Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-enye Obi Ụtọ Si n’Inwe Ndidi na Ịnọgidesi Ike n’Ihe Pụta

Ihe Ndị Na-enye Obi Ụtọ Si n’Inwe Ndidi na Ịnọgidesi Ike n’Ihe Pụta

 Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ihe Ndị Na-enye Obi Ụtọ Si n’Inwe Ndidi na Ịnọgidesi Ike n’Ihe Pụta

JIZỌS KRAỊST buru amụma na n’ụbọchị ikpeazụ “ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.” N’ihi ya, n’ọtụtụ ebe n’ụwa taa, ndị mmadụ n’ozuzu ha adịghị enwe mmasị n’ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ọbụna ụfọdụ na-ele okpukpe anya ọjọọ.—Matiu 24:12, 14.

N’agbanyeghị nke ahụ, site n’inwe okwukwe na ndidi, ndị nkwusa Alaeze enwewo ihe ịga nke ọma n’imeri ihe ịma aka ahụ, dị ka ahụmahụ na-esonụ nke e si Czech Republic nweta na-egosi.

Ndịàmà abụọ nọ n’èzí gwa otu nwaada nọ n’ime ụlọ e mechiri ọnụ ụzọ ya emechi okwu. Ka obere oge gasịrị, e mepetụrụ ọnụ ụzọ ahụ, otu onye wepụtakwara aka nara magazin Ụlọ Nche na Teta! nke Ndịàmà ahụ nọ na-enye. A nụrụ olu sịrị, “unu emeela,” a kwachiekwa ụzọ ahụ. “Ọ̀ bụ anyị gaghachi?” ka Ndịàmà ahụ nọ na-eche. Otu n’ime ha, bụ́ onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye ozi oge nile, kpebiri ịgaghachi, ma otu ihe ahụ mekwara ọzọ, nke a nọgidekwara na-eme ruo otu afọ.

Ebe ọ bụ na onye ọsụ ụzọ ahụ ekpebiwo ịgbanwe ụzọ o si ezi nwaada ahụ ozi ọma, o kpegaara Jehova ekpere maka enyemaka. Mgbe ọzọ o nyere nwanyị ahụ magazin, o ji ihu enyi jụọ ya, sị: “Olee otú i mere? Magazin ndị ahụ hà tọkwara gị ụtọ?” Na mbụ, o nweghị ihe a zara ya, ma mgbe ọ gaghachiri ebe ahụ ugboro ole na ole, nwaada ahụ malitere inwe omume enyi. N’otu oge, o meghere ọnụ ụzọ ya nke ọma, ma mkparịta ụka ahụ dịrị nkenke.

Ebe ọ bụ na nwanyị ahụ enwechaghị mmasị ikwu okwu n’ọnụ ụzọ, onye ọsụ ụzọ ahụ kpebiri idegara ya akwụkwọ ozi iji kọwaara ya ihe mere o ji na-abịa ma jụọ ya ma ọ ga-achọ ka e duziwere ya ọmụmụ Bible. N’ikpeazụ, mgbe onye ọsụ ụzọ ahụ nwesịrị ndidi ruo otu afọ na ọkara, ọ maliteere onye ahụ nwe ụlọ ọmụmụ Bible. Ọ tụrụ ya n’anya ma bụrụ ihe na-agba ume nye ya mgbe nwanyị ahụ gwara ya, sị: “Ekwerewo m na Chineke kemgbe ị malitere iwetara m magazin ndị ahụ.”

N’ezie, ndidi na ịnọgidesi ike n’ihe pụrụ ịrụpụta ihe ndị na-enye obi ụtọ n’ọrụ nkwusa na nke ime ndị na-eso ụzọ.—Matiu 28:19, 20.