Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Na-eche Banyere Gị n’Ezie

Chineke Na-eche Banyere Gị n’Ezie

Chineke Na-eche Banyere Gị n’Ezie

Ọ BỤ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị ịkpọku Chineke maka enyemaka mgbe anyị nọ n’oké ihe isi ike. E kwuwerị, o ‘nwere ike hiri nne; nghọta ya enweghị ọnụ ọgụgụ.’ (Abụ Ọma 147:5) Ọ nọ nnọọ n’ọnọdụ kasị mma inyere anyị aka ịnagide nsogbu anyị. Tụkwasị na nke ahụ, Bible na-akpọ anyị òkù ‘ịwụsị obi anyị dị ka mmiri’ n’ihu ya. (Abụ Ọma 62:8) N’ihi gịnịzị ka ọtụtụ ji na-eche na Chineke adịghị aza ekpere ha? Nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ dịghị eche banyere anyị?

Kama ịdị ngwa ịta Chineke ụta n’ihi ihe yiri ịgba nkịtị n’akụkụ ya, chee echiche laa azụ n’oge ị bụ nwata. Mgbe ndị mụrụ gị na-adịghị enye gị ihe ọ bụla ị chọrọ, ọ̀ dị mgbe i boro ha ebubo na ha ahụghị gị n’anya? Ọtụtụ ụmụaka na-eme otú ahụ. Otú ọ dị, mgbe i tolitere, ị ghọtara na a na-egosipụta ịhụnanya n’ọtụtụ ụzọ nakwa na inye nwatakịrị ihe ọ bụla ọ chọrọ abụghị n’ezie ihe na-egosi ịhụnanya.

N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na Jehova adịghị aza ekpere anyị otú anyị si chọọ mgbe nile, ọ pụtaghị na ọ na-eleghara anyị anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke na-egosi nchegbu ya n’ebe anyị nile nọ n’ọtụtụ ụzọ.

“Site n’Aka Ya Ka Anyị Nwere Ndụ”

Nke mbụ, ọ bụ n’ihi Chineke ka “anyị nwere ndụ, na-ejegharị, na-adịkwa ndụ.” (Ọrụ 17:28) Inye anyị ndụ na-egosi n’ezie nchegbu ịhụnanya ya n’ebe anyị nọ!

Ọzọkwa, Jehova na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa iji wee nọgide na-adị ndụ. Anyị na-agụ, sị: “Onye na-eme ka ahịhịa puoro anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ n’ala puoro ọrụ ubi mmadụ; ime ka nri si n’ala pụta.” (Abụ Ọma 104:14) N’ezie, Onye Okike anyị na-eme ihe karịrị nanị inye anyị ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Ọ na-eji mmesapụ aka enye “mmiri ozuzo site n’eluigwe na oge mkpụrụ ji amị, na-emejupụta obi [anyị] n’ihe oriri na ezi obi ụtọ.”—Ọrụ 14:17.

Ka o sina dị, ụfọdụ pụrụ iche, sị, ‘Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otú ahụ, n’ihi gịnị ka o ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ?’ Ị̀ maara azịza nke ajụjụ ahụ?

Ọ̀ Bụ Chineke Ka Ụta Dịịrị?

Ihe ka ukwuu n’ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata bụ ndị ha kpataara onwe ha. Dị ka ihe atụ, a maara nke ọma ọdachi ndị na-esi n’ihe omume ụfọdụ ndị dị nnọọ ize ndụ apụta. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị mmadụ na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ, na-eji mmanya na-aba n’anya na ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na-eji ụtaba eme ihe, na-eme egwuregwu ndị dị ize ndụ, na-anya ụgbọala ọnwụ ọnwụ, na ihe ndị ọzọ. Ọ bụrụ na omume ndị dị otú ahụ dị ize ndụ akpata ahụhụ, ònye ka a ga-ata ụta? Ọ̀ bụ Chineke ka ọ̀ bụ onye ahụ na-eme omume n’ụzọ amamihe na-adịghị na ya? Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu, sị: “Ekwela ka e duhie gị: Chineke abụghị onye a ga-akwa emo. N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.”—Ndị Galeshia 6:7.

Tụkwasị na nke a, ụmụ mmadụ na-akpatakarịrị ibe ha ihe mgbu. Mgbe otu mba na-alụso ibe ya agha, n’ezie ọ bụghị Chineke ka a ga-ata ụta n’ihi ahụhụ ndị na-esi na ya apụta. Mgbe onye omekome wakporo nwa amaala ibe ya, à ga-ata Chineke ụta maka mmerụ ahụ ọ bụla ma ọ bụ ọnwụ ga-esi na ya pụta? Ọ dịghị ma ọlị! Mgbe onye ọchịchị aka ike na-emegbu ndị ọ na-achị, na-emekpọ ha ọnụ ma na-egbu ha, ànyị kwesịrị ịta Chineke ụta? Nke ahụ ga-abụ ihe ezi uche na-adịghị na ya.—Eklisiastis 8:9.

Otú ọ dị, gịnị banyere ọtụtụ nde ndị bụ ogbenye ọnụ ntụ ma ọ bụ ndị agụụ na-agụgbu? Ọ̀ bụ Chineke ka ụta dịịrị? Ee e. Mbara ala anyị na-enye nnọọ ihe oriri n’ụba iji nyejuo onye ọ bụla afọ. (Abụ Ọma 10:2, 3; 145:16) Ọ bụ ekesaghị ụbara ihe ndị ahụ Chineke nyere n’ụzọ ha nhata na-akpata agụụ na ịda ogbenye ijupụta ebe nile. Ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke ụmụ mmadụ adịghịkwa ekwe ka e dozie nsogbu ahụ.

Isi Ihe Na-akpata Ya

Otú ọ dị, ònye ka a ga-ata ụta mgbe mmadụ rịawara ọrịa ma ọ bụ nwụọ n’ihi nká? Ọ̀ ga-eju gị anya ịmara na ọ bụghị Chineke ka ụta dịịrị ọbụna maka nke ahụ? Chineke ekeghị mmadụ ka ọ na-aka nká ma na-anwụ anwụ.

Mgbe e tinyere di na nwunye mbụ ahụ bụ́ Adam na Iv n’ogige Iden, Jehova nyere ha atụmanya nke ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala. Otú ọ dị, o doro anya na ọ bụ ụmụ mmadụ ndị ga-enwe ekele maka ihe nketa e nyere ha ka ọ chọrọ ka ha biri n’ụwa. N’ihi ya, o mere ka olileanya ha maka ndụ n’ọdịnihu dabere n’ihe ụfọdụ. Adam na Iv ga-ebi n’ime paradaịs nanị ma ọ bụrụ na ha anọgide na-edo onwe ha n’okpuru Onye Okike ha na-ahụ n’anya.—Jenesis 2:17; 3:2, 3, 17-23.

N’ụzọ dị mwute, Adam na Iv nupụrụ isi. Iv họọrọ ige Setan bụ́ Ekwensu ntị. Setan ghaara ya ụgha, na-ekwu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na Chineke na-ezochiri Iv ihe dị mma. N’ihi ya, Iv malitere ịgbaso ụzọ ndụ nke nnwere onwe ma gbalịa ịdị “ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” Adam sonyeere ya ná nnupụisi ya.—Jenesis 3:5, 6.

Mgbe ha mere mmehie a, Adam na Iv gosiri na ha erughị eru ịdị ndụ ebighị ebi. Ha nwetara ihe ndị dị mwute mmehie na-akpata. Ike ha na ume ha belatara, ha mesịkwara nwụọ. (Jenesis 5:5) Otú ọ dị, nnupụisi ha nwere ihe ndị ọzọ ka nnọọ njọ si na ya pụta. Anyị ka na-ata ahụhụ ihe ndị si ná mmehie Adam na Iv pụta. Pọl onyeozi dere, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.” (Ndị Rom 5:12) Ee, n’ihi nnupụisi Adam na Iv, mmehie na ọnwụ gbasara dị ka ọrịa na-egbu egbu n’agbụrụ mmadụ dum.

Ihe Àmà Kasịnụ Na-egosi na Chineke Na-eche Banyere Anyị

Nke ahụ ọ̀ pụtara na nke ụmụ mmadụ Chineke kere eke na-eme agwụla? Ee e, n’ebe a kwa ka anyị na-ahụ ihe àmà kasịnụ na-egosi na Chineke na-eche banyere anyị. N’ịbụ onye o furu ihe dị ukwuu, Chineke nyere ihe a ga-eji gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ ná mmehie na ọnwụ. Ọnụ ahịa ihe mgbapụta ahụ bụ ndụ zuru okè nke Jizọs, nke e ji ọchịchọ obi nye n’ihi anyị. (Ndị Rom 3:24) N’ihi ya, Jọn onyeozi dere, sị: “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) N’ihi ngosipụta nke ịhụnanya a pụtara ìhè, anyị nwere olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi ọzọ. Pọl degaara ndị Rom akwụkwọ sị: “Site n’otu ime ihe ziri ezi, a na-akpọ ụdị mmadụ nile ndị ezi omume maka ndụ.”—Ndị Rom 5:18.

Anyị pụrụ ijide n’aka na n’oge Chineke, a gaghịzi enwe ahụhụ ma ọ bụ ọnwụ n’Ụwa. Kama, a ga-amalite inwe ọnọdụ ndị ahụ e buru amụma ha n’akwụkwọ Mkpughe: “Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) Ị pụrụ ikwu, sị, ‘Agaghị m anọ ndụ hụ mgbe nke ahụ ga-eme.’ Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na ị pụrụ. A sịgodịkwa na ị nwụọ, Chineke pụrụ ịkpọlite gị n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Nke ahụ bụ ihe Chineke zubere imere anyị, nke ahụ bụkwa ihe ga-eme. Lee nnọọ ka o si bụrụ ihe eziokwu na-adịghị na ya ikwu na Chineke adịghị eche banyere ihe a kpọrọ mmadụ!

‘Bịaruo Chineke Nso’

Ọ bụ ihe na-akasi obi ịmara na Chineke amalitewo ime ihe ga-abụ ihe ngwọta ga-adịgide adịgide nye nsogbu nke ahụhụ ụmụ mmadụ. Otú ọ dị, gịnị banyere ugbu a? Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na onye anyị hụrụ n’anya anwụọ ma ọ bụ nwa anyị arịawa ọrịa? Oge Chineke ga-eji ewepụ ọrịa na ọnwụ erubeghị. Bible na-egosi na anyị ga-echetụkwu nwa ntakịrị oge tupu nke ahụ emee. Ma Chineke agbahapụghị anyị n’enweghị enyemaka. Onye na-eso ụzọ bụ́ Jems dere, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Ee, Onye Okike anyị na-akpọ anyị òkù ka anyị bịa soro ya nwee mmekọrịta chiri anya, ndị mekwara otú ahụ adịghị mgbe ha na-agaghị na-enweta nkwado ya ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị taa akpụ.

Olee otú anyị ga-esi bịaruo Chineke nso? Eze Devid jụrụ ajụjụ yiri nke ahụ ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, na-ajụ, sị: “Jehova, . . . ònye ga-ebi n’ugwu nsọ Gị?” (Abụ Ọma 15:1) Devid zara ajụjụ ya n’onwe ya mgbe ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Onye na-eje ije n’izu okè, nke na-arụkwa ọrụ ezi omume, nke na-ekwukwa eziokwu n’obi ya. O jighị ire ya kwuo okwu azụ, o meghị mmadụ ibe ya ihe ọjọọ.” (Abụ Ọma 15:2, 3) Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jehova na-anabata ndị na-agbaso ụzọ ahụ Adam na Iv jụrụ. Ọ na-abịaru ndị na-eme uche ya nso.—Deuterọnọmi 6:24, 25; 1 Jọn 5:3.

Olee otú anyị pụrụ isi mee uche Chineke? Anyị aghaghị ịmụta ihe bụ́ ihe “dị mma ma bụrụ ihe a na-anara nke ọma n’anya Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke,” mgbe ahụkwa, họrọ ime ihe kwekọrọ na ya. (1 Timoti 2:3) Nke ahụ na-agụnye inweta ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. (Jọn 17:3; 2 Timoti 3:16, 17) Ọ na-agụnye ihe karịrị nanị ịgụ Bible elu elu. Ọ dị mkpa ka anyị ṅomie ndị Juu narị afọ mbụ nọ na Biria bụ́ ndị nụrụ nkwusa Pọl. Banyere ha, anyị na-agụ, sị: “Ha ji ọchịchọ obi siri nnọọ ike nabata okwu ahụ, jiri nlezianya na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.”—Ọrụ 17:11.

N’otu aka ahụ taa, iji nlezianya na-amụ Bible na-ewusi okwukwe anyị n’ebe Chineke nọ ike ma na-enyere anyị aka iwulite mmekọrịta chiri anya n’etiti anyị na ya. (Ndị Hibru 11:6) Ọ na-enyekwara anyị aka ịghọta kpọmkwem otú Jehova si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe—ọ bụghị nanị maka abamuru ndị na-adịghị adịte aka ma karịsịa maka ọdịmma na-adịte aka nke ndị nile obi ha ziri ezi.

Tụlee ihe Ndị Kraịst ole na ole kwuru bụ́ ndị ha na Chineke nwere mmekọrịta chiri anya. “Ahụrụ m Jehova n’anya nke ukwuu, enwekwara m ọtụtụ ihe ikele ya maka ha,” ka Danielle dị afọ 16 na-ekwu. “O nyere m nne na nna na-ahụ n’anya bụ́ ndị nwere ezi ịhụnanya n’ebe ọ nọ, ndị zikwara m ihe n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu ya.” Otu Onye Kraịst na Uruguay dere, sị: “Obi m jupụtara n’ekele, a na-akpalikwa m ikele Jehova maka obiọma ya na-erughịrị m na maka ọbụbụenyi ya.” Chineke na-anabata ọbụna obere ụmụaka. Gabriela dị afọ asaa, na-ekwu, sị: “Ahụrụ m Chineke n’anya karịa ihe ọ bụla ọzọ n’ụwa a! Enwere m Bible nke m. Ọ na-amasị m ịmụ banyere Chineke na Ọkpara ya.”

Taa, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile ji obi ha dum na-ekwenyere ọbụ abụ ahụ bụ́ onye kwuru, sị: “Ịbịaru Chineke nso dị m mma.” (Abụ Ọma 73:28) E nyeworo ha aka ịnagide nsogbu ndị ha na-eche ihu ugbu a, ha nwekwara olileanya siri ike nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala. (1 Timoti 4:8) Gịnị ma i mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ‘ịbịaru Chineke nso’? N’ezie, e mesiri anyị obi ike, sị: “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ 17:27) Ee, Chineke na-eche banyere gị n’ezie!

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

A na-ahụ nchegbu Jehova n’ebe anyị nọ n’ọtụtụ ụzọ

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọbụna ụmụaka pụrụ ịbịaru Chineke nso

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Taa, Jehova na-enyere anyị aka ịtachi obi. Mgbe oge ruru, ọ ga-ewepụ ọrịa na ọnwụ