Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ohu Jehova Nwere Ezi Olileanya

Ndị Ohu Jehova Nwere Ezi Olileanya

 Ndị Ohu Jehova Nwere Ezi Olileanya

“Ndị Jekọb fọdụrụ ga-adịkwa n’etiti ọtụtụ ndị dị iche iche dị ka igirigi sitere n’ebe Jehova nọ, . . . nke na-adịghị ele anya onye ọ bụla.”—MAỊKA 5:7.

1. Olee otú Izrel ime mmụọ si bụrụ ndị e si n’aka ha enweta ume ọhụrụ?

JEHOVA bụ Onye Okike ukwu nke mmiri ozuzo na igirigi. Ọ baghị uru ilegara ụmụ mmadụ anya ka ha nye igirigi ma ọ bụ mmiri ozuzo. Maịka onye amụma dere, sị: “Ndị Jekọb fọdụrụ ga-adịkwa n’etiti ọtụtụ ndị dị iche iche dị ka igirigi sitere n’ebe Jehova nọ, dị ka abụrụbụ mmiri n’elu ihe ọkụkụ; nke na-adịghị ele anya onye ọ bụla, nke na-adịghị echerekwa ụmụ mmadụ.” (Maịka 5:7) Ole ndị bụ “ndị Jekọb fọdụrụ” n’oge a? Ha bụ ndị Izrel ime mmụọ, ihe fọdụrụ ‘n’Izrel nke Chineke.’ (Ndị Galeshia 6:16) Nye “ọtụtụ ndị dị iche iche” bi n’ụwa, ha dị ka ‘igirigi na-enye ume ọhụrụ nke sitere n’ebe Jehova nọ’ na “abụrụbụ mmiri n’elu ihe ọkụkụ.” Ee, Ndị Kraịst e tere mmanụ taa bụ ngọzi si n’aka Chineke nye ndị mmadụ. Dị ka ndị nkwusa Alaeze, Jehova si n’aka ha eme ka ndị mmadụ nụ ozi ya nke na-enye olileanya.

2. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee ezi olileanya n’agbanyeghị na anyị na-ebi n’ụwa a nke nọ ná nsogbu?

2 O kwesịghị iju anyị anya na ụwa a enweghị ezi olileanya. Ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndakpọ omume ọma, mpụ, nsogbu akụ̀ na ụba, iyi ọha egwu, agha—anyị na-atụ anya ihe ndị dị otú a n’ụwa nke Setan bụ́ Ekwensu na-achị. (1 Jọn 5:19) Ọtụtụ ndị na-atụ egwu ihe ọdịnihu ga-abụ. Otú ọ dị, dị ka ndị na-efe Jehova, egwu adịghị atụ anyị n’ihi na anyị nwere olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu. Ọ bụ ezi olileanya n’ihi na ọ dabeere n’Okwu Chineke. Anyị nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ nakwa n’Okwu ya n’ihi na ihe o kwuru na-emezu mgbe nile.

3. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ga-eji mee ihe megide Izrel na Juda? (b) N’ihi gịnị ka okwu Maịka ji metụta oge a?

3 Amụma Maịka nke sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke na-ewusi anyị ike ijegharị n’aha Jehova ma na-enye anyị ihe mere anyị ga-eji nwee ezi olileanya. Na narị afọ nke asatọ T.O.A., mgbe Maịka buru amụma, e kewara ndị Chineke ha na ya nọ n’ọgbụgba ndụ ịbụ mba abụọ—Izrel na Juda—ha abụọ kwa nọ na-eleghara ọgbụgba ndụ Chineke anya. Ihe si na ya pụta bụ ndakpọ omume, ndapụ n’ezi ofufe, na oké ịhụ ihe onwunwe n’anya. N’ihi ya, Jehova dọrọ ha aka ná ntị na ya ga-eme ihe megide ha. N’ezie, ọ bụ ndị ha na Maịka dịkọrọ ndụ ka e nyere ịdọ aka ná ntị Chineke. Ma, ọnọdụ dị n’oge anyị yiri nnọọ nke dị n’oge Maịka nke na ihe ndị o kwuru na-emetụtakwa oge anyị. Nke a ga-apụta ìhè ka anyị na-atụle isi ihe ụfọdụ dị n’isiakwụkwọ asaa nke akwụkwọ Maịka.

 Ihe Ntụle Dị Mkpirikpi Na-ekpughe

4. Ihe ọmụma dị aṅaa ka Maịka isi 1 ruo na nke 3 na-enye?

4 Ka anyị tụlee ná mkpirikpi ihe ndị dị na Maịka. N’isi 1, Jehova kpughere nnupụisi nke Izrel na Juda. A ga-ebibi Izrel n’ihi nnupụisi ya, ntaramahụhụ a ga-enyekwa Juda ga-eru ọbụna n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem. Isi nke 2 na-ekpughe na ndị bara ọgaranya na ndị dị ike na-emegbu ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị onye inyeaka. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịkwa nkwa Chineke kwere. A ga-achịkọta ndị Chineke n’otu. Isi nke 3 na-akọ banyere nkwupụta okwu nke Jehova megide ndị ndú mba ahụ na ndị amụma ya na-enupụ isi. Ndị ndú ahụ nọ na-agbagọ ikpe ziri ezi, ndị amụma nọkwa na-ekwu okwu ụgha. N’agbanyeghị nke a, mmụọ nsọ nyere Maịka ike ịkpọsa ikpe Jehova nke na-abịanụ.

5. Gịnị bụ isi ihe ndị dị na Maịka isi nke 4 na nke 5?

5 Isi nke 4 na-ebu amụma na n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, mba nile ga-abịa n’ugwu e buliri elu nke ụlọ Jehova iji bụrụ ndị o ziri ihe. Tupu nke ahụ, a ga-eme ka Juda jee biri na Babilọn, ma Jehova ga-anapụta ya. Isi nke 5 na-ekpughe na a ga-amụ Mezaịa ahụ na Betlehem nke Juda. Ọ ga-azụ ndị ya dị ka atụrụ, ọ ga-anapụtakwa ha n’aka mba ndị na-emegbu ha.

6, 7. Isi ihe ndị dị aṅaa dị n’isi nke 6 na nke 7 nke amụma Maịka?

6 E dekọrọ n’ụdị okwu ikpe, ihe Jehova kwuru na ndị ya mere na Maịka isi nke 6. Gịnị ka O mere nke mere ka ha nupụrụ ya isi? Ọ dịghị ihe o mere. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ọ chọrọ n’aka ha agabigaghị ókè. Ọ chọrọ ka ndị na-efe ya ofufe na-ekpe ikpe ziri ezi, nwee obiọma ma dị obi umeala ka ha so ya na-eje ije. Kama ime nke ahụ, Izrel na Juda agbasowo ụzọ nke nnupụisi, ha ga-enwetakwa ihe ndị ga-esi na ya pụta.

7 N’isiakwụkwọ nke ikpeazụ nke amụma ya, Maịka katọrọ ajọ omume nke ndị ya na ha dịkọrọ ndụ. Otú ọ dị, o nweghị nkụda mmụọ n’ihi na o kpebisiri ike ‘ichere’ Jehova. (Maịka 7:7) Ihe mechiri akwụkwọ ahụ bụ nkwupụta nke obi ike na Jehova ga-enwe obi ebere n’ahụ́ ndị Ya. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na e mezuru olileanya a. Na 537 T.O.A., mgbe Jehova nyesịrị ndị ya ntaramahụhụ, o ji obi ebere weghachi ndị fọdụrụnụ n’ala nke aka ha.

8. Olee otú ị ga-esi chịkọta ihe ndị dị n’akwụkwọ Maịka?

 8 Lee ihe ọmụma mara nnọọ mma nke Jehova na-ekpughe site n’ọnụ Maịka! Akwụkwọ a nke sitere n’ike mmụọ nsọ na-enye ihe atụ ịdọ aka ná ntị nke ụzọ Chineke si emeso ndị na-ekwu na ha na-ejere ya ozi ma bụrụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Akwụkwọ a buru ihe ndị na-eme taa n’amụma. Ọ na-enyekwa ndụmọdụ sitere n’aka Chineke banyere otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà n’oge ndị a siri ike iji mee ka olileanya anyị bụrụ nke siri ike.

Eze Onyenwe Anyị Jehova Ekwuo Okwu

9. Dị ka e dekọrọ na Maịka 1:2, gịnị ka Jehova gaje ime?

9 Ugbu a, ka anyị nyochaa akwụkwọ Maịka n’ụzọ miri emi karị. Na Maịka 1:2, anyị na-agụ, sị: “Nụrụnụ, unu ndị nile dị iche iche, unu nile; ṅaa ntị, gị ụwa, na ùjú ya: ka Onyenwe anyị Jehova ghọọ onye àmà n’etiti unu, bụ́ Onyenwe anyị site n’ụlọukwu Ya dị nsọ.” Ọ bụrụ na ị dị ndụ n’oge Maịka, obi abụọ adịghị ya na okwu ndị ahụ gaara adọrọ mmasị gị. N’ezie, ha na-adọrọ mmasị gị n’ihi na Jehova si n’ụlọukwu ya dị nsọ na-ekwu okwu, ndị ọ na-agwakwa okwu abụghị nanị ndị Izrel na Juda kamakwa ndị nọ n’ebe nile. N’oge Maịka, ndị mmadụ leghaara Eze Onyenwe anyị Jehova anya ruo ogologo oge. Nke ahụ ga-agbanwe n’oge na-adịghị anya. Jehova kpebiri ime ihe pụtara ìhè.

10. N’ihi gịnị ka okwu ndị dị na Maịka 1:2 ji dị mkpa nye anyị?

10 Otú ahụ ka ọ dịkwa n’oge anyị. Mkpughe 14:18-20 na-egosi na Jehova si n’ụlọukwu ya dị nsọ na-ekwu okwu ọzọ. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ihe pụtara ìhè, ihe omume ndị dị oké mkpa ga-emekwa ka ụmụ mmadụ maa jijiji. Na nke ugbu a, a ga-awụba ajọ ‘vaịn nke ụwa dum’ n’ime nnukwu ebe nzọchapụta mmanya nke iwe Jehova, bụ́ nke ga-arụpụta mbibi zuru ezu nke usoro ihe Setan.

11. Gịnị ka okwu ndị dị na Maịka 1:3, 4 pụtara?

11 Gee ntị ihe Jehova gaje ime. Maịka 1:3, 4 na-ekwu, sị: “Lee, Jehova na-esi n’ebe Ya pụta, Ọ ga-arịdatakwa, zọkwasị ebe dị elu nile nke ụwa ụkwụ. Ugwu nile ga-agbazekwa n’okpuru Ya, a ga-agbawakwa ndagwurugwu nile, dị ka wax n’ihu ọkụ, dị ka mmiri nke a na-awụda n’ebe nrịda.” Jehova ọ̀ ga-ahapụ ebe obibi ya n’eluigwe ma zọkwasị ụkwụ n’ụzọ a na-ahụ anya n’elu ugwu na na mbara ala nke Ala Nkwa ahụ? Ee e. Ọ dịghị ya mkpa ime otú ahụ. Ihe ọ ga-eme bụ nanị iche ihu n’ebe ụwa dị iji mezuo uche ya. Ọzọkwa, ọ bụghị ala nkịtị, kama ọ bụ ndị bi na ya ka ihe ndị ahụ a kọwara ga-adakwasị. Mgbe Jehova ga-eme ihe, ọ ga-arụpụtara ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi ọdachi—dị ka a ga-asị na ugwu agbazewo dị ka wax nakwa na ala ọma jijiji ekewawo mbara ala.

12, 13. N’ikwekọ n’ihe e dere na 2 Pita 3:10-12, gịnị na-eme ka olileanya anyị bụrụ nke e ji n’aka?

12 Okwu amụma ndị e dekọrọ na Maịka 1:3, 4, pụrụ ichetara gị amụma ọzọ sitere n’ike mmụọ nsọ, nke kwuru banyere ọdachi ndị ga-ewere ọnọdụ n’ụwa. Dị ka e dekọrọ na 2 Pita 3:10, Pita onyeozi dere, sị: “Ụbọchị Jehova ga-abịa dị ka onye ohi, bụ́ mgbe eluigwe ga-eji oké ụzụ gabiga, ma ihe ndị dị n’ígwé, n’ịbụ ndị dị oké ọkụ, ga-agbaze, a ga-ekpughekwa ụwa na ọrụ ndị dị n’ime ya.” N’ụzọ yiri amụma Maịka, ihe Pita kwuru adịghị emetụta eluigwe na ala nkịtị. Ha na-ezo aka n’oké mkpagbu nke ga-abịakwasị usoro ihe a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke.

13 N’agbanyeghị ọdachi ahụ na-abịanụ, Ndị Kraịst pụrụ inwe obi ike n’ọdịnihu, dị nnọọ ka Maịka nwere. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịgbaso ndụmọdụ ahụ dị n’amaokwu ndị na-esonụ n’akwụkwọ ozi Pita. Onyeozi ahụ na-ekwu, sị: “Lee ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche!” (2 Pita 3:11, 12) Olileanya anyị nwere maka ọdịnihu ga-abụ nke e ji n’aka ma ọ bụrụ na anyị enwee obi nke na-erube isi ma jide n’aka na omume anyị dị nsọ nakwa na ndụ anyị jupụtara n’omume nke nsọpụrụ  Chineke. Iji mee ka olileanya anyị bụrụ nke e ji n’aka, anyị aghaghịkwa icheta na ụbọchị Jehova aghaghị ịbịa.

14. N’ihi gịnị ka Izrel na Juda ji kwesị inweta ntaramahụhụ?

14 Jehova na-akọwa ihe mere e ji kwesị inye ndị ya nke oge ochie ntaramahụhụ. Maịka 1:5 na-ekwu, sị: “N’ihi njehie Jekọb ka ihe a nile dị, na n’ihi mmehie nile nke ụlọ [Izrel]. Gịnị bụ njehie Jekọb? ọ́ bụghị Sameria? gịnị bụkwa ebe dị elu nile nke Juda? há abụghị [Jeruselem]?” Ọ bụ Jehova mere ka e nwee Izrel na Juda. N’agbanyeghị nke ahụ, ha enupụworo ya isi, nnupụisi ha eruwokwa kpọmkwem n’isi obodo ha, bụ́ Sameria na Jeruselem.

Ajọ Omume Zuru Ebe Nile

15, 16. Ikpe omume ọjọọ ndị dị aṅaa mara ndị ha na Maịka dịkọrọ ndụ?

15 E nyere otu ihe atụ doro anya nke ajọ omume nke ndị ha na Maịka dịkọrọ ndụ na Maịka 2:1, 2: “Ahụhụ dịrị ndị na-echepụta ajọ ihe, na-arụkwa ihe ọjọọ n’elu ihe ndina ha! n’ìhè nke ụtụtụ ka ha na-eme ya, n’ihi na ọ dị n’ike aka ha. Ha wee tụkwasị anyaukwu n’ubi, nara ha n’ike; ha tụkwasị anyaukwu n’ụlọ, buru ha: ha emegbuwokwa ma nwoke ma ụlọ ya, bụ́ onye ọ bụla na ala nketa ya.”

16 Ndị anyaukwu na-amụ anya n’abalị wee na-akpa nkata otú ha ga-esi nara ndị agbata obi ha ala ha na ụlọ ha n’ike. Mgbe chi bọrọ, ha na-eme ngwa ngwa imezu atụmatụ ha. Ha agaghị eme ụdị ihe ọjọọ ndị ahụ ma ọ bụrụ na ha echeta ọgbụgba ndụ Jehova. Iwu Mozis kwuru ka a na-echebe ndị ogbenye. Dị ka iwu a si kwuo, ọ dịghị ezinụlọ a ga-anara ihe nketa ya kpam kpam. Otú ọ dị, nke ahụ agbasaghị ndị anyaukwu ahụ. Ha na-eleghara ihe e kwuru na Levitikọs 19:18 anya, bụ́ nke na-asị: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.”

17. Gịnị pụrụ ime mgbe ndị na-ekwu na ha na-ejere Chineke ozi butere ihe onwunwe ụzọ?

17 Nke a na-egosi ihe pụrụ ime mgbe ndị na-ekwu na ha na-ejere Chineke ozi leghaara ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ anya ma buru ụzọ na-achọ ihe onwunwe. Pọl dọrọ Ndị Kraịst nke oge ya aka ná ntị, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi.” (1 Timoti 6:9) Mgbe mmadụ mere ka inweta ego bụrụ ihe mgbaru ọsọ bụ́ isi ná ndụ ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ na-efe chi ụgha—Akụ̀ na Ụba. Chi ụgha ahụ adịghị eme ka e nwee olileanya ọ bụla e ji n’aka maka ọdịnihu.—Matiu 6:24.

18. Gịnị gaje ime ndị hụrụ ihe onwunwe n’anya n’oge Maịka?

18 Ọtụtụ ndị oge Maịka mụtara n’ụzọ siri ike na ịdabere n’ihe onwunwe bụ nnọọ ihe efu. Dị ka e dekọrọ na Maịka 2:4, Jehova na-ekwu, sị: “N’ụbọchị ahụ ka a ga-atụ ilu megide unu, gosie ákwá ike, sị: A pụnarịsịwo anyị ihe: òkè ndị m ka Ọ na-agbanwe: lee ka O si ewepụrụ m ya nke ukwuu! ọ bụ onye nke na-adaghachi azụ ka Ọ na-ekere ubi nile anyị.” Ee, ihe nketa ezinụlọ nke ndị ahụ na-ezu ụlọ na ubi n’ohi ga-efunahụ ha. A ga-ebuga ha ala ọzọ, ihe onwunwe ha ga-aghọkwa ihe nkwata n’agha nke “ndị na-adaghachi azụ,” ma ọ bụ ndị mba ọzọ. Olileanya nile nke inwe ihe ịga nke ọma n’ọdịnihu ga-akụ afọ n’ala.

19, 20. Olee otú ihe si gaara ndị Juu bụ́ ndị tụkwasịrị Jehova obi?

19 Otú ọ dị, olileanya nke ndị tụkwasịrị Jehova obi agaghị akụ afọ n’ala. Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe ọgbụgba ndụ ya na Ebreham na nke ya na Devid dị, o nwekwara obi ebere n’ahụ́ ndị yiri Maịka, bụ́ ndị hụrụ ya n’anya ma na-enwe mwute n’ihi nkewapụ ndị obodo ha kewapụrụ onwe ha n’ebe Chineke nọ. N’ihi ndị ziri ezi, a ga-eweghachi ha n’oge nke Chineke.

20 Nke ahụ weere ọnọdụ na 537 T.O.A., bụ́ mgbe Babilọn dara, mgbe ndị Juu fọdụrụnụ laghachikwara n’ala ha. N’oge ahụ, ihe Maịka 2:12 kwuru nwere mmezu mbụ ya. Jehova na-ekwu, sị: “Gị Jekọb, aghaghị m ime ka ndị  gị nile zukọta; aghaghị m ịchịkọta ndị [Izrel] fọdụrụ; n’otu ka M ga-edokọ ha dị ka ìgwè ewu na atụrụ nke Bọzra: dị ka ìgwè atụrụ n’etiti ebe ịta nri ya; ha ga-eme oké mkpọtụ n’ihi ụba mmadụ.” Lee ka Jehova si bụrụ onye na-ahụ n’anya! Mgbe o nyesịrị ndị ya ntaramahụhụ, o kwere ka ndị fọdụrụnụ laghachi ma jeere ya ozi n’ala nke o nyere ndị nna nna ha.

Ọnọdụ Yiri Ya Nnọọ n’Oge Anyị

21. Olee otú ọnọdụ ndị e nwere n’oge a si yie ndị nke e nwere n’oge Maịka?

21 Ka anyị tụleworo amaokwu ndị a sitere n’isiakwụkwọ abụọ mbụ nke Maịka, ò metụrụ gị n’ahụ́ ịhụ otú ọnọdụ e nwere taa si yie nnọọ nke e nwere n’oge ahụ? Dị ka ọ dị n’oge Maịka, ọtụtụ ndị taa na-azọrọ na ha na-efe Chineke. Ma, dị ka Juda na Izrel, ha kewasịrị ekewasị, ọbụna na-ebusorịta ibe ha agha. Ọtụtụ n’ime ndị bara ọgaranya na Krisendọm emegbuwo ndị ogbenye. N’ụzọ na-arịwanye elu, ndị ndú okpukpe na-agbachi omume ndị Bible katọrọ hoo haa nkịtị. Ka a sịkwa ihe mere Krisendọm ga-eji bịa ná njedebe ya n’isi nso, tinyere akụkụ ndị ọzọ nile nke “Babilọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha! (Mkpughe 18:1-5) Ka o sina dị, dị ka ọ dị n’oge Maịka, Jehova ga-enwe ndị ohu na-ekwesị ntụkwasị obi ga-afọdụ n’ụwa.

22. Ìgwè abụọ dị aṅaa nwere olileanya n’Alaeze Chineke?

22 Na 1919, Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi kewapụrụ onwe ha kpam kpam na Krisendọm ma malite ịkpọsa ozi ọma nke Alaeze ahụ ná mba nile. (Matiu 24:14) Nke mbụ, ha chọtara ihe fọdụrụ n’ime Izrel ime mmụọ. Ka e mesịrị, a malitere ịchịkọta “atụrụ ọzọ,” ìgwè abụọ ahụ ghọkwara “otu ìgwè atụrụ, otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:16) Ọ bụ ezie na ha na-ejere Chineke ozi ugbu a n’ala 234, e mewo ka ndị a nile ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova dịrị “n’otu” n’ezie. Ka ọ dịkwa ugbu a, ogige atụrụ ahụ na-eme “oké mkpọtụ n’ihi ụba mmadụ.” Ọ bụghị n’usoro ihe a ka olileanya ha dị, kama n’Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-eweghachi paradaịs n’ụwa n’oge na-adịghị anya.

23. N’ihi gịnị ka obi ji sie gị ike na olileanya gị bụ ihe e ji n’aka?

23 Amaokwu ikpeazụ nke Maịka isi nke 2 na-ekwu banyere ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova, sị: “Eze ha agabigawokwa n’ihu ha, Jehova kwa n’isi ha.” Ị̀ na-ahụ onwe gị n’etiti ndị ahụ na-eme ngagharị mmeri, na-eso Eze gị, bụ́ Jizọs Kraịst n’azụ, Jehova n’onwe ya anọrọkwa n’ihu? Ọ bụrụ otú ahụ, obi sie gị ike na a ghaghị inwe mmeri nakwa na olileanya gị bụ nke e ji n’aka. Nke a ga-apụta ìhè karị ka anyị na-atụlekwu isi ihe ndị dị n’amụma Maịka.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’oge Maịka, n’ihi gịnị ka Jehova ji kpebie ime ihe megide Juda na Izrel?

• Gịnị pụrụ ime mgbe ndị na-ekwu na ha na-ejere Chineke ozi butere ihe onwunwe ụzọ ná ndụ ha?

• Ka ị tụlesịworo Maịka isi 1 na nke 2, n’ihi gịnị ka obi ji sie gị ike na olileanya gị bụ nke e ji n’aka?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Amụma Maịka pụrụ iwusi anyị ike n’ụzọ ime mmụọ

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Dị ka ndị Juu fọdụrụnụ na 537 T.O.A., ndị Izrel ime mmụọ na ndị enyi ha na-akwalite ezi ofufe