Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọnọdụ Ụwa A Na-agbanwe Agbanwe”

“Ọnọdụ Ụwa A Na-agbanwe Agbanwe”

 “Ọnọdụ Ụwa A Na-agbanwe Agbanwe”

“Nke a ka m na-ekwu, ụmụnna m, oge fọdụrụnụ dị ntakịrị.”—1 NDỊ KỌRINT 7:29.

1, 2. Mgbanwe ndị dị aṅaa ka ị hụworo n’oge ndụ gị?

OLEE mgbanwe ndị ị hụworo n’oge ndụ gị? Ị̀ pụrụ ịkọ ụfọdụ n’ime ha? Dị ka ihe atụ, e nwere ọganihu ndị e nweworo na sayensị ọgwụ na ahụ́ ike. N’ihi nnyocha a na-eme n’akụkụ a, nkezi afọ ndụ amụbawo n’ala ụfọdụ site n’ihe na-erughị afọ 50 ná mmalite narị afọ nke 20 ruo ihe karịrị nnọọ afọ 70 taa! Cheekwa banyere ụzọ ndị anyị siworo rite uru site n’iji redio, telivishọn, fon e ji agagharị agagharị, na ígwè ozi fax eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. E kwesịghịkwa ichefu ọganihu ndị e nweworo n’agụmakwụkwọ, usoro ime njem, na n’ihe ndị ruuru mmadụ, bụ́cha ihe ndị meworo ka ndụ ọtụtụ nde mmadụ ka mma.

2 N’ezie, ọ bụghị mgbanwe nile meworo ka ihe ka mma. A pụghị iwezụga n’akụkụ mmetụta na-emebi ihe nke ịrị elu nke ime mpụ, ndalata nke ụkpụrụ omume, mmụba nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ịrị elu nke ịgba alụkwaghịm, ịrị elu nke ọnụ ahịa, na mmụba nke iyi ọha egwu. Otú o sina dị, eleghị anya ị ga-ekwere ihe Pọl onyeozi dere ogologo oge gara aga, sị: “Ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.”—1 Ndị Kọrint 7:31.

3. Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o dere na “ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe”?

3 Mgbe Pọl kwuru okwu ahụ, o ji ọnọdụ ụwa na-atụnyere ebe ihe nkiri. Ndị na-eme ihe nkiri n’ebe ahụ—ndị a ma ama n’ọchịchị, n’okpukpe, na n’obodo—na-apụta, mee akụkụ nke ha, ma hapụziere ndị ọzọ ebe ihe nkiri ahụ. Nke a anọwo na-aga n’ihu ruo ọtụtụ narị afọ. N’oge gara aga, otu usoro ndị eze pụrụ ịchị ruo ọtụtụ iri afọ—ọbụna ruo ọtụtụ narị afọ—mgbanwe na-ewerekwa ọnọdụ nwayọọ nwayọọ. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị taa bụ́  mgbe ọnọdụ ụwa na-agbanwe n’otu ntabi anya mgbe e gburu otu onye ndú a ma ama! Ee, n’oge a na-agba aghara, anyị amaghị ihe echi ga-eweta.

4. (a) Echiche dị aṅaa ziri ezi ka Ndị Kraịst kwesịrị inwe banyere ihe ndị na-eme n’ụwa? (b) Ihe àmà abụọ dị aṅaa doro anya ka anyị ga-atụle ugbu a?

4 Ọ bụrụ na ụwa bụ ebe ihe nkiri, ndị ndú ya abụrụkwa ndị na-eme ihe nkiri, mgbe ahụ, Ndị Kraịst bụ ndị nkiri. * Otú ọ dị, ebe ha ‘na-abụghị akụkụ nke ụwa,’ ha adịghị echegbu onwe ha gabiga ókè banyere otú e si na-eme ihe nkiri ahụ ma ọ bụ ọbụna ndị ndị na-eme ya bụ. (Jọn 17:16) Kama nke ahụ, ha na-atụsi anya ike ịhụ ihe ndị na-egosi na ihe nkiri ahụ eruwela ná ngwụsị—ngwụsị na-akpata mbibi—n’ihi na ha maara na usoro ihe a aghaghị ịbịa ná njedebe tupu Jehova eweta ụwa ọhụrụ ezi omume nke a nọworo na-atụ anya ya eri oge. * Ya mere, ka anyị nyochaa ihe àmà abụọ ndị na-egosi na anyị bi na mgbe ọgwụgwụ nakwa na ụwa ọhụrụ dị nso. Ha bụ (1) usoro ngụkọ oge Bible na (2) ọnọdụ ụwa nke na-akawanye njọ.—Matiu 24:21; 2 Pita 3:13.

A Kọwaa Otu Ihe Omimi n’Ikpeazụ!

5. Gịnị bụ “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ,” n’ihi gịnịkwa ka ha ji adọrọ mmasị anyị?

5 Ọgụgụ oge bụ ịtụle njikọ dị n’etiti oge na ihe omume dị iche iche. Jizọs kwuru okwu banyere oge mgbe ndị ndú ụwa ga na-akpa ike n’enweghị ntinye aka nke Alaeze Chineke. Jizọs kpọrọ oge ahụ “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ.” (Luk 21:24) N’ọgwụgwụ nke ‘oge ndị ahụ a kara aka,’ Alaeze eluigwe nke Chineke ga-amalite ịchị, na-enwe Jizọs dị ka Onye Ọchịchị o ruuru ịchị ụwa. Ná mmalite, Jizọs ga-achị “n’etiti ndị iro [ya].” (Abụ Ọma 110:2) Mgbe e mesịrị, dị ka Daniel 2:44 na-ekwu, Alaeze ahụ ‘ga-etipịa ọchịchị nile nke mmadụ mee ka ha gwụsịa,’ ọ ga-eguzosikwa ike ruo mgbe ebighị ebi.

6. Olee mgbe “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” malitere, ogologo hà aṅaa ka ha were, oleekwa mgbe ha gwụrụ?

6 Olee mgbe “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” ga-agwụ, Alaeze Chineke amalitekwa ịchị? Azịza ya, bụ́ nke ‘a kachitere akara ruo mgbe ọgwụgwụ,’ metụtara ọgụgụ oge Bible. (Daniel 12:9) Ka “oge” ahụ na-eru nso, Jehova mere ihe iji kpughee azịza ya nye ìgwè ndị mmụta Bible dị umeala n’obi. Site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ha ghọtara na “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” malitere mgbe e bibiri Jeruselem na 607 T.O.A. nakwa na “oge” ndị ahụ dị afọ 2,520 n’ogologo. Site na nke a, ha ghọtara na 1914 kara akara ọgwụgwụ nke “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ.” Ha ghọtakwara na 1914 bụ mmalite nke ọgwụgwụ nke usoro ihe a. Dị ka onye mmụta Bible, ị̀ pụrụ ịkọwa site n’Akwụkwọ Nsọ otú e si gbakọta afọ ahụ bụ́ 1914? *

7. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa na-enyere anyị aka ịmata mmalite, ogologo, na ọgwụgwụ nke oge asaa ahụ a kpọtụrụ uche n’akwụkwọ Daniel?

7 E zochiri otu ihe na-atụpenye anyị azụ n’akwụkwọ Daniel. Ebe Jehova ji Eze Nebukadneza nke Babilọn bibie Jeruselem ná mmalite nke ‘oge ahụ a kara aka’ na 607 T.O.A., O sitere n’onye ọchịchị ahụ kpughee na mba dị iche iche ga-anọgide na-achị n’enweghị ntinye aka nke Chineke ruo oge asaa zuru ezu nke bụ́ ihe atụ. (Ezikiel 21:26, 27; Daniel 4:16, 23-25) Oge asaa ndị ahụ ha hà aṅaa n’ogologo? Dị ka Mkpughe 11:2, 3, na 12:6, 14 si kwuo, oge atọ na ọkara bụ ụbọchị 1,260. N’ihi ya, oge asaa aghaghị ịbụ okpukpu abụọ ya, ma ọ bụ ụbọchị 2,520. Ọ̀ bụ ebe ahụ ka ọ gwụrụ? Ee e, n’ihi na Jehova nyere onye ya na Daniel dịkọrọ ndụ, bụ́ Izikiel onye amụma ụkpụrụ a ga-eji agbakọ ihe atụ  ahụ: “Otu ụbọchị n’ọnọdụ otu afọ, ka M nyeworo gị.” (Ezikiel 4:6) N’ihi ya, oge asaa ahụ ga-adị nnọọ afọ 2,520 n’ogologo. N’iji 607 T.O.A. mere mmalite ya na afọ 2,520 dị ka ogologo oge ọ ga-ewe, anyị pụrụ ikwubi na oge ahụ a kara aka ga-agwụ na 1914.

A Nwapụta “Mgbe Ọgwụgwụ”

8. Ihe àmà dị aṅaa ka ị pụrụ ịkpọtụ uche nke na-egosi na ọnọdụ ụwa ajọwanyewo njọ kemgbe 1914?

8 Ihe ndị na-eme n’ụwa malite na 1914 gaa n’ihu na-akwado na nghọta e kwupụtara n’elu nke dabeere n’ọgụgụ oge Bible ziri ezi. Jizọs n’onwe ya kwuru na a ga-eji agha, ụnwụ nri, na ọrịa na-efe efe mata “ọgwụgwụ nke usoro ihe a.” (Matiu 24:3-8; Mkpughe 6:2-8) Nke ahụ abụwo n’ezie ihe na-eme kemgbe 1914. Pọl onyeozi nyekwuru ihe ọmụma banyere nke ahụ, na-ekwu na a ga-enwe nnọọ mgbanwe n’àgwà ndị mmadụ na-akpaso ibe ha. Nkọwa ya nke mgbanwe ndị anyị nile hụworo ziri nnọọ ezi.—2 Timoti 3:1-5.

9. Gịnị ka ndị na-ekiri ihe ndị na-emenụ nwere ikwu banyere ọnọdụ ụwa kemgbe 1914?

9 “Ọnọdụ ụwa a” ọ̀ gbanwewo n’ezie n’ụzọ dị nnọọ ukwuu kemgbe 1914? N’akwụkwọ bụ́ The Generation of 1914, Prọfesọ Robert Wohl na-ekwu, sị: “Ndị dị ndụ gabiga agha ahụ adịghị mgbe ha pụrụ iwepụ ya n’uche ha na otu ụwa gwụrụ, ọzọ amalitekwa n’August 1914.” N’ịkwado nke a, Dr. Jorge A. Costa e Silva, onye na-arụ ọrụ dị ka onye ntụzi nke Òtù Ahụ́ Ike Ụwa n’ihe banyere ọrịa uche, dere, sị: “Anyị bi n’oge na-agbanwe nnọọ ọsọ ọsọ, bụ́ nke na-akpata nchekasị na nrụgide n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ.” Nke ahụ ọ̀ bụ mmetụta ị na-enwe?

10. Olee otú Bible si eme ka anyị mata onye na-akpata ọnọdụ na-akawanye njọ nke ụwa kemgbe 1914?

10 Ònye bụ agamevu na-akpata ọnọdụ na-akawanye njọ nke ụwa? Mkpughe 12:7-9 na-ekpughe onye agamevu ahụ bụ: “Agha wee daa n’eluigwe: Maịkel [Jizọs Kraịst] na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ [Setan bụ́ Ekwensu] agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha ma dragọn ahụ emerighị, e nwekwaghị ọnọdụ maka ha n’eluigwe. Otú ahụ ka e si chụda dragọn ukwu ahụ, . . . onye na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.” Ya mere, ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-akpata nsogbu a na-enwe, nchụpụ ya n’eluigwe na 1914 apụtawo ‘ahụhụ nye ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo ha, na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.’—Mkpughe 12:10, 12.

Ihe Ga-eme n’Agba nke Ikpeazụ

11. (a) Usoro ndị dị aṅaa ka Setan ji eme ihe iji na-eduhie “ụwa dum mmadụ bi”? (b) Ná mgbalị dị aṅaa pụrụ iche nke Setan ka Pọl dọọrọ uche gaa?

11 N’ịmara na ọnwụ ya na-eru nso, kemgbe 1914, Setan anọwo na-agbalịsi ike iduhie “ụwa dum mmadụ bi.” N’ịbụ mgbe nile onye nduhie bụ́ aka ochie, Setan nọ n’azụ ebe ihe nkiri ahụ, na-akpọpụta ndị ndú ụwa na ndị na-ekpebi ihe ndị na-ewu ewu n’ebe ihe nkiri  ahụ dị ka ndị na-eme ihe nkiri. (2 Timoti 3:13; 1 Jọn 5:19) Otu n’ime ihe mgbaru ọsọ ya bụ iduhie ihe a kpọrọ mmadụ iche na ụzọ o si achị pụrụ iwetara ha ezi udo. N’ozuzu ya, mgbasa echiche ya na-eduhie eduhie enwewo ihe ịga nke ọma, n’ihi na ndị mmadụ nọgidere na-enwe olileanya n’agbanyeghị ọtụtụ ihe àmà na-egosi na ọnọdụ na-akawanye njọ. Pọl onyeozi buru n’amụma na kpọmkwem tupu e bibie usoro ihe a, a ga-enwe otu ngosipụta dị ịrịba àmà nke mgbasa echiche na-eduhie eduhie nke Setan. O dere, sị: “Mgbe ọ bụla ha na-asị: ‘Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi!’ mgbe ahụ mbibi mberede gaje ịbịakwasị ha n’otu ntabi anya dị nnọọ ka ihe ụfụ nke nhụjuanya na-abịakwasị nwanyị dị ime.”—1 Ndị Tesalonaịka 5:3; Mkpughe 16:13.

12. Mgbalị ndị dị aṅaa na-aga n’ihu ka a nọworo na-eme iji weta udo n’oge anyị?

12 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị ọchịchị ejiwo okwu ahụ bụ́ “udo na ịnọ ná ntụkwasị obi” mee ihe mgbe mgbe iji kọwaa atụmatụ dị iche iche nke ụmụ mmadụ. Ọbụna ha kpọrọ afọ 1986 Afọ Udo nke Mba Nile, ọ bụ ezie na e nweghị udo mba nile n’afọ ahụ. Mgbalị ndị dị otú ahụ nke ndị ndú ụwa ọ̀ bụ mmezu zuru ezu nke 1 Ndị Tesalonaịka 5:3, ka Pọl ọ̀ na-ezo aka n’otu ihe omume nke ga-adị nnọọ ịrịba ama nke na ụwa dum ga-ama banyere ya?

13. Mgbe Pọl buru amụma banyere iti mkpu nke “Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi!,” gịnị ka o ji mbibi nke ga-esochi ya tụnyere, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?

13 Ebe ọ bụ na a na-aghọtakarị amụma Bible nke ọma nanị mgbe ha mezuchara ma ọ bụ mgbe ha nọ na-emezu, anyị aghaghị ichere ma hụ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe na-akpali mmasị na Pọl ji mbibi mberede nke ga-eso mkpu “Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi!” tụnyere ihe ụfụ nke ime omume nke nwanyị dị ime. N’ime ihe dị ka ọnwa itoolu, nwanyị dị ime na-amatawanye na nwa na-eto n’ime ya. O nwere ike ịnụ ụda obi otiti nwa ya ma ọ bụ nwee mmetụta nke mmegharị ahụ́ ya n’akpa nwa. Ọbụna nwa ya pụrụ ịgba ya ụkwụ. Ihe àmà ndị ahụ na-anọgide na-apụtawanye ìhè ruo otu ụbọchị mgbe ọ ga-enwe oké ihe ụfụ, ihe ụfụ nke na-egosi na ihe a nọworo na-atụ anya ya—ọmụmụ nke nwa ahụ—eruwo. N’ihi ya, n’agbanyeghị otú e si tie mkpu ahụ e buru n’amụma bụ́ “Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi!” ọ ga-eduga n’ihe omume mberede na-egbu mgbu na n’ikpeazụ n’ihe omume na-enye obi ụtọ—mbibi nke ajọ omume nile na mmalite nke usoro ihe nke ụwa ọhụrụ.

14. Usoro dị aṅaa ka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu ga-agbaso, gịnị ga-esi na ya pụta?

14 Mbibi na-abịanụ ga-emenye Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’akụkụ na-ekiri ihe na-emenụ egwu. Nke mbụ, ndị eze nke ụwa (akụkụ nzukọ Setan nke bụ́ ọchịchị) ga-awakpo ndị na-akwado Babilọn Ukwu ahụ (akụkụ nzukọ Setan nke bụ́ okpukpe) ma bibie ha. (Mkpughe 17:1, 15-18) Ya mere, n’ụzọ dị ịtụnanya, alaeze Setan ga-ekewa megide onwe ya, ebe otu akụkụ ga-awakpo ibe ya, ike agaghị adịkwa Setan igbochi ya. (Matiu 12:25, 26) Jehova ga-etinye ya n’obi ndị eze ụwa “imezu echiche ya,” ya bụ, ikpochapụ ndị iro ya bụ́ ndị okpukpe n’ụwa. Mgbe e bibisịrị okpukpe ụgha, Jizọs Kraịst ga-eduzi usuu ndị agha eluigwe ya n’ikpochapụ ihe fọdụrụ ná nzukọ Setan—òtù azụmahịa na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’ikpeazụ, a ga-eme ka Setan n’onwe ya kwụsị ịkpa ike. Mgbe nke ahụ mere, ndị nile na-eme ihe nkiri ahụ ga-apụ, ihe nkiri ahụ wewokwara ogologo oge ga-abịa ná njedebe.—Mkpughe 16:14-16; 19:11-21; 20:1-3.

15, 16. Mmetụta dị aṅaa ka ihe ncheta bụ́ na “oge fọdụrụnụ dị ntakịrị” kwesịrị inwe ná ndụ anyị?

15 Olee mgbe ihe ndị a nile ga-eme? Anyị amaghị ụbọchị ma ọ bụ awa ahụ. (Matiu 24:36) Ma anyị maara na “oge fọdụrụnụ dị ntakịrị.” (1 Ndị Kọrint 7:29) N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka anyị jiri oge fọdụrụnụ mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. N’ụzọ dị aṅaa? Dị ka Pọl onyeozi kọwara, anyị aghaghị ‘ịzụpụta oge kwesịrị ekwesị’ maka ihe ndị ka mkpa, na-ahapụ ihe ndị na-adịghị mkpa ma na-eji ụbọchị ọ bụla eme ihe bara uru. N’ihi gịnị? “N’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” ‘N’ịghọtakwa ihe  bụ́ uche Jehova’ maka anyị, anyị agaghị ala ntakịrị oge dị oké ọnụ ahịa fọdụrụnụ n’iyi.—Ndị Efesọs 5:15-17; 1 Pita 4:1-4.

16 N’ịmara na mbibi na-echere usoro ihe dum nke ụwa, olee mmetụta anyị kwesịrị inwe n’otu n’otu? Pita onyeozi dere maka abamuru anyị, sị: “Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a nile, lee ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke!” (2 Pita 3:11) Lee ka nke ahụ si bụrụ ụdị mmadụ anyị kwesịrị ịbụ n’ezie! N’ikwekọ na ndụmọdụ amamihe dị na ya nke Pita, ọ dị anyị mkpa (1) ịdị na-elebara nnọọ àgwà anyị anya iji hụ na ọ dị nsọ na (2) ịhụ na ihe ndị anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme n’ozi Jehova na-egosipụta mgbe nile ịhụnanya miri emi anyị nwere n’ebe ọ nọ.

17. Ọnyà ndị dị aṅaa nke Setan ka Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi na-aghaghị ịnọ na nche megide?

17 Ịhụnanya maka Chineke ga-egbochi anyị imikpu onwe anyị n’ụwa a n’ihi ihe ndọrọ ya dị iche iche. N’ihi ihe na-echere usoro ihe dị ugbu a, ọ dị ize ndụ anyị ịbụ ndị ihe ndọrọ ya nke ịchụso ndụ ihe ụtọ nke ụwa dọọrọ. Ọ bụ ezie na anyị bi ma na-arụ ọrụ n’ime ụwa, anyị kwesịrị ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ amamihe dị na ya ka anyị ghara iji ụwa eme ihe n’újú. (1 Ndị Kọrint 7:31) N’ezie, anyị aghaghị ime ike anyị iji nọrọ na nche megide ịbụ ndị mgbasa echiche na-eduhie eduhie nke ụwa duhiere. Ụwa a agaghị enwe ihe ịga nke ọma n’ịchọta ihe ngwọta nye nsogbu ya. Ọ gaghị anọgide na-akwagide onwe ya ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ nnọọ iji jide nke ahụ n’aka? Ọ bụ n’ihi na Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ kwuru otú ahụ: “Ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.

Ihe Kasị Mma Ka Na-abịa!

18, 19. Mgbanwe ndị dị aṅaa ka ị na-atụ anya ịhụ n’ụwa ọhụrụ, n’ihi gịnịkwa ka ọ ga-eji ruo nchere e cheere ya?

18 Jehova ga-eweta ihe nkiri nke Setan na ndị na-akwado ya ná njedebe n’isi nso. Mgbe nke ahụ gasịrị, site ná ngọzi Chineke, ndị kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị ga-alanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe a ga-amalite ịrụ ọrụ n’idozigharị “ọnọdụ” ebe ihe nkiri nke ga-adịru ebighị ebi. Agha agaghịzikwa emebi ọnọdụ ahụ; Chineke ga-eme ka “agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” (Abụ Ọma 46:9) N’ọnọdụ ụkọ nri, ‘ọtụtụ ọka ga-adị n’ala n’elu ugwu nile.’ (Abụ Ọma 72:16) Ụlọ mkpọrọ, ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, ndị isi ahịa ọgwụ ike, ụlọikpe maka ịgba alụkwaghịm, okwu ikpe maka irikpọ ego, na iyi ọha egwu ga-apụ n’anya.—Abụ Ọma 37:29; Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:3-5.

19 Ọ dịghịzi ihe ga-adị n’ili ncheta, a ga-enwe ọtụtụ nde ndị e si n’ọnwụ kpọlite n’ụwa—ndị ọzọ ga-esonye n’ihe nkiri. Lee ihe na-enye ọṅụ ọ ga-abụ mgbe e jikọtaghachiri otu ọgbọ na ibe ya na mgbe ndị a hụrụ n’anya e kewapụrụ n’ebe ibe ha nọ eri ogologo oge ga-amakụ ibe ha n’ụzọ na-ekpo ọkụ! N’ikpeazụ, mmadụ nile dị ndụ ga na-efe Jehova ofufe. (Mkpughe 5:13) Mgbe mgbanwe ndị ahụ wesịịrị ọnọdụ, ihe nkiri ọzọ ga-amalite na paradaịs zuru ụwa ọnụ. Olee otú ọ ga-adị gị ka ị na-elegharị anya gburugburu gị? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-akpali gị ikwu, sị, ‘Echewo m ogologo oge maka nke a, ma o ruru ya!’

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Mgbe ọ na-ekwu ihe ọzọ, Pọl kwuru banyere Ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka “ihe a na-ekiri ekiri n’ebe a na-eme ihe ngosi n’anya ụwa, nakwa n’anya ndị mmụọ ozi, nakwa n’anya ụmụ mmadụ.”—1 Ndị Kọrint 4:9.

^ par. 4 Dị ka ihe atụ, banyere ihe e ji amata “eze ugwu,” nke a kpọtụrụ aha na Daniel 11:40, 44, 45, lee akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, peeji nke 280-281.

^ par. 6 Bible n’onwe ya na-egosi na Jeruselem dara afọ 70 tupu ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ alọghachi na 537 T.O.A. (Jeremaịa 25:11, 12; Daniel 9:1-3) Maka ntụle zuru ezu nke “oge a kara nke ndị mba ọzọ,” lee peeji nke 95-97 nke Reasoning From the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú okwu Pọl bụ́ na “ọnọdụ ụwa na-agbanwe agbanwe” si bụrụ eziokwu n’oge anyị?

• Olee otú ọgụgụ oge Bible si gosi kpọmkwem mgbe “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” gwụrụ?

• Olee otú ọnọdụ ụwa na-agbanwe agbanwe si nwapụta na 1914 kara akara mmalite nke “mgbe ọgwụgwụ”?

• Olee otú eziokwu ahụ bụ́ na “oge fọdụrụnụ dị ntakịrị” kwesịrị isi metụta anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 20]

N’ikpeazụ—a kọwaa ihe omimi ahụ!