Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmụta Nkà nke Iji Akọ Eme ihe

Ịmụta Nkà nke Iji Akọ Eme ihe

 Ịmụta Nkà nke Iji Akọ Eme ihe

PEGGY hụrụ nwa ya nwoke ka o ji obi ọjọọ na-agwa nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ okwu. “Ì chere na ihe a bụ ụzọ kasị mma isi gwa nwanne gị nwoke okwu?” ka mama ya bụ́ Peggy jụrụ ya. “Ị hụlanụ na ị kpasuola ya iwe!” Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? Ọ nọ na-agbalị ịkụziri nwa ya nwoke nkà nke iji akọ eme ihe na ichebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche.

Pọl onyeozi gbara onye ibe ya ọ tọrọ atọ bụ́ Timoti ume ka “ọ na-emeso mmadụ nile n’ụzọ dị nro [ma ọ bụ “n’ụzọ akọ”].” Site n’ime otú ahụ, Timoti agaghị eleghara mmetụta nke ndị ọzọ anya. (2 Timoti 2:24) Gịnị bụ akọ? Olee otú ị pụrụ isi meziwanye ihe n’akụkụ a? Oleekwa otú ị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka ịzụlite nkà ahụ?

Gịnị Bụ Akọ?

Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa akọ dị ka “ikike nke ịghọta otú ọnọdụ siruru n’ike na nke ime ihe ma ọ bụ ikwu okwu n’ụzọ dịkarịsịrị nro ma ọ bụ n’ụzọ kasị daba adaba.” Onye ji akọ eme ihe pụrụ ịchọpụta mmetụta ndị ọzọ na-enwe, ọ pụtara ịghọta mmetụta okwu ya ma ọ bụ omume ya ga-enwe n’ebe ha nọ. Ma ime nke a abụghị nanị nkà; ọ na-agụnye ọchịchọ siri ike nke izere imejọ ndị ọzọ.

N’ihe ndekọ Bible banyere ohu Ịlaịsha bụ́ Gihezi, anyị na-ahụ ihe atụ nke onye na-adịghị akọ. Otu nwanyị Shunem bụ́ onye nwa ya nwoke nwụnahụrụ ka o ku ya n’aka bịakwutere Ịlaịsha, na-achọ inweta nkasi obi. Mgbe a jụrụ ya ma udo ọ̀ dịkwa, ọ zaghachiri, sị: “Anyị nọ n’udo.” Ma mgbe ọ gakwuuru onye amụma ahụ, “Gihezi wee bịaruo nso inupụ ya.” N’aka nke ọzọ, Ịlaịsha kwuru, sị: “Haa ya aka: n’ihi na mkpụrụ obi ya dị ilu n’ime ya.”—2 Ndị Eze 4:17-20, 25-27.

Gịnị mere Gihazi jiri kpaa àgwà otú a n’echeghị echiche na n’ejighị akọ mee ihe? Ọ bụ eziokwu na nwanyị ahụ ekwupụtaghị echiche ya mgbe a jụrụ ya. Ma, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ anaghị agwa onye ọ bụla ha hụrụ mmetụta ha. Ka o sina dị, mmetụta ya aghaghị ịpụtaworịị ìhè ruo n’ókè ụfọdụ. O doro anya na Ịlaịsha hụrụ ya, ma Gihezi ahụghị ya, ma ọ bụkwanụ na ọ họọrọ ileghara ya anya. Nke a na-egosipụta nke ọma otu ihe na-akpatakarị ejighị akọ eme ihe. Mgbe obi mmadụ dị n’ọrụ ya gabiga ókè, ọ pụrụ ịdịrị ya mfe ịghara ịghọta ma ọ bụ iche banyere mkpa nke ndị ya na ha na-emekọ ihe. O yiri nnọọ onye na-anya bọs nke obi ya dị n’iru ebe ọ na-aga n’oge nke na ọ kwụsịghị iburu ndị mmadụ.

Iji zere ịbụ ndị na-adịghị akọ dị ka Gihezi, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịdị na-enwe obiọma n’ebe ndị ọzọ nọ n’ihi na anyị amaghị mmetụta ha na-enwe n’ezie. Anyị kwesịrị ịnọ na nche mgbe nile iji na-achọpụta ihe ndị na-egosi mmetụta mmadụ na-enwe ma jiri obiọma na-aza onye ahụ okwu ma ọ bụ na-emeso ya ihe. Olee otú ị pụrụ isi meziwanye nkà gị n’akụkụ a?

Ịghọta Mmetụta nke Ndị Ọzọ

Jizọs pụtara ìhè n’ịghọta mmetụta nke ndị ọzọ na n’ịhụta ụzọ kachasị mma isi jiri obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe. N’otu oge, ọ nọ na-eri nri n’ụlọ Saịmọn, bụ́ onye Farisii, mgbe otu nwanyị nke “a maara n’obodo ahụ dị ka onye mmehie” bịakwutere ya. Na nke a kwa, ọ dịghị  okwu ọ bụla e kwuru, ma, ihe a gba n’aka a dịghị eji enyo ele ya. “O wee weta obere ite alabasta nke mmanụ na-esi isi ụtọ, ka o weere ọnọdụ n’azụ n’akụkụ ụkwụ [Jizọs], ọ kwakwara ákwá ma malite iji anya mmiri ya na-ede ụkwụ ya, ọ na-ejikwa ntutu isi ya na-ehicha ha. Ọzọ, o susuru ụkwụ ya ọnụ n’ụzọ dị nro ma tee ha mmanụ ahụ na-esi isi ụtọ.” Jizọs ghọtara ihe ihe a nile pụtara. Ọ bụkwa ezie na Saịmọn ekwughị ihe ọ bụla, Jizọs bịara nwee ike ịghọta na ọ nọ na-ekwu n’ime onwe ya, sị: “Nwoke a, a sị na ọ bụ onye amụma, gaara ama onye na-ebitụ ya aka, nakwa ụdị nwanyị ọ bụ, na ọ bụ onye mmehie.”—Luk 7:37-39.

Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche ihe Jizọs gaara emebi ma a sị na ọ kwapụrụ nwanyị ahụ, ma ọ bụ ma a sị na ọ gwara Saịmọn, sị: “Onye iberibe! Ị́ hụghị na o nwere nchegharị?” Kama nke ahụ, Jizọs ji akọ nye Saịmọn ihe atụ nke nwoke nke gbaghaara mmadụ nnukwu ụgwọ o ji ya, ma gbaghara onye nke ọzọ ụgwọ dị nta. “Ònye n’ime ha ga-ahụ ya n’anya karị?” ka Jizọs jụrụ ya. N’ụzọ dị otú a, kama iyi ka ọ na-akọcha Saịmọn, Jizọs bịara nwee ike ịja ya mma maka ezi azịza ahụ o nyere. O jizi obiọma nyere Saịmọn aka ịhụ ọtụtụ ihe ndị na-egosi otú obi dị nwanyị ahụ n’ezie na omume nchegharị ya. Jizọs chigharịkwuuru nwanyị ahụ ma jiri obiọma mee ka ọ mata na ọ ghọtara mmetụta ya. Ọ gwara ya na a gbagharawo ya mmehie ya, mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gwakwara ya, sị: “Okwukwe gị azọpụtawo gị: gawara onwe gị n’udo.” Lee otú okwu ndị ahụ e ji akọ kwuo na-aghaghị isiwo wusie mkpebi ya ime ihe ziri ezi ike! (Luk 7:40-50) Jizọs nwere ihe ịga nke ọma n’iji akọ eme ihe n’ihi na ọ chọpụtara mmetụta ndị mmadụ nwere ma mesoo ha ihe n’ụzọ ọmịiko.

Dị nnọọ ka Jizọs si nyere Saịmọn aka, anyị pụrụ ịmụta ma nyere ndị ọzọ aka ịghọta otú obi dị ndị mmadụ. Mgbe ụfọdụ, ndị ozi nweworo ahụmahụ pụrụ ịkụziri ndị ọhụrụ nkà a n’ozi Ndị Kraịst. Mgbe ha si na nke mmadụ pụta ka ha na-eje ozi ọma, ha pụrụ ịtule ihe ndị gosiri mmetụta onye ha gara na nke ya nwere. Onye ahụ ọ̀ na-eme ihere, ọ̀ na-enwe obi abụọ, ọ̀ na-ewe iwe, ka ò ji ọrụ n’aka? Olee ụzọ ga-akasị nro isi nyere ya aka? Ndị okenye pụkwara inyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị aka, bụ́ ndị pụrụ imejọwo ibe ha n’ihi ejighị akọ mee ihe. Nyere nke ọ bụla n’ime ha aka ịghọta mmetụta nke onye nke ọzọ. Ọ̀ dị ya ka a kparịrị ya, leghara ya anya, ma ọ bụ ghọtahie ya? Olee otú obiọma pụrụ isi mee ka obi dị ya mma?

Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị inyere ụmụ ha aka ịzụlite obi ọmịiko, ebe nke a ga-akwali ha iji akọ na-eme ihe. Nwa Peggy nke nwoke, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, chọpụtara na ihu nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ gbarụrụ agbarụ, na obi adịghị ya mma, nakwa na anya mmiri juru ya anya, ọ ghọtazie ụdị iwe ọ kpasuru nwanne ya nwoke. Dị nnọọ ka nne ya tụworo anya ya, ọ kwara ụta ma kpebie ịgbanwe. Ụmụ Peggy abụọ ahụ ji nkà ndị ha mụtara n’oge ha ka bụ ụmụaka mee ihe nke ọma, ka ọtụtụ afọ gasịkwara, ha ghọrọ ndị na-arụpụta ihe n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nakwa ndị ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

Gosi na Ị Na-aghọta Ihe

Ọ dị mkpa iji akọ eme ihe karịsịa mgbe i nwere mkpesa megide mmadụ. Ọ pụrụ ịdịrị gị nnọọ mfe imebi ùgwù onye ahụ. Ọ na-abụkarị ihe kwesịrị ekwesị ibu ụzọ jaa onye ahụ mma, na-akpọ okwu aha. Kama ịkatọ ya, lekwasị anya n’otú ị pụrụ isi dozie nsogbu ahụ. Kọwaa otú omume ya siri metụta gị nakwa kpọmkwem ihe ị ga-achọ ịhụ na ọ gbanwere. Mgbe ahụ, dị njikere ige ntị. Ikekwe, ị ghọtahiewo ya.

Ọ na-amasị ndị mmadụ inwe mmetụta na ị  ghọtara echiche ha ọbụna ma a sị na i kwenyeghị n’ihe ha kwuru. Jizọs ji akọ kwuo okwu, na-egosi na ọ ghọtara nsogbu Mata. O kwuru, sị: “Mata, Mata, ị na-echegbu ma na-esogbu onwe gị banyere ọtụtụ ihe.” (Luk 10:41) N’otu aka ahụ, mgbe mmadụ mere mkpesa banyere nsogbu ụfọdụ ọ na-enwe, kama ịmalite ikwu ihe a ga-eme iji dozie okwu ahụ tupu ị nụchaa ka o si mee, ụzọ akọ ị ga-esi gosi na ị ghọtara ya bụ site n’ịkọghachi nsogbu ma ọ bụ mkpesa ahụ n’okwu nke aka gị. Nke a bụ ụzọ obiọma ị ga-esi gosi na ị na-aghọta ihe.

Mata Ihe Ị Na-ekwesịghị Ikwu

Mgbe Nwunye Eze bụ́ Esta chọrọ ịrịọ di ya ka ọ kagbuo nkata ọjọọ Heman kpara ibibi ndị Juu, o ji akọ hazie ihe nke ọma ka obi wee dị di ya mma. Ọ bụ mgbe ahụ ka o welitere okwu a chọrọ akọ. Ma ọ dịkwa mkpa ịmụta ihe site n’ịrịba ama ihe ọ na-ekwughị. O ji akọ hapụ ịrụtụ aka n’òkè dị ya keere na nkata ọjọọ ahụ.—Esta 5:1-8; 7:1, 2; 8:5.

N’otu aka ahụ, mgbe ị na-eleta di na-ekweghị ekwe nke nwanna nwanyị bụ́ Onye Kraịst, kama iwepụta Bible ozugbo n’ihu ya, gịnị ma ị malite site n’ịjụ ya otú o mere? Mgbe onye ọhụrụ yi uwe na-ekwesịghị ekwesị bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụ mgbe mmadụ laghachitere n’ọgbakọ ka ọ nọsịrị ọtụtụ oge n’èzí, nabata ya nke ọma kama ikwu okwu banyere uwe ya ma ọ bụ ọpụpụ ọ pụrụ n’ọgbakọ. Mgbe ị chọpụtakwara na onye ọhụrụ nwere mmasị nwere echiche na-ezighị ezi, ọ pụrụ ịkasị mma ịghara ịgbazi ya olu ozugbo ahụ. (Jọn 16:12) Iji akọ eme ihe na-agụnye iji obiọma amata ihe ị na-ekwesịghị ikwu.

Okwu Na-agwọ Ọrịa

Ịmụta nkà nke iji akọ ekwu okwu ga-enyere gị aka iso ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta obi ụtọ, ọbụna mgbe mmadụ ghọtahiere ebumnobi gị ma nwee obi ilu ma na-eburu gị iwe n’obi. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ikom Ifrem ‘sesosiri Gidiọn okwu ike,’ n’ihe o ji akọ zaghachi ha, ọ kọwara, n’ụzọ doro anya, ihe meworonụ n’ezie, jirikwa obi eziokwu kwuo ihe ndị ikom Ifrem rụzuworo. Nke a bụ iji akọ mee ihe n’ihi na ọ ghọtara ihe mere ha ji wee iwe, obi umeala ya mekwara ka obi jụrụ ha.—Ndị Ikpe 8:1-3; Ilu 16:24.

Gbalịa mgbe nile ịtụle otú okwu gị ga-esi metụta ndị ọzọ. Ịgbalị iji akọ na-eme ihe ga-enyere gị aka inweta ọṅụ ahụ a kọwara n’Ilu 15:23: “Ọṅụ dịịrị onye ọ bụla n’ọzịza okwu nke ọnụ ya: ọzọ, okwu e kwuru na mgbe ya, lee ka o si dị mma nke ukwuu!”

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịkụziri ụmụ ha inwe mmetụta n’ebe ndị ọzọ nọ

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi nwere ahụmahụ pụrụ ịkụziri ndị ọhụrụ otú e si eji akọ eme ihe