Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

 Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú anyị pụrụ isi mee ihe na-ewute mmụọ nsọ Chineke, ebe ọ na-abụghị onye?

Ọ bụ Pọl onyeozi dere, sị: “Unu adịla na-eme ka mmụọ nsọ Chineke na-enwe mwute.” (Ndị Efesọs 4:30) Ụfọdụ na-ewere okwu ndị a dị ka ihe na-egosi na mmụọ nsọ bụ onye. Otú ọ dị, akwụkwọ dị iche iche “onye ahụ na-elekọta ụlọ” bipụtara enyewo mgbe mgbe ihe àmà ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na ndị nke sitere n’akụkọ ihe mere eme bụ́ ndị na-egosi na Ndị Kraịst oge mbụ eleghị mmụọ nsọ anya dị ka onye ma ọ bụ chi ya na Onye Kasị Ihe Nile Elu ha nhata dị ka akụkụ nke ihe ahụ a na-akpọ Atọ n’Ime Otu. * (Luk 12:42) Ya mere, Pọl anọghị na-ezo aka na mmụọ nsọ Chineke dị ka onye.

Mmụọ nsọ Chineke bụ ike ya nọ n’ọrụ nke a na-adịghị ahụ anya. (Jenesis 1:2) Jizọs ga-eji “mmụọ nsọ” mee ndị mmadụ baptizim, dị nnọọ ka Jọn ji mmiri mee. (Luk 3:16) Na Pentikọst 33 O.A., ihe dị ka ndị na-eso ụzọ 120 “jupụtara na mmụọ nsọ”—nke o doro anya na ọ bụghị onye. (Ọrụ 1:5, 8; 2:4, 33) Ndị a e tere mmanụ nwetara olileanya eluigwe, mmụọ Chineke duzikwara ha ná ndụ nke ikwesi ntụkwasị obi. (Ndị Rom 8:14-17; 2 Ndị Kọrint 1:22) Mmụọ ahụ mịpụtara mkpụrụ na-amasị Chineke ma nyere ha aka izere “ọrụ nke anụ ahụ́” jupụtara ná mmehie bụ́ nke pụrụ ịkpata enweghị ihu ọma Chineke.—Ndị Galeshia 5:19-25.

Ọ bụrụ na anyị bụ ndị ohu Chineke nwere olileanya elu ala, e jighị mmụọ nsọ tee anyị mmanụ. Ka o sina dị, anyị pụrụ inwe mmụọ Chineke hakwa ka nke ndị nwere olileanya eluigwe nwere. N’ihi ya, anyị onwe anyị pụrụ ime ka mmụọ nsọ nwee mwute. Ma n’ụzọ dị aṅaa?

Ọ bụrụ na anyị eleghara ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ anya, anyị pụrụ ịzụlite àgwà ndị pụrụ iduje ná mmehie a ma ụma mee megide mmụọ nsọ, enwekwaghị ihu ọma Jehova, na n’ikpeazụ, mbibi. (Matiu 12:31, 32) Ọ pụrụ ịbụ na nke ahụ agabeghị abụ anyị ime mmehie dị oké njọ, ma anyị pụrụ ịdị na-etinye isi n’ụzọ ọjọọ, nke pụrụ imesị duje anyị n’ime ihe megidere nduzi nke mmụọ nsọ. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, anyị ga na-eme ihe na-ewute mmụọ nsọ.

Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi zere ime ihe ga-ewute mmụọ Chineke? Anyị aghaghị ịchịkwa echiche na omume anyị. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs, n’isi 4, Pọl onyeozi kwuru okwu banyere izere ọchịchọ ikwu okwu ụgha, ịnọgide na-ewe iwe, ịdị  umengwụ, na ikwu okwu rere ure. Ọ bụrụ na anyị eyikwasịwo “mmadụ ọhụrụ ahụ” ma ka na-etinye aka n’ihe ndị dị otú ahụ, gịnị ka anyị ga na-eme? Anyị ga na-emegide ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Site n’ime nke a, anyị ga na-eme ihe na-ewute mmụọ nsọ.

Ndị Efesọs isi 5, anyị na-agụ ndụmọdụ Pọl banyere izere inwe mmasị na-ezighị ezi n’ịkwa iko. Pọl onyeozi na-agbakwa ndị kwere ekwe ibe ya ume izere omume ihere na okwu njakịrị rụrụ arụ. Ọ bụrụ na anyị achọghị ime ihe ga-ewute mmụọ nsọ Chineke, anyị kwesịrị ibu ihe a n’obi mgbe anyị na-ahọrọ ntụrụndụ. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji gosi mmasị n’ihe ndị dị otú ahụ site n’ikwu banyere ha, ịgụ banyere ha, na ile ha mgbe a na-egosi ha na telivishọn ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ?

N’ezie, anyị pụrụ ime ihe ga-ewute mmụọ nsọ n’ụzọ ndị ọzọ. Mmụọ Jehova na-akwalite ịdị n’otu n’ọgbakọ, ma ọ bụrụ na anyị agbasaa asịrị na-emerụ ahụ́ ma ọ bụ na-akwalite ịrọ òtù n’ọgbakọ. Ọ̀ bụ na anyị agaghị na-arụ ọrụ megide nduzi nke mmụọ nsọ n’ihe banyere ịdị n’otu? E lee ya anya n’ụzọ sara mbara, anyị ga na-eme ihe na-ewute mmụọ nsọ, dị ka ndị ahụ kpatara nkewa n’ọgbakọ dị na Kọrint. (1 Ndị Kọrint 1:10; 3:1-4, 16, 17) Anyị ga na-emekwa ihe na-ewute mmụọ nsọ ma ọ bụrụ na anyị amara ụma ghara ịkwanyere ndị ikom e ji mmụọ nsọ họpụta n’ọgbakọ ùgwù.—Ọrụ 20:28; Jud 8.

Mgbe ahụ, o doro anya na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịtụle àgwà na omume anyị dabere n’ihe anyị maara dị ka nduzi nke mmụọ nsọ dị ka a na-achọta ya na Bible na n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ka anyị ‘na-ekpekwa ekpere site na mmụọ nsọ,’ na-agbaso nduzi ya ma na-eme ihe kwekọrọ n’ihe e kwuru n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ mgbe nile. (Jud 20) Ka anyị kpebisie ike ịghara ime ihe ga-ewute mmụọ nsọ mgbe ọ bụla, kama nke ahụ, ka ọ na-edu anyị mgbe nile iji wetara aha nsọ Jehova nsọpụrụ.

Jizọs Kraịst ji otú ọ ga-esi siere ọgaranya ike ịbanye n’Alaeze ahụ tụnyere kamel na-anwa isi n’anya agịga gafee. Ihe Jizọs bu n’obi ọ̀ bụ kamel nkịtị na agịga nkịtị e ji akwa ákwà?

Ebe abụọ n’ime ebe atọ e hotara okwu a n’Akwụkwọ Nsọ yiri nnọọ onwe ha. Dị ka ihe ndekọ Matiu si kwuo, Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga gafere karịa onye bara ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.” (Matiu 19:24) N’ụzọ yiri nke ahụ, Mak 10:25 na-agụ, sị: “Ọ dịrị kamel mfe isi n’anya agịga gafere karịa onye bara ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.”

Akwụkwọ ntụaka ụfọdụ na-atụ aro na ‘anya agịga’ ahụ bụ otu obere ọnụ ụzọ dị n’otu nnukwu ọnụ ụzọ ámá dị na Jeruselem. Ọ bụrụ na e mechie ọnụ ụzọ nke nnukwu ahụ n’abalị, a pụrụ imeghe nke obere. E kweere na kamel pụrụ isi na ya gafee. Nke a ọ̀ bụ ihe Jizọs bu n’uche?

O doro anya na ọ bụghị. O doro anya na ihe Jizọs na-ezo aka na ya bụ agịga e ji akwa ákwà. Ebe ọ bụ na a hụwo n’ógbè ahụ agịga oge ochie e ji ọkpụkpụ anụ na ọla mee, ha aghaghị ịbụwo ụmụ ihe ndị e ji ebi n’ụlọ. Luk 18:25 wepụrụ obi abụọ ọ bụla banyere okwu Jizọs ahụ, n’ihi na o hotara na o kwuru, sị: “Ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga e ji akwa ákwà gafere karịa onye bara ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.”

Ndị ọkọwa okwu dị iche iche kwekọrịtara n’ịkpọ ya “agịga e ji akwa ákwà” dị ka a na-achọta  ya ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. E si na ngwaa pụtara “kwaa” nweta okwu Grik maka ‘agịga’ (rha·phisʹ) nke dị na Matiu 19:24 na Mak 10:25. A na-ejikwa okwu Grik a na-achọta na Luk 18:25 (be·loʹne) eme ihe n’izo aka n’agịga e ji adụchi ahụ́. Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words na-ekwu, sị: “Echiche nke ịkọwa ‘anya agịga ahụ’ dị ka obere ọnụ ụzọ, yiri ka ihe malitere ọhụrụ; ọ dịghị ihe gosiri na e nwere echiche dị otú ahụ n’oge ochie. Ihe Onyenwe anyị bu n’uche kwuo okwu ahụ bụ igosi ihe na-agaghị ekwe omume n’anya ụmụ mmadụ, ọ dịghịkwa mkpa ịgbalị ibelata ihe ahụ o bu n’uche site n’iwere ya na agịga ahụ bụ ihe ọzọ karịa ngwá ọrụ nkịtị.”—1981, Mpịakọta nke 3, peeji nke 106.

Ụfọdụ na-atụ aro na n’amaokwu ndị a, e kwesịrị ịkpọ “kamel” “eriri.” Okwu Grik e ji mee ihe maka eriri (kaʹmi·los) na nke e ji mee ihe maka kamel (kaʹme·los) yiri. Otú ọ dị, ọ bụ okwu Grik maka “kamel” kama ịbụ nke e ji eme ihe maka “eriri” pụtara na Matiu 19:24 n’ihe odide Grik ndị kasị ochie nke Oziọma Matiu ka dị adị (Sinaitic, Vatican No. 1209, na Alexandrine). A kọrọ na Matiu bu ụzọ dee Oziọma ya n’asụsụ Hibru, na ọ pụkwara ịbụ na o ji aka ya sụgharịa ya gaa n’asụsụ Grik. Ọ maara kpọmkwem ihe Jizọs kwuru ma jiri okwu dabara adaba mee ihe.

Mgbe ahụzi, Jizọs bu agịga nkịtị e ji akwa ákwà na kamel nkịtị n’uche. O ji ihe ndị a na-emesi ihe na-agaghị ekwe omume ike. Ma Jizọs ọ̀ na-ekwu na ọ dịghị onye bara ọgaranya pụrụ ịba n’Alaeze ahụ? Ee e, n’ihi na Jizọs ebughị n’uche ka a ghọta okwu ya n’ụzọ nkịtị. O ji ikwufe okwu ókè mee ihe iji maa atụ na dị nnọọ ka ọ ga-esi siere kamel nkịtị ike ịgafe n’anya agịga nkịtị e ji akwa ákwà, ọ gaghị ekwe onye bara ọgaranya omume ịba n’Alaeze ahụ ma ọ bụrụ na ọ nọgide na-ejigidesi akụ̀ na ụba ya ike ma ghara ibute Jehova ụzọ ná ndụ ya.—Luk 13:24; 1 Timoti 6:17-19.

Jizọs kwuru okwu a ka otu nwa okorobịa bụ́ onye ọchịchị bara ọgaranya jụchara nnọọ nnukwu ihe ùgwù nke ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs. (Luk 18:18-24) Onye ọgaranya nke nwere ịhụnanya ka ukwuu maka ihe onwunwe ya karịa ka o nwere maka ihe ime mmụọ apụghị ịtụ anya inweta ndụ ebighị ebi ná ndokwa Alaeze ahụ. Ma, ụfọdụ ndị ọgaranya ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Matiu 27:57; Luk 19:2, 9) Ya mere, onye ọgaranya nke maara mkpa ime mmụọ ya ma na-achọ enyemaka Chineke pụrụ inweta nzọpụta Chineke na-enye.—Matiu 5:3; 19:16-26.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.