Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Anyị Si Egosipụta Ịhụnanya Anyị Nwere n’Ebe Chineke Nọ

Otú Anyị Si Egosipụta Ịhụnanya Anyị Nwere n’Ebe Chineke Nọ

 Otú Anyị Si Egosipụta Ịhụnanya Anyị Nwere n’Ebe Chineke Nọ

ỊZỤLITE ịhụnanya n’ebe Chineke nọ ejedebeghị n’inwe ihe ọmụma banyere ya. Dị ka ndị ohu Chineke gburugburu ụwa pụrụ ịgba akaebe ya, ezi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ na-eto ka mmadụ na-amatakwu ụdị onye ọ bụ, ọ na-esiwanyekwa nnọọ ike ka onye ahụ na-amata ihe ndị ọ hụrụ n’anya, ihe ndị ọ kpọrọ asị, na ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị ọ na-achọ.

N’ịhụnanya, Jehova enyewo anyị Okwu ya, bụ́ Bible, bụ́ ebe o kpughere onwe ya. N’ime ya, anyị na-amụta otú Jehova si mee ihe n’ọnọdụ dịgasị iche iche. Dị nnọọ ka akwụkwọ ozi si n’aka onye anyị hụrụ n’anya si enye anyị obi ụtọ dị ukwuu, otú a ka Bible si enye anyị ọṅụ ka anyị na-ahụ ka a na-ekpughe akụkụ ndị ọhụrụ nke ụdị onye Jehova bụ.

Otú ọ dị, dị ka anyị na-ahụta mgbe ụfọdụ n’ozi anyị na-eje maka ọha, inwe ihe ọmụma banyere Chineke adịghị eme mgbe nile ka onye ahụ hụ ya n’anya. Jizọs gwara ụfọdụ ndị Juu nke oge ya bụ́ ndị na-enweghị ekele, sị: “Unu na-enyocha Akwụkwọ Nsọ, n’ihi na unu chere na site na ya unu ga-enwe ndụ ebighị ebi; . . . kama amaara m nke ọma na unu enweghị ịhụnanya Chineke n’ime unu.” (Jọn 5:39, 42) Ụfọdụ na-eji ọtụtụ afọ amụ banyere ọrụ ịhụnanya ndị Jehova rụrụ ma ka nwee ịhụnanya dị nta n’ebe ọ nọ. N’ihi gịnị? Ha anaghị atụgharị uche n’ihe ihe ndị ha na-amụ pụtara. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọtụtụ nde ndị nwere ezi obi anyị na-amụrụ Bible na-achọpụta na ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ na-anọgide na-eto. N’ihi gịnị? N’ihi na ha na-agbaso ihe nlereanya Esaf, dị ka anyị onwe anyị gbasoworo. N’ụzọ dị aṅaa?

Jiri Ekele Na-atụgharị Uche

Esaf kpebiri n’obi ya ịzụlite ịhụnanya n’ebe Jehova nọ. O dere, sị: “M ga-eso obi m  tụgharịa uche; . . . M ga-ehota omume nile nke Jaa; n’ihi na m ga-echeta oké ọrụ Gị nile site na mgbe ochie. M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.” (Abụ Ọma 77:6, 11, 12) Ịhụnanya n’ebe Chineke nọ ga-eto n’obi onye na-atụgharị uche n’ụzọ Jehova dị ka ọbụ abụ ahụ mere.

Tụkwasị na nke ahụ, ichetaghachi ahụmahụ ndị anyị nweworo ka anyị na-ejere Jehova ozi na-eme ka mmekọrịta anyị na ya siwanye ike. Pọl onyeozi kwuru na anyị bụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” ọbụbụenyi nke pụkwara itolite n’etiti ndị na-arụkọ ọrụ na-apụ nnọọ iche. (1 Ndị Kọrint 3:9) Mgbe anyị na-egosi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ, ọ na-enwe ekele maka ya, nke a na-emekwa ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Mgbe ahụ, mgbe anyị rịọrọ enyemaka Jehova, ya eduziekwa anyị n’oge nsogbu, anyị na-ama na ọ nọnyeere anyị, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ na-esiwanyekwa ike.

Ọbụbụenyi dị n’etiti mmadụ abụọ na-eto ka ha na-agwa ibe ha mmetụta ha. N’otu aka ahụ, mgbe anyị gwara Jehova ihe mere anyị ji rara onwe anyị nye ya, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ na-esiwanye ike. Anyị ga-ahụta onwe anyị ka anyị na-atụgharị uche n’okwu Jizọs, bụ́: “Ị ghaghịkwa iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:30) Gịnị ka anyị pụrụ ime iji hụ na anyị na-anọgide na-eji obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, uche anyị dum na ike anyị dum na-ahụ Jehova n’anya?

Iji Obi Anyị Dum Hụ Jehova n’Anya

Akwụkwọ Nsọ na-ekwu maka obi ihe atụ, nke bụ́ mmadụ ime—ọchịchọ, àgwà, na mmetụta anyị. Ya mere, iji obi anyị dum hụ Jehova n’anya pụtara na karịa ihe ọ bụla ọzọ, anyị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. (Abụ Ọma 86:11) Anyị na-egosi na anyị nwere ịhụnanya dị otú ahụ site n’ime ka àgwà anyị bụrụ nke ọ na-anabata. Anyị na-agbalị iṅomi Chineke site ‘n’ịkpọ ihe ọjọọ asị ma na-arapara n’ezi ihe.’—Ndị Rom 12:9.

Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-emetụta echiche anyị n’ihe nile. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịchọpụta na ọrụ anyị na-akpali mmasị ma ọ bụ bụrụ nke anyị na-etinyekarị uche na ya, ma ọ̀ bụ ebe a ka obi anyị dị? Ee e. Ebe ọ bụ na anyị ji obi anyị dum hụ Jehova n’anya, ihe mbụ anyị bụ, bụ ndị ozi Chineke. N’otu aka ahụ, anyị chọrọ ime ihe na-atọ ndị mụrụ anyị, onye òtù ọlụlụ anyị, na onye anyị na-arụrụ ọrụ ụtọ, ma anyị na-egosi na anyị ji obi anyị dum hụ Jehova n’anya site n’anyị ịchọ ime ihe na-atọ ya ụtọ karịa ihe ọ bụla ọzọ. E kwuwerị, o kwesịrị inwe ọnọdụ mbụ n’obi anyị.—Matiu 6:24; 10:37.

 Iji Mkpụrụ Obi Anyị Dum Hụ Jehova n’Anya

N’Akwụkwọ Nsọ, okwu ahụ bụ́ “mkpụrụ obi” na-ezo aka n’ụzọ bụ́ isi n’onwe anyị dum, nakwa ndụ anyị dị. Ya mere, iji mkpụrụ obi anyị dum hụ Jehova n’anya pụtara na anyị ga-eji ndụ anyị na-enye ya otuto, jirikwa ya na-egosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ.

N’ezie, anyị pụrụ inwe ihe ndị ọzọ na-amasị anyị ná ndụ, dị ka ịmụ ọrụ, ịzụ ahịa, ma ọ bụ ịzụlite ezinụlọ. Ma n’otu oge ahụ, anyị na-egosi na anyị ji mkpụrụ obi anyị dum hụ Jehova n’anya site n’ime ihe n’ụzọ nke ya na site n’itinye ihe ndị ọzọ n’ọnọdụ kwesịịrị ha ná ndụ anyị, si otú a “buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya.” (Matiu 6:33) Ofufe si ná mkpụrụ obi dum pụtakwara ịdị na-anụ ọkụ n’obi. Anyị na-egosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-agbasa ozi ọma Alaeze ahụ, n’ịza ajụjụ ndị na-ewuli elu ná nzukọ, ma ọ bụ inyere ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst aka. N’ihe nile, anyị na-anọgide ‘na-eji mkpụrụ obi dum na-eme uche Chineke.’—Ndị Efesọs 6:6.

Jizọs gosiri na o ji mkpụrụ obi dum hụ Chineke n’anya site n’ịjụ onwe ya. O butere ime uche Chineke ụzọ tupu mkpa nke onwe ya. Jizọs gwara anyị ka anyị soro ihe nlereanya ya. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Matiu 16:24, 25) Ịjụ onwe anyị pụtara ime nraranye. Ọ pụtara na anyị hụrụ Chineke n’anya nke ukwuu nke na anyị nyefere ya onwe anyị, dị ka mgbe onye Izrel n’oge Bible nyefere onye nwe ya onwe ya ịbụ ohu ya ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ịhụnanya dị ukwuu o nwere n’ebe onye nwe ya nọ. (Deuterọnọmi 15:16, 17) Ịrara ndụ anyị nye Jehova bụ ihe àmà doro anya na anyị hụrụ ya n’anya.

Iji Uche Anyị Dum Hụ Jehova n’Anya

Iji uche anyị dum hụ Jehova n’anya pụtara na anyị na-etinye mgbalị nile dị mkpa ịghọta ụdị onye Jehova bụ, nzube ya, na ihe ndị ọ na-achọ. (Jọn 17:3; Ọrụ 17:11) Anyị na-egosipụta na anyị hụrụ Jehova n’anya site n’iji ikike uche anyị dum na-enyere ndị ọzọ aka ịbịakwa hụ Jehova n’anya site n’imeziwanye nkà izi ihe anyị. “Meenụ ka obi unu sie ike maka ịrụ ọrụ,” ka Pita onyeozi gbara ume ya. (1 Pita 1:13) N’otu aka ahụ, anyị na-agbalị igosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, karịsịa, ndị ohu Chineke ibe anyị. Anyị na-ama otú ọnọdụ ha dị, wee mara mgbe o kwesịrị ekwesị ịja ha mma ma ọ bụ mgbe ọ dị mkpa ịkasi ha obi.

Anyị na-egosi na anyị ji uche anyị dum hụ Jehova n’anya site n’ido onwe anyị n’okpuru ya n’uche anyị. Anyị na-agbalị ile ihe anya otú o si ele ha, na-amara ya mgbe anyị na-eme mkpebi ma nwee ntụkwasị obi na ụzọ ya bụ nke kasị mma. (Ilu 3:5, 6; Aịsaịa 55:9; Ndị Filipaị 2:3-7) Ma ka anyị na-anọgide na-egosi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ, olee otú anyị pụrụ isi jiri ike anyị na-eme otú ahụ?

Iji Ike Anyị Dum Hụ Jehova n’Anya

Ọtụtụ ndị ntorobịa n’ọgbakọ Ndị Kraịst ji ike ha na-eto Jehova. (Ilu 20:29; Eklisiastis 12:1) Otu ụzọ ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto si egosi na ha ji ike ha dum hụ Jehova n’anya bụ site n’ikere òkè n’ọrụ ọsụ ụzọ, bụ́ ozi oge nile. Ọtụtụ ndị nne na-ekere òkè n’ozi a mgbe ụmụ ha nọ n’ụlọ akwụkwọ. Ndị okenye na-ekwesị ntụkwasị obi ndị na-eme nleta ọzụzụ atụrụ, tụkwasị n’ịhụ maka ọdịmma ezinụlọ nke ha, na-egosi na ha ji ike ha dum hụ Jehova n’anya. (2 Ndị Kọrint 12:15) Jehova na-enye ndị nwere olileanya n’ebe ọ nọ ike, ka ha wee nwee ike igosipụta ịhụnanya ha site n’ito ya, na-eji ike ọ bụla ha nwere na-eme nke a.—Aịsaịa 40:29; Ndị Hibru 6:11, 12.

Ịhụnanya ga-eto ma ọ bụrụ na a zụlite ya nke ọma. Ya mere, anyị na-anọgide na-ewepụta oge ịtụgharị uche. Anyị na-echeta ihe Jehova mewooro anyị na ihe mere o ji ruo eruo anyị ịrara onwe anyị nye ya. Dị ka ụmụ Adam na-ezughị okè, anyị apụghị iru eru inweta “ihe Chineke kwadebewooro ndị hụrụ ya n’anya,” ma anyị pụrụ igosi na anyị ji onwe anyị dum hụ Jehova n’anya. Ka anyị nọgide na-eme otú ahụ!—1 Ndị Kọrint 2:9.

[Foto dị na peeji nke 20]

Anyị na-egosi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ site n’omume