Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchọ A Na-achọ Obi Ụtọ

Ọchịchọ A Na-achọ Obi Ụtọ

 Ọchịchọ A Na-achọ Obi Ụtọ

AFỌ ole na ole gara aga, a jụrụ ndị bi na France, Germany, Great Britain, na United States, sị, “Gịnị ka ọ na-ewe iji nwee obi ụtọ?” N’ime ndị a gbara ajụjụ ọnụ, pasent 89 kwuru na ọ na-ewe ezi ahụ́ ike; pasent 79 kwuru na ọ bụ inwe alụmdi na nwunye ma ọ bụ mmekọrịta na-enye afọ ojuju; pasent 62 rụtụrụ aka n’ụgwọ ọrụ ndị a na-enweta site n’ịbụ nne ma ọ bụ nna; pasent 51 chekwara na ọrụ na-aga nke ọma dị mkpa iji nweta obi ụtọ. Ọ bụkwa ezie na a na-akụziri ọtụtụ ndị na ego adịghị eweta obi ụtọ, pasent 47 n’ime ndị a jụrụ ajụjụ kwenyesiri ike na ego na-eweta obi ụtọ. Gịnị ka ihe ndị a na-egosi?

Nke mbụ, tụlee njikọ a sịrị na ego na obi ụtọ nwere. Nnyocha e mere banyere otu narị mmadụ kasị baa ọgaranya na United States gosiri na ha enweghị obi ụtọ karịa ndị mmadụ n’ozuzu. Ọzọkwa, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị bi na United States amụbawo ihe onwunwe ha ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu abụọ n’ime afọ iri atọ gara aga, ha enweghị obi ụtọ karịa ka ha nweburu, dị ka ndị ọkachamara n’ihe banyere ọrịa uche si kwuo. N’ezie, otu akụkọ na-ekwu, sị: “N’ime otu oge ahụ, ịda mbà n’obi arịwo elu. Igbu onwe onye nke ndị nọ n’afọ iri na ụma amụbawo okpukpu atọ. Ịgba alụkwaghịm amụbawo okpukpu abụọ.” N’ihe dị ka mba 50, ndị na-eme nchọpụta, bụ́ ndị mụrụ banyere njikọ ego na obi ụtọ nwere, ruru ná nkwubi okwu bụ́ na ego apụghị ịzụta obi ụtọ.

Ọzọ, ruo n’ókè ha aṅaa ka ihe ndị dị ka ezi ahụ́ ike, alụmdi na nwunye na-enye afọ ojuju, na ọrụ na-aga nke ọma dịruru mkpa n’inweta obi ụtọ? N’ezie, ọ bụrụ na ihe ndị a dị nnọọ mkpa iji nwee obi ụtọ, olee maka ọtụtụ nde mmadụ bụ́ ndị na-enweghị ezi ahụ́ ike na ndị nile na-enweghị alụmdi na nwunye na-enye afọ ojuju? Olee maka ndị di na nwunye na-enweghị ụmụ, na ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị nile na-enweghị ọrụ na-aga nke ọma? Ndị nile dị otú ahụ hà ga-anọgide na-adị ndụ enweghị obi ụtọ? Ihe a sịkwara na ọ bụ obi ụtọ nke ndị nwere ezi ahụ́ ike na alụmdi na nwunye na-enye afọ ojuju ugbu a, ọ̀ ga-efunyụ anya ma ọnọdụ ha gbanwee?

Ànyị Na-achọ Ya n’Ebe Ndị Kwesịrị Ekwesị?

Onye ọ bụla chọrọ inwe obi ụtọ. Nke a adịghị eju anya n’ihi na a kọwara Onye Kere mmadụ dị ka “Chineke onye obi ụtọ,” e mekwara mmadụ n’onyinyo Chineke. (1 Timoti 1:11; Jenesis 1:26, 27) N’ihi ya, mmadụ ịchọ inweta obi ụtọ bụ ihe dị nnọọ otú o kwesịrị. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-ele ijigide obi ụtọ anya dị ka ijigide ájá uzuzu n’aka—ha abụọ na-amịpụsị amịpụsị.

Otú ọ dị, ọ̀ pụrụ ịbụ na ụfọdụ na-etinye  mgbalị gabiga ókè iji chọta obi ụtọ? Ọkà ihe ọmụma n’ihe banyere ọha na eze bụ́ Eric Hoffer chere otú ahụ. O kwuru, sị: “Ọchịchọ a na-achọ obi ụtọ bụ otu isi ihe na-akpata enweghị obi ụtọ.” Nke ahụ bụ nnọọ eziokwu ma ọ bụrụ na anyị na-achọ obi ụtọ n’ebe ndị na-ekwesịghị ekwesị. Ya bụrụ otú ahụ, anyị ga-enwerịrị ndakpọ olileanya na obi nkoropụ. Ịgbalị ịba ọgaranya; ịgbalịsi ike imere onwe onye aha ma ọ bụ ịbụ onye a ma ama; ịchụso ihe mgbaru ọsọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke ọha na-eze, ma ọ bụ nke akụ̀ na ụba; ma ọ bụ ibi ndụ nke iche nanị banyere onwe onye na nke imeju agụụ onwe onye ozugbo adịghị nke na-eweta obi ụtọ. Ka a sịkwa ihe mere ụfọdụ jiworo nakwere echiche ahụ na-emegide onwe ya nke otu onye edemede kwupụtara bụ́ onye sịrị: “A sị nnọọ na anyị ga-akwụsịtụ ịgbalị inwe obi ụtọ, anyị ga-enwe nnọọ obi ụtọ”!

N’ụzọ dị ịrịba ama, njụta echiche ahụ a kpọtụrụ uche ná mmalite isiokwu a gosikwara na mmadụ 4 n’ime mmadụ 10 ọ bụla n’ime ndị a gbara ajụjụ ọnụ chere na ime ihe ọma na inyere ndị ọzọ aka na-eweta obi ụtọ. Nakwa na 1 onye n’ime mmadụ 4 ọ bụla kwusiri ike na okpukpe na nkwenkwe okpukpe na-ekere òkè dị mkpa n’inwe obi ụtọ. O doro anya na ọ dị anyị mkpa ilebakwu anya n’ihe ọ na-ewe iji nwee ezi obi ụtọ. Isiokwu na-esonụ ga-enyere anyị aka ime otú ahụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Ọtụtụ na-eche na ego, ndụ ezinụlọ na-enye afọ ojuju, ma ọ bụ ọrụ na-aga nke ọma bụ isi ihe na-eduga n’inwe obi ụtọ. Ì kweere otú ahụ?