Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

 Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ụfọdụ azọrọwo na ụgbọ Pọl nọ na ya ekpughị n’agwaetiti Mọlta, n’ebe ndịda Sisili, kama na ọ bụ n’agwaetiti ọzọ. Ebee ka ụgbọ ọ nọ na ya kpuru?

Ajụjụ a na-ezo aka n’echiche pụtara nnọọ ọhụrụ nke bụ́ na ụgbọ Pọl onyeozi nọ na ya kpuru, ọ bụghị n’agwaetiti Mọlta, kama na Cephalonia (ma ọ bụ, Kefallinía) nke dị nso na Corfu n’Oké Osimiri Ionia, n’ụsọ oké osimiri nke ebe ọdịda anyanwụ Gris. Ihe ndekọ ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ na-agwa anyị na Pọl buliri ije site na Sesaria n’okpuru nlekọta nke ọchịagha ndị Rom bụ́ Juliọs, ya na ndị agha ndị ọzọ na ndị ibe Pọl. Dị ka e gosiri na map dị n’ebe a, ha ji ụgbọ mmiri gaa Saịdọn na Maịra. N’ịgbanwe ụgbọ banye ná nnukwu ụgbọ mmiri na-ebu  mkpụrụ akụ́kụ́ si Aleksandria, Ijipt, ha gawara Kinaịdọs nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ. Ha apụghị ịnọgide n’ụzọ ha bu n’uche bụ́ isi n’Oké Osimiri Aegean na-agafe ọnụ ọnụ Gris ma gawa Rom. Oké ifufe manyere ha iche ihu n’ebe ndịda gawa Krit ma ruo ikperé mmiri ya dị nchebe. N’ebe ahụ ha kwụsịrị n’Ọdụ Ụgbọ Mmiri Ọma. Ka ha ‘kwọpụrụ ụgbọ na Krit banye n’oké osimiri, oké ifufe a na-akpọ Yuroakwilo jichiri ụgbọ mmiri ahụ n’ike.’ Nnukwu ụgbọ ahụ na-ebu mkpụrụ akụ́kụ́ ‘ṅagharịrị n’elu oké osimiri’ ruo abalị 14. N’ikpeazụ, ụgbọ ahụ mmadụ 276 nọ na ya kpuru n’otu agwaetiti nke ihe odide Grik nke Akwụkwọ Nsọ kpọrọ Me·liʹte.Ọrụ 27:1–28:1.

N’ime afọ ndị gafeworonụ, a tụwo aro dịgasị iche iche banyere ebe bụ́ agwaetiti a, bụ́ Me·liʹte. Ụfọdụ echewo na ọ bụ agwaetiti Melite Illyrica, nke a maara ugbu a dị ka Mljet, nke dị n’Oké Osimiri Adriatic n’akụkụ ụsọ oké osimiri Croatia. Ma o yighị ka nke a ọ̀ ga-abụ ya, ebe ọ bụ na ebe ugwu Mljet dị siri ike ime ka o kwekọọ n’ebe ndị ọzọ Pọl gara na njem ya, ndị bụ́ Sirakus, Sisili, nakwa ụsọ oké osimiri nke ebe ọdịda anyanwụ Ịtali.—Ọrụ 28:11-13.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị nsụgharị Bible ekwubiwo na Me·liʹte na-ezo aka n’agwaetiti Melite Africanus, nke a maara ugbu a dị ka Mọlta. Ebe ikpeazụ ụgbọ ahụ bu Pọl kwụsịrị bụ́ Ọdụ Ụgbọ Mmiri Ọma, dị na Krit. Mgbe ahụ oké ifufe manyere ụgbọ ahụ iche ihu n’ebe ọdịda anyanwụ, ịgawa Kọda. Ifufe ahụ nọgidere na-ebu ụgbọ ahụ ruo ọtụtụ ụbọchị. Ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya na ụgbọ ahụ oké ifufe nọ na-ebu ga-agbadawa n’ebe ọdịda anyanwụ ma ruo Mọlta.

N’iburu n’uche ụdị ifufe na-efekarị ebe ahụ na “akụkụ ebe o si na-efe na otú o si enugharị ihe,” Conybeare na Howson kwuru n’akwụkwọ ha bụ́ The Life and Epistles of St. Paul (Ndụ Senti Pọl na Akwụkwọ Ozi Ndị O Dere), sị: “Ịdị anya Clauda [ma ọ bụ, Kọda] site na Mọlta eruchaghị kilomita 770. Ndabakọ ahụ dị nnọọ ịrịba ama, nke na o yiri ihe a na-agaghị ekwere ekwere na ala ahụ, bụ́ ebe ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ [rutere] n’abalị nke iri na anọ, pụrụ ịbụ ebe ọzọ ma ọ́ bụghị Mọlta. E nwere ọtụtụ ihe àmà na-egosi nke a.”

Ọ bụ ezie na a pụrụ ikwu ebe ndị ọzọ ọ pụrụ ịbụ na o mere, ụgbọ okpukpu a mere na Mọlta nke e gosiri na map so isiokwu a yiri ka ò kwekọrọ n’ihe ndekọ Bible.

[Map/Foto dị na peeji nke 31]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Jeruselem

Sesaria

Saịdọn

Maịra

Kinaịdọs

KRIT

KỌDA

MỌLTA

SISILI

Sirakus

Rom

MLJET

GRIS

CEPHALONIA