Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mee Jehova Obi Ike Gị

Mee Jehova Obi Ike Gị

 Mee Jehova Obi Ike Gị

“Gị onwe gị bụ olileanya m, Onyenwe anyị Jehova: Gị bụ ntụkwasị obi [“obi ike,” NW] m site na nwata.”—ABỤ ỌMA 71:5.

1. Ihe ịma aka dị aṅaa chere nwa okoro ahụ na-azụ atụrụ bụ́ Devid ihu?

NWOKE ahụ dị nnọọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mita atọ n’ogologo. Ka a sịkwa ihe mere ụjọ ji jide ndị agha nke usoro agha nile nke Izrel ịlụso ya agha! Ruo ọtụtụ izu, kwa ụtụtụ na kwa uhuruchi, dike ndị Filistia ahụ bụ́ Golaịat tara usuu ndị agha Izrel ụta, na-ama ha aka ka ha wepụta otu dike ga-alụso ya agha. N’ikpeazụ, ọ bụghị onye agha kama ọ bụ onye ntorobịa nakweere ihe ịma aka ahụ. Ọdịdị onye ya na ya ga-alụ agha ahụ mere ka o yie ka nwa okoro ahụ na-azụ atụrụ bụ́ Devid ọ̀ bụ akakpọ. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na ihe agha Golaịat dị arọ karịa Devid! N’agbanyeghị nke ahụ, nwa okoro ahụ lụsoro dike ahụ agha ma ghọọ ihe atụ obi ike nke a ma ama.—1 Samuel 17:1-51.

2, 3. (a) Gịnị mere Devid ji nwee ike iji nnọọ obi ike lụsoo Golaịat agha? (b) Nzọụkwụ abụọ dị aṅaa dị mkpa iji mee Jehova obi ike anyị ka anyị ga-atụle?

2 Gịnị mere Devid ji nwee obi ike dị otú ahụ? Tụlee okwu ụfọdụ ihe ama na-egosi na ọ bụ Devid dere ha n’afọ ndụ ya ndị sochirinụ: “N’ihi na Gị onwe gị bụ olileanya m, Onyenwe anyị Jehova: Gị bụ ntụkwasị obi [“obi ike,” NW] m site na nwata.” (Abụ Ọma 71:5) Ee, dị ka nwata, Devid tụkwasịrị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu. O chere Golaịat ihu, na-asị: “Gị onwe gị na-ewere mma agha, werekwa ube, werekwa mkpụmkpụ ube, bịakwute m: ma mụ onwe m na-ewere aha Jehova nke usuu nile nke ndị agha bịakwute gị, bụ́ Chineke nke usoro agha nile nke Izrel, Onye ị taworo ụta.” (1 Samuel 17:45) Ebe Golaịat tụkwasịrị obi n’ike ya dị ukwuu na n’ihe agha ya, Devid tụkwasịrị Jehova obi. Ebe Eze Nwe eluigwe na ala kwụ ya n’akụkụ, n’ihi gịnị ka Devid ga-eji tụọ egwu mmadụ nkịtị, n’agbanyeghị otú ọ gbaruru dimkpa na ihe agha zuru ezu ọ pụrụ ịbụ na o ji?

3 Ka ị na-agụ banyere Devid, ọ̀ na-adị gị ka ya bụrụ na obi ike i nwere n’ebe Jehova nọ siri ike karị? O yikarịrị ka ọ na-adị ọtụtụ n’ime anyị otú ahụ. Ya mere, ka anyị nyochaa nzọụkwụ abụọ anyị pụrụ iwere iji mee Jehova obi ike anyị. Nke mbụ, ọ dị anyị mkpa ịlụso ihe na-abụkarị ihe mgbochi nye inwe obi ike dị otú ahụ ọgụ. Nke abụọ, ọ dị anyị mkpa ịmụta kpọmkwem ihe ịtụkwasị Jehova obi gụnyere.

 Imeri Ihe Na-emekarị Ka A Ghara Inwe Obi Ike n’Ebe Jehova Nọ

4, 5. N’ihi gịnị ka o ji esiri ọtụtụ ndị ike ịtụkwasị Chineke obi?

4 Gịnị na-egbochi ndị mmadụ ịtụkwasị Chineke obi? Ọtụtụ mgbe, ụfọdụ na-enwe mgbagwoju anya banyere ihe mere ihe ọjọọ ji na-eme. A na-akụziri ọtụtụ ndị na ọ bụ Chineke na-akpata nhụjuanya. Mgbe mmadụ nwụrụ, ndị ụkọchukwu pụrụ ịsị na ọ bụ Chineke “kpọọrọ” onye ahụ nwụrụ anwụ ka ọ nọnyere ya n’eluigwe. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ndú okpukpe na-akụzi na Chineke akawo ihe nile—gụnyere ọdachi ọ bụla ma ọ bụ ihe ọjọọ ọ bụla—na-eme n’ụwa a aka tupu o mee. Ọ ga-abụ ihe siri ike ịtụkwasị ụdị Chineke ahụ obi tara mmiri obi. Setan, bụ́ onye na-eme ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì, chọsiri ike ịkwalite “ozizi ndị mmụọ ọjọọ” nile dị otú ahụ.—1 Timoti 4:1; 2 Ndị Kọrint 4:4.

5 Setan chọrọ ka ndị mmadụ ghara ịtụkwasị Jehova obi. Onye iro Chineke ahụ achọghị ka anyị mara kpọmkwem ihe ndị na-akpata nhụjuanya nke mmadụ. Ọ bụrụ na anyị amụtawo ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru kpatara nhụjuanya, ọ ga-amasị Setan ka anyị chefuo ha. N’ihi ya, ọ dị mma ka anyị na-atụleghachi isi ihe atọ mere nhụjuanya ji dịrị n’ụwa site n’oge ruo n’oge. Site n’ime otú ahụ, anyị ga-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụghị Jehova na-akpata nsogbu ndị anyị na-eche ihu ná ndụ.—Ndị Filipaị 1:9, 10.

6. Olee otú 1 Pita 5:8 si mee ka otu ihe na-akpata nhụjuanya Ndị Kraịst pụta ìhè?

6 Otu ihe mere ụmụ mmadụ ji na-ahụsi anya bụ na Setan chọrọ imebi iguzosi ike n’ihe nke ndị Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ gbalịrị imebi iguzosi ike n’ihe Job. Setan kụrụ afọ n’ala na nke ahụ, ma ọ kwụsịbeghị mgbalị ya. Dị ka onye na-achị ụwa a, ọ na-achọ ‘iripịa’ ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi. (1 Pita 5:8) Nke ahụ na-agụnye onye ọ bụla n’ime anyị! Setan chọrọ ime ka anyị kwụsị ijere Jehova ozi. N’ihi ya, ọ na-akpalitekarị mkpagbu. Otú ọ dị, n’agbanyeghị na nhụjuanya dị otú ahụ na-akpatara anyị ihe mgbu, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-atachi obi. Site n’ime otú ahụ, anyị na-enye aka ime Setan onye ụgha ma na-eme Jehova obi ụtọ. (Job 2:4; Ilu 27:11) Ka Jehova na-ewusi anyị ike ịtachi obi ná mkpagbu, obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ na-esiwanye ike.—Abụ Ọma 9:9, 10.

7. Ihe dị aṅaa na-akpata nhụjuanya ka Ndị Galeshia 6:7 na-enyere anyị aka ịmata?

7 A na-achọta ihe ọzọ mere e ji nwee nhụjuanya n’ụkpụrụ a: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.” (Ndị Galeshia 6:7) Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-agha mkpụrụ site n’ime nhọrọ ndị na-ezighị ezi ma na-aghọrọ nhụjuanya dị ka ihe si na ya pụta. Ha pụrụ ịhọrọ ịkwọ ụgbọala ara ara, bụ́ nke pụrụ ịkpata ihe ọghọm. Ọtụtụ na-ahọrọ ise siga, bụ́ nke na-akpata ọrịa obi ma ọ bụ ọrịa cancer akpa ume. Ndị na-ahọrọ itinye aka n’omume mmekọahụ na-ezighị ezi na-anọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e mebiri mmekọrịta ezinụlọ ha, ịtụfu ùgwù ha, inweta ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ, na ịtụrụ ime ọkwà. Ndị mmadụ pụrụ ịchọ ịta Chineke ụta maka ahụhụ ndị dị otú ahụ, ma n’ezie, ọ bụ mkpebi na-ezighị ezi ha mere n’onwe ha kpataara ha nsogbu.—Ilu 19:3.

8. Dị ka e dere n’Eklisiastis 9:11, n’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji ata ahụhụ?

8 E kwuru ihe nke atọ na-akpata nhụjuanya n’Eklisiastis 9:11: “M laghachiri, hụ n’okpuru anyanwụ, na ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka ịwụ ọsọ dịịrị, ọ bụghịkwa ndị dị ike ka agha dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nghọta ka akụ̀ dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị; kama mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ nnọọ na ndị mmadụ nọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị. N’agbanyeghị ike ma ọ bụ adịghị ike anyị, nhụjuanya ma ọ bụ ọnwụ pụrụ irute onye ọ bụla n’ime anyị mgbe ọ na-atụghị anya ya. Dị ka ihe atụ, n’oge Jizọs, otu ụlọ elu dara na Jeruselem ma gbuo mmadụ 18. Jizọs gosiri na ọ bụghị ntaramahụhụ ka Chineke na-enye ndị ahụ n’ihi mmehie ndị ha metara mgbe ha dị ndụ. (Luk 13:4) Ee e, e kwesịghị ịta Jehova ụta maka nhụjuanya dị otú ahụ.

9. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-adịghị aghọta banyere nhụjuanya?

 9 Ịmata ụfọdụ ihe ndị na-akpata nhụjuanya dị mkpa. Otú ọ dị, e nwere otu akụkụ nke okwu ahụ bụ́ nke na-esiri ọtụtụ ndị ike nghọta. Ọ bụ nke a: N’ihi gịnị ka Jehova Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị?

N’ihi Gịnị Ka Jehova Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?

10, 11. (a) Dị ka e dere ná Ndị Rom 8:19-22, gịnị mere “ihe nile e kere eke”? (b) Olee otú anyị pụrụ isi chọpụta onye doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu?

10 Otu akụkụ nke akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Rom mere ka a ghọtakwuo isiokwu a dị mkpa. Pọl dere, sị: “Ịtụsi anya ike nke ihe e kere eke na-echere mkpughe nke ụmụ Chineke. N’ihi na e doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu, ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ya kama site n’aka onye ahụ nke doro ya, na-adabere n’olileanya bụ́ na a ga-emekwa ka ihe e kere eke n’onwe ya nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke. N’ihi na anyị maara na ihe nile e kere eke nọgidere na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.”—Ndị Rom 8:19-22.

11 Iji ghọta isi ihe ndị dị n’amaokwu ndị a, ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ zaa ajụjụ ụfọdụ ndị bụ́ isi. Dị ka ihe atụ, Ònye doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu? Ụfọdụ ekwuwo na ọ bụ Setan; ndị ọzọ asị na ọ bụ Adam. Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha ọ pụrụ ịbụ ya doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na onye ahụ nke doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu mere otú ahụ “na-adabere n’olileanya.” Ee, o mere ka e nwee olileanya na ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ga-emesịa “pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure.” Ma Adam ma Setan apụghị ime ka e nwee olileanya dị otú ahụ. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ime otú ahụ. Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, ọ bụ ya doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu.

12. Olee ihe mgbagwoju anya bilitere n’ihe banyere ihe “ihe nile e kere eke” pụtara, oleekwa otú a pụrụ isi zaa ajụjụ a?

12 Otú ọ dị, gịnị bụ “ihe nile e kere eke” e zoro aka na ya n’akụkụ ihe odide a? Ụfọdụ na-asị na “ihe nile e kere eke” na-ezo aka n’ala nkịtị, gụnyere ụmụ anụmanụ na ihe ọkụkụ. Ma ụmụ anụmanụ na ihe ọkụkụ hà nwere olileanya nke inweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke”? Ee e. (2 Pita 2:12) Mgbe ahụ, “ihe nile e kere eke” pụrụ izo aka nanị n’ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ nke a bụ ihe e kere eke nke mmehie na ọnwụ na-emetụta n’ihi nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’Iden, nke olileanya dịkwa mkpa nke ukwuu.—Ndị Rom 5:12.

13. Gịnị ka nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’Iden mere ihe a kpọrọ mmadụ?

13 Gịnị kpọmkwem ka nnupụisi ahụ kpataara  ihe a kpọrọ mmadụ? Pọl ji okwu abụọ kọwaa ihe si na ya pụta: ihe efu. Dị ka otu akwụkwọ ntụaka si kwuo, okwu a na-akọwa “ịbụ ihe efu nke ihe na-adịghị arụ ọrụ e mere ya ịrụ.” E mere ụmụ mmadụ ka ha na-adị ndụ ebighị ebi, na-arụkọ ọrụ dị ka ezinụlọ dị n’otu, nke zukwara okè n’ilekọta paradaịs elu ala. Kama nke ahụ, ha na-ebi ndụ dị mkpụmkpụ, nke ihe mgbu jupụtara, ọtụtụ mgbe bụrụkwa nke na-agbakasị ahụ́. Dị ka Job si kwuo ya, “mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) Ọ bụ ihe efu n’ezie!

14, 15. (a) Ihe ama dị aṅaa nke ikpe ziri ezi ka anyị na-achọta n’ikpe Jehova mara ihe a kpọrọ mmadụ? (b) N’ihi gịnị ka Pọl ji kwuo na e doro ihe e kere eke ịbụ ihe efu “ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ya”?

14 Anyị eruteziela n’ajụjụ bụ́ isi: N’ihi gịnị ka “Onyeikpe ụwa nile” ji doo ihe a kpọrọ mmadụ ibi ndụ nke ihe mgbu na mgbakasị ahụ́? (Jenesis 18:25) Ihe ahụ o mere ò ziri ezi? Ọ dị mma, cheta ihe nne na nna anyị mbụ mere. Site n’inupụrụ Chineke isi, ha sonyeere Setan, bụ́ onye mara ọbụbụeze Jehova aka n’ụzọ siri ike. N’ihi ihe ahụ ha mere, ha kwadoro nzọrọ ahụ bụ́ na mmadụ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’adabereghị na Jehova, na-achị onwe ya n’okpuru nduzi nke mmụọ e kere eke nupụrụ isi. N’ịma ndị nnupụisi ahụ ikpe, Jehova nyeziri ha ihe ha rịọrọ maka ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. O nyere mmadụ ohere ịchị onwe ya n’okpuru ikike Setan. N’ọnọdụ dị otú ahụ, olee mkpebi nke pụrụ izi nnọọ ezi karịa ido ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ ihe efu ma ná ndabere nke olileanya?

15 N’ezie, nke a abụghị n’ihi ‘ọchịchọ nke ihe e kere eke.’ A mụrụ anyị dị ka ohu nke mmehie na ire ure, anyị enweghịkwa nhọrọ ọ bụla ime n’okwu ahụ. Ma Jehova, site n’obi ebere ya, nyere Adam na Iv ohere ibizu ndụ ha fọdụrụnụ na ịmụ ụmụ. Ọ bụ ezie na dị ka ụmụ ha, e doro anyị n’ihe efu nke mmehie na ọnwụ, anyị nwere ohere ime ihe ahụ Adam na Iv na-emeghị. Anyị pụrụ ige Jehova ntị ma mụta na ọbụbụeze ya ziri ezi ma zuo okè, ebe ọchịchị ụmụ mmadụ na-achị n’adabereghị na Jehova na-eweta nanị ihe mgbu, obi nkoropụ, na ihe efu. (Jeremaịa 10:23; Mkpughe 4:11) Mmetụta Setan na-emekwa ka ihe na-akawanye nanị njọ. Akụkọ ihe mere eme nke mmadụ na-agba akaebe banyere eziokwu ndị a.—Eklisiastis 8:9.

16. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ọ bụghị Jehova na-akpata nhụjuanya nke anyị na-ahụ n’ụwa taa? (b) Olileanya dị aṅaa ka Jehova jiworo ịhụnanya mee ka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nwee?

16 N’ụzọ doro anya, Jehova nwere ezi ihe ndị mere o ji doo ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ ihe efu. Otú ọ dị, nke ahụ ọ̀ pụtara na ọ bụ Jehova na-akpata ihe efu na nhụjuanya na-abịakwasị onye ọ bụla n’ime anyị taa? Cheedị echiche banyere ọkàikpe nke mara omekome ikpe n’ụzọ ziri ezi. Onye ahụ a mara ikpe pụrụ ịta ahụhụ dị ukwuu ka ọ na-anọzu oge mkpọrọ ya, ma ọ̀ pụrụ izi ezi ịta ọkàikpe ahụ ụta na ọ bụ ya kpataara ya ahụhụ ahụ ọ na-ata? Ọ dịghị ma ọlị! Ọzọkwa, ọ dịghị mgbe ọ bụ Jehova na-akpata ajọ omume. Jems 1:13 na-ekwu, sị: “A pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” Ka anyị chetakwa na Jehova kwupụtara amamikpe a ‘ná ndabere nke olileanya.’ O jiriwo ịhụnanya meere ndị na-ekwesị ntụkwasị obi sitere n’eriri Adam na Iv ndokwa ịhụ njedebe nke ihe efu na inwe obi ụtọ inweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” Ruo mgbe nile ebighị ebi, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-echegbu onwe ha na ihe nile e kere eke ga-adaba ọzọ n’ọnọdụ na-egbu mgbu nke ihe efu. Jehova ime ihe n’ụzọ ziri ezi ga-emeworị ka a mara oruru o ruuru ya ịbụ eze ruo mgbe ebighị ebi.—Aịsaịa 25:8.

17. Olee otú ịtụleghachi ihe ndị mere e ji nwee nhụjuanya n’ụwa taa kwesịrị isi metụta anyị?

17 Ka anyị na-atụle ihe mere nhụjuanya ji dịrị, ànyị na-ahụ ihe mere anyị ga-eji taa Jehova ụta n’ihi ajọ omume ndị a na-eme ma ọ bụ ghara inwe obi ike n’ebe ọ nọ? N’ụzọ megidere nke ahụ, ihe ọmụmụ dị otú ahụ na-enye anyị ezi ihe mere anyị ga-eji kwere n’okwu Mozis bụ́: “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi  ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Site n’ịtụgharị uche n’ihe ndị a, ka anyị na-atụleghachi nghọta anyị nwere banyere ha site n’oge ruo n’oge. N’ụzọ dị otú ahụ, mgbe ọnwụnwa chere anyị ihu, anyị ga-eguzogide mgbalị Setan na-eme iji kụnye obi abụọ n’ime uche anyị. Otú ọ dị, gịnị banyere nzọụkwụ nke abụọ a kpọtụrụ aha ná mmalite? Gịnị ka ịtụkwasị Jehova obi gụnyere?

Ihe Ịtụkwasị Jehova Obi Pụtara

18, 19. Okwu ndị dị aṅaa ka Bible ji na-agba anyị ume ịtụkwasị Jehova obi, ma echiche ndị dị aṅaa na-ezighị ezi ka ụfọdụ na-enwe banyere nke ahụ?

18 Okwu Chineke na-agba anyị ume, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” (Ilu 3:5, 6) Okwu ndị ahụ bụ okwu ndị na-enye obi ụtọ ma na-emesi obi ike. N’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’eluigwe na ala e kwesịrị ịtụkwasị obi karịa Nna anyị nke eluigwe anyị hụrụ n’anya. Ka o sina dị, ọ na-adịkarị mfe ịgụ okwu ndị a dị n’Ilu agụ karịa itinye ha n’ọrụ.

19 Ọtụtụ ndị nwere echiche ndị hiere ụzọ banyere ihe ịtụkwasị Jehova obi pụtara. Ụfọdụ na-ewere ụdị ntụkwasị obi ahụ dị ka nanị mmetụta, ụdị mmetụta uche na-enye ọṅụ bụ́ nke kwesịrị ịbịara onwe ya n’ime obi. O yiri ka ndị ọzọ hà kweere na ịtụkwasị Chineke obi pụtara na anyị pụrụ ịtụ anya ka o chebe anyị pụọ n’ihe isi ike nile anyị na-enwe, ka o wepụ nsogbu anyị nile, ka o mee ka anyị merie ihe ịma aka nile anyị na-enweta kwa ụbọchị kpọmkwem otú anyị si tụọ anya ya—meekwa ha ozugbo! Ma echiche ndị dị otú ahụ enweghị ihe ndabere. Ntụkwasị obi karịrị nnọọ nanị inwe mmetụta, ọ bụghịkwa ihe a na-apụghị inweta enweta. Nye ndị toruworo ogo mmadụ, ntụkwasị obi gụnyere ime mkpebi ndị a kpachapụrụ anya mee na ndị ezi uche dị na ha.

20, 21. Gịnị ka ịtụkwasị Jehova obi gụnyere? Nye ihe atụ.

20 Rịbakwa ama ihe Ilu 3:5 na-ekwu. Ọ na-egosi ọdịiche dị n’ịtụkwasị Jehova obi na ịdabere ná nghọta nke onwe anyị, na-enye echiche na anyị apụghị ime ha abụọ. Nke ahụ ọ̀ pụtara na e nyeghị anyị ohere iji ikike nghọta anyị mee ihe? Ee e, n’ihi na Jehova, bụ́ onye nyere anyị ikike ndị a na-atụ anya ka anyị na-eji ha eme ihe n’ijere ya ozi. (Ndị Rom 12:1) Ma na gịnị ka anyị na-adabere mgbe anyị na-eme mkpebi? Mgbe echiche anyị na-ekwekọghị na nke Jehova, ànyị na-anakwere amamihe ya n’ihi ihe ọ bụ—nke dị nnọọ elu karịa nke anyị? (Aịsaịa 55:8, 9) Ịtụkwasị Jehova obi pụtara ikwe ka echiche ya na-eduzi nke anyị.

21 Iji maa atụ: Chee echiche banyere nwatakịrị nọ n’oche azụ nke ụgbọala, ndị mụrụ ya anọrọkwa n’ihu. Nna ya na-akwọ ụgbọala ahụ. Mgbe nsogbu bilitere ka ha na-eme njem—ihe banyere ụzọ ha ga-esi gaa ebe ha na-aga ma ọ bụ ikekwe nsogbu banyere ihu igwe ma ọ bụ otú ụzọ ha si aga dị—olee otú nwatakịrị na-erube isi na nke tụkwasịrị ndị mụrụ ya obi si emeghachi omume? Ọ̀ na-esite n’azụ na-agwa nna ya n’oké olu ụzọ ha ga-esi gaa na otú ọ ga-esi kwọọ ụgbọala ahụ? Ọ̀ na-agbagha mkpebi ndị mụrụ ya mere ma ọ bụ ghara ikechi belt oche ya mgbe ha chetaara ya ka o mee otú ahụ? Ee e, dị ka ọ na-adịkarị, ọ na-atụkwasị ndị mụrụ ya obi ime ihe banyere ọnọdụ ndị dị otú ahụ, n’agbanyeghị na ha bụ ndị na-ezughị okè. Jehova bụ Nna zuru okè. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịtụkwasị ya obi n’ụzọ zuru ezu, karịsịa mgbe anyị zutere ọnọdụ ndị na-ama aka?—Aịsaịa 30:21.

22, 23. (a) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-atụkwasị Jehova obi mgbe nsogbu chere anyị ihu, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

 22 Otú ọ dị, Ilu 3:6 na-egosi na anyị kwesịrị ‘ịmara Jehova n’ụzọ anyị nile,’ ọ bụghị nanị mgbe anyị chere ọnọdụ ndị siri ike ihu. Ya mere, mkpebi ndị anyị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị kwesịrị igosipụta ntụkwasị obi anyị nwere n’ebe Jehova nọ. Mgbe nsogbu bilitere, anyị ekwesịghị inwe obi nkoropụ, ịma jijiji, ma ọ bụ ịjụ nduzi Jehova banyere ụzọ kasị mma isi mee ihe. Anyị kwesịrị ile ọnwụnwa anya dị ka ohere anyị nwere iji kwado ọbụbụeze Jehova, iji nye aka gosi na Setan bụ onye ụgha, na iji zụlite nrubeisi na àgwà ndị ọzọ na-atọ Jehova ụtọ.—Ndị Hibru 5:7, 8.

23 Anyị pụrụ igosipụta na anyị tụkwasịrị Jehova obi n’agbanyeghị ihe mgbochi ọ bụla anyị pụrụ izute. Anyị na-eme otú ahụ site n’ekpere ndị anyị na-ekpe na n’otú anyị si elegara Okwu Jehova na nzukọ ya anya maka nduzi. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta kpọmkwem na anyị tụkwasịrị Jehova obi mgbe nsogbu ndị a na-enwe n’ụwa taa chere anyị ihu? Isiokwu na-esonụ ga-atụle okwu ahụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú Devid si gosi na ya mere Jehova obi ike ya?

• Gịnị bụ ihe atọ na-akpatara ụmụ mmadụ nhụjuanya taa, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mma ịtụleghachi ha site n’oge ruo n’oge?

• Ikpe dị aṅaa ka Jehova mara ihe a kpọrọ mmadụ, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ ikpe ziri ezi?

• Gịnị ka ịtụkwasị Jehova obi gụnyere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Devid mere Jehova obi ike ya

[Foto dị na peeji nke 10]

Jizọs gosiri na mgbe otu ụlọ elu dara na Jeruselem, ọ bụghị Jehova kpatara ya