Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Iwu Jehova’ Ọ̀ Na-atọ Gị Ụtọ?

‘Iwu Jehova’ Ọ̀ Na-atọ Gị Ụtọ?

 ‘Iwu Jehova’ Ọ̀ Na-atọ Gị Ụtọ?

‘Onye ihe na-agara nke ọma [ma ọ bụ, “onye obi ụtọ”] ka mmadụ ahụ bụ nke ihe ụtọ ya dị n’iwu Jehova.’—ABỤ ỌMA 1:1, 2.

1. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee obi ụtọ dị ka ndị ohu Jehova?

JEHOVA na-akwado ma na-agọzi anyị dị ka ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe. N’eziokwu, anyị na-eche ọtụtụ ọnwụnwa ihu. Otú ọ dị, anyị na-enwekwa ezi obi ụtọ. Nke a abụghị ihe ijuanya n’ihi na anyị na-ejere “Chineke onye obi ụtọ” ozi, mmụọ nsọ ya na-amịpụtakwa ọṅụ n’ime obi anyị. (1 Timoti 1:11; Ndị Galeshia 5:22) Ọṅụ bụ ezi obi ụtọ na-abịa site n’atụmanya ma ọ bụ nnweta nke ihe dị mma. Nna anyị nke eluigwe na-enyekwa anyị ezi onyinye n’ezie. (Jems 1:17) Ka a sịkwa ihe mere anyị ji nwee obi ụtọ!

2. Olee abụ ọma ndị anyị ga-atụle?

2 A kpọtụrụ obi ụtọ ma ọ bụ ihe ịga nke ọma aha ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ Abụ Ọma. Dị ka ihe atụ, nke a bụ eziokwu banyere Abụ Ọma nke 1 na nke 2. Ụmụazụ Jizọs Kraịst n’oge mbụ kwuru na ọ bụ Eze Devid nke Izrel dere abụ ọma nke abụọ. (Ọrụ 4:25, 26) Onye rọrọ abụ ọma nke mbụ, bụ́ onye a na-akpọghị aha, ji okwu ndị a malite abụ ya nke o dere n’ike mmụọ nsọ: “Onye ihe na-agara nke ọma [ma ọ bụ, “onye obi ụtọ”] ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.” (Abụ Ọma 1:1) Ka anyị hụ n’isiokwu a na na nke na-eso ya, otú Abụ Ọma nke 1 na nke 2 si agwa anyị ihe mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ.

Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ

3. Dị ka Abụ Ọma 1:1 si kwuo, gịnị bụ ụfọdụ ihe mere onye na-asọpụrụ Chineke ji enwe obi ụtọ?

3 Abụ Ọma nke 1 na-egosi ihe mere onye na-asọpụrụ Chineke ji enwe obi ụtọ. N’ikwu ihe mere e ji nwee obi ụtọ dị otú ahụ, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma [ma ọ bụ, “onye obi ụtọ”] ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu, nke na-eguzoghịkwa n’ụzọ ndị mmehie, nke na-anọghịkwa n’ọnọdụ ndị na-akwa emo.”—Abụ Ọma 1:1.

4. Ụzọ ndụ dị aṅaa kwesịrị nṅomi ka Zekaraịa na Elizabet gbasoro?

4 Iji nwee obi ụtọ n’ezie, anyị aghaghị ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Jehova. Zekaraịa na Elizabet, bụ́ ndị nwere ihe ùgwù na-enye ọṅụ nke ịghọ nne na nna Jọn Onye Na-eme Baptizim, “bụ ndị ezi omume n’ihu Chineke n’ihi ije ije n’ụzọ na-enweghị ụta n’ikwekọ n’ihe nile Jehova nyere n’iwu na ihe ndị ọ chọrọ n’iwu.” (Luk 1:5, 6) Anyị pụrụ inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị agbasoo ụzọ ndụ yiri nke ha ma jụwaa isi ‘ije ije na ndụmọdụ nke ndị na-emebi iwu’ ma ọ bụ jụ ịbụ ndị ndụmọdụ ha ndị na-ekwekọghị n’iwu Chineke na-eduzi.

5. Gịnị pụrụ inyere anyị aka izere ‘ụzọ ndị mmehie’?

5 Ọ bụrụ na anyị na-ajụ echiche ndị na-emebi  iwu, anyị agaghị ‘na-eguzo n’ụzọ ndị mmehie.’ N’ezie, a gaghị ahụ anyị n’ụzọ nkịtị n’ebe ha na-anọkarị—n’ebe a na-eme ihe ntụrụndụ rụrụ arụ ma ọ bụ n’ebe ndị a na-enyo enyo. Gịnị ma ọ bụrụ na a nwaa anyị isonyere ndị mmehie n’omume ha nke Akwụkwọ Nsọ katọrọ? Mgbe ahụ, ka anyị kpee ekpere maka enyemaka Chineke iji mee ihe kwekọrọ n’okwu Pọl onyeozi: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu n’ụzọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee mkpakọrịta ezi omume na mmebi iwu nwere? Ma ọ bụ olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?” (2 Ndị Kọrint 6:14) Ọ bụrụ na anyị adabere n’ebe Chineke nọ ma “dị ọcha n’obi,” anyị ga-ajụ mmụọ na ụzọ ndụ nke ndị mmehie, anyị ga-enwekwa ebumnobi na ọchịchọ dị ọcha, ya na ‘okwukwe na-enweghị ihu abụọ.’—Matiu 5:8; 1 Timoti 1:5.

6. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnọ na nche banyere ndị na-akwa emo?

6 Iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ, anyị agaghị anwa anwa ‘nọrọ n’ọnọdụ ndị na-akwa emo.’ Ụfọdụ na-akwa nsọpụrụ Chineke n’onwe ya emo, ma ‘n’ụbọchị ikpeazụ’ ndị a, ndị bụ́bu Ndị Kraịst bụ́ ndị siworo n’ezi ofufe dapụ na-egosipụtakarị nlelị n’ịkwa emo ha. Pita onyeozi dọrọ ndị kwere ekwe ibe ya aka ná ntị, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, . . . unu bu ụzọ mara nke a, na n’ụbọchị ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa, na-aga n’ihu dị ka ọchịchọ nke aka ha si dị ma na-asị: ‘Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị? Leenụ, site n’ụbọchị nna nna anyị ha dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide kpọmkwem dị ka hà dị site ná mmalite nke ihe e kere eke.’” (2 Pita 3:1-4) Ọ bụrụ na ‘anyị anọdụghị ma ọlị n’ọnọdụ ndị na-akwa emo,’ anyị ga-ezere ọdachi nke na-aghaghị ịdakwasị ha.—Ilu 1:22-27.

7. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iburu okwu ndị dị n’Abụ Ọma 1:1 n’uche?

7 Ọ gwụla ma anyị buuru okwu mmalite nke Abụ Ọma nke 1 n’uche, anyị pụrụ ịtụfu ọnọdụ ime mmụọ anyị nwetaworo site n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ. N’ezie, ọnọdụ anyị pụziri ịka njọ. Anyị pụrụ ịmalite ịdaghachi azụ ma ọ bụrụ na anyị agbasoo ndụmọdụ ndị na-emebi iwu. Mgbe ahụ, anyị pụrụ iso ha na-akpachi anya. Ka oge na-aga, anyị pụrụ ịghọ ndị na-enweghị okwukwe si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị na-akwa emo. N’ụzọ doro anya, ime ndị na-emebi iwu enyi pụrụ iwulite n’ime anyị mmụọ nke asọpụrụghị Chineke, ọ pụkwara ibibi mmekọrịta anyị na Jehova Chineke. (1 Ndị Kọrint 15:33; Jems 4:4) Ka anyị ghara ikwe ka nke ahụ mee anyị ma ọlị!

8. Gịnị ga-enyere anyị aka ime ka uche anyị dịgide n’ihe ime mmụọ?

8 Ekpere ga-enyere anyị aka itinye uche anyị  n’ihe ime mmụọ na izere iso ndị na-emebi iwu na-akpakọrịta. “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla,” ka Pọl dere, “kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” Onyeozi ahụ gbara ume ka anyị na-atụle ihe ndị bụ́ eziokwu, ihe ndị kwesịrị nchebara echiche, ihe ndị bụ́ ezi omume, ihe ndị dị ọcha, ihe ndị na-akpali ịhụnanya, ihe ndị a na-ekwu okwu ọma banyere ha, omume ọma, na ihe kwesịrị otuto. (Ndị Filipaị 4:6-8) Ka anyị mee ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl ma ghara ma ọlị ịdị ka ndị na-emebi iwu.

9. Ọ bụ ezie na anyị na-ezere mmebi iwu, olee otú anyị si agbalị inyere ụdị mmadụ nile aka?

9 Ọ bụ ezie na anyị na-ajụ mmebi iwu, anyị na-eji nkà agbara ndị ọzọ àmà, ọbụna dị ka Pọl onyeozi gwara Gọvanọ Filiks nke Rom “banyere ezi omume na njide onwe onye na ikpe nke na-abịanụ.” (Ọrụ 24:24, 25; Ndị Kọlọsi 4:6) Anyị na-ekwusara ụdị mmadụ nile ozi ọma nke Alaeze ahụ, anyị na-emesokwa ha ihe n’ụzọ obiọma. Anyị nwere obi ike na “ndị nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi” ga-aghọ ndị kwere ekwe ma bụrụ ndị iwu Chineke na-atọ ụtọ.—Ọrụ 13:48.

Iwu Jehova Na-atọ Ya Ụtọ

10. Gịnị ga-enye aka mee ka ihe anyị na-amụ dịgide n’uche na n’obi anyị n’oge ọmụmụ ihe onwe onye?

10 Banyere onye nwere obi ụtọ, ọbụ abụ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “N’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.” (Abụ Ọma 1:2) Dị ka ndị ohu Chineke, ‘iwu Jehova na-atọ anyị ụtọ.’ Mgbe o kwere omume, n’oge ọmụmụ ihe onwe onye na mgbe anyị na-atụgharị uche, anyị pụrụ ‘ịtụgharị uche n’ihe anyị na-agụ,’ na-agụpụta ya agụpụta. Ime nke a mgbe anyị na-agụ akụkụ ọ bụla nke Akwụkwọ Nsọ ga-enye aka ime ka ọ dịgide n’uche na n’obi anyị.

11. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịdị na-agụ Bible “ehihie na abalị”?

11 “Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” agbawo anyị ume ịgụ Bible kwa ụbọchị. (Matiu 24:45) N’ihi ọchịchọ siri ike anyị nwere ịghọta ozi Jehova maka ihe a kpọrọ mmadụ nke ọma karị, anyị pụrụ ịdị na-agụ Bible “ehihie na abalị”—ee, ọbụna mgbe anyị na-enweghị ike ihi ụra n’ihi ihe ụfọdụ. Pita gbara anyị ume, sị: “Dịkwa ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, zụlitenụ agụụ maka mmiri ara a na-agwagbughị agwagbu nke dịịrị okwu ahụ, ka unu wee site na ya toruo nzọpụta.” (1 Pita 2:1, 2) Ọ̀ na-atọ gị ụtọ ịgụ Bible kwa ụbọchị na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke na nzube ya n’abalị? Ọ tọrọ ọbụ abụ ahụ ụtọ.—Abụ Ọma 63:6.

12. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na iwu Jehova na-atọ anyị ụtọ?

12 Obi ụtọ ebighị ebi anyị dabeere n’iwu Chineke ịtọ anyị ụtọ. O zuru okè ma zie ezie, a na-enwetakwa ọkpụkpụ ọrụ hiri nne n’idebe ya. (Abụ Ọma 19:7-11) Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Onye na-enyonye anya n’iwu ahụ zuru okè nke dịịrị nnwere onwe, onye na-anọgidekwa na ya, onye a, n’ihi na ọ ghọwo, ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama onye na-arụ ọrụ ahụ, ga-enwe obi ụtọ na ọ na-arụ ya.” (Jems 1:25) Ọ bụrụ na iwu Jehova na-atọ anyị ụtọ n’ezie, otu  ụbọchị agaghị agafe ka anyị ghara ịtụle ihe ime mmụọ. N’ezie, a ga-akpali anyị ‘inyocha ihe ndị miri emi nke Chineke’ na idebe ihe ndị metụtara Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ.—1 Ndị Kọrint 2:10-13; Matiu 6:33.

Ọ Na-adị Ka Osisi

13-15. N’echiche dị aṅaa ka anyị pụrụ ịdị ka osisi a kụrụ n’akụkụ isi iyi mmiri jupụtara?

13 N’ịga n’ihu n’ịkọwa onye ezi omume, ọbụ abụ ahụ na-ekwu, sị: “Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” (Abụ Ọma 1:3) Dị ka ndị ọzọ nile na-ezughị okè, anyị bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi na-enwe ihe isi ike ná ndụ. (Job 14:1) Anyị pụrụ inweta mkpagbu na ọnwụnwa ndị ọzọ dịgasị iche bụ́ ndị metụtara okwukwe anyị. (Matiu 5:10-12) Otú ọ dị, site n’enyemaka Chineke, anyị nwere ike idi ule ndị a n’ụzọ gara nke ọma, dị nnọọ ka osisi ahụ́ dị mma na-alanarị ifufe na-efesi nnọọ ike.

14 Osisi a kụrụ n’akụkụ isi iyi na-adịghị ata ata adịghị akpọnwụ n’oge okpomọkụ ma ọ bụ n’oge oké ọkọchị. Ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-atụ egwu Chineke, ume anyị na-abịa site n’Isi Iyi na-adịghị ata ata—Jehova Chineke. Pọl legaara Chineke anya maka enyemaka ma nwee ike ikwu, sị: “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ [Jehova] nke na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Mgbe mmụọ nsọ Jehova na-edu ma na-akwagide anyị n’ụzọ ime mmụọ, anyị adịghị akpọnwụ, na-aghọ ndị na-adịghị amị mkpụrụ ma ọ bụ ndị nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ. Anyị na-amị mkpụrụ n’ozi Chineke ma na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ ya.—Jeremaịa 17:7, 8; Ndị Galeshia 5:22, 23.

15 Site n’iji ụdị okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “dị ka” mee ihe, ọbụ abụ ahụ ji ihe ya na ihe yiri na-eme ihe. O ji ihe abụọ dị iche na-atụnyere ibe ha, ọ bụ ezie na ọ dị otu ụzọ ha si yie. Ụmụ mmadụ na osisi dị iche ma o doro anya na ịma mma nke osisi a kụrụ n’akụkụ isi iyi mmiri jupụtara na-echetara ọbụ abụ ahụ ọganihu ime mmụọ nke ndị ‘iwu Jehova na-atọ ụtọ.’ Ọ bụrụ na iwu Chineke na-atọ anyị ụtọ, ụbọchị anyị pụrụ ịdị ka nke osisi. N’ezie, anyị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3.

16. N’ihi gịnị, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka ‘ihe ọ bụla anyị na-eme na-aga nke ọma’?

16 Ka anyị na-agbaso ụzọ ndụ ziri ezi, Jehova na-enyere anyị aka ịnagide nrụgide nke ọnwụnwa na ihe isi ike dị iche iche. Anyị na-enwe ọṅụ ma na-amị mkpụrụ n’ozi Chineke. (Matiu 13:23; Luk 8:15) ‘Ihe nile anyị na-eme na-aga nke ọma’ n’ihi na ebumnobi anyị bụ́ isi bụ ime uche Jehova. Ebe ọ bụ na nzube ya na-emezu mgbe nile, ya ana-atọkwa anyị ụtọ idebe iwu ya, anyị na-enwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. (Jenesis 39:23; Joshua 1:7, 8; Aịsaịa 55:11) Nke a bụ eziokwu ọbụna mgbe anyị na-eche ihe isi ike ihu.—Abụ Ọma 112:1-3; 3 Jọn 2.

Ndị Na-emebi Iwu Na-eyi Ka Hà Na-enwe Ihe Ịga nke Ọma

17, 18. (a) Gịnị ka ọbụ abụ ahụ ji tụnyere ndị na-emebi iwu? (b) Ya bụrụgodị na ndị na-emebi iwu enwee ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe, n’ihi gịnị ka ha na-ejighị nwee nchebe na-adịgide adịgide?

17 Lee ka ọnọdụ ndị na-emebi iwu si dị nnọọ iche na nke ndị ezi omume! Ndị na-emebi iwu pụrụ iyi ka hà na-enwe ihe ịga nke ọma ruo oge ụfọdụ, ma ha adịghị enwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ ime mmụọ. Nke a pụtara ìhè n’okwu ọzọ nke ọbụ abụ ahụ: “Ọ bụghị otú a ka ndị na-emebi iwu dị; kama ha dị ka igbogbo ọka nke ifufe na-efesa. N’ihi nke a ndị na-emebi iwu agaghị eguzosi ike n’ikpe, ndị mmehie agaghị eguzosikwa ike ná nzukọ ndị ezi omume.” (Abụ Ọma 1:4, 5) Rịba ama na ọbụ abụ ahụ kwuru, sị, “ọ bụghị otú a ka ndị na-emebi iwu dị.” Ihe o bu n’uche bụ na ha adịghị ka ndị na-asọpụrụ Chineke, bụ́ ndị a ka ji tụnyere osisi na-amị mkpụrụ bụ́ nke na-adịgide adịgide.

18 Ya bụrụgodị na ndị na-emebi iwu enwee ihe ịga nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe, ha enweghị nchebe na-adịgide adịgide. (Abụ Ọma 37:16; 73:3, 12) Ha dị ka nwoke ahụ bara ọgaranya na-enweghị ezi uche nke Jizọs kpọtụrụ aha n’ilu ya mgbe a gwara ya ka o kpee ikpe n’okwu metụtara ihe nketa. Jizọs gwara ndị nọ n’ebe ahụ, sị: “Ghewenụ anya unu oghe, na-echekwanụ nche  megide ụdị ọchịchọ anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ihe n’ụba, ndụ ya adịghị esi n’ihe ndị o nwere apụta.” Jizọs mere ihe atụ nke a site n’ikwu na ala otu ọgaranya mere ihe nke ọma nke na o mere atụmatụ ịkwatu ọba ya ma wuo ndị nke ka ibu bụ́ ndị ga-aba ezi ihe ya nile. Nwoke ahụ meziri atụmatụ iri ihe, ịṅụ ihe, na ime onwe ya obi ụtọ. Ma Chineke sịrị: “Onye na-enweghị ezi uche, n’abalị a ka ha na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị. Ònye ga-enwezi ihe ndị ị kwakọbara?” Iji mesie ihe ọ na-ekwu ike, Jizọs gbakwụnyere, sị: “Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:13-21.

19, 20. (a) Kọwaa usoro nzọcha na mfụcha ọka nke oge ochie. (b) N’ihi gịnị ka e ji jiri ndị na-emebi iwu tụnyere igbogbo?

19 Ndị na-emebi iwu abụghị “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” N’ihi ya, ha enweghị nchebe na nkwụsi ike karịa igbogbo, bụ́ obere ihe nke na-ekpuchi ọka. Mgbe e gbutesịrị ọka n’oge ochie, a na-ewega ya n’ebe nzọcha ọka, ebe dị larịị nke na-adịkarị n’elu mkputamkpu. N’ebe ahụ, a na-eji ihe mkpọre nwere nkume dị nkọ ma ọ bụ ezé ígwè n’akụkụ ya nke anụmanụ na-adọkpụ, agba n’elu ọka ahụ iji gwerie okporo ha ma mee ka ọka ndị ahụ pụta. Mgbe nke ahụ gasịrị, a na-eji shọvel e ji afụcha ọka ekuli ha nile elu n’ikuku. (Aịsaịa 30:24) Ọka ndị ahụ na-adaghachi n’ala ebe nzọcha ọka ebe ikuku na-ebuga okporo ọka n’akụkụ ma bufuo igbogbo ọka. (Rut 3:2) Mgbe e ji myọ yọchasịa ọka ahụ iji wepụ ajịrịja na ihe ndị yiri ha, a na-akwakọbazi ha n’ọba ma ọ bụ gwerie ha. (Luk 22:31) Ma ikuku ebufuola igbogbo ha.

20 Dị nnọọ ka a na-echekwa ọka ndị dara n’ala ebe ikuku na-ebufu igbogbo ha, otú ahụ ka ndị ezi omume ga-anọgide, a ga-ewepụkwa ndị na-emebi iwu. N’ezie, obi dị anyị ụtọ na n’isi nso, ndị dị otú ahụ na-emebi iwu ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ha pụrụ n’anya, a ga-agọzi ndị iwu Jehova na-atọ ụtọ n’ụzọ dị ukwuu. N’ezie, ụmụ mmadụ na-erube isi ga-emesị nweta onyinye Chineke nke bụ́ ndụ ebighị ebi.—Matiu 25:34-46; Ndị Rom 6:23.

‘Ụzọ A Gọziri Agọzi nke Ndị Ezi Omume’

21. Olee otú o si bụrụ na Jehova “maara ụzọ ndị ezi omume”?

21 Abụ ọma nke mbụ ji okwu ndị a mechie: “Jehova maara ụzọ ndị ezi omume: ma ụzọ ndị na-emebi iwu ga-ala n’iyi.” (Abụ Ọma 1:6)  Olee otú o si bụrụ na Chineke “maara ụzọ ndị ezi omume”? Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ ziri ezi, anyị pụrụ ijide n’aka na Nna anyị nke eluigwe na-ahụ ndụ nsọpụrụ Chineke anyị na-ebi ma na-ele anyị anya dị ka ndị ohu ya a nwapụtara anwapụta. Anyị onwe anyị pụziri, kwesịkwa ịtụkwasị ya nchegbu anyị nile, na-enwe obi ike na ọ na-eche banyere anyị n’ezie.—Ezikiel 34:11; 1 Pita 5:6, 7.

22, 23. Gịnị ga-eme ndị na-emebi iwu na ndị ezi omume?

22 “Ụzọ ndị ezi omume” ga-adịru mgbe ebighị ebi, ma ndị na-emebi iwu na-enweghị nchegharị ga-ala n’iyi n’ihi ọmụma ikpe Jehova. “Ụzọ” ha kwa, ma ọ bụ ụzọ ndụ ha, ga-eso ha laa n’iyi. Anyị pụrụ inwe obi ike ná mmezu nke okwu Devid bụ́: “Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ. Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:10, 11, 29.

23 Lee obi ụtọ anyị ga-enwe ma ọ bụrụ na anyị nwere ihe ùgwù nke ibi na paradaịs elu ala mgbe ndị na-emebi iwu na-agaghịzi adị! Ndị dị umeala n’obi na ndị ezi omume ga-enwe ezi udo n’ihi na ‘iwu Jehova’ ga na-atọ ha ụtọ mgbe nile. Otú ọ dị, tupu mgbe ahụ, “ụkpụrụ Jehova” aghaghị imezu. (Abụ Ọma 2:7a) Isiokwu na-esonụ ga-enyere anyị aka ịhụ ihe ụkpụrụ ahụ bụ na ihe ọ ga-apụtara anyị na ezinụlọ dum nke mmadụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’ihi gịnị ka onye na-asọpụrụ Chineke ji enwe obi ụtọ?

• Gịnị na-egosi na iwu Jehova na-atọ anyị ụtọ?

• N’ụzọ dị aṅaa ka mmadụ pụrụ isi dị ka osisi a na-agba mmiri nke ọma?

• Olee otú ụzọ onye ezi omume si dị iche na nke onye na-emebi iwu?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 11]

Ekpere ga-enyere anyị aka izere iso ndị na-emebi iwu na-akpakọrịta

[Foto dị na peeji nke 12]

N’ihi gịnị ka onye ezi omume ji dị ka osisi?