Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Njedebe nke Agha

Njedebe nke Agha

 Njedebe nke Agha

‘Anyị dị nanị afọ 12. Anyị apụghị imetụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha n’ụzọ ọ bụla, ma anyị chọrọ ịdị ndụ! Anyị na-eche udo. Ànyị ga-adị ndụ hụ ya?’—Ụmụ akwụkwọ nọ na klas nke ise

‘Anyị chọrọ ịga akwụkwọ na ileta ndị enyi na ezinụlọ anyị n’atụghị ụjọ ịbụ ndị a tọọrọ. Enwere m olileanya na ndị ọchịchị ga-ege ntị. Anyị chọrọ ndụ ka mma. Anyị chọrọ udo.’—Alhaji, onye dị afọ 14

OKWU ndị a na-emetụ n’ahụ́ na-egosi olileanya sitere n’obi nke ndị na-eto eto bụ́ ndị hụsiworo anya ruo ọtụtụ afọ n’ihi ọgụ ime obodo. Nanị ihe ha chọrọ bụ ibi ndụ dị otú o kwesịrị. Ma ime ka olileanya mezuo anaghị adị mfe. Ọ̀ dị mgbe anyị ga-ahụ ụwa nke agha na-adịghị na ya ná ndụ anyị?

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e mewo mgbalị zuru ụwa ọnụ iji kwụsị agha obodo ụfọdụ site n’ịrụgide ndị ahụ na-alụrịta agha ịbịanye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta udo. Mba ụfọdụ ezigawo ndị agha nchebe udo iji hụ na e mezuru nkwekọrịta ndị dị otú ahụ. Ma, ọ bụ mba ole na ole nwere ego ma ọ bụ ọchịchọ ịchịkwa mba ndị dị n’ebe dị anya bụ́ ebe oké ịkpọasị na inyo mmadụ enyo na-eme ka nkwekọrịta ọ bụla òtù ndị na-ebusorịta onwe ha agha mere ghara nnọọ isi ike. Ọtụtụ mgbe, agha na-ebirighachi ọkụ nanị izu ma ọ bụ ọnwa ole na ole e kwekọrịtasịrị ịkwụsị ya. Dị ka ụlọ ọrụ Stockholm International Peace Research Institute na-ekwu, “udo na-esi ike nnweta mgbe ndị na-alụ agha nwere ọchịchọ na ikike ịnọgide na-alụ agha.”

N’otu oge ahụ, agha ndị a na-adịghị akwụsị akwụsị ndị na-eti ọtụtụ akụkụ nke ụwa ihe otiti na-echetara Ndị Kraịst otu amụma Bible. Akwụkwọ Mkpughe na-ekwu banyere otu oge pụrụ iche n’akụkọ ihe mere eme bụ́ mgbe onye na-agba ịnyịnya ihe atụ ‘ga-ewepụ udo n’ụwa.’ (Mkpughe 6:4) Ihe a na-ese onyinyo agha na-adịghị akwụsị akwụsị bụ akụkụ nke ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara bụ́ nke na-egosi na anyị bi n’oge a kọwara na Bible dị ka ‘ụbọchị ikpeazụ.’ * (2 Timoti 3:1) Otú ọ dị, Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na ụbọchị ikpeazụ ndị a ga-eduga n’udo.

Bible na-akọwa n’Abụ Ọma 46:9 na ka e wee nweta ezi udo agha ga-akwụsị, ọ bụghị nanị n’otu akụkụ nke ụwa, kama n’ụwa nile. Ọzọkwa, otu abụ ọma a kwuru kpọmkwem banyere mbibi nke ngwá agha ndị e nwere n’oge Bible—ọta na ube. N’otu aka ahụ, a ghaghị ibibi ngwá agha na-amụba amụba nke oge a ma ọ bụrụ na ọ dị mgbe ihe a kpọrọ mmadụ ga-ebi n’udo.

Otú ọ dị, ọ bụ ịkpọasị na anyaukwu na-eme ka agha sikwuo ike, ọ bụghị mgbọ na égbè. Anyaukwu bụ isi ihe na-akpata agha, ịkpọasị na-edugakwa mgbe mgbe n’ime ihe ike. Iji wepụ echiche ndị a na-emebi ihe, ọ dị ndị  mmadụ mkpa ịgbanwe otú ha si eche echiche. Ọ dị ha mkpa ka a kụziere ha ibi n’udo. Ya mere, onye amụma oge ochie bụ́ Aịzaịa kwuru n’ezie na agha ga-akwụsị nanị mgbe ndị mmadụ ‘na-adịghịzi amụ agha.’—Aịsaịa 2:4.

Ma, ka ọ dị ugbu a, anyị bi n’ụwa nke na-akụziri ndị okenye na ụmụaka, ọ bụghị uru udo bara kama otuto nke agha. N’ụzọ dị mwute, a na-akụziri ọbụna ụmụaka otú e si egbu mmadụ.

Ha Mụtara Igbu Mmadụ

Mgbe ọ dị afọ 14, Alhaji ghọrọ onye agha na-anọghịzi n’ọrụ agha. Ọ dị nanị afọ iri mgbe ndị agha nnupụisi jidere ya ma kụziere ya ka e si eji égbè AK-47 alụ ọgụ. Dị ka onye a manyere ịrụ ọrụ agha, ọ kwakọọrọ nri ndị mmadụ ma gbaa ụlọ ọkụ. O gbukwara ma bepụ ndị mmadụ akụkụ ahụ́. Taa, ọ na-esiri Alhaji ike ichefu agha na ime mgbanwe iji bie ndụ dị ka onye nkịtị. Abraham, bụ́ nwatakịrị ọzọ ghọrọ onye agha, mụtakwara igbu mmadụ, o sikwaara ya ike inyefe ngwá agha ya. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ha asị m hapụ égbè m lawa, amaghị m ihe m ga-eme, otú m ga-esi na-enweta ihe m ga-eri.”

Ihe karịrị ụmụntakịrị 300,000 bụ́ ndị agha—ma ndị nwoke ma ndị nwanyị—ka na-alụ agha ma na-anwụ n’agha obodo ndị na-eti mbara ala anyị ihe otiti. Otu onye ndú nke òtù nnupụisi kọwara, sị: “Ha na-erube isi n’iwu e nyere ha; ha adịghị eche echiche ịlaghachikwuru ndị nwunye ma ọ bụ ezinụlọ ha; ha adịghịkwa atụ egwu.” N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụaka ndị a chọrọ ma kwesị ibi ndụ ka mma.

Ná mba ndị mepere emepe, ọnọdụ ọjọọ nke nwatakịrị bụ́ onye agha bụ ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ụmụaka bi n’obodo ndị mepere emepe na-amụ ka e si alụ agha n’ụlọ ha. N’ụzọ dị aṅaa?

Were José dị ka ihe atu, bụ́ onye si n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Spen. Ọ bụ onye nọ n’afọ iri na ụma nke na-enwe mmasị n’ọgụ aka na ụkwụ. Ihe onwunwe ya o ji kpọrọ ihe karịsịa bụ mma agha ndị Japan nke nna ya zụtaara ya dị ka onyinye Krismas. O nwekwara mmasị n’egwuregwu vidio, karịsịa ndị a na-eme ihe ike na ha. N’April 1, 2000, o ṅomiri oké iwe nke onye ọ na-enwe mmasị ikiri na TV. N’ime ihe ike nke na-enweghị nchịkwa, o ji mma agha ahụ nna ya nyere ya gbuo nna ya, nne ya na nwanne ya nwanyị. “Achọrọ m ịnọ nanị m n’ụwa; achọghị m ka nna m na nne m na-achọgharị m,” ka ọ kọwaara ndị uwe ojii.

Mgbe ọ na-ekwu banyere mmetụta ntụrụndụ a na-eme ihe ike na ha na-enwe n’ahụ́ ndị mmadụ, onye na-ede akwụkwọ na onye na-achịkwa ndị agha bụ́ Dave Grossman sịrị: “Anyị eruwela ebe ihe na-adịkwaghị emetụ anyị n’ahụ́ bụ́ ebe ịkpatara ndị ọzọ ihe mgbu na nhụjuanya ghọworo ihe ntụrụndụ: inweta ihe ụtọ dị ka a ga-asị na mmadụ so na-eme ihe ike ahụ kama ịsọ ya oyi. Anyị na-amụta igbu mmadụ, anyị na-amụtakwa inwe mmasị na ya.”

Ma Alhaji ma José mụtara igbu mmadụ. Ọ dịghị onye n’ime ha bu n’obi ịghọ ogbu mmadụ, ma otu ọzụzụ ma ọ bụ ọzọ merụrụ echiche ha. Ọzụzụ dị otú ahụ—ma è nyere ya ụmụaka ma ọ bụ ndị toro eto—na-akụ mkpụrụ nke ime ihe ike na agha.

Ịmụta Udo Kama Ịmụ Agha

A pụghị inwe udo na-adịgide adịgide ebe ndị mmadụ ka na-amụ igbu mmadụ. Ọtụtụ narị afọ gara aga, Aịzaịa onye amụma dere, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile [Chineke] nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri.” (Aịsaịa 48:17, 18) Mgbe ndị mmadụ nwetara ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke ma mụta ịhụ iwu Chineke n’anya, ha ga na-asọ ime ihe ike na agha oyi. Ọbụna ugbu a, ndị nne na nna kwesịrị ijide n’aka na egwuregwu ndị ụmụ ha na-egwu adịghị akwalite ime ihe ike. Ndị toro eto pụkwara ịmụta imeri ịkpọasị na anyaukwu. Ndịàmà Jehova achọpụtawo ugboro ugboro na Okwu Chineke nwere ikike ịgbanwe àgwà mmadụ.—Ndị Hibru 4:12.

 Tụlee ihe banyere Hortêncio. Ọ bụ nwa okorobịa mgbe a manyere ya ịghọ onye agha. E mere ọzụzụ agha iji “kụnye ọchịchọ nke igbu ndị ọzọ n’ime anyị na ịghara ịtụ ụjọ igbu mmadụ,” ka ọ na-akọwa. Ọ lụrụ agha n’otu agha obodo were ogologo oge n’Africa. “Agha ahụ metụtara àgwà m,” ka o kwetara. “Ọbụna ruo taa, m ka na-echeta ihe nile m mere. Ihe ndị a manyere m ime na-ewutebiga m ókè.”

Mgbe onye agha ibe Hortêncio gwara ya okwu banyere Bible, o metụrụ ya n’obi. Nkwa Chineke dị n’Abụ Ọma 46:9 banyere iwepụ ụdị agha nile masịrị ya. Ka ọ na-amụkwu Bible, otú ahụ ka ọchịchọ ya maka ịlụ agha na-ebelata. N’oge na-adịghị anya, a chụrụ ya na ndị enyi ya abụọ n’ọrụ agha, ha ararakwa ndụ ha nye Jehova Chineke. “Eziokwu Bible nyeere m aka ịhụ ndị iro m n’anya,” ka Hortêncio na-akọwa. “Aghọtara m na site n’ịlụ ọgụ n’agha, m na-eme ihe ọjọọ megide Jehova, n’ihi na Chineke kwuru na anyị ekwesịghị igbu onye agbata obi anyị. Iji gosipụta ịhụnanya a, aghaghị m ịgbanwe ụzọ m si eche echiche ma ghara ile ndị mmadụ anya dị ka ndị iro m.”

Ahụmahụ ndị dị otú ahụ mere eme na-egosi na nkụzi Bible na-akwalite udo n’ezie. Nke a abụghị ihe ijuanya. Aịzaịa onye amụma kwuru na izi ihe Chineke na udo nwere nnọọ njikọ. O buru amụma, sị: ‘Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.’ (Aịsaịa 54:13) Otu onye amụma ahụ kwuru banyere mgbe ndị si ná mba nile ga-enuba n’ezi ofufe nke Jehova Chineke iji mụta ụzọ ya. Gịnị ga-esi na ya pụta? ‘Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.’—Aịsaịa 2:2-4.

N’ikwekọ n’amụma a, Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ izi ihe zuru ụwa ọnụ bụ́ nke nyewooro ọtụtụ nde aka imeri ịkpọasị nke bụ́ isi ihe na-akpata agha ụmụ mmadụ.

Ihe Na-eme Ka E Jide n’Aka na A Ga-enwe Udo Ụwa

E wezụga izi ihe, Chineke eguzobewo ọchịchị, ma ọ bụ “alaeze” bụ́ nke pụrụ ịhụ na e nwere udo n’ụwa nile. N’ụzọ dị ịrịba ama, Bible na-akpọ Onye Ọchịchị nke Chineke họọrọ, bụ́ Jizọs Kraịst, “Onyeisi Udo.” Ọ na-emesikwu anyị obi ike na “ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.”—Aịsaịa 9:6, 7.

Gịnị mere anyị ji jide n’aka na ọchịchị Kraịst ga-enwe ihe ịga nke ọma n’iwepụ ụdị agha nile? Aịzaịa onye amụma na-agbakwụnye, sị: “Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.” (Aịsaịa 9:7) Chineke nwere ọchịchọ na ikike ime ka e nwee udo na-adịgide adịgide. Jizọs nwere obi ike dị ukwuu ná nkwa a. Ọ bụ ya mere o ji kụziere ụmụazụ ya ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa na ka uche Chineke mee n’ụwa. (Matiu 6:9, 10) Mgbe a ga-emesị mezuo arịrịọ ahụ e ji ezi obi na-arịọ, agha agaghịkwa ebibi mbara ụwa ọzọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Iji nyochaa ihe àmà na-egosi na anyị na-ebi n’ụbọchị ikpeazụ, lee isi nke 11 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 7]

Nkụzi Bible na-akwalite ezi udo