Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NDỊ OGBENYE Na-adawanye Ogbenye

NDỊ OGBENYE Na-adawanye Ogbenye

 NDỊ OGBENYE Na-adawanye Ogbenye

“Ọ dịghị obodo ọ bụla ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị nọ na ya dara ogbenye ma na-ahụsi anya nke pụrụ inwe ọganihu na obi ụtọ n’ezie.”

ỌKÀ ná nhazi akụ̀ na ụba bụ́ Adam Smith kwuru nke ahụ laa azụ na narị afọ nke 18. Ọtụtụ ndị kweere na a na-ahụ eziokwu dị n’ihe ahụ o kwuru nke ọma taa ọbụna karị. Ọdịiche dị n’etiti ndị nwere ihe na ndị na-enweghị na-apụta ìhè ọbụna karị. Na Philippines, otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi n’obodo ahụ anaghị akpataru otu $1 (U.S.) kwa ụbọchị, bụ́ ego a na-akpatakarị n’ime minit ole na ole ná mba ndị bara ọgaranya. Akwụkwọ bụ́ Human Development Report 2002 nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu na “pasent 5 nke ndị kasị baa ọgaranya n’ụwa na-akpata ihe ji okpukpu 114 karịa ihe pasent 5 nke ndị kasị daa ogbenye na-akpata.”

Ọ bụ ezie na ụfọdụ na-ebi ndụ dịtụ ntụsara ahụ́, ọtụtụ nde mmadụ na-ebi ebe ọ bụla ha hụrụ, na-arụ nkịrịka ụlọ n’ebe ọ bụla ha nwere ike. Ọ naghị adabachara ndị ọzọ otú ahụ; ha na-ebi n’okporo ámá, ikekwe na-atọ nanị katọn ma ọ bụ wọtapruf n’ala edina. Ọtụtụ n’ime ha na-akpata ihe ha na-eri n’ụzọ ọ bụla ha nwere ike—na-atụtụ ihe n’ebe a na-ekpofu ihe, na-ebu ibu ndị dị arọ, ma ọ bụ jiri trọkụ na-atụtụkọta mkpọmkpọ na mkpọmkpọ.

Ọ bụghị nanị na ndị ọgaranya na ndị ogbenye ahaghị nhata ná mba ndị na-emepe emepe kama, dị ka Ụlọ Akụ Ụwa na-ekwu, “‘e nwere ebe ndị dara ogbenye’ ná mba nile.” Site na Bangladesh ruo na United States, n’agbanyeghị otú ọ pụrụ isi yie ka mba ụfọdụ ha bara ọgaranya, e nwere ndị na-adọga inweta ihe ga-ezuru ha iri ma ọ bụ ebe ha ga-ebi. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times hotara akụkọ si n’aka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ọnụ Ọgụgụ Mmadụ na United States bụ́ nke na-egosi na ọdịiche dị n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye na United States nọgidere na-ebuwanye ibu. O kwuru, sị: “N’afọ gara aga, otu ụzọ n’ụzọ ise nke ndị kasị baa ọgaranya ná mba a kpatara ọkara nke ihe ruuru ezinụlọ nile ịkpata . . . Otu ụzọ n’ụzọ ise nke ndị kasị daa ogbenye kpatara pasent 3.5.” Ọnọdụ ahụ dị otú a ma ọ bụ kara njọ n’ọtụtụ mba ndị ọzọ. Akụkọ sitere n’aka Ụlọ Akụ Ụwa na-egosi na ihe dị ka pasent 57 nke ndị bi n’ụwa anaghị akpataru $2 kwa ụbọchị.

Nke ka njọ bụ na n’afọ 2002, ọtụtụ nde mmadụ were iwe mgbe ha nụrụ akụkọ banyere ndị isi ọrụ bụ́ ndị bara ọgaranya site n’ụzọ a na-enyo enyo. A sịgodị  na ọ dịghị ihe megidere nnọọ iwu ha mere, ọtụtụ ndị chere na ndị isi ụlọ ọrụ ndị a, dị ka magazin bụ́ Fortune na-ekwu, “na-aba ọgaranya nke ukwuu n’ụzọ rụrụ arụ.” N’ihi ihe ndị na-eme n’ụwa, ụfọdụ ndị na-eche otú a ga-esi mee ka o yie ihe ziri ezi na ụfọdụ ndị na-akpata nnukwu ego dị otú ahụ e kwuru na ha ruru ọtụtụ narị nde dollar, ebe ọtụtụ ndị dara ogbenye.

Ịda Ogbenye Ọ̀ Ga-adịgide?

Nke a apụtaghị na ọ dịghị onye na-agbalị ime ihe banyere ọnọdụ ndị ogbenye. N’ezie, ndị ọchịchị bu ezi ihe n’obi na òtù enyemaka dị iche iche atụwo aro maka mgbanwe. Otú o sina dị, ihe ndị na-eme eme na-akụda mmụọ. Akwụkwọ bụ́ Human Development Report 2002 na-ekwu na “ọtụtụ mba dara ogbenye ugbu a karịa ka ha dara afọ 10, 20, na n’ebe ụfọdụ afọ 30 gara aga,” n’agbanyeghị ọtụtụ ezi mgbalị ndị e meworo iji mee ka ihe ka mma.

Nke a ọ̀ pụtara na ndị ogbenye enweghị olileanya? Anyị na-agba gị ume ịgụ isiokwu na-esonụ iji tụlee ihe ụfọdụ ezi uche dị na ha a ga-eme bụ́ ndị pụrụ inye aka ugbu a nakwa ihe ngwọta ndị ọ pụrụ ịbụ na i chetụbeghị ha n’echiche.