Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Gọziri Anyị n’Ụba Maka Ịnọgide Na-enwe Mmụọ Ozi Ala Ọzọ

A Gọziri Anyị n’Ụba Maka Ịnọgide Na-enwe Mmụọ Ozi Ala Ọzọ

 Akụkọ Ndụ

A Gọziri Anyị n’Ụba Maka Ịnọgide Na-enwe Mmụọ Ozi Ala Ọzọ

Ị KA TOM COOKE SI KỌỌ

Ụda égbè kpaghasịrị ịdị jụụ e nwere n’ehihie na mberede. Mgbọ égbè nọ na-efefesị n’osisi ndị dị n’ubi anyị. Gịnị na-eme? N’oge na-adịghị anya, anyị chọpụtara na a kwatuola ọchịchị nakwa na Uganda nọzi n’okpuru ọchịchị Ọchịagha Idi Amin. Ọ bụ na 1971.

N’IHI gịnị ka mụ na nwunye m, bụ́ Ann, ji hapụ England dị n’udo ma bịa n’akụkụ a dị ize ndụ nke Africa? Echere m na m na-enwetụ mmasị ịnwale ihe ndị dị ize ndụ, ma, ọ bụ ihe nlereanya ndị mụrụ m nke iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi Alaeze ahụ bụ isi ihe kụnyere mmụọ ozi ala ọzọ n’ime m.

Ana m echeta otu ụbọchị okpomọkụ n’August 1946 mgbe ndị mụrụ m zutere Ndịàmà Jehova nke mbụ ya. Ha kwụụrụ n’ọnụ ụzọ ma soro ndị ọbịa abụọ kwurịta okwu ruo ihe yiri ọtụtụ awa. Ndị ọbịa a, Fraser Bradbury na Mamie Shreve, bịaghachiri ọtụtụ ugboro, n’ọnwa ndị sochikwaranụ, ndụ ezinụlọ anyị gbanwere n’ụzọ dị ịrịba ama.

Ihe Nlereanya Obi Ike nke Ndị Mụrụ M

Ndị mụrụ m tinyere aka n’ọtụtụ ihe omume obodo. Dị ka ihe atụ, nwa oge tupu ha amalite ịmụ Bible, e ji ihe osise ndị iche iche nke Winston Churchill chọọ ụlọ anyị mma. Ná ntụli aka e mere mgbe agha bisịrị, e ji ụlọ anyị mere ebe òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Conservative Party Committee nke dị n’ógbè anyị na-ezukọ. Ezinụlọ anyị makwaara ọtụtụ ndị a ma ama n’okpukpe na n’obodo. Ọ bụ ezie na m dị nanị  afọ itoolu mgbe ahụ, achọpụtara m akpata oyi wụrụ ndị ikwu anyị n’ahụ́ mgbe ha chọpụtara na anyị na-aghọ Ndịàmà Jehova.

Ihe nlereanya nke iji obi dum eje ozi na nke atụghị egwu nke Ndịàmà anyị na ha na-akpakọrịta kpaliri ndị mụrụ m ịrụsi ọrụ ike n’ọrụ nkwusa. N’oge na-adịghị anya, papa m malitere iji ígwè okwu na-ekwu okwu ihu ọha ná nnukwu ógbè azụmahịa nke Spondon, bụ́ obodo anyị, ebe anyị bụ́ ụmụaka na-anọ n’ebe ndị a ga-ahụ anyị nke ọma na-eche Ụlọ Nche na Teta! n’ihu ndị mmadụ. Aghaghị m ikweta na mgbe ụmụaka ndị mụ na ha na-agakọ akwụkwọ rutere m nso, ọ na-adị m ka m mie ala.

Ihe nlereanya nke ndị mụrụ m gbara nwanne m nwanyị nke tọrọ m, bụ́ Daphne, ume ịmalite ịsụ ụzọ. Na 1955, ọ gara Watchtower Bible School of Gilead, e kenyekwa ya ọrụ dị ka onye ozi ala ọzọ na Japan. * Otú ọ dị, nwanne m nwanyị nke m tọrọ, bụ́ Zoe, kwụsịrị ijere Jehova ozi.

Ka ọ dịgodị, agụsịrị m akwụkwọ site n’ịmụ otú e si ahazi ihe osise n’akwụkwọ na otú e si ese ihe. N’oge ndị ahụ, ihe ụmụ akwụkwọ ibe m nile na-ekwu banyere ya bụ ije ozi agha ná mmanye. Mgbe m gwara ha na m gaghị eje n’ihi akọ na uche m, ha chere na m na-egwu egwu. Nke a nyere m ohere iso ụfọdụ ụmụ akwụkwọ nwee ọtụtụ nkwurịta okwu ndị dabeere na Bible. N’oge na-adịghị anya, a mara m ikpe ịga mkpọrọ ọnwa 12 maka ịjụ ije ozi agha. Otu n’ime ụmụ akwụkwọ kọleji ahụ na-akụzi ise ihe bụ́ onye gosiri mmasị n’ozi Bible mesịrị ghọọ nwunye m. Ma m ga-ahapụ Ann ka ọ kọọrọ gị otú o si nata eziokwu ahụ.

Otú Ann Si Nata Eziokwu Ahụ

“Ezinụlọ m ejighị okpukpe kpọrọ ihe, e meghịkwa m baptizim n’okpukpe ọ bụla. Ma m chọsiri ike ịmata ihe banyere okpukpe ma gaa chọọchị ọ bụla ndị enyi m na-aga. A kpaliri mmasị m na Bible mgbe m nụrụ nkwurịta okwu kporo ọkụ nke Tom na Onyeàmà ọzọ so ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ nwee na kọleji anyị. Ọ wụrụ m akpata oyi n’ahụ́ mgbe a tụrụ Tom na Onyeàmà nke ọzọ ahụ mkpọro n’ihi ịjụ ije ozi agha.

“Anọgidere m na-edegara Tom akwụkwọ ozi mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, mmasị m nwekwara na Bible mikwuru emi. Mgbe m kwagara London iji gaa n’ihu n’agụmakwụkwọ m, ekwere m iso Muriel Albrecht na-amụ Bible. Muriel ejewo ozi dị ka onye ozi ala ọzọ n’Estonia, ma ya ma mama ya bụụrụ m nnukwu isi iyi nke agbamume. N’ime izu ole na ole, amalitere m ịga nzukọ na iguzo n’ihu Ọdụ Ụgbọ Okporo Ígwè Victoria na-enyefe Ụlọ Nche na Teta!

“Eso m Ọgbakọ Southwark dị n’ebe ndịda London na-amụ ihe. Ihe mejupụtara ya bụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe bụ́ ndị si ná mba dịgasị iche iche, ndị ọtụtụ n’ime ha nwere ihe onwunwe dị nnọọ nta. Ọ bụ ezie na abụ m onye ọhụrụ, ha mesoro m ihe dị ka onye nke ha. Ọ bụ ịhụnanya dị n’ọgbakọ ahụ mere n’ezie ka m kwenye na nke a bụ eziokwu ahụ, e mekwara m baptizim na 1960.”

Otu Ihe Mgbaru Ọsọ—Ọnọdụ Dịgasị Iche

Mụ na Ann lụrụ ná ngwụsị afọ 1960, anyị nwekwara ihe mgbaru ọsọ nke ịbanye n’ozi ala ọzọ. Ma ọnọdụ anyị gbanwere mgbe anyị chọpụtara na anyị na-atụ anya nwa ọhụrụ. Mgbe a  mụsịrị nwa anyị nwanyị bụ́ Sara, mụ na Ann ka nwere ọchịchọ ije ozi ná mba ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Etinyere m akwụkwọ n’ọtụtụ mba iji nweta ọrụ, n’ikpeazụkwa, na May 1966, enwetara m akwụkwọ ozi sitere n’Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Agụmakwụkwọ na Uganda nke na-egosi na enwetawo m ọrụ. Otú ọ dị, n’oge a, Ann dị ime nwa anyị nke abụọ. Ụfọdụ lere ya anya dị ka ihe amamihe na-adịghị na ya ichedị n’echiche ịkwaga n’ebe ahụ. Anyị kpọtụụrụ dọkịta anyị, bụ́ onye kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu na-aga, unu aghaghị ịga tupu ime nwunye gị eruo ọnwa asaa.” Ya mere, anyị gawara Uganda ozugbo. N’ihi nke a, ndị mụrụ anyị ahụghị nwa anyị nwanyị nke abụọ, bụ́ Rachel, ruo mgbe ọ gbara afọ abụọ. Ugbu a anyị onwe anyị bụzi ndị nne na nna ochie, anyị na-aghọta nke ọma mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke ndị mụrụ anyị anyị hụrụ n’anya gosipụtara.

Nrute anyị na Uganda na 1966 bụ ma ihe na-akpali akpali ma ihe na-akụda mmụọ. Ka anyị na-arịtu n’ụgbọelu, anyị hụrụ ọmarịcha àgwà dị iche iche. Ha na-egbukepụ nnọọ egbukepụ. Ebe obibi mbụ anyị dịdewere obere obodo bụ́ Iganga, bụ́ nke dị kilomita 50 site na Jinja, bụ́ obodo nke dị n’ebe isi iyi Osimiri Naịl dị. Ndịàmà kasị nọrọ anyị nso bụ otu ìgwè dịpụrụ adịpụ nke dị na Jinja. Ndị ozi ala ọzọ bụ́ Gilbert na Joan Walters na Stephen na Barbara Hardy na-elekọta ìgwè ahụ. Etinyere m akwụkwọ ka a gbanwee ebe ọrụ m gaa na Jinja ka anyị wee nwee ike inyekwuru ìgwè a aka. Obere oge ka a mụsịrị Rachel, anyị kwagara Jinja. N’ebe ahụ, anyị nwere ọṅụ nke iso ntakịrị ìgwè nke Ndịàmà na-ekwesị ntụkwasị obi na-eje ozi ka ọ na-eto ịghọ ọgbakọ nke abụọ e nwere na Uganda.

Ije Ozi Dị Ka Ezinụlọ n’Ubi Ala Ọzọ

Mụ na Ann chere na ọ dịghị ebe ka mma anyị gaara ahọrọ ịnọ zụlite ezinụlọ anyị. Anyị nwere obi ụtọ iso ndị ozi ala ọzọ si mba dị iche iche rụkọọ ọrụ na inyere ọgbakọ ahụ e hiwere ọhụrụ aka ito. Anyị nwere mmasị ná mkpakọrịta nke anyị na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Uganda, bụ́ ndị bịara leta anyị n’ebe obibi anyị ugboro ugboro. Stanley na Esinala Makumba kasị bụụrụ anyị ndị agbamume.

Ma ọ bụghị nanị ụmụnna bụ ndị ọbịa anyị na-enwe, ebe ọ bụ na ọmarịcha ụmụ anụ ọhịa gbara anyị gburugburu. Enyí mmiri na-esi n’Osimiri Naịl apụta n’abalị ma bịaruo nnọọ ụlọ anyị nso. M ka na-echeta nke ọma otu oge eke dị mita isii n’ogologo batara n’ubi anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị na-aga ekiri ụmụ anụ ọhịa site n’ịga n’ogige ụmụ anụmanụ, bụ́ ebe ọdụm na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ na-akpagharị n’enweghị ihe mgbochi.

N’ozi, anyị bụụrụ ndị ógbè ahụ ihe nlere,  bụ́ ndị na-ahụtụbeghị ihe e ji akwagharị nwa ọhụrụ. Ka anyị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ìgwè ụmụaka na-esokarị anyị. Ndị mmadụ na-eji nkwanye ùgwù ekiri anyị ma na-emetụ nwa onye ọcha ahụ aka. Ịgba àmà bụ ihe na-enye obi ụtọ n’ihi na ndị ahụ nwere nnọọ omume enyi. Anyị chere na onye ọ bụla ga-abata n’eziokwu ahụ ebe ọ bụ na ọ dị nnọọ mfe ịmalite ọmụmụ Bible. Ma, o siiri ọtụtụ ndị ike ịhapụ omenala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nakweere ụkpụrụ omume dị elu nke Bible, ọnụ ọgụgụ ndị nọ n’ọgbakọ mụbakwara. Mgbakọ sekit mbụ anyị na Jinja na 1968 dị ịrịba ama. Baptizim a nọ n’Osimiri Naịl mee ụfọdụ ndị anyị mụụrụ Bible bụ ihe na-amasịkarị anyị icheta. Ma a na-aga itisasị udo ahụ anyị nwere n’oge na-adịghị anya.

Mmachibido Iwu Ahụ—Ule nke Okwukwe na Ịdị Nkà n’Ichepụta Ihe

Na 1971, Ọchịagha Idi Amin weghaara ọchịchị n’ike. E nwere nnukwu ọgba aghara na Jinja, ọ bụkwa mgbe anyị na-aṅụ tii n’ubi anyị ka ihe ahụ a kọwara ná mmalite mere. N’afọ abụọ sochirinụ, a chụlara ọtụtụ ndị Eshia. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mba ọzọ họọrọ ịla, nke ahụ metụtakwara ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọgwụ n’ụzọ dị njọ. Mgbe ahụ, a mara ọkwa doro anya na a machibidowo Ndịàmà Jehova iwu. N’ihi nchegbu o nwere maka nchebe anyị, Ngalaba Na-ahụ Maka Agụmakwụkwọ kpọgara anyị n’isi obodo ahụ bụ́ Kampala. Nkwapụ a bara uru n’ụzọ abụọ. A maghị anyị nke ọma na Kampala n’ihi ya kwa, anyị nwekwuuru onwe anyị ịgagharị. E nwekwara ọrụ dị ukwuu a ga-arụ n’ọgbakọ na n’ozi ubi.

Brian na Marion Wallace na ụmụ ha abụọ nọ n’ọnọdụ yiri nke anyị, ha kpebikwara ịnọgide na Uganda. Anyị nwere ekele dị ukwuu maka mkpakọrịta anyị na ha ka anyị na-ejekọ ozi n’Ọgbakọ Kampala n’oge a ihe siri ike. Akụkọ ndị anyị gụrụ banyere ụmụnna anyị ndị na-eje ozi n’okpuru mmachibido iwu ná mba ndị ọzọ bịaziri ghọọrọ anyị ihe agbamume pụrụ iche. Anyị na-ezukọ n’obere ìgwè dị iche iche otu ugboro n’ọnwa, anyị nwere mgbakọ ndị buru ibu n’Ubi Mkpụrụ Àkụ̀kụ̀ Entebbe, na-eme ka o yie ka anyị na-enwe nnọkọ ntụrụndụ. Ụmụ anyị nwanyị chere na nke a bụ echiche magburu onwe ya.

Anyị aghaghị ịkpachara anya ụzọ anyị si arụ ọrụ nkwusa. Ndị ọcha ịga n’ebe obibi ndị Uganda gaara abụ nnọọ ihe onye ọ bụla ga-ahụ. N’ihi ya, ụlọ ahịa, na ụlọ ndị nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ na ebe obibi ụlọ akwụkwọ ụfọdụ  ghọrọ ókèala anyị. Otu ụzọ m ji eme ihe n’ụlọ ahịa bụ ịjụ ma è nwere ngwá ahịa nke m maara na ọ dịghịzi, dị ka shuga ma ọ bụ osikapa. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ahịa ahụ egosi mwute n’ihi ihe na-eme ná mba ahụ, m na-amalite izi ya ozi Alaeze ahụ. Ụzọ ime ihe a gara nke ọma. Mgbe mgbe, m na-ahapụ ụlọ ahịa ahụ ọ bụghị nanị na-eburu n’uche ịlaghachi kamakwa, na-eji ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke ngwá ahịa dị ụkọ ala.

Ka ọ dịgodị, ime ihe ike na-etiwapụ gburugburu anyị. N’ihi na mmekọrịta dị n’etiti Uganda na Britain na-akawanye njọ, ndị isi ọrụ m agbatịghị oge ọrụ m. Ya mere, na 1974, mgbe anyị nọsịrị afọ asatọ na Uganda, o ruru anyị n’aka iji mwute sị ụmụnna anyị nọrọ nke ọma. N’agbanyeghị nke ahụ, mmụọ ozi ala ọzọ anyị ajụghị oyi.

Ịga New Guinea

Na January 1975, anyị nwetara ohere ịrụ ọrụ na Papua New Guinea. Ya mere, anyị malitere ozi na-enye obi ụtọ nke were afọ asatọ n’ógbè a dị na Pacific. Mkpakọrịta anyị na ụmụnna na ndụ anyị n’ozi bụ ihe na-eju afọ na nke na-akwụghachi ụgwọ.

Ezinụlọ anyị na-echeta ọnụnọ anyị na Papua New Guinea dị ka oge ihe nkiri—ya bụ, ihe nkiri Bible. Kwa afọ, anyị na-ekere òkè n’ịkwadebe ihe nkiri maka mgbakọ distrikti, nke ahụ nyekwara anyị obi ụtọ! Anyị soro ezinụlọ ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe kpakọrịta, nke a nwekwara mmetụta dị mma n’ahụ́ ụmụ anyị nwanyị. Ada anyị, bụ́ Sara, lụrụ onye ọsụ ụzọ pụrụ iche, bụ́ Ray Smith, ha abụọ jekwara ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe dịdebere ókèala Irian Jaya (ebe bụzi Papua, bụ́ ógbè Indonesia). Ụlọ ha bụ ntakịrị ụlọ e ji ata wuo nke dị n’obodo nta ahụ, Sara kwukwara na oge ya ji jee ozi ahụ bụ ọzụzụ magburu onwe ya nye ya.

Ime Mgbanwe Iji Kwekọọ n’Ọnọdụ Ndị Na-agbanwe Agbanwe

N’oge a, ndị mụrụ m chọkwuru nlekọta. Kama ime ka anyị laghachi England, ndị mụrụ m kwere ịbịa binyere anyị, anyị nile kwagakwara Australia na 1983. Ha binyekwaara nwanne m nwanyị bụ́ Daphne ruo oge ụfọdụ, bụ́ onye bi na Japan. Mgbe ndị mụrụ m nwụsịrị, mụ na Ann kpebiri ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ, nke dujere n’ihe ùgwù nke wetaara m ihe ịma aka.

Ọ dịbeghị anya anyị malitere ịsụ ụzọ mgbe a kpọrọ anyị òkù ịrụ ọrụ sekit. Kemgbe m bụ nwata, anọwo m na-ele nleta onye nlekọta sekit anya dị ka oge pụrụ iche. Ugbu a, abụ m onye nlekọta sekit. Ọ bịara bụrụ ọrụ kasị sie ike anyị rụtụrụla ruo n’oge ahụ ná ndụ anyị, ma ọtụtụ mgbe, Jehova nyeere anyị aka n’ụzọ anyị na-ahụtụbeghị mbụ.

N’oge nleta zoonu nke Nwanna Theodore Jaracz n’Australia na 1990, anyị jụrụ ya ma ò chere na anyị emewo agadi nke ukwuu ịrụ ọrụ oge nile ná mba ọzọ. Ọ sịrị: “Gịnị banyere Solomon Islands?” Ya mere n’ikpeazụ, mgbe mụ na Ann dị afọ 50 na ụma, anyị gara ebe ghọrọ ebe mbụ e kenyere anyị ozi ala ọzọ.

Ije Ozi ‘n’Àgwàetiti Obi Ụtọ’

A maara Solomon Islands dị ka Àgwàetiti Obi Ụtọ, anyị enwewokwa nnọọ obi ụtọ n’ozi  anyị jeworo ebe a kemgbe afọ iri. Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ na Solomon Islands gosiri mụ na Ann obiọma dị nro ka m na-eje ozi dị ka onye nlekọta distrikti. Ọbịa ha lere anyị metụrụ anyị n’ahụ́, onye ọ bụla nagidekwara mgbalị m ịkọwa ihe ụfọdụ n’ihe m chere bụ́ ezigbo Solomon Islands Pidgin—asụsụ nke nwere ihe na-aghaghị ịbụ ìgwè okwu kasị nta n’ụwa.

N’oge na-adịghị anya ka anyị rutesịrị Solomon Islands, ndị mmegide nwara itinye aka n’Ụlọ Mgbakọ anyị ji eme ihe. Chọọchị Anglịkan boro Ndịàmà Jehova ebubo, na-azọrọ na Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ anyị dị na Honiara batara n’ala ha. Ndị ọchịchị nakweere nzọrọ ha, n’ihi ya anyị tinyere akwụkwọ n’Ụlọikpe Dị Elu ka a gbanwee mkpebi ahụ. Ihe ga-esi na nke ahụ pụta ga-ekpebi ma ànyị ga-akwatu Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ anyị nke na-aba mmadụ 1,200.

Okwu ahụ nọrọ otu izu zuru ezu n’ụlọikpe. Ọkàiwu na-ekpegide anyị gosipụtara obi ike ịka anya ka ọ na-ekwu okwu ikpe megide anyị. Mgbe ahụ, site n’iji arụmụka na-eri ọnụ eme ihe, ọkàiwu anyị, bụ́ Nwanna Warren Cathcart bụ́ onye si New Zealand, kpughere ma kagbuo akụkụ nke ọ bụla nke ihe ndị e kwuru megide anyị. Ka ọ na-erule Friday, akụkọ banyere ihe mere n’ụlọikpe ahụ gbasara ruo ebe dị anya, ndị nọ n’ọkwá dị elu na chọọchị, ndị ọchịchị, na ụmụnna anyị Ndị Kraịst jupụtakwara n’ụlọikpe ahụ. Echetara m ihe e dehiere n’ihe e dere n’ebe ịma ọkwa nke ụlọikpe ahụ. Ọ na-agụ, sị: “Ọchịchị Solomon Islands na Chọọchị nke Melanesia megide Jehova.” Anyị meriri.

Otú ọ dị, ịdị jụụ e nwetụrụ n’Àgwàetiti Obi Ụtọ adịgideghị. Ọzọ, mụ na Ann hụtara onwe anyị n’etiti ọgba aghara na ime ihe ike nke ndị agha iweghara ọchịchị n’ike kpatara. Esemokwu agbụrụ dujere n’agha obodo. Na June 5, 2000, a kwaturu ọchịchị, isi obodo ahụ bịakwara nọrọ n’okpuru ndị agha ji ngwá agha. Ruo izu ụfọdụ, Ụlọ Mgbakọ anyị ghọrọ ebe obibi nke ndị si n’ebe obibi ha gbapụ. Ọ tụrụ ndị ọchịchị n’anya na ụmụnna anyị Ndị Kraịst sitere n’agbụrụ ndị na-emegiderịta ibe ha na-ebikọ ọnụ dị ka otu ezinụlọ dị n’udo n’ime Ụlọ Mgbakọ ahụ. Lee ka nke ahụ si gbaa àmà dị mma!

Ọbụna ndị ahụ na-eburịta agha kwanyeere nnọpụiche Ndịàmà Jehova ùgwù. Nke a mere ka o kwe anyị omume ime ka otu n’ime ndị ọchịagha kwe ka a nyara otu ụgbọala bu akwụkwọ na ihe ndị ọzọ gaa n’ebe ntakịrị ìgwè ụmụnna anyị nọ bụ́ ndị nọ n’ógbè ndị agha ha na ha na-eburịta agha. Mgbe anyị hụrụ ezinụlọ ndị e kewapụrụ n’ebe anyị nọ ruo ọnwa ụfọdụ, echeghị m na ọ dị onye n’ime anyị na-ebeghị ákwá.

Ọtụtụ Ihe Anyị Ga-enwe Ekele Maka Ha

N’ịtụgharị uche ná ndụ anyị n’ozi Jehova, anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-enwe ekele maka ha. Dị ka nne na nna, anyị enwewo ngọzi nke ịhụ ka ụmụ anyị nwanyị abụọ na di ha, Ray na John, nọgidere jiri ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi. Ha anọwo na-enye anyị ezi nkwado n’ozi ala ọzọ anyị.

Kemgbe afọ 12, mụ na Ann enwewo ihe ùgwù nke ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Solomon Islands, n’oge ahụkwa, anyị ahụwo ka ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze mụbara okpukpu abụọ, na-eru ihe karịrị 1,800. N’oge na-adịbeghị anya, enwere m ihe ùgwù ọzọ nke ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Patterson, New York. N’ezie, anyị ebiwo ndụ na-eju afọ ma nweta ọtụtụ ngọzi n’ihi ịnọgide na-enwe mmụọ ozi ala ọzọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Lee isiokwu bụ́ “Anyị Eyigharị Ihe” dị n’Ụlọ Nche (Bekee), January 15, 1977.

[Foto dị na peeji nke 23]

N’ụbọchị agbamakwụkwọ anyị, 1960

[Foto dị na peeji nke 24]

Na Uganda, Stanley na Esinala Makumba bụụrụ ezinụlọ anyị isi iyi nke agbamume

[Foto dị na peeji nke 24]

Ka Sara na-abanye n’ụlọ ata nke onye agbata obi anyị

[Foto dị na peeji nke 25]

Ana m ese ihe iji nyere m aka ịkụziri ndị Solomon Islands ihe

[Foto dị na peeji nke 25]

Ná nzukọ anyị so ọgbakọ dịpụrụ adịpụ dị na Solomon Islands nwee

[Foto dị na peeji nke 26]

Ezinụlọ anyị taa