Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Ebube Jizọs—Ihe Mere Eme Ka Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo?

Ọrụ Ebube Jizọs—Ihe Mere Eme Ka Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo?

 Ọrụ Ebube Jizọs—Ihe Mere Eme Ka Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo?

“NDỊ mmadụ kpọtaara ya [Jizọs Kraịst] ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ ji; o wee were okwu ọnụ chụpụ ndị mmụọ ahụ, ọ gwọkwara ndị nile ahụ́ na-adịghị mma.” (Matiu 8:16) “O [Jizọs] biliri wee baara ifufe ahụ mba ma gwa oké osimiri ahụ, sị: ‘Shịị! Daa jụụ!’ Ifufe ahụ wee dajụọ, ebe nile wee daa jụụ.” (Mak 4:39) Olee otú i si ele okwu ndị a anya? Ì kweere na ha na-akọwa ihe ndị mere eme n’ezie, ka ị̀ na-eche na ha bụ akụkọ ifo, akụkọ ọdịbendị nkịtị na-emeghị eme?

Ọtụtụ ndị taa na-enwe nnọọ obi abụọ ma ọrụ ebube Jizọs hà mere eme n’ezie. Ọgbọ a nke teliskop na microscope, nke nnyocha mbara igwe na nke mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa, yiri ka ọ naghị ekwe ndị mmadụ ikwere akụkọ nke ọrụ ebube na ihe ijuanya ndị sitere n’aka Chineke.

Ụfọdụ na-eche na ihe ndekọ nke ọrụ ebube bụ ihe ndị e chepụtara echepụta ma ọ bụ akụkọ ifo. Dị ka onye edemede nke otu akwụkwọ na-azọrọ na ya na-atụle ihe banyere “ezigbo” Jizọs si kwuo, akụkọ banyere ọrụ ebube Kraịst adịghị ihe ọzọ ọ bụ ma ọ́ bụghị “ihe ndị e ji adọta ndị mmadụ” n’Iso Ụzọ Kraịst.

Ndị ọzọ na-ele ọrụ ebube Jizọs anya dị ka wayo chara acha. A na-ekwu mgbe ụfọdụ na Jizọs n’onwe ya na-aghọgbu ndị mmadụ. Dị ka Justin Martyr nke narị afọ nke abụọ O.A., si kwuo, ndị na-akatọ Jizọs “ọbụna kara anya kpọọ ya onye majik  na onye na-aghọgbu ndị mmadụ.” Ụfọdụ na-azọrọ na Jizọs “arụghị ọrụ ebube ya dị ka onye amụma ndị Juu, kama dị ka onye majik, onye a zụrụ n’ụlọ arụsị.”

Ịkọwa Ihe Na-apụghị Ime Eme

Ị pụrụ iche na obi abụọ ndị dị otú ahụ na-ekpughe otu isi ihe mere ndị mmadụ na-ejighị ekwetacha n’ọrụ ebube. Ọ na-esiri ha nnọọ ike, ọbụna bụrụ ihe na-apụghị ikwe ha omume ịnabata echiche bụ́ na a pụrụ inwe ikike ndị karịrị nke mmadụ bụ́ ndị nọ n’ọrụ. “Ihe m ma bụ na e nweghị ihe dị ka ọrụ ebube,” ka otu onye na-eto eto kpọrọ onwe ya onye na-amaghị ma Chineke ọ̀ dị kwuru. Mgbe ahụ, o hotara ihe ọkà ihe ọmụma nke narị afọ nke 18 bụ́ onye Scotland bụ́ David Hume kwuru, bụ́ onye dere, sị: “Ọrụ ebube megidere iwu okike.”

Otú ọ dị, ọ ga-esiri ọtụtụ ndị ike ikwubi na ihe ịtụnanya ụfọdụ bụ ihe na-apụghị ikwe omume. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-akpọ ọrụ ebube “ihe omume a na-apụghị iji iwu okike ndị a maara kọwaa.” Dabere ná nkọwa ahụ, ịga na mbara igwe, iji telifon na-enweghị eriri akparịta ụka, ịdabere n’ígwè satellite na-eme njem gaara eyi “ọrụ ebube” n’anya ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ nanị otu narị afọ gara aga. N’ezie, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ikwu na ọrụ ebube bụ ihe na-apụghị ikwe omume nanị n’ihi na anyị apụghị ịkọwa ha dabere n’ihe ọmụma nke oge a.

Ọ bụrụ na anyị enyochaa ụfọdụ ihe àmà ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị metụtara ọrụ ebube ndị a sịrị na Jizọs Kraịst rụrụ, gịnị ka anyị ga-achọpụta? Ọrụ ebube Jizọs hà bụ ihe mere eme ka hà bụ akụkọ ifo?