Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Levitikọs

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Levitikọs

 Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Levitikọs

OTU afọ agafebeghị kemgbe a tọhapụsịrị ụmụ Izrel n’agbụ Ijipt. N’ịbụ ndị a haziri ugbu a ịbụ mba ọhụrụ, ha nọ n’ụzọ ịga ala Kenan. Nzube Jehova bụ ime ka obodo dị nsọ biri n’ebe ahụ. Otú ọ dị, ụzọ ndụ na ihe omume okpukpe ndị Kenan rụrụ nnọọ arụ. Ya mere, ezi Chineke ahụ nyere ọgbakọ Izrel ahụ iwu nchịkwa ndị ga-edo ya iche maka ozi ya. E dekọrọ ihe ndị a n’akwụkwọ Bible bụ́ Levitikọs. N’ịbụ nke Mozis onye amụma dere n’ịkpa Saịnaị, eleghị anya na 1512 T.O.A., akwụkwọ ahụ bu ihe ndị mere n’ihe na-akarịghị otu ọnwa. (Ọpụpụ 40:17; Ọnụ Ọgụgụ 1:1-3) Jehova gbara ndị na-efe ya ume ugboro ugboro ịdị nsọ.—Levitikọs 11:44; 19:2; 20:7, 26.

Ndịàmà Jehova taa anọghị n’okpuru Iwu ahụ Chineke nyere site n’aka Mozis. Ọnwụ Jizọs Kraịst mere ka Iwu ahụ kwụsị ịdị irè. (Ndị Rom 6:14; Ndị Efesọs 2:11-16) Otú ọ dị, iwu nchịkwa ndị a na-achọta na Levitikọs pụrụ ịbara anyị uru, na-akụziri anyị ọtụtụ ihe banyere ofufe Chineke anyị, bụ́ Jehova.

ONYINYE NDỊ DỊ NSỌ—NKE AFỌ OFUFO NA NKE A NA-AGHAGHỊ INYE

(Levitikọs 1:1–7:38)

Ụfọdụ n’ime onyinye na àjà ndị e kwuru okwu ha n’Iwu ahụ bụ ndị nke afọ ofufo, ebe ndị ọzọ bụ ndị a na-aghaghị inye. Dị ka ihe atụ, àjà nsure ọkụ, bụ nke afọ ofufo. A na-enye ya Chineke n’ozuzu ya, ọbụna dị ka Jizọs Kraịst si jiri afọ ofufo nye ndụ ya kpam kpam dị ka àjà mgbapụta. A na-ekerịta àjà udo nke onyinye afọ ofufo. A na-enye Chineke otu akụkụ ya n’elu ebe ịchụàjà, onye nchụàjà na-eri akụkụ ya ọzọ, onye wetara ihe ịchụàjà ahụ na-erikwa akụkụ ya ọzọ. N’ụzọ yiri nke ahụ, nye Ndị Kraịst e tere mmanụ, Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst bụ oriri ha nile na-ekere òkè na ya.—1 Ndị Kọrint 10:16-22.

Àjà mmehie na àjà ikpe ọmụma bụ ndị a na-aghaghị inye. Nke mbụ ahụ na-ekpuchi mmehie ndị e mere n’amaghị ama. Nke abụọ bụ iji mee ka obi jụrụ Chineke mgbe e mebiri iwu, ma ọ bụ iji weghachiri onye mmehie ahụ chegharịworonụ ụfọdụ ihe ndị ruuru ya—ma ọ bụ ha abụọ. E nwekwara onyinye ịnata ihu ọma, nke a na-enye iji gosi ekele maka ngọzi ndị sitere n’aka Jehova. Ihe ndị a nile na-adọrọ mmasị anyị n’ihi na àjà nile ahụ e nyere iwu ịchụ n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ na-ezo aka na Jizọs Kraịst na àjà ya ma ọ bụ n’uru ndị sitere na ha.—Ndị Hibru 8:3-6; 9:9-14; 10:5-10.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

2:11, 12N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị nabata mmanụ aṅụ ‘dị ka àjà ọkụ’? Mmanụ a na-ekwu okwu ya ebe a apụghị ịbụ nke sitere n’aṅụ. Ọ bụ ezie na e  kweghị “ka ọ bụrụ àjà ọkụ,” a gụnyere ya ná “mkpụrụ mbụ nke . . . ihe omume nile nke ubi.” (2 Ihe E Mere 31:5) Ihe àmà na-egosi na mmanụ a bụ mmiri sitere ná mkpụrụ osisi. Ebe ọ bụ na ọ pụrụ ịgba ụka, a naraghị ya dị ka àjà n’elu ebe ịchụàjà.

2:13—N’ihi gịnị ka e ji enyekọta nnu na ‘onyinye nile’? E meghị nke a iji mee ka àjà ndị ahụ sikwuo ísì ụtọ. N’ụwa nile, a na-eji nnu echekwa ihe. O yiri ka à na-enyekọta ya na onyinye n’ihi na ọ na-anọchi anya enweghị mmerụ na ire ure.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

3:17. Ebe ọ bụ na e weere abụba dị ka ebe kasị mma ma ọ bụ ebe uru kasị dịrị, o doro anya na mgbochi e gbochiri iri ya mere ka ụmụ Izrel ghọta nke ọma na ọ bụ Jehova nwe akụkụ kasị mma. (Jenesis 45:18) Nke a na-echetara anyị na anyị kwesịrị inye Jehova ihe kasị nnọọ mma anyị nwere.—Ilu 3:9, 10; Ndị Kọlọsi 3:23, 24.

7:26, 27. Ụmụ Izrel agaghị eri ọbara. N’anya Chineke, ọbara na-anọchi anya ndụ. “Ndụ nke anụ ahụ́, n’ọbara ka ọ dị,” ka Levitikọs 17:11 na-ekwu. Izere ọbara nọgidere na-abụ ụkpụrụ dịịrị ndị na-efe ezi ofufe taa.—Ọrụ 15:28, 29.

E GUZOBE ÒTÙ NDỊ NCHỤÀJÀ DỊ NSỌ

(Levitikọs 8:1–10:20)

Ole ndị ka e nyere ibu ọrụ nke ilekọta ọrụ ndị metụtara àjà na onyinye? Ọ bụ ndị nchụàjà ka e nyere ya. Site ná ntụziaka Chineke nyere ya, Mozis duziri ememe nke ime Erọn nnukwu onye nchụàjà, na ime ụmụ ya ndị ikom anọ ndị nchụàjà nọ n’okpuru ya. O yiri ka ememe ahụ ò were ụbọchị asaa, òtù ndị nchụàjà malitekwara ọrụ n’echi ya.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

9:9—Gịnị dị ịrịba àmà banyere ịwụsa ọbara na ntọala ebe ịchụàjà na ịtasa ya n’ihe dị iche iche? Nke a gosiri na Jehova nabatara ọbara maka mkpuchi mmehie. Ndokwa nile e mere maka mkpuchi mmehie dabeere n’ọbara. “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a na-eji ọbara eme ka ihe nile dị ọcha dị ka Iwu ahụ si dị,” ka Pọl onyeozi dere, “ọ gwụkwala ma à wụsịrị ọbara, a dịghị enwe mgbaghara ọ bụla.”—Ndị Hibru 9:22.

10:1, 2—Gịnị ka mmehie Nedab na Abaihu bụ́ ụmụ Erọn pụrụ ịgụnyewo? Obere oge ka Nedab na Abaihu mesịrị ihe na-ekwesịghịrị ha ime mgbe ha na-eje ozi ha dị ka ndị nchụàjà, Jehova machibidoro ndị nchụàjà iwu iji mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe mgbe ha na-eje ozi n’ụlọikwuu ahụ. (Levitikọs 10:9) Nke a na-enye echiche na ọ pụrụ ịbụ na mmanya na-egbu ụmụ Erọn abụọ ahụ mgbe ihe ahụ a na-ekwu okwu ya mere. Otú ọ dị, kpọmkwem ihe mere ha ji nwụọ bụ na ha jiri “ọkụ ala ọzọ, nke [Jehova] na-enyeghị ha n’iwu chụọ àjà.”

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

10:1, 2. Ndị ohu Jehova taa bụ́ ndị ji ihe akpọrọ ihe aghaghị ịgbaso ụkpụrụ Chineke. Ọzọkwa, ha agaghị adị mpako ka ha na-ebu ibu ọrụ ha.

10:9. Anyị ekwesịghị iji anya mmanya na-arụ ọrụ ndị Chineke nyere anyị.

 OFUFE DỊ NSỌ CHỌRỌ ỊDỊ ỌCHA

(Levitikọs 11:1–15:33)

Iwu nchịkwa ihe oriri ndị metụtara ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha na ndị na-adịghị ọcha oriri baara ụmụ Izrel uru n’ụzọ abụọ. Iwu nchịkwa ndị a chebere ha pụọ n’ịbụ ndị ụmụ ahụhụ ndị na-ebu ọrịa merụrụ ahụ́ ma wusie ike ihe ndị mere ka ha dị iche n’ebe mba ndị gbara ha gburugburu nọ. Iwu nchịkwa ndị ọzọ kwuru banyere adịghị ọcha site n’imetụ ozu aka, ime ka ndị inyom dị ọcha mgbe ha mụsịrị nwa, ụkpụrụ ndị metụtara ekpenta, na adịghị ọcha na-esite n’oruru na-esi n’akụkụ ahụ́ nwoke na nwanyị ji enwe mmekọahụ agbapụ. Ọ bụ ndị nchụàjà na-ahụ maka okwu ndị metụtara adịghị ọcha nke ndị mmadụ.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

12:2, 5—N’ihi gịnị ka ịmụ nwa ji mee ka nwanyị “bụrụ onye rụrụ arụ”? E kere akụkụ ahụ́ ndị e ji amụ nwa iji na-ebufe ndụ mmadụ zuru okè. Otú ọ dị, n’ihi ihe ndị sitere ná mmehie e ketara eketa, e bufeere ụmụ ndị a mụrụ ndụ na-ezughị okè na nke mmehie. ‘Ịrụ arụ’ ruo nwa oge nke na-esite n’ịmụ nwa, tinyere ihe ndị ọzọ, dị ka ịhụ nsọ na ịgbapụ ure, na-eme ka e cheta mmehie a e ketara eketa. (Levitikọs 15:16-24; Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12) Iwu nchịkwa ndị ahụ chọrọ ka e mee ka onye ahụ dị ọcha ga-enyere ụmụ Izrel aka ịghọta ịdị mkpa nke àjà mgbapụta iji kpuchie mmehie nke ihe a kpọrọ mmadụ na iji weghachi izu okè mmadụ. N’ụzọ dị otú a, Iwu ahụ ghọọrọ ha ‘onye nduzi nke na-eduga na Kraịst.’—Ndị Galeshia 3:24.

15:16-18—Gịnị bụ ‘ure si n’ahụ́ pụọ’ e kwuru okwu banyere ya n’amaokwu ndị a? O yiri ka nke a ọ̀ na-ezo aka n’ọpụpụ nke ọbara ọcha na-apụ n’abalị tinyere mmekọahụ di na nwunye.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

11:45. Jehova Chineke dị nsọ, na-achọkwa ka ndị na-ejere ya ozi dị nsọ. Ha aghaghị ịchụso ịdị nsọ ma nọgide na-adị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́ na n’ụzọ ime mmụọ.—2 Ndị Kọrint 7:1; 1 Pita 1:15, 16.

12:8. Jehova kwere ka ndị ogbenye were nnụnụ chụọ àjà kama iji atụrụ bụ́ nke ọnụ ego ya ka elu. Ọ na-echebara ndị ogbenye echiche.

A GHAGHỊ ỊNỌGIDE NA-ADỊ NSỌ

(Levitikọs 16:1–27:34)

A na-achụ àjà ndị kasị mkpa maka mmehie n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie a na-eme kwa afọ. A na-achụ otu oké ehi n’àjà maka ndị nchụàjà na ebo Livaị. A na-achụ otu ewu n’àjà maka ebo Izrel ndị na-abụghị ndị nchụàjà. A na-ezipụ ewu ọzọ dị ndụ n’ịkpa ka e kwupụtasịrị mmehie nile nke ndị ahụ n’isi ya. A na-ewere ewu abụọ ahụ dị ka otu àjà mmehie. Ihe a nile na-arụtụ aka n’eziokwu ahụ bụ́ na a ga-eji Jizọs Kraịst chụọ àjà, na ọ ga-ebupụkwa mmehie.

Iwu nchịkwa ndị metụtara iri anụ na ndị  metụtara ihe ndị ọzọ na-eme nnọọ ka anyị ghọta mkpa ịdị nsọ dị mgbe anyị na-efe Jehova. Dị ka o kwesịrị, ndị nchụàjà ga-edo onwe ha nsọ. Ememe atọ a na-eme kwa afọ bụ oge oké ọṅụ na oge e ji enye Onye Okike ekele. Jehova nyekwara ndị ya iwu nchịkwa ndị metụtara ikwutọ aha nsọ ya, idebe Ụbọchị Izu Ike dị iche iche na nke Jubile, ụzọ isi na-emeso ndị ogbenye, na ụzọ isi na-emeso ndị ohu. E gosiri ihe dị iche ná ngọzi ndị ga-esi n’irubere Chineke isi pụta na nkọcha a ga-enweta n’ihi inupụ isi. E nwekwara iwu nchịkwa banyere onyinye ndị metụtara nkwa na ịhụ ọnụ ahịa, nwa e buru ụzọ mụọ nke anụ ụlọ, na inye otu ụzọ n’ụzọ iri dị ka “ihe nsọ dịịrị Jehova.”

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

16:29—N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Izrel ‘ga-eweda mkpụrụ obi ha n’ala’? Usoro a, bụ́ nke a na-agbaso n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, metụtara ịchọ mgbaghara mmehie. O yiri ka ibu ọnụ n’oge ahụ ò nwere ihe jikọrọ ya na ikweta na e mere mmehie. Ọ bụrụ otú ahụ, o yikarịrị ka ‘iweda mkpụrụ obi n’ala’ ọ̀ pụtara ibu ọnụ.

19:27—Gịnị ka iwu ahụ na-amachibido ‘ịkọpụ ụsọ isi gburugburu’ ma ọ bụ ‘ibibi ụsọ’ afụ ọnụ pụtara? O yiri ka e nyere ndị Juu iwu a iji gbochie ha ịkpụ afụ ọnụ ma ọ bụ ntutu ha n’ụzọ ga-abụ iṅomi omume ụfọdụ nke ndị na-ekpere arụsị. (Jeremaịa 9:25, 26; 25:23; 49:32) Otú ọ dị, iwu Chineke apụtaghị na ndị Juu apụghị ịkpụbilata afụ ọnụ ha ma ọ bụ ntutu dị n’ihu ha ma ọlị.—2 Samuel 19:24.

25:35-37—Ọ̀ bụ mgbe nile ka ọ bụ ihe na-ezighị ezi ụmụ Izrel ịnara ọmụrụ nwa? Ọ bụrụ na e binyere ego ahụ maka azụmahịa, onye binyere ego ahụ pụrụ ịnara ọmụrụ nwa. Otú ọ dị, Iwu ahụ machibidoro ịnara ọmụrụ nwa n’ego e binyere iji nyere onye dara ogbenye aka. Iji ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba nke onye agbata obi nọ n’ụkọ enweta uru ezighị ezi.—Ọpụpụ 22:25.

26:19—Olee otú ‘eluigwe pụrụ isi dị ka ígwè, ala adịkwa ka ọla’ kọpa? N’ihi enweghị mmiri ozuzo, eluigwe dị n’elu ala Kenan, n’ile ya anya, ga-adị ka ígwè siri ike mmiri na-apụghị ịgafe. Ma mmiri ezoghị, ala ga na-acha ka ọla kọpa na-egbukepụ egbukepụ.

26:26—Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘ndị inyom iri isi achịcha n’otu ite ọkụ’? Dị ka o kwesịrị, nwanyị ọ bụla ga-enwe ite ọkụ nke ya maka isi achịcha nile ọ chọrọ isi. Ma okwu ndị a zoro aka n’ụkọ nri siri nnọọ ike nke na otu ite ọkụ ga-aba achịcha nile ụmụ nwanyị iri ga-esi. Nke a bụ otu n’ime ahụhụ ndị e kwuru na a ga-enweta n’ihi anọgideghị na-adị nsọ.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

20:9. Mmụọ ịkpọasị na nke ime ihe ike bụ ihe ọjọọ n’anya Jehova dị nnọọ ka igbu ọchụ. Ya mere, o kwuru na otu ahụhụ ga-adịrị onye na-ekwutọ ndị mụrụ ya na onye gburu ha egbu n’ezie. Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ịkpali anyị igosi ndị kwere ekwe ibe anyị ịhụnanya?—1 Jọn 3:14, 15.

22:32; 24:10-16, 23. A gaghị akọcha aha Jehova. Kama nke ahụ, anyị aghaghị ito aha ya ma na-ekpe ekpere ka e doo ya nsọ.—Abụ Ọma 7:17; Matiu 6:9.

OTÚ LEVITIKỌS SI EMETỤTA OFUFE ANYỊ

Ndịàmà Jehova taa anọghị n’okpuru Iwu ahụ. (Ndị Galeshia 3:23-25) Ka o sina dị, ebe ọ bụ na ihe ndị e kwuru na Levitikọs na-eme ka anyị ghọta otú Jehova si ele ihe dị iche iche anya, ọ pụrụ imetụta ofufe anyị.

Ka ị na agụ ọgụgụ Bible dịịrị izu ná nkwadebe maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, obi abụọ adịghị ya na eziokwu ahụ bụ́ na Chineke chọrọ ịdị nsọ n’aka anyị dị ka ndị ohu ya ga-emetụta gị. Akwụkwọ Bible a pụkwara ịkwali gị inye Onye Kasị Ihe Nile Elu ihe kasị nnọọ mma i nwere, nọgide na-adị nsọ mgbe nile iji nye ya otuto.

[Foto dị na peeji nke 21]

Àjà ndị a chụrụ n’okpuru Iwu ahụ zoro aka na Jizọs Kraịst na àjà ya

[Foto dị na peeji nke 22]

Ememe Achịcha Ekoghị Eko bụ oge oké ọṅụ

[Foto dị na peeji nke 23]

Ememe ndị a na-eme kwa afọ, dị ka Ememe Ụlọ Ntu, bụ oge e ji enye Jehova ekele