Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọdịdị nke Agha Agbanweela

Ọdịdị nke Agha Agbanweela

 Ọdịdị nke Agha Agbanweela

AGHA anọgidewo na-akpata nhụsianya. Ọ nọgidewo na-ala ndụ ndị agha n’iyi, nọgidekwa na-akpatara ndị nkịtị nhụjuanya. Ma n’ime afọ ndị na-adịbeghị anya, ọdịdị nke agha agbanweela. N’ụzọ dị aṅaa?

Agha ndị a na-alụ taa na-abụkarị agha obodo—agha ndị na-adị n’etiti ụmụ amaala na-emegiderịta onwe ha n’otu mba. Agha obodo na-adịtekarịkwa aka, na-eme ka ndị mmadụ na-enwekwu mkpasasị uche, na-ebibikwa mba n’ụzọ dị njọ karịa agha mba na mba. “Agha obodo bụ ihe obi ọjọọ, nke a na-awụfu ọbara na ya bụ́ nke na-akpata ọnwụ ọtụtụ nde mmadụ, mwakpo n’ụzọ mmekọahụ, ịbụ onye a manyere ije biri ná mba ọzọ, na n’ọnọdụ ndị kasị njọ, mgbukpọ,” ka onye Spen na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Julián Casanova na-ekwu. N’ezie, mgbe ndị agbata obi kpasoro ibe ha arụ, ihe mgbu ya na-ewe ọtụtụ afọ tupu e chefuo ya.

Kemgbe Agha Nzuzo kwụsịrị, ọ bụ agha ole na ole ka e nweworo n’etiti ndị agha nke mba dị iche iche. “Agha nile bụ́ isi e ji ngwá agha lụọ ndị e dekọrọ site na 1990 ruo 2000 bụcha agha ime obodo ma e wezụga atọ,” ka ụlọ ọrụ Stockholm International Peace Research Institute (SIPRI) na-akọ.

N’ezie, agha obodo pụrụ iyi ihe na-adịchaghị ize ndụ ma bụrụ nnọọ nke a na-adịghị akọkarị akụkọ banyere ya n’usoro mgbasa ozi mba nile, ma n’agbanyeghị nke ahụ, ihe mgbu na mbibi agha dị otú ahụ na-akpata na-emebi ihe. Ọtụtụ nde mmadụ anwụwo n’agha obodo. N’ezie, n’iri afọ abụọ gara aga, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ ise nwụrụ nanị ná mba atọ agha tisasịrị—Afghanistan, Democratic Republic of Congo, na Sudan. N’ógbè Balkan, agha agbụrụ kpụ ọkụ n’ọnụ gburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 250,000, agha wekwara ogologo oge nke ndị agha okpuru lụrụ na Colombia gburu 100,000 mmadụ.

Ọ bụ ụmụaka ka agha obodo na-aka akpa aka ọjọọ. Dị ka Kọmishọna Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ si kwuo, n’iri afọ gara aga, ihe karịrị nde ụmụaka abụọ nwụrụ n’agha obodo. E merụrụ nde isii ndị ọzọ ahụ́. A nọwo na-azụ ọnụ ọgụgụ na-amụba amụba nke ụmụaka ịghọ ndị agha. Otu nwatakịrị bụ́ onye agha na-ekwu, sị: “Ha nyere m ọzụzụ. Ha nyere m égbè. Aṅụrụ m ọgwụ ọjọọ. Egburu m ndị nkịtị. Ọtụtụ n’ime ha. Ọ bụ nanị agha . . . Nanị ihe m mere bụ irube isi n’iwu e nyere m. Amaara m na ọ dị njọ. Ọ bụghị ọchịchọ m.”

Ọtụtụ ụmụaka ndị bi ná mba ebe a na-alụkarị agha obodo na-etolite n’amatụghị ihe bụ́ udo. Ha bi n’ụwa ebe e bibisịworo ụlọ akwụkwọ na ebe a na-eji ọnụ égbè ekpe udo. Dunja dị afọ 14 na-ekwu, sị: “E gbuwo ọtụtụ mmadụ . . . Ị pụghịzi ịnụ ube nnụnụ, nanị ihe ị na-anụ bụ olu ụmụaka na-ebe ákwá maka ọnwụ nke nne ha ma ọ bụ nna ha, nwanne ha nwoke ma ọ bụ nwanne ha nwanyị.”

 Olee Ihe Ndị Na-akpata Ya?

Gịnị na-eme ka agha obodo obi ọjọọ ndị dị otú ahụ na-esiwanye ike? Ịkpọasị agbụrụ na nke ebo, esemokwu okpukpe, ikpe na-ezighị ezi na ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị socha n’ihe ndị bụ́ isi na-eme ka ha na-esiwanye ike. Ihe ọzọ bụ́ isi na-akpata ya bụ anyaukwu—anyaukwu maka ikike na anyaukwu maka ego. Ndị ọchịchị, n’ịbụ ndị anyaukwu na-akpalikarị, na-akwalite ịkpọasị nke na-eme ka agha siwanye ike. Akụkọ ụlọ ọrụ SIPRI bipụtara na-ekwu na “ọ bụ uru ha ga-erite na-akpali” ọtụtụ ndị na-etinye aka n’agha ndị e ji ngwá agha alụ. Akụkọ ahụ na-agbakwụnye, sị: “A na-egosipụta anyaukwu n’ọtụtụ ụzọ, site n’ịzụ ahịa daịamọnd nke ndị agha na ndị ọchịchị ruo ná ndị ntorobịa iji égbè akwakọrọ ihe n’ime obodo.”

Inweta ngwá agha ndị na-egbu egbu n’ọnụ ego dị ala na-atụnye ụtụ ná mgbukpọ ahụ. A na-ekwu na ọ bụ ihe a sị na ọ bụ obere ngwá agha na-akpata ọnwụ nke ihe dị ka mmadụ 500,000 kwa afọ—karịsịa ụmụ nwanyị na ụmụaka. N’otu mba Africa, a pụrụ iji ego e ji azụta otu ọkụkọ zụta égbè AK-47. Ọ dị mwute ikwu na n’ebe ụfọdụ, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na égbè dị ọtụtụ dị ka ọkụkọ. N’ụwa nile, a na-eme atụmatụ na e nwere ihe dị ka obere ngwá agha dị nde 500—1 maka mmadụ 12 ọ bụla dị ndụ.

Agha obodo na-ebibi ihe ọ̀ bụ ihe a ga-eji mara narị afọ nke 21? À pụrụ ịchịkwa agha obodo? Ndị mmadụ hà ga-emesị kwụsị igbu ibe ha? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Igbe dị na peeji nke 4]

Oké Ihe Agha Obodo Na-efu

N’agha obodo ndị a na-adịghị eji ngwá agha ọgbara ọhụrụ alụ ma bụrụ ndị na-akpata nhụsianya, pasent 90 nke ndị na-anwụ bụ ndị nkịtị kama ịbụ ndị agha. “O doro anya na ụmụaka na-abụwanye ndị e bu n’obi igbu, kama ịbụ ndị e gburu n’amaghị ama, n’agha ndị e ji ngwá agha alụ,” ka Graça Machel na-ekwu, bụ́ Ọkachamara Na-achọpụtara Odeakwụkwọ Ukwu nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu Mmetụta Agha Ndị E Ji Ngwá Agha Alụ Na-enwe n’Ahụ́ Ụmụaka.

Ndina n’ike aghọwo ihe ndị agha na-eme iji nweta ihe ha chọrọ. N’ụfọdụ ebe ndị agha tisasịrị, ndị nnupụisi na-edina ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nwata nwanyị ọ bụla ha hụrụ n’obodo ndị ha meriri. Ebumnobi ndị dị otú ahụ na-edina mmadụ n’ike bụ ime ka ụjọ jide ndị mmadụ ma ọ bụ ibibi nkekọ ezinụlọ.

Agha na-akpata ụnwụ nri na ọrịa. Agha obodo na-ebelata ihe a na-akọ na ihe a na-ewe n’ubi, na-eme ka e nwee nanị ebe nlekọta ahụ́ ike ole na ole na-arụ ọrụ ma ọ bụrụdị na ọ dị nke e nwere, na-emekwa ka ndị nọ ná mkpa ghara inwetacha enyemaka site ná mba ndị ọzọ. Otu nnyocha e mere n’otu agha obodo a lụrụ n’Africa kpughere na ọ bụ ọrịa gburu pasent 20 nke ndị nwụrụnụ nakwa na ọ bụ agụụ gburu pasent 78. Ọ bụ nanị pasent 2 ka agha ahụ n’onwe ya gburu.

Ná nkezi, kwa minit 22, ogbunigwe na-ebepụ mmadụ ụkwụ ma ọ bụ aka ma ọ bụ gbuo onye ahụ egbuo mgbe ọ zọnyere ya ụkwụ. E mere atụmatụ na e ligasịrị ihe dị ka nde ogbunigwe 60 ruo nde 70 n’ihe karịrị mba 60.

A na-amanye ndị mmadụ ịgbapụ n’ụlọ ha. Gburugburu ụwa, e nwere ihe dị ka nde mmadụ 50 gbara ọsọ ndụ na ndị na-enweghịkwa ebe obibi—ọkara ha bụ ụmụaka.

 [Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]

IHU AKWỤKWỌ: Nwatakịrị: Foto Chris Hondros sere/⁠Getty Images

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Foto Chris Hondros sere/Getty Images