Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ilekọta Ndị Agadi—Ọrụ Dịịrị Ndị Kraịst

Ilekọta Ndị Agadi—Ọrụ Dịịrị Ndị Kraịst

 Ilekọta Ndị Agadi—Ọrụ Dịịrị Ndị Kraịst

“Ọzọ, ruo agadi Mụ onwe m bụ Onye ahụ, ruokwa isi awọ Mụ onwe m ga-eku unu n’aka.”—AỊSAỊA 46:4.

1, 2. Olee otú nlekọta nke Nna anyị nke eluigwe si dị iche na nke ndị nne na nna bụ́ ụmụ mmadụ?

NDỊ nne na nna ji ọrụ ha kpọrọ ihe na-azụ ụmụ ha site na mgbe ha bụ ụmụ ọhụrụ ruo mgbe ha dị afọ iri na ụma. Ọbụna mgbe ndị na-eto eto toruru ogo mmadụ ma nwee ezinụlọ nke ha, ndị nne na nna ha na-anọgide na-enye ha nlekọta na nkwado ịhụnanya.

2 Ọ bụ ezie na a kpaara ihe ụmụ mmadụ pụrụ imere ụmụ ha ókè, Nna anyị nke eluigwe nwere ike mgbe nile inye ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi nlekọta na nkwado ịhụnanya. N’ịgwa ndị ya a họpụtara ahọpụta n’oge ochie okwu, Jehova sịrị: “Ọzọ, ruo agadi Mụ onwe m bụ Onye ahụ, ruokwa isi awọ Mụ onwe m ga-eku unu n’aka.” (Aịsaịa 46:4) Lee ihe na-emesighachi obi ike okwu ndị a bụụrụ Ndị Kraịst meworo agadi! Jehova adịghị agbahapụ ndị nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye ya. Kama nke ahụ, o kwere nkwa ịkwagide, ịkwado, na iduzi ha n’oge ndụ ha nile, ọbụna ruo n’agadi.—Abụ Ọma 48:14.

3. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu a?

3 Olee otú anyị pụrụ isi na-eṅomi nchegbu ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị agadi nọ? (Ndị Efesọs 5:1, 2) Ka anyị tụlee ụzọ ụmụ, ndị nlekọta ọgbakọ, na Ndị Kraịst n’otu n’otu pụrụ isi na-egbo mkpa ndị agadi nọ n’òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ.

Ọrụ Dịịrị Anyị Dị Ka Ụmụ

4. Olee ọrụ dịịrị ụmụ bụ́ Ndị Kraịst n’ebe ndị mụrụ ha nọ?

4 “Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Ndị Efesọs 6:2; Ọpụpụ 20:12) Pọl onyeozi ji okwu a dị mfe ma gbaa ọkpụrụkpụ nke o hotara  n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, chetara ụmụ ọrụ dịịrị ha n’ebe ndị mụrụ ha nọ. Ma olee otú okwu a si metụta ilekọta ndị agadi? Ihe nlereanya na-akpali akpali nke ndị biri ndụ tupu oge Ndị Kraịst ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a.

5. (a) Gịnị na-egosi na Josef echefubeghị ọrụ dịịrị ya n’ebe ezinụlọ ya dị? (b) Gịnị ka ịsọpụrụ nne na nna anyị pụtara, ezi ihe nlereanya dịkwa aṅaa ka Josef setịpụrụ n’akụkụ a?

5 Ruo ihe karịrị afọ 20, Josef ahụghị nna ya meworo agadi, bụ́ nna ochie ahụ bụ́ Jekọb, anya. Otú ọ dị, ihe àmà na-egosi na Josef ka nwere ịhụnanya ezinụlọ n’ebe Jekọb nọ. N’ezie, mgbe Josef mere ka ụmụnne ya mata onye ọ bụ, ọ jụrụ, sị: “Nna m, ọ̀ nọ ndụ ugbu a?” (Jenesis 43:7, 27; 45:3) N’oge ahụ, ụnwụ nri na-akpa ala Kenan aka ọjọọ. N’ihi ya, Josef ziri nna ya ozi, na-asị: “Rịdakwute m, atụla nguzo: ị ga-ebi n’ala Goshen, nọọkwa m nso . . . M ga-azụkwa gị n’ebe ahụ.” (Jenesis 45:9-11; 47:12) Ee, ịsọpụrụ ndị nne na nna meworo agadi gụnyere ichebe ha na igbo mkpa ha n’ụzọ ihe onwunwe mgbe ha na-enweghị ike ilekọta onwe ha. (1 Samuel 22:1-4; Jọn 19:25-27) Josef ji obi ụtọ nakwere ọrụ a dịịrị ya.

6. Olee otú Josef si gosipụta ezi ịhụnanya o nwere n’ebe nna ya nọ, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ya?

6 Site ná ngọzi Jehova, Josef aghọwo otu n’ime ndị kasị baa ọgaranya ma nwee ike n’Ijipt. (Jenesis 41:40) Ma o leghị onwe ya anya dị ka onye ji ọrụ n’aka gabiga ókè ịsọpụrụ nna ya dị afọ 130. Mgbe ọ nụrụ na Jekọb (ma ọ bụ Izrel) na-abịa, “Josef wee dozie ụgbọala ya, rịgoruo Goshen izute Izrel, bụ́ nna ya; o mee ka ọ hụ ya anya, o wee dakwasị ya n’olu, kwaa ákwá n’olu ya mgbe dị anya.” (Jenesis 46:28, 29) Nnabata a karịrị ngosipụta nkịtị nke nkwanye ùgwù. Josef hụrụ nna ya meworo agadi n’anya nke ukwuu, ihere emeghịkwa ya igosipụta ịhụnanya ya. Ọ bụrụ na anyị nwere ndị nne na nna meworo agadi, ànyị na-egosipụta ịhụnanya dị ukwuu otú ahụ n’ebe ha nọ?

7. N’ihi gịnị ka Jekọb ji chọọ ka e lie ya na Kenan?

7 Nrara Jekọb raara onwe ya nye Jehova siri ike ruo n’ọgwụgwụ nke ndụ ya. (Ndị Hibru 11:21) N’ihi okwukwe o nwere ná nkwa Chineke, Jekọb rịọrọ ka e lie ya na Kenan. Josef sọpụụrụ nna ya site n’imere ya ihe ọ rịọrọ, n’agbanyeghị ego na mgbalị dị ukwuu ọ ga-ewe.—Jenesis 47:29-31; 50:7-14.

8. (a) Gịnị bụ isi ihe ga-akpali anyị ilekọta ndị nne na nna anyị meworo agadi? (b) Ihe ndị dị aṅaa ka otu onye ozi oge nile mere iji lekọta nne na nna ya meworo agadi? (Lee igbe dị na peeji nke 17.)

8 Gịnị kpaliri Josef ilekọta nna ya? Ọ bụ ezie na ịhụnanya na mmetụta nke iji onye nyere ya ndụ na onye zụrụ ya ụgwọ so n’ihe ndị kpaliri ya, ihe ịrụ ụka adịghị ya na Josef nwekwara ọchịchọ siri ike ime ihe na-atọ Jehova ụtọ. Anyị kwesịkwara inwe ọchịchọ dị otú ahụ. Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ka ndị a buru ụzọ mụta itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ezinụlọ nke ha na ịnọgide na-akwụ ndị mụrụ ha na ndị nne na nna ha ochie ụgwọ ruuru ha, n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’anya Chineke.” (1 Timoti 5:4) N’ezie, ịhụnanya na egwu nsọpụrụ anyị nwere n’ebe Jehova nọ ga-akpali anyị ilekọta ndị nne na nna anyị meworo agadi,  n’agbanyeghị ihe ịma aka ndị ime otú ahụ pụrụ ịgụnye. *

Otú Ndị Okenye Si Egosi na Ha Na-echebara Ndị Agadi Echiche

9. Ole ndị ka Jehova họpụtara ịzụ ìgwè atụrụ ahụ, gụnyere Ndị Kraịst meworo agadi?

9 Ka ọ na-eru n’ọgwụgwụ nke ogologo ndụ ya, Jekọb zoro aka n’ebe Jehova nọ dị ka “Chineke ahụ nke na-azụ m ogologo oge m ruo taa.” (Jenesis 48:15) Taa, Jehova na-azụ ndị ohu ya nọ n’elu ala site n’aka Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye, ndị nọ n’okpuru nlekọta nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ́ “onyeisi ọzụzụ atụrụ ahụ.” (1 Pita 5:2-4) Olee otú ndị nlekọta pụrụ isi na-eṅomi Jehova ka ha na-elekọta ndị agadi so n’ìgwè atụrụ ahụ?

10. Gịnị ka e meworo iji nyere Ndị Kraịst meworo agadi aka n’ụzọ ihe onwunwe? (Lee igbe dị na peeji nke 19.)

10 Nwa oge ka e guzobesịrị ọgbakọ Ndị Kraịst, ndịozi họpụtara “ndị ikom asaa a gbaara ezi àmà . . . bụ́ ndị jupụtara na mmụọ nsọ na amamihe” ilekọta ‘nkesa nri a na-eme kwa ụbọchị’ maka ndị inyom nọ ná mkpa bụ́ Ndị Kraịst di ha nwụrụ. (Ọrụ 6:1-6) Mgbe e mesịrị, Pọl nyere onye nlekọta bụ́ Timoti ntụziaka ịgụnye ndị inyom di ha nwụrụ ndị bụ́ ezi ihe nlereanya ná ndị ruru eru inweta ihe enyemaka. (1 Timoti 5:3, 9, 10) N’otu aka ahụ, ndị nlekọta ọgbakọ taa na-eji ọchịchọ obi ahazi ihe enyemaka maka ndị agadi bụ́ Ndị Kraịst mgbe nke a dị mkpa. Otú ọ dị, ọ dị ihe ọzọ ilekọta ndị agadi kwesịrị ntụkwasị obi gụnyere.

11. Gịnị ka Jizọs kwuru banyere nwanyị di ya nwụrụ nke nọ ná mkpa bụ́ onye nyere onyinye pere mpe?

11 Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke ozi elu ala ya, Jizọs nọ ọdụ n’ụlọ nsọ ahụ ma “malite ịhụ otú ìgwè mmadụ ahụ si atụnye ego n’ime ihe ntụnye ego ahụ.” Mgbe ahụ, otu onye dọọrọ uche ya. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Otu nwanyị di ya nwụrụ bụ́ onye dara ogbenye bịara tụnye obere mkpụrụ ego abụọ nke ihe ha ga-azụtali dị nnọọ nta.” Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya ma gwa ha, sị: “N’ezie asị m unu na nwanyị a di ya nwụrụ bụ́ onye dara ogbenye tụnyere karịa ndị nile ahụ na-atụnye ego n’ime ihe ntụnye ego ndị ahụ; n’ihi na ha nile sitere n’ihe mafọọrọ ha wee tụnye, ma nwanyị a sitere n’ụkọ ya wee tụnye ihe nile o nwere, ihe dum o ji biri.” (Mak 12:41-44) N’ọnụ ego, onyinye nwanyị ahụ di ya nwụrụ nyere pere mpe, ma Jizọs maara otú Nna ya nke eluigwe si jiri ngosipụta dị otú ahụ sitere n’obi dum nke nraranye kpọrọ ihe. N’agbanyeghị afọ ndụ nke nwanyị ahụ di ya  nwụrụ bụ́ onye dara ogbenye, Jizọs elegharaghị ihe o mere anya.

12. Olee otú ndị okenye pụrụ isi gosipụta ekele ha nwere maka ihe Ndị Kraịst meworo agadi na-eme?

12 Dị ka Jizọs, Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta adịghị eleghara ihe ndị agadi na-eme iji kwalite ezi ofufe anya. Ndị okenye nwere ihe mere ha ga-eji na-aja ndị agadi mma maka òkè ha na-ekere n’ozi na ná nzukọ, maka mmetụta dị mma ha na-enwe n’ebe ọgbakọ dị, nakwa maka ntachi obi ha. Okwu agbamume sitere n’obi pụrụ inyere ndị agadi aka ịchọta ‘ihe ha ga-aṅụrịrị ọṅụ’ n’ozi dị nsọ ha na-eje, si otú ahụ na-ezere iji ihe ha na-eme na-atụnyere nke Ndị Kraịst ndị ọzọ ma ọ bụ jiri ha na-atụnyere ihe ndị ha mere n’oge ndị gara aga n’ụzọ na-akụda mmụọ.—Ndị Galeshia 6:4.

13. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị okenye pụrụ isi rite uru na nkà na ahụmahụ nke ndị agadi?

13 Ndị okenye pụrụ iji nkwado Ndị Kraịst meworo agadi na-enye kpọrọ ihe site n’irite uru n’ahụmahụ na nkà ha. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ iji ndị agadi bụ́ ezi ihe nlereanya mee ihe ngosi ma ọ bụ gbaa ha ajụjụ ọnụ. “Ndị bịara nzukọ na-ege ntị nke ọma mgbe m na-agba nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị meworo agadi, bụ́ onye zụliteworo ụmụ n’eziokwu, ajụjụ ọnụ,” ka otu okenye na-ekwu. Ndị okenye nọ n’ọgbakọ ọzọ na-akọ na otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ nke dị afọ 71 anọwo na-enwe ihe ịga nke ọma n’inyere ndị nkwusa Alaeze aka ijechi ozi ubi anya. Ọ na-agbakwa ha ume ime ihe ndị “bụ́ isi,” dị ka ịgụ Bible na ihe mmụta dịịrị ụbọchị ma na-atụgharịzi uche n’ihe ndị ha gụrụ.

14. Olee otú otu òtù ndị okenye si gosi ekele maka onye nlekọta ibe ha meworo agadi?

14 Ndị okenye na-ejikwa ihe ndị nlekọta ibe ha meworo agadi na-eme akpọrọ ihe. José, bụ́ onye dị afọ 70 na ụma, nke jewokwara ozi dị ka okenye ruo ọtụtụ iri afọ, wara ahụ́ siri ike n’oge na-adịbeghị anya. N’ịbụ onye mgbake ya na-ewe oge, o chere echiche ịhapụ ihe ùgwù ya nke ije ozi dị ka onyeisi oche ndị nlekọta. “Mmeghachi omume nke ndị okenye ndị ọzọ tụrụ m n’anya,” ka José na-ekwu. “Kama ịnakwere aro m, ha jụrụ m ụdị enyemaka m chọrọ iji nọgide na-elekọta ibu ọrụ m.” Site n’enyemaka nke otu okenye na-akatabeghị ahụ́, José nwere ike ịnọgide jiri  ọṅụ na-eje ozi dị ka onyeisi oche ndị nlekọta, nke a abụwokwara ọgbakọ ahụ ngọzi. Okenye ibe ya na-ekwu, sị: “Ụmụnna nwere ekele dị ukwuu maka ọrụ José na-arụ dị ka okenye. Ha hụrụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù n’ihi ahụmahụ ya na ihe nlereanya ya nke okwukwe. Ọ na-ewuli ọgbakọ anyị elu.”

Ilekọtarịta Ibe Anyị

15. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst nile ji kwesị inwe mmasị n’ọdịmma nke ndị agadi nọ n’etiti ha?

15 Ọ bụghị nanị ụmụ nke ndị nne na nna meworo agadi na ndị ohu a họpụtara ahọpụta kwesịrị inwe nchegbu banyere ndị agadi. N’iji ọgbakọ Ndị Kraịst tụnyere ahụ́ mmadụ, Pọl dere, sị: “Chineke jikọtara ahụ́ ọnụ, na-enye akụkụ ahụ́ ndị ihe kọrọ nsọpụrụ dị ukwuu karị, ka e wee ghara inwe nkewa n’ahụ́, kama ka akụkụ ya nile wee na-elekọta ibe ha n’otu ụzọ ahụ.” (1 Ndị Kọrint 12:24, 25) Nsụgharị ọzọ na-agụ, sị: “Akụkụ ahụ́ ọ bụla maara mkpa ibe ya, ha na-egborịtakwara onwe ha mkpa.” (International Bible Society) Ka ọgbakọ Ndị Kraịst wee na-arụkọ ọrụ ọnụ, onye ọ bụla nọ na ya aghaghị inwe nchegbu banyere ọdịmma nke ndị kwere ekwe ibe ya, gụnyere ndị agadi.—Ndị Galeshia 6:2.

16. Olee otú anyị pụrụ isi gosi mmasị n’ebe ndị agadi nọ mgbe anyị gara nzukọ Ndị Kraịst?

16 Nzukọ Ndị Kraịst na-enye anyị ohere mara mma igosi mmasị n’ebe ndị agadi nọ. (Ndị Filipaị 2:4; Ndị Hibru 10:24, 25) Ànyị na-ewepụta oge iji soro ndị agadi kparịta ụka n’oge ndị dị otú ahụ? Ọ bụ ezie na ọ ga-ekwesị ekwesị ịjụ banyere ọdịmma anụ ahụ́ ha, ànyị pụrụ ‘inyetụ ha onyinye ime mmụọ,’ ikekwe site n’ịkọrọ ha ahụmahụ na-ewuli elu ma ọ bụ ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ? Ebe ọ bụ na ụfọdụ ndị agadi adịghị enwecha ike ịgagharị agagharị, ọ ga-abụ ihe na-egosipụta obiọma ịgakwuru ha kama ịtụwa anya ka ha bịakwute anyị. Ọ bụrụ na ha adịghị anụcha ihe nke ọma, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ikwu okwu nwayọọ nwayọọ ma na-akpọpụta okwu nke ọma. Ọ bụrụkwa na a ga-enwe ezi ‘mgbarịta ume,’ anyị aghaghị ịṅa ntị nke ọma n’ihe onye agadi na-ekwu.—Ndị Rom 1:11, 12.

17. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere nchegbu maka ndị agadi bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-adịghị apụta èzí?

17 Gịnị ma ọ bụrụ na e nwere ndị agadi na-apụghị ịga nzukọ Ndị Kraịst? Jems 1:27 na-egosi na ọ bụ ọrụ anyị “ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha.” Otu ihe ngwaa Grik a sụgharịrị ịbụ “ilekọta” pụtara bụ “ileta.” (Ọrụ 15:36 ) Lee nnọọ ka ndị agadi si enwe ekele maka nleta anyị! Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom n’ihe dị ka  na 65 O.A., “nwoke [ahụ] meworo agadi” bụ́ Pọl nọ nanị ya n’ezie. Ọ gụsiri ya agụụ ike ịhụ onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti, o dekwara, sị: “Mee ike gị nile ịbịakwute m n’isi nso.” (Faịlimọn 9; 2 Timoti 1:3, 4; 4:9) Ọ bụ ezie na ha abụghị ndị mkpọrọ n’ụzọ nkịtị, ụfọdụ ndị agadi adịghị apụta èzí n’ihi nsogbu ahụ́ ike. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha pụrụ ịdị na-asị, ‘Biko, mee ike gị nile ileta m n’isi nso.’ Ànyị na-eme ihe banyere arịrịọ ahụ?

18. Uru ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ irite site n’ileta ndị agadi?

18 Ya adịla mgbe ị ga-eleda uru ileta nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị ime mmụọ meworo agadi bara anya. Mgbe otu Onye Kraịst aha ya bụ́ Onisifọrọs nọ na Rom, ọ chọsiri Pọl ike, chọta ya ma mesịa ‘wetara ya ume ọhụrụ mgbe mgbe.’ (2 Timoti 1:16, 17) “Ọ na-amasị m iso ndị na-eto eto na-anọkọ,” ka otu nwanna nwanyị meworo agadi kwuru. “Ihe kasị amasị m bụ na ha na-emeso m ihe ka m̀ bụ onye òtù ezinụlọ ha. Nke a na-agba m ume.” Onye Kraịst ọzọ meworo agadi na-ekwu, sị: “Ọ na-amasị m n’ezie mgbe mmadụ ziteere m kaadị, kpọọ m na fon ruo nanị minit ole na ole, ma ọ bụ leta m ruo nwa oge. Ọ dị ka ikuru ume ndụ.”

Jehova Na-akwụghachi Ndị Na-elekọta Ndị Agadi Ụgwọ

19. Ngọzi ndị dị aṅaa na-abịa site n’ilekọta ndị agadi?

19 Ilekọta ndị agadi na-eweta ọtụtụ ngọzi. Iso ndị agadi na-akpakọrịta na inwe ike ịmụta ihe site n’ihe ọmụma na ahụmahụ ha bụ ihe ùgwù n’onwe ya. Ndị na-enye nlekọta na-enweta obi ụtọ dị ukwuu nke na-abịa site n’inye ihe, nakwa afọ ojuju na udo nke obi site n’ịrụzu ọrụ ha dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 20:35) Ọzọkwa, ọ dịghị ndị na-elekọta ndị agadi mkpa ịtụwa ụjọ na a ga-agbahapụ ha mgbe ha mere agadi. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Mkpụrụ obi nke na-agọzi agọzi ka a ga-eme ka ọ maa abụba: ọzọ, onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ.”—Ilu 11:25.

20, 21. Olee otú Jehova si ele ndị na-elekọta ndị agadi anya, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 Jehova na-akwụghachi ụmụ ndị na-atụ egwu Chineke, ndị nlekọta na Ndị Kraịst ndị ọzọ na-ahụ n’anya ụgwọ maka iji achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-egbo mkpa nke ndị kwere ekwe ibe ha meworo agadi. Mmụọ dị otú ahụ kwekọrọ n’ilu a: “Onye na-ebinye Jehova ihe ka onye na-emere onye na-enweghị ike amara bụ, ọ bụkwa mmeso ọma ya ka Ọ ga-akwụghachi ya.” (Ilu 19:17) Ọ bụrụ na ịhụnanya akpalie anyị imere ndị na-enweghị ike na ndị ogbenye amara, Chineke na-ele inye ihe dị otú ahụ anya dị ka ego e binyere ya nke ọ ga-eji ngọzi kwụghachi. Ọ na-akwụghachikwa anyị ụgwọ maka iji ịhụnanya na-elekọta ndị anyị na ha na-efekọ ofufe meworo agadi, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha ‘dara ogbenye n’ebe ụwa dị ma baa ọgaranya n’okwukwe.’—Jems 2:5.

21 Lee ka nkwụghachi ụgwọ Chineke si baa ụba! Ọ na-agụnye ndụ ebighị ebi. Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ohu Jehova, nke ahụ ga-abụ ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs, bụ́ ebe a ga-ekpochapụ ihe nile mmehie e ketara eketa na-akpata, ebe a ga-emekwa ka ndị agadi na-ekwesị ntụkwasị obi nwetaghachi ike ntorobịa ha. (Mkpughe 21:3-5) Ka anyị na-echere oge ahụ a gọziri agọzi, ka anyị nọgide na-arụ ọrụ dịịrị anyị dị ka Ndị Kraịst nke ilekọta ndị agadi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Maka aro ndị dị irè banyere ụzọ isi lekọta ndị nne na nna meworo agadi, lee Teta! nke May 8, 1994, peeji nke 3-10.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

• Olee otú ụmụ pụrụ isi sọpụrụ ndị nne na nna ha meworo agadi?

• Olee otú ndị okenye si egosi na ha nwere ekele maka ndị agadi so n’ìgwè atụrụ ahụ?

• Gịnị ka Ndị Kraịst n’otu n’otu pụrụ ime iji gosi ezi mmasị ha nwere n’ebe ndị agadi nọ?

• Ngọzi ndị dị aṅaa na-abịa site n’ilekọta Ndị Kraịst meworo agadi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 17]

Mgbe Enyemaka Dị Ndị Mụrụ Ya Mkpa

Philip na-eje ozi dị ka onye ọrụ afọ ofufo na-ewu ihe owuwu na Liberia na 1999 mgbe ọ natara ozi na papa ya na-arịasi ọrịa ike. N’ịbụ onye o doro anya na mama ya agaghị enwe ike ime ihe maka ọnọdụ ahụ n’onwe ya, o kpebiri ịlaghachi ụlọ ịhụ maka nlekọta ahụ́ ike nke papa ya.

“Ọ dịghị mfe ịlaghachi ụlọ,” ka Philip na-echeta, “ma echere m na ọrụ mbụ dịịrị m bụ ilekọta ndị mụrụ m.” N’ime afọ atọ sochirinụ, ọ kpọfere ndị mụrụ ya n’ụlọ ka dị ntụsara ahụ́, sitekwa n’enyemaka nke Ndị Kraịst ibe ya bi n’ógbè ahụ, ọ rụziri ebe obibi ahụ ikwekọ ná mkpa pụrụ iche nke papa ya.

Mama Philip dịzi njikere ugbu a karị ịhụ maka nsogbu ahụ́ ike siri ike nke papa Philip. N’oge na-adịbeghị anya, Philip nakweere ọkpụkpọ òkù ịrụ ọrụ dị ka onye ọrụ afọ ofufo n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Masedonia.

[Igbe dị na peeji nke 19]

Ha Elegharabeghị Mkpa Ya Anya

Mgbe Ada, Onye Kraịst dị afọ 85 nke bi n’Australia, na-enweghịzi ike ịpụta èzí n’ihi ọrịa, ndị okenye ọgbakọ mere ndokwa inyere ya aka. Ha haziri otu ìgwè nke ndị kwere ekwe ibe ya bụ́ ndị pụrụ inyere ya aka. Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị a nwere obi ụtọ ịrụ ọrụ ndị dị ka ihichasị ihe, ịsachasị ihe, isi nri, na ije ozi ndị ọzọ.

Enyemaka ahụ malitere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri gara aga. Ka ọ dị ugbu a, ihe karịrị Ndịàmà Jehova ibe ya 30 enyewo aka lekọta Ada. Ha nọgidere na-eleta ya, na-agụrụ ya akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, na-agwa ya banyere ọganihu ime mmụọ nke ndị nọ n’ọgbakọ na-enwe ma na-eso ya ekpechi ekpere anya.

Otu Onye Kraịst bụ́ okenye nọ n’ọgbakọ ahụ kwuru, sị: “Ndị na-elekọta Ada na-ewere ya dị ka ihe ùgwù inyere ya aka. Ozi o jiworo ikwesị ntụkwasị obi jee ruo ihe karịrị ọtụtụ iri afọ na-akpali ọtụtụ n’ime ha, ọ dịghịkwa nnọọ otú ha ga-esi leghara mkpa ya anya.”

[Foto dị na peeji nke 16]

Ànyị na-egosipụta ịhụnanya dị ukwuu n’ebe ndị nne na nna anyị meworo agadi nọ?

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Mmadụ nile nọ n’ọgbakọ pụrụ igosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha meworo agadi nọ