Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Nweta Ihe Nrite ahụ, Na-egosipụta Njide Onwe Onye!

Iji Nweta Ihe Nrite ahụ, Na-egosipụta Njide Onwe Onye!

 Iji Nweta Ihe Nrite ahụ, Na-egosipụta Njide Onwe Onye!

“Onye ọ bụla nke na-ekere òkè n’ịsọ mpi na-egosipụta njide onwe onye n’ihe nile.”—1 NDỊ KỌRINT 9:25.

1. N’ikwekọ ná Ndị Efesọs 4:22-24, olee otú ọtụtụ nde mmadụ siworo malite ime uche Jehova?

Ọ BỤRỤ na e mewo gị baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, i mere ka a mara n’ihu ọha na ị dị njikere isonye n’asọmpi nke nwere ndụ ebighị ebi dị ka ihe nrite ya. I kweere ime uche Jehova. Tupu anyị arara onwe anyị nye Jehova, ọtụtụ n’ime anyị mere mgbanwe ndị pụtara ìhè ka nraranye anyị wee nwee nzube, bụrụ nke Chineke na-anakwere. Anyị gbasoro ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere Ndị Kraịst, sị: “Yipụ ụdị mmadụ ochie ahụ bụ́ nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga, bụrụkwa nke a na-emerụ dị ka ọchịchọ aghụghọ ya si dị . . . Yikwasịkwa ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.” (Ndị Efesọs 4:22-24) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, tupu anyị arara onwe anyị nye Chineke, anyị aghaghị ịjụ ụdị ndụ na-adịghị mma anyị na-ebibu.

2, 3. Olee otú 1 Ndị Kọrint 6:9-12 si egosi na a ghaghị ime ụdị mgbanwe abụọ iji nweta ihu ọma Chineke?

2 Akụkụ ụfọdụ nke ụdị mmadụ ochie nke ndị chọrọ ịghọ Ndịàmà Jehova na-aghaghị iyipụ bụ ndị Okwu Chineke katọrọ kpọmkwem. Pọl depụtara ụfọdụ n’ime ha n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrint, na-asị: “Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị bụ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ ndị ikom e debere maka mmekọahụ na-ekwekọghị n’okike, ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị na-ekwujọ mmadụ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe agaghị eketa alaeze Chineke.” O gosiziri na Ndị Kraịst oge mbụ ahụ mere mgbanwe ndị dị mkpa n’àgwà ha, na-agbakwụnye, sị: “Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu.” Rịba ama na ihe e kwuru n’ebe a bụ bụbu, ọ bụghị bụ.1 Ndị Kọrint 6:9-11.

 3 Pọl tụrụ aro na ọ pụkwara ịdị mkpa imekwu mgbanwe, n’ihi na ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Nye m, iwu kwadoro ihe nile; ma ọ bụghị ihe nile bara uru.” (1 Ndị Kọrint 6:12) N’ihi ya, ọtụtụ ndị taa bụ́ ndị na-achọ ịbụ Ndịàmà Jehova na-ahụ mkpa ọ dị ịjụ ọbụna ihe ndị ọ bụ ezie na iwu kwadoro ha ma ha abaghị uru ma ọ bụ ha enwechaghị abamuru na-adịgide adịgide. Ha pụrụ ịdị na-eri oge ma nwee ike ịdọpụ uche ha n’ịchụso ihe ndị ka mkpa.

4. Na gịnị ka Ndị Kraịst raara onwe ha nye na-ekwenyere Pọl?

4 A na-eji ọchịchọ obi arara onwe onye enye Chineke, ọ bụghị n’ụzọ na-esiteghị n’obi, dị ka a ga-asị na ọ chọrọ àjà buru oké ibu. Ndị Kraịst raara onwe ha nye kweere ihe Pọl kwuru, bụ́ onye kwuru mgbe ọ ghọsịrị onye na-eso ụzọ Kraịst, sị: “N’ihi [Jizọs], ekwerewo m ka ihe nile funahụ m, ana m agụkwa ha dị ka ihe mkpofu dị ukwuu, ka m wee nweta Kraịst.” (Ndị Filipaị 3:8) Pọl ji obi ụtọ jụ ihe ndị na-abachaghị uru ka o wee nwee ike ịnọgide na-eme ihe Chineke na-achọ.

5. N’ọsọ dị aṅaa ka Pọl nwere ihe ịga nke ọma, oleekwa otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma?

5 Pọl gosipụtara njide onwe onye n’ịgba ọsọ ime mmụọ ya ma nwee ike ikwu n’ikpeazụ, sị: “Alụwo m ezi ọgụ ahụ, agbawo m ọsọ ahụ ruo n’isi, edebewo m okwukwe ahụ. Malite ugbu a gaa n’ihu e debeere m okpueze ezi omume, nke Onyenwe anyị, bụ́ onyeikpe ezi omume, ga-enye m dị ka ụgwọ ọrụ n’ụbọchị ahụ, ma ọ bụghị nanị m, kamakwa ndị nile hụworo mpụta ìhè ya n’anya.” (2 Timoti 4:7, 8) Ànyị nwere ike ikwu ihe yiri nke ahụ otu ụbọchị? Anyị ga-enwe ike ime otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị ejiri okwukwe na-egosipụta njide onwe onye ka anyị na-agba ọsọ Ndị Kraịst n’adaghị mbà ma gbaruo ya n’isi.

Njide Onwe Onye Ime Ihe Dị Mma

6. Gịnị bụ njide onwe onye, oleekwa ebe abụọ anyị na-aghaghị igosipụta ya?

6 Okwu Hibru na nke Grik a sụgharịrị ịbụ “njide onwe onye” na Bible pụtara n’ụzọ nkịtị na mmadụ nwere ikike ịchịkwa onwe ya. Ha na-enyekarị echiche nke igbochi onwe onye ime ihe ọjọọ. Ma o doro anya na a chọtụrụ njide onwe onye ma ọ bụrụ na anyị ga-eji ahụ́ anyị arụ ezi ọrụ. Ọchịchọ ebumpụta ụwa nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè bụ ime ihe ọjọọ, n’ihi ya, anyị nwere ọgụ gbara mkpị. (Eklisiastis 7:29; 8:11) Ka anyị na-ezere ime ihe ọjọọ, anyị aghaghị ịmanye onwe anyị ime ezi ihe. N’ezie, ịchịkwa ahụ́ anyị iji na-eme ezi ihe bụ ụzọ kasị mma isi na-ezere ime ihe ọjọọ.

7. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ịdị na-ekpe ekpere banyere ya, dị ka Devid mere? (b) Ịtụgharị uche na gịnị ga-enyere anyị aka igosipụtakwu njide onwe onye?

7 N’ụzọ doro anya, njide onwe onye dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-eme ihe kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke. Anyị kwesịrị ịdị na-ekpe ekpere dị ka Devid  kpere: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.” (Abụ Ọma 51:10) Anyị pụrụ ịtụgharị uche n’uru ndị dị n’izere omume ndị dị njọ ma ọ bụ ndị na-akpata ike ọgwụgwụ. Cheedị banyere ihe mgbu ndị na-adị n’ịghara izere ihe ndị dị otú ahụ: oké nsogbu ahụ́ ike, mmekọrịta e mebiri emebi, ọbụna ọnwụ ike. N’aka nke ọzọ, chee banyere ọtụtụ uru ndị dị n’ibi ụdị ndụ Jehova kwuru ka a na-ebi. Otú ọ dị, n’ezie, anyị agaghị echefu ma ọlị na obi anyị dị aghụghọ. (Jeremaịa 17:9) Anyị aghaghị ikpebisi ike iguzogide mgbalị ọ na-eme ime ka anyị ledaa mkpa ọ dị ịgbaso ụkpụrụ Jehova anya.

8. Eziokwu dị aṅaa ka ahụmahụ na-akụziri anyị? Nye ihe atụ.

8 Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị maara site n’ahụmahụ na anụ ahụ́ na-adịghị njikere na-agbalịkarị imenyụ ọkụ nke mmụọ dị njikere. Were ime nkwusa Alaeze dị ka ihe atụ. Jehova na-enwe obi ụtọ n’ịdị njikere nke ụmụ mmadụ ikere okè n’ọrụ a na-enye ndụ. (Abụ Ọma 110:3; Matiu 24:14) Ọ dịghịrị ihe ka ọtụtụ n’ime anyị mfe ịmụta ime nkwusa n’ihu ọha. Ọ chọrọ—ma eleghị anya ka chọọ—ka anyị na-achịkwa ahụ́ anyị, ‘na-etipụta ya ọnyá’ ma “na-achịkwa ya dị ka ohu,” kama ikwe ka ọ na-eme ka anyị na-ejiri ya nwayọọ.—1 Ndị Kọrint 9:16, 27; 1 Ndị Tesalonaịka 2:2.

“N’ihe Nile”?

9, 10. Gịnị ka igosipụta “njide onwe onye n’ihe nile” gụnyere?

9 Ndụmọdụ Bible ka a na-egosipụta “njide onwe onye n’ihe nile” na-egosi na ọ gụnyere ihe karịrị nanị ịchịkwa iwe anyị na izere omume ọjọọ. Anyị pụrụ iche na anyị na-egosipụta njide onwe onye n’akụkụ ndị a, ya bụrụ otú ahụ, anyị pụrụ inwe obi ụtọ n’ezie. Ma, gịnị banyere akụkụ ndị ọzọ nke ndụ bụ́ ebe mkpa ọ dị igosipụta njide onwe onye na-adịghị apụtacha ìhè? Iji maa atụ, ka e were ya na anyị bi ná mba batụrụ ọgaranya nke ọnọdụ ibi ndụ na ya dị elu. Ọ̀ bụ na ọ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya ịghara ịdị na-emefusị ego n’ihe ndị na-adịghị mkpa? Ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha ịghara ịzụ ihe ọ bụla ha hụrụ nanị n’ihi na ọ dị adị, na-adọrọ mmasị, ma ọ bụ n’ihi na ha ga-azụtali ya. N’ezie, ka ntụziaka dị otú ahụ wee dị irè, ndị nne na nna aghaghị isetịpụ ezi ihe nlereanya.—Luk 10:38-42.

10 Ịmụta ileghara ihe onwunwe ụfọdụ anya pụrụ ime ka mkpebi anyị sikwuo ike. Ọ pụkwara ime ka anyị nwekwuo ekele maka ihe ndị anyị nwere, ọzọkwa, ọ pụrụ ime ka anyị nwekwuo ọmịiko n’ahụ́ ndị na-aghaghị ileghara ihe ụfọdụ anya, ọ bụghị n’ihi na ha chọrọ, kama n’ihi na ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime. N’eziokwu, ibi ndụ dị mfe megidere echiche zuru ebe nile dị ka “kwaa onwe gị mgbe ị dị ndụ” ma ọ bụ “a naghị ata ego ata.” Ụlọ ọrụ mkpọsa ngwa ahịa na-akwalite ọchịchọ nke imejụ agụụ ozugbo, ma ọ na-eme otú ahụ iji nweta uru ahịa. Ọnọdụ dị otú a pụrụ imetụta mgbalị anyị igosipụta njide onwe onye. Otu magazin sitere n’otu mba Europe bara ọgaranya kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Ọ bụrụ na ịchịkwa ọchịchọ ndị na-ezighị ezi chọrọ ịrụ ahụ́ ụka n’aka ndị nọ n’ọnọdụ na-egbu mgbu nke ịbụ ogbenye ọnụ ntụ, lee ka nke ahụ si dị ndị bi n’ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ha ná mba ndị bara ọgaranya taa mkpa karị!”

11. N’ihi gịnị ka ịmụta ileghara ihe ụfọdụ anya ji aba uru, ma gịnị na-eme nke a ji esi ike?

11 Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ịmata ihe dị iche n’ihe anyị chọrọ na ihe dị anyị mkpa n’ezie, ọ pụrụ ịbụ ihe na-enye aka ime ihe ụfọdụ iji hụ na anyị emeghị ihe n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-achọ igbochi ọchịchọ imefu ego aghara aghara, anyị pụrụ ịchọ ikpebi ịghara ịzụ ihe n’aka ma ọ bụ were nanị ego ga-ezu ihe anyị chọrọ ịzụ mgbe anyị na-aga ịzụ ihe. Cheta na Pọl kwuru na “nsọpụrụ Chineke a ya na inwe afọ ojuju” bụ “ụzọ isi rite uru dị ukwuu.” O kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe anyị webataworo n’ime ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iburu pụọ na ya. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na ihe mgbokwasị, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:6-8) Ànyị nwere afọ ojuju? Ịmụta ibi ndụ dị mfe, nke na-enweghị ihe ndọkasị ahụ́ nke imeju ọchịchọ onwe onye—n’ụdị ya ọ bụla—chọrọ mkpebi siri ike na njide onwe onye. Otú ọ dị, ọ bụ ihe kwesịrị mmụta.

12, 13. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka nzukọ Ndị Kraịst si agụnye njide onwe onye? (b) Olee ihe ndị ọzọ ọ dị mkpa ịzụlite njide onwe onye na ha?

 12 Ịga nzukọ Ndị Kraịst na mgbakọ ukwu na mgbakọ nta na-achọkwa ka a na-egosipụta njide onwe onye. Dị ka ihe atụ, àgwà dị otú ahụ dị mkpa ka anyị wee ghara ikwe ka uche anyị na-awagharị mgbe ihe omume na-aga n’ihu. (Ilu 1:5) Ọ pụrụ ịchọ njide onwe onye iji ghara inye ndị ọzọ nsogbu site n’ịgbanyere onye nọ gị n’akụkụ izu kama ige ọkà okwu ntị nke ọma. Ịhazigharị ihe omume anyị ka anyị wee nwee ike ịdị na-abịa n’oge pụrụ ịchọ njide onwe onye. Ọzọkwa, njide onwe onye pụrụ ịdị mkpa iji wepụta oge iji kwadebe nzukọ ma mesịa kere òkè na ha.

13 Igosipụta njide onwe onye n’ihe ndị dị nta na-eme ka anyị nwekwuo ike ime otú ahụ n’ihe ndị ka ukwuu. (Luk 16:10) N’ihi ya, lee ka o si dị mma ịzụ onwe anyị ịdị na-agụchi Okwu Chineke na akwụkwọ ndị dabeere na Bible anya, na-amụ ha ma na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị na-amụta! Lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya ịzụ onwe anyị ịjụ ọrụ, ndị enyi, omume, na akparamàgwà ndị na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ịzụ onwe anyị ịjụ ihe omume ndị na-eri oge ndị dị oké ọnụ ahịa anyị ga-etinye n’ozi Chineke! Ịrụsi ọrụ ike n’ozi Jehova bụ n’ezie ihe nchebe dị mma megide ihe ndị pụrụ ịdọpụ anyị na paradaịs ime mmụọ nke bụ́ ọgbakọ Jehova zuru ụwa ọnụ.

Bụrụ Onye Tojuru Etoju Site ná Njide Onwe Onye

14. (a) Olee otú ụmụaka kwesịrị isi mụta igosipụta njide onwe onye? (b) Abamuru ndị dị aṅaa na-abịa mgbe ụmụaka mụtara ime otú ahụ mgbe ha ka dị obere?

14 E jighị inwe njide onwe onye ama nwa a mụrụ ọhụrụ. Otu akwụkwọ nta nke ndị ọkachamara bipụtara banyere akparamàgwà nwata na-akọwa, sị: “Njide onwe onye adịghị abịara onwe ya ma ọ bụ bịa na mberede. Ụmụ ọhụrụ na ndị na-amụ ije chọrọ nduzi na nkwado nke ndị mụrụ ha iji malite usoro nke ịmụta igosipụta njide onwe onye. . . . Site ná nduzi nke ndị mụrụ ha, ha na-egosipụtawanye njide onwe onye n’oge nile ha na-aga akwụkwọ.” Nnyocha e mere banyere ụmụaka dị afọ anọ gosiri na ndị mụtaworo igosipụtatụ njide onwe onye “na-etolitekarị ịghọ ndị nwere ezi nguzo, ndị a ma ama, ndị nwere ike ịnagide ihe, ndị nwere obi ike na ndị a pụrụ ịtụkwasị obi mgbe ha dị afọ iri na ụma.” Ndị na-amalitebeghị ịmụta nke a “yikarịrị ka ha ga-abụ ndị owu na-ama, ndị na-enwe nkụda mmụọ ngwa ngwa na ndị isi ike. Ha na-adakarị mbà n’obi ma ha nwee nrụgide, ha na-agbakwara ihe ịma aka ọsọ.” N’ụzọ doro anya, iji ghọọ onye toro eto nwere  ezi nguzo, nwatakịrị aghaghị ịmụta ịdị na-egosipụta njide onwe onye.

15. Gịnị ka enweghị njide onwe onye na-egosi, olee ihe mgbaru ọsọ e depụtara na Bible nke ahụ na-emegide?

15 N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị ga-abụ Ndị Kraịst tojuru etoju, anyị aghaghị ịmụta igosipụta njide onwe onye. Enweghị ike igosipụta ya na-egosi na anyị ka bụ ụmụ ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. Bible na-adụ anyị ọdụ ka anyị ‘bụrụ ndị tojuru etoju n’ikike nghọta ihe.’ (1 Ndị Kọrint 14:20) Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ‘inweta ịdị n’otu n’okwukwe ahụ na n’ezi ihe ọmụma banyere Ọkpara Chineke, ruo n’ogo nke nwoke tojuru etoju, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogo dịịrị izu ezu nke Kraịst ahụ.’ N’ihi gịnị? Ọ bụ “ka anyị wee ghara ịbụkwa ụmụ ọhụrụ, ndị ebili mmiri na-enugharị na ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị site n’aghụghọ nke ụmụ mmadụ, site n’aghụghọ dị n’ichepụta njehie.” (Ndị Efesọs 4:13, 14) N’ụzọ doro anya, ịmụta igosipụta njide onwe onye dị oké mkpa nye ọnọdụ ime mmụọ anyị.

Ịzụlite Njide Onwe Onye

16. Olee otú Jehova si enyere anyị aka?

16 Iji zụlite njide onwe onye, enyemaka Chineke dị anyị mkpa, a pụkwara inweta ya. Okwu Chineke, dị ka enyo zuru okè, na-egosi anyị ebe anyị kwesịrị ime mgbanwe n’ime onwe anyị, ọ na-enyekwa anyị ndụmọdụ banyere otú anyị ga-esi eme nke ahụ. (Jems 1:22-25) Òtù ụmụnna na-ahụ n’anya dịkwa njikere inyere anyị aka. Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-egosi nchebara echiche mgbe ha na-enyere anyị aka. Jehova n’onwe ya na-enye mmụọ nsọ ya n’efu ma ọ bụrụ na anyị arịọ maka ya n’ekpere. (Luk 11:13; Ndị Rom 8:26) N’ihi ya, ka anyị jiri ọṅụ na-eji ndokwa ndị a eme ihe. Aro ndị a tụrụ na peeji nke 21 pụrụ inye aka.

17. Agbamume dị aṅaa ka Ilu 24:16 na-enye anyị?

17 Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi na Jehova na-eji mgbalị anyị akpọrọ ihe mgbe anyị na-anwa ime ihe na-atọ ya ụtọ! Nke a kwesịrị ịkpali anyị ịnọgide na-agbalịsi ike igosipụtakwu njide onwe onye. N’agbanyeghị ugboro ole anyị pụrụ ịsụ ngọngọ, anyị agaghị akwụsị ma ọlị ịdị na-eme mgbalị. “Ugbo asaa ka onye ezi omume na-ada, biliekwa ọzọ.” (Ilu 24:16) Mgbe ọ bụla anyị nwere mmeri, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji nwee obi ụtọ. Anyị pụkwara ijide n’aka na Jehova nwere obi ụtọ n’ebe anyị nọ. Otu Onyeàmà na-ekwu na tupu ya arara ndụ ya nye Jehova, mgbe ọ bụla ya nwere ihe ịga nke ọma n’ịghara ise siga ruo otu izu, ya na-akwụghachi onwe ya ụgwọ site n’iji ego njide onwe onye mere ka ya chebe zụta ihe bara uru.

18. (a) Gịnị ka mgba anyị na-agba igosipụta njide onwe onye na-agụnye? (b) Mmesi obi ike dị aṅaa ka Jehova na-enye?

18 Karịsịa, anyị kwesịrị icheta na njide onwe onye na-agụnye uche na mmetụta uche. Anyị pụrụ ịhụ nke a n’okwu Jizọs: “Onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya.” (Matiu 5:28; Jems 1:14, 15) Ọ ga-adịrị onye mụtaworo ịchịkwa uche na mmetụta ya mfe ịchịkwa ahụ́ ya dum. N’ihi ya, ka anyị mee ka mkpebi anyị sikwuo ike izere, ọ bụghị nanị ime ihe ọjọọ, kama ọbụna ịdị na-eche ya n’echiche. Ọ bụrụ na echiche ndị na-ezighị ezi abata gị n’uche, wepụ ha ozugbo. Anyị pụrụ ịgbanahụ ọnwụnwa site n’iji ekpere lekwasị Jizọs anya. (1 Timoti 6:11; 2 Timoti 2:22; Ndị Hibru 4:15, 16) Ka anyị na-eme ike anyị nile, anyị ga na-agbaso ndụmọdụ dị n’Abụ Ọma 55:22: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”

Ị̀ Na-echeta?

• N’ụzọ abụọ dị aṅaa ka anyị na-aghaghị igosipụta njide onwe onye?

• Gịnị ka igosipụta “njide onwe onye n’ihe nile” pụtara?

• Aro ndị dị aṅaa dị irè maka ịzụlite njide onwe onye ka ị rịbara nnọọ ama mgbe ihe ọmụmụ a na-aga n’ihu?

• N’ebee ka njide onwe onye na-amalite?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ụzọ Isi Na-egosipụtakwu Njide Onwe Onye

• Na-azụlite ya ọbụna n’ihe ndị dị nta

• Na-atụgharị uche n’uru ndị ọ na-aba ugbu a na ndị ọ ga-aba n’ọdịnihu

• Na-eji ihe ndị Chineke na-anakwere edochi anya ndị ọ kpọrọ asị

• Na-ajụ echiche ndị na-ekwesịghị ekwesị ozugbo

• Na-eji echiche ndị na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ emejupụta uche gị

• Na-anakwere enyemaka pụrụ isite n’aka Ndị Kraịst ibe gị tozuru okè

• Na-ezere ọnọdụ ndị pụrụ ime ka i mebie okwukwe gị

• Na-ekpe ekpere maka enyemaka Chineke n’oge ọnwụnwa

[Foto ndị dị na peeji nke 18, 19]

Njide onwe onye na-akpali anyị ime ihe dị mma