Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnọ Na Nche Anyị Adịkwuo Ngwa

Ịnọ Na Nche Anyị Adịkwuo Ngwa

 Ịnọ Na Nche Anyị Adịkwuo Ngwa

“Nọrọnụ na nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”—MATIU 24:42.

1, 2. Gịnị na-egosi na anyị bi ná ngwụsị nke usoro ihe dị ugbu a?

“KARỊA ihe nile ọzọ, e ji agha mara narị afọ nke iri abụọ,” ka onye edemede bụ́ Bill Emmott na-ekwu. Ọ bụ ezie na o kwetara na oge nile n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nwechara agha na ime ihe ike, ọ na-agbakwụnye, sị: “Narị afọ nke iri abụọ adịghị iche n’ụdị ihe ndị merenụ, ọ dị iche n’ókè ha meruru. Ọ bụ narị afọ mbụ nwere ihe bụ́ n’ezie agha zuru ụwa ọnụ . . . Dịkwa ka ọ̀ bụ iji mesie nke ahụ ike, o nwere, ọ bụghị nanị otu agha dị otú ahụ zuru ụwa ọnụ kama abụọ.”

2 Jizọs Kraịst buru amụma banyere agha nke gụnyere ‘mba ibili megide mba na alaeze ibili megide alaeze.’ Otú ọ dị, ha bụ nanị otu akụkụ nke ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Kraịst nakwa nke ngwụsị nke usoro ihe a.’ N’oké amụma a, Jizọs kpọtụkwara ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na ala ọma jijiji aha. (Matiu 24:3, 7, 8; Luk 21:6, 7, 10, 11) N’ọtụtụ ụzọ, ọdachi ndị dị otú ahụ amụbawo n’otú ha bururu n’ibu na n’otú ha dịruru ná njọ. Ihe ọjọọ nke mmadụ bara ụba, dị ka a na-ahụ n’àgwà ya n’ebe Chineke na mmadụ ibe ya nọ. Ndakpọ nke omume na mmụba nke mpụ na ime ihe ike pụtakwara ìhè. Ndị mmadụ aghọwo ndị hụrụ ego n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, na-emikpu onwe ha n’ihe ụtọ. Ihe a nile na-agba akaebe na anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche.’—2 Timoti 3:1-5.

3. Olee otú “ihe ịrịba ama nke oge ndị a” kwesịrị isi na-emetụta anyị?

3 Olee otú i si ele ọnọdụ na-akawanye njọ nke ụmụ mmadụ anya? Ọtụtụ ndị nwere omume ọ gbasaghị m banyere ihe ndị na-eme taa ọbụna bụrụ ndị ọ na-adịghị emetụ n’ahụ́. Ndị a na-akwanyere ùgwù na ndị nwere ọgụgụ isi n’ụwa adịghị aghọta ihe “ihe ịrịba ama nke oge ndị a” pụtara; ndị ndú okpukpe enyebeghịkwa nduzi kwesịrị ekwesị banyere nke a. (Matiu 16:1-3) Ma Jizọs dụrụ ụmụazụ ya ọdụ, sị: “Ya mere nọrọnụ na nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” (Matiu 24:42) N’ebe a, Jizọs na-agba anyị ume ọ bụghị nanị iche nche kama ‘ịnọrọ na nche.’ Iji nọrọ na nche, anyị aghaghị ịmụrụ anya. Nke a chọrọ ihe karịrị nanị ikweta na anyị bi n’ụbọchị ikpeazụ, karịakwa ịmata na oge ndị a siri ike. Anyị aghaghị ikwenyesi ike na “ọgwụgwụ nke ihe nile eruwo nso.” (1 Pita 4:7) Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka anyị ga-eji echiche nke ịdị ngwa nọrọ na nche. N’ihi ya, ajụjụ anyị na-aghaghị ịtụgharị uche na ya bụ: ‘Gịnị ga-enyere anyị aka ikwenyesikwu ike na ọgwụgwụ dị nso?’

4, 5. (a) Gịnị ga-eme ka anyị kwenyesikwuo ike na ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a dị nso, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Gịnị bụ otu myirịta dị n’etiti ụbọchị Noa na ọnụnọ Nwa nke mmadụ?

4 Tụlee ọnọdụ e nwere tupu otu ihe omume pụrụ iche n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ—oké Iju Mmiri nke ụbọchị Noa. Ndị mmadụ jọrọ nnọọ njọ nke na ‘o wutere Jehova n’obi.’ O kwupụtara, sị: “M ga-ekpochapụ mmadụ n’elu ala, bụ́ ndị M keworo.” (Jenesis 6:6, 7) O mekwara nnọọ otú ahụ. N’igosi otú oge ahụ na oge a si yie, Jizọs kwuru, sị: “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37.

5 Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na mmetụta  Jehova nwere banyere ụwa nke oge a bụ otu mmetụta ahụ o nwere banyere ụwa nke dị tupu Iju Mmiri ahụ. Ebe ọ bụ na o bibiri ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke nke ụbọchị Noa, ọ ghaghị ibibi ajọ ụwa nke oge a. Ịghọta nke ọma myirịta dị n’etiti oge ahụ na ụbọchị anyị kwesịrị ime ka anyị kwenyesikwuo ike na ọgwụgwụ nke ụwa nke oge a dị nso. Gịnịzi bụ myirịta ndị dị n’etiti ha? E nwere ma ọ dịkarịa ala ise. Nke mbụ bụ na e nyere ịdọ aka ná ntị doro anya banyere mbibi na-abịanụ.

E Nye Ịdọ Aka ná Ntị Banyere “Ihe Ndị A Na-ahụbeghị Anya”

6. Gịnị ka Jehova kpebisiri ike ime n’ụbọchị Noa?

6 N’ụbọchị Noa, Jehova kwupụtara, sị: “Mmụọ m agaghị achị achị n’ime mmadụ ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na ya onwe ya bụkwa anụ ahụ́: ma ụbọchị ya nile ga-abụ [otu narị afọ na iri afọ abụọ.]” (Jenesis 6:3) Mkpebi ikpe a nke Chineke na 2490 T.O.A. kara akara mmalite nke ọgwụgwụ nke ụwa ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke. Cheedị echiche ihe nke ahụ pụtara nye ndị dị ndụ n’oge ahụ! Ọ fọdụrụ nanị afọ 120 tupu Jehova emee “ka iju mmiri bịakwasị ụwa, ibibi anụ ahụ́ nile, nke ume nke ndụ dị n’ime ya, ka ọ pụọ n’okpuru eluigwe.”—Jenesis 6:17.

7. (a) Olee otú Noa si meghachi omume n’ịdọ aka ná ntị banyere Iju Mmiri ahụ? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ịdọ aka ná ntị ndị e nyere banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe a?

7 Noa nwetara ịdọ aka ná ntị banyere oké ọdachi na-abịanụ ọtụtụ iri afọ tupu ya emee, o jikwa oge ahụ mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya iji kwadebe maka nlanarị. “Mgbe e nyesịrị ya ịdọ aka ná ntị Chineke banyere ihe ndị a na-ahụbeghị anya,” ka Pọl onyeozi na-ekwu, “[Noa] gosiri egwu Chineke ma wuo ụgbọ maka ịzọpụta ezinụlọ ya.” (Ndị Hibru 11:7) Gịnị banyere anyị? Ihe dị ka afọ 90 agafewo kemgbe ụbọchị ikpeazụ nke usoro ihe a malitere na 1914. N’ezie, anyị bi na “mgbe ọgwụgwụ.” (Daniel 12:4) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ịdọ aka ná ntị ndị e nyeworo anyị? “Onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi,” ka Bible na-ekwu. (1 Jọn 2:17) N’ihi ya, ugbu a bụ oge iji echiche nke ịdị ngwa na-eme uche Jehova.

8, 9. Ịdọ aka ná ntị ndị dị aṅaa ka e nyeworo n’oge a, oleekwa otú e si na-akpọsa ha?

8 N’oge a, ndị ji ezi obi na-amụ Bible amụtawo site n’Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ na a na-aga ibibi usoro ihe a. Ànyị kweere nke a? Rịba ama ihe Jizọs Kraịst kwuru n’ụzọ doro anya: “A ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwebeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghịkwa enwe ya ọzọ.” (Matiu 24:21) Jizọs kwukwara na ya ga-abịa dị ka Onyeikpe Chineke họpụtara, nakwa na ya ga-ekewapụ ndị mmadụ dị ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’etiti ewu. Ndị a chọpụtara na ha erughị eru “ga-apụkwa gaa ná mbipụ ebighị ebi, ma ndị ezi omume ga-aga ná ndụ ebighị ebi.”—Matiu 25:31-33, 46.

9 Jehova ejiriwo ihe ndị a na-echetara ndị ya n’oge kwesịrị ekwesị site ná nri ime mmụọ nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke  nwekwara uche” na-ewepụta nye ndị ya ịdọ aka ná ntị ndị a. (Matiu 24:45-47) Ọzọkwa, a na-akpọ mba nile, agbụrụ nile, asụsụ nile, na ndị nile òkù ka ha ‘tụọ Chineke egwu, nyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe sitere n’aka ya abịawo.’ (Mkpughe 14:6, 7) Akụkụ dị mkpa nke ozi Alaeze ahụ nke Ndịàmà Jehova na-ekwusa n’ụwa nile bụ ịdọ aka ná ntị na Alaeze Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ n’isi nso. (Daniel 2:44) Ịdọ aka ná ntị a abụghị ihe a ga-eji gwurie egwu. Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile na-emezu okwu ya mgbe nile. (Aịsaịa 55:10, 11) O mere otú ahụ n’ụbọchị Noa, ọ ga-emekwa ya n’ụbọchị anyị.—2 Pita 3:3-7.

Mmekọahụ Rụrụ Arụ Ejupụta Ebe Nile

10. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere mmekọahụ rụrụ arụ n’ụbọchị Noa?

10 Oge anyị kwekọrọ n’ụbọchị Noa n’ụzọ ọzọ. Jehova enyewo nwoke na nwanyị mbụ ahụ iwu ka ha jiri ndị dị ka ha ‘mejupụta ụwa,’ na-eji ikike inwe mmekọahụ Chineke nyere ha eme ihe n’ụzọ dị ùgwù n’ime ndokwa alụmdi na nwunye. (Jenesis 1:28) N’ụbọchị Noa, ndị mmụọ ozi nupụrụ isi ji mmekọahụ na-ekwekọghị n’okike metọọ ihe a kpọrọ mmadụ. Ha gbadatara n’ụwa, nwoghara ahụ́ mmadụ, ma soro ụmụ nwanyị mara mma biri, na-amụ ụmụ ndị bụ́ ọkara mmadụ ọkara mmụọ—ndị Nefilim. (Jenesis 6:2, 4) E ji mmehie nke ndị mmụọ ozi a ara mmekọahụ na-agba tụnyere omume rụrụ arụ nke Sọdọm na Gọmọra. (Jud 6, 7) N’ihi ya, mmekọahụ rụrụ arụ jupụtara ebe nile n’oge ahụ.

11. Omume ndị dị aṅaa na-eme ka oge anyị yie ụbọchị Noa?

11 Gịnị banyere omume ndị a na-eme n’oge a? N’ụbọchị ikpeazụ ndị a, inwe mmekọahụ eriwo ọtụtụ ndị ahụ́. Pọl onyeozi kọwara ndị dị otú ahụ n’ụzọ doro anya dị ka ndị “na-enwekwaghị mmetụta ime omume ọma”; ọtụtụ ndị enyefewo onwe ha “n’omume rụrụ arụ iji ụdị anyaukwu ọ bụla na-arụpụta adịghị ọcha.” (Ndị Efesọs 4:19) Ihe ndị na-akpali mmekọahụ, mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, imetọ ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ, na idina ụdị onwe onye jupụtara ebe nile. Ụfọdụ ndị enwetawalarị “n’ime onwe ha nkwụghachi ụgwọ zuru ezu” n’ụdị ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, ndakpọ ezinụlọ, na nsogbu ndị ọzọ nke ọha mmadụ.—Ndị Rom 1:26, 27.

12. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịzụlite ịkpọasị maka ihe ọjọọ?

12 N’ụbọchị Noa, Jehova wetara oké Iju Mmiri ahụ ma mee ka ụwa ahụ ara mmekọahụ na-agba bịa ná njedebe. Anyị agaghị anwa anwa chefuo na oge a dị nnọọ n’ezie otú ụbọchị Noa dịrị. “Oké mkpagbu” nke na-abịanụ ga-ekpochapụ n’ụwa ‘ndị na-akwa iko, ndị bụ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị ikom e debere maka mmekọahụ na-ekwekọghị n’okike, na ndị ikom na-edina ndị ikom.’ (Matiu 24:21; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Mkpughe 21:8) Lee ka o si dị ngwa ka anyị zụlite ịkpọasị maka ihe ọjọọ ma na-ezere ọnọdụ ọ bụla nke pụrụ iduba n’omume rụrụ arụ!—Abụ Ọma 97:10; 1 Ndị Kọrint 6:18.

Ụwa ‘Ejupụta n’Ihe Ike’

13. N’ụbọchị Noa, n’ihi gịnị ka ụwa ji ‘jupụta n’ihe ike’?

13 N’izo aka n’ihe ọzọ e ji mara ụbọchị Noa,  Bible na-ekwu, sị: “E bibiri ụwa n’ihu Chineke, ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” (Jenesis 6:11) N’ezie ime ihe ike abụghị ihe ọhụrụ. Nwa Adam bụ́ Ken gburu nwanne ya bụ́ onye ezi omume. (Jenesis 4:8) N’igosipụta mmụọ ime ihe ike e nwere n’oge ya, Lemek rọrọ otu uri o ji na-etu ọnụ otú o si gbuo otu nwa okorobịa, nke o kwuru na ya mere iji chebe onwe ya. (Jenesis 4:23, 24) Ihe bụ́ ihe ọhụrụ n’ụbọchị Noa bụ ọ̀tụ̀tụ̀ ime ihe ike ruru. Ka ụmụ Chineke bụ́ ndị mmụọ ozi nupụrụ isi lụrụ ndị inyom n’ụwa ma mụta ụmụ—ndị Nefilim—ime ihe ike mụbara ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ. New World Translation na-egosi na okwu Hibru mbụ na-ezo aka n’ebe ndị dike a na-eme ihe ike nọ pụtara “Ndị Nkwada”—ndị na-eme ka ndị ọzọ daa. (Jenesis 6:4) N’ihi ya, ụwa “jupụtara n’ihe ike.” (Jenesis 6:13) Cheedị banyere nsogbu ndị Noa na-aghaghị ichewo ihu n’ịzụlite ezinụlọ ya na gburugburu ebe dị otú ahụ! N’agbanyeghị nke ahụ, Noa gosipụtara onwe ya ịbụ ‘onye ezi omume n’ihu Jehova n’ọgbọ ahụ.’—Jenesis 7:1.

14. Olee otú ụwa taa siworo ‘jupụta n’ihe ike’?

14 A nọwo na-eme ihe ike n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ kemgbe ụwa. Ma dị ka ọ dị n’ụbọchị Noa, a na-ahụ ya n’oge anyị n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ. Anyị na-anụkarị banyere ime ihe ike n’ebe obibi, iyi ọha egwu, mgbuchapụ nke agbụrụ, na ndị ogbu mmadụ igbusịsị ndị mmadụ n’ìgwè n’enweghị ihe doro anya kpatara ya. Tụkwasị n’ihe a nile, e nwere nkwafu ọbara nke agha na-akpata. Ụwa ejupụtala ọzọ n’ihe ike. N’ihi gịnị? Gịnị kpataworo mmụba a? Azịza ya na-ekpughe ụzọ ọzọ oge a na oge Noa si yie.

15. (a) Gịnị kpataworo mmụba nke ime ihe ike n’ụbọchị ikpeazụ ndị a? (b) Gịnị ka anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-eme?

15 Mgbe e guzobere Alaeze Mezaịa Chineke n’eluigwe na 1914, Eze ya e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Jizọs Kraịst, mere ihe dị ịrịba ama. E si n’eluigwe chụda Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ n’ụwa. (Mkpughe 12:9-12) Tupu Iju Mmiri ahụ, ndị mmụọ ozi nupụrụ isi ji aka ha hapụ ọnọdụ ha n’eluigwe; otú ọ dị, n’oge anyị, e ji ike chụpụ ha. Ọzọkwa, ha enweghịzi ike inwoghara ahụ́ mmadụ n’ụwa iji nwee ihe ụtọ anụ ahụ́ rụrụ arụ. Ya mere, n’obi nkoropụ, iwe, na ụjọ n’ihi ikpe na-abịanụ, ha na-akpali ụmụ mmadụ na òtù dị iche iche ime omume obi ịta mmiri nke mpụ na ime ihe ike ọbụna n’ọ̀tụ̀tụ̀ karịrị nke ụbọchị Noa. Jehova kpochapụrụ ụwa nke dị tupu Iju Mmiri ahụ mgbe ndị mmụọ ozi nupụrụ isi na ụmụ ha jisịworo ihe ọjọọ mejupụta ya. Ihe ịrụ ụka adịghị  ya ọ na ọ ga-emekwa otu ihe ahụ n’oge anyị! (Abụ Ọma 37:10) Otú ọ dị, ndị nọ na nche taa maara na nnapụta ha dị nso.

E Kwusaa Ozi Ahụ

16, 17. Olee ụzọ nke anọ ụbọchị Noa na ụbọchị anyị si yie?

16 A na-ahụ ụzọ nke anọ oge a na ụwa nke dị tupu Iju Mmiri ahụ si yie n’ọrụ e nyere Noa ịrụ. Noa wuru nnukwu ụgbọ. Ọ bụkwa onye ‘na-eme nkwusa.’ (2 Pita 2:5) Ozi dị aṅaa ka o kwusara? Ihe ama na-egosi na nkwusa Noa gụnyere ịgwa ndị mmadụ ka ha chegharịa na ịdọ aka ná ntị banyere mbibi na-abịanụ. Jizọs kwuru na ndị ụbọchị Noa “amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.”—Matiu 24:38, 39.

17 N’ụzọ yiri nke ahụ, ka Ndịàmà Jehova ji ịdị uchu na-arụzu ọrụ ha nke ime nkwusa, a na-ekwusa ozi Alaeze Chineke n’ụwa nile. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ebe nile n’ụwa, ndị mmadụ pụrụ ịnụ na ịgụ ozi Alaeze ahụ n’asụsụ ha. A na-ekesa ihe karịrị 25,000,000 nke magazin Ụlọ Nche, ikwupụta Alaeze Jehova, a na-ebipụtakwa ya n’ihe karịrị asụsụ 140. N’ezie, a na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke “n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” Mgbe a rụzuru ọrụ ahụ otú juru Chineke afọ, ọgwụgwụ ga-abịarịrị.—Matiu 24:14.

18. Olee otú mmeghachi omume nke ọtụtụ ndị n’ebe ọrụ nkwusa anyị dị si yie nke ihe ka ọtụtụ n’ụbọchị Noa?

18 N’iburu n’uche ndakpọ nke omume e nwere n’ụbọchị ndị bu Iju Mmiri ahụ ụzọ, o sighị ike ịghọta otú ezinụlọ Noa si ghọọrọ ndị agbata obi ha na-adịghị ekwe ekwe ihe ọchị na ihe ịkwa emo. Ma ọgwụgwụ ahụ bịara n’ezie. N’otu aka ahụ, ‘ndị na-akwa emo na ịkwa emo’ jupụtara n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. “Ma ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi,” ka Bible na-ekwu. (2 Pita 3:3, 4, 10) Ọ ghaghị ịbịa n’oge a kara aka. Ọ gaghị anọ ọdụ. (Habakuk 2:3) Lee ka anyị ga-esi bụrụ ndị maara ihe ịnọ na nche!

Nanị Ole na Ole Alanarị

19, 20. Myirịta dị aṅaa dị n’etiti Iju Mmiri ahụ na mbibi nke usoro ihe dị ugbu a?

19 Myirịta dị n’etiti ụbọchị Noa na ụbọchị anyị abụghị nanị n’ịdị njọ nke ndị mmadụ na mbibi ha. Dị ka e nwere ndị lanarịrị Iju Mmiri ahụ, a ga-enwe ndị ga-alanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a. Ndị lanarịrị Iju Mmiri ahụ bụ ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị na-ebighị ndụ dị ka ndị mmadụ n’ozuzu ha biri. Ha ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke ma kewapụ onwe ha n’ajọ ụwa nke oge ahụ. “Noa hụtara amara n’ihu Jehova,” ka Bible na-ekwu. “[Noa] gosiri na ya enweghị ntụpọ n’etiti ndị ya na ha dịkọrọ ndụ.” (Jenesis 6:8, 9, NW) N’ime ihe nile a kpọrọ mmadụ, nanị otu ezinụlọ, ‘mmadụ ole na ole, ya bụ, mkpụrụ obi asatọ, ka e buuru gabiga na mmiri ahụ n’enweghị mmerụ ahụ́.’ (1 Pita 3:20) Jehova Chineke nyekwara ha iwu, na-asị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa.”—Jenesis 9:1.

20 Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na “oké ìgwè mmadụ” ga-esi ‘n’oké mkpagbu ahụ pụta.’ (Mkpughe 7:9, 14) Oké ìgwè mmadụ ahụ hà ga-adị ole? Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.” (Matiu 7:13, 14) E jiri ha tụnyere ihe dị ka ijeri mmadụ isii bi n’ụwa ugbu a, ndị ga-alanarị oké mkpagbu ahụ na-abịanụ ga-adị ole na ole. Ma ha pụrụ inwe ihe ùgwù yiri nke ahụ e nyere ndị lanarịrị Iju Mmiri ahụ. Ruo oge ụfọdụ, ndị lanarịrịnụ ga-enwe ike ịmụ ụmụ dị ka akụkụ  nke ọha mmadụ ga-ebi n’ụwa ọhụrụ.—Aịsaịa 65:23.

“Nọrọnụ na Nche”

21, 22. (a) Olee otú ntụle a nke ihe ndekọ banyere Iju Mmiri ahụ siworo baara gị uru? (b) Gịnị bụ isiokwu dịịrị afọ 2004, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ịṅa ntị na ndụmọdụ ọ na-enye?

21 Ọ bụ ezie na Iju Mmiri ahụ na-eyi ihe oge ochie, ọ na-enye nnọọ ịdọ aka ná ntị nke anyị na-agaghị eleghara anya. (Ndị Rom 15:4) Myirịta dị n’etiti ụbọchị Noa na ụbọchị anyị kwesịrị ime ka anyị marakwuo ihe ihe ndị na-emenụ pụtara ma mee ka anyị nọrọ na nche maka ọbịbịa Jizọs dị ka onye ohi imezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ndị ajọ omume.

22 Taa, Jizọs Kraịst na-eduzi nnukwu ọrụ owuwu ihe ime mmụọ. Maka nchebe na nlanarị nke ndị na-efe ezi ofufe, e nwere paradaịs ime mmụọ yiri ụgbọ. (2 Ndị Kọrint 12:3, 4) Iji bụrụ ndị e chebere gabiga oké mkpagbu ahụ, anyị aghaghị ịnọgide na paradaịs ime mmụọ ahụ. Ụwa Setan gbara paradaịs ime mmụọ ahụ gburugburu, dị njikere irikpu onye ọ bụla na-ero ụra n’ụzọ ime mmụọ. Ọ dị oké mkpa ka anyị ‘nọrọ na nche’ ma gosi na anyị dị njikere maka ụbọchị Jehova.—Matiu 24:42, 44.

Ị̀ Na-echeta?

• Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jizọs nyere banyere ọbịbịa ya?

• Gịnị ka Jizọs ji tụnyere oge ọnụnọ ya?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka oge anyị si yie ụbọchị Noa?

• Olee otú ịtụgharị uche ná myirịta ndị dị n’etiti ụbọchị Noa na ụbọchị anyị kwesịrị isi metụta echiche anyị nke ịdị ngwa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]

Isiokwu dịịrị afọ 2004 ga-abụ: “Nọrọnụ na nche . . . Gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere.”—Matiu 24:42, 44.

[Foto dị na peeji nke 15]

Noa ṅara ntị n’ịdọ aka ná ntị Chineke. Ànyị na-eme otú ahụ?

[Foto ndị dị na peeji nke 16, 17]

“Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị”