Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchọ Ihe A Kpọrọ Mmadụ Ime Ihe Na-atọ Chineke Ụtọ

Ọchịchọ Ihe A Kpọrọ Mmadụ Ime Ihe Na-atọ Chineke Ụtọ

 Ọchịchọ Ihe A Kpọrọ Mmadụ Ime Ihe Na-atọ Chineke Ụtọ

“Ọ DỊBEGHỊ ọha mmadụ nke na-ekweghị na Chineke, mgbe mgbe dị ka onye ọchịchị na onye okike. Nke ahụ bụ eziokwu ọbụna banyere ọha mmadụ ndị kpebiri ịghara nnọọ iji okpukpe kpọrọ ihe.” Ka John Bowker na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ God—A Brief History. N’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, ọchịchọ nke ịchọta Chineke na inweta ihu ọma ya abụwo akụkụ nke àgwà ụmụ mmadụ. Gburugburu ụwa, ọtụtụ nwere ọchịchọ sitere n’obi nke ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. N’ezie, otú ha si agbalị ime nke a dịgasị iche dabere na nkwenkwe ha.

Ụfọdụ kweere na nanị ihe dị mkpa iji nweta ihu ọma Chineke bụ ibi ndụ dị mma. Ndị ọzọ chere na ha na-enweta nnwapụta Chineke site n’ịrụ ọrụ ebere maka ndị ogbenye. Ọzọkwa, ememe okpukpe dị ọtụtụ nde mmadụ mkpa.

N’aka nke ọzọ, e nwere ndị kweere na Chineke anọghị ha nso—na ọ nọ nnọọ ebe dị anya ma ọ bụ jiri nnọọ ọrụ ndị ọzọ n’aka nke na ọ pụghị ilebara ndị nkịtị anya. A kọrọ na onye ọkà ihe ọmụma bụ́ Epicurus nke Gris oge ochie kweere na ‘ndị bụ́ chi nọ ebe dị nnọọ anya nke na ha apụghị imere ụmụ mmadụ ihe ọma ma ọ bụ mee ha ihe ọjọọ.’ Otú o sina dị, ọtụtụ bụ́ ndị nwere echiche ndị dị otú ahụ bụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe. Ụfọdụ pụrụ ọbụna ịdị na-achụ àjà ma na-eme ememe okpukpe dị iche iche n’atụmanya ime ka obi ndị nna nna ha nwụrụ anwụ dajụọ.

Gịnị ka i chere? Chineke ọ̀ na-ahụ mgbalị ndị anyị na-eme iji nweta ihu ọma ya? Ọ̀ ga-ekwe anyị omume ime ihe ga-eru Chineke n’obi ma mee ihe na-atọ ya ụtọ?

 [Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

IHU AKWỤKWỌ: Site n’ikike nke ROE/⁠Anglo-Australian Observatory, foto David Malin sere