Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ka Osimiri Nile Kụọ Aka Ha”

“Ka Osimiri Nile Kụọ Aka Ha”

 Ịma Mma Nke Ihe Okike Jehova

“Ka Osimiri Nile Kụọ Aka Ha”

LEE anya na map ụwa, n’ọtụtụ ebe, ị ga-ahụ ahịrị ndị gbara ngọrịngọ gafere n’ala dị iche iche. Ahịrị ndị a gafere mbara ala, ọzara, na ala ahịhịa dị iche iche. Ha gafere ndagwurugwu ndị ukwu na ndị nta, na oké ọhịa dị iche iche. (Habakuk 3:9) Ha bụ osimiri, bụ́ akwara ndị ji mbara ụwa anyị ndụ. Osimiri ndị dị otú ahụ na-agba akaebe nye amamihe na ike nke Onye Okike ụwa, bụ́ Jehova. Ka anyị na-ekiri ha, anyị na-enwe ụdị mmetụta ọbụ abụ ahụ nwere bụ́ onye bụrụ, sị: “Ka osimiri nile kụọ aka ha; ka ugwu tie mkpu ọṅụ n’otu; n’ihu Jehova.”—Abụ Ọma 98:8, 9. *

Osimiri na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nwere njikọ chiri anya. Bible na-ekwu banyere osimiri anọ bụ́ isi ndị si n’otu osimiri si n’Iden asọpụta wasasịa. (Jenesis 2:10-14) Otu n’ime mmepeanya ndị mbụ malitere na ndagwurugwu na-eme nri nke osimiri Taịgris na Yufretis ndị dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Osimiri Hwang dị na China, Ganges na Indus bụ́ ndị dị n’ebe ndịda Eshia, na Naịl dị n’Ijipt mere ka mmepeanya ndị ka ukwuu kwe omume.

Ka a sịkwa ihe mere ịdị ike, ịdị ukwuu, na ịma mma nke osimiri jiworo na-atụ ụmụ mmadụ n’anya mgbe nile. Naịl nke Ijipt na-asọ ruo ihe dị ka kilomita 6,670. A ma Amazon nke Ebe Ndịda America ama dị ka osimiri kasị ibu. Ebe osimiri ụfọdụ dị ebube, ndị ọzọ mara nnọọ mma, dị ka Osimiri Tone nke dị na Japan, bụ́ nke dị nnọọ nta karị ma na-asọsi ike.

Gịnị na-eme ka osimiri na-asọ asọ? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ ike ndọda. Ọ bụ ike ndọda na-esi n’ebe dị elu adọda mmiri n’ebe dị ala. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme ka e nwee nsụda mmiri ndị na-adachi ntị. N’ịkọwa ngosipụta ndị a nke ike na ịdị egwu, Bible na-ekwu, sị: “Osimiri eweliwo olu ha, Jehova, osimiri eweliwo olu ha; osimiri na-eweli ebili mmiri nile ha elu.”—Abụ Ọma 93:3.

“Ònye na-ezite oké mmiri ozuzo?” ka Jehova jụrụ nwoke ahụ na-atụ egwu Chineke bụ́ Job. (Job 38:25, Contemporary English Version) Ee, olee ebe mmiri ahụ nile si abịa? Azịza ya na-agụnye otu usoro dị mgbagwoju anya a na-akpọ nrugharị mmiri. Ike anyanwụ na ike ndọda na-eme ka mmiri ndị dị n’ụwa na-erugharị mgbe nile. Mgbe mmiri kupụsịrị, ọ na-arịgo na mbara ikuku. Ọ na-emesị jụọ oyi ma kpụkọọ iji ghọọ urukpuru. Ka oge na-aga, alụlụ a na-alaghachi n’ụwa dị ka snow ma ọ bụ mmiri ozuzo. Ihe ka ukwuu ná mmiri ahụ na-adị n’oké osimiri, ọdọ mmiri, osimiri, mkpụkọba ice, ice ndị kpuchiri akụkụ ụwa ebe ndị na-ajụbiga oyi ókè, na n’okpuru ala.

Banyere nrugharị a dị ịrịba ama, Bible na-ekwu, sị: “Osimiri nile na-erudaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughị eju, ruo ebe osimiri na-eruda, ruo ebe ahụ ka osimiri ahụ na-erughachi  ọzọ.” (Eklisiastis 1:7) Ọ bụ nanị Jehova, Chineke nke amamihe na-enweghị nsọtụ na nlekọta ịhụnanya, pụrụ ime ka e nwee nrugharị dị otú ahụ. Gịnịkwa ka nkà dị otú ahụ amamihe dị na ya na-agwa anyị banyere ụdị onye Chineke bụ? Ọ bụ Chineke nke nwere amamihe dị ukwuu na nke na-enye nlekọta ịhụnanya.—Abụ Ọma 104:13-15, 24, 25; Ilu 3:19, 20.

N’agbanyeghị ibu ha na ọnụ ọgụgụ ha, osimiri nwere nanị akụkụ dị nta nke mmiri ọṅụṅụ ndị dị n’ụwa. Otú o sina dị, ha dị oké mkpa maka ndụ. “Ọ bụrụ na mmiri adịghị, ọ bụrụkwa na a dịghị achịkwa ya achịkwa ruo n’ókè ụfọdụ, ọ ga-abụ ihe na-agaghị ekwe omume ụmụ mmadụ igbo mkpa ha ndị kasị nta na ndị kasị ukwuu,” ka akwụkwọ bụ́ Water na-ekwu. “Ihe ndekọ nke otú mmadụ siworo meghachi omume nye eziokwu a mejupụtara akụkụ ka ukwuu nke akụkọ ihe mere eme nke mmepeanya.”

Ruo ọtụtụ puku afọ, osimiri enyewo mmadụ mmiri ọṅụṅụ na nke o ji eme ihe n’ubi ya. Ala ndị na-eme nri bụ́ ndị dị n’akụkụ ọtụtụ osimiri bụ ebe ndị dị mma maka ịkụ ihe ọkụkụ. Rịba ama otú e si kwupụta echiche a ná ngọzi e nyere ndị ohu Jehova: “Lee ka ụlọikwuu gị nile si maa nnọọ mma, Jekọb! Lee ka ebe obibi gị nile si maa nnọọ mma, Izrel! Dị ka ndagwurugwu dị iche iche ka e setịworo ha, dị ka ubi dị iche iche a gbara ogige n’akụkụ osimiri, dị ka osisi lign aloes nke Jehova kụworo, dị ka osisi cedar n’akụkụ mmiri.” (Ọnụ Ọgụgụ 24:5, 6) Osimiri na-enyekwa aka eme ka anụmanụ ndị dị ka ọbọgwụ mmiri na nkịta ọhịa dịgide ndụ dị ka ị na-ahụ n’ebe a. N’ezie, ka anyị na-amụkwu banyere osimiri, otú ahụ ka a na-akpalikwu anyị inye Jehova ekele.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee 2004 Calendar of Jehovah’s Witnesses, May/June.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]

Nsụda Mmiri Iguaçú, nke dị n’agbata Argentina na Brazil, so ná nsụda mmiri ndị kasị dị obosara ná nsụda mmiri nile. Ọ dị ihe karịrị kilomita atọ n’obosara. N’ịbụ nke dị n’oké ọhịa a na-emetọghị emetọ, ihe mejupụtara ya bụ obere nsụda mmiri 300. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmiri dị cubic mita 10,000 na-esi na ya awụda kwa sekọnd n’oge udu mmiri.

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

Osimiri Tone, Japan