Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

 Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji ewere ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ 144,000 a kpọtụrụ aha n’akwụkwọ Mkpughe dị ka ọnụ ọgụgụ nkịtị kama iwere ya dị ka ihe atụ?

Jọn onyeozi dere, sị: “M wee nụ ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ a kara akara, narị puku na iri puku anọ na anọ.” (Mkpughe 7:4) N’ime Bible, nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ “ndị ahụ a kara akara” na-ezo aka n’otu ìgwè mmadụ, bụ́ ndị a họpụtara n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ iso Kraịst gaa n’eluigwe ma chịa ụwa Paradaịs nke na-abịa n’ihu. (2 Ndị Kọrint 1:21, 22; Mkpughe 5:9, 10; 20:6) E weere ọnụ ọgụgụ ha, bụ́ 144,000, n’ụzọ nkịtị n’ihi ọtụtụ ihe. A na-achọta otu n’ime ha kpọmkwem n’ihe ndị gbara Mkpughe 7:4 gburugburu.

Mgbe a gwasịrị Jọn onyeozi banyere ìgwè mmadụ a dị 144,000 n’ọhụụ, e gosiri ya ìgwè mmadụ ọzọ. Jọn na-akọwa ìgwè nke abụọ a dị ka “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta.” Oké ìgwè mmadụ a na-ezo aka n’ebe ndị ga-alanarị “oké mkpagbu” na-abịa n’ihu nọ, bụ́ nke ga-ebibi ajọ ụwa dị ugbu a.—Mkpughe 7:9, 14.

Otú ọ dị, rịba ama otú Jọn si gosi ọdịiche dị n’etiti amaokwu nke 4 na nke 9 nke Mkpughe isi 7. O kwuru na a pụrụ ịgụta ìgwè nke mbụ, bụ́ “ndị a kara akara,” ọnụ. Otú ọ dị, a pụghị ịgụta ìgwè nke abụọ, bụ́ “oké ìgwè mmadụ,” ọnụ. N’iburu nke ahụ n’uche, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya iwere ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ 144,000 dị ka ọnụ ọgụgụ nkịtị. Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ 144,000 bụ́ ihe atụ ma na-arụtụ aka n’ìgwè a na-apụghị ịgụta ọnụ n’ezie, ọdịiche dị n’etiti amaokwu abụọ ahụ agaghịzi apụta ìhè. N’ihi ya, ihe ndị gbara ya gburugburu na-egosi n’ụzọ siri ike na a ghaghị iwere ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ 144,000 dị ka ọnụ ọgụgụ nkịtị.

Ndị ọkà mmụta Bible dịgasị iche iche, ma n’oge gara aga ma n’oge a, ruru n’otu nkwubi okwu ahụ—nke bụ́ na ọnụ ọgụgụ ahụ bụ ọnụ ọgụgụ nkịtị. Dị ka ihe atụ, n’ikwu banyere Mkpughe 7:4, 9, onye Britain na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Dr. Ethelbert W. Bullinger kwuru n’ihe dị ka 100 afọ gara aga, sị: “Ọ bụ eziokwu e kwuru n’ụzọ dị mfe: ọnụ ọgụgụ a kpọrọ aha nke dị iche n’ọnụ ọgụgụ ahụ a na-akpọghị aha n’isiakwụkwọ a kpọmkwem.” (The Apocalypse or “The Day of the Lord,” peeji nke 282) Na nso nso a, Robert L. Thomas, Jr., bụ́ prọfesọ Agba Ọhụrụ n’ụlọ akwụkwọ bụ́ The Master’s Seminary dị na United States, dere, sị: “E nweghị ihe àmà siri ike na-egosi na ọ bụ ihe nnọchianya.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ọ bụ ọnụ ọgụgụ a kpọrọ aha [na 7:4] n’iji ya tụnyere ọnụ ọgụgụ a na-akpọghị aha nke 7:9. Ọ bụrụ na e were ya dị ka ọnụ ọgụgụ ihe atụ, ọ dịghị ọnụ ọgụgụ dị n’akwụkwọ ahụ a pụrụ iwere dị ka nke nkịtị.”—Revelation: An Exegetical Commentary, Mpịakọta nke 1, peeji nke 474.

Ụfọdụ ndị na-arụ ụka na ebe ọ bụ na Mkpughe nwere ọtụtụ ihe atụ, ọnụ ọgụgụ nile dị n’akwụkwọ a, gụnyere ọnụ ọgụgụ bụ́ 144,000, aghaghị ịbụ ihe atụ. (Mkpughe 1:1, 4; 2:10) Otú ọ dị, o doro anya na nkwubi okwu ahụ ezighị ezi. N’eziokwu, Mkpughe nwere ọtụtụ  ọnụ ọgụgụ ihe atụ, ma o nwekwara ọnụ ọgụgụ nkịtị. Dị ka ihe atụ, Jọn na-ekwu banyere “aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 21:14) N’ụzọ doro anya, ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ 12, nke a kpọtụrụ aha n’amaokwu a bụ ọnụ ọgụgụ nkịtị, ọ bụghị ihe atụ. Ọzọkwa, Jọn onyeozi dere banyere ọchịchị “puku afọ” Kraịst. E kwesịkwara iwere ọnụ ọgụgụ ahụ dị ka nke nkịtị, dị ka ntụle e ji nlezianya tụlee Bible na-egosi. * (Mkpughe 20:3, 5-7) N’ihi ya, ma à ga-ewere ọnụ ọgụgụ dị ná Mkpughe dị ka nke nkịtị ma ọ bụ dị ka ihe atụ dabeere n’ihe ndị gbara ya gburugburu.

Nkwubi okwu ahụ bụ́ na ọnụ ọgụgụ bụ́ 144,000 bụ nke nkịtị, nakwa na ọ na-ezo aka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ a kpaara ókè, bụ́ ìgwè dị nnọọ nta ma e jiri ya tụnyere “oké ìgwè mmadụ” ahụ, na akụkụ Bible ndị ọzọ kwekọkwara. Dị ka ihe atụ, ná ngwụsị nke ọhụụ ahụ Jọn onyeozi hụrụ, a kọwara 144,000 ahụ dị ka ndị e “si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ zụta . . . dị ka mkpụrụ mbụ.” (Mkpughe 14:1, 4) Okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ mbụ” na-ezo aka n’ìgwè dị nta nke ndị nnọchianya a họpụtara ahọpụta. Ọzọkwa, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kwuru banyere ndị ga-eso ya chịa n’Alaeze eluigwe ya ma kpọọ ha “ìgwè atụrụ nta.” (Luk 12:32; 22:29) N’ezie, ndị sitere n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ bụ́ ndị ga-achị achị n’eluigwe dị ole na ole ma e jiri ha tụnyere ihe a kpọrọ mmadụ ga-ebi na Paradaịs elu ala nke na-abịa n’ihu.

N’ihi ya, ihe ndị gbara Mkpughe 7:4 gburugburu na okwu ndị yiri ha, bụ́ ndị a na-achọta n’ebe ndị ọzọ n’ime Bible, na-egosi na e kwesịrị iwere ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ 144,000 dị ka ọnụ ọgụgụ nkịtị. Ọ na-ezo aka ná ndị ga-eso Kraịst gaa n’eluigwe ịchị ụwa paradaịs, bụ́ nke ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu nwere obi ụtọ bụ́ ndị na-efe Jehova Chineke ofufe, ndị a na-amaghịkwa ole ha ga-adị, ga-ejupụta na ya.—Abụ Ọma 37:29.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! peeji nke 289-290, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 31]

Ọnụ ọgụgụ ndị nketa eluigwe dị nanị 144,000

[Foto dị na peeji nke 31]

A kpọghị ọnụ ọgụgụ nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ aha

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]

Kpakpando: Site n’ikike nke Anglo-Australian Observatory, foto David Malin sere