Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“N’ime Ụwa Dum Ka Ụda Ha Garuru”

“N’ime Ụwa Dum Ka Ụda Ha Garuru”

“N’ime Ụwa Dum Ka Ụda Ha Garuru”

“Mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.”—MATIU 28:19.

1, 2. (a) Olee ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya? (b) Gịnị mere Ndị Kraịst narị afọ mbụ ji nwee ike ịrụzu ihe dị ukwuu otú ahụ?

OGE na-adịghị anya tupu ọ rịgoro n’eluigwe, Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ. Ọ gwara ha, sị: “Mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Matiu 28:19) Lee ọrụ dị nnọọ ukwuu nke ahụ bụ!

2 Cheedị echiche! Na Pentikọst 33 O.A., a wụsara ihe dị ka ndị na-eso ụzọ 120 mmụọ nsọ, ha wee malite ịrụzu ọrụ ahụ site n’ịgwa ndị ọzọ na Jizọs bụ Mezaịa ahụ a nọworo na-ele anya ya eri ogologo oge, bụ́ onye a pụrụ isi n’aka ya nweta nzọpụta. (Ọrụ 2:1-36) Olee otú obere ìgwè a ga-esi gakwuruchaa “ndị nke mba nile”? N’anya mmadụ, ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume, ma “n’ebe Chineke nọ ihe nile kwere omume.” (Matiu 19:26) Ndị Kraịst oge mbụ ahụ nwere nkwado nke mmụọ nsọ Jehova, ha nwekwara echiche nke ịdị ngwa. (Zekaraịa 4:6; 2 Timoti 4:2) N’ihi ya, n’ime nanị iri afọ ole na ole, Pọl onyeozi pụrụ ikwu na a na-ekwusa ozi ọma ahụ “n’etiti ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”—Ndị Kọlọsi 1:23.

3. Gịnị kpuchiri ezi Ndị Kraịst bụ́ “ọka wit”?

3 N’akụkụ ka ukwuu nke narị afọ mbụ, ezi ofufe nọgidere na-agbasa. Otú ọ dị, Jizọs ebuolarị amụma na oge na-abịa mgbe Setan ga-akụnye “ata,” e kpuchiekwa ezi Ndị Kraịst bụ́ “ọka wit” ruo ọtụtụ narị afọ ruo oge owuwe ihe ubi. Nke ahụ mezuru mgbe ndịozi nwụsịrị.—Matiu 13:24-39.

Ịmụba n’Ike n’Ike Taa

4, 5. Malite na 1919, gịnị bụ ọrụ Ndị Kraịst e tere mmanụ malitere ịrụ, gịnịkwa mere o ji bụrụ ihe ịma aka buru ibu?

4 Na 1919, oge ikewapụ ezi Ndị Kraịst bụ́ ọka wit n’ebe ata dị ruru. Ndị Kraịst e tere mmanụ maara na nnukwu ọrụ Jizọs nyere ka ga na-aga n’ihu. Ha kwenyesiri ike na ha na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ,” marakwa amụma Jizọs bụ́: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (2 Timoti 3:1; Matiu 24:14) N’ezie, ha maara na e nwere ọrụ dị ukwuu a ga-arụ.

5 Otú ọ dị, dị ka ndị na-eso ụzọ nke 33 O.A., Ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ chere ihe ịma aka buru ibu ihu. E nwere nanị puku ole na ole n’ime ha nọ nanị ná mba ole na ole. Olee otú ha pụrụ nnọọ isi kwusaa ozi ọma ahụ “n’elu ụwa dum mmadụ bi”? Cheta na ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa amụbawo eleghị anya site na nde 300 n’oge ndị Siza ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri 2 mgbe Agha Ụwa Mbụ bisịrị. Ọ ga-anọgidekwa na-amụba n’ike n’ike n’ime narị afọ nke 20 nile.

6. Olee ọganihu e nweworo n’ịgbasa ozi ọma ahụ ka ọ na-erule afọ ndị 1930?

6 Ka o sina dị, ndị ohu Jehova e tere mmanụ, dị ka ụmụnna ha ndị narị afọ mbụ, ji okwukwe zuru ezu n’ebe Jehova nọ malite ọrụ e nyere ha, mmụọ ya nọnyekwaara ha. Ka ọ na-erule n’etiti afọ ndị 1930, ihe dị ka ndị na-ezisa ozi ọma dị 56,000 akpọsawo eziokwu Bible n’ala 115. A rụọlarị ọrụ buru ibu, ma nke fọdụrụnụ ka buru ibu.

7. (a) Olee ihe ịma aka ọhụrụ Ndị Kraịst e tere mmanụ chere ihu? (b) Site ná nkwado nke “atụrụ ọzọ” ahụ, olee ọganihu e nweworo n’ọrụ nchịkọta ahụ?

7 Mgbe ahụ, nghọta mikwuru emi e nwere banyere ndị bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe 7:9 ghọrọ ihe ịma aka ọhụrụ ma gosikwa na Ndị Kraịst ahụ na-arụsi ọrụ ike ga-enweta enyemaka. A ghaghị ịchịkọta ìgwè mmadụ a na-akpọghị ọnụ ọgụgụ ha aha nke “atụrụ ọzọ” ahụ, bụ́ ndị kwere ekwe nwere olileanya elu ala, ‘site ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile.’ (Jọn 10:16) Ndị a ‘ga na-ejere Jehova ozi dị nsọ ehihie na abalị.’ (Mkpughe 7:15) Nke ahụ pụtara na ha ga-enye aka n’ọrụ nkwusa na izi ihe. (Aịsaịa 61:5) N’ihi ya, Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere obi ụtọ ịhụ ọnụ ọgụgụ nke ndị na-ezisa ozi ọma ka ọ na-amụba ịbụ ọtụtụ iri puku ma mesịakwa ruo ọtụtụ nde. N’afọ 2003, ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ́ 6,429,351 keere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ—ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha so n’oké ìgwè mmadụ ahụ. * Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere ekele maka enyemaka a, atụrụ ọzọ ahụ nwekwara ekele maka ihe ùgwù nke ịkwado ụmụnna ha e tere mmanụ.—Matiu 25:34-40.

8. Olee otú Ndịàmà Jehova si meghachi omume ná nrụgide gabigara ókè ha nwetara n’oge Agha Ụwa nke Abụọ?

8 Mgbe òtù ọka wit ahụ pụtara ìhè ọzọ, Setan busoro ya agha kpụ ọkụ n’ọnụ. (Mkpughe 12:17) Olee otú o si meghachi omume mgbe oké ìgwè mmadụ ahụ malitere ịpụta? O mesoro ha ihe ike n’ụzọ gabigara ókè! Ànyị pụrụ ịgbagha na ọ bụ ya kpatara mwakpo zuru ụwa ọnụ a wakporo ezi ofufe n’oge Agha Ụwa nke Abụọ? Ndị Kraịst nwetara nrụgide dị ukwuu site n’akụkụ abụọ ahụ na-alụrịta agha. Ọtụtụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị anyị hụrụ n’anya nwetara ule ndị jọgburu onwe ha, ụfọdụ nwụkwara n’ihi okwukwe ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ha kwughachiri okwu ọbụ abụ ahụ, na-asị: “N’ime Chineke ka m ga-eto okwu Ya. Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịworo obi, m gaghị atụ egwu; Gịnị ka anụ ahụ́ bụ́ mmadụ ga-eme m?” (Abụ Ọma 56:4; Matiu 10:28) Ndị Kraịst e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ, n’ịbụ ndị mmụọ Jehova wusiri ike, guzosiri ike dị ka otu ìgwè. (2 Ndị Kọrint 4:7) N’ihi ya, “okwu Chineke nọgidere na-eto eto.” (Ọrụ 6:7) Na 1939, mgbe agha ahụ malitere, Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dị 72,475 nyere akụkọ ozi nke gosiri na ha keere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. Otú ọ dị, akụkọ ozi na-ezughị ezu e nwetara na 1945, bụ́ afọ agha ahụ biri, kpughere na Ndịàmà 156,299 na-arụsi ọrụ ike nọ na-agbasa ozi ọma ahụ. Lee ka nke ahụ si bụrụ imeri Setan!

9. Olee ụlọ akwụkwọ ọhụrụ ndị a mara ọkwa mmalite ha n’oge Agha Ụwa nke Abụọ?

9 O doro anya na ọgba aghara nke Agha Ụwa nke Abụọ emeghị ka ndị ohu Jehova nwee obi abụọ ma à ga-arụzụkwa ọrụ nkwusa ahụ. N’ezie, na 1943, mgbe agha ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ, a mara ọkwa mmalite nke ụlọ akwụkwọ ọhụrụ abụọ. E zubere iduzi otu, nke a na-akpọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ugbu a, n’ọgbakọ nile iji zụọ Ndịàmà n’otu n’otu ime nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ. Nke ọzọ, bụ́ Watchtower Bible School of Gilead, bụ maka inye ndị ozi ala ọzọ ọzụzụ bụ́ ndị ga-agbasawanye ọrụ nkwusa ahụ n’ala ndị ọzọ. Ee, mgbe agha ahụ mesịrị kwụsị, ezi Ndị Kraịst dị njikere maka ọrụ bukwuru ibu.

10. Olee otú e si hụ ịnụ ọkụ n’obi nke ndị Jehova n’afọ 2003?

10 Lee ọrụ magburu onwe ya ha rụworo! N’ịbụ ndị a zụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, mmadụ nile—ndị na-eto eto na ndị agadi, ndị nne na nna na ụmụaka, ọbụna ndị na-adịkwaghị ike—ekerewo òkè ma nọgide na-ekere òkè n’ịrụzu nnukwu ọrụ ahụ Jizọs nyere. (Abụ Ọma 148:12, 13; Joel 2:28, 29) N’afọ 2003, ná nkezi kwa ọnwa, mmadụ 825,185 gosipụtara echiche ịdị ngwa ha site n’ikere òkè n’ọrụ ọsụ ụzọ, nke nwa oge ma ọ bụ nke oge nile. N’otu afọ ahụ, Ndịàmà Jehova, ji awa 1,234,796,477 gwa ndị ọzọ banyere ozi ọma Alaeze ahụ. N’ezie Jehova nwere obi ụtọ n’ihi ịnụ ọkụ n’obi nke ndị ya!

N’ubi Ala Ọzọ

11, 12. Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi ezi ihe ndị ozi ala ọzọ rụpụtara?

11 N’ime afọ ndị gafeworonụ, ndị gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Gilead na, n’oge na-adịchabeghị anya, ndị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi arụpụtawo ihe magburu onwe ya. Dị ka ihe atụ, na Brazil, e nwere ihe na-erughị ndị nkwusa 400 mgbe ndị ozi ala ọzọ mbụ bịarutere ebe ahụ na 1945. Ndị ozi ala ọzọ a na ndị ọzọ e mechara zite na ụmụnna ha ndị Brazil na-anụ ọkụ n’obi rụkọsiri ọrụ ike, Jehova agọziwokwa mgbali ha n’ụzọ dị ukwuu. Lee ihe ọṅụ ọ bụụrụ onye ọ bụla na-echeta oge mbụ ahụ ka ọ na-ahụ na Brazil nyere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ́ 607,362 na 2003!

12 Tụlee Japan. Tupu Agha Ụwa nke Abụọ, e nwere ihe dị ka otu narị ndị nkwusa Alaeze n’ala ahụ. N’oge agha ahụ, mkpagbu obi ọjọọ belatara ọnụ ọgụgụ ha, ka ọ na-erukwala mgbe agha ahụ biri, ọ bụ nanị Ndịàmà ole na ole dị ndụ ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ nkịtị. (Ilu 14:32) Mmadụ ole na ole ahụ na-eguzosi nnọọ ike n’ezi ihe nwere nnọọ obi ụtọ na 1949 ịnabata ndị ozi ala ọzọ 13 mbụ bịara n’ebe ahụ bụ́ ndị a zụrụ na Gilead, ndị ozi ala ọzọ ahụ egbughịkwa oge n’inwe mmasị n’ebe ụmụnna ha ndị Japan na-anụ ọkụ n’obi ma na-ele ọbịa nọ. Ihe karịrị afọ 50 ka e mesịrị, n’afọ 2003, Japan nyere akụkọ ozi nke ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nkwusa 217,508! N’ezie Jehova agọziwo ndị ya nke ukwuu n’ala ahụ. E nwere akụkọ ozi ndị yiri nke ahụ si n’ọtụtụ mba ndị ọzọ. Ndị nwere ike ime nkwusa n’ala ọzọ atụnyewo ụtụ dị ukwuu n’ịhụ na a gbasara ozi ọma ahụ, nke mere na a nụrụ ya ná mba, àgwàetiti, na ókèala 235 gburugburu ụwa n’afọ 2003. Ee, oké igwe mmadụ ahụ na-apụta site ‘ná mba nile.’

‘Ndị Si n’Ebo na Ndị na Asụsụ Nile’

13, 14. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si gosi abamuru nke ikwusa ozi ọma ahụ ‘n’asụsụ nile’?

13 Ọrụ ebube mbụ a kọrọ na ndị na-eso ụzọ Jizọs rụrụ mgbe e jisịrị mmụọ nsọ tee ha mmanụ na Pentikọst 33 O.A., bụ na ha gwara ìgwè mmadụ gbakọtaranụ okwu n’asụsụ dị iche iche. Ndị nile nụrụ ihe ha kwuru pụrụ ịbụ ndị na-asụ asụsụ a na-asụ n’ọtụtụ mba, eleghị anya asụsụ Grik. Ebe ha bụ “ndị na-asọpụrụ Chineke,” o yiri ka ha na-aghọtakwa okwu ndị a na-ekwu n’asụsụ Hibru n’ụlọ nsọ ahụ. Ma a dọtara nnọọ mmasị ha mgbe ha nụrụ ozi ọma ahụ n’asụsụ ha mụtara site na nwata.—Ọrụ 2:5, 7-12.

14 Taa, e jikwa ọtụtụ asụsụ eme ihe n’ọrụ nkwusa ahụ. E buru amụma na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi ọ bụghị nanị ná mba nile kamakwa ‘n’ebo, na ndị, na asụsụ nile’ pụta. N’ikwekọ na nke a, Jehova buru amụma site n’ọnụ Zekaraịa, sị: ‘Ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ́ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.’ (Zekaraịa 8:23) Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova enwekwaghị onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, ha maara abamuru nke ịkụziri ndị mmadụ ihe n’asụsụ ha dị iche iche.

15, 16. Olee otú ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ siworo nakwere ihe ịma aka nke ime nkwusa n’asụsụ obodo dị iche iche?

15 N’eziokwu, e nwere asụsụ ole na ole a na-asụ n’ebe nile taa, dị ka asụsụ Bekee, French, na Spanish. Otú ọ dị, ndị hapụrụ ala nna ha ije ozi ná mba ndị ọzọ na-agbalị ịmụta asụsụ ógbè ebe ha bi iji mee ka ozi ọma ahụ ruo ndị “nwere ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Nke ahụ pụrụ isi ike. Mgbe ọ dị ụmụnna ndị bi ná mba Ebe Ndịda Àgwàetiti Pacific nke Tuvalu mkpa inweta akwụkwọ anyị n’asụsụ ha, otu n’ime ndị ozi ala ọzọ ahụ nakweere ihe ịma aka ahụ. Ebe ọ bụ na ọ dịghị akwụkwọ ọkọwa okwu e nwere n’asụsụ ahụ, ọ malitere idepụta okwu Tuvaluan na ihe ndị ha pụtara. Ka oge na-aga, e bipụtara akwụkwọ bụ́ Ị pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala * n’asụsụ Tuvaluan. Mgbe ndị ozi ala ọzọ rutere Curaçao, ọ dịghị akwụkwọ ọ bụla e ji amụ Bible na akwụkwọ ọkọwa okwu e nwere n’asụsụ ógbè ahụ bụ́ Papiamento. E nwekwara echiche ndị dịgasị nnọọ iche banyere otú e kwesịrị isi dee asụsụ ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, afọ abụọ ka ndị ozi ala ọzọ ahụ bịasịrị, e bipụtara traktị Ndị Kraịst mbụ e ji amụ Bible n’asụsụ ahụ. Taa, Papiamento bụ otu n’ime asụsụ 133 a na-ebipụta Ụlọ Nche na ha n’otu oge ahụ a na-ebi nke Bekee ya.

16 Na Namibia, ndị ozi ala ọzọ mbụ bịara ebe ahụ apụghị ịhụ Ndịàmà bụ́ ndị obodo ahụ ga-enyere ha aka ime nsụgharị. Ọzọkwa, otu asụsụ obodo ahụ bụ́ Nama enweghị okwu ndị a pụrụ iji kọwaa echiche ndị a na-ejikarị eme ihe, dị ka “izu okè.” Otu onye ozi ala ọzọ na-akọ, sị: “Ejikarịrị m ndị nkụzi ụlọ akwụkwọ bụ́ ndị na-amụ Bible mee ihe. Ebe ọ bụ na ha nwere ihe ọmụma dị nta banyere eziokwu ahụ, aghaghị m ịnọdebe ha iji hụ na ahịrịokwu ọ bụla ziri ezi.” Ka o sina dị, e mesịrị sụgharịa traktị bụ́ Life in a New World gaa n’asụsụ Namibia anọ. Taa, a na-ebipụta Ụlọ Nche mgbe nile n’asụsụ Kwanyama na Ndonga.

17, 18. Olee ihe ịma aka ndị a na-eme ihe banyere ha na Mexico na mba ndị ọzọ?

17 Na Mexico, asụsụ ha bụ́ isi bụ Spanish. Otú ọ dị, tupu ndị Spen abịa, a na-asụ ọtụtụ asụsụ n’ebe ahụ, a ka na-asụkwa ọtụtụ n’ime ha. N’ihi ya, a na-ebipụta akwụkwọ Ndịàmà Jehova ugbu a n’asụsụ Mexico asaa nakwa n’Ụdị Asụsụ Ogbi nke Mexico. Ozi Alaeze Anyị n’asụsụ Maya bụ akwụkwọ mbụ nwere akara ụbọchị nke e bipụtara n’asụsụ ndị American Indian. N’ezie, ọtụtụ puku ndị Maya, Aztec na ndị ọzọ so ná ndị nkwusa Alaeze 572,530 nọ na Mexico.

18 N’oge na-adịbeghị anya, ọtụtụ nde mmadụ agbagala ala ọzọ dị ka ndị gbara ọsọ ndụ, ma ọ bụ kwaga mba ọzọ n’ihi ihe ndị metụtara akụ̀ na ụba. N’ihi ya, na nke mbụ ya, ọtụtụ mba enwewo ubi asụsụ ala ọzọ butụrụ ibu ugbu a. Ndịàmà Jehova anakwerewo ihe ịma aka ahụ. Dị ka ihe atụ n’Ịtali, e nwere ọgbakọ na ìgwè 22 na-eji asụsụ ọzọ eme ihe ma e wezụga asụsụ Italian. Iji nyere ụmụnna aka ikwusara ndị mmadụ ndị na-asụ asụsụ ndị ọzọ aka, a haziri ihe ọmụmụ na nso nso a iji kuzie asụsụ 16, ndị gụnyere Ụdị Asụsụ Ogbi nke Ịtali. N’ọtụtụ mba ndị ọzọ, Ndịàmà Jehova na-etinyekwa otu ụdị mgbalị ahụ iji jekwuru ụbara mmadụ si mba ọzọ kwabata. Ee, site n’enyemaka Jehova, oké ìgwè mmadụ ahụ n’ezie na-esi n’imerime asụsụ apụta.

“N’ime Ụwa Dum”

19, 20. Olee okwu Pọl ndị a na-emezu n’ụzọ dị ịrịba ama taa? Kọwaa.

19 Pọl onyeozi dere na narị afọ mbụ, sị: “Ọ̀ bụ na ha anụghị? N’eziokwu, ‘n’ime ụwa dum ka ụda ha garuru, okwu ha garukwara ná nsọtụ nile nke elu ụwa mmadụ bi.’” (Ndị Rom 10:18) Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu na narị afọ mbụ, lee ka ọ ga-esi bụrụ eziokwu karị n’oge anyị! Ọtụtụ nde—eleghị anya karịa mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme—na-asị: “M ga-agọzi Jehova na mgbe nile; mgbe nile ka otuto ya ga-adị n’ọnụ m.”—Abụ Ọma 34:1.

20 Ọzọkwa, ọrụ ahụ adịghị akwụsịlata. Ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze nọgidere na-amụba. A na-etinyewanye oge n’ọrụ nkwusa ahụ. A na-eme ọtụtụ nde nletaghachi ma na-eduzi ọtụtụ narị puku ọmụmụ Bible. Ọtụtụ nọgidekwara na-egosi mmasị. N’afọ gara aga, ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bịara Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs bụ 16,097,622. O doro anya na a ka nwere nnukwu ọrụ a ga-arụ. Ka anyị nọgide na eṅomi iguzosi ike n’ezi ihe nke ụmụnna anyị ndị tachiworo obi ná mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. Ka anyị na-egosikwa ụdị ịnụ ọkụ n’obi ahụ ụmụnna anyị nile ndị nọgidere kemgbe 1919 na-enyefe onwe ha n’ozi Jehova gosiworo. Ka mmadụ nile nọgide na-ekwughachi okwu ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Ihe ọ bụla na-eku ume, ka o too Jaa. Toonụ Jaa!”—Abụ Ọma 150:6.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Lee akụkọ mgbaafọ dị na peeji nke 18 ruo 21 nke magazin a.

^ par. 15 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Olee ọrụ ụmụnna malitere ịrụ na 1919, gịnị mere o ji bụrụ ihe ịma aka?

• Olee ndị a chịkọtara ịkwado ọrụ nkwusa ahụ?

• Olee ihe ndị ozi ala ọzọ na ndị ọzọ na-eje ozi n’ala ọzọ rụzuworo?

• Ihe àmà dị aṅaa ka ị pụrụ ịkpọtụ aha iji gosi na Jehova na-agọzi ọrụ ndị ya taa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Chaatị dị na peeji nke 18-21]

AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 2003 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE

(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)

[Foto ndị dị na peeji nke 14, 15]

Ọgba aghara nke Agha Ụwa nke Abụọ emeghị ka Ndị Kraịst nwee obi abụọ ma à ga-ekwusakwa ozi ọma ahụ

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Mgbawa: Foto Ndị Agha Ụgbọ Mmiri nke U.S.; ndị ọzọ: Foto Ndị Agha Na-ahụ Maka Nchebe Ndị Njem Ụgbọ Mmiri nke U.S.

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

Oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi n’ebo na asụsụ nile pụta