Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova, ‘Ebe Anyị E Wusiri Ike n’Oge Nsogbu’

Jehova, ‘Ebe Anyị E Wusiri Ike n’Oge Nsogbu’

 Jehova, ‘Ebe Anyị E Wusiri Ike n’Oge Nsogbu’

“Nzọpụta ndị ezi omume na-esi n’aka Jehova bịa: Ọ bụ ebe ha siri ike na mgbe mkpa.” —ABỤ ỌMA 37:39.

1, 2. (a) Gịnị ka Jizọs kpere n’ekpere n’ihi ndị na-eso ụzọ ya? (b) Gịnị bụ uche Chineke banyere ndị ya?

JEHOVA bụ onye pụrụ ime ihe nile. O nwere ike ichebe ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ya ofufe n’ụzọ ọ bụla o si chọọ. Ọ pụrụ ọbụna ikewapụ ndị ya n’ụzọ nkịtị site n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụwa nọ ma debe ha n’ebe dị nchebe na nke dị n’udo. Otú ọ dị, banyere ndị na-eso ụzọ ya, Jizọs kpegaara Nna ya nke eluigwe ekpere, sị: “M na-arịọ gị arịrịọ, ọ bụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ.”—Jọn 17:15.

2 Jehova ahọrọwo ịghara ịkpọpụ anyị “n’ụwa.” Kama nke ahụ, ọ bụ uche ya ka anyị biri n’etiti ọha mmadụ n’ụwa iji nwee ike ikwusara ndị ọzọ ozi ya nke olileanya na nke nkasi obi. (Ndị Rom 10:13-15) Ma, dị ka Jizọs nyere echiche ya n’ekpere ya, site n’ibi n’ụwa a, a na-ekpughepụ anyị nye “ajọ onye ahụ.” Ihe a kpọrọ mmadụ na ndị ajọ mmụọ na-enupụ isi na-akpata oké ihe mgbu na nhụjuanya, nsogbu na-emetụtakwa Ndị Kraịst.—1 Pita 5:9.

3. Olee ihe ndị na-eme eme nke ọbụna ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova ofufe na-aghaghị iche ihu, ma nkasi obi dị aṅaa ka anyị na-achọta n’Okwu Chineke?

3 N’okpuru ule ndị dị otú ahụ, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị ịda mbà n’obi mgbe ụfọdụ. (Ilu 24:10) E nwere ọtụtụ ihe ndekọ Bible nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwetara nsogbu. “Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume,” ka ọbụ abụ ahụ na-ekwu, “ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.” (Abụ Ọma 34:19) Ee, ajọ ihe na-adakwasị ọbụna “onye ezi omume.” Dị ka ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, mgbe ụfọdụ, ‘ahụ́ pụrụ ọbụna isinwụ anyị, e gwepịakwa anyị nke ukwuu.’ (Abụ Ọma 38:8) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18; 94:19.

4, 5. (a) N’ikwekọ n’Ilu 18:10, gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nweta nchebe Chineke? (b) Olee nzọụkwụ ụfọdụ a kapịrị ọnụ anyị pụrụ iwere iji nweta enyemaka Chineke?

4 N’ikwekọ n’ekpere Jizọs, Jehova na-eche anyị nche n’ezie. Ọ bụ ‘ebe anyị siri ike na mgbe mkpa.’ (Abụ Ọma 37:39) Akwụkwọ Ilu jikwa okwu yiri nke ahụ mee ihe mgbe ọ na-asị: “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu.” (Ilu 18:10) Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-ekpughe eziokwu bụ́ isi banyere nchegbu  ọmịiko Jehova nwere n’ebe ihe ndị o kere eke nọ. Chineke na-echebe karịsịa ndị ezi omume bụ́ ndị na-achọsi ya ike, dị ka à ga-asị na anyị na-agbaga n’ụlọ elu dị ike maka nchebe.

5 Mgbe nsogbu ndị na-eweta obi erughị ala chere anyị ihu, olee otú anyị pụrụ isi gbakwuru Jehova maka nchebe? Ka anyị tụlee nzọụkwụ atọ dị oké mkpa ndị anyị pụrụ iwere iji nweta enyemaka Jehova. Nke mbụ, anyị aghaghị ịgakwuru Nna anyị nke eluigwe n’ekpere. Nke abụọ, anyị kwesịrị ịrụ ọrụ kwekọrọ na mmụọ nsọ ya. Nke atọ kwa, anyị aghaghị ido onwe anyị n’okpuru ndokwa Jehova site n’ịgbalị iso Ndị Kraịst ibe anyị na-akpakọrịta, bụ́ ndị pụrụ ime ka obi erughị ala anyị belata.

Ike nke Ekpere

6. Olee otú ezi Ndị Kraịst si ele ekpere anya?

6 Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe metụtara ahụ́ ike na-atụ aro ikpe ekpere dị ka ihe e ji agwọ ịda mbà n’obi na nchekasị. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ eziokwu na oge ndị dị jụụ nke ntụgharị uche yiri ekpere pụrụ ibelata nchekasị, ịnụ ụda ụfọdụ sitere n’ihe ndị e kere eke ma ọ bụ ọbụna ịhịa aka pụkwara ibelata nchekasị. Ezi Ndị Kraịst adịghị eleda ekpere anya site n’iwere ya dị ka nanị ihe e ji eme ka ahụ́ dị mma. Anyị na-ele ekpere anya dị ka iso Onye Okike ekwurịta okwu n’ụdị ofufe. Ekpere gụnyere ofufe anyị na-efe Chineke na obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ. Ee, ekpere bụ akụkụ nke ofufe anyị.

7. Gịnị ka iji obi ike na-ekpe ekpere pụtara, oleekwa otú ekpere ndị dị otú ahụ si enyere anyị aka ịnagide nsogbu?

7 Ekpere anyị aghaghị igosipụta obi ike ma ọ bụ ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Jehova nọ. Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụkwa obi ike nke anyị nwere n’ebe ọ nọ, na, n’agbanyeghị ihe ọ bụ nke anyị na-arịọ dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) Jehova, Onye Kachasị Elu, onye nanị ya bụ ezi Chineke na onye pụrụ ime ihe nile, na-ege ntị n’ezie n’ekpere ndị na-efe ya ofufe na-ekpesi ike. Nanị ịmara na Chineke anyị na-ahụ n’anya na-ege ntị mgbe anyị na-agwa ya nchegbu na nsogbu anyị bụ ihe na-akasi obi.—Ndị Filipaị 4:6.

8. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi na-ekwesịghị iji na-eme ihere ma ọ bụ na-eche na ha erughị eru mgbe ha na-abịakwute Jehova n’ekpere?

8 Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi ekwesịghị ime ihere, iche na ha erughị eru, ma ọ bụ ghara inwe obi ike mgbe ha na-agakwuru Jehova n’ekpere. N’eziokwu, mgbe anyị na-erughị ihe anyị chọrọ ma ọ bụ mgbe anyị nwere ọtụtụ nsogbu, anyị apụchaghị mgbe nile inwe ọchịchọ ịbịakwute Jehova n’ekpere. N’oge ndị dị otú ahụ, anyị kwesịrị icheta na Jehova ‘na-enwe obi ebere n’ahụ́ ndị Ya e wedara n’ala’ nakwa na ọ “na-akasi ndị e wedara n’ala obi.” (Aịsaịa 49:13; 2 Ndị Kọrint 7:6) Karịsịa ọ bụ n’oge nhụjuanya na nsogbu ka ọ dị anyị mkpa iji obi ike gakwuru Nna anyị nke eluigwe dị ka ebe anyị e wusiri ike.

9. Olee òkè okwukwe na-ekere n’anyị ịgakwuru Chineke n’ekpere?

9 Iji rite uru n’ụzọ zuru ezu n’ihe ùgwù nke ekpere, anyị aghaghị inwe ezi okwukwe. Bible na-ekwu na “onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Okwukwe karịrị nanị ikwere na Chineke “dị adị.” Ezi okwukwe na-agụnye ikwenyesi ike na Chineke nwere ikike na ọchịchọ ịkwụghachi anyị ụgwọ maka ndụ nrubeisi nye ya. “Anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike.” (1 Pita 3:12) Iburu n’uche mgbe nile nchegbu Jehova nwere maka anyị na-eme ka ekpere anyị nwee ihe pụrụ iche ọ pụtara.

10. Olee otú ekpere anyị na-aghaghị ịdị ma ọ bụrụ na Jehova ga-akwagide anyị n’ụzọ ime mmụọ?

10 Jehova na-ege ntị n’ekpere anyị mgbe anyị ji obi zuru okè na-ekpe ya. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ewerewo m obi m nile kpọọ mkpu; za m, Jehova.” (Abụ Ọma 119:145) N’adịghị ka ekpere mmezu iwu nke ọtụtụ okpukpe, ekpere anyị abụghị ihe a na-ekpe iji mezuo iwu ma ọ bụ nke na-esiteghị n’obi. Mgbe anyị ji ‘obi anyị nile’ na-ekpegara Jehova ekpere, ihe anyị na-ekwu na-enwe ihe bara uru ọ pụtara ma bụrụ nke nwere nzube. Mgbe anyị kpesisịrị ekpere ike n’ụzọ dị otú ahụ, anyị na-enweta ahụ́ efe nke na-abịa site n’ịtụkwasị ‘Jehova ibu anyị.’ Dị ka Bible na-ekwe ná nkwa, ‘ọ ga-anagide’ anyị.—Abụ Ọma 55:22; 1 Pita 5:6, 7.

Mmụọ Chineke Bụ Ihe Inyeaka Anyị

11. Olee otu ụzọ Jehova si aza ekpere anyị mgbe anyị ‘nọgidere na-arịọ’ maka enyemaka ya?

11 Jehova abụghị nanị Onye Na-anụ ekpere kamakwa Onye Na-aza ekpere. (Abụ Ọma 65:2) Devid dere, sị: “N’ụbọchị mkpa m m ga-akpọku Gị; n’ihi na Ị ga-aza m.” (Abụ Ọma 86:7) N’ihi ya, Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ‘ịnọgide na-arịọ’ maka enyemaka Jehova n’ihi na “Nna unu nke nọ n’eluigwe” ga-enye “ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.” (Luk 11:9-13) Ee, ike Chineke nọ n’ọrụ na-eje ozi dị ka ihe inyeaka, ma ọ bụ ihe nkasi obi, nye ndị ya.—Jọn 14:16.

12. Olee otú mmụọ Chineke pụrụ isi nyere anyị aka mgbe nsogbu yiri ka ọ na-akarị ike anyị?

12 Ọbụna mgbe anyị na-eche ule ihu, mmụọ Chineke pụrụ inye anyị “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Pọl onyeozi, bụ́ onye tachiri obi n’ọtụtụ ọnọdụ ndị na-akpata nchekasị, ji obi ike kwuo, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) N’otu aka ahụ, ọtụtụ Ndị Kraịst taa abụrụwo ndị e mere ka ha nwee ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ mmetụta uche mgbe a zara arịrịọ ha. Mgbe mgbe, nsogbu ndị na-akpata mwute adịghị eyizi ihe karịrị ike anyị mgbe anyị nwetasịrị enyemaka nke mmụọ Chineke. N’ihi ume a Chineke na-enye, anyị pụrụ ikwu dị ka onyeozi ahụ kwuru, sị: “A na-akpagide anyị n’ụzọ nile, ma a kpagideghị anyị ruo n’ókè nke enweghị ike imegharị ahụ́; anyị na-enwe mgbagwoju anya, ma ọ bụghị n’enwetụghị ụzọ mgbapụ; a na-akpagbu anyị, ma a dịghị agbahapụ anyị; a na-akwada anyị, ma a dịghị ebibi anyị.”—2 Ndị Kọrint 4:8, 9.

13, 14. (a) Olee otú Jehova siworo ghọọ ebe anyị e wusiri ike site n’Okwu ya e dere ede? (b) Olee otú itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ siworo nyere gị onwe gị aka?

13 Mmụọ nsọ enyewokwa ike e ji dee Okwu Chineke ma chebe ya n’ihi abamuru anyị. Olee otú Jehova siworo ghọọ ebe anyị e wusiri ike n’oge nsogbu site n’Okwu ya? Otu ụzọ bụ site n’inye anyị nzube ihe ma ọ bụ ezi amamihe na izuzu. (Ilu 3:21-24) Bible na-azụ ikike iche echiche anyị ma na-eme ka ike nke uche anyị dịwanye nkọ. (Ndị Rom 12:1) Site n’ịgụ na ịmụ Okwu Chineke mgbe nile, nakwa itinye ya n’ọrụ, anyị pụrụ ịbụ ndị ‘a zụrụ ikike nghọta ha ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.’ (Ndị Hibru 5:14) Ị pụrụ ịhụwo n’onwe gị otú ụkpụrụ Bible si nyere gị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha mgbe i chere ihe isi ike ihu. Bible na-enye anyị ezi uche pụrụ inyere anyị aka ịchọta ihe ngwọta ndị dị iré nye nsogbu ndị na-akpata mwute.—Ilu 1:4.

 14 Okwu Chineke na-enye anyị ihe ọzọ na-enye ume—olileanya nke nzọpụta. (Ndị Rom 15:4) Bible na-agwa anyị na ihe ọjọọ agaghị anọgide na-eme ruo mgbe ebighị ebi. Mkpagbu ọ bụla anyị na-enweta ugbu a agaghị adịgide adịgide. (2 Ndị Kọrint 4:16-18) Anyị nwere “olileanya ndụ ebighị ebi nke Chineke, onye na-apụghị ịgha ụgha, kwere ná nkwa tupu mgbe dị anya gara aga.” (Taịtọs 1:2) Ọ bụrụ na anyị na-enwe ọṅụ n’olileanya ahụ, na-echeta mgbe nile ọdịnihu na-egbukepụ egbukepụ nke Jehova kwere ná nkwa, anyị pụrụ ịtachi obi n’ule.—Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalonaịka 1:3.

Ọgbakọ —Ngosipụta nke Ịhụnanya Chineke

15. Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi bụụrụ ibe ha ngọzi?

15 Ndokwa ọzọ sitere n’aka Jehova nke pụrụ inyere anyị aka n’oge nsogbu bụ mkpakọrịta anyị na-enwe n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Bible na-ekwu, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” (Ilu 17:17) Okwu Chineke na-agba mmadụ nile nọ n’ọgbakọ ume ịsọpụrụ na ịhụ ibe ha n’anya. (Ndị Rom 12:10) “Ka onye ọ bụla nọgide na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ,” ka Pọl onyeozi dere. (1 Ndị Kọrint 10:24) Inwe ọnọdụ uche dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ilekwasị anya ná mkpa nke ndị ọzọ kama ịbụ n’ule nke anyị. Mgbe anyị na-ewepụta onwe anyị iji nyere ndị ọzọ aka, ọ bụghị nanị na anyị na-enyere ha aka kama anyị na-enweta obi ụtọ na afọ ojuju bụ́ ndị na-eme ka ibu arọ anyị ghara ịnyịgbu anyị.—Ọrụ 20:35.

16. Olee otú Onye Kraịst ọ bụla pụrụ isi na-agba ụmụnna ya ume?

16 Ndị ikom na ndị inyom tozuru okè pụrụ ikere òkè dị mkpa n’iwusi ndị ọzọ ike. Iji mee nke ahụ, ha na-eme ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịbịakwute ha ma na-ewepụta onwe ha inyere ha aka. (2 Ndị Kọrint 6:11-13) Ọgbakọ na-erite uru n’ezie mgbe mmadụ nile na-ewepụta oge ịja ndị na-eto eto mma, iwuli ndị ọhụrụ kwere ekwe elu, na ịgba ndị dara mbà n’obi ume. (Ndị Rom 15:7) Ịhụnanya ụmụnna ga-enyekwara anyị aka izere mmụọ nke inyo ndị ọzọ enyo. Anyị ekwesịghị ịdị ngwa ikwubi na ihe isi ike onwe onye bụ ihe àmà nke adịghị ike ime mmụọ. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Pọl na-agba Ndị Kraịst ume “ịgụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Bible na-egosi na ọbụna Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi na-enwe nsogbu.—Ọrụ 14:15.

17. Olee ohere ndị anyi nwere iji wusie nkekọ òtù ụmụnna Ndị Kraịst anyị ike?

17 Nzukọ Ndị Kraịst na-enye anyị ohere magburu onwe ya iji na-akasi ibe anyị obi ma na-agba ha ume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ bụghị nanị ná nzụkọ Ndị Kraịst ka anyị na-enweta mkpakọrịta ịhụnanya a. Kama nke ahụ, ndị  Chineke na-agbalịkwa ịchọ ohere iji kere òkè ná mkpakọrịta bara uru n’oge ndị ọzọ. Mgbe ọnọdụ ndị na-akpata mwute bilitere, anyị ga-adị njikere inyere ibe anyị aka n’ihi na e nwewo nkekọ ọbụbụenyi siri ike. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka e wee ghara inwe nkewa n’ahụ́, kama ka akụkụ ya nile wee na-elekọta ibe ha. . . . Ọ bụrụkwa na otu akụkụ ahụ́ na-ata ahụhụ, akụkụ ndị ọzọ dum na-eso ya ata ahụhụ; ma ọ bụ ọ bụrụ na e bulie otu akụkụ ahụ́ elu, akụkụ ndị ọzọ dum na-eso ya aṅụrị ọṅụ.”—1 Ndị Kọrint 12:25, 26.

18. Mmetụta dị aṅaa ka anyị kwesịrị izere mgbe anyị nwere nkụda mmụọ?

18 Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ inwe nkụda mmụọ siri ike nke na anyị ga-achọ izere iso Ndị Kraịst ibe anyị akpakọrịta. Anyị kwesịrị ịlụso mmetụta dị otú ahụ ọgụ ka anyị wee ghara ịnapụ onwe anyị nkasi obi na enyemaka nke ndị kwere ekwe ibe anyị pụrụ inye. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.” (Ilu 18:1) Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ ngosipụta nke nchebara echiche Chineke nwere n’ebe anyị nọ. Ọ bụrụ na anyị amata ndokwa ịhụnanya ahụ, anyị ga-achọta ahụ́ efe n’oge nsogbu.

Nọgide Na-enwe Nchekwube

19, 20. Olee otú Akwụkwọ Nsọ si enyere anyị aka ịjụ echiche na-ezighị ezi?

19 Mgbe ịda mbà na mwute bịara, ọ na-adịkarị mfe inwewe echiche na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, mgbe ọdachi dakwasịrị ha, ụfọdụ pụrụ ịmalite inwe obi abụọ banyere ọnọdụ ime mmụọ ha, na-ekwubi na ihe isi ike ha bụ ihe àmà nke enweghị ihu ọma Chineke. Otú ọ dị, cheta na Jehova adịghị eji “ihe ọjọọ” anwa onye ọ bụla. (Jems 1:13) “[Chineke adịghị] esite n’obi Ya wedaa ụmụ mmadụ n’ala, mekpaa ha ahụ́,” ka Bible na-ekwu. (Abụ Ákwá 3:33) N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ na-ewute Jehova n’ụzọ dị ukwuu mgbe ndị ohu ya na-ata ahụhụ.—Aịsaịa 63:8, 9; Zekaraịa 2:8.

20 Jehova bụ “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi nile.” (2 Ndị Kọrint 1:3) Ọ na-eche banyere anyị, ọ ga-ebulikwa anyị elu mgbe oge ya ruru. (1 Pita 5:6, 7) Iburu n’uche mgbe nile mmetụta ọmịiko Chineke nwere n’ebe anyị nọ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe àgwà ziri ezi, ọbụna ịṅụrị ọṅụ. Jems dere, sị: “Gụọnụ ya dị ka nanị ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche.” (Jems 1:2) N’ihi gịnị? Ọ na-aza, sị: “N’ihi na n’ịbụ onye a nwapụtara, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ, nke Jehova kwere ndị nọgidere na-ahụ ya n’anya ná nkwa.”—Jems 1:12.

21. N’agbanyeghị ihe isi ike ndị anyị na-eche ihu, mmesi obi ike dị aṅaa ka Chineke na-enye ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya?

21 Dị ka Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị, n’ụwa anyị na-enwe mkpagbu. (Jọn 16:33) Ma Bible na-ekwe nkwa na ọ dịghị ‘ahụhụ ma ọ bụ nsogbu ma ọ bụ mkpagbu ma ọ bụ agụụ ma ọ bụ ịgba ọtọ ma ọ bụ ihe ize ndụ’ pụrụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Jehova na nke Ọkpara ya. (Ndị Rom 8:35, 39) Lee ihe nkasi obi ọ bu ịmara na nsogbu ọ bụla anyị pụrụ iche ihu ugbu a bụ ihe na-adịru nwa oge! Ka ọ dịgodị, ka anyị na-echere ọgwụgwụ nke nhụjuanya ụmụ mmadụ, Nna anyị nke na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova na-eche anyị nche. Ọ bụrụ na anyị agbakwuru ya maka nchebe, ọ ga-abụrụ “onye a na-azọpịa ụlọ elu, bụ́ ụlọ elu nke dịịrị mgbe nile nke mkpa.”—Abụ Ọma 9:9.

Gịnị Ka Anyị Mụtara?

• Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ịtụ anya ya ka ha na-ebi n’ajọ ụwa a?

• Olee otú ekpere anyị na-ekpesi ike ga-esi wusie anyị ike mgbe anyị na-eche ule ihu?

• Olee otú mmụọ Chineke si bụrụ ihe inyeaka?

• Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ibe anyị aka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Anyị aghaghị ịchọ Jehova dị ka à ga-asị na anyị na-agbaga n’ụlọ elu dị ike

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ na-eji ohere ọ bụla aja ndị ọzọ mma ma na-agba ha ume