Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Gbaa Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Gilead Ume Ikwu “Ihe Ndị Dị Ebube”

A Gbaa Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Gilead Ume Ikwu “Ihe Ndị Dị Ebube”

 A Gbaa Ndị Na-agụsị Akwụkwọ na Gilead Ume Ikwu “Ihe Ndị Dị Ebube”

ÌGWÈ mmadụ buru ibu dị 6,635 ndị si ala 52 nọ ya n’usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ nke klas nke 115 nke Watchtower Bible School of Gilead na September 13, 2003.

Ha nụrụ agbamume dabeere na Bible e nyere ụmụ akwụkwọ 48 nke klas ahụ ka ha wegara ndị bi n’ala 17 “ihe ndị dị ebube nke Chineke.” (Ọrụ 2:11) Ọ bụ n’ebe ahụ ka ndị ahụ gụsịrị akwụkwọ ga na-ejezi ozi ala ọzọ ha.

N’okwu mmeghe ya, Stephen Lett, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova nakwa onye jere ozi dị ka onyeisi oche nke ememe ngụsị akwụkwọ ahụ, chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Mgbe unu gara ebe e kenyere unu ọrụ, n’agbanyeghị ebe ọ bụ ma ọ bụ n’ọnọdụ ọ bụla ị hụtara onwe gị, ndị gị na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị na-emegide gị.” N’iji isi nke 6 nke Ndị Eze nke Abụọ mee ihe, Nwanna Lett chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na ha pụrụ ịdabere ná nkwado Jehova Chineke na imerime ndị mmụọ ozi ka ha na-eme ka a mara “ihe ndị dị ebube nke Chineke.” (2 Ndị Eze 6:15, 16) Ndị Kraịst narị afọ mbụ chere mmegide na enweghị mmasị ihu n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe ha, ndị ozi ala ọzọ nke Ndị Kraịst na-echekwa ọnọdụ ndị yiri nke ahụ ihu taa. Ma ha pụrụ ịdabere ná nkwado sitere n’eluigwe nakwa nke sitere ná nzukọ elu ala nke Jehova.—Abụ Ọma 34:7; Matiu 24:45.

Na-ekwu “Ihe Ndị Dị Ebube nke Chineke”

Mgbe okwu mmeghe nke onyeisi oche ahụ gasịrị, Harold Corkern, onye so na Kọmitii Alaka United States kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Atụmanya Ndị Ezi Uche Dị na Ha—Ihe Dị Mkpa Iji Jee Ozi Na-enye Ọṅụ na nke Na-aga nke Ọma.” Nwanna Corkern mere ka ọ pụta ìhè na olileanya ndị na-emezughị emezu pụrụ iduje ná ndakpọ olileanya dị ka Ilu 13:12 na-egosi. Ma, atụmanya ndị ezi uche na-adịghị na ha ndị na-emezughị emezu na-akpatakarị ndakpọ olileanya. Ọ dị ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ mkpa ile onwe ha na ndị ọzọ anya n’ụzọ ziri ezi. Ha kwesịrị ịtụ anya imehie ụfọdụ ihe, ma ihe ndị a ekwesịghị iwutebiga ha ókè ka ha na-agbalịsi ike inyere ndị ọzọ aka ịghọta “ihe ndị dị ebube nke Chineke.” Nwanna Corkern gbara ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ume ịdabere na Jehova, bụ́ “onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.

Onye sochiri n’usoro ihe omume ahụ bụ Daniel Sydlik, onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ onye kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Olileanya Ndị Kraịst—Gịnị Ka Ọ Bụ?” O kwuru, sị: “Olileanya bụ omume ọma Ndị Kraịst. Ọ bụ ụkpụrụ nke ezi ihe nke na-eme ka mmadụ na Chineke nwee ezi mmekọrịta. Onye na-abụghị Onye Kraịst inwe olileanya dị ka anyị na-enwe bụ ihe na-agaghị ekwe omume.” Nwanna Sydlik gara n’ihu ịkọwa akụkụ dị iche iche nke olileanya Ndị Kraịst ndị pụrụ inyere mmadụ aka ịnọgide na-enwe nchekwube n’agbanyeghị ihe isi ike nke ndụ. “Site n’olileanya, anyị pụrụ iji ike ọhụrụ na mmụọ nke mmeri chee ndụ ihu.” Olileanya Onye Kraịst na-enyere ya aka  ịhụ Jehova dị ka Chineke nke nzube na inwe ọṅụ n’ijere ya ozi.—Ndị Rom 12:12.

Wallace Liverance, onye na-edeba aha n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead, gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha “Nọgide Na-eje Ije Site na Mmụọ Nsọ.” (Ndị Galeshia 5:16) O gosiri otú o siri fọdụ nke nta ka Beruk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaịa, dapụ site n’ije ije na mmụọ nsọ. N’otu oge, ike gwụrụ Beruk, ya amalitekwa ịchọrọ onwe ya ihe ukwu. (Jeremaịa 45:3, 5) Nwanna Liverance kwuziri na ụfọdụ hapụrụ iso Jizọs ma jụ eziokwu ime mmụọ, bụ́ nke dị mkpa maka nzọpụta. Nke ahụ bụ n’ihi na ha aghọtaghị ihe ọ nọ na-akụzi, ha nwekwara ndakpọ olileanya n’ihi na e mezughị atụmanya anụ ahụ́ ha n’oge ahụ. (Jọn 6:26, 27, 51, 66) Gịnị ka ndị ozi ala ọzọ, ndị ọrụ ha bụ ịdọrọ uche ndị mmadụ gaa n’ebe Onye Okike na nzube ya nọ, pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ ndị a? A gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha ghara itinye uche ha n’inweta ọkwá, ịbụ ndị a ma ama, ma ọ bụ iji ihe omume ọchịchị Chineke eme ihe maka uru onwe onye.

“Ị̀ Ga-abụ Onye Na-enye Enye Ka Ọ Bụ Onye Na-anara Anara?” bụ ajụjụ onye nkụzi Gilead bụ́ Mark Noumair welitere. O mere ka okwu ya gbakwasị ụkwụ ná Ndị Ikpe 5:2, bụ́ ebe a jara ụmụ Izrel mma n’ihi iji achọghị ọdịmma onwe onye nanị nye onwe ha n’afọ ofufo iji jee ozi n’usuu  ndị agha Berak. A jara ụmụ akwụkwọ Gilead ahụ mma n’ihi mmụọ nke ha gosipụtara n’ịza òkù nke Berak ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst kpọrọ ha itinyekwu onwe ha n’agha ime mmụọ. Ndị agha Kraịst kwesịrị inwe mmasị n’inweta nnwapụta nke onye debanyere aha ha n’akwụkwọ dị ka ndị agha. Nwanna Noumair chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ, sị: “Mgbe anyị malitere ilekwasị anya n’ime ihe ga-atọ onwe anyị ụtọ, anyị na-akwụsị ịlụso onye iro ahụ ọgụ. . . . Ozi ala ọzọ abụghị banyere gị. Ọ bụ banyere Jehova, ọbụbụeze ya, na mmezu nke uche ya. Anyị adịghị eje ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ n’ihi na anyị chọrọ ka Jehova mee anyị obi ụtọ, anyị na-ejere ya ozi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya.”—2 Timoti 2:4.

Onye nkụzi Gilead bụ́ Lawrence Bowen duziri akụkụ ihe omume ahụ nke bụ́ “Jiri Eziokwu Doo Ha Nsọ.” (Jọn 17:17) O kwuru na ụmụ akwụkwọ klas nke 115 bụ ndị ozi Chineke e doro nsọ. Mgbe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ, ha kekwaara òkè n’ozi ubi, na-achọ ndị ji ezi obi hụ eziokwu ahụ n’anya. Dị ka Jizọs na ndịozi ya nke oge mbụ, ụmụ akwụkwọ ahụ “esiteghị ná mkpali nke aka” ha kwuo okwu. (Jọn 12:49, 50) Ha ji ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu nke eziokwu ahụ na-enye ndụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ. Mmeghachi nke ihe ndị merenụ na ahụmahụ nke ụmụ akwụkwọ ahụ gosiri mmetụta siri ike Bible nwere n’ahụ́ ndị ha zutere.

Ndụmọdụ na Ahụmahụ Na-enye Agbamume

Anthony Pérez na Anthony Griffin, ndị na-eje ozi ná Ngalaba Ije Ozi nke alaka United States, gbara ndị so na Kọmitii Alaka bụ́ ndị si n’akụkụ nile nke ụwa ajụjụ ọnụ. Ndị a kọrọ banyere ihe ịma aka ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ na-eche ihu ma nye ndụmọdụ ndị dị irè bụ́ ndị dabeere n’ahụmahụ onwe onye. Ụfọdụ n’ime ihe ịma aka ndị a gụnyere ndịrịta iche nke ọdịbendị, inwe okpomọkụ oge nile n’afọ ma ọ bụ ọnọdụ okpukpe na ọchịchị ndị dị iche n’ihe maara ụmụ akwụkwọ ahụ ahụ́. Gịnị pụrụ inyere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ aka ịnagide gburugburu ebe obibi ọhụrụ ha? Ịhụnanya maka Jehova, ịhụnanya maka ndị mmadụ, eleghị anya n’azụ na ịghara ime ihe n’echeghị eche. Otu onye so na kọmitii alaka kwuru, sị: “Ndị bi n’ebe e kenyere anyị ọrụ ebiwo ebe ahụ ruo ọtụtụ narị afọ tupu anyị abịa. N’ezie anyị pụrụ ibi n’ebe ahụ ma mee mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ e nwere n’ebe ndị ahụ. Mgbe ọ bụla anyị nwere ihe isi ike, anyị na-ewere ha dị ka ihe ndị pụrụ imeziwanye àgwà anyị. Ị na-adabere n’ekpere na mmụọ nsọ Jehova, ị na-ahụkwa ịbụ eziokwu nke okwu Jizọs bụ́, ‘M nọnyeere unu.’”—Matiu 28:20.

Samuel Herd, onye so n’Òtù Na-achị Isi, wetara usoro ihe omume ahụ ná njedebe site n’okwu ya bụ́, “Nọgide Na-ekwu Banyere Ihe Ndị Dị Ebube nke Chineke.” Mwụpụ nke mmụọ nsọ n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A. mere ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nwee ike ikwu banyere “ihe ndị dị ebube nke Chineke.” Gịnị pụrụ inyere ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ nke taa aka iji ịnụ ọkụ n’obi yiri nke ahụ na-ekwu banyere Alaeze Chineke? Ọ bụ otu mmụọ nsọ ahụ. Nwanna Herd gbara ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha ‘na-anụ ọkụ na mmụọ,’ ka ha nwee obi ụtọ n’ọrụ e kenyere ha, ghara ịnwa anwa chefuo ọzụzụ ndị e nyeworo ha. (Ndị Rom 12:11) “Bible bụ ihe dị ebube nke Chineke,” ka Nwanna Herd kwuru. “Ya adịla mgbe ị ga-eleda uru ọ bara anya. Ozi ya dị ndụ. Ọ na-eru nnọọ n’ụmị nke okwu. Jiri ya mee ka ihe guzozie ná ndụ gị. Kwe ka ọ gbanwee ụzọ i si eche echiche. Chebekwa ikike iche echiche gị site n’ịmụ, ịgụ na ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ . . . Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ na mkpebi gị siri ike iji ọzụzụ i nwetara na Gilead na-ekwu ‘ihe ndị dị ebube nke Chineke.’”

Mgbe a gụchara ozi ekele ndị sitere n’akụkụ nile nke ụwa, nyefeekwa diplọma, otu onye na-agụsị akwụkwọ gụpụtara akwụkwọ ozi sitere n’aka ndị klas ahụ, na-ekwupụta obi ekele maka ọzụzụ ha nwetara. Nwanna Lett wetaziri ihe omume ahụ na-enye ọṅụ ná njedebe kwesịrị ekwesị site n’ịrụtụ aka na 2 Ihe E Mere 32:7 na Deuterọnọmi 20:1, 4. N’ijikọta okwu mmeghe ya na okwu mmechi ya, o kwubiri, sị: “Ya mere ezigbo ndị na-agụsị akwụkwọ, ka unu na-apụ, ka unu na-azọrọ ije na-abanye n’agha ime mmụọ n’ebe ọhụrụ unu nwetara ọrụ, chetanụ na Jehova ga-eso unu na-abanye. Unu echefula eziokwu ahụ bụ́ na ndị unu na ha nọ dị ọtụtụ karịa ndị na-emegide unu.”

[Igbe dị na peeji nke 25]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 7

Ọnụ ọgụgụ mba e zigara ha: 17

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48

Nkezi afọ ndụ ha: 33.7

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 17.8

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 13.5

[Foto dị na peeji nke 26]

Klas nke 115 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Brown, T.; Goller, C.; Hoffman, A.; Bruzzese, J.; Trahan, S. (2) Smart, N.; Cashman, F.; Garcia, K.; Lojan, M.; Seyfert, S.; Gray, K. (3) Beckett, M.; Nichols, S.; Smith, K.; Gugliara, A.; Rappenecker, A. (4) Gray, S.; Vacek, K.; Fleming, M.; Bethel, L.; Hermansson, T.; Hermansson, P. (5) Rappenecker, G.; Lojan, D.; Dickey, S.; Kim, C.; Trahan, A.; Washington, A.; Smart, S. (6) Goller, L.; Burghoffer, T.; Gugliara, D.; Nichols, R.; Washington, S.; Kim, J. (7) Beckett, M.; Dickey, J.; Smith, R.; Garcia, R.; Hoffman, A.; Seyfert, R.; Brown, H. (8) Fleming, S.; Bruzzese, P.; Burghoffer, W.; Bethel, T.; Cashman, J.; Vacek, K.