Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Dabeere n’Ume Sitere n’Aka Jehova

Anyị Dabeere n’Ume Sitere n’Aka Jehova

 Akụkọ Ndụ

Anyị Dabeere n’Ume Sitere n’Aka Jehova

DỊ KA ERZSÉBET HAFFNER SI KỌỌ

“M gaghị ekwe ka ha gbaara gị ụgbọ nwa mkpi,” ka Tibor Haffner kwuru mgbe ọ nụrụ na e nyewo m iwu ịhapụ Czechoslovakia. Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Ọ bụrụ na i kwere, m ga-alụ gị, mụ na gị ga-anọkwa ruo mgbe ebighị ebi.”

NA January 29, 1938, nanị izu ole na ole ka nkwa ọlụlụ ahụ m na-atụghị anya ya gasịrị, alụrụ m Tibor, bụ́ Onye Kraịst mbụ gbaara ezinụlọ m àmà. Mkpebi ahụ adịghịrị m mfe. M ka rusịrị nnọọ afọ 18, dịkwa ka onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, achọrọ m iji afọ ntorobịa m jeere nanị Chineke ozi. Ebere m ákwá. Ekpere m ekpere. Ọ bụ nanị mgbe m weturu obi ala ka m ghọtara na nkwa Tibor kwere ịlụ m karịrị nnọọ ngosipụta nke obiọma, abịakwara m nwee ọchịchọ mụ na nwoke a hụrụ m nnọọ n’anya ibi.

Ma gịnị mere m ji nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye a gbaara ụgbọ nwa mkpi? E kwuwerị, ebi m ná mba na-anya isi na ya nwere usoro ọchịchị onye kwuo uche ya na nnwere onwe okpukpe. Echere m na ọ dị mkpa ugbu a ka m kọkwuoro gị banyere nzụlite m.

Nne na nna bụ́ ndị Katọlik Gris mụrụ m na December 26, 1919, n’obodo Sajószentpéter, Hungary, nke dị kilomita 160 site n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ Budapest. N’ụzọ dị mwute, papa m nwụrụ tupu mụ amara ya. N’oge na-adịghị anya, mama m lụrụ nwoke nwunye ya nwụrụ nke ji ụmụ anọ, anyị kwagakwara Lučenec, bụ́ ọmarịcha obodo nke dị n’ebe bụ Czechoslovakia mgbe ahụ. N’afọ ndị ahụ, ibi n’ezinụlọ ebe a lụgharịrị di ma ọ bụ nwunye adịghị mfe. Dị ka onye kasị nta n’ime ụmụaka ise, ọ dị m ka m bụ onye mbịarambịa. Ọnọdụ akụ̀ na ụba anyị dị njọ, ọ bụghịkwa nanị ihe onwunwe kọrọ m, kamakwa, nlebara anya na  ịhụnanya nne na nna ha otú o kwesịrị.

Ọ̀ Dị Onye Maara Azịza Ya?

Mgbe m dị afọ 16, ọtụtụ ajụjụ nyere m nsogbu n’obi. Eji m mmasị dị ukwuu gụọ akụkọ ihe mere eme nke Agha Ụwa nke Abụọ, ogbugbu weere ọnọdụ n’etiti mba ndị mepere anya na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst tụrụ m n’anya. E wezụga nke ahụ, apụrụ m ịhụ mmụba nke nkwadebe agha gburugburu m. Ọ dịghị ihe ọ bụla banyere ya kwekọrọ n’ihe m mụtara na chọọchị banyere ịhụ onye agbata obi n’anya.

Ya mere, agakwuuru m otu onye ụkọchukwu Roman Katọlik ma jụọ ya, sị: “Olee iwu anyị kwesịrị ịgbaso dị ka Ndị Kraịst—ịga agha ma gbuo ndị agbata obi anyị ka ọ̀ bụ ịhụ ha n’anya?” N’ịbụ onye ajụjụ m were iwe, ọ zara na ya na-akụzi ihe ndị isi gwara ya. Ihe yiri nke ahụ mere mgbe m gakwuuru onye ụkọchukwu okpukpe Calvin ma mesịa gakwuru onye rabaị ndị Juu. Enwetaghị m azịza ọ bụla, nanị ihe m nwetara bụ ijuanya ha nwere n’ihi ajụjụ m ha na-adịghị anụkebe. N’ikpeazụ, agakwuuru m onye ụkọchukwu okpukpe Luther. O were iwe ma tupu m laa, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ n’ezie na ị chọrọ ịmata azịza ya, jụọ Ndịàmà Jehova.”

Agbalịrị m ịchọta Ndịàmà ma ahụghị m ha. Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, ka m na-alọta ọrụ, ahụrụ m ka ụzọ anyị ghetụrụ oghe. Otu nwa okorobịa mara mma nọ na-agụrụ mama m Bible. Otu ihe gbabatara m n’uche, ‘Ọ ghaghị ịbụ Onyeàmà Jehova!’ Anyị kpọbatara nwoke a, bụ́ Tibor Haffner, n’ụlọ, ajụghachikwara m ajụjụ m ndị ahụ. Kama ịza ha n’isi, o gosiri m ihe Bible na-ekwu banyere ihe e ji amata ezi Ndị Kraịst, nakwa banyere oge anyị bi n’ime ya.—Jọn 13:34, 35; 2 Timoti 3:1-5.

Ọnwa ole na ole tupu mụ eruo afọ 17, e mere m baptizim. Echere m na onye ọ bụla kwesịrị ịnụ eziokwu a dị oké ọnụ ahịa nke m chọsiri ike tupu m chọta ya. Amalitere m ime nkwusa oge nile, bụ́ nke na-ama nnọọ aka na Czechoslovakia ná ngwụsị afọ ndị 1930. Ọ bụ ezie na e debara ọrụ anyị n’akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro, anyị nwetara mmegide siri ike bụ́ nke ndị ụkọchukwu kpalitere.

Mkpagbu Mbụ M Nwetara

Otu ụbọchị, ná ngwụsị nke afọ 1937, mụ na nwanna nwanyị ọzọ bụ́ Onye Kraịst nọ na-eme nkwusa n’otu obodo nta dịdewere Lučenec. N’oge na-adịghị anya, e jidere anyị ma kpọga anyị n’ụlọ mkpọrọ. “Unu ga-anwụ ebe a,” ka otu onye nche kwuru ka ọ na-akwachi ọnụ ụzọ ụlọ nga anyị n’ike.

Ka ọ na-erule uhuruchi, anyị nwetakwuru mmadụ anọ ọzọ anyị na ha ga-anọ n’otu ọnụ ụlọ nga. Anyị malitere ịkasi ha obi na ịgbara ha àmà. Ha weturu obi ala, anyị jiri abalị ahụ nile soro ha kerịta eziokwu Bible.

N’elekere anya isii nke ụtụtụ, onye nche ahụ kpọpụtara m n’ụlọ nga. Agwara m onye ibe m, sị: “Anyị ga-ahụ ọzọ n’Alaeze Chineke.” Agwara m ya ka ọ kọọrọ ndị ezinụlọ m ihe merenụ ma ọ bụrụ na ọ lanarịrị. Ekpere m ekpere n’obi m ma soro onye nche ahụ pụọ. Ọ kpọọrọ m gaa n’ụlọ ya dị n’ogige ụlọ mkpọrọ ahụ. “Enwere m ajụjụ ụfọdụ ndị m ga-ajụ gị, nwatakịrị,” ka o kwuru. “N’abalị, i kwuru na aha Chineke bụ Jehova. Ị̀ pụrụ igosi m nke ahụ n’ime Bible?” Lee ihe ijuanya na ahụ́ efe ọ bụ! O wetara Bible ya, egosikwara m ya na nwunye ya aha ahụ bụ́ Jehova. Ọ jụkwara ajụjụ ndị ọzọ n’ihe ndị metụtara ihe ndị anyị na ụmụ nwanyị anọ ahụ kwurịtara n’abalị. N’ịbụ onye azịza ndị ahụ juru afọ, ọ gwara nwunye ya ka ọ kwadebere mụ na onye ibe m nri ụtụtụ.

Ụbọchị ole na ole ka e mesịrị, a tọhapụrụ anyị ma ọkàikpe kpebiri na ebe ọ bụ na m bụ nwa amaala Hungary, na m ga-ahapụ Czechoslovakia. Ọ bụ mgbe ihe a mesịrị ka Tibor  Haffner gwara m ka m ghọọ nwunye ya. Anyị lụrụ, akwagakwara m n’ụlọ ndị mụrụ ya.

Mkpagbu Aka Njọ

Anyị nọgidere n’ọrụ nkwusa dị ka di na nwunye, ọ bụ ezie na Tibor nwekwara ọrụ nhazi ụfọdụ. Nanị ụbọchị ole na ole tupu ndị agha Hungary abata n’obodo anyị na November 1938, a mụrụ nwa anyị nwoke, bụ́ Tibor nke Nta. Na Europe, Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-eru ka mmiri. Hungary weghaara akụkụ buru ibu nke Czechoslovakia, na-ewetakwuru Ndịàmà Jehova bi n’ebe ndị ahụ ha jichiri mkpagbu.

N’October 10, 1942, Tibor gawara Debrecen iso ụfọdụ ụmụnna nwee nzukọ. Otú ọ dị, ọ lọtaghị na nke a. Ka e mesịrị, ọ kọọrọ m ihe merenụ. Kama ịbụ ụmụnna, ọ bụ ụfọdụ ndị uwe ojii jiri ejiji dị ka ndị ọrụ nọ n’àkwà mmiri bụ́ ebe a ga-enwe nzukọ ahụ. Ha nọ na-eche di m na Pál Nagypál, bụ́ ndị ikpeazụ bịaranụ. Ndị uwe ojii ahụ kpọgara ha n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ma were okpiri na-akụ ha n’ụkwụ nkịtị ruo mgbe ha tụbọrọ n’ihi ihe ụfụ.

E nyeziri ha iwu ka ha yiri buutu ha ma kwụrụ ọtọ. N’agbanyeghị ihe ụfụ ahụ, a manyere ha ịga n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Ndị uwe ojii kpọpụtara nwoke ọzọ nke e ji bandeeji kechie isi ya nke na o siiri ya ike ịhụ ụzọ. Onye a bụ Nwanna András Pilling, onye bịakwara nzukọ ahụ. E jiri ụgbọ okporo ígwè buga di m n’Alag, nke dịdewere Budapest, bụ́ ebe a kpọchiri ya. Otu n’ime ndị nche nke hụrụ ụkwụ Tibor a kụjasịrị akụjasị kwuru n’ụzọ mkparị, sị: “Lee nnọọ otú ndị mmadụ si dị obi ọjọọ! Enyela onwe gị nsogbu, anyị ga-agwọ gị.” Ndị nche abụọ ọzọ malitere iti Tibor ihe n’ụkwụ, na-efesasị ọbara ebe nile. Mgbe minit ole na ole gasịrị, ọ tụbọrọ.

N’ọnwa na-esonụ, e kpere Tibor na ihe karịrị ụmụnna nwoke na ndị nwanyị 60 ọzọ ikpe. A mara ụmụnna ndị dị ka András Bartha, Dénes Faluvégi, na János Konrád ikpe nkwụgbu. A mara Nwanna András Pilling ikpe ịga nga mkpụrụ ọka, a mara di m ikpe ịga mkpọrọ afọ 12. Gịnị ka ha mere? Ọkàiwu na-ekpegide ha boro ha ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru, ịjụ ije agha, ịbụ ndị nledo, na ikwutọ chọọchị kasị dị nsọ. E mesịrị gbanwee ọmụma ikpe nke ndị a mara ikpe ọnwụ ịbụ nga mkpụrụ ọka.

Iso Di M

Ụbọchị abụọ ka Tibor gasịrị nzukọ ahụ na Debrecen, etetara m ụra tupu elekere anya isii akụọ, na-ede ákwà anyị. Na mberede, e suru aka n’ọnụ ụzọ. ‘Abịala ha,’ ka m chere. Ndị uwe ojii isii batara ma gwa m na e nyere ha ikike inyocha ụlọ anyị. E jichiri mmadụ nile nọ n’ụlọ anyị ma kpọga ha n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, tinyere nwa anyị nwoke dị afọ atọ. N’otu ụbọchị ahụ, a kpọgara anyị n’ụlọ mkpọrọ dị na Pétervására, Hungary.

Mgbe anyị rutere, ahụ́ ọkụ malitere ime m, ha kewapụrụ m n’ebe ndị mkpọrọ ibe m nọ. Mgbe m gbakere, ndị agha abụọ batara n’ọnụ ụlọ nga m, na-ese okwu n’ihi m. “Anyị aghaghị ịgbagbu ya! M ga-agbagbu ya!” ka otu kwuru. Ma nke ọzọ chọrọ ịmata ọnọdụ ahụ́ ike m tupu ha emee ihe ha chọrọ ime. Arịọrọ m ha ka ha hapụ m ndụ. Ha mesịrị pụọ n’ọnụ ụlọ nga m, ekelekwara m Jehova maka inyere m aka.

Ndị nche ahụ nwere ụzọ pụrụ iche ha si agba ajụjụ ọnụ. Ha nyere m iwu ịmakpuru ala ma kpudo ihu n’ala, ha tinyere sọks n’ọnụ m, kechie m aka na ụkwu, ha pịakwara m ihe ruo mgbe ọbara gbawara m. Ha kwụsịrị nanị mgbe otu n’ime ndị agha ahụ sịrị na ike agwụla ya. Ha jụrụ m onye di m gara ịhụ n’ụbọchị ahụ ha jidere ya. Agwaghị m ha, n’ihi ya, a  nọgidere na-eti m ihe ruo ụbọchị atọ. N’ụbọchị nke anọ, e nyere m ohere ịkpọgara nne m nwa m nwoke. N’oké oyi, akwọọrọ m obere nwa m n’azụ m ọnyá juru ma gaa ije ihe ruru kilomita 13 iji ruo n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Site n’ebe ahụ, agbara m ụgbọ okporo ígwè iji ruo ụlọ, ma aghaghị m ịlaghachi n’ogige ụlọ mkpọrọ ahụ n’otu ụbọchị ahụ.

A mara m ikpe ịga mkpọrọ afọ isii na Budapest. Mgbe m bịarutere, anụrụ m na Tibor nọkwa ebe ahụ. Lee obi ụtọ anyị nwere mgbe e nyere anyị ohere ikwurịta okwu, ọ bụ ezie na ọ bụ ruo nanị minit ole na ole site ná mgbidi e ji ígwè rụọ! Anyị abụọ nwetara ịhụnanya Jehova, oge ndị a dị oké ọnụ ahịa wusikwara anyị ike. Tupu anyị ahụ ọzọ, anyị abụọ aghaghị ịgabiga ule ndị tara akpụ, jiri obere ihe na-alagbụrụ ọnwụ ugboro ugboro.

Site n’Ụlọ Mkpọrọ Gaa n’Ụlọ Mkpọrọ

Anyị dị ihe dị ka ụmụnna nwanyị 80 a kwakpuru n’otu ọnụ ụlọ nga. Agụụ nri ime mmụọ gụsiri anyị ike, ma iwebata ihe ọ bụla n’ụlọ mkpọrọ ahụ yiri ihe na-apụghị ikwe omume. Ànyị pụrụ inweta ihe ọ bụla site n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ? Ka m kọọrọ gị ihe anyị mere. Ewepụtara m onwe m ịrụziri ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ akpụkpọ ụkwụ. Etinyere m mpempe akwụkwọ iji rịọ ka e nye m nọmba Bible dị n’ọ́bá akwụkwọ ụlọ mkpọrọ ahụ n’ime otu akpụkpọ ụkwụ. Iji mee ka a ghara inyowe m enyowe, etinyekwuru m aha akwụkwọ abụọ ọzọ.

N’ụbọchị na-esonụ, ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ ahụ kpoteere m akpụkpọ ụkwụ ndị ọzọ. E tinyere azịza nke arịrịọ m n’ime otu n’ime ha. Enyeziri m onye nche nọmba ndị ahụ ma rịọ ya ka o wetara anyị akwụkwọ ndị ahụ. Lee ọṅụ anyị nwere mgbe anyị nwetara akwụkwọ ndị ahụ, gụnyere Bible! Anyị gbanwere akwụkwọ ndị nke ọzọ kwa izu, ma anyị debere Bible ahụ. Mgbe ọ bụla onye nche ahụ jụrụ banyere ya, anyị na-agwa ya mgbe nile, sị: “Ọ bụ akwụkwọ buru ibu, onye ọ bụla chọkwara ịgụ ya.” N’ụzọ dị otú a anyị gụrụ Bible.

Otu ụbọchị, otu ọfịsa kpọrọ m òkù n’ọfịs ya. Ọ kpasoro m nnọọ àgwà obiọma otú ọ na-adịghị emebu.

“Oriakụ Haffner, enwere m ozi ọma izi gị,” ka o kwuru. “Ị pụrụ ịla. Ikekwe echi. Ọ bụrụ na e nwee ụgbọ okporo ígwè na-aganụ, ị pụrụ ịla ọbụna taa.”

“Nke ahụ ga-amagbu onwe ya,” ka m zaghachiri.

“N’ezie, ọ ga-amagbu onwe ya,” ka o kwuru. “I nwere nwa, echekwara m na ị ga-achọ ịzụ ya.” Ọ gbakwụnyeziri, sị, “Nanị ihe ị ga-eme bụ ịbịanye aka n’akwụkwọ ozi a.”

“Gịnị ka ọ bụ?” ka m jụrụ.

“Enyela onwe gị nsogbu banyere ya,” ka ọ nọgidere na-ekwu. “Nanị ihe ị ga-eme bụ ịbịanye aka na ya, ị ga-alakwa.” Mgbe ahụ, ọ gwara m, sị: “Ozugbo ị lara, mewe ihe ọ bụla masịrị gị. Ma ugbu a, ị ghaghị ịbịanye aka na ị bụkwaghị otu n’ime Ndịàmà Jehova.”

Alara m azụ ma jụwaa isi.

“Ya bụrụ otú ahụ, ị ga-anwụ ebe a!” ka o ji iwe tie ná mkpu ma kpọpụ m.

Na May 1943, a kpọgara m n’ụlọ mkpọrọ ọzọ dị na Budapest, mesịakwa kpọga m n’obodo Márianosztra, bụ́ ebe anyị na ihe dị ka ndị nọn 70 biri n’ebe obibi ndị nọn. N’agbanyeghị agụụ na ihe isi ike ndị ọzọ, anyị chọsiri ike iso ha kerịta olileanya anyị. Otu n’ime ndị nọn ahụ gosiri ezigbo mmasị n’ozi anyị ma kwuo, sị: “Ihe ndị a amaka. Anụtụbeghị m ihe yiri nke a. Biko kọkwuoronụ m.” Anyị gwara ya banyere ụwa ọhụrụ na ndụ magburu onwe ya a ga-ebi na ya. Ka anyị nọ na-ekwu okwu, onyeisi ndị mọda bịara. A kpọpụrụ  onye nọn ahụ nwere mmasị ozugbo, yipụ ya uwe ya, ma pịakasịa ya ahụ́. Mgbe anyị zutere ya ọzọ, ọ rịọrọ, sị: “Biko, na-ekpegaranụ Jehova ekpere ka ọ zọpụta m ma kpọpụ m n’ebe a. Achọrọ m ịbụ otu n’ime unu.”

Ebe ọzọ a kpọgara anyị bụ n’ụlọ mkpọrọ ochie dị na Komárom, bụ́ obodo dị n’Osimiri Danube, nke dị kilomita 80 n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Budapest. Ọnọdụ obibi ndụ dị nnọọ njọ. Dị ka ọ dị ụmụnna nwanyị ndị nke ọzọ, arịarịa m oké ịba ahụ́ ọkụ, na-agbọ ọbara ma gharazie inwe ume. Anyị enweghị ọgwụ ọ bụla, echekwara m na m ga-anwụ. Ma mgbe ahụ, ndị isi ndị nche nọ na-achọ onye pụrụ ịrụ ọrụ n’ọfịs. Ụmụnna nwanyị ahụ kpọrọ aha m. N’ihi ya, e nyere m ọgwụ, agbakekwara m.

E Jikọtaghachi Mụ na Ezinụlọ M

Ka usuu ndị agha Soviet si akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ na-abịa, a manyere anyị ịga n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ. Ịkọcha ọnọdụ ọjọọ nile anyị gabigara ga-abụ ogologo akụkọ. Eruru m n’ọnụ ọnwụ ọtụtụ ugboro, ma n’ihi nchebe Jehova, alanarịrị m. Mgbe agha biri, anyị nọ n’obodo Czechoslovakia bụ́ Tábor, nke dị kilomita 80 site na Prague. O were ihe dị ka izu atọ ọzọ tupu mụ na nwanne di m nke nwanyị bụ́ Magdalena alaruo n’ụlọ anyị na Lučenec, na May 30, 1945.

Site n’ebe dị anya apụrụ m ịhụ nne di m na nwa m nwoke m hụrụ n’anya, bụ́ Tibor, n’èzí. Anya mmiri juru m anya, akpọkwara m ya, “Tibike!” Ọ gbaara ọsọ bịa makụọ m. “Ị gaghị apụ ọzọ, ka ị̀ ga-apụ, Mama?” Ihe a bụ ihe mbụ ọ gwara m, agaghịkwa m echefu ya echefu.

Jehova mekwaara di m, bụ́ Tibor, ebere. Site n’ụlọ mkpọrọ dị na Budapest, e zigara ya na ụmụnna nwoke ndị ọzọ ruru 160 n’ogige ọrụ mmanye dị na Bor. Ọtụtụ mgbe ha ruru n’ọnụ ọnwụ, ma dị ka otu ìgwè, e chebere ha ndụ. Tibor lọtara n’April 8, 1945, ihe dị ka otu ọnwa tupu mụ alọta.

Mgbe agha ahụ bisịrị, ume Jehova dịkwa anyị mkpa iji lanarị ule nile anyị ga-enweta n’afọ 40 ga-esonụ n’okpuru ọchịchị Kọmunist na Czechoslovakia. A makwara Tibor ikpe ọzọ ịga mkpọrọ ogologo oge, aghaghịkwa m ilekọta nwa anyị nwoke n’enweghị enyemaka ya. Mgbe a tọhapụsịrị ya, Tibor jere ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. N’ime afọ 40 nke Ọchịchị Kọmunist, anyị jiri ohere ọ bụla soro ndị ọzọ kerịta okwukwe anyị. Anyị nyeere ọtụtụ ndị aka ịmụta eziokwu ahụ. Ha si otú a ghọọ ụmụ ime mmụọ anyị.

Lee ọṅụ ọ bụ mgbe anyị nwetara nnwere onwe okpukpe na 1989! N’afọ sochirinụ, anyị gara mgbakọ distrikti mbụ e nwere ná mba anyị ka ogologo oge gasịrị. Mgbe anyị hụrụ ọtụtụ puku ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị nọgideworo na-eguzosi ike n’ezi ihe ruo ọtụtụ iri afọ, anyị maara na Jehova bụ isi iyi dị ike nke ume nye ha nile.

Di m m hụrụ n’anya, bụ́ Tibor, nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’October 14, 1993, ugbu a ebidịdewekwara m nwa m nwoke na Žilina, Slovakia. Adịchaghịzi m ike n’ụzọ anụ ahụ́, ma mmụọ m siri ike n’ihi ike Jehova na-enye. Enweghị m nnọọ obi abụọ ọ bụla na m pụrụ ịtachi obi n’ule ọ bụla n’usoro ihe ochie a n’ihi ike ọ na-enye. Ọzọkwa, ana m elepụ anya n’oge mgbe m ga-enwe ike ịdị ndụ ebighị ebi site n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova.

[Foto dị na peeji nke 20]

Nwa m nwoke bụ́ Tibor nke Nta, (mgbe ọ dị afọ 4) bụ́ onye m hapụrụ

[Foto dị na peeji nke 21]

Tibor nke Ukwu, na ụmụnna nwoke ndị ọzọ na Bor

[Foto dị na peeji nke 22]

Mụ na Tibor na Magdalena, nwanne di m nke nwanyị, na 1947, na Brno

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Eruru m n’ọnụ ọnwụ ọtụtụ ugboro, ma n’ihi nchebe Jehova, alanarịrị m