Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchọ A Na-achọ Ezi Ọchịchị

Ọchịchọ A Na-achọ Ezi Ọchịchị

 Ọchịchọ A Na-achọ Ezi Ọchịchị

“Ndabere na-arịwanye elu mba dị iche iche na-adabere n’ebe ibe ha dị akpalitewo ọtụtụ nsogbu ndị zuru ụwa ọnụ bụ́ ndị mba dị iche iche n’otu n’otu na-apụghịzi idozi n’onwe ha. Ọ bụ nanị site ná mba nile ịgbakọ aka ka anyị pụrụ ịnagide ihe ize ndụ na ihe ịma aka ndị na-arịwanye elu bụ́ ndị ihe a kpọrọ mmadụ na-eche ihu.”—Ghulam Umar, onye Pakistan bụ́ ọkà ná nnyocha ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

ỤWA taa jupụtara n’ọnọdụ ndị na-emegiderịta onwe ha. N’agbanyeghị na e nwere ụbara ihe oriri, ọtụtụ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ tupu ha enweta ihe ha ga-eri. Ọgbọ kọmputa a pụrụ n’ezie ịbụ ọgbọ kasị gụọ akwụkwọ na nke kasị nwee ihe ọmụma e nwetụrụla, n’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-esiri ọtụtụ mmadụ ike inweta ọrụ na-adịgide adịgide. Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ yiri ka hà nweere onwe ha karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ọtụtụ nde mmadụ na-ebi n’ụjọ na amaghị ihe echi ga-eweta. Ọ pụrụ ịbụ na ọrụ ndị na-adọrọ adọrọ gbara anyị gburugburu, ma nrụrụ aka na mmebi iwu ndị a na-ahụ n’ogo nile nke ọha na eze akpataworo ọtụtụ ndị ndakpọ olileanya.

Nsogbu ndị ihe a kpọrọ mmadụ na-eche ihu buru nnọọ ibu nke na ọ karịrị ihe otu mba, ma ọ bụ ọbụna ìgwè mba dị iche iche, pụrụ idozi. N’ihi ya, ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-ahụ ihe na-emenụ ekwubiwo na ka udo na ịnọ ná nchebe zuru ụwa ọnụ bụrụ ihe ga-ekwe omume, mba nile aghaghị ịbịakọta ọnụ n’okpuru otu ọchịchị. Dị ka ihe atụ, Albert Einstein, kwalitere echiche dị otú ahụ ogologo oge gara aga. Na 1946, o kwuru, sị: “Ekwenyesiri m ike na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ n’ụwa ga-ahọrọ ibi n’udo na nchebe . . . Ọchịchọ ihe a kpọrọ mmadụ maka udo pụrụ imezu nanị site n’ikepụta otu ọchịchị ga-achị ụwa nile.”

Ka ihe karịrị afọ iri ise gafesịworo, e gbobeghị oké mkpa a. N’idepụta ihe ịma aka nke narị afọ nke 21, otu nkọwa dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Monde nke Paris, France, na-ekwu, sị: “Ihe dị mkpa bụ ịtọ ntọala maka usoro ikpe, usoro nduzi, na usoro iwu nke ọchịchị ga-achị mba nile nke ga-enwe ike ịgbata ọsọ enyemaka ozugbo, n’ebe ọ bụla n’ụwa, mgbe e nwere mgbukpọ agbụrụ. Ọ bụ ịnabata echiche bụ́ na site n’ugbu a gaa n’ihu, Ụwa bụ otu mba.” Ònye ma ọ bụ gịnị nwere ike na ikike imezu nke a iji hụ na ihe a kpọrọ mmadụ nwetara ọdịnihu udo?

Òtù Mba Ndị Dị n’Otu Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta Ya?

Ọtụtụ etinyewo olileanya ha maka udo ụwa n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu. Òtù UN ọ̀ bụ ọchịchị nke pụrụ iweta ezi udo na nchebe n’ụwa? Obi abụọ adịghị ya na e nwere ọtụtụ okwu ire ụtọ ndị na-akpali akpali ma na-enye olileanya. Dị ka ihe atụ, ná “Nkwupụta Narị Afọ Iri” ya nke 2000, Nzukọ Ezumezu nke Òtù Mba Ndị Dị  n’Otu mere mkpebi a siri ike: “Anyị ga-eme ike anyị nile iji napụta ndị anyị n’ihe otiti nke agha, ma ọ bụ n’ime otu mba ma ọ bụ n’etiti mba na mba, bụ́ nke laworo ndụ nde mmadụ 5 n’iyi n’afọ iri gara aga.” Nkwupụta dị otú ahụ ewetaworo òtù UN otuto na nkwanye ùgwù site n’aka ọtụtụ ndị, tinyere Ihe Nrite Nobel Maka Ime Udo na 2001. N’ịkwanyere òtù UN ùgwù, Kọmitii Na-ahụ Maka Ihe Nrite Nobel na Norway kwuru na “òtù Mba Ndị Dị n’Otu bụ nanị òtù pụrụ iweta udo na mgbakọ aka zuru ụwa ọnụ.”

N’agbanyeghị ihe a nile, òtù Mba Ndị Dị n’Otu, bụ́ nke e hiwere na 1945, ọ̀ bụrụwo ọchịchị nke nwere ike iweta ezi udo ụwa nke na-adịgide adịgide? Ee e, n’ihi na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na oké ọchịchọ nke mba ndị mejupụtara ya emewo ka ọtụtụ n’ime mgbalị ya kụọ afọ n’ala. Echiche ndị mmadụ n’ozuzu nwere, n’iji okwu nke otu onye nchịkọta akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ mee ihe, bụ na òtù UN adịghị ihe ọzọ ọ bụ karịa “nchịkọta nke echiche e nwere gburugburu ụwa,” nakwa na “ọtụtụ isiokwu ndị ha na-atụle bụ ndị a rụworo ụka n’elu ha ruo ọtụtụ afọ n’enwetabeghị ihe ngwọta ha.” Ajụjụ ka bụ: Mba nile nke ụwa hà ga-adị n’otu n’ezie otu ụbọchị?

Bible na-ekpughe na a ga-enwe ịdị n’otu dị otú ahụ n’oge na-adịghị anya. Olee otú nke a ga-esi mee? Oleekwa ọchịchị ga-eme ka nke ahụ mee? Iji nweta azịza ha, biko gụọ isiokwu na-esonụ.

[Foto dị na peeji nke 3]

Einstein kwalitere echiche bụ́ na e nwere mkpa nke inwe otu ọchịchị ga-achị ụwa

[Ebe E Si Nweta Foto]

Einstein: Foto U.S. National Archives