Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Nketa Kasị Baa Uru E Nwere

Ihe Nketa Kasị Baa Uru E Nwere

 Ihe Nketa Kasị Baa Uru E Nwere

KA OGE ọnwụ ya na-eru nso, Jọn onyeozi meworo okenye dere, sị: “Ọ dịghị ihe ga-akpatara m inwe obi ekele nke karịrị ihe ndị a, na m ga na-anụ na ụmụ m nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 4.

Onyeozi ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ezo aka n’ụmụ ime mmụọ ya. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nne na nna ga-ekwughachi ihe ahụ onyeozi ahụ kwuru. Ha arụsiwo ọrụ ike ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova,” ugbu a kwa, ha na-enwe ọṅụ ịhụ ka ụmụ ha ndị toro eto “na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (Ndị Efesọs 6:4) N’ezie, mmadụ ịkụziri ụmụ ya ụzọ nke ndụ agwụghị agwụ bụ inye ha ihe nketa kasị baa uru e nwere. Nke ahụ bụ n’ihi na nsọpụrụ Chineke, bụ́ nke gụnyere ibi ndụ dị ka Jehova si chọọ ka Ndị Kraịst na-ebi, “nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.”—1 Timoti 4:8.

Jehova, bụ́ Nna ahụ zuru okè, na-eji ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị na-agbalịsi ike ịzụ ụmụ ha n’ụzọ ime mmụọ akpọrọ ihe nke ukwuu. Mgbe ụmụaka nabatara ọzụzụ ahụ, ha na-enweta ọṅụ dị ukwuu n’iso ndị mụrụ ha na-efe ezi ofufe. Ka ụmụaka dị otú ahụ na-etozu okè, ha na-enwe ọtụtụ ihe ndị na-enye obi ụtọ ha na-echeta banyere oge ndị dị otú ahụ. Ụfọdụ na-eji obi ụtọ echeta mgbe mbụ ha keere òkè n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. * Ma ọ bụ ikekwe, ha pụrụ icheta mgbe mbụ ha gụrụ otu akụkụ Bible n’ozi ụlọ n’ụlọ mgbe ha na otu n’ime ndị mụrụ ha so. Olee otú ha pụrụ isi chefuo mgbe ndị mụrụ ha na-agụrụ ha Akwukwọm nke Akukọ Bible ma ọ bụ Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti? * Gabriel na-echeta ihe mesịrị na-amasị ya nke ukwuu: “Mgbe m dị nanị afọ anọ, mama m na-abụrụ m abụ kwa ụbọchị ka ọ na-esi nri. M ka ji mmetụta miri emi na-echeta otu abụ Alaeze. Mgbe e mesịrị, abụ ahụ nyeere m aka ịhụ ịdị mkpa nke ozi Jehova.” Ikekwe gị onwe gị kwa na-echeta ọmarịcha abụ ahụ Gabriel na-ezo aka na ya. Ọ bụ abụ nke 73 n’akwụkwọ abụ bụ́ ‘Na-abụnụ Abụ, Na-ekwekwanụ Ukwe n’Ime Obi Unu,’ isiokwu ya bụkwa “Fee Jehova n’Okorobịa!”

Abụ ahụ si otú a malite: “Ọnụ ụmụnta na-enye Chineke otuto;/Ha weliri olu ha ito Jizọs.” N’ezie, e nwere ụmụaka ndị nwere ihe ùgwù nke iso Jizọs kpakọrịta, o yikwara ka hà ji àgwà ezoghị ọnụ ha nke na-enye ume ọhụrụ  mee ya obi ụtọ. Ọbụna Jizọs ji ụmụaka ịbụ ndị a pụrụ izi ihe meere ụmụazụ ya ihe atụ ha kwesịrị iṅomi. (Matiu 18:3, 4) Ya mere, ụmụaka nwere ọnọdụ kwesịrị ekwesị n’ofufe Jehova. N’ezie, abụ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ee, ụmụnta pụrụ ito Chineke.”

Site n’omume ha kwesịrị nṅomi—n’ụlọ, n’ụlọ akwụkwọ, na n’ebe ndị ọzọ—ọtụtụ ụmụaka ewetaworo Chineke na ezinụlọ ha nsọpụrụ. Lee ngọzi ọ bụwooro ha inwe “nna na nne ndị hụrụ eziokwu n’anya.” (Deuterọnọmi 6:7) Ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke na-eme ihe Chineke kwuru, bụ́ onye dị ka Nna na-ahụ n’anya, na-akụziri ndị o kere eke ije ije n’ụzọ ha kwesịrị ijeso. Leekwa ngọzi ha na-enweta! Ka ha onwe ha, n’aka nke ha, na-akụziri ndị na-eto eto nọ n’ime ezinụlọ ha ihe, lee ka ha si enwe obi ụtọ inwe ụmụ ndị ‘na-erube isi wee mee ha obi ụtọ’! (Aịsaịa 48:17, 18) Angélica, bụ́ onye na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico, na-ekwu, sị: “Ndị mụrụ m gbalịrị mgbe nile itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Nke ahụ mere ka oge ịbụ nwata m bụrụ ihe na-atọ ụtọ nke ukwuu. Enwere m obi ụtọ.”

Ndị Kraịst dị otú ahụ kwetara na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị gị ilekọta ihe nketa ime mmụọ gị nke ọma. Ma eleghị anya, ị bụ onye ntorobịa a na-azụlite n’ime ezinụlọ na-agbaso ezi ụkpụrụ Ndị Kraịst. Ọ bụrụ otú ahụ, otu abụ ahụ na-agbakwa gị ume, sị: “Unu ụmụnta Ndị Kraịst sonụ ụzọ dị ọcha.” Oge ga-abịa mgbe ị ga-eme mkpebi nke gị, ya mere ugbu a “mụtanụ ịdabere na Jehova./Agbasola ụzọ nke ịbụ onye a ma ama.”

Ọ bụrụ na i hie ụzọ site n’ibute ịbụ onye a ma ama ụzọ ná ndụ gị, ọzụzụ nile i nwetaworo pụrụ ịbụ ihe efu, ị pụkwara imebi atụmanya gị maka ọdịnihu. Ọchịchọ nke ịbụ onye a ma ama pụrụ ime ka ị gharazie ịnọ na nche. Ụfọdụ amalitewo iso ndị, ọ bụ ezie na ha yiri ndị ezigbo mmadụ, ọbụna ndị na-adọrọ mmasị, ma ha bụ ndị na-enweghị mmasị n’ụkpụrụ Ndị Kraịst, na-akpakọrịta. E ji Tara, bụ́ onye bụ́ isi e gosiri na vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? mee ihe atụ nke ahụ. Dị ka Tara, Onye Kraịst ọ bụla na-eto eto nke na-eso ndị na-ejighị ezi ofufe kpọrọ ihe akpakọrịta ga-achọpụta n’oge na-adịghị anya na “ndị enyi ọjọọ na-emebi ezi omume,” dị ka abụ ahụ na-ekwu. Ọ na-ewe ọtụtụ afọ iji zụlite ezi àgwà, ma a pụrụ imebi ya ngwa ngwa.

N’eziokwu, ụzọ ndụ nke ịtụ egwu Chineke adịghị mfe. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka abụ ahụ gara n’ihu ikwu, ‘i cheta Chineke gị na nwata,/wee fee Jehova na mmụọ na eziokwu,’ ị ga-atọ ntọala siri ike maka ezi ihe ịga nke  ọma. ‘Mgbe ị na-etolitekwa ị ga-enwe ọṅụ karị.’ Ị ga-achọpụtakwu nnọọ na n’okpuru nlekọta ịhụnanya Jehova, ọ dịghị ihe pụrụ ịkwụsị gị ime ihe ziri ezi n’anya ya. Nke ahụ bụ ụzọ isi ghọọ onye toro eto nke tozuru okè, nke na-atụ egwu Chineke. Tụkwasị na nke ahụ, iji amamihe na-eji ọzụzụ e nyere gị dị ka Onye Kraịst eme ihe na-enye gị ohere nke ‘ime ka obi Chineke ṅụrịa ọṅụ!’ Ọ̀ dị ihe ùgwù mmadụ pụrụ inwe nke ga-akarị nke ahụ?—Ilu 27:11.

Ya mere, ndị ntorobịa, na-echetanụ mgbe nile otú ọzụzụ sitere n’aka Jehova na ndị nne na nna unu bụ́ Ndị Kraịst baruru n’uru. Ka ịhụnanya dị ukwuu ha nwere n’ebe unu nọ kpalie unu ime ihe dị mma n’anya Jehova. Dị ka Jizọs Kraịst na Timoti na-eto eto bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi, unu ga-eme ka Nna unu nke eluigwe na ndị mụrụ unu n’ụwa nwee obi ụtọ. Ọ bụrụkwa na unu emechaa ghọọ ndị nne ma ọ bụ nna, ikekwe unu ga-ekwenyere Angélica, bụ́ onye a kpọrọ aha n’elu, bụ́ onye kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mụ emesịa mụọ nwa, aga m agbalịsi nnọọ ike ịkụnye ịhụnanya maka Jehova n’ime obi ya site na nwa ọhụrụ, iji mee ka nke ahụ bụrụ ihe na-eduzi ya ná ndụ.” N’ezie, ụzọ ziri ezi nke na-eduba ná ndụ agwụghị agwụ bụ ihe nketa kasị baa uru e nwere!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Usoro nkụzi Bible a a na-enwe n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dịịrị ma ndị na-eto eto ma ndị toro eto.

^ par. 4 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ ndị ahụ a kpọtụrụ aha.