Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Udo Westphalia—Oge Oké Mgbanwe na Europe

Udo Westphalia—Oge Oké Mgbanwe na Europe

 Udo Westphalia—Oge Oké Mgbanwe na Europe

“ỌTỤTỤ ndị isiala nke mba Europe ịgbakọta ọnụ otú ha si gbakọta n’ebe a taa bụ n’ezie ihe a na-adịghị ahụkebe.” Roman Herzog, onye bụ́bu president nke Federal Republic of Germany, kwuru nke ahụ n’October 1998. Mgbe o kwuru nke ahụ, ndị na-ege ya ntị gụnyere ndị eze anọ, ndị eze nwanyị anọ, ndị isi obodo abụọ, otu nnukwu onyeisi, na ọtụtụ ndị president. Ihe omume ahụ, bụ́ nke Kansụl Europe haziri, bụ nke dị oké mkpa n’akụkọ ihe merenụ kemgbe afọ 50 ná mba Germany nke oge a. Gịnị bụ ihe omume ahụ?

October 1998 bụ ụbọchị ememe mgbaafọ 350 nke Nkwekọrịta Udo Westphalia. Oge nkwekọrịta udo na-abụkarị mgbe a na-eme mkpebi ndị dị mkpa n’akụkọ ihe mere eme, a bịakwa na nke a, Nkwekọrịta Udo Westphalia pụrụ iche. Ịbịanye aka ná nkwekọrịta a na 1648 wetara Agha Afọ Iri Atọ ahụ ná njedebe ma kaa akara nguzobe nke Europe nke oge a dị ka kọntinent nwere ọtụtụ mba ndị kwụụrụ onwe ha.

E Mee Ka Usoro Ihe Ochie Maa Jijiji

Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, òtù ndị kasị ike e nwere na Europe bụ Chọọchị Roman Katọlik na Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ. Ihe mejupụtara alaeze ukwu ahụ bụ ọtụtụ narị obodo dịgasị iche iche, ọ gụnyekwara ebe ndị bụzi Austria, Czech Republic, ebe ọwụwa anyanwụ France, Germany, Switzerland, Mba Ndị Dị n’Ebe Dị Ala, na akụkụ ụfọdụ nke Ịtali. Ebe ọ bụ na ọ bụ obodo dị iche iche nke Germany mejupụtara akụkụ ya bụ́ isi, a bịara mara alaeze ukwu ahụ dị ka Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ nke Mba Germany. Ọ bụ onyeisi na-achị obodo nke ọ bụla. Eze ukwu ha n’onwe ya bụ onye Roman Katọlik onye sitere n’ezinụlọ Habsburg nke Austria. N’ihi ya, ebe popu na eze ukwu na-achị, Europe batara nnọọ n’aka Roman Katọlik.

Otú ọ dị, na narị afọ nke 16 na nke 17, usoro ihe a haziri ahazi mara jijiji. Ndị mmadụ na Europe dum enweghị afọ ojuju n’ihi imebiga ihe ókè nke Chọọchị Roman Katọlik. Ndị ndozigharị okpukpe dị ka Martin Luther na John Calvin kwuru okwu banyere ịlaghachi n’ụkpụrụ Bible. Luther na Calvin nwetara nkwado nke ọtụtụ ndị, ihe omume a mekwara ka e nwee Ndozigharị ahụ na okpukpe Protestant. Ndozigharị ahụ kewara alaeze ukwu ahụ gaa n’okpukpe atọ—Katọlik, Lutheran, na nke Calvin.

Ndị Katọlik nyowere ndị Protestant enyowe, ndị Protestant ledawakwara ndị iro ha bụ́ ndị Katọlik anya. Ọnọdụ a dugara ná nhiwe nke Òtù Protestant na Njikọ Katọlik ná mmalite narị afọ nke 17. Ụfọdụ ndị isi nke alaeze ukwu ahụ sonyeere Òtù ahụ, ndị ọzọ sonyeere Njikọ ahụ. Europe—karịsịakwa alaeze ukwu ahụ—ghọrọ ebe a na-enyo nnọọ ndị mmadụ enyo, bụ́ ebe nanị obere nsogbu zuru ịkpata oké ọgba aghara. Mgbe nsogbu ahụ mesịrị dapụta, ọ kpalitere ọgba aghara nke were afọ 30.

Otu Ajọ Nsogbu Akpata Ọgba Aghara na Europe

Ndị isi Protestant gbalịrị ime ka ezinụlọ Habsburg bụ́ ndị Katọlik nyekwuo nnwere  onwe ife ofufe. Ma ha ejighị obi ha nye nke ahụ, na 1617-1618 kwa, e ji ike mechie chọọchị Lutheran abụọ dị na Bohemia (Czech Republic). Nke a kpasuru ndị isi Protestant iwe, bụ́ ndị mabanyere n’otu obí eze dị na Prague, jide ndị isi Katọlik atọ ma si na windo ụlọ elu tụpụ ha. Omume a bụ isi ihe kpatara oké ọgba aghara na Europe.

Ọ bụ ezie na ha sị na ha bụ ụmụazụ nke Onyeisi Udo, bụ́ Jizọs Kraịst, ndị so n’okpukpe abụọ a na-emegiderịta onwe ha busorịtara ibe ha agha. (Aịsaịa 9:6) N’Agha nke Ugwu Ọcha, Njikọ ahụ meriri Òtù ahụ ajọ mmeri, Òtù ahụ kewakwara. E gburu ndị isi Protestant n’ọma ahịa nke Prague. Na Bohemia nile, e jichiri ihe onwunwe nke ndị Protestant na-ekweghị ajụ okwukwe ha ma kesaara ya ndị Katọlik. Akwụkwọ bụ́ 1648—Krieg und Frieden in Europa (1648—Agha na Udo na Europe) kọwara njichi a dị ka “otu n’ime mgbanwe kasịnụ nke ikike inwe ihe e nwetụrụla na Europe.”

Ihe malitere dị ka esemokwu okpukpe na Bohemia gbasara ghọọ nsọrịta mpi maka ike ọchịchị n’etiti mba dị iche iche. N’ime ihe karịrị afọ 30 sochirinụ, Denmark, France, Netherlands, Spen, na Sweden sonyere n’agha ahụ. Ndị ọchịchị bụ́ ndị Katọlik na ndị nke Protestant, n’ịbụ ndị anyaukwu na oké ọchịchọ maka inweta ike ọchịchị kpaliri ọtụtụ mgbe, sọrịtara mpi inweta ike ọchịchị na uru ahịa. E kewawo Agha Afọ Iri Atọ ahụ gaa ná nkebi ná nkebi, na-akpọ nke ọ bụla aha ndị iro bụ́ isi nke eze ukwu ahụ. Ọtụtụ akwụkwọ ntụaka kpọtụrụ anọ n’ime nkebi ndị ahụ aha: Agha Bohemia na Palatine, Agha Denmark na Saxony nke Dị n’Ebe Dị Ala, Agha Sweden, na Agha France na Sweden. Ihe ka ọtụtụ n’agha ndị ahụ weere ọnọdụ n’ókèala nke alaeze ukwu ahụ.

Ngwá agha ndị e ji mee ihe n’oge ahụ gụnyere obere égbè na ụdị ogbunigwe dịgasị iche iche, Sweden bụkwa mba bụ́ isi na-ebuga ngwá agha. Ndị Katọlik na Protestant busorịtara ibe ha agha. Ndị agha banyere n’ọgbọ agha na-eti “Santa Maria” ma ọ bụ “Chineke nọnyeere anyị.” Usuu ndị agha kwakọọrọ ihe ndị mmadụ ka ha na-agabiga n’obodo dị iche iche nke Germany, na-emeso ndị iro ha na ndị nkịtị ihe dị ka ụmụ anụmanụ. Agha ahụ ghọwanyere nke obi ọjọọ. Lee ka nke ahụ si dị nnọọ iche n’amụma Bible bụ́: “Mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ”!—Maịka 4:3.

E nwere otu ọgbọ nke ndị Germany tolitere n’enweghị ihe ọ bụla ọzọ ha ma ma ọ́ bụghị agha, ndị mmadụ ike gwụwokwara chọsiri udo ike. N’ụzọ doro anya, udo gaara ekwe omume ma a sị na ọchịchọ ndị ọchịchị adịrịtaghị iche. Agha ahụ bịara nnọọ ghọọ nke ọchịchị ma kwụsị ịbụ nke okpukpe. N’ụzọ na-emegide onwe ya, onye kpatara mgbanwe a bụ nnukwu onyeisi a ma ama nke Chọọchị Katọlik.

Kadinal Richelieu Egosi Ike Ya

Utu aha chọọchị nke Armand-Jean du Plessis bụ Kadinal de Richelieu. Ọ bụkwa praịm  minista nke France site na 1624 ruo 1642. Richelieu zubere ime France ike ọchịchị bụ́ isi na Europe. Iji mezuo nke a, ọ gbalịrị ibelata ike nke ndị Katọlik ibe ya, bụ́ ezinụlọ Habsburg. Ò si aṅaa mee nke a? Ọ bụ site n’ịkwado ndị agha Protestant nke obodo dị iche iche nke Germany, Denmark, Netherlands, na Sweden n’ụzọ ego, bụ́cha ndị na-ebuso ndị ezinụlọ Habsburg agha.

Na 1635, Richelieu zigara ndị agha France n’agha na nke mbụ ya. Akwụkwọ bụ́ vivat pax—Es lebe der Friede! (Ka Udo ahụ Dịruo Mgbe Ebighị Ebi!) na-akọwa na ná nkebi ikpeazụ ya, “Agha Afọ Iri Atọ ahụ kwụsịrị ịbụ agha dị n’etiti òtù okpukpe dị iche iche . . . Agha ahụ ghọrọ nsọrịta mpi maka ike ọchịchị na Europe.” Ihe malitere dị ka esemokwu okpukpe dị n’etiti ndị Katọlik na ndị Protestant ghọrọ agha ebe ndị Protestant sonyeere ndị Katọlik n’ibuso ndị Katọlik ibe ha agha. Njikọ Katọlik, bụ́ nke na-esizighị ike ná mmalite afọ ndị 1630, kewara na 1635.

Nnọkọ Udo na Westphalia

Ịkwakọrọ ihe ndị mmadụ, igbu ọchụ, ndina n’ike, na ọrịa jupụtara na Europe. Nwayọọ nwayọọ, a bịara chọsiwe udo ike mgbe a chọpụtara na agha ahụ bụ nke ọ na-adịghị onye ga-emeri na ya. Akwụkwọ ahụ bụ́ vivat pax—Es lebe der Friede! na-ekwu na “ka ọ na-erule ná ngwụsị nke afọ ndị 1630, ndị isi na-achị achị mesịrị ghọta na ibu agha agaghịzi enyere ha aka inweta ihe ha chọrọ.” Ma ọ bụrụ na udo bụ ihe onye ọ bụla chọrọ, olee otú a ga-esi nweta ya?

Eze Ukwu Ferdinand nke Atọ nke Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ, Eze Louis nke Iri na Atọ nke France, na Eze Nwanyị Christina nke Sweden, kweere na e kwesịrị inwe nnọkọ bụ́ ebe ndị nile na-eburịta agha ahụ kwesịrị izukọta ma kwuo okwu udo. A họọrọ ebe abụọ maka okwu ahụ—obodo Osnabrück na Münster ndị dị n’ógbè Westphalia nke Germany. A họọrọ ha n’ihi na ha nọ n’etiti isi obodo Sweden na France. Malite na 1643, ihe dị ka mmadụ 150—ndị ụfọdụ n’ime ha kpọ ọtụtụ ndị ndụmọdụ—gara n’obodo abụọ ahụ, ndị nnọchianya nke ndị Katọlik gbakọtara na Münster, ndị nnọchianya nke ndị Protestant gbakọtakwara na Osnabrück.

Ná mmalite, a tụrụ ụkpụrụ omume iji hụ maka utu aha na ọkwá nke ndị nnọchianya ndị ahụ, onye ga-anọ ọdụ ebe ọ ga-anọ, na usoro ndị a ga-agbaso. Mgbe e mesịrị, okwu udo ahụ malitere, site n’aka ndị ngabita, e gosikwara onye nke ọ bụla bịaranụ aro ndị e dere ede. Mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ ise gasịrị—ka agha ahụ ka na-aga n’ihu—e nwere nkwekọrịta udo. Akwụkwọ Nkwekọrịta Udo Westphalia karịrị otu akwụkwọ. Eze Ukwu Ferdinand nke Atọ na ndị Sweden bịanyere aka n’otu akwụkwọ nkwekọrịta na Osnabrück, eze ukwu ahụ na ndị France abịanyekwa aka na nke ọzọ na Münster.

Akụkọ banyere nkwekọrịta udo ahụ gbasara, ememe birikwaara ọkụ. A gbara nọkaụt n’ebe nile n’obodo dị iche iche. Mgbịrịgba ụlọ ụka na égbè malitere ịda aghara aghara n’ihi obi ụtọ, ndị mmadụ bụrụkwaara abụ na-aga n’okporo ámá dị iche iche. Europe ọ̀ pụrụ ịtụ anya udo na-adịgide adịgide ugbu a?

À Pụrụ Inwe Udo Na-adịgide Adịgide?

Nkwekọrịta Udo Westphalia ahụ nabatara ihe ndị ruuru mba ndị kwụụrụ onwe ha. Nke a pụtara na ndị ọ bụla so ná nkwekọrịta ahụ agaghị etinye aka n’ókèala nke mba ndị ọzọ, ha agaghịkwa etinye ọnụ n’ihe ndị na-eme n’ime mba ndị ọzọ. N’ụzọ dị otú a, e guzobere Europe nke oge a, dị ka kọntinent nke ọtụtụ mba ndị kwụụrụ onwe ha mejupụtara. N’ime mba ndị ahụ, ụfọdụ nwetara ihe ná nkwekọrịta ahụ karịa ndị ọzọ.

E guzobere France dị ka ike ọchịchị bụ́ isi,  Netherlands na Switzerland nwekwaara onwe ha. A bịa n’obodo dị iche iche nke Germany, bụ́ ndị agha ahụ bibiworo ọtụtụ n’ime ha, nkwekọrịta ahụ gbara ọrụ. Ruo n’ókè ụfọdụ, ọ bụ mba ndị ọzọ kpebiri ihe Germany nwetara. The New Encyclopædia Britannica na-akọ, sị: “Ihe ndị isi Germany nwetara dabeere n’ihe ga-amasị ike ọchịchị ndị bụ́ isi bụ́: France, Sweden, na Austria.” Kama ịbụ ndị e jikọrọ ọnụ dị ka otu mba, e kewasịrị obodo Germany ekewasị dị nnọọ ka ọ dịbu. Ọzọkwa, e nyere ndị ọchịchị mba ọzọ ókèala ya ụfọdụ, dịkwa ka e mere osimiri ndị bụ́ isi nke Germany—Rhine, Elbe, na Oder.

E nyere okpukpe Katọlik, Lutheran, na nke Calvin ikike ha nhata. Nke a amasịghị mmadụ nile. Popu Innocent nke Iri megidere nnọọ nkwekọrịta ahụ, na-ekwu na o nweghị isi. Otú o sina dị, òtù okpukpe ndị ahụ bụ́ isi e guzobere dịkwa nnọọ otú ha dị ruo narị afọ atọ. Ọ bụ ezie na ndị mmadụ n’otu n’otu enwebeghị nnwere onwe okpukpe, o ji nwayọọ nwayọọ na-abịa.

Nkwekọrịta ahụ wetara Agha Afọ Iri Atọ ahụ ná njedebe, esemokwu ndị e nwere kwụsịtụkwara. Nke a bụ agha okpukpe ikpeazụ bụ́ isi a lụrụ na Europe. Agha akwụsịghị, ma ihe na-akpata ha kwụsịrị ịbụ okpukpe ma bụrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ azụmahịa. Nke a apụtaghị na okpukpe adịghịzi etinye aka n’esemokwu ndị a na-enwe na Europe. N’Agha Ụwa Mbụ na nke Abụọ, ndị agha Germany yi belt e dere okwu a a ma ama n’isi ya: “Chineke Nọnyeere Anyị.” N’oge agha obi ọjọọ ndị ahụ, ndị Katọlik na ndị Protestant jikọkwara aka n’otu akụkụ na-ebuso ndị Katọlik na ndị Protestant nọ n’akụkụ nke ọzọ agha.

N’ụzọ doro anya, Nkwekọrịta Udo Westphalia ewetaghị udo na-adịgide adịgide. Otú ọ dị, ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enweta udo dị otú ahụ n’isi nso. Jehova Chineke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ udo na-adịgide adịgide site n’Alaeze Mezaịa nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. N’okpuru ọchịchị ahụ, otu ezi okpukpe ga-abụ ihe na-akpata ịdị n’otu, ọ bụghị nkewa. Ọ dịghị onye ga-alụkwa agha n’ihi ihe ọ bụla, n’ihi okpukpe ma ọ bụ ihe ndị yiri ya. Lee ahụ́ efe ọ ga-abụ mgbe ịchịisi Alaeze ahụ ga-ezu ụwa nile, ‘ịba ụba nke udo agharakwa ịgwụ agwụ’!—Aịsaịa 9:6, 7.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Ihe malitere dị ka esemokwu okpukpe dị n’etiti ndị Katọlik na ndị Protestant ghọrọ agha ebe ndị Protestant sonyeere ndị Katọlik n’ibuso ndị Katọlik ibe ha agha

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

Ndị agha banyere n’ọgbọ agha na-eti “Santa Maria” ma ọ bụ “Chineke nọnyeere anyị”

[Foto dị na peeji nke 21]

Kadinal Richelieu

[Foto dị na peeji nke 23]

Ihe osise nke narị afọ nke 16 nke na-egosi nsọrịta mpi dịrị n’etiti Luther, Calvin, na popu

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]

Site n’akwụkwọ bụ́ Spamers Illustrierte Weltgeschichte VI

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]

Ebe ndị ndú okpukpe na-asọrịta mpi: Site n’akwụkwọ bụ́ Wider die Pfaffenherrschaft; map: The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck