Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Jehova Na-atụ Anya Ya n’Aka Anyị?

Gịnị Ka Jehova Na-atụ Anya Ya n’Aka Anyị?

 Gịnị Ka Jehova Na-atụ Anya Ya n’Aka Anyị?

“Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị [“ikpe ikpe ziri ezi,” NW], na ịhụ [“obiọma,” NW] n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—MAỊKA 6:8.

1, 2. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ohu Jehova pụrụ iji daa mbà n’obi, ma gịnị pụrụ inyere ha aka?

VERA bụ Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nke dị ihe dị ka afọ 75 bụ́ onye ahụ́ na-adịghị. “Mgbe ụfọdụ,” ka ọ na-ekwu, “ana m esi na windo elepụ anya ma hụ ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst ka ha na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọ na-eme ka anya mmiri na-agba m n’ihi na m na-achọ isonyere ha, ma ọrịa ebelatawo ozi m na-ejere Jehova.”

2 Ọ̀ dịtụwo mgbe ọ dịrị gị otú ahụ? N’ezie, ndị nile hụrụ Jehova n’anya na-achọ ijegharị n’aha ya ma na-emezu ihe ọ chọrọ. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na anyị enweghị ezi ahụ́ ike, bụrụ ndị mere agadi, ma ọ bụ nwee ibu ọrụ ezinụlọ? Anyị pụrụ ịdatụ mbà n’obi n’ihi na ọnọdụ ndị dị otú ahụ pụrụ igbochi anyị ime ihe nile na-agụ obi anyị agụụ ime n’ozi Chineke. Ọ bụrụ na anyị nọ n’ọnọdụ dị otú a, eleghị anya, ịtụle ihe dị na Maịka isi nke 6 na nke 7 ga-abụ ihe na-agba nnọọ ume. Isiakwụkwọ ndị a na-egosi na ihe Jehova chọrọ bụ ihe ndị ezi uche dị na ha nakwa ihe ndị a pụrụ ime eme.

Ụzọ Chineke Si Emeso Ndị Ya Ihe

3. Olee otú Jehova si mesoo ndị Izrel na-enupụ isi ihe?

3 Ka anyị buru ụzọ lee anya na Maịka 6:3-5 ma rịba ama otú Jehova si emeso ndị ya ihe. Cheta na n’oge Maịka, ndị Izrel na-enupụ isi. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova ji ọmịiko na-akpọ ha “ndị m.” Ọ na-arịọ ha, sị: “Ndị m, biko, cheta.” Kama iji iwe na-ebo ha ebubo, ọ gbalịrị iru ha n’obi site n’ịjụ, sị, “Gịnị ka M meworo gị?” Ọbụna ọ gbara ha ume ka ha “gbaa àmà,” megide ya.

4. Mmetụta dị aṅaa ka ihe nlereanya Chineke nke igosipụta ọmịiko kwesịrị inwe n’ahụ́ anyị?

4 Lee ezi ihe nlereanya Chineke setịpụụrụ anyị nile! O ji ọmịiko kpọọ ọbụna ndị Izrel na ndị Juda na-enupụ isi n’oge Maịka “ndị m” ma sị ha “biko.” Mgbe ahụ, anyị kwesịrị n’ezie igosipụta ọmịiko na àgwà obiọma mgbe anyị na ndị nọ n’ọgbakọ na-emekọ ihe. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ isi ike iso ụfọdụ n’ime ha na-emekọ ihe, ma ọ bụkwanụ, ha nwere ike ịbụ ndị na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ha hụrụ Jehova n’anya, anyị kwesịrị inyere ha aka ma nwee ọmịiko n’ahụ́ ha.

5. Isi ihe dị aṅaa dị mkpa ka e kwuru na Maịka 6:6, 7?

 5 Ka anyị sapetazie Maịka 6:6, 7. Maịka jụrụ ọtụtụ ajụjụ, na-asị: “M̀ ga-eji gịnị bịa n’ihu Jehova, rube isi n’ihu Chineke dị elu? m̀ ga-abịa n’ihu Ya chịrị ihe àjà nsure ọkụ, chịrị ụmụ ehi gbara otu afọ? Ọ̀ ga-atọ Jehova ụtọ, bụ́ [puku kwuru puku] ebule ma ọ bụ [iri puku kwuru iri puku] iyi mmanụ? m̀ ga-enye ọkpara m n’ihi njehie m, mkpụrụ afọ m n’ihi mmehie mkpụrụ obi m?” Ee e, ọ gaghị ekwe omume iji “puku kwuru puku ebule ma ọ bụ iri puku kwuru iri puku iyi mmanụ” mee ka obi dị Jehova ụtọ. Ma ọ dị ihe ga-eme ka obi dị ya ụtọ. Gịnị ka ọ bụ?

Anyị Aghaghị Ịdị Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi

6. Ihe atọ dị aṅaa Chineke chọrọ ka e depụtara na Maịka 6:8?

6 Na Maịka 6:8, anyị na-amụta ihe Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị. Maịka na-ajụ, sị: “Ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị [“ikpe ikpe ziri ezi,” NW], na ịhụ [“obiọma,” NW] n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” Ihe atọ a a chọrọ na-agụnye mmetụta anyị, otú anyị si eche echiche ma na-eme omume. Anyị aghaghị ịchọ igosipụta àgwà ndị a, na-eche echiche banyere otú anyị pụrụ isi na-egosipụta ha ma na-eme ihe iji gosipụta ha. Ka anyị tụlee ihe atọ a a chọrọ otu otu.

7, 8. (a) Gịnị ka “ikpe ikpe ziri ezi” pụtara? (b) Ikpe na-ezighị ezi dị aṅaa juru ebe nile n’oge Maịka?

7 “Ikpe ikpe ziri ezi” pụtara ime ihe ziri ezi. Ụzọ Chineke si eme ihe bụ ụkpụrụ nke ikpe ziri ezi. Otú ọ dị, ndị ha na Maịka dịkọrọ ndụ na-ekpe, ọ bụghị ikpe ziri ezi kama ikpe na-ezighị ezi. N’ụzọ dịgasị aṅaa? Tụlee Maịka 6:10. Ná ngwụsị amaokwu ahụ, a kọwara na ndị ahịa na-eji “ephah na-erughị eru,” ya bụ, nke dị ntakịrị gabiga ókè, na-eme ihe. Amaokwu nke 11 na-agbakwụnye na ha na-eji “nkume ọ̀tụ̀tụ̀ aghụghọ” na-eme ihe. Dịkwa ka amaokwu nke 12 na-ekwu, “ire ha dịkwa aghụghọ.” Ya mere, ihe ọ̀tụ̀tụ̀ aghụghọ, nkume ọ̀tụ̀tụ̀ aghụghọ, na okwu ụgha bụ ihe a na-ahụ ebe nile n’etiti ndị ahịa n’oge Maịka.

8 Ọ bụghị nanị n’ọmà ahịa ka a na-ahụ omume ikpe na-ezighị ezi. A na-ahụkwa ya ọtụtụ mgbe n’ụlọikpe. Maịka 7:3 na-egosi na “onyeisi na-arịọ, onyeikpe ewee jikere n’ihi ụgwọ.” A na-enye ndị ọkàikpe aka azụ ka ha wee maa ndị aka ha dị ọcha ikpe n’ụzọ na-ezighị ezi. “Onye ukwu,” ma ọ bụ nwa amaala a ma ama so na-eme mpụ ahụ. N’ezie, Maịka na-ekwu na onyeisi, onyeikpe, na onye ukwu ‘na-atụkọta,’ ma ọ bụ na-ahazi, omume ọjọọ ha.

9. Olee otú ikpe na-ezighị ezi nke ndị ajọ omume na-ekpe si metụta Juda na Izrel?

9 Ikpe na-ezighị ezi nke ndị ndú ọjọọ ahụ na-ekpe na-enwe mmetụta n’ahụ́ Juda na Izrel nile. Maịka 7:5 na-ekwu na enweghị ikpe ziri ezi emewo ka a ghara inwe ntụkwasị obi n’etiti enyi na enyi, n’etiti ndị na-akọrọ ibe ha izu nzuzo, na ọbụna n’etiti di na nwunye. Amaokwu nke 6 na-ekwu na nke a emewo ka e nwee ọnọdụ nke na ndị bụ́ ezigbo ndị ikwu, dị ka ụmụ ndị ikom na nna ha, ụmụ ndị inyom na nne ha, na-elelị ibe ha.

10. Olee otú Ndị Kraịst si eme omume n’oge a ikpe na-ezighị jupụtara ebe nile?

10 Olee banyere taa? Ọ̀ bụ na anyị adịghị ahụ ọnọdụ ndị yiri ya? Dị ka ọ gbara Maịka gburugburu, ikpe na-ezighị ezi, atụkwasịghị onye ọzọ obi, na ndakpọ nke ndụ ọha na eze na nke ezinụlọ gbara anyị gburugburu. Ma, dị ka ndị ohu Chineke n’ime ụwa a nke jupụtara n’ajọ omume, anyị adịghị ekwe ka mmụọ ikpe ikpe na-ezighị ezi nke ụwa a bata n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Kama nke ahụ, anyị na-agbalịsi ike ịgbaso ụkpụrụ nke ime ihe n’eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ, na-egosipụta ha n’ihe ndị anyị na-eme ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. N’ezie, anyị “na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) Í kweghị na site n’ikpe ikpe ziri ezi anyị na-enweta ọtụtụ ngọzi ndị na-abịa site n’òtù ụmụnna ndị na-enwe ezi ntụkwasị obi n’ebe ibe ha nọ?

Olee Otú Ndị Mmadụ Si Anụ “Olu Jehova”?

11. Olee otú Maịka 7:12 si na-emezu?

11 Maịka na-ebu amụma na n’agbanyeghị ikpe na-ezighị ezi nke juru ebe nile, na mmadụ  nile ga-enweta ikpe ziri ezi. Onye amụma ahụ na-ebu amụma na a ga-achịkọta ndị mmadụ ‘site n’oké osimiri ruo oké osimiri, sitekwa n’ugwu ruo ugwu’ ịghọ ndị na-efe Jehova ofufe. (Maịka 7:12) Taa, ná mmezu ikpeazụ nke amụma a, ọ bụghị otu mba, kama ndị mmadụ si ná mba nile na-erite uru n’ezie site n’ikpe ziri ezi nke Chineke, nke ọ na-ekpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu. (Aịsaịa 42:1) Olee otú nke a si na-eme?

12. Olee otú e si na-anụ “olu Jehova” taa?

12 Iji zaa ya, tụlee ihe Maịka bu ụzọ kwuo. Maịka 6:9 na-ekwu, sị: “Olu Jehova na-akpọ obodo òkù, onye nzube ihe [“ga-atụ egwu aha Gị,” NW].” Olee otú ndị nke mba nile si anụ “olu Jehova,” oleekwa ihe jikọrọ nke a na anyị ikpe ikpe ziri ezi? N’ezie, ndị mmadụ taa adịghị anụ olu Chineke n’ụzọ nkịtị. Otú ọ dị, site n’ọrụ nkwusa anyị na-arụ n’ụwa nile, ndị mmadụ, bụ́ ndị si n’agbụrụ nile na n’ọnọdụ nile ná ndụ na-anụ olu Jehova. N’ihi ya, ndị na-ege ntị ‘na-atụ egwu aha Chineke,’ na-egosipụta nsọpụrụ ofufe n’ebe ọ dị. N’ezie, anyị na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-egosipụta ịhụnanya site n’ije ozi dị ka ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi. Site n’ime ka onye ọ bụla mara aha Chineke n’eleghị mmadụ anya n’ihu, anyị ‘na-ekpe ikpe ziri ezi.’

Anyị Aghaghị Ịhụ Obiọma n’Anya

13. Gịnị dị iche n’etiti obiọma sitere n’ịhụnanya na ịhụnanya?

13 Ka anyị tụlezie ihe nke abụọ a chọrọ,  bụ́ nke e hotara na Maịka 6:8. Jehova na-atụ anya n’aka anyị “ịhụ obiọma n’anya.” A na-asụgharịkwa okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “obiọma” dị ka “obiọma sitere n’ịhụnanya” ma ọ bụ “ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe.” Obiọma sitere n’ịhụnanya bụ ichebasiri ndị ọzọ echiche ike, inwe nchegbu maka ha, n’ọmịiko. Obiọma sitere n’ịhụnanya dị iche n’àgwà bụ́ ịhụnanya. N’ụzọ dị aṅaa? Ịhụnanya bụ okwu sara mbara karị nke a pụrụ iji mee ihe maka ọbụna ihe na echiche dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere onye “na-ahụ mmanya vaịn na mmanụ n’anya” nakwa banyere onye “na-ahụ amamihe n’anya.” (Ilu 21:17; 29:3) N’aka nke ọzọ, ọ bụ nanị mmadụ, karịsịa ndị na-ejere Chineke ozi, ka a pụrụ inwe obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe ha nọ. Ya mere, Maịka 7:20, na-ekwu banyere “obiọma sitere n’ịhụnanya nke e nyere Ebreham” (NW)—nwoke jeere Jehova Chineke ozi.

14, 15. Olee otú e si egosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya, oleekwa ihe atụ a kpọturu uche nke na-egosi nke ahụ?

14 Dị ka e dekọrọ na Maịka 7:18, onye amụma ahụ na-ekwu na Chineke bụ “onye [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] na-atọ ụtọ.” Na Maịka 6:8, a gwara anyị, ọ bụghị nanị ka anyị na-egosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya kama ka anyị hụ àgwà ahụ n’anya. Gịnị ka anyị na-amụta site n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a? A na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya site n’ọchịchọ obi nakwa ná mmesapụ aka n’ihi na anyị chọrọ igosi ya. Dị ka Jehova, anyị na-enweta obi ụtọ, ma ọ bụ ọṅụ dị ukwuu, n’igosi ndị nọ ná mkpa obiọma sitere n’ịhụnanya.

15 Taa, ụdị obiọma ahụ sitere n’ịhụnanya bụ ihe e ji mara ndị Chineke. Tụlee nanị otu ihe atụ. Na June 2001, oké mmiri ozuzo mere ka e nwee oké idei mmiri na Texas, U.S.A., na-ebibi ọtụtụ puku ebe obibi, gụnyere ọtụtụ narị ebe obibi nke Ndịàmà Jehova. Iji nyere ụmụnna ha Ndị Kraịst nọ ná mkpa aka, ihe dị ka Ndịàmà 10,000 ji ọchịchọ obi na mmesapụ aka nye oge ha na ume ha. Ruo ihe karịrị ọnwa isii, ndị ọrụ afọ ofufo rụrụ ọrụ n’akwụsịghị akwụsị, jiri oge ha, ehihie na abalị nakwa ngwụsị izu, wughachi Ụlọ Nzukọ Alaeze 8 na ihe karịrị ebe obibi 700 nke ụmụnna ha Ndị Kraịst. Ndị na-apụghị ịrụ ụdị ọrụ ahụ nyere onyinye ihe oriri, ihe dị iche iche dị mkpa, na ego. Gịnị mere ọtụtụ puku Ndịàmà a ji gbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka? Ọ bụ n’ihi na ha ‘hụrụ obiọma n’anya.’ Leekwa ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ịmata na ụmụnna anyị n’ụwa nile na-egosi ụdị obiọma ahụ sitere n’ịhụnanya! Ee, imezu ihe ahụ a chọrọ bụ́ “ịhụ obiọma n’anya” abụghị ibu arọ kama ọ bụ ihe na-enye ọṅụ!

Jiri Obi Umeala Soro Chineke Na-eje Ije

16. Ihe atụ dị aṅaa na-enye aka imesi ike mkpa ọ dị iji obi umeala soro Chineke na-eje ije?

16 Ihe nke atọ a chọrọ nke dị na Maịka 6:8 bụ “iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije.” Nke a pụtara ịmata otú ike anyị ha na ịdabere n’ebe Chineke nọ. Iji maa atụ: Were anya nke uche hụ otu nwa agbọghọ nta nke jidesiri nna ya aka ike ka ha nọ na-agafe oké ifufe. Nwata ahụ maara na ike ya pere mpe, ma o nwere obi ike n’ebe nna ya nọ. Anyị onwe anyị kwa aghaghị ịmata otú ike anyị ha ma nwee obi ike n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe obi ike dị otú a? Otu ụzọ bụ site n’iburu n’uche ihe mere o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya ịnọ Chineke nso. Maịka na-echetara anyị ihe atọ mere o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya: Jehova bụ Onye Nnapụta, Onye Nduzi, na Onye Nchebe anyị.

17. Olee otú Jehova si napụta, duzie, ma chebe ndị ya nke oge ochie?

17 Dị ka e dekọrọ na Maịka 6:4, 5, Chineke na-ekwu, sị: “M mere ka i si n’ala Ijipt rịgopụta.” Ee, Jehova bụ Onye Nnapụta nke Izrel. Jehova gara n’ihu ikwu, sị: “M wee ziga [Mozis] na Erọn na Miriam ịga n’ihu gị.” E ji Mozis na Erọn duzie mba ahụ, Miriam dukwara ndị inyom Izrel n’egwú mmeri. (Ọpụpụ 7:1, 2; 15:1, 19-21; Deuterọnọmi 34:10) Jehova nyere nduzi site n’aka ndị ohu ya. N’amaokwu nke 5, Jehova chetaara mba Izrel na ya chebere ha pụọ n’aka Belak na Belam, nakwa na ya chebere ndị Izrel ná ngwụsị nke njem ha site  na Shitim dị na Moab ruo Gilgal nke dị n’Ala Nkwa ahụ.

18. Olee otú Chineke si arụ ọrụ dị ka Onye Nnapụta, Onye Nduzi, na Onye Nchebe anyị taa?

18 Ka anyị na Chineke so na-eje ije, ọ na-anapụta anyị n’ụwa Setan, na-eduzi anyị site n’Okwu ya na nzukọ ya, na-echebekwa anyị dị ka otu ìgwè mgbe ndị mmegide na-awakpo anyị. N’ihi ya, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji jidesie Nna anyị nke eluigwe aka ike ka anyị na ya so na-eje ije ná ngwụsị nke njem a tara akpụ nke anyị na-eme gaa n’ebe karịrị nnọọ Ala Nkwa oge ochie ahụ—ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke.

19. N’ụzọ dị aṅaa ka inwe obi umeala na mmadụ ịma otú ike ya ha si nwee njikọ?

19 Iji obi umeala soro Chineke na-eje ije ga-enyekwara anyị aka inwe echiche ziri ezi banyere ọnọdụ anyị. Nke a dị mkpa n’ihi na igosipụta obi umeala na-agụnye ịmara otú ike anyị ha. Ime agadi ma ọ bụ ọrịa pụrụ ibelata ihe anyị pụrụ ime n’ozi Jehova? Otú ọ dị, kama ikwe ka nke a kụdaa anyị aka, anyị kwesịrị icheta na Chineke na-anabata mgbalị na àjà ndị anyị na-achụ ‘dị ka ihe ọ bụla anyị nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe anyị na-enweghị si dị.’ (2 Ndị Kọrint 8:12) N’ezie, Jehova na-atụ anya ka anyị jiri mkpụrụ obi anyị dum jeere ya ozi, na-eme  ihe ọnọdụ anyị kwere anyị ime. (Ndị Kọlọsi 3:23) Mgbe anyị ji ịdị uchu na ịnụ ọkụ n’obi mee ihe nile anyị nwere ike ime n’ozi ya, Chineke na-agọzi anyị n’ụba.—Ilu 10:22.

Àgwà nke Ichere Na-eweta Ọtụtụ Ngọzi

20. Ịmara gịnị kwesịrị inyere anyị aka igosipụta àgwà nke ichere dị ka Maịka?

20 Inweta ngọzi Jehova na-akpali anyị iṅomi àgwà Maịka. Ọ na-ekwu, sị: “M ga-echere [“ga-egosipụta àgwà nke ichere,” NW] Chineke nke nzọpụta m.” (Maịka 7:7) Olee ihe jikọtara okwu ndị a na anyị iji obi umeala soro Chineke na-eje ije? Inwe àgwà nke ichere, ma ọ bụ ndidi, na-enyere anyị aka izere inwe ndakpọ olileanya na ụbọchị Jehova abịabeghị. (Ilu 13:12) N’ikwu eziokwu, ọ na-agụsi anyị nile agụụ ike ka ajọ ụwa a bịa ná njedebe. Otú ọ dị, kwa izu, ọtụtụ puku mmadụ ka na-amalite amalite isoro Chineke na-eje ije. Ịmara nke ahụ na-eme ka anyị nwee ihe mere anyị ga-eji nwee àgwà nke ichere. Otu Onyeàmà nọteworo aka kwuru banyere nke a sị: “N’ileghachi anya azụ n’ihe karịrị afọ 55 nke ịrụ ọrụ nkwusa, ekwenyesiri m ike na ọ dịghị ihe funahụworo m n’ihi ichere Jehova. Kama nke ahụ, a zọpụtawo m n’ọtụtụ ihe mgbu.” Ì nwetụla ahụmahụ yiri nke ahụ?

21, 22. Olee otú Maịka 7:14 si na-emezu n’oge anyị?

21 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na iso Jehova na-eje ije na-abara anyị uru. Dị ka anyị na-agụ na Maịka 7:14, Maịka ji ndị Chineke tụnyere atụrụ ndị nọ ná nchebe n’akụkụ onye na-azụ ha. Taa, ná mmezu ka ukwuu nke amụma a, ihe fọdụrụ n’Izrel ime mmụọ ahụ, tinyere “atụrụ ọzọ” ahụ, nọ ná nchebe n’ebe Onye Ọzụzụ Atụrụ ha nke ha tụkwasịrị obi, bụ́ Jehova, nọ. Ha ‘bi iche n’oké ọhịa n’etiti Kamel,’ bụrụ ndị e kewapụrụ iche n’ụzọ ime mmụọ n’ụwa a nọ nnọọ ná nsogbu ma dị ize ndụ.—Jọn 10:16; Deuterọnọmi 33:28; Jeremaịa 49:31; Ndị Galeshia 6:16.

22 Ndị Jehova na-enwe ọganihu dị ka Maịka 7:14 bukwara n’amụma. Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere atụrụ Chineke, ma ọ bụ ndị ya, Maịka kwuru, sị: “Ka ha taa nri n’ime Beshan na Gilied.” Dị nnọọ ka atụrụ ndị nọ na Beshan na Gilied si ata nri n’ala ahịhịa mara mma ma na-amụba, otú a ka ndị Chineke taa si na-enwe ọganihu ime mmụọ—nke bụ́ ngọzi ọzọ na-abịara ndị ji obi umeala soro Chineke na-eje ije.—Ọnụ Ọgụgụ 32:1; Deuterọnọmi 32:14.

23. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ịtụle Maịka 7:18, 19?

23 Na Maịka 7:18, 19, onye amụma ahụ kọwapụtara ọchịchọ Jehova ịgbaghara ndị nwere nchegharị. Amaokwu nke 18 na-ekwu na Jehova “na-ebupụ ajọ omume,” na ọ “na-agabigakwa njehie.” Dịkwa ka e kwuru n’amaokwu nke 19, ọ “ga-atụbakwa mmehie nile ha n’ebe dịkarịsịrị omimi nke oké osimiri.” Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta na nke a? Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị ma ànyị na-eṅomi Jehova n’akụkụ a. Ànyị na-agbaghara ndị ọzọ mmehie ha mere megide anyị? Mgbe ndị dị otú ahụ chegharịrị ma chọọ idozi ụzọ ha, n’ezie, anyị kwesịrị igosipụta ụdị njikere ahụ Jehova dị ịgbaghara ha mmehie ha kpam kpam na n’ụzọ na-adịgide adịgide.

24. Olee otú i siworo rite uru site n’amụma Maịka?

24 Olee otú anyị siworo rite uru ná ntụle a anyị tụleworo amụma Maịka? O chetaworo anyị na Jehova na-eme ka ndị bịaruru ya nso nwee ezi olileanya. (Maịka 2:1-13) Ọ gbawo anyị ume ime ihe nile anyị pụrụ ime iji kwalite ezi ofufe ka anyị wee jegharịa n’aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi. (Maịka 4:1-4) O mesiwokwa anyị nile obi ike na n’agbanyeghị otú ọnọdụ anyị dị, anyị pụrụ imezu ihe Jehova chọrọ. Ee, amụma Maịka na-ewusi anyị ike n’ezie ijegharị n’aha Jehova.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Dị ka e kwuru na Maịka 6:8, gịnị ka Jehova na-achọ n’aka anyị?

• Gịnị dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga ‘na-ekpe ikpe ziri ezi’?

• Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta na anyị ‘hụrụ obiọma n’anya’?

• Gịnị ka ‘iji obi umeala soro Chineke na-eje ije’ gụnyere?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

N’agbanyeghị ajọ ọnọdụ nke dị n’oge ya, Maịka mezuru ihe Jehova chọrọ. Anyị pụkwara ime otú ahụ

[Foto dị na peeji nke 23]

Na-ekpe ikpe ziri ezi site n’ịgbara ụdị mmadụ nile àmà

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Gosi na ị hụrụ obiọma n’anya site n’igbo mkpa nke ndị ọzọ

[Foto dị na peeji nke 23]

Mee ihe nile i nwere ike ime ka i ji obi umeala na-amata otú ike gị hà