Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọpụpụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọpụpụ

 Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ọpụpụ

Ọ BỤ akụkọ mere eme nke nnapụta nke ndị ‘e ji mkpagbu mee ka ha bụrụ ohu.’ (Ọpụpụ 1:13) Ọ bụkwa ihe ndekọ na-akpali akpali nke ọmụmụ nke otu mba. Ọrụ ebube ndị dị ịtụnanya, iwu ndị bụ́ ịgba na owuwu nke ụlọikwuu so n’akụkụ ya ndị na-adọrọ mmasị. N’ụzọ bụ́ isi, nke a bụ ihe dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọpụpụ.

N’ịbụ nke onye amụma Hibru bụ́ Mozis dere, Ọpụpụ na-akọ ahụmahụ ndị Izrel nwere ruo ihe karịrị afọ 145—site n’ọnwụ Josef na 1657 T.O.A. ruo mgbe e wusịrị ụlọikwuu ahụ na 1512 T.O.A. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndekọ ahụ karịrị nanị akụkọ ihe mere eme. Ọ bụ akụkụ nke okwu, ma ọ bụ ozi Chineke, nye ihe a kpọrọ mmadụ. N’ihi ya, ọ “dị ndụ ma na-akpa ike.” (Ndị Hibru 4:12) Mgbe ahụ, Ọpụpụ nwere nnọọ ihe ọ pụtara nye anyị.

“CHINEKE WEE NỤ ỊSỤ UDÈ HA”

(Ọpụpụ 1:1–4:31)

Ụmụ Jekọb bi n’Ijipt amụbaa ngwa ngwa nke na n’ihi iwu eze nyere e mee ka ha taa ahụhụ dị ka ndị ohu. Fero enye iwu ọbụna ka e gbuo ụmụ ọhụrụ Izrel nile bụ́ nwoke. Onye lanarịrị ogbugbu dị otú ahụ bụ nwa ọhụrụ dị ọnwa atọ, bụ́ Mozis, onye ada Fero kuchiri. Ọ bụ ezie na a zụlitere ya n’obí eze, mgbe ọ dị afọ 40, Mozis adụnyere ndị ya úkwù ma gbuo otu onye Ijipt. (Ọrụ 7:23, 24) N’ịbụ onye a manyere ịgbalaga, ya agbaga Midian. Ya alụọ nwunye n’ebe ahụ ma na-ebi ndụ dị ka onye ọzụzụ atụrụ. N’obere osisi na-ere ọkụ n’ụzọ ọrụ ebube, Jehova enye Mozis iwu ịlaghachi Ijipt iji dupụta ndị Izrel n’ịgba ohu. A họpụta nwanne ya, bụ́ Erọn, ịbụ ọnụ na-ekwuru ya.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

3:1Ụdị onye nchụàjà dị aṅaa ka Jetro bụ? N’oge ndị nna ochie, onyeisi ezinụlọ na-eje ozi dị ka onye nchụàjà maka ezinụlọ ya. N’ụzọ doro anya, Jetro bụ́ nna ochie bụ onyeisi nke otu n’ime ebo ndị Midian. Ebe ndị Midian bụ ụmụ Ketura mụtaara Ebreham, ikekwe ha maara banyere ofufe Jehova.—Jenesis 25:1, 2.

4:11N’echiche dị aṅaa ka Jehova bụ ‘onye na-eme mmadụ ka ọ bụrụ onye ogbi, onye ntị chiri, nakwa onye ìsì’? Ọ bụ ezie na ọ dịwo mgbe Jehova kpatara ikpu ìsì na ịda ogbi, ọ bụghị ya na-akpata ụdị nkwarụ nile dị otú ahụ. (Jenesis 19:11; Luk 1:20-22, 62-64) Ha bụ ihe ndị mmehie e ketara eketa na-akpata. (Job 14:4; Ndị Rom 5:12) Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Chineke ekwewo ka ọnọdụ a dịrị, ọ pụrụ ikwu na ọ bụ ya “na-eme” mmadụ ka ọ bụrụ onye ogbi, onye ntị chiri nakwa onye ìsì.

4:16Olee otú Mozis ga-esi ‘bụụrụ Erọn Chineke’? Mozis bụ onye nnọchiteanya Chineke. N’ihi ya, Mozis dị ka “Chineke” nye Erọn, bụ́ onye kwuchiteere Mozis.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:7, 14. Jehova kwadoro ndị ya mgbe a nọ na-emegbu ha n’Ijipt. N’otu aka ahụ, ọ na-akwado Ndịàmà ya nke oge a, ọbụna mgbe ha na-eche mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ihu.

 1:17-21. Jehova na-echeta ‘imere anyị ezi ihe.’—Nehemaịa 13:31.

3:7-10. Ntiku nke ndị ya na-emetụ Jehova n’obi.

3:14. Jehova na-emezu nzube ya mgbe nile. N’ihi ya, anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-eme ka olileanya anyị ndị dabeere na Bible mezuo.

4:10, 13. Mozis gosiri nnọọ na obi esighị ya ike banyere ikike ikwu okwu ya nke na ọbụna mgbe Chineke mesiri ya obi ike na ya ga-anọnyere ya, ọ rịọrọ Chineke ka o ziga onye ọzọ ịga gwa Fero okwu. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova jiri Mozis mee ihe ma nye ya amamihe na ike dị ya mkpa iji rụzuo ọrụ ya. Kama ilekwasị anya n’erughị eru anyị, ka anyị dabere na Jehova ma jiri ikwesị ntụkwasị obi na-arụzu ọrụ anyị nke ime nkwusa na izi ihe.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

ỌRỤ EBUBE NDỊ DỊ ỊTỤNANYA EWETA NNAPỤTA

(Ọpụpụ 5:1-15:21)

Mozis na Erọn abịa n’ihu Fero, na-agwa ya ka ọ hapụ ndị Izrel ka ha gaa meere Jehova ememe n’ọzara. Onye ọchịchị Ijipt ahụ ajụwaa isi. Jehova esite n’aka Mozis weta ọtụtụ ihe otiti ndị dị ike. Ọ bụ nanị mgbe e wetasịrị ihe otiti nke iri ka Fero kwere ka ndị Izrel laa. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ya na usuu ndị agha ya achụrụ ndị Izrel ọkụ ọkụ gawa. Ma Jehova meghere ụzọ mgbapụ n’Osimiri Uhie, zọpụtakwa ndị ya. Mmiri agbagbuo ndị Ijipt na-achụ ha ka osimiri ahụ rikpuru ha.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

6:3N’ụzọ dị aṅaa ka e si ghara ime ka Ebreham, Aịzik na Jekọb mara aha Chineke? Ndị nna ochie a jiri aha Chineke mee ihe ma nata nkwa ndị sitere n’aka Jehova. Ma, ha amaghị Jehova dị ka onye mere ka nkwa ndị a mezuo ma ọ bụ hụ mgbe o mere nke ahụ.—Jenesis 12:1, 2; 15:7, 13-16; 26:24; 28:10-15.

7:1Olee otú e si mee ka Mozis “ghọọrọ Fero chi”? Chineke nyere Mozis ikike karịrị nke Fero. N’ihi ya, ọ dịghị ya mkpa ịtụ eze ahụ egwu.

7:22Ebee ka ndị nchụàjà Ijipt si nweta mmiri nke na-aghọbeghị ọbara? Ọ pụrụ ịbụ na ha ji mmiri e kutere n’Osimiri Naịl tupu ihe otiti a mee ihe. O doro anya na a pụkwara inweta mmiri na-aghọbeghị ọbara site n’igwu olulu mmiri n’ala ndị dị mmiri mmiri ndị dị gburugburu Osimiri Naịl.—Ọpụpụ 7:24.

8:26, 27N’ihi gịnị ka Mozis ji kwuo na àjà ndị Izrel ga-abụ “ihe arụ ndị Ijipt”? A na-efe ọtụtụ anụ dịgasị iche iche ofufe n’Ijipt. Ya mere, ịkpọtụ àjà aha mere ka ọnwụ Mozis siri ka a hapụ ndị Izrel ka ha pụọ apụọ iji chụọrọ Jehova àjà zie ezie.

12:29Olee ndị a gụrụ dị ka ụmụ e buru ụzọ mụọ? Ụmụ e buru ụzọ mụọ gụnyere nanị ndị nwoke. (Ọnụ Ọgụgụ 3:40-51) E gbughị Fero, bụ́ n’onwe ya, nwa e buru ụzọ mụọ. O nwere ezinụlọ nke ya. Ọ bụghị onyeisi ezinụlọ kama ọ bụ nwa nwoke e bu ụzọ mụọ n’ezinụlọ nwụrụ n’ihi ihe otiti nke iri ahụ.

 12:40Ogologo oge ha aṅaa ka ndị Izrel biri n’ala Ijipt? Afọ 430 a kpọtụrụ aha ebe a gụnyere oge ụmụ Izrel biri “n’ala Ijipt na n’ala Kenan.” (Reference Bible, ihe odide ala ala peeji) Ebreham bụ́ onye dị afọ 75 gafere Osimiri Yufretis na 1943 T.O.A. mgbe ọ na-aga Kenan. (Jenesis 12:4) Site mgbe ahụ ruo oge Jekọb bụ́ onye dị afọ 130 bara n’Ijipt bụ afọ 215. (Jenesis 21:5; 25:26; 47:9) Nke a pụtara na ndị Izrel biri ihe ha ka afọ 215 n’Ijipt mgbe nke a gasịrị.

15:8Mmiri nke Osimiri Uhie ahụ “rahụrụ arahụ” hà kpụkọrọ akpụkọ n’ezie? Ngwaa Hibru a sụgharịrị ịbụ “rahụrụ arahụ” pụtara ịtalata ma ọ bụ isi ike. Na Job 10:10, e ji okwu ahụ mee ihe n’ihe banyere mmiri ara ehi ịrahụ arahụ. N’ihi ya, mmiri rahụrụ arahụ adịchaghị enye echiche nke mmiri ịkpụkọ akpụkọ, dị ka ice. Ọ bụrụ na “ifufe Ihu anyanwụ dị ike” e kwuru okwu ya n’Ọpụpụ 14:21 jụruru oyi nke ịkpụkọ mmiri ahụ, obi abụọ adịghị ya na a gaara ekwu banyere ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi ya gabigara ókè. Ebe ọ bụ na ọ dịghị ihe a na-ahụ anya gbochiri mmiri ahụ ịbịaghachi, o yiri ihe rahụrụ arahụ ma ọ bụ nke siri ike.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

7:14–12:30. Ihe Otiti Iri ahụ abụghị nnọọ ihe mere ná ndapụta. E kwuru na ha ga-eme tupu ha emee, ha mekwara dị ka e kwuru. Lee nnọọ otú imezu ha si gosi ikike Onye Okike nwere ịchịkwa mmiri, ìhè anyanwụ, ahụhụ, ụmụ anụmanụ na ụmụ mmadụ! Ihe otiti ndị ahụ gosikwara na Chineke pụrụ iwetara nanị ndị iro ya ọdachi ebe ọ na-echebe ndị na-efe ya ofufe.

11:2; 12:36. Jehova na-agọzi ndị ya. O doro anya na ihe o mere bụ ịhụzi na a kwụrụ ndị Izrel ụgwọ maka ọrụ ha rụrụ n’Ijipt. Ha banyere n’ala ahụ dị ka ndị nweere onwe ha, ọ bụghị dị ka ndị a dọọrọ n’agha ịbụ ndị ohu.

14:30. Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-anapụta ndị na-efe ya ofufe ‘n’oké mkpagbu’ ahụ na-abịanụ.—Matiu 24:20-22; Mkpughe 7:9, 14.

JEHOVA EGUZOBE MBA Ọ NA-ACHỊ

(Ọpụpụ 15:22–40:38)

N’ọnwa nke atọ mgbe a napụtasịrị ha site n’Ijipt, ndị Izrel amaa ụlọikwuu ha n’ala ala Ugwu Saịnaị. N’ebe ahụ, ha anata Iwu Iri ahụ na iwu ndị ọzọ, soro Jehova gbaa ọgbụgba ndụ ma ghọọ mba ọ na-achị. Mozis anọọ ụbọchị 40 n’ugwu ahụ, na-anata ntụziaka banyere ezi ofufe na owuwu nke ụlọikwuu Jehova, bụ́ ụlọ nsọ a pụrụ ibugharị ebugharị. Ka ọ dịgodị, ụmụ Izrel akpụọ nwa ehi ọlaedo ma na-efe ya ofufe. Ka o si n’ugwu ahụ na-agbadata, Mozis ahụ nke a, iwe ewee ya nke ukwuu nke na o tiwara mbadamba nkume abụọ ahụ nke Chineke nyere ya. Mgbe e nyesịrị ndị mmehie ahụ ntaramahụhụ kwesịịrị ha, ya arịgoo ugwu ahụ ma nata mbadamba nkume ndị ọzọ. Mgbe Mozis lọghachiri, a malite owuwu nke ụlọikwuu ahụ. Ná ngwụsị afọ mbụ nke nnwere onwe Izrel, a rụchaa  ụlọikwuu a magburu onwe ya na ihe ndị dị n’ime ya. Jehova emezie ka ebube ya jupụta ụlọikwuu ahụ.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

20:5Olee otú o si bụrụ na Jehova na-ewere “ajọ omume nke ndị bụ́ nna” leta ọgbọ ndị dị n’ihu? Mgbe mmadụ ọ bụla toruru ogo ibu ibu ọrụ, a na-ekpe ya ikpe dabere n’omume na àgwà ya. Ma mgbe mba Izrel fere arụsị, ọtụtụ ọgbọ tara ahụhụ nke a mgbe nke ahụ gasịrị. Ọbụna o metụtara ndị Izrel kwesịrị ntụkwasị obi n’ihi na omume nnupụisi n’ụzọ okpukpe nke mba ahụ mere ka o siere ha ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe.

23:19; 34:26—Gịnị ka iwu e nyere ka a ghara isi nwa ewu ná mmiri ara nne ya pụtara? A kọrọ na isi nwa anụ (nwa ewu ma ọ bụ nwa anụ ọzọ) ná mmiri ara nne ya bụ ememe ndị ọgọ mmụọ nke e chere na ọ na-eweta mmiri ozuzo. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na nne anụ na-eji mmiri ara azụ nwa ọhụrụ ya, isi nwa ya ná mmiri ara ya ga-abụ omume obi ọjọọ. Iwu a nyere aka igosi ndị Chineke na ha kwesịrị ịdị na-enwe ọmịiko.

23:20-23Ònye bụ mmụọ ozi ahụ a kpọtụrụ aha n’ebe a, oleekwa otú o si bụrụ na aha Jehova dị “n’ime ya”? Ma eleghị anya, mmụọ ozi a bụ Jizọs tupu ya aghọọ mmadụ. E jiri ya mee ihe iduzi ndị Izrel ka ha na-aga Ala Nkwa ahụ. (1 Ndị Kọrint 10:1-4) Aha Jehova dị “n’ime ya” n’ihi na Jizọs bụ onye bụ́ isi jiri aha Nna ya mee ihe ma mee ka ọ dị nsọ.

32:1-8, 25-35—Gịnị mere na e nyeghị Erọn ntaramahụhụ n’ihi ịkpụ nwa ehi ọlaedo ahụ? Erọn ejighị obi ya kwenyere ikpere arụsị ahụ. Mgbe e mesịrị, o doro anya na o sonyeere ndị Livaị ibe ya n’ịkwụnyere Chineke ma megide ndị guzogidere Mozis. Mgbe e gbusịrị ndị ikpe mara, Mozis chetaara ndị ahụ na ha emehiewo nke ukwuu, na-egosi na Jehova mekwaara ndị ọzọ ma e wezụga Erọn ebere.

33:11, 20—Olee otú Chineke si gwa Mozis okwu “ihu na ihu”? Okwu a na-egosi mkparịta ụka chiri anya nke dị n’etiti mmadụ abụọ. Mozis soro onye nnọchiteanya Chineke kwurịta okwu ma site n’ọnụ ya nata ntụziaka Jehova. Ma Mozis ahụghị Jehova anya, ebe ọ bụ na ‘mmadụ agaghị ahụ Chineke anya, dịkwa ndụ.’ N’ezie, Jehova agwaghị Mozis okwu n’onwe ya. ‘E sitere n’aka ndị mmụọ ozi nye iwu ahụ site n’aka onye ogbugbo,’ ka Ndị Galeshia 3:19 na-ekwu.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

15:25; 16:12. Jehova na-egbo mkpa nke ndị ya.

18:21. Ndị ikom a họọrọ maka ibu ọrụ ụfọdụ n’ọgbakọ Ndi Kraịst aghaghịkwa ịbụ ndị ruru eru, ndị na-atụ egwu Chineke, ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi, na ndị na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha nanị.

20:1–23:33. Jehova bụ onye kachasịnụ Na-enye Iwu. Mgbe ha rubere isi na ha, iwu ya nyeere ndị Izrel aka ife ya ofufe n’ụzọ a haziri ahazi na nke na-enye ọṅụ. Jehova nwere nzukọ ọ na-achị taa. Irubere ya isi na-ewetara anyị obi ụtọ na nchebe.

Ihe Ọ Pụtaara Anyị n’Ezie

Gịnị ka akwụkwọ Ọpụpụ na-ekpughe banyere Jehova? Ọ na-egosi ya dị ka Ogbo Mkpa na-ahụ n’anya, Onye Nnapụta na-enweghị atụ na Onye Mmezu nke nzube ya. Ọ bụ Chineke nke na-ahazi ndị ya n’okpuru ọchịchị ya.

Ka ị na-agụ ọgụgụ Bible dịịrị izu ná nkwadebe maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, obi abụọ adịghị ya na ihe ị mụtara site n’Ọpụpụ ga-akpali gị n’ụzọ miri emi. Mgbe ị na-atụle ihe ndị e kwuru n’akụkụ bụ́ “A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ,” ị ga-aghọtakwu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ. Ihe ndị e kwuru n’okpuru isiokwu nta ndị bụ́ “Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị” ga-egosi gị otú ị pụrụ isi rite uru n’ọgụgụ Bible nke izu ahụ.

[Foto dị na peeji nke 24, 25]

Jehova nyere nwoke ahụ dị umeala n’obi bụ́ Mozis ọrụ nke idupụta ndị Izrel n’ohu

[Foto dị na peeji nke 25]

Ihe Otiti Iri ahụ gosiri ikike nke Onye Okike nwere ịchịkwa mmiri, ìhè anyanwụ, ahụhụ, ụmụ anụmanụ, na ụmụ mmadụ

[Foto dị na peeji nke 26, 27]

Site n’aka Mozis, Jehova haziri ndị Izrel ịbụ mba ọ na-achị