Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ’

‘Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ’

 ‘Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ’

“E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa. Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.”—MATIU 28:18, 19.

1, 2. (a) Ọrụ dị aṅaa ka Jizọs nyere ụmụazụ ya? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa metụtara iwu Jizọs ka a ga-atụle?

Ọ BỤ n’oge opupu ihe ubi n’Izrel na 33 O.A., ndị na-eso ụzọ Jizọs gbakọtakwara n’otu ugwu dị na Galili. Onyenwe ha a kpọlitere n’ọnwụ na-aga ịrịgo n’eluigwe, ma tupu nke ahụ, o nwere ihe dị mkpa ịgwa ha. Jizọs nwere ọrụ ọ ga-enye ha. Gịnị bụ ọrụ ahụ? Olee otú ndị na-eso ụzọ ya si meghachi omume na nke ahụ? Oleekwa otú ọrụ ahụ si metụta anyị taa?

2 E dekọrọ ihe Jizọs kwuru na Matiu 28:18-20: “E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa. Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu. Ma, lee! m nọnyeere unu ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” Jizọs kwuru okwu banyere “ikike nile,” “mba nile,” “ihe nile,” na “ụbọchị nile.” Iwu ya, bụ́ nke gụnyere okwu anọ ndị ahụ metụtara ọtụtụ ihe, na-ewelite ajụjụ ụfọdụ dị mkpa, bụ́ ndị a pụrụ ịchịkọta n’okwu ndị bụ́ n’ihi gịnị? ebee? gịnị? na ole mgbe? Ka anyị tụlee ajụjụ ndị ahụ n’otu n’otu. *

“E Nyewo M Ikike Nile”

3. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị irube isi n’iwu ahụ nke ime ndị na-eso ụzọ?

3 Nke mbụ, n’ihi gịnị ka anyị ji kwesị irube isi n’iwu nke ime ndị na-eso ụzọ? Jizọs kwuru, sị: “E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa. Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” Okwu ahụ bụ́ “ya mere” na-egosi otu isi ihe mere e ji kwesị irube isi n’iwu a. Ọ bụ n’ihi na Jizọs, bụ́ onye nyere iwu ahụ, nwere “ikike nile.” Ikike ya ọ̀ ha aṅaa?

4. (a) Olee otú ikike Jizọs bururu n’ibu? (b) Olee otú anyị ịghọta otú ikike Jizọs ha kwesịrị isi metụta otú anyị si ele iwu nke ime ndị na-eso ụzọ anya?

4 Jizọs nwere ikike n’ebe ọgbakọ ya dị, kemgbe 1914 kwa, o nwewo ikike n’ebe Alaeze Chineke e guzobere ọhụrụ dị. (Ndị Kọlọsi 1:13; Mkpughe 11:15) Ọ bụ ya bụ onyeisi nke ndị mmụọ ozi, n’ihi ya kwa, na-achịkwa usuu ndị agha eluigwe nke ihe mejupụtara ya bụ ọtụtụ narị nde ndị mmụọ ozi. (1 Ndị Tesalonaịka 4:16; 1 Pita 3:22; Mkpughe 19:14-16) Nna ya enyewo ya ikike ime ka “ọchịchị nile na ikike na ike nile” na-emegide ụkpụrụ ezi omume ghara ịdị irè. (1 Ndị Kọrint 15:24-26;  Ndị Efesọs 1:20-23) Ọ bụghị nanị n’ebe ndị dị ndụ nọ ka Jizọs nwere ikike. Ọ bụkwa “onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ,” nweekwa ike sitere n’aka Chineke ịkpọlite ndị dara n’ụra ọnwụ. (Ọrụ 10:42; Jọn 5:26-28) N’ezie, iwu Onye e nyere ikike dị ukwuu otú ahụ nyere kwesịrị ka e lee ya anya dị ka ihe dị nnọọ mkpa. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji nkwanye ùgwù na ọchịchọ obi na-erube isi n’iwu Kraịst nke ‘ịga mee ndị na-eso ụzọ.’

5. (a) Olee otú Pita si rube isi n’okwu Jizọs? (b) Isi Pita rubere ná ntụziaka Jizọs wetara ngọzi dị aṅaa?

5 Ná mmalite nke ozi elu ala ya, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya n’ụzọ dị ịrịba ama na ịnakwere ikike ya na irube isi n’iwu ya ga-eweta ọtụtụ ngọzi. N’otu oge, ọ gwara Pita, bụ́ onye ọkụ azụ, sị: “Kwọpụ ụgbọ gaa n’ebe dị omimi, wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu wee gbute azụ.” O doro Pita anya na azụ adịghị, n’ihi ya, ọ gwara Jizọs, sị: “Onye ozizi, anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ n’abalị dum n’egbuteghị ihe ọ bụla.” Otú ọ dị, Pita ji obi umeala gbakwụnye, sị: “Ma ebe i kwuru ya aga m awụnye ụgbụ.” Mgbe Pita rubesịrị isi n’iwu Kraịst, o gbutere “azụ bara oké ụba.” N’ịbụ onye nke ahụ riri ọnụ, Pita “dara n’ala n’ụkwụ Jizọs, na-asị: ‘Si n’ebe m nọ pụọ, Onyenwe anyị, n’ihi na abụ m onye mmehie.’” Ma Jizọs zara, sị: “Kwụsị ịtụ egwu. Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.” (Luk 5:1-10; Matiu 4:18) Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe ndekọ a?

6. (a) Gịnị ka ihe ndekọ banyere azụ ndị ahụ a kụtara n’ụzọ ọrụ ebube na-egosi banyere ụdị nrubeisi Jizọs chọrọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi na-eṅomi Jizọs?

6 Jizọs nyere Pita, Andru, na ndịozi ndị ọzọ ọrụ nke ‘ịghọ ndị na-akụta mmadụ,’ ọ bụghị tupu ha akụta ọtụtụ azụ a ha kụtara n’ụzọ dị ịtụnanya, kama mgbe ha mesịworo nke a. (Mak 1:16, 17) N’ụzọ doro anya, Jizọs achọghị ka ha rubere ya isi n’enweghị ihe ndabere. O nyere ndị ikom ahụ ihe doro anya mere ha ji kwesị irubere ya isi. Dị nnọọ ka irube isi n’iwu Jizọs bụ́ ka ha wụnye ụgbụ ha rụpụtara ihe dị ịrịba ama, otú ahụ ka irube isi n’iwu Jizọs nke ‘ịkụta ndị mmadụ’ ga-arụpụta ngọzi dị ukwuu. Ndịozi ahụ ji okwukwe siri ike mee ihe. Ihe ndekọ ahụ na-ekwubi, sị: “Ha kwọọrọ ụgbọ ndị ahụ gaghachi n’ebe bụ́ ala, gbahapụkwa ihe nile ma soro ya.” (Luk 5:11) Taa, ka anyị na-agba ndị ọzọ ume ikere òkè n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ, anyị na-eṅomi Jizọs. Ihe anyị na-eme abụghị nanị ịchọ ka ndị mmadụ mee ihe anyị gwara ha, kama anyị na-enye ha ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ mere ha ga-eji rube isi n’iwu Kraịst.

Ihe Ndị Gbara Ọkpụrụkpụ Mere Anyị Ga-eji Rube Isi na Ebumnobi Ziri Ezi Maka Ime Otú Ahụ

7, 8. (a) Olee ihe ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ kwuru mere a ga-eji na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ? (b) Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ kasị akpali gị ịnọgide na-arụ ọrụ nkwusa? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)

7 N’ihi na anyị ghọtara ikike Kraịst nwere, anyị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ. Olee ihe ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ kwuru mere a ga-eji na-arụ ọrụ ahụ ka anyị pụrụ ịgwa ndị anyị chọrọ ịkpali ịrụ ọrụ ọma? Tụlee ihe na-esonụ nke ọtụtụ Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị sitere n’ala dị iche iche kwuru, rịbakwa ama otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara si kwado okwu ha.

8 Roy, bụ́ onye e mere baptizim na 1951: “Mgbe m raara onwe m nye Jehova, ekwere m nkwa ijere ya ozi mgbe nile. Achọrọ m imezu nkwa m.” (Abụ Ọma 50:14; Matiu 5:37) Heather, bụ́ onye e mere baptizim na 1962: “Mgbe m chere echiche banyere ihe nile Jehova mewooro m, achọrọ m igosi ya ekele m site n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi.” (Abụ Ọma 9:1, 9-11; Ndị Kọlọsi 3:15) Hannelore, bụ́ onye e mere baptizim na 1954: “Oge ọ bụla anyị nọ n’ozi, ndị mmụọ ozi na-akwado anyị—lee ihe ùgwù nke ahụ bụ!” (Ọrụ 10:30-33; Mkpughe 14:6, 7) Honor, bụ́ onye e mere baptizim na 1969: “Mgbe oge ikpe Jehova bịara, achọghị m ka onye ọ bụla bi n’agbata obi m boo Jehova na Ndịàmà ya ebubo nke ejighị ihe kpọrọ ihe ma sị, ‘Ọ dịghị onye dọrọ m aka  ná ntị!’” (Ezikiel 2:5; 3:17-19; Ndị Rom 10:16, 18) Claudio, bụ́ onye e mere baptizim na 1974: “Mgbe anyị na-eme nkwusa, anyị nọ ‘n’ihu anya Chineke’ ‘anyị na Kraịst na-enwekwa mmekọrịta.’ Cheedị nke ahụ! Mgbe anyị nọ n’ozi, anyị na ndị kasị bụrụ ezigbo ndị enyi anyị na-enwe mmekọrịta.”—2 Ndị Kọrint 2:17. *

9. (a) Gịnị ka ihe ndekọ nke ahụmahụ ahụ Pita na ndịozi ndị ọzọ nwere n’ịkụ azụ na-ekpughe banyere ebumnobi kwesịrị ekwesị maka irubere Kraịst isi? (b) Gịnị bụ ebumnobi kwesịrị ekwesị maka irubere Chineke na Kraịst isi taa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

9 Ihe ndekọ banyere ọtụtụ azụ ahụ a kụtara n’ụzọ dị ịrịba ama na-egosi mkpa ọ dị inwe ebumnobi kwesịrị ekwesị maka irubere Kraịst isi—ịhụnanya. Mgbe Pita sịrị, “Si n’ebe m nọ pụọ, . . . n’ihi na abụ m onye mmehie,” Jizọs apụghị, ọ katọghịkwa Pita n’ihi mmehie ọ bụla. (Luk 5:8) Ọbụna Jizọs akatọghị Pita maka ịrịọ ya ka ọ pụọ. Kama nke ahụ, Jizọs ji obiọma zaghachi, sị: “Kwụsị ịtụ egwu.” Egwu na-ezighị ezi gaara abụwo ebumnobi na-ekwesịghị ekwesị maka irubere Kraịst isi. Kama nke ahụ, Jizọs gwara Pita na ya na ndị enyi ya ga-aba uru dị ka ndị na-akụta mmadụ. Taa, anyị onwe anyị adịghị eji egwu ma ọ bụ mmetụta na-ezighị ezi ndị yiri ya, dị ka obi amamikpe na ihere, amanye ndị ọzọ irubere Kraịst isi. Ọ bụ nanị nrubeisi sitere n’obi nke dabeere n’ịhụnanya e nwere n’ebe Chineke na Kraịst nọ na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Matiu 22:37.

“Mee Ndị nke Mba Nile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ”

10. (a) Akụkụ dị aṅaa nke iwu Jizọs nke ime ndị na-eso ụzọ wetaara ndị na-eso ụzọ ya nnukwu ihe ịma aka? (b) Olee otú ndị ahụ na-eso ụzọ si meghachi omume n’iwu Jizọs?

10 Ajụjụ nke abụọ na-ebilite n’ihe banyere iwu Kraịst bụ, Ebee ka e kwesịrị ịrụ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ a? Jizọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.” Tupu oge ozi Jizọs, a na-anabata ndị  mba ọzọ ma ọ bụrụ na ha abịa n’Izrel ijere Jehova ozi. (1 Ndị Eze 8:41-43) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Jizọs n’onwe ya meere nkwusa bụ ndị Juu anụ ahụ́, ma ugbu a, ọ gwara ụmụazụ ya ka ha gakwuru ndị nke mba nile. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ebe ndị na-eso ụzọ ya ga-akụ azụ, ma ọ bụ ókèala ha ga-eme nkwusa, ga-abụ n’obere “ọdọ mmiri”—ndị Juu anụ ahụ́—ma n’oge na-adịghị anya, ọ ga-agụnye “oké osimiri” dum nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ ezie na mgbanwe a wetaara ndị ahụ na-eso ụzọ ihe ịma aka, ha rubere isi ngwa ngwa ná ntụziaka Jizọs. N’ihe na-erughị afọ 30 ka Jizọs nwụsịrị, Pọl onyeozi pụrụ ide na e kwusaworo ọ bụghị nanị ndị Juu ozi ọma ahụ kama “ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”—Ndị Kọlọsi 1:23.

11. Mgbasawanye dị aṅaa nke ‘ebe ịkụ azụ’ ka e nweworo kemgbe mmalite nke narị nke 20?

11 Na nso nso a karị, a hụwo mgbasawanye yiri nke ahụ n’ihe banyere ókèala ebe a na-eme nkwusa. Ná mmalite nke narị afọ nke 20, ‘ebe ịkụ azụ’ dị nanị n’ala ole na ole. N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụazụ Kraịst laa azụ n’oge ahụ ṅomiri ihe nlereanya nke Ndị Kraịst narị afọ mbụ ma jiri ịnụ ọkụ n’obi gbasaa ókèala ha mere nkwusa na ya. (Ndị Rom 15:20) Ka ọ na-erule ná mmalite afọ ndị 1930, ha nọ na-eme ndị na-eso ụzọ n’ihe dị ka otu narị ala. Taa, a gbasawanyewo ‘ebe ịkụ azụ’ anyị ruo n’ala 235.—Mak 13:10.

“N’asụsụ Nile nke Mba Nile”

12. Ihe ịma aka dị aṅaa ka amụma ahụ dị na Zekaraịa 8:23 na-eme ka ọ pụta ìhè?

12 Ime ndị na-eso ná mba nile bụ ihe ịma aka o bụghị nanị n’ihi ọtụtụ ókèala e nwere kamakwa, n’ihi ọtụtụ asụsụ e nwere. Site n’ọnụ Zekaraịa onye amụma, Jehova buru amụma, sị: “Na mgbe ahụ ka ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ́ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zekaraịa 8:23) Ná mmezu ka ukwuu nke amụma a, ‘nwoke ahụ bụ́ onye Juu’ na-anọchi anya ihe fọdụrụ ná Ndị Kraịst e tere mmanụ, ebe “ndị ikom iri” ahụ na-anọchi anya “oké ìgwè mmadụ” ahụ. * (Mkpughe 7:9, 10; Ndị Galeshia 6:16) A ga-achọta oké ìgwè mmadụ a nke ndị na-eso ụzọ Kraịst n’ọtụtụ mba, dịkwa ka Zekaraịa kwuru, ha ga na-asụ ọtụtụ asụsụ. Akụkọ ihe mere eme nke oge a nke ndị Chineke ọ̀ na-egosipụta akụkụ a nke ime ndị na-eso ụzọ? Ee, ọ na-egosi.

13. (a) Mgbanwe dị aṅaa n’ihe banyere asụsụ werewooro ọnọdụ n’etiti ndị Chineke nke oge a? (b) Olee otú òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi siworo meghachi omume nye mkpa na-amụbawanye amụbawanye a na-enwe maka nri ime mmụọ n’asụsụ dị iche iche? (Gụnye igbe bụ́ “Akwụkwọ Maka Ndị Ìsì.”)

13 Na 1950, asụsụ ala nna nke ihe dị ka mmadụ 3 n’ime Ndịàmà 5 ọ bụla nke Jehova n’ụwa nile bụ Bekee. Ka ọ na-erule 1980, nkezi ahụ  gbanwere gaa n’ihe dị ka mmadụ 2 n’ime mmadụ 5 ọ bụla, taakwa, ọ bụ nanị 1 onye n’ime Ndịàmà 5 ọ bụla ka asụsụ ala nna ya bụ Bekee. Olee otú ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke nwekwara uche siworo meghachi omume ná mgbanwe a nke asụsụ? Ọ bụ site n’inye nri ime mmụọ n’ọnụ ọgụgụ asụsụ ndị nọgideworo na-amụba amụba. (Matiu 24:45) Dị ka ihe atụ, na 1950, a na-ebipụta akwụkwọ anyị n’asụsụ 90, ma taa, ọnụ ọgụgụ ahụ arịwo elu ruo ihe dị ka 400. Ilebakwuru ndị na-asụ asụsụ dịgasị iche anya n’ụzọ dị otú a ọ̀ rụpụtawo ihe? Ee! Ná nkezi, ihe dị ka mmadụ 5,000 ‘si n’asụsụ nile’ na-aghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst n’izu nke ọ bụla n’afọ! (Mkpughe 7:9) A nọgidekwara na-enwe mmụba. N’ala ụfọdụ, “ụgbụ” ahụ na-egbute ọtụtụ azụ!—Luk 5:6; Jọn 21:6.

Ozi Na-enye Obi Ụtọ —Ị̀ Pụrụ Ikere Òkè na Ya?

14. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị nọ n’ókèala anyị bụ́ ndị na-asụ asụsụ ọzọ aka? (Gụnye igbe bụ́ “Asụsụ Ogbi na Ime Ndị Na-eso Ụzọ.”)

14 N’ọtụtụ ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, nkwabata nke ndị si mba ọzọ na-eweta ihe ịma aka nke ime ndị si ‘n’asụsụ ọ bụla’ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ná mba ha. (Mkpughe 14:6) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị bi n’ókèala anyị aka, bụ́ ndị na-asụ asụsụ dị iche na nke anyị? (1 Timoti 2:4) Anyị pụrụ iji ngwá ọrụ kwesịrị ekwesị e ji egbu azụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-eme ihe. Nye ndị dị otú ahụ akwụkwọ n’asụsụ ha na-asụ. Ọ bụrụ na o kwe mee, mee ndokwa ka Onyeàmà na-asụ asụsụ ha leta ha. (Ọrụ 22:2) Ime ndokwa ndị a dị mfe ugbu a karị, ebe ọ bụ na ọtụtụ Ndịàmà amụwo ịsụ asụsụ dị iche na nke ha iji nyere ndị mba ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Akụkọ na-egosi na inye aka n’ụzọ dị otú a bụ ahụmahụ na-enye afọ ojuju.

15, 16. (a) Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na ọ bụ ihe na-enye afọ ojuju inyere ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ aka? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa banyere ije ozi n’ubi asụsụ ọzọ ka ị pụrụ ịtụle?

15 Tụlee ihe atụ abụọ si Netherlands, bụ́ ebe a na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze a haziri ahazi n’asụsụ 34. Otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà wepụtara onwe ha n’afọ ofufo ịga mee ndị na-eso ụzọ n’etiti ndị si esi kwabata bụ́ ndị na-asụ Polish. Ndị mmadụ meghachiri omume n’ụzọ magburu onwe ya nye mgbalị ha nke na onye  nke bụ́ di nwere mkpali igbubilata oge o ji arụ ọrụ ego iji nwekwuo otu ụbọchị n’izu iji na-amụrụ ndị gosiri mmasị Bible. N’oge na-adịghị anya, di na nwunye ahụ na-eduzi ihe karịrị ọmụmụ Bible 20 kwa izu. Ha kwuru, sị: “Ozi anyị na-eme anyị nnọọ obi ụtọ.” Ndị na-eme ndị na-eso ụzọ na-enwe obi ụtọ karịsịa mgbe a kpaliri ndị nụrụ eziokwu Bible n’asụsụ ha igosipụta ekele ha. Dị ka ihe atụ, n’otu nzukọ e nwere n’asụsụ Vietnamese, otu agadi nwoke biliri ọtọ ma rịọ ka e kwe ka o kwuo okwu. O ji anya mmiri gwa Ndịàmà ahụ, sị: “Unu emeela maka mgbalị unu na-eme iji mụta asụsụ m siri ike. Enwere m nnọọ ekele ịmụta ọtụtụ ihe ndị magburu onwe ha site na Bible n’agadi m.”

16 N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ndị na-eje ozi n’ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ ọzọ na-enwe afọ ojuju dị ukwuu. Otu di na nwunye si Britain kwuru, sị: “Ije ozi n’ubi asụsụ mba ọzọ bụ otu n’ime ozi kasị akpali akpali anyị jetụworo n’ime afọ 40 anyị jeworo ozi Alaeze.” Ị̀ pụrụ ịgbanwegharị ọnọdụ gị iji kere òkè n’ọrụ a na-akpali akpali? Ọ bụrụ na ị ka na-aga akwụkwọ, ị̀ pụrụ ịmụ asụsụ mba ọzọ iji kwadebe maka ụdị ozi a? Ime otú ahụ pụrụ iduga gị n’ibi ndụ na-eju afọ nke jupụtara ná ngọzi. (Ilu 10:22) Gịnị ma i soro ndị mụrụ gị kwurịta nke a?

Ịgbanwegharị Ụzọ Anyị Si Eme Ndị Na-eso Ụzọ

17. Olee otú anyị pụrụ isi kwusakwuoro ọtụtụ mmadụ ozi ọma n’ókèala ọgbakọ anyị?

17 N’ụzọ kwere nghọta, ọnọdụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị adịghị ekwe ha ịwụnye “ụgbụ” ha n’ókèala asụsụ ọzọ. Otú ọ dị, anyị nwere ike ikwusakwuru ọtụtụ mmadụ n’ókèala ọgbakọ anyị ozi ọma karịa ka anyị na-eme ugbu a. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịgbanwegharị, ọ bụghị ozi anyị, kama ụzọ ndị anyị si eme nkwusa. N’ọtụtụ ebe, ọnụ ọgụgụ na-amụbawanye amụbawanye nke ndị mmadụ na-ebi n’ụlọ ndị nwere ngwá nchebe ndị bụ́ ọkpọka. Ọtụtụ ndị ọzọ adịghị anọ n’ụlọ mgbe anyị na-aga ozi ụlọ n’ụlọ. N’ihi ya, ọ pụrụ ịdị mkpa anyị ịwụnye “ụgbụ” anyị n’oge dịgasị iche na n’ebe dịgasị iche. N’ụzọ dị otú a, anyị na-eṅomi Jizọs. Ọ chọtara ụzọ isi gwa ndị mmadụ okwu n’ọnọdụ dịgasị iche.—Matiu 9:9; Luk 19:1-10; Jọn 4:6-15.

18. Olee otú ịgba àmà n’ebe dịgasị iche siworo dị irè? (Gụnye igbe bụ́ “Ime Ka Ndị Achụmnta Ego Ghọọ Ndị Na-eso Ụzọ.”)

18 N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ịgba àmà n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ndị mmadụ bụ ụzọ dị mkpa e si eme ndị na-eso ụzọ. Ndị na-eme ndị na-eso ụzọ bụ́ ndị nwere ahụmahụ anọwo na-elekwasị anya n’ụzọ ka ukwuu n’ịgba àmà n’ebe dịgasị iche. Tụkwasị n’ikere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ, ndị nkwusa na-agba àmà ugbu a n’ọdụ ụgbọelu, n’ọfịs, n’ụlọ ahịa, n’ebe a na-adọba ụgbọala, n’ebe bọs na-akwụsị, n’okporo ámá, n’ogige ntụrụndụ, n’ụsọ osimiri, na n’ebe ndị ọzọ. Ebe mbụ e zutere ọtụtụ Ndịàmà e mere baptizim ọhụrụ na Hawaii bụ n’ebe ndị dị otú ahụ. Ịgbanwegharị ụzọ anyị si eme nkwusa na-enyere anyị aka idebezu iwu Jizọs nke ime ndị na-eso ụzọ.—1 Ndị Kọrint 9:22, 23.

19. Akụkụ dị aṅaa nke ọrụ Jizọs nyere anyị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ọrụ Jizọs nyere anyị ime ndị na-eso ụzọ gụnyere ọ bụghị nanị nkọwa nke ihe mere anyị ji kwesị ịrụ ọrụ ahụ na ebe anyị kwesịrị ịrụ ya kamakwa ihe anyị kwesịrị ikwusa na mgbe anyị ga-ekwusaru ya. A ga-atụle akụkụ abụọ a nke ọrụ Jizọs nyere anyị n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Anyị ga-atụle ajụjụ abụọ mbụ n’isiokwu a. A ga-atụle abụọ ndị ikpeazụ n’isiokwu na-esonụ.

^ par. 8 A na-achọtakwu ihe ndị mere a ga-eji na-eme nkwusa n’Ilu 10:5; Emọs 3:8; Matiu 24:42; Mak 12:17; Ndị Rom 1:14, 15.

^ par. 12 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere mmezu nke amụma a, lee Ụlọ Nche nke May 15, 2001, peeji nke 12, na Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ Mpịakọta nke 2, peeji nke 408, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị, ọ̀ bụkwa ebumnobi dị aṅaa ka anyị ji ekere òkè n’ọrụ ime nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ?

• Ruo ókè ha aṅaa ka ndị ohu Jehova taa na-arụzu ọrụ Jizọs nyere ha ime ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ?

• Olee otú anyị pụrụ isi na-agbanwegharị ‘ụzọ anyị si akụ azụ,’ n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ime otú ahụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10]

Akwụkwọ Maka Ndị Ìsì

Albert bụ Onye Kraịst bụ́ okenye na onye ozi oge nile nke bi na United States. O kpuru ìsì. Iji akwụkwọ ndị e ji amụ Bible bụ́ ndị e ji mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì dee eme ihe na-enyere ya aka ịdị irè karị n’ozi ya, gụnyere n’ịrụ ọrụ ya dị ka onye nlekọta ije ozi. Olee otú o si na-arụ ọrụ e nyere ya n’ọgbakọ?

“Albert bụ onye nlekọta ije ozi dị nnọọ irè n’ọgbakọ anyị,” ka James, bụ́ onyeisi oche ndị nlekọta na-ekwu. Albert bụ otu n’ime ndị ìsì 5,000 nọ na United States bụ́ ndị, kemgbe ọtụtụ afọ, nwetaworo akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị e ji mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì dee n’asụsụ Bekee na Spanish. N’ezie, site na 1912 gaa n’ihu, òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ewepụtawo ihe karịrị otu narị akwụkwọ dị iche iche e ji mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì bie. Site n’iji usoro ndị bụ́ ọkpọka eme ihe, ebe obibi akwụkwọ Ndịàmà Jehova na-ebipụta ọtụtụ nde ihe odide e ji mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì bie kwa afọ n’ihe karịrị asụsụ iri ma na-ekesara ha ihe karịrị mba 70. Ị̀ maara onye pụrụ irite uru site n’akwụkwọ e ji amụ Bible ndị a kwadebere maka ndị ìsì?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 11]

Asụsụ Ogbi na Ime Ndị Na-eso Ụzọ

Ọtụtụ puku Ndịàmà gbaa gburugburu ụwa, gụnyere ọtụtụ ndị na-eto eto na-anụ ọkụ n’obi, amụwo asụsụ ogbi iji nyere ndị ogbi aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. N’ihi ya, na Brazil nanị, e mere ndị ogbi 63 baptizim n’ime otu afọ na-adịbeghị anya, Ndịàmà 35 bụ́ ndị ogbi na-ejekwa ozi n’ebe ahụ ugbu a dị ka ndị nkwusa oge nile. N’ụwa nile, e nwere ihe karịrị ọgbakọ na ìgwè 1,200 ji asụsụ ogbi eme ihe. Otu sekit ndị ogbi e nwere na Russia bụ sekit kasị ibu e nwere n’ụwa n’ihi ebe ọgbakọ ya nọgasị, n’akụkụ nile nke Russia!

[Igbe dị na peeji nke 12]

Ime Ka Ndị Achụmnta Ego Ghọọ Ndị Na-eso Ụzọ

Ka ọ na-eleta ndị achụmnta ego n’ọfịs ebe ha na-arụ ọrụ, otu Onyeàmà na Hawaii zutere onyeisi nke ụlọ ọrụ nwere ụgbọ ndị na-ebu ndị njem. Ọ bụ ezie na ọ na-eji ọrụ n’aka, nwoke ahụ kweere ka a na-amụrụ ya Bible minit 30 kwa izu n’ọfịs ya. Kwa ụtụtụ Wednesday, ọ na-agwa ndị ọrụ ya ka ha na-azara ya fon ya, ọ na-etinyezi uche nke ọma n’ọmụmụ ihe ahụ. Otu Onyeàmà ọzọ na Hawaii na-amụrụ otu onye nwe ụlọ ọrụ na-arụzi akpụkpọ ụkwụ Bible otu ugboro n’izu. Ha na-enwe ọmụmụ ihe ahụ na tebụl ụlọ ọrụ ahụ. Mgbe onye ahịa batara, Onyeàmà ahụ na-aga n’akụkụ. Mgbe onye ahịa ahụ lara, ha na-amaliteghachi ọmụmụ ihe ahụ.

E nwetara ma onyeisi ọrụ ahụ ma onye ahụ nwe ụlọ ọrụ n’ihi na Ndịàmà butere ụzọ n’ịwụnye “ụgbụ” ha n’ebe dị iche iche. Ị̀ pụrụ icheta ebe ndị dị n’ókèala ọgbakọ gị bụ́ ebe ị pụrụ inweta ndị ọ na-esi ike inweta n’ụlọ?

[Foto dị na peeji nke 12]

Ị̀ pụrụ ije ozi n’ubi asụsụ ọzọ?