Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Mmadụ Nile Kpọsaa Ebube Jehova

Ka Mmadụ Nile Kpọsaa Ebube Jehova

 Ka Mmadụ Nile Kpọsaa Ebube Jehova

“Kwuonụ na Jehova dị ebube, dịkwa ike. Nyenụ Jehova otuto dịịrị aha ya.”—ABỤ ỌMA 96:7, 8, NW.

1, 2. Olee ihe ndị na-enye Jehova otuto, oleekwa ndị a gbara ume isonye?

DEVID, nwa Jesi, tolitere dị ka nwata nwoke na-azụ atụrụ n’ógbè Betlehem. Lee ka ọ na-aghaghị isiwo kirie ọtụtụ mgbe eluigwe sara mbara nke kpakpando jupụtara n’abalị dị jụụ mgbe ọ na-elekọta ìgwè atụrụ nna ya n’ebe ndị ahụ dara owu atụrụ na-ata nri! Obi abụọ adịghị ya na ihe ndị ahụ ọ hụrụ gbatara ya n’uche mgbe o ji ike mmụọ nsọ Chineke rọọ ma bụọ abụ ahụ mara mma dị n’Abụ Ọma nke 19, sị: “Eluigwe na-akpọsa ebube Chineke; mbara ígwé na-akọkwa banyere ọrụ aka ya. Eriri ha ji atụ ihe agazuwo n’ime ụwa dum, olu okwu ha eruwokwa ná nsọtụ elu ala.”—Abụ Ọma 19:1, 4, NW.

2 N’ejighị okwu ọnụ, n’ekwughị okwu, n’ejighị olu, eluigwe dị ebube Jehova kere eke na-akpọsa ebube ya, site n’otu ụbọchị ruo ụbọchị ọzọ, site n’otu abalị ruo abalị ọzọ. Ihe e kere eke na-akpọsa ebube Chineke n’akwụsịghị akwụsị, ịtụle ihe akaebe a na-adịghị ekwu okwu nke ndị nile bi n’ime “ụwa dum” na-ahụ na-eme ka anyị dị umeala n’obi. Otú ọ dị, àmà ihe e kere eke na-agba n’ekwughị okwu ezughị. A gbara ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ume ka ha jiri olu na-ada ụda sonye. Otu ọbụ abụ a na-akpọghị aha gwara ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ofufe okwu ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ, sị: “Kwuonụ na Jehova dị ebube, dịkwa ike. Nyenụ Jehova otuto dịịrị aha Ya.” (Abụ Ọma 96:7, 8, NW) Ndị ha na Jehova nwere mmekọrịta chiri anya na-enwe obi ụtọ imeghachi omume n’agbamume ahụ. Otú ọ dị, gịnị ka inye Chineke otuto gụnyere?

3. N’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ ji enye Chineke otuto?

3 A chọrọ ihe karịrị okwu ọnụ nkịtị. Ndị Izrel nke oge Aịzaia ji egbugbere ọnụ ha too Chineke, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha enweghị ọnọdụ obi ziri ezi. Site n’ọnụ Aịzaịa, Jehova kwuru, sị: “N’ihi na ndị nke a abịaruwo nso n’ọnụ ha, werekwa egbugbere ọnụ ha sọpụrụ m, ma ha emewo ka obi ha dị anya n’ebe M nọ.” (Aịsaịa 29:13) Otuto ọ bụla ndị dị otú ahụ nyere abaghị uru. Ka otuto wee bụrụ nke bara uru, ọ ghaghị isite n’obi nke jupụtara n’ịhụnanya  maka Jehova, sitekwa n’iji obi dum ghọta na ọ dị ebube n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ nanị Jehova bụ Onye Okike. Ọ bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, Onye Ikpe Ziri Ezi, bụrụ ịhụnanya n’onwe ya. Ọ bụ onye nzọpụta anyị sitere n’aka ya, bụrụkwa onye o ruuru ịbụ Eze, onye onye ọ bụla nọ n’eluigwe na n’ụwa ji ụgwọ ido onwe ya n’okpuru Ya. (Mkpughe 4:11; 19:1) Ọ bụrụ n’ezie na anyị kweere ihe ndị a, ka anyị jiri obi anyị dum na–eto ya.

4. Olee ntụziaka ndị Jizọs nyere banyere otú e si eto Chineke, oleekwa otú anyị pụrụ isi mezuo ha?

4 Jizọs Kraịst gwara anyị otú e si eto Chineke. O kwuru, sị: “A na-enye Nna m otuto na nke a, na unu nọgidere na-amị mkpụrụ dị ukwuu ma na-egosipụta na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 15:8) Olee otú anyị si amị mkpụrụ dị ukwuu? Nke mbụ, site n’iji obi anyị dum na-ekere òkè n’ikwusa ‘ozi ọma nke alaeze ahụ,’ sikwa otú ahụ na-esonyere ihe nile e kere eke ‘n’ikwu’ banyere ‘àgwà Chineke ndị a na-apụghị ịhụ anya.’ (Matiu 24:14; Ndị Rom 1:20) Ọzọkwa, n’ụzọ dị otú a anyị nile na-ekere òkè—n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtaghị ìhè—n’ime ndị na-eso ụzọ ọhụrụ bụ́ ndị na-eme ka abụ otuto nye Jehova Chineke dasikwuo ụda ike. Nke abụọ, anyị na-azụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ na-amịpụta n’ime anyị ma na-agbalị iṅomi àgwà ndị magburu onwe ha nke Jehova Chineke. (Ndị Galeshia 5:22, 23; Ndị Efesọs 5:1; Ndị Kọlọsi 3:10) N’ihi ya, àgwà anyị kwa ụbọchị na-eto Chineke.

“N’ime Ụwa Dum”

5. Kọwaa otú Pọl si mesie ike ibu ọrụ Ndị Kraịst nwere inye Chineke otuto site n’ịgwa ndị ọzọ ihe ha kweere.

5 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, o mesiri ike ibu ọrụ Ndị Kraịst nwere inye Chineke otuto site n’ịgwa ndị ọzọ ihe ha kweere. Otu isiokwu gbara ọkpụrụkpụ dị n’akwụkwọ Ndị Rom bụ na ọ bụ nanị ndị gosipụtara okwukwe na Jizọs Kraịst ka a ga-azọpụta. N’isi 10 nke akwụkwọ ozi ya, Pọl gosiri na ndị Izrel anụ ahụ́ nke oge ya ka nọgidere na-agbalị inweta nguzo ezi omume site n’ịgbaso Iwu Mozis, n’agbanyeghị na “Kraịst bụ njedebe nke Iwu.” N’ihi ya, Pọl na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị na-akpọsa ‘okwu ahụ n’ọnụ gị,’ na Jizọs bụ Onyenwe anyị, na-egosipụta okwukwe n’obi gị na Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, a ga-azọpụta gị.” Site n’oge ahụ gawa, “ọ [dịbeghị] ọdịiche dị n’etiti onye Juu na onye Grik, n’ihi na e nwere otu Onyenwenụ n’ebe mmadụ nile nọ, bụ́ onye na-enye ndị nile na-akpọku ya ihe n’ụba. N’ihi na ‘onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.’”—Ndị Rom 10:4, 9-13.

6. Olee otú Pọl si jiri Abụ Ọma 19:4 mee ihe?

6 Mgbe ahụ Pọl jụrụ ajụjụ ezi uche dị na ya, sị: “Otú ọ dị, olee otú ha ga-esi kpọkuo onye ha na-etinyebeghị okwukwe na ya? N’aka nke ọzọ, olee otú ha ga-esi tinye okwukwe n’onye ha na-anụbeghị banyere ya? N’aka nke ọzọ, olee otú ha ga-esi anụ ma ọ́ dịghị onye ga-eme nkwusa?” (Ndị Rom 10:14) Pọl na-ekwu banyere Izrel, sị: “Ọ bụghị ha nile rubere isi n’ozi ọma ahụ.” Gịnị mere Izrel na-ejighị rube isi? Erubeghị isi ha bụ n’ihi enweghị okwukwe ọ bụghị n’ihi enweghị ohere. Pọl gosiri nke a site n’ihota ihe dị n’Abụ Ọma 19:4 ma jiri ya mee ihe banyere ọrụ nkwusa Ndị Kraịst kama ịbụ banyere àmà ihe e kere eke na-agba n’ekwughị okwu. Ọ na-ekwu, sị: “N’eziokwu, ‘n’ime ụwa dum ka ụda ha garuru, okwu ha garukwara ná nsọtụ nile nke elu ụwa mmadụ bi.’” (Ndị Rom 10:16, 18) Ee, ọbụna dị ka ihe e kere eke na-adịghị ndụ na-eto Jehova, Ndị Kraịst narị afọ mbụ kwusara ozi ọma nke nzọpụta n’ebe nile, sikwa otú ahụ nye Chineke otuto ‘n’ụwa dum.’ N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọlọsi, Pọl kọwakwara otú ozi ọma ahụ siworo gbasaa. O kwuru na e zisawo ozi ọma  ahụ “n’etiti ihe nile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”—Ndị Kọlọsi 1:23.

Ndịàmà Na-anụ Ọkụ n’Obi

7. Dị ka Jizọs si kwuo, ibu ọrụ dị aṅaa ka Ndị Kraịst nwere?

7 O yiri ka Pọl ò degaara ndị Kọlọsi akwụkwọ ozi ya ihe dị ka afọ 27 Jizọs Kraịst nwụsịrị. Olee otú ọrụ nkwusa ahụ pụrụ isiwo gbasaruo ebe dị anya dị ka Kọlọsi n’oge dị mkpirikpi otú ahụ? O mere n’ihi na Ndị Kraịst narị afọ mbụ bụ ndị na-anụ ọkụ n’obi, Jehova gozikwara ịnụ ọkụ n’obi ha. Jizọs buru n’amụma na ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike mgbe ọ sịrị: “A ghaghị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ ná mba nile.” (Mak 13:10) Jizọs gbakwụnyere iwu a e dekọrọ n’amaokwu ndị ikpeazu nke Oziọma Matiu n’amụma ahụ: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Oge na-adịghị anya Jizọs rigosịrị n’eluigwe, ụmụazu ya malitere imezu okwu ndị ahụ.

8, 9. Dị ka e dekọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, olee otú Ndị Kraịst si meghachi omume n’iwu ndị Jizọs nyere?

8 Ka a wụsachara ha mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A., ihe mbụ ụmụazụ Jizọs na-eguzosi ike n’ihe mere bụ ịpụ gaa mee nkwusa, na-agwa ìgwè mmadụ ndị nọ na Jeruselem “banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.” Ọrụ nkwusa ha dị nnọọ irè, e mekwara “ihe dị ka puku mkpụrụ obi atọ” baptizim. Ndị na-eso ụzọ ahụ nọgidere na-enye Chineke otuto n’ihu ọha na n’ịnụ ọkụ n’obi, bụ́ nke rụpụtara ihe ndị dị mma.—Ọrụ 2:4, 11, 41, 46, 47.

9 N’oge na-adịghị anya, ndị ndú okpukpe bịara chọpụta ọrụ Ndị Kraịst ahụ na-arụ. N’ịbụ ndị ezoghị ọnụ Pita na Jọn nyere nsogbu n’obi, ha nyere ndịozi abụọ ahụ iwu ka ha kwụsị ime nkwusa. Ndịozi ahụ zaghachiri, sị: “Anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụworo ma nụ.” Mgbe e yisịrị ha egwu ma tọhapụ ha, Pita na Jọn laghachikwuuru ụmụnna ha, ha nile jikọkwara ọnụ n’ekpere nye Jehova. Ha ji obi ike wee rịọ Jehova, sị: “Nyekwa ndị ohu gị ikike ịnọgide na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.”—Ọrụ 4:13, 20, 29.

10. Mmegide dị aṅaa malitere ịpụta ìhè, oleekwa otú ezi Ndị Kraịst si meghachi omume?

10 N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, ọ bịara doo anya na ekpere ahụ kwekọrọ n’uche Jehova. E jidere ndịozi ahụ, mgbe ahụkwa mmụọ ozi tọhapụrụ ha n’ụzọ ọrụ ebube. Mmụọ ozi ahụ gwara ha, sị: “Gawanụ, mgbe unu guzowokwara n’ụlọ nsọ, nọgidenụ na-agwa ndị  mmadụ okwu nile metụtara ndụ a.” (Ọrụ 5:18-20) N’ihi na ndịozi ahụ rubere isi, Jehova nọgidere na-agọzi ha. N’ihi ya, “kwa ụbọchị kwa, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.” (Ọrụ 5:42) O doro anya na mmegide siri ike akwụsịlighị ụmụazụ Jizọs inye Chineke otuto n’ihu ọha.

11. Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si lee ọrụ nkwusa ahụ anya?

11 N’oge na-adịghị anya, e jidere Stivin ma tụgbuo ya na nkume. Ogbugbu ya kpaliri mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ na Jeruselem, a manyekwara ndị nile na-eso ụzọ ịgbasasị ma e wezụga ndịozi. Mkpagbu ahụ ò mere ka ha daa mbà n’obi? Ọ dịghị ma ọli. Anyị na-agụ, sị: “Ndị ahụ a chụsasịworo gazuru ala ahụ na-akpọsa ozi ọma banyere okwu ahụ.” (Ọrụ 8:1, 4) A hụrụ ugboro ugboro ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ maka ịkpọsa ebube Chineke. N’Ọrụ isi 9, anyị na-agụ na mgbe onye Farisii bụ́ Sọl onye Tasọs na-aga Damaskọs iji malite ịkpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’ebe ahụ, ọ hụrụ ọhụụ nke Jizọs, e meekwa ka o kpuo ìsì. Na Damaskọs, Ananaịas gwọrọ Sọl ìsì ya n’ụzọ ọrụ ebube. Gịnị bụ ihe mbụ Sọl—onye e mesịrị mara dị ka Pọl onyeozi—mere? Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Ozugbo ahụkwa n’ụlọ nzukọ, ọ malitere ikwusa Jizọs, na Onye a bụ Ọkpara Chineke.”—Ọrụ 9:20.

Mmadụ Nile Keere Òkè n’Ime Nkwusa

12, 13. (a) Dị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, gịnị bụ ihe dị ịrịba ama banyere Ndị Kraịst oge mbụ? (b) Olee otú akwụkwọ Ọrụ Ndịozi na okwu Pọl si kwekọọ n’ihe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru?

12 Ọ bụ ihe a nakweere n’ebe nile na onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ keere òkè n’ọrụ nkwusa. Banyere Ndị Kraịst oge ahụ, Philip Schaff dere, sị: “Ọgbakọ ọ bụla bụ òtù ndị na-eje ozi, Onye Kraịst ọ bụla kwere ekwe bụ onye na-ekwusa ozi ọma.” (History of the Christian Church) W. S. Williams na-ekwu, sị: “Ihe àmà zuru ebe nile bụ na Ndị Kraịst nile nke Chọọchị mbụ ahụ, karịsia ndị nwere onyinye pụrụ iche [onyinye nke mmụọ nsọ], kwusara oziọma.” (The Glorious Ministry of the Laity) O kwusikwara ike, sị: “Ọ dịghị mgbe Jizọs Kraịst bu n’uche ka ime nkwusa bụrụ ọrụ dịịrị nanị ndị nọ n’ọkwá ụfọdụ nke ozi ahụ.” Ọbụna Celsus, onye bụ́ onye iro Ndị Kraịst n’oge ochie, dere sị: “Ndị na-aghọ ogho, ndị na-edozi akpụkpọ ụkwu, ndị na-esiji akpụkpọ anụ, ndị kasị bụrụ iti na ndị nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke oziọma ahụ.”

13 Akụkọ ihe mere eme e dekọrọ n’akwụkwọ Ọru Ndịozi na-egosi izi ezi nke okwu ndị ahụ. Ka a wụsachara ha mmụọ nsọ na Pentikọst 33 O.A., ndị na-eso ụzọ nile, ma ndị nwoke ma ndị nwanyị, kwusara ihe ndị dị ebube nke Chineke n’ihu ọha. Ka mkpagbu sochiri ogbugbu Stivin gasịrị, Ndị Kraịst nile ndị gbasasịrị ná mba ndị ọzọ gbasara ozi ọma ahụ n’ebe nile. Ihe dị ka afọ 28 ka e mesịrị, Pọl na-edegara Ndị Kraịst nile bụ́ ndị Hibru akwụkwọ ozi, ọ bụghị nanị òtù ndị ụkọchukwu, mgbe o kwuru, sị: “Ka anyị site na ya chụọrọ Chineke àjà otuto mgbe nile, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.” (Ndị Hibru 13:15) N’ịkọwa otú ya onwe ya si ele ọrụ nkwusa ahụ anya, Pọl kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na m na-akpọsa ozi ọma, ọ bụghị ihe mere m ga-eji na-anya isi, n’ihi na e mewo ka m nwee mkpa. N’ezie, ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na akpọsaghị m ozi ọma!” (1 Ndị Kọrint 9:16) O doro anya na Ndị Kraịst nile kwesịrị ntụkwasị obi na narị afọ mbụ nwere otu echiche ahụ.

14. Gịnị jikọrọ okwukwe na ime nkwusa?

14 N’ezie, ezi Onye Kraịst aghaghị ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ n’ihi na ya na okwukwe nwere njikọ chiri anya. Pọl kwuru, sị: “Mmadụ na-eji obi egosipụta okwukwe maka ezi omume, ma ọnụ ka mmadụ na-eji eme nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta.” (Ndị Rom 10:10) Ọ̀ bụ nanị otu ìgwè dị nta nọ n’ime ọgbakọ—dị ka òtù ndị ụkọchukwu—na-egosipụta okwukwe ma si otú ahụ bụrụ ndị nwere ibu ọrụ nke ime nkwusa? Ọ dịghị ma  ọlị! Ezi Ndị Kraịst nile na-azụlite okwukwe dị ndụ n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ma bụrụ ndị a kpaliri ikwupụtara ndị ọzọ okwukwe ahụ n’ihu ọha. Ma ọ́ bụghị ya, okwukwe ha nwụrụ anwụ. (Jems 2:26) N’ihi na Ndị Kraịst nile na-eguzosi ike n’ihe nke narị afọ mbụ nke Oge Anyị gosipụtara okwukwe ha n’ụzọ dị otú a, a nụrụ oké mkpu nke otuto nye aha Jehova.

15, 16. Nye ihe atụ ndị na-egosi na ọrụ nkwusa gara n’ihu n’agbanyeghị nsogbu.

15 Na narị afọ mbụ, Jehova gọziri ndị ya site n’ime ka ha mụbaa n’agbanyeghị nsogbu ndị dị ma n’ime ọgbakọ ma n’èzí. Dị ka ihe atụ, n’Ọrụ isi 6, e dekọrọ esemokwu dị n’etiti ndị na-asụ asụsụ Hibru na ndị na-asụ asụsụ Grik bụ́ ndị a tọghatara ọhụrụ. Ndịozi doziri nsogbu ahụ. N’ihi ya, anyị na-agụ, sị: “Okwu Chineke nọgidere na-eto eto, ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ na-eso ụzọ nọgidekwara na-amụba nke ukwuu na Jeruselem; oké ìgwè ndị nchụàjà malitekwara irube isi n’okwukwe ahụ.”—Ọrụ 6:7.

16 Mgbe e mesịrị, esemokwu ọchịchị bilitere n’etiti Eze Herọd Agrịpa nke Judia na ndị Taịa na Saịdọn. Ndị bi n’obodo ndị ahụ rịọrọ Herọd arịrịọ udo ndị mere ka isi buo ya, n’ịzaghachikwa ha, o kwuru okwu n’ihu ọha. Ìgwè mmadụ ahụ zukọtaranụ malitere iti mkpu, na-asị: “Ọ bụ olu chi, ọ bụghịkwa nke mmadụ!” Ozugbo ahụ, mmụọ ozi Jehova tiri Herọd Agrịpa ihe, o wee nwụọ “n’ihi na o nyeghị Chineke otuto.” (Ọrụ 12:20-23) Lee nnọọ ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́ ọ bụụrụ ndị olileanya ha dị n’ebe ndị ọchịchị bụ́ ụmụ mmadụ nọ! (Abụ Ọma 146:3, 4) Otú ọ dị, Ndị Kraịst nọgidere na-eto Jehova. N’ihi ya, “okwu Jehova nọgidere na-eto eto ma na-agbasa” n’agbanyeghị ọnọdụ ọchịchị na-akwụsighị ike.—Ọrụ 12:24.

Mgbe ahụ na Ugbu A

17. Na narị afọ mbụ, gịnị ka ọnụ ọgụgụ mmadụ na-amụba amụba sonyere n’ime?

17 Ee, ọ bụ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eto Jehova Chineke mejụpụtara ọgbakọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ ahụ zuru ụwa ọnụ. Ndị Kraịst nile na-eguzosi ike n’ihe keere òkè n’ịgbasa ozi ọma. Ụfọdụ zutere ndị gere ntị, dịkwa ka Jizọs kwuru, kụziere ha irube isi n’ihe nile o nyere n’iwu. (Matiu 28:19, 20) Ihe si na ya pụta bụ na ọgbakọ ahụ toro, ọtụtụ ndị ọzọkwa bịara sonyere Eze Devid oge ochie n’ịkpọsa ebube Jehova. Ha nile kwughachiri okwu ndị ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́: “M ga-eji obi m nile kelee Gị, Onyenwe anyị Chineke, m ga-asọpụrụkwa aha Gị ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na ebere Gị dị ukwuu n’ahụ́ m.”—Abụ Ọma 86:12, 13.

18. (a) Ọdịiche dị aṅaa ka a chọpụtara n’etiti ọgbakọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ na Krisendọm taa? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

18 N’ihi ihe ndị a, okwu prọfesọ nkà mmụta okpukpe bụ́ Allison A. Trites bụ nke na-akpali echiche. N’iji Krisendọm nke taa tụnyere Iso Ụzọ Kraịst nke narị afọ mbụ, o kwuru, sị: “Uto a na-enwe na chọọchị taa na-abụkarị n’ihi ọmụmụ (mgbe ụmụaka nọ n’ezinụlọ na-aga otu chọọchị kwenyere n’ihe ọ na-akụzi) ma ọ bụ uto n’ihi nkwagharị (mgbe mmadụ si n’otu chọọchị gafee n’ọzọ). Otú ọ dị, n’Ọrụ Ndịozi, uto bụ site ná ntọghata, n’ihi na chọọchị ahụ ka na-amalite ọrụ ya amalite.” Nke ahụ ọ̀ pụtara na ezi Iso Ụzọ Kraịst anaghịzi eto otú Jizọs kwuru na o kwesịrị isi na-eto? Ọ dịghị ma ọli. N’ụzọ nile, ezi Ndị Kraịst taa ka na–anụ ọkụ n’obi n’ịkpọsa ebube Chineke n’ihu ọha dị ka Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ. Anyị ga-ahụ nke a n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị si eto Chineke?

• Olee otú Pọl si jiri Abụ Ọma 19:4 mee ihe?

• Gịnị jikọrọ okwukwe na ime nkwusa?

• Gịnị dị ịrịba ama banyere ọgbakọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Eluigwe na-egosi ebube Jehova n’akwụsịghị akwụsị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike Anglo-Australian Observatory, foto David Malin sere

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ọrụ nkwusa na ekpere nwere njikọ chiri anya