Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inweta Obiọma Sitere n’Ịhụnanya na Nlekọta Jehova

Inweta Obiọma Sitere n’Ịhụnanya na Nlekọta Jehova

Akụkọ Ndụ

Inweta Obiọma Sitere n’Ịhụnanya na Nlekọta Jehova

DỊ KA FAY KING SI KỌỌ

Nne m na nna m bụ ndị nwere obiọma, ma dị ka ọtụtụ ndị ọzọ, o nweghị ihe ha ji okpukpe kpọrọ. Nne m na-ekwukarị, sị: “A ghaghị inwe Chineke, ma ọ́ bụghị ya, ònye kere okooko osisi nile, ònye mekwara osisi nile?” Ma ebe ahụ ka okwu biri.

NNA m nwụrụ na 1939 mgbe m dị afọ 11, ebinyekwaara m nne m na Stockport, bụ́ ebe dịdebere nnọọ ebe ndịda Manchester, England. Anọwo m na-enwe mmasị ịmatakwu banyere Onye Okike m, na-akwanyekwara Bible ùgwù, ọ bụ ezie na amaghị m ihe ọ bụla banyere ya. Ya mere, ekpebiri m ịga Chọọchị England ịchọpụta ma ọ ga-enyere m aka.

Okwuchukwu a na-ekwu enweghị mmetụta buru ibu n’ebe m nọ, ma mgbe a gụrụ Oziọma ndị ahụ, n’ụzọ ụfọdụ, okwu Jizọs mere ka m kwere na Bible aghaghị ịbụ eziokwu. N’ileghachi anya azụ, ọ na-eju m anya na agụghị m Bible n’onwe m. Ọbụna ka e mesịrị, mgbe otu enyi ezinụlọ anyị nyere m “Agba Ọhụrụ” e jiri asụsụ oge a sụgharịa, ọ dịghị mgbe m nọturu ala gụọ ya.

Mmalite nke Agha Korea na 1950 mere n’ezie ka m chee echiche. Esemokwu ahụ ọ̀ ga-agbasa dị ka Agha Ụwa nke Abụọ gbasara? Ọ bụrụ na ọ gbasaa, olee otú m pụrụ isi rube isi n’iwu Jizọs nke ịhụ ndị iro m n’anya? Ma, àpụrụ m ịnọ nnọọ na-ele n’anya ka ndị mmadụ na-awakpo obodo m ma ghara ime ihe ọ bụla iji kwụsị ha? Ọ bụrụ na mụ emee nke ahụ, ọ ga-abụ nnọọ ịgbara ibu ọrụ m ọsọ. N’agbanyeghị na enwere m mgbagwoju anya, anọgidere m na-ekwenyesi ike na Bible nwere azịza nye ajụjụ m nile, ọ bụ ezie na amaghị m otú m ga-esi chọta ma ọ bụ ebe m ga-achọta ha.

Ịchọ Eziokwu ahụ n’Australia

Na 1954, mụ na mama m kpebiri ịkwaga Australia bụ́ ebe nwanne m nwanyị bụ́ Jean bi. Ka afọ ole na ole gasịrị, Jean gwara m na ya sịrị Ndịàmà Jehova bịa na nke m n’ihi na ọ maara na m nwere mmasị na Bible ma na-aga chọọchị. Ọ chọrọ ịmata ihe m chere banyere ha. “Amaghị m ma nkọwa ha na-enye ò ziri ezi ka ọ bụ na o zighị ezi,” ka ọ gbanyeere m n’izu, “ma, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ha nwere nkọwa nke karịrị nke chọọchị dị iche iche nwere.”

Bill na Linda Schneider, bụ́ di na nwunye bịara na nke m, bụ ndị nwere omume enyi. Ha nọ ná ngwụcha afọ ndị 60 ha, ha abụwokwa Ndịàmà ruo ọtụtụ afọ. Ha rụburu ọrụ n’ụlọ ọrụ redio Ndịàmà Jehova dị na Adelaide, mgbe a machibidokwara ọrụ nkwusa ahụ iwu n’Australia n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, ha denyere aha ha dị ka ndị na-ezisa ozi ọma oge nile. Otú ọ dị, n’agbanyeghị enyemaka Bill na Linda nyere m, anọgidere m na-enyocha okpukpe dị iche iche.

Otu onye ọrụ ibe m kpọọrọ m gaa nzukọ onye okwuchukwu bụ́ Billy Graham, mgbe e mesịrị, ụfọdụ n’ime anyị zutere otu ụkọchukwu sịrị anyị jụwa ya ajụjụ. Ajụrụ m otu ajụjụ ka nọ na-enye m nsogbu n’obi: “Olee otú ị pụrụ isi bụrụ Onye Kraịst ma hụ ndị iro gị n’anya mgbe ị na-aga egbu ha n’agha?” Ndị nile nọ n’ìgwè ahụ malitere ozugbo ịtụ ụzụ—o doro anya na ajụjụ ahụ na-enye ha nile nsogbu n’obi! N’ikpeazụ, ụkọchukwu ahụ kwụrụ, sị: “Amaghị m azịza nke ahụ. M ka na-eche banyere ya.”

Ka ọ dịgodị, ọmụmụ Bible mụ na Bill na Linda nọ na-aga n’ihu, e mekwara m baptizim na September 1958. Ekpebiri m ịgbaso ihe nlereanya nke ndị kụziiri m ihe, nke a mere na n’August nke afọ sochiri, edenyere m aha m dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile, onye na-ezisa ozi ọma oge nile. Ọnwa asatọ ka nke ahụ gasịrị, a kpọrọ m òkù isonye ná ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụụrụ m ịnụ na nwanne m nwanyị bụ́ Jean enwewo ọganihu n’ọmụmụ ihe ya, na e mewokwa ya baptizim!

E Mepee Ọnụ Ụzọ Ije Ozi

Ana m eje ozi n’otu n’ime ọgbakọ dị na Sydney, na-eduzikwa ọtụtụ ọmụmụ Bible ebe obibi. Otu ụbọchị, ezutere m otu onye ụkọchukwu Chọọchị England laworo ezumike nká ma jụọ ya ihe chọọchị ahụ na-akụzi banyere ọgwụgwụ ụwa. Ọ bụ ezie na ọ gwara m na ya akụziela nkwenkwe chọọchị ruo afọ 50, ihe ọ zara juru m anya: “Aghaghị m iwepụta oge iji mee nnyocha maka nke ahụ n’ihi na amarughị m Bible otú Ndịàmà Jehova maruru.”

Oge na-adịghị anya ka nke a gasịrị, a kpọrọ òkù maka ndị ozi afọ ofufo ga-eje ozi na Pakistan. Etinyere m akwụkwọ, n’aghọtaghị na a naghị ezije ụmụ nwanyị na-alụbeghị di, na ọ bụ nanị ndị nwoke na-alụbeghị nwanyị ma ọ bụ ndị di na nwunye ka a na-ezije. O yiri ka e zijere akwụkwọ ndejupụta m n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Brooklyn n’ihi na n’oge na-adịghị anya, anatara m akwụkwọ ozi gwara m na e nwere ohere na Bombay (ebe a na-akpọ Mumbai ugbu a), dị n’India, na-ajụ ma m ga-anakwere ya. Nke ahụ bụ na 1962. Emere m otú ahụ ma nọọ na Bombay ọnwa 18 tupu m kwaga Allahabad.

N’oge na-adịghị anya, etinyere m onwe m n’ịmụ asụsụ Hindi. A na-edekarị asụsụ India a otú e si akpọpụta ya, n’ihi ya, o sibigaghị ike ókè ịmụta. Otú ọ dị, ọ na-abụkarị ihe nkụda mmụọ mgbe ndị nwe ụlọ sịrị m sụwara ha Bekee kama ịgbalị ịsụ asụsụ ha! Ma mba ọhụrụ a nwere ọtụtụ ihe ịma aka na-akpali akpali ma na-adọrọ mmasị, mkpakọrịta nke mụ na Ndịàmà ibe m si Australia tọkwara m ụtọ.

Mgbe m ka na-etolite etolite, echere m echiche banyere alụmdi na nwunye, ma ka ọ na-erule mgbe e mere m baptizim, anọ m na-arụsi ọrụ ike n’ijere Jehova ozi nke na echekwaghị m echiche banyere ya. Otú ọ dị, ugbu a, amalitewekwala m inwe mmetụta na ọ dị m mkpa inwe onye ibe ná ndụ. N’ezie, achọghị m ịhapụ ozi ala ọzọ m, ya mere, ekpere m ekpere banyere ya nye Jehova ma wepụ ya n’uche m.

Ngọzi A Na-atụghị Anya Ya

Edwin Skinner bụ onye na-elekọta ọrụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’India n’oge ahụ. Ọ gara klas nke asatọ nke Watchtower Bible School of Gilead na 1946 ya na ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, tinyere Harold King na Stanley Jones, ndị e zigara China. * Na 1958, e tinyere Harold na Stanley n’ọnụ ụlọ mkpọrọ nanị otu onye na-anọ n’ihi ọrụ nkwusa ha na Shanghai. Mgbe a tọhapụrụ Harold na 1963, Edwin degaara ya akwụkwọ ozi. Harold zaghachiri mgbe ọ lọghachitere Hong Kong ka o mesịrị njem gaa United States na Britain ma kwute na ya nwere ọchịchọ ịlụ nwunye. Ọ gwara Edwin na ya tinyere nke a n’ekpere mgbe ya nọ n’ụlọ mkpọrọ ma jụọ Edwin ma ò nwere Onyeàmà ọ maara ga-abụ nwunye kwesịrị ekwesị.

N’India, ihe ka ọtụtụ n’ime alụmdi na nwunye bụ nke ndị ọzọ na-ahụtakarịrị ndị ọzọ di ma ọ bụ nwunye, a na-agwakarịkwa Edwin ka o mee ndokwa dị otú ahụ, ma ọ naghị achọkarị ime ya. N’ihi ya, o nyere Ruth McKay, onye di ya bụ́ Homer bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, akwụkwọ ozi Harold. N’ikpeazụ, Ruth deere m akwụkwọ ozi ịgwa m na otu onye ozi oge nile nọworo n’eziokwu ruo ọtụtụ afọ na-achọ nwunye, ọ jụkwara ma m nwere mmasị idegara ya akwụkwọ ozi. Ọ gwaghị m onye nwanna nwoke ahụ bụ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ banyere ya.

Ọ dịghị onye ọzọ maara banyere ekpere m kpere maka onye ibe, ma e wezụgakwa Jehova, mmeghachi omume mbụ m bụ ịjụ echiche ahụ. Ma ka m na-echekwu banyere ya, otú ahụ ka m na-erukwu ná nkwubi okwu bụ́ na Jehova anaghị azakebe ekpere anyị n’ụzọ anyị pụrụ iche na ọ ga-esi zaa ya. Ya mere, edeghachiiri m Ruth akwụkwọ ozi ma gwa ya na ọ bụrụhaala na iwu ejighị m ịlụ ya, ọ pụrụ ịgwa nwanna nwoke ahụ ka o dee akwụkwọ ozi ọzọ. Akwụkwọ ozi nke abụọ sitere n’aka Harold King bụ mụ ka o detaara ya.

Foto Harold na akụkọ ya pụtara n’akwụkwọ akụkọ na magazin dịgasị iche iche mgbe a tọhapụsịrị ya n’ụlọ mkpọrọ na China. Ka ọ na-erule n’oge a, a maara ya nke ọma n’ụwa nile, ma, ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi ya n’ozi ọchịchị Chineke masịrị m. Ya mere, anyị derịtara akwụkwọ ozi ruo ọnwa ise, mgbe ahụkwa, agara m Hong Kong. Anyị lụrụ n’October 5, 1965.

Anyị abụọ chọrọ ịbanye n’alụmdi na nwunye na ịnọgide n’ozi oge nile, ebe ọ bụkwa na anyị na-emewanye okenye, anyị nwere mkpa nke mkpakọrịta karịa ihe ọ bụla ọzọ. Abịara m hụ Harold n’anya mgbe m chọpụtara obiọma na nchebara echiche o ji emeso ndị mmadụ na otú o si egosipụta àgwà ndị a n’ime ihe banyere nsogbu ndị na-adapụta n’ihe ndị metụtara ozi anyị, àgwà ya mere ka m malite ịkwanyere ya ùgwù nke ukwuu. Ruo afọ 27, anyị nwere nnọọ alụmdi na nwunye obi ụtọ ma nweta ọtụtụ ngọzi n’aka Jehova.

Ndị China bụ ndị na-arụsi ọrụ ike, ahụkwara m ha n’anya nke ukwuu. Na Hong Kong, asụsụ a na-asụ bụ Cantonese, bụ́ otu olu mba China nwere ọtụtụ mgbanwe ụda olu karịa asụsụ Mandarin, n’ihi ya kwa, o siri ike mmụta. Mụ na Harold malitere ije ozi n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị n’alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova, mgbe ahụkwa anyị jere ozi n’ebe e kenyere anyị ọrụ n’ọtụtụ ebe dịgasị iche iche n’ókèala ahụ. Ee, anyị nwere nnọọ obi ụtọ, ma na 1976, echere m oké nsogbu ahụ́ ike ihu.

Ịnagide Nsogbu Ahụ́ Ike

Anọwo m na-enwe oruru ọbara ruo ọnwa ole na ole, ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara m agbadawokwa nke ukwuu. Ọ dị mkpa na a ga-awa m ahụ́, ma ndị dọkịta nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ gwara m na ha apụghị ime ya n’ejighị ọbara n’ihi na ọ bụrụ na ha emee ya, eleghị anya, m ga-anwụ n’ihi ụkọ ọbara ime ka ahụ́ m kwụsị ịrụ ọrụ. Otu ụbọchị mgbe ndị dọkịta ahụ na-ekwu banyere ọnọdụ m, ndị nọọsụ gbalịrị ime ka m gbanwee obi m, na-ekwu na o nweghị ihe mere m ga-eji tụfuo ndụ m. E mere ndokwa ịwa mmadụ 12 ahụ́ n’ụbọchị ahụ, 10 n’ime ha bụ iji sikwopụ afọ ime, ma achọpụtara m na ọ dịghị onye gwara ụmụ nwanyị ahụ dị ime okwu banyere iwepụ ndụ ụmụ ha.

N’ikpeazụ, Harold dere akwụkwọ ozi tọhapụrụ ụlọ ọgwụ ahụ n’ibu ọrụ ọ bụla ma ọ bụrụ na mụ anwụọ, ndị dọkịta kwetakwara ịwa m ahụ́ ahụ dị mkpa. A kpọjere m n’ụlọ ebe a na-awa ahụ́ ma kwadoo m maka inye m ọgwụ nkụnwụ ahụ́. Otú ọ dị, kpọmkwem n’oge a na-aga ime ya, onye na-enye ọgwụ nkụnwụ ahụ́ jụrụ ịga n’ihu, ụlọ ọgwụ ahụ aghaghịkwa ịsị m lawa.

Anyị jekwuziiri otu onye ọkachamara n’ọrịa ụmụ nwanyị nke na-arụrụ onwe ya ọrụ. Mgbe ọ ghọtara otú ọnọdụ m si sie ike, o kwetara iji ọnụ ego dị ala waa ahụ́ ahụ—ma ọ bụrụhaala na anyị agaghị agwa onye ọ bụla ego ole ọ nara anyị. Ọ wara ahụ́ ahụ n’ụzọ gara nke ọma—n’ejighịkwa ọbara ọ bụla. Obiọma sitere n’ịhụnanya na nlekọta Jehova pụtara nnọọ ìhè n’oge a nye mụ na Harold.

Na 1992, Harold malitere ịrịa ọrịa ga-egbu ya. Anyị kwagara n’alaka ụlọ ọrụ, e jikwa ịhụnanya lekọta anyị abụọ. Ezigbo di m jesịrị ozi elu ala ya na 1993 mgbe ọ dị afọ 81.

Ịlaghachi England

Enwere m obi ụtọ ịbụ onye òtù ezinụlọ Betel Hong Kong, ma ọ na esiwanyere m ike ịnagide okpomọkụ na ihu igwe ebe ahụ dị udè. Anataziri m akwụkwọ ozi tụrụ m n’anya site n’isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn, na-ajụ ma m ga-achọ ịgafe n’alaka nwere ngwá ọrụ karịa n’ihi ahụ́ ike m. Ya mere, n’afọ 2000, alaghachiri m England ma sonyere ezinụlọ Betel dị na London. Lee nnọọ ndokwa ịhụnanya nke a bụworo! E ji ikpo ọkụ nabata m, ana m enwetakwa ọṅụ dị ukwuu n’ọrụ dị iche iche a na-ekenye m, nke gụnyere inye aka ilekọta ọ́bá akwụkwọ ezinụlọ Betel na akwụkwọ 2,000 dị na ya.

Anọkwa m n’ọgbakọ na-asụ asụsụ Chinese nke na-ezukọ na London, ma n’ebe a, ihe agbanwewo. N’ụbọchị ndị a, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-esi Hong Kong abịa, ma, kama nke ahụ, a na-enwe ndị si n’akụkụ China ndị na-adịdebeghị mmiri. Ha na-asụ asụsụ Mandarin, nke ahụ na-ewetakwa ihe ịma aka ọhụrụ n’ọrụ nkwusa ahụ. A na-enweta akụkọ site n’ọtụtụ akụkụ nke mba a banyere ọtụtụ ọmụmụ Bible na-atọ ụtọ a na-eduziri ụmụ akwụkwọ si China bụ́ ndị gụsịworo mahadum ma na-agụkwu akwụkwọ iji nweta akara ugo mmụta ndị ka elu. Ha bụ ndị na-arụsi ọrụ ike ma na-enwe ekele maka eziokwu Bible ha na-amụta. Ọ bụ ihe ọṅụ inyere ha aka.

N’ịdị jụụ nke ebe obibi ọhụrụ m, ana m atụgharịkarị uche ná ndụ obi ụtọ m, obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova nọgidekwara na-atụ m n’anya. Ọ na-emetụta nnọọ ihe nile metụtara nzube ya, nlekọta ọ na-enye ndị ohu ya n’otu n’otu pụtakwara nnọọ ìhè. Enwere m ọtụtụ ihe mere m ga-eji nwee ekele maka nlekọta ịhụnanya ya nile ọ na-enye m.—1 Pita 5:6, 7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 Akụkọ ndụ ndị ozi ala ọzọ abụọ a pụtara n’Ụlọ Nche (Bekee), July 15, 1963, peeji nke 437-442, na n’Ụlọ Nche nke April 1, 1967, peeji nke 113-123.

[Foto dị na peeji nke 24]

Ije ozi n’India

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Harold King na 1963 na mgbe ọ na-eje ozi na China n’afọ ndị 1950

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ụbọchị agbamakwụkwọ anyị na Hong Kong, October 5, 1965

[Foto dị na peeji nke 26]

Anyị na ndị òtù Betel Hong Kong, Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Liang nọ n’etiti, Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Gannaway nọ n’aka nri