Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Agadi—Ndị Bara Uru N’òtù Ụmụnna Ndị Kraịst Anyị

Ndị Agadi—Ndị Bara Uru N’òtù Ụmụnna Ndị Kraịst Anyị

 Ndị Agadi—Ndị Bara Uru N’òtù Ụmụnna Ndị Kraịst Anyị

“Ndị a kụworo n’ụlọ Jehova . . . ga-ama akwụkwọ . . . Ha ga-anọ na-amị mkpụrụ n’isi awọ.”—ABỤ ỌMA 92:13, 14.

1. Olee otú ọtụtụ ndị si ele ndị agadi anya?

JEHOVA hụrụ ndị ohu ya nile na-ekwesị ntụkwasị obi n’anya, gụnyere ndị nke meworo agadi. Otú ọ dị, dị ka atụmatụ otu mba mere si dị, kwa afọ, a na-emeso ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara otu nde ndị agadi nọ na United States mmeso ọjọọ ma ọ bụ na-eleghara ha anya. Akụkọ ndị yiri nke ahụ bụ́ ndị sitere n’akụkụ nile nke ụwa na-egosi na imeso ndị agadi mmeso ọjọọ bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ. Ihe na-akpata ya bụ ihe otu òtù kpọrọ “echiche ọtụtụ ndị nwere . . . nke bụ́ na ndị agadi bụ ndị na-abaghịzi uru, ndị na-adịghịzi arụpụta ihe na ndị na-adabere n’ebe ndị ọzọ nọ gabiga ókè.”

2. (a) Olee otú Jehova si ele ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi meworo agadi anya? (b) Nkọwa dị aṅaa na-ekpo obi ọkụ ka anyị na-achọta n’Abụ Ọma 92:12-15?

2 Jehova Chineke na-eji ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe meworo agadi akpọrọ ihe. Ọ na-elekwasị anya ná “mmadụ anyị bụ n’ime ahụ́”—ọnọdụ ime mmụọ anyị—kama ilekwasị anya n’adịghị ike elu ahụ́ anyị. (2 Ndị Kọrint 4:16) N’Okwu ya, bụ́ Bible, anyị na-achọta mmesi obi ike a na-ekpo obi ọkụ: “Onye ezi omume ga-awa igu dị ka nkwụ: dị ka osisi cedar n’ime Lebanọn ka ọ ga-ebu ibu. Ndị a kụworo n’ụlọ Jehova dị ka osisi ga-ama akwụkwọ n’ogige nile nke Chineke anyị. Ha ga-anọ na-amị mkpụrụ n’isi awọ; osisi nke mmiri dị ha n’ahụ́ hie nne, nke nwezukwara akwụkwọ ndụ, ka ha ga-abụ. Igosi na Jehova ziri ezi.” (Abụ Ọma 92:12-15) Ịtụle amaokwu ndị a ga-ekpughe ihe ụfọdụ ndị bara uru unu bụ́ ndị agadi pụrụ ime n’òtù ụmụnna Ndị Kraịst.

“Na-amị Mkpụrụ n’Isi Awọ”

3. (a) N’ihi gịnị ka e ji jiri ndị ezi omume tụnyere osisi nkwụ? (b) Olee otú ndị agadi pụrụ isi “na-amị mkpụrụ n’isi awọ”?

3 Ọbụ abụ ahụ ji onye ezi omume tụnyere osisi nkwụ nke ‘a kụrụ n’ogige nile nke Chineke anyị.’ Ha “ga-anọ na-amị mkpụrụ n’isi awọ.” Nsụgharị ọzọ na-agụ, sị: “N’agadi, ha ka na-amị mkpụrụ.” (Tanakh) Í kweghị na nke a bụ okwu na-agba ume? A na-ahụkarị osisi nkwụ ndị mara mma ma kwụrụ kwem n’ogige ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa n’oge Bible. Tụkwasị n’uru ha bara dị ka ihe ndị e ji achọ ógbè mma, osisi nkwụ bara uru n’ihi mkpụrụ ha na-amị n’ụba, ụfọdụ na-anọgidekwa na-amị mkpụrụ  ruo ihe karịrị otu narị afọ. * Site n’ịnọgide na-agbanyesi mkpọrọgwụ ike n’ezi ofufe, ị pụrụ n’otu aka ahụ ‘ịnọgide na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla.’—Ndị Kọlọsi 1:10.

4, 5. (a) Mkpụrụ dị aṅaa dị mkpa ka Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-amịpụta? (b) Nye ihe atụ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke ndị agadi bụ́ ndị mịpụtara “mkpụrụ egbugbere ọnụ.”

4 Jehova na-atụ anya ka Ndị Kraịst na-amị “mkpụrụ egbugbere ọnụ”—okwu ndị e kwuru iji too ya na nzube ya. (Ndị Hibru 13:15) Nke a ò metụtara gị dị ka onye agadi? N’ezie, o metụtara gị.

5 Bible nwere ihe atụ nke ndị agadi bụ́ ndị gbara àmà banyere aha Jehova na nzube ya n’atụghị egwu. Mozis agafeelarị “afọ iri asaa” ya mgbe Jehova nyere ya ọrụ dị ka onye amụma na onye nnọchianya ya. (Abụ Ọma 90:10; Ọpụpụ 4:10-17) Ime agadi egbochighị Daniel onye amụma ịgba àmà n’atụghị egwu banyere ọbụbụeze Jehova. Eleghị anya Daniel dị afọ 90 na ụma mgbe Belshaza kpọrọ ya ka ọ kọwaa ihe ahụ dị omimi aka dere ná mgbidi. (Daniel, isi 5) Gịnịkwanụ banyere Jọn onyeozi meworo agadi? Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke ije ozi ya were ogologo oge, ọ chọtara onwe ya n’agwaetiti Patmọs dị ka onye mkpọrọ “n’ihi ikwu banyere Chineke na ịgbara Jizọs àmà.” (Mkpughe 1:9) Eleghị nnọọ anya ị pụrụ icheta ọtụtụ ndị a kpọrọ aha na Bible bụ́ ndị mịrị “mkpụrụ egbugbere ọnụ” n’oge agadi ha.—1 Samuel 8:1, 10; 12:2; 1 Ndị Eze 14:4, 5; Luk 1:7, 67-79; 2:22-32.

6. Olee otú Jehova siworo jiri “ndị agadi” na-ebu amụma n’ụbọchị ikpeazụ ndị a?

6 N’ihota okwu onye amụma Hibru bụ́ Joel, Pita onyeozi kwuru, sị: “‘N’ụbọchị ikpeazụ,’ ka Chineke na-ekwu, ‘m ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla [gụnyere “ndị agadi”], . . . ha ga-ebukwa amụma.’” (Ọrụ 2:17, 18; Joel 2:28) N’ikwekọ na nke ahụ, n’ụbọchị ikpeazụ ndị a, Jehova ejiriwo ndị agadi e tere mmanụ na ndị nke so ‘n’atụrụ ọzọ’ mee ihe n’ikwusa nzube ya. (Jọn 10:16) Ụfọdụ n’ime ndị a ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi nọgide na-amịpụta mkpụrụ Alaeze kemgbe ọtụtụ iri afọ.

7. Nye ihe atụ nke otú ndị agadi si nọgide na-amịpụta mkpụrụ Alaeze n’agbanyeghị adịghị ike anụ ahụ́.

7 Tụlee ihe banyere Sonia, bụ́ onye ghọrọ onye nkwusa Alaeze oge nile na 1941. N’agbanyeghị ọrịa na-adịghị ala ala nke ya na ya nọworo na-alụ eri ogologo oge, ọ na-eduzi ọmụmụ Bible n’ụzọ chiri anya n’ebe obibi ya. “Ikwusa ozi ọma bụ akụkụ nke ndụ m,” ka Sonia na-akọwa. “N’ezie, ọ bụ ndụ m. Ajụrụ m ịla ezumike nká.” N’oge na-adịbeghị anya, Sonia na nwanne ya nwanyị bụ́ Olive, ziri Janet, bụ́ onye na-arịa ọrịa ga-egbu ya, onye ha zutere n’ụlọ nchere nke ụlọ ọgwụ, ozi olileanya nke Bible. Mama Janet, bụ́ onye na-ekpesi Katọlik ike, nwere obi ụtọ ná mmasị ịhụnanya a e gosiri nwa ya nwanyị nke na o kwere ka e duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi, ọ na-enwekwa ọganihu magburu onwe ya ugbu a. Ị̀ pụrụ iji ohere ndị yiri nke ahụ na-amịpụta mkpụrụ Alaeze?

8. Olee otú Keleb meworo agadi si gosipụta na ya tụkwasịrị Jehova obi, oleekwa otú Ndị Kraịst meworo agadi pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ya?

8 Site n’iji obi ike na-aga n’ihu n’ọrụ nkwusa Alaeze n’agbanyeghị adịghị ike ndị ime agadi na-akpata, Ndị Kraịst meworo agadi  na-agbaso nzọụkwụ nke onye Izrel kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Keleb, onye sonyeere Mozis ruo afọ iri anọ n’ịkpa. Keleb dị afọ 79 mgbe ọ gafere Osimiri Jọdan banye n’Ala Nkwa ahụ. Ka o sosịrị usuu ndị agha Izrel na-enwe mmeri lụọ agha ruo afọ isii, ọ gaara enwewo afọ ojuju n’ihe ọ rụzuworo. Ma o meghị otú ahụ, o ji obi ike rịọ ka e nye ya ọrụ tara akpụ nke inweta “obodo dị ukwuu e wusiri ike” dị n’ugwu nke Juda, bụ́ ebe ndị Anakịm bi, bụ́ ndị gbara nnọọ dimkpa. Site n’enyemaka Jehova, Keleb ‘napụrụ ha ala ha dị ka Jehova kwuru.’ (Joshua 14:9-14; 15:13, 14) Jide n’aka na Jehova nọnyeere gị, dị ka ọ nọnyeere Keleb, ka ị nọgidere na-amịpụta mkpụrụ Alaeze n’agadi. Ọ bụrụkwa na ị nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ ga-enye gị òkè n’ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa.—Aịsaịa 40:29-31; 2 Pita 3:13.

“Osisi nke Mmiri Dị Ha n’Ahụ́ Hie Nne, nke Nwezukwara Akwụkwọ Ndụ, Ka Ha Ga-abụ”

9, 10. Olee otú Ndị Kraịst meworo agadi si anọgide na-adị ike n’okwukwe ma nọgide na-enwe ike ime mmụọ? (Lee igbe dị na peeji nke 13.)

9 N’ịdọrọ uche gaa n’ịmị mkpụrụ nke ndị ohu Jehova meworo agadi, ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Onye ezi omume ga-awa igu dị ka nkwụ: dị ka osisi cedar n’ime Lebanọn ka ọ ga-ebu ibu. Ha ga-anọ na-amị mkpụrụ n’isi awọ; osisi nke mmiri dị ha n’ahụ́ hie nne, nke nwezukwara akwụkwọ ndụ, ka ha ga-abụ.”—Abụ Ọma 92:12, 14.

10 Olee otú ị pụrụ isi nọgide na-enwe ike ime mmụọ n’agbanyeghị ime agadi? Isi ihe na-eme ka osisi nkwụ nọgide na-ama mma bụ na mkpọrọgwụ ya na-enweta mmiri mgbe nile. N’ụzọ yiri nke ahụ, ị pụrụ inweta ihe ga-enyere gị aka ịnọgide na-agbasi ike ná mmiri nke eziokwu Bible site n’ịmụ Okwu Chineke nakwa iso nzukọ ya na-akpakọrịta. (Abụ Ọma 1:1-3; Jeremaịa 17:7, 8) Ike ime mmụọ gị na-eme ka ị bụrụ onye dị oké ọnụ ahịa nye ndị kwere ekwe ibe gị. Tụlee otú nke a si bụrụ eziokwu n’ihe banyere Nnukwu Onye Nchụàjà meworo agadi bụ́ Jehoịada.

11, 12. (a) Òkè dị aṅaa dị oké mkpa ka Jehoịada keere n’akụkọ ihe mere eme nke alaeze Juda? (b) Olee otú Jehoịada si jiri ọnọdụ ya kwalite ezi ofufe?

11 Eleghị anya Jehoịada akarịwo otu narị afọ mgbe Eze Nwanyị Atalaịa nwere oké ọchịchọ weghaara ọchịchị Juda site n’igbu ụmụ nwa ya. Gịnị ka Jehoịada meworo agadi pụrụ ime? Ruo afọ isii, ya na nwunye ya zoro nanị onye nketa fọdụrụ ndụ nke ocheeze ahụ, bụ́ Jehoash, n’ụlọ nsọ. Mgbe ahụ, n’ime ihe dị ịtụnanya, Jehoịada kpọsara Jehoash dị afọ asaa dị ka eze ma mee ka e gbuo Atalaịa.—2 Ihe E Mere 22:10-12; 23:1-3, 15, 21.

12 Dị ka onye na-elekọta eze ahụ, Jehoịada ji ọnọdụ ya kwalite ezi ofufe. O “wee mee ọgbụgba ndụ nke dị n’etiti ya na ndị Juda nile na eze, na ha ga-abụ ndị Jehova nwere.” N’ihi iwu Jehoịada nyere, ndị ahụ kwadara ụlọ chi ụgha bụ́ Bel ma wepụ ebe ịchụàjà ya, ihe oyiyi ya, na ndị nchụàjà ya. Ọ bụkwa n’okpuru nduzi Jehoịada ka Jehoash mere ka a maliteghachi ije ozi n’ụlọ nsọ ahụ ma rụzie ọtụtụ ihe ndị dị oké mkpa ka a rụzie n’ụlọ nsọ ahụ. “Jehoash wee mee ihe ziri ezi n’anya Jehova ụbọchị nile nke Jehoịada, bụ́ onye nchụàjà, ziri ya ihe.” (2 Ihe E Mere 23:11, 16-19; 24:11-14; 2 Ndị Eze 12:2) Mgbe ọ nwụrụ ka ọ gbasịrị afọ 130, e nyere Jehoịada ihe ùgwù pụrụ iche nke ilikọta ya na ndị eze n’ihi na “o mere ezi ihe n’Izrel, na n’ebe Chineke na ụlọ Ya dị.”—2 Ihe E Mere 24:15, 16.

13. Olee otú Ndị Kraịst meworo agadi pụrụ isi ‘na-eme ezi ihe n’ebe Chineke na ụlọ Ya dị’?

13 Ikekwe ọrịa ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ na-ebelata ihe ị pụrụ ime iji kwalite ezi ofufe. Ọ bụrụgodị otú ahụ, ị ka nwere ike ‘ime ezi ihe n’ebe Chineke na ụlọ Ya dị.’ Ị pụrụ igosipụta ịnụ ọkụ n’obi maka ụlọ ime mmụọ nke Jehova site n’ịga na ikere òkè ná nzukọ ọgbakọ nakwa site n’ikere òkè n’ozi ubi mgbe ọ bụla o kwere gị mee. Gị ịdị njikere ịnakwere ndụmọdụ Bible na iji iguzosi ike n’ihe na-akwado “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na ọgbakọ ga-ewusi òtù ụmụnna  Ndị Kraịst anyị ike. (Matiu 24:45-47) Ị pụkwara ịkpali ndị gị na ha na-efekọ ofufe “inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” (Ndị Hibru 10:24, 25; Faịlimọn 8, 9) Ị ga-abụkwara ndị ọzọ ngọzi ma ọ bụrụ na i mee ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ka ndị nwoke meworo agadi nwee àgwà imeru ihe n’ókè, na-eji ihe akpọrọ ihe, nwee uche zuru okè, dị ike [“nwee ume,”An American Translation] n’okwukwe, n’ịhụnanya, ná ntachi obi. N’otu aka ahụ, ka ndị nwanyị meworo agadi nwee àgwà ịsọpụrụ Chineke, n’abụghị ndị nkwutọ, n’abụghị ndị ohu nye oké mmanya, bụrụ ndị na-akụzi ihe dị mma.”—Taịtọs 2:2-4.

14. Gịnị ka ndị nlekọta bụ́ Ndị Kraịst jeworo ozi ruo ogologo oge pụrụ ime iji kwalite ezi ofufe?

14 Ì jewo ozi dị ka okenye ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ? “Jiri amamihe i nwetaworo ka ị na-eme agadi na-eme ihe n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị,” bụ ndụmọdụ otu okenye ọgbakọ nke jeworo ozi ruo ogologo oge nyere. “Kenye ndị ọzọ ọrụ ma soro ndị dị njikere ịmụta ihe kerịta ahụmahụ gị . . . Chọpụta ihe ndị ọzọ pụrụ ime. Zụlite ma wulite ya. Na-akwadebe maka ọdịnihu.” (Deuterọnọmi 3:27, 28) Ezi mmasị i nwere n’ọrụ Alaeze nke nọgidere na-agbasawanye ga-ewetara ndị ọzọ nọ n’òtù ụmụnna Ndị Kraịst anyị ọtụtụ ngọzi.

“Igosi na Jehova Ziri Ezi”

15. Olee otú Ndị Kraịst meworo agadi si ‘egosi na Jehova ziri ezi’?

15 Ndị ohu Chineke meworo agadi ji ọṅụ na-arụ ọrụ ha nke “igosi na Jehova ziri ezi.” Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst meworo agadi, okwu ọnụ gị na omume gị pụrụ igosi ndị ọzọ na ‘Jehova bụ oké nkume gị, ọ dịghịkwa ajọ omume dị n’ime ya.’ (Abụ Ọma 92:15) Osisi nkwụ na-agba akaebe n’ekwughị okwu banyere àgwà na-enweghị atụ nke Onye Okike ya. Ma Jehova enyewo gị ihe ùgwù nke ịgbara ndị na-anabata ezi ofufe ugbu a àmà banyere ya. (Deuterọnọmi 32:7; Abụ Ọma 71:17, 18; Joel 1:2, 3) N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa?

16. Ihe atụ dị aṅaa dị na Bible na-egosi mkpa ọ dị “igosi na Jehova ziri ezi”?

16 Mgbe onye ndú Izrel bụ́ Jọshụa ghọrọ “agadi, mgbe ụbọchị ndụ ya na-agwụ,” ọ “kpọrọ Izrel nile, bụ́ ndị okenye ha, na ndị isi ha, na ndị ikpe ha, na ndị odozi okwu ha,” iji  chetara ha ezi mmeso nke Chineke. Ọ sịrị: “Ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu.” (Joshua 23:1, 2, 14) Ruo oge ụfọdụ, okwu ndị a wusiri mkpebi ndị ahụ mere ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, ike. Otú ọ dị, mgbe Jọshụa nwụsịrị, “ọgbọ ọzọ wee bilie . . . ndị na-amaghị Jehova, ha amaghịkwa omume nke O meere Izrel. Ụmụ Izrel wee mee ihe ọjọọ n’anya Jehova, fee Bealim ofufe.”—Ndị Ikpe 2:8-11.

17. Olee otú Jehova siworo na-emeso ndị ya ihe n’oge a?

17 Iguzosi ike n’ihe nke ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge a adabereghị n’akaebe ndị ohu Chineke meworo agadi ji ọnụ gbaa. N’agbanyeghị nke ahụ, okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ na ná nkwa ya na-esikwu ike mgbe anyị nụrụ site n’ọnụ ndị ji anya ha hụ ihe merenụ akụkọ banyere “oké ọrụ” ndị ọ rụwooro ndị ya n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. (Ndị Ikpe 2:7; 2 Pita 1:16-19) Ọ bụrụ na i sowo nzukọ Jehova kpakọrịta ruo ọtụtụ afọ, ị pụrụ icheta mgbe e nwere ndị nkwusa Alaeze ole na ole n’ógbè ma ọ bụ ná mba gị ma ọ bụ mgbe a na-emegide ọrụ nkwusa ahụ n’ụzọ siri ike. Ka oge na-aga, ị hụwo ka Jehova wepụrụ ihe mgbochi ụfọdụ ma mee ka Alaeze ahụ too ‘ngwa ngwa.’ (Aịsaịa 54:17; 60:22) Ị hụwo otú e si na-eme ka eziokwu Bible na-edo anya, hụkwa nnụcha na-aga n’ihu n’ihu nke akụkụ a na-ahụ anya nke nzukọ Chineke. (Ilu 4:18; Aịsaịa 60:17) Ị̀ na-achọ iwuli ndị ọzọ elu site n’iso ha kerịta ahụmahụ i nweworo banyere ezi mmeso nke Jehova? Lee mmetụta ziri ezi na nke na-ewusi ike nke a pụrụ inwe n’ebe òtù ụmụnna Ndị Kraịst nọ!

18. (a) Nye ihe atụ nke mmetụta na-adịte aka nke “igosi na Jehova ziri ezi” na-enwe. (b) Olee otú i siworo hụ izi ezi nke Jehova site n’ahụmahụ nke gị?

18 Gịnị banyere mgbe i nwetara nlekọta na nduzi ịhụnanya Jehova ná ndụ gị? (Abụ Ọma 37:25; Matiu 6:33; 1 Pita 5:7) Otu nwanna nwanyị meworo agadi aha ya bụ Martha na-adị na-agba ndị ọzọ ume site n’ikwu, sị: “N’agbanyeghị ihe merenụ, ya adịla mgbe ị ga-agbahapụ Jehova. Ọ ga-akwagide gị.” Ndụmọdụ a nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ Tolmina, otu n’ime ndị Martha mụụrụ Bible bụ́ onye e mere baptizim ná mmalite afọ ndị 1960. “Mgbe di m nwụrụ,” ka Tolmina na-echeta, “enwere m nnọọ nkụda mmụọ, ma okwu ndị ahụ mere ka m kpebisie ike ịghara ịhapụ nzukọ nke ọ bụla. Jehova wusikwara m ike n’ezie.” Tolmina enyewo ọtụtụ n’ime ndị ya onwe ya na-amụrụ Bible otu ndụmọdụ ahụ eri ọtụtụ afọ. N’ezie, site n’inye ndị ọzọ agbamume na icheta ezi mmeso nke Jehova, ị pụrụ inye aka nke ukwuu n’iwulite okwukwe nke ndị kwere ekwe ibe gị.

 Jehova Na-eji Ndị Agadi Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Akpọrọ Ihe

19, 20. (a) Olee otú Jehova si ele ọrụ ndị ohu ya meworo agadi na-arụ anya? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ụwa taa, nke e ji enweghị ekele mara, enweghị ohere maka ndị agadi. (2 Timoti 3:1, 2) Mgbe e chetara ha, ọ na-abụkarị n’ihi ihe ndị ha rụzuru n’oge gara aga—ihe ha bụbu kama ịbụ n’ihi ihe ha bụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, Bible na-ekwu, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi.” (Ndị Hibru 6:10) N’ezie, Jehova Chineke na-echeta ọrụ ndị i ji ikwesị ntụkwasị obi rụọ n’oge gara aga. O jikwa gị kpọrọ ihe n’ihi ihe ị nọgidere na-eme n’ozi ya. Ee, ọ na-ele ndị agadi na-ekwesị ntụkwasị obi anya dị ka Ndị Kraịst na-amị mkpụrụ, ndị dị ike n’ụzọ ime mmụọ, na ndị nwere ume—ndị ndụ ha na-agba akaebe banyere ike ya.—Ndị Filipaị 4:13.

20 Ị̀ na-ele ndị agadi nọ n’òtù ụmụnna Ndị Kraịst anya dị ka Jehova si ele ha? Ọ bụrụ na ị na-ele ha anya otú ahụ, a ga-akpali gị igosipụta ịhụnanya i nwere n’ebe ha nọ. (1 Jọn 3:18) Isiokwu na-esonụ ga-atụle ụzọ ndị dị irè isi na-egosipụta ịhụnanya dị otú ahụ n’igbo mkpa ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Isi nkwụ date ọ bụla pụrụ inwe ihe dị ka otu puku mkpụrụ, ọ pụkwara ịdị kilogram asatọ ma ọ bụ karịa n’arọ. Otu onye edemede mere atụmatụ na “osisi [nkwụ] ọ bụla na-amị mkpụrụ ga-amịworo onye nwe ya mkpụrụ nke ịdị arọ ha ga-adị tọn abụọ ma ọ bụ atọ tupu ya anwụọ.”

Gịnị Bụ Azịza Gị?

• Olee otú ndị agadi si ‘amị mkpụrụ’?

• N’ihi gịnị ka ike ime mmụọ nke Ndị Kraịst meworo agadi ji bụrụ ihe bara uru?

• Olee otú ndị agadi pụrụ isi ‘na-egosi na Jehova ziri ezi’?

• N’ihi gịnị ka Jehova ji eji ndị ohu ya jeworo ozi ruo ogologo oge akpọrọ ihe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 13]

Otú Ha Siworo Nọgide Na-adị Ike n’Okwukwe

Gịnị nyewooro Ndị Kraịst jeworo ozi ruo ogologo oge aka ịnọgide na-adị ike n’okwukwe na ịnọgide na-enwe ume n’ụzọ ime mmụọ? Nke a bụ ihe ụfọdụ n’ime ha kwuworo:

“Ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-ekwu banyere mmekọrịta anyị na Jehova dị oké mkpa. Ọtụtụ abalị, m na-agụghachi Abụ Ọma nke 23 na nke 91 n’isi.”—Olive, onye e mere baptizim na 1930.

“Emewo m ka ọ bụrụ àgwà m ịnọ ya mgbe a na-ekwu okwu baptizim ọ bụla na ige ntị nke ọma, dị ka à ga-asị na ọ bụ baptizim nke m. Ime ka nraranye m na-adị ọhụrụ n’uche m abụwo nzọụkwụ dị mkpa n’ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi.”—Harry, onye e mere baptizim na 1946.

“Ikpe ekpere kwa ụbọchị dị oké mkpa—na-arịọ Jehova mgbe nile maka enyemaka, nchebe na ngọzi, ‘na-amara ya n’ụzọ gị nile.’” (Ilu 3:5, 6)—Antônio, onye e mere baptizim na 1951.

“Ige ntị n’ahụmahụ nke ndị ka ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi ka ọtụtụ afọ gasịworo na-eme ka mkpebi m ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe na ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi sikwuo ike.”—Joan, onye e mere baptizim na 1954.

“Ọ dị mkpa ka mmadụ ghara ịdị na-eche banyere onwe ya gabiga ókè. Ihe anyị nwere bụ n’ihi ịhụnanya na-erughịrị mmadụ nke Chineke. Inwe echiche dị otú a na-eme ka anyị na-elega anya n’ebe kwesịrị ekwesị maka nri ime mmụọ dị mkpa iji tachie obi ruo ọgwụgwụ.”—Arlene, onye e mere baptizim na 1954.

[Foto dị na peeji nke 11]

Ndị agadi na-amịpụta mkpụrụ Alaeze bara uru

[Foto dị na peeji nke 14]

Ike ime mmụọ nke ndị agadi bụ ihe bara uru