Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Ime Ka Chineke Ṅụrịa

Ị Pụrụ Ime Ka Chineke Ṅụrịa

 Ị Pụrụ Ime Ka Chineke Ṅụrịa

ÀNYỊ pụrụ n’ezie ime ihe ga-emetụta Chineke? Chineke ọ̀ pụrụ ịṅụrị ọṅụ? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara okwu ahụ bụ́ “Chineke” dị ka “onye kasịnụ dị adị.” Gịnị ma ọ bụrụ na onye ahụ dị egwu nke dị adị bụ nanị ikike? Ànyị pụrụ ịtụ anya ka ikike na-abụghị onye ṅụrịa ọṅụ? Ọ dịghị ma ọlị. Otú ọ dị, tụlee ihe Bible na-ekwu banyere Chineke.

“Chineke bụ Mmụọ,” ka Jizọs Kraịst kwuru. (Jọn 4:24) Mmụọ bụ ụdị ndụ dị iche na nke ụmụ mmadụ. Ọ bụ ezie na anya ụmụ mmadụ apụghị ịhụ ya, mmụọ nwere ahụ́—“ahụ́ nke mmụọ.” (1 Ndị Kọrint 15:44; Jọn 1:18) N’iji atụmatụ okwu eme ihe, Bible na-ekwu ọbụna banyere Chineke dị ka onye nwere anya, ntị, aka, na ihe ndị ọzọ. * Chineke nwekwara aha—Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Ya mere, Chineke nke Bible bụ mmụọ. (Ndị Hibru 9:24) “Ya onwe ya bụ Chineke dị ndụ, na eze na-adị mgbe ebighị ebi.”—Jeremaịa 10:10.

Dị ka onye dị ndụ n’ezie, Jehova nwere ikike nke iche echiche na ime ihe. Ọ na-egosipụta àgwà na mmetụta dị iche iche, ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-adịghị amasị ya. N’ezie, Bible jupụtara n’okwu ndị na-eme ka a mata ihe ndị na-atọ ya ụtọ ma ọ bụ ihe ndị na-adịghị atọ ya ụtọ. Ọ bụ ezie na chi na arụsị dị iche iche ndị ụmụ mmadụ mere bụ nanị ihe ndị na-egosipụta àgwà ụmụ mmadụ bụ́ ndị mere ha, Chineke onye pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova, bụ nnọọ Onye Nwe mmetụta uche ndị o kenyere n’ime ụmụ mmadụ.—Jenesis 1:27; Aịsaịa 44:7-11.

Obi abụọ adịghị ya na Jehova bụ “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) Ọ bụghị nanị na ọ na-aṅụrị ọṅụ n’ọrụ okike ya kamakwa ọ na-enwe obi ụtọ n’imezu nzube ya. Site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, Jehova na-ekwu, sị: “Ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme . . . ekwuwo m, M ga-emekwa ka o mee; ezubewo m, M ga-emekwa ya.” (Aịsaịa 46:9-11) Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Ka Jehova ṅụrịa ọṅụ n’ọrụ Ya nile.” (Abụ Ọma 104:31) Ma, e nwekwara ihe ọzọ na-ewetara Chineke ọṅụ. Ọ na-ekwu, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa.” (Ilu 27:11) Cheedị ihe nke ahụ pụtara—anyị pụrụ ime ka Chineke ṅụrịa!

Otú Anyị Pụrụ Isi Mee Ka Obi Chineke Ṅụrịa

Tụlee otú onyeisi ezinụlọ bụ́ Noa si mee ka obi Jehova ṅụrịa. Noa “hụtara amara n’ihu Jehova” n’ihi na ọ bụ “onye zuru okè n’ọgbọ ya nile.” N’ịbụ onye dị nnọọ iche ná ndị ajọ mmadụ nke oge ahụ, okwukwe na nrubeisi Noa tọrọ Chineke ụtọ nke na a  pụrụ ikwu na “Noa na Chineke yikọrọ na-ejegharị.” (Jenesis 6:6, 8, 9, 22) “Site n’okwukwe, Noa . . . gosiri egwu Chineke ma wuo ụgbọ maka ịzọpụta ezinụlọ ya.” (Ndị Hibru 11:7) Ihe Noa mere tọrọ Jehova ụtọ, ọ gọzikwara ya na ezinụlọ ya site n’ime ka ha lanarị oge ọgba aghara ahụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.

Nna ochie ahụ bụ́ Ebreham makwaara mmetụta Jehova nke ọma. Ihe ọmụma miri emi o nwere banyere echiche Chineke pụtara nnọọ ìhè mgbe Jehova gwara ya na a ga-ebibi Sọdọm na Gọmọra n’ihi ịrụ arụ ha. Ebreham maara Jehova nke ọma ruo n’ókè nke ikwubi na ọ bụ ihe arụ na Chineke ga-egbukọta onye ezi omume na onye ajọ omume. (Jenesis 18:17-33) Ọtụtụ afọ ka nke ahụ gasịrị, n’irube isi ná ntụziaka Chineke, Ebreham “fọrọ nke nta ka ọ chụọ Aịzik n’àjà,” n’ihi na “o weere ya na Chineke nwere ike ịkpọlite ya ọbụna site ná ndị nwụrụ anwụ.” (Ndị Hibru 11:17-19; Jenesis 22:1-18) Ebreham maara nnọọ mmetụta Chineke nke ọma ma gosipụta okwukwe siri ike na nrubeisi nke na a “na-akpọ ya ‘enyi Jehova.’”—Jems 2:23.

Nwoke ọzọ gbalịrị ime ka obi Chineke ṅụrịa bụ Eze Devid nke Izrel oge ochie. Banyere ya, Jehova kwuru, sị: “Achọtawo m Devid nwa Jesi, nwoke kwekọrọ n’obi m, bụ́ onye ga-eme ihe nile m na-achọ.” (Ọrụ 13:22) Tupu ya agaa ịlụso dike ahụ bụ́ Golaịat ọgụ, Devid tụkwasịrị Chineke obi kpam kpam ma gwa Eze Sọl nke Izrel, sị: “Jehova nke napụtara m n’aka ọdụm, na n’aka bea, Ya onwe ya ga-anapụta m n’aka onye Filistia nke a.” Jehova gọziri obi ike Devid nwere na Ya, na-enyere Devid aka igbu Golaịat. (1 Samuel 17:37, 45-54) Devid chọrọ ọ bụghị nanị ka omume ya kamakwa, ‘okwu nile nke ọnụ ya na ntụgharị nke obi ya bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Jehova.’—Abụ Ọma 19:14.

Gịnị banyere anyị? Olee otú anyị pụrụ isi mee ka Jehova nwee obi ụtọ? Ka anyị na-amatakwu mmetụta Chineke, otú ahụ ka anyị ga na-amatakwu ihe anyị pụrụ ime iji mee ka obi Chineke ṅụrịa. Ya mere, ka anyị na-agụ Bible, ọ dị oké mkpa ka anyị na-etinye mgbalị ịmụ banyere mmetụta Chineke ka anyị wee ‘jupụta n’ezi ihe ọmụma nke uche ya n’amamihe nile na nghọta ime mmụọ, ka anyị wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu.’ (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) N’aka nke ya, ihe ọmụma na-enyere anyị aka iwulite okwukwe anyị. Nke a dị oké mkpa n’ihi na “ma okwukwe adịghị ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Chineke] ezi mma.” (Ndị Hibru 11:6) Ee, site n’itinye mgbalị iwulite okwukwe siri ike na site n’ime ka ndụ anyị na-ekwekọ n’uche Jehova, anyị pụrụ ime ka obi ya ṅụrịa. N’otu oge ahụ, anyị aghaghị ịkpachara anya ịghara ime ka Jehova nwee mwute.

Emela Ka Chineke Nwee Mwute

A na-achọta ihe atụ nke otú a pụrụ isi mee ka Jehova nwee mwute n’ihe ndekọ banyere ụbọchị Noa. N’oge ahụ, “ụwa jupụtakwara n’ihe ike. Chineke wee hụ ụwa, ma, lee, e bibiri ya; n’ihi na anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ, bibiri ụzọ ya n’elu ụwa.” Olee mmetụta Chineke nwere ka ọ na-ahụ ịrụ arụ na ime ihe ike ahụ? “Jehova wee chegharịa na O mere mmadụ n’ụwa,” ka Bible na-ekwu, “o wee wute Ya n’obi Ya.” (Jenesis 6:5, 6, 11, 12) Chineke nwere mwute n’echiche nke na omume ụmụ mmadụ bịara dị nnọọ njọ nke na ọ gbanwere àgwà ya n’ebe ajọ ọgbọ ahụ dị tupu Iju Mmiri ahụ dị. N’ihi mwute o nwere n’ihi ajọ omume ha, Chineke gbanwere site n’ịbụ Onye Okike nke ụmụ mmadụ gaa n’ịbụ onye mbibi ha.

Jehova nwekwara mwute mgbe ndị nke ya, bụ́ mba Izrel oge ochie, nọgidere na-eleghara  mmetụta ya na nduzi ịhụnanya ya anya. Ọbụ abụ ahụ kwara arịrị, sị: “Ugboro ole ka ha na-enupụ isi n’okpuru Ya n’ọzara? Ugboro ole ka ha na-eme ka o wute Ya n’ala tọgbọrọ n’efu? Ha wee chigharịa, wee nwaa Chineke, ọ bụkwa Onye nsọ nke Izrel ka ha kpasuru iwe.” N’agbanyeghị nke ahụ, “O nwere obi ebere, Ọ na-ekpuchi ajọ omume ha, Ọ dịghị ebibikwa ha: ee, ọtụtụ mgbe ka O mere iwe Ya ka ọ laghachi azụ, Ọ dịghị akpọtekwa ọnụma Ya nile.” (Abụ Ọma 78:38-41) Ọ bụ ezie na ụmụ Izrel bụ́ ndị na-enupụ isi tara ahụhụ n’ụzọ ziri ezi n’ihi mmehie ha, Bible na-agwa anyị na “ná mkpagbu nile ha [ọ bụ Chineke] ka a na-akpagbu.”—Aịsaịa 63:9.

N’agbanyeghị ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosipụta mmetụta dị nro Chineke nwere maka ha, ndị Izrel “wee na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu Ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma Ya nọ, ruo mgbe ọnụma Jehova lara elu imegide ndị Ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.” (2 Ihe E Mere 36:16) N’ikpeazụ, àgwà ha nke iji ikwesi olu ike enupụ isi mere ka “o wute Mmụọ Nsọ Ya” ruo n’ókè nke na ihu ọma Jehova funahụrụ ha. (Aịsaịa 63:10) Gịnị si na ya pụta? N’ụzọ ziri ezi, Chineke wepụrụ nchebe ya n’ebe ha nọ, ọdachi dakwasịkwara ha mgbe ndị Babilọn meriri Juda ma bibie Jeruselem. (2 Ihe E Mere 36:17-21) Lee ihe mwute ọ na-eweta mgbe ndị mmadụ họọrọ ịgbaso ụzọ ndụ nke mmehie bụ́ nke na-akpasu Onye Okike ha iwe ma na-ewute ya!

Bible mere ka o doo anyị anya na omume na-ezighị ezi na-akpasu Chineke iwe nke ukwuu. (Abụ Ọma 78:41) Ihe ndị na-akpasu Chineke iwe—ọbụna bụrụ ihe arụ—n’anya ya na-agụnye mpako, ịgha ụgha, igbu ọchụ, ime majik, ịgba afa, ife ndị nna ochie ofufe, omume rụrụ arụ, ndina ụdị onwe, ekwesịghị ntụkwasị obi nye onye òtù ọlụlụ, idina onye ikwu, na imegbu ndị ogbenye.—Levitikọs 18:9-29; 19:29; Deuterọnọmi 18:9-12; Ilu 6:16-19; Jeremaịa 7:5-7; Malakaị 2:14-16.

Olee otú Jehova si ele ikpere arụsị anya? Ọpụpụ 20:4, 5 na-ekwu, sị: “Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isi ala nye ha, efekwala ha ofufe.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na arụsị bụ “ihe arụ nke Jehova.” (Deuterọnọmi 7:25, 26) Jọn onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ụmụntakịrị, cheenụ onwe unu nche pụọ n’arụsị.” (1 Jọn 5:21) Pọl onyeozi dekwara, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, gbanahụnụ ikpere arụsị.”—1 Ndị Kọrint 10:14.

Na-achọ Nnwapụta Chineke

‘N’aka ndị ziri ezi ka izu nzuzo Chineke dị.’ “Ihe na-atọ ya ụtọ ka ndị zuru okè n’ụzọ ha bụ.” (Ilu 3:32; 11:20) N’ụzọ dị iche, Chineke ga-ajụ ndị nọgidere na-akpasu ya iwe site n’iji ịgba isi akwara na-eleghara mmetụta ezi omume ya anya ma ọ bụ na-eme ihe megidere ya. (2 Ndị Tesalonaịka 1:6-10) N’ezie, n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eweta ajọ omume nile jupụtara ebe nile taa ná njedebe.—Abụ Ọma 37:9-11; Zefanaịa 2:2, 3.

Otú ọ dị, Bible na-eme nnọọ ka ọ pụta ìhè na Jehova ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla kama ọ na-achọ ka mmadụ nile ruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9) Ọ ga-enwe nnọọ mmasị n’igosipụta ịhụnanya ya maka ndị ezi omume bụ́ ndị hụrụ ya n’anya karịa ka ọ ga-enwe n’igosipụta enweghị mmasị ya n’ebe ndị họọrọ ịghọ ndị na-ekweghị mmekwata nọ. ‘Ọnwụ nke onye na-emebi iwu adịghị atọ Jehova ụtọ ma ọlị; kama ọ na-atọ ya ụtọ mgbe onye na-emebi iwu si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ.’—Ezikiel 33:11.

 Ọ dịghị onye a kara akara inweta iwe Jehova. “Jehova nwere mmetụta dị nnọọ nro, na-emekwa ebere.” (Jems 5:11) N’inwe obi ike zuru ezu ná mmetụta Chineke, ị pụrụ ‘ịtụkwasị nchegbu nile gị n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere gị.’ (1 Pita 5:7) Jide n’aka na ndị na-eme ka obi Chineke ṅụrịa nwere atụmanya dị ebube nke inweta ihu ọma na ọbụbụenyi ya. N’ihi ya, ọ dị ngwa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ‘ịnọgide na-ejide n’aka ihe Onyenwe anyị na-anara nke ọma.’—Ndị Efesọs 5:10.

Lee ihe magburu onwe ya ọ bụ na Chineke site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ ekpughewo àgwà ya ndị dị ebube na mmetụta ya! Ị pụkwara ime ka obi ya ṅụrịa. Ọ bụrụ na ị chọrọ ime otú ahụ, anyị na-agba gị ume ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ha ga-enwe obi ụtọ igosi gị ihe ndị ha chọpụtara na-adị irè na ndị na-ekwe omume ná mgbalị ha ime ka Chineke nwee obi ụtọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee igbe nke isiokwu ya bụ “N’ihi Gịnị Ka Bible Ji Eji Ọdịdị Mmadụ Akọwa Chineke?”

[Igbe dị na peeji nke 7]

N’ihi Gịnị Ka Bible Ji Eji Ọdịdị Mmadụ Akọwa Chineke?

Ebe ọ bụ na “Chineke bụ Mmụọ,” anyị apụghị iji anya anyị nkịtị hụ ya. (Jọn 4:24) Ya mere, Bible na-eji atụmatụ okwu, ndị dị ka ihe yiri ihe, ihe bụ ihe, na iji ọdịdị mmadụ akọwa Chineke eme ihe iji nyere anyị aka ịghọta ike, ịdị ebube na ọrụ Chineke. Ya mere, ọ bụ ezie na anyị amaghị ihe ahụ́ mmụọ nke Chineke dị ka ya, Bible na-ekwu na Chineke nwere anya, ntị, aka, ogwe aka, mkpịsị aka, ụkwụ, na obi.—Jenesis 8:21; Ọpụpụ 3:20; 31:18; Job 40:9; Abụ Ọma 18:9; 34:15.

Nkọwa ndị dị otú ahụ apụtaghị na ahụ́ mmụọ Chineke nwere otu ụdị akụkụ ahụ́ ndị ahụ́ mmadụ nwere. E kwesịghị ile iji ọdịdị mmadụ akọwa Chineke anya n’ụzọ nkịtị. Nanị ihe ha na-eme bụ inyere ụmụ mmadụ aka ịghọta Chineke nke ọma karị. Ọ bụrụ na e jighị atụmatụ okwu dị otú ahụ mee ihe, ọ ga-esi ike, ọbụna bụrụ ihe na-agaghị ekwe omume, ịkọwa Chineke n’ụzọ ụmụ mmadụ nkịtị ga-aghọta. Otú ọ dị, nke ahụ apụtaghị na ọ bụ ụmụ mmadụ mepụtara àgwà nke Jehova Chineke. Bible na-akọwa n’ụzọ doro anya na e kere mmadụ n’onyinyo Chineke—ọ bụghị na e kere Chineke n’onyinyo mmadụ. (Jenesis 1:27) N’ihi na ndị dere Bible “sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke” dee ya, otú ha si kọwaa àgwà Chineke bụ n’ezie otú o si kọwaa àgwà ya—kpọmkwem àgwà ndị ọ kụnyere n’ime ụmụ mmadụ ndị o kere eke n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche. (2 Timoti 3:16, 17) Kama ha ịbụ àgwà mmadụ n’ime Chineke, ha bụ n’ezie àgwà Chineke n’ime mmadụ.

[Foto dị na peeji nke 4]

Noa nwetara ihu ọma Chineke

[Foto dị na peeji nke 5]

Ebreham maara mmetụta Chineke nke ọma

[Foto dị na peeji nke 6]

Devid nwere ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ

[Foto dị na peeji nke 7]

Ka ị na-agụ Bible, ị pụrụ ịmụta otú ị ga-esi mee ka Chineke ṅụrịa

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]

Site n’ikike nke Anglo-Australian Observatory, foto David Malin sere