Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jenesis—Akụkụ nke Mbụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jenesis—Akụkụ nke Mbụ

 Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Jenesis—Akụkụ nke Mbụ

“JENESIS” pụtara “mmalite,” ma ọ bụ “ọmụmụ.” Nke a bụ aha kwesịrị ekwesị maka akwụkwọ nke na-akọ otú eluigwe na ala si malite ịdị, otú e si kwadebe ụwa maka ụmụ mmadụ ibi n’ime ya, na otú mmadụ si bịa biri n’ime ya. Mozis dere akwụkwọ a n’ọzara Saịnaị, eleghị anya na-edecha ya na 1513 T.O.A.

Akwụkwọ Jenesis na-akọrọ anyị banyere ụwa nke dị tupu Iju Mmiri ahụ, ihe ndị merenụ ka ụwa nke e nwere mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị malitere, na otú Jehova Chineke si mesoo Ebreham, Aịzik, Jekọb, na Josef. Isiokwu a ga-atụle isi ihe ndị sitere na Jenesis 1:1–11:9, n’ụzọ bụ́ isi ruo mgbe Jehova malitere imeso nna ochie ahụ bụ́ Ebreham ihe.

ỤWA NKE DỊ TUPU IJU MMIRI AHỤ

(Jenesis 1:1–7:24)

Okwu mmalite nke Jenesis, bụ́ “na mbụ,” na-ezo aka n’ọtụtụ ijeri afọ gara aga. A kọwara ihe mere ‘n’ụbọchị’ isii nke okike, ma ọ bụ oge nke ọrụ okike pụrụ iche, otú mmadụ ga-esi ele ya anya ma a sị na ọ nọ n’ụwa mgbe ahụ. Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke ụbọchị nke isii, Chineke kere mmadụ. Ọ bụ ezie na a tụfuru Paradaịs n’oge na-adịghị anya n’ihi nnupụisi nke mmadụ, Jehova mere ka e nwee olileanya. Amụma mbụ e dekọrọ na Bible na-ekwu banyere otu “mkpụrụ” nke ga-emezi ihe nile mmehie mebiri ma chifịa Setan n’isi.

N’ime narị afọ 16 sochirinụ, Setan nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka mmadụ nile gbakụta Chineke azụ ma e wezụga mmadụ ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi, ndị dị ka Ebel, Ịnọk, na Noa. Dị ka ihe atụ, Ken gburu nwanne ya nwoke na-eme ezi omume bụ́ Ebel. “A malitere ịkpọku aha Jehova,” o doro anya na ọ bụ n’ụzọ nkwulu. N’igosi mmụọ ime ihe ike nke e nwere n’oge ahụ, Lemek rọrọ uri banyere otú o si gbuo otu nwa okorobịa nke o kwuru na ya mere iji chebe onwe ya. Ọnọdụ dịwanyere njọ ka ụmụ Chineke bụ́ ndị mmụọ ozi nupụrụ isi lụụrụ ụmụ ndị inyom dị ka nwunye ma mụta ndị dike na-eme ihe ike a kpọrọ ndị Nefilim. N’agbanyeghị nke ahụ, Noa bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi wuru ụgbọ, jiri obi ike dọọ ndị ọzọ aka ná ntị banyere Iju Mmiri na-abịanụ ma gbanahụ mbibi ọ kpatara, ya na ezinụlọ ya.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:16—Olee otú Chineke pụrụ isiwo mee ka ìhè dị n’ụbọchị nke mbụ ma ọ bụrụ na e meghị ihe ndị na-enye ìhè ruo n’ụbọchị nke anọ? Okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “kpụọ” n’amaokwu nke 16 na okwu bụ́ “kee” nke e ji mee ihe na Jenesis isi 1, amaokwu 1, 21, na 27 abụghị otu ihe. E kere “eluigwe” nke gụnyere ihe ndị na-enye ìhè, ogologo oge ọbụna tupu “ụbọchị mbụ” amalite. Ma ìhè ha eruteghị n’ụwa. N’ụbọchị nke mbụ, ‘ìhè dịrị’ n’ihi na ìhè si n’igwe ojii nwupụta ma rute n’ụwa. Ụwa nke na-agba gburugburu si otú ahụ malite inwe ehihie na abalị. (Jenesis 1:1-3, 5) N’agbanyeghị nke ahụ, a dịghị anọ n’ụwa ahụ ebe ìhè ahụ sitere. Otú ọ dị, n’oge nke anọ nke okike, mgbanwe pụtara ìhè weere ọnọdụ. E mere anyanwụ, ọnwa, na kpakpando ‘inye ìhè  n’ụwa.’ (Jenesis 1:17) “Chineke wee kpụọ” ha n’echiche nke na a pụrụ ịnọzi n’ụwa na-ahụ ha.

3:8Jehova Chineke ọ̀ gwara Adam okwu n’onwe ya? Bible na-ekpughe na mgbe Chineke gwara ụmụ mmadụ okwu, o mere nke ahụ mgbe mgbe site n’ọnụ mmụọ ozi. (Jenesis 16:7-11; 18:1-3, 22-26; 19:1; Ndị Ikpe 2:1-4; 6:11-16, 22; 13:15-22) Ọnụ bụ́ isi na-ekwuru Chineke bụ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, onye a kpọrọ “Okwu ahụ.” (Jọn 1:1) O yikarịrị ka Chineke ò si n’ọnụ “Okwu ahụ” gwa Adam na Iv okwu.—Jenesis 1:26-28; 2:16; 3:8-13.

3:17—N’echiche dị aṅaa ka a bụrụ ala ọnụ, ọ̀ bụkwa ruo ogologo oge hà aṅaa? Ọnụ a bụrụ ala na-apụta na ịkọ ya ga-abụzi nnọọ ihe siri ike. Ihe ala a bụrụ ọnụ, tinyere ogwu na uke ya, rụpụtara metụtara ụmụ Adam nke ukwuu nke na nna Noa, bụ́ Lemek, kwuru banyere “ndọgbu anyị ji aka anyị adọgbu onwe anyị n’ọrụ, bụ́ nke pụtara n’ala Jehova bụworo ọnụ.” (Jenesis 5:29) Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, Jehova gọziri Noa na ụmụ ya, na-ekwupụta nzube Ya ka ha jupụta ụwa. (Jenesis 9:1) O doro anya na e wepụrụ ọnụ ahụ Chineke bụrụ alạ.—Jenesis 13:10.

4:15Olee otú Jehova si “dooro Ken ihe ịrịba ama”? Bible ekwughị na e dere ihe ama ma ọ bụ kanye akara n’ahụ́ Ken n’ụzọ ọ bụla. Eleghị anya ihe ama ahụ na-agụnye iwu siri ike nke ndị ọzọ maara ma na-edebe, bụ́kwa nke e mere iji gbochie ya ịbụ onye e gburu n’ịbọ ọ́bọ̀.

4:17Ebee ka Ken si lụta nwunye ya? Adam wee “mụọ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.” (Jenesis 5:4) Ya mere, Ken lụụrụ otu n’ime ụmụnne ya ndị inyom ma ọ bụ ma eleghị anya otu n’ime ụmụ ndị inyom nke nwanne ya dị ka nwunye. Mgbe e mesịrị, Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel ekweghị ka nwanne na-alụ nwanne.—Levitikọs 18:9.

5:24N’echiche dị aṅaa ka Chineke ‘kuuru Ịnọk’? O doro anya na Ịnọk nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye e gburu, ma Chineke ekweghị ka ọ taa ahụhụ n’aka ndị iro ya. “E wegara Ịnọk ebe ọzọ ka o wee ghara ịhụ ọnwụ,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Hibru 11:5) Nke a apụtaghị na Chineke kuuru ya gaa eluigwe, bụ́ ebe ọ nọgidere na-adị ndụ. Jizọs bụ onye mbụ rịgoro n’eluigwe. (Jọn 3:13; Ndị Hibru 6:19, 20) Ịnọk ịbụ onye ‘e wegara ebe ọzọ ka o wee ghara ịhụ ọnwụ’ pụrụ ịpụta na Chineke mere ka ọ nọrọ n’ọhụụ ma mezie ka ọ nwụọ mgbe ọ ka nọ n’ọnọdụ ahụ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, Ịnọk anụghị ụfụ ọnwụ, ma ọ bụ ‘hụ ọnwụ,’ n’aka ndị iro ya.

6:6N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na Jehova ‘chegharịrị’ na o mere mmadụ? N’ebe a, okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “chegharịa” metụtara ịgbanwe àgwà ma ọ bụ ebumnuche. Jehova zuru okè, n’ihi ya kwa, o hieghị ụzọ n’ike mmadụ. Otú ọ dị, ọ gbanwere echiche ya banyere ọgbọ ajọ omume nke dịrị tupu Iju Mmiri ahụ. Chineke si n’àgwà nke Onye Okike nke mmadụ gaa na nke onye mbibi ha n’ihi mwute o nwere maka ajọ omume ha. Eziokwu ahụ bụ́ na o debere mmadụ ụfọdụ ndụ na-egosi na nchegharị ya bụ nanị n’ebe ndị ahụ na-eme ajọ omume nọ.—2 Pita 2:5, 9.

7:2Gịnị ka e ji mee ihe ndabere maka ikpebi anụmanụ dị ọcha na nke na-adịghị ọcha? Ihe ama na-egosi na ihe e ji kpebie ya metụtara ịchụ àjà n’ofufe ọ bụghị ihe a pụrụ iri eri na nke a na-apụghị iri eri. Anụ esoghị n’ihe oriri mmadụ tupu Iju Mmiri ahụ. A malitere iji okwu ahụ bụ́ “ịdị ọcha” na “adịghị ọcha” eme ihe n’ihe metụtara ihe oriri nanị n’oge Iwu Mozis, ha bịakwara ná njedebe mgbe a kagburu ya. (Ọrụ 10:9-16; Ndị Efesọs 2:15) O doro anya na Noa maara anụmanụ kwesịrị ekwesị maka ịchụàjà n’ofufe Jehova. Ozugbo o si n’ụgbọ ahụ pụta, o “wee  wuoro Jehova ebe ịchụàjà, were ụfọdụ n’ime anụ ụlọ nile ọ bụla dị ọcha na n’ime anụ ufe nile ọ bụla dị ọcha, suree àjà nsure ọkụ n’ebe ịchụàjà ahụ.”—Jenesis 8:20.

7:11Ebee ka mmiri nke kpatara Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ sitere? N’oge, ma ọ bụ “ụbọchị,” nke abụọ nke okike, mgbe e mere “mbara” ụwa, e nwere mmiri “n’okpuru mbara ahụ” nakwa mmiri “n’elu mbara ahụ.” (Jenesis 1:6, 7) Mmiri ndị dị “n’okpuru” bụ mmiri ndị dịbu adị n’ụwa. Mmiri ndị dị “n’elu” bụ mmiri buru nnọọ ibu nke dị n’elu mbara ahụ, nke ghọrọ “oké ogbu mmiri.” Mmiri a zoro n’ụwa n’ụbọchị Noa.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:26. N’ịbụ ndị e mere n’oyiyi Chineke, ụmụ mmadụ nwere ikike nke igosipụta àgwà dị iche iche nke Chineke. N’ezie, anyị kwesịrị ịgbalị ịzụlite àgwà ndị dị ka ịhụnanya, ebere, obiọma, ịdị mma, na ndidi, na-eṅomi Onye ahụ nke mere anyị.

2:22-24. Alụmdi na nwunye bụ ndokwa Chineke mere. Nkekọ alụmdi na nwunye bụ ihe ga-adịgide adịgide na ihe dị nsọ, nke di ga-abụ onyeisi ezinụlọ na ya.

3:1-5, 16-23. Obi ụtọ na-adabere n’anyị ịnakwere ọbụbụeze Jehova ná ndụ anyị.

3:18, 19; 5:5; 6:7; 7:23. Okwu Jehova na-emezu mgbe nile.

4:3-7. Àjà Ebel masịrị Jehova n’ihi na ọ bụ onye ezi omume nke nwere okwukwe. (Ndị Hibru 11:4) N’aka nke ọzọ, dị ka omume ya gosipụtara, Ken enweghị okwukwe. Ọrụ ya jọrọ njọ, jupụta n’ekworo, ịkpọasị, na igbu ọchụ. (1 Jọn 3:12) Ọzọkwa, eleghị anya o chebaraghị àjà ya echiche ma chụọ ya nanị iji mezuo iwu. Ọ̀ bụ na àjà otuto anyị nye Jehova ekwesịghị isite n’obi dum, bụrụkwa nke ya na ezi àgwà na-agakọ?

6:22. Ọ bụ ezie na o were ọtụtụ afọ iji wuo ụgbọ ahụ, Noa mere kpọmkwem ihe Chineke nyere n’iwu. N’ihi ya, e chebere Noa na ezinụlọ ya gabiga Iju Mmiri ahụ. Jehova na-agwa anyị okwu site n’Okwu ya e dere ede ma na-enye ntụziaka site ná nzukọ ya. Ọ ga-abara anyị uru ige ntị na irube isi.

7:21-24. Jehova adịghị ebibikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume.

IHE A KPỌRỌ MMADỤ ABANYE ỌGBỌ ỌHỤRỤ

(Jenesis 8:1–11:9)

Ka ụwa nke dị tupu Iju Mmiri ahụ gabigasịworo, ihe a kpọrọ mmadụ banyere ọgbọ ọhụrụ. E nyere ụmụ mmadụ ikike iri anụ ma e nyere ha iwu izere ọbara. Jehova kwupụtara amamikpe ọnwụ maka onye gburu ọchụ, ọ gbakwara ọgbụgba ndụ eke na ogwurugwu, na-ekwe nkwa na ya agaghị eweta Iju Mmiri ọzọ. Ụmụ atọ Noa ghọrọ ndị nna ochie nke agbụrụ mmadụ dum, ma nwa nwa ya bụ́ Nimrọd ghọrọ “dike n’ịchụ nta n’ihu Jehova.” Kama ịgbasapụ iji mejupụta ụwa, ụmụ mmadụ kpebiri iwu otu obodo aha ya bụ Bebel na ụlọ elu iji meere onwe ha aha. E mebiri ebumnuche ha mgbe Jehova ghagburu asụsụ ha ma chụsasịa ha n’ụwa dum.

 A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

8:11—Ọ bụrụ na Iju Mmiri ahụ bibiri osisi nile, ebee ka nduru ahụ kụbitere akwụkwọ osisi oliv? E nwere ihe abụọ pụrụ imewonụ. Ebe ọ bụ na oliv bụ osisi siri nnọọ ike, ọ pụrụ ịbụ na ọ nọgidere na-adị ndụ n’okpuru mmiri ahụ ruo ọnwa ụfọdụ n’oge Iju Mmiri ahụ. Ka mmiri ahụ na-atalata, osisi oliv nke nọworo n’okpuru mmiri ga-adịzi n’ala akọrọ ma nwee ike ipupụta akwụkwọ. Akwụkwọ oliv nke nduru ahụ wegaara Noa pụkwara ịbụ nke ka pupụtara ọhụrụ mgbe mmiri ahụ tasịrị.

9:20-25N’ihi gịnị ka Noa ji bụọ Kenan ọnụ? O yikarịrị nnọọ ka Kenan ò mejọrọ ma ọ bụ lelịa nna nna ya bụ́ Noa n’ụzọ na-asọ oyi. Ọ bụ ezie na nna Kenan, bụ́ Ham hụrụ nke a, o gbochighị ya kama o yiri ka ọ̀ gbasara akụkọ ahụ. Otú ọ dị, ụmụ Noa abụọ ndị ọzọ, Shem na Jefet, mere ihe iji kpuchie nna ha. A gọziri ha n’ihi nke a, ma a bụrụ Kenan ọnụ, Ham takwara ahụhụ n’ihi ihere nke bịakwasịrị mkpụrụ ya.

10:25È si aṅaa ‘kewaa’ ụwa n’ụbọchị Peleg? Peleg dịrị ndụ site na 2269 ruo 2030 T.O.A. Ọ bụ “n’ụbọchị ya” ka Jehova mere ka e nwee oké nkewa site n’ịghagbu asụsụ nke ndị na-ewu Bebel ma chụsasịa ha n’elu ụwa dum. (Jenesis 11:9) N’ihi ya, “e kewara ụwa [ma ọ bụ, ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa]” n’ụbọchị Peleg.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

9:1; 11:9. Ọ dịghị atụmatụ ma ọ bụ mgbalị mmadụ ọ bụla nke pụrụ imebi nzube Jehova.

10:1-32. Ihe ndekọ abụọ nke usoro ọmụmụ nke gbara ihe ndekọ Iju Mmiri ahụ gburugburu—isi 5 na nke 10—jikọrọ agbụrụ mmadụ nile gaa n’Adam, site n’ụmụ Noa atọ. Ndị Asiria, ndị Kaldia, ndị Hibru, ndị Siria, na ụfọdụ agbụrụ ndị Arebia, bụ ụmụ Shem. Ndị Etiopia, ndị Ijipt, ndị Kenan, na ụfọdụ ndị agbụrụ Africa na Arebia sitere na Ham. Ndị Europe si India bụ ụmụ Jefet. Ụmụ mmadụ nile nwere ihe jikọtara ha, a mụkwara ha nile dị ka ndị ha nhata n’ihu Chineke. (Ọrụ 17:26) Eziokwu a kwesịrị imetụta otú anyị si ele ndị ọzọ anya na otú anyị si emeso ha ihe.

Okwu Chineke Pụrụ Ịkpa Ike

Ihe dị n’akụkụ nke mbụ nke akwụkwọ Jenesis bụ nanị ihe ndekọ ziri ezi nke mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Na peeji ndị a, anyị na-aghọta nzube Chineke ji debe mmadụ n’ụwa. Lee ka o si bụrụ ihe na-emesi obi ike ịhụ na ọ dịghị mgbalị ọ bụla nke mmadụ, dị ka nke Nimrọd, pụrụ igbochi mmezu ya!

Ka ị na-enwe ọgụgụ Bible dịịrị izu n’ịkwadebe maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ịtụle ihe e kwuru n’okpuru nkebi bụ́ “A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ” ga-enyere gị aka ịghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ siri ike. Ihe ndị e dere n’okpuru isiokwu bụ́ “Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị” ga-egosi gị otú ị pụrụ isi rite uru site n’ọgụgụ Bible dịịrị izu. Mgbe o kwesịrị ekwesị, a pụrụ iji ha kwadebe mkpa ọgbakọ ná Nzukọ Ije Ozi. Okwu Jehova dị ndụ n’ezie, ọ pụkwara ịkpa ike ná ndụ anyị.—Ndị Hibru 4:12.