Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Isi Zụlite Ezi Ịhụnanya

Ụzọ Isi Zụlite Ezi Ịhụnanya

 Ụzọ Isi Zụlite Ezi Ịhụnanya

“Ịhụnanya bụ ọgwọ nnụ ọrịa; ịhụnanya bụ ndụ.”—Living to Purpose, nke Joseph Johnson dere, 1871.

OLEE otú mmadụ si amụta ịhụ n’anya? Ọ̀ bụ site n’ịmụ banyere akparamàgwà mmadụ? Ka ọ̀ bụ site n’ịgụ akwụkwọ ndị na-enyere mmadụ aka ime ka omume ya ka mma? Ka ọ̀ bụ site n’ikiri sịnịma ndị a na-egosi ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ na ha? Ọ dịghị ma ọlị. Ụzọ mbụ ụmụ mmadụ si amụta ịhụ n’anya bụ site n’ihe nlereanya nke ndị mụrụ ha na ọzụzụ ndị mụrụ ha nyere ha. Ụmụaka ga-amụta ihe ịhụnanya pụtara ma ọ bụrụ na, n’ebe a na-egosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ, ha ahụ ka ndị mụrụ ha na-enye ha nri ma na-echebe ha, soro ha na-ekwurịta okwu ma nwee nnọọ mmasị onwe onye n’ebe ha nọ. Ha na-amụtakwa ịhụ n’anya mgbe ndị mụrụ ha na-akụziri ha idebe ụkpụrụ ndị ezi uche dị na ha banyere ezi ihe na ihe ọjọọ.

Ezi ịhụnanya karịrị nnọọ mmetụta na-erughị n’obi. A na-egosipụta ya mgbe nile n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụzọ ga-akasị abara ha uru, ọbụna ma a sị na ha ejichaghị ya kpọrọ ihe mgbe e gosiri ha ya, bụ́ ihe a na-ahụkarị n’ebe ụmụaka nọ mgbe e ji ịhụnanya dọọ ha aka ná ntị. Onye setịpụrụ ihe nlereanya na-enweghị atụ n’igosipụta ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị bụ Onye Okike n’onwe ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Nwa m, eledala ịdọ aka ná ntị nke sitere n’aka Jehova anya, adakwala mbà mgbe ọ na-abara gị mba; n’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.”—Ndị Hibru 12:5, 6.

Ndị nne na nna, olee otú unu pụrụ isi na-eṅomi Jehova n’igosipụta ịhụnanya n’ebe ezinụlọ unu nọ? Oleekwa otú ihe nlereanya unu na-esetịpụ ná mmekọrịta unu na-enwe dị ka di na nwunye dịruru ná mkpa?

Jiri Ihe Nlereanya Na-akụzi Banyere Ịhụnanya

Ọ bụrụ na ị bụ di, ì ji nwunye gị kpọrọ ihe ma ọ bụ were ya dị ka onye dị oké ọnụ ahịa ma na-enye ya ùgwù na nsọpụrụ? Ọ bụrụ na ị bụ nwunye, ị̀ hụrụ di gị n’anya ma na-akwado ya? Bible na-ekwu na di na nwunye kwesịrị ịhụrịta ibe ha n’anya na ịkwanyerịtara ibe ha ùgwù. (Ndị Efesọs 5:28; Taịtọs 2:4) Mgbe ha na-eme otú ahụ, ụmụ ha na-ahụ ịhụnanya Ndị Kraịst ka ọ nọ n’ọrụ. Lee ka nke ahụ pụrụ isi kụziere ha ihe gbara ọkpụrụkpụ na ihe bara uru!

Ndị nne na nna na-akwalitekwa ịhụnanya n’ebe obibi ha mgbe ha na-agbaso ụkpụrụ ndị dị elu a tụpụtaara ezinụlọ n’ihe banyere ntụrụndụ, omume, na ihe mgbaru ọsọ nakwa ihe ndị e weere dị ka ihe ndị ka mkpa. N’ụwa nile, ndị mmadụ achọpụtawo na Bible na-enye aka nke ukwuu n’isetịpụ ụkpụrụ ndị dị otú ahụ ezinụlọ kwesịrị ịgbaso, na-enye ihe àmà anya na-ahụ  nke na-egosi na Bible n’ezie “sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe, maka ịdọ aka ná ntị, maka ime ka ihe guzozie, maka inye ọzụzụ n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) N’ezie, a na-ele ụkpụrụ omume ọma na nduzi e nyere maka ndụ bụ́ ndị a na-achọta n’Ozizi Elu Ugwu ahụ anya n’ebe nile dị ka ndị na-enweghị atụ.—Matiu, isi 5 ruo 7.

Mgbe ezinụlọ dum legaara Chineke anya maka nduzi ma na-agbaso ụkpụrụ ya, ahụ́ na-eru onye ọ bụla n’ime ha ala, o yikarịkwara ka ụmụaka hà ga-etolite ịhụ ndị mụrụ ha n’anya na ịkwanyere ha ùgwù. N’aka nke ọzọ, n’ebe obibi e nwere ụkpụrụ abụọ, ụkpụrụ na-ezighị ezi, ma ọ bụ nke na-esighị ike, ụmụaka pụrụ ịghọ ndị a kpasuru iwe, ndị nwere ọnụma, na ndị nnupụisi.—Ndị Rom 2:21; Ndị Kọlọsi 3:21.

Gịnị banyere ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ? Hà bụ ndị na-agaghị enwe ike ịkụziri ụmụ ha ịhụ n’anya? Ọ dịchaghị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe a ga-eji dochie anya ezi nne na nna ịrụkọ ọrụ ọnụ, ahụmahụ na-egosi na otú mmekọrịta ezinụlọ siruru n’ike pụrụ ime n’ụzọ ụfọdụ ka a ghara ịmatacha na nne ma ọ bụ nna anọghị. Ọ bụrụ na ọ bụ nanị gị na-azụ ụmụ, gbalịsie ike ịdị na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’ebe obibi gị. Ee, otu ilu na-agwa anyị, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie”—gụnyere ụzọ nke ịbụ nne ma ọ bụ nna.—Ilu 3:5, 6; Jems 1:5.

A zụlitere ọtụtụ ndị na-eto eto na-akpa ezi àgwà n’ezinụlọ e nwere nanị nne ma ọ bụ nna, ha jikwa ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi ugbu a n’ọtụtụ puku ọgbakọ Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. Nke a bụ ihe àmà na-egosi na ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịkụziri ụmụ ha ihe banyere ịhụnanya.

Ụzọ Mmadụ Nile Pụrụ Isi Zụlite Ịhụnanya

Bible buru amụma na a ga-eji ‘enweghị obi mmadụ,’ ya bụ, enweghị mmetụta e bu pụta ụwa nke na-adịkarị n’etiti ndị òtù ezinụlọ, mara ‘ụbọchị ikpeazụ.’ (2 Timoti 3:1, 3) N’agbanyeghị nke ahụ, ọbụna ndị ọ pụrụ ịbụ na ha tolitere n’ebe a na-enweghị mmetụta na-ekpo ọkụ pụrụ ịmụta ịzụlite ịhụnanya. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịmụta ya n’aka Jehova, bụ́ kpọmkwem Isi Iyi nke ịhụnanya, bụrụkwa onye na-egosipụta ịhụnanya na mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ndị nile ji obi ha dum na-abịakwute ya nọ. (1 Jọn 4:7, 8) “Ọ bụrụgodị na nna m na nne m ahapụ m, ọbụna Jehova n’onwe ya ga-akpọrọ m,” ka otu ọbụ abụ kwuru.—Abụ Ọma 27:10, NW.

Jehova na-egosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ n’ọtụtụ ụzọ dịgasị iche iche. Ụzọ ndị a na-agụnye nduzi o ji Bible na-enye anyị dị ka nna, enyemaka nke mmụọ nsọ, na nkwado siri ike anyị na-enweta n’aka òtù ụmụnna bụ́ Ndị Kraịst. (Abụ Ọma 119:97-105; Luk 11:13; Ndị Hibru 10:24, 25) Tụlee otú ihe atọ ndị a pụrụ isi nyere anyị aka ịhụkwu Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya.

Nduzi Chineke Na-enye Dị Ka Nna

Iji soro mmadụ na-enwe ezi mmekọrịta, anyị aghaghị ịmara onye ahụ nke ọma. Site n’ime ka anyị mara onye ọ bụ site na Bible, Jehova na-akpọ anyị òkù ịbịaru ya nso. Otú ọ dị, ịgụ Bible ezughị. Anyị aghaghị itinye ihe ọ na-akụzi n’ọrụ ma rite uru ndị na-esite na ya. (Abụ Ọma 19:7-10) “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso,” ka Aịsaịa 48:17 na-ekwu. Ee, Jehova, onye bụ́ ịhụnanya n’onwe ya, na-akụziri anyị ihe maka abamuru anyị—ọ bụghị n’ihi na ọ chọrọ iji iwu na ụkpụrụ ndị na-enweghị isi egbochi anyị imegharị ahụ́.

 Ezi ihe ọmụma nke Bible na-enyekwara anyị aka inwekwu ịhụnanya n’ebe ụmụ mmadụ ibe anyị nọ. Nke a bụ n’ihi na eziokwu Bible na-akụziri anyị otú Chineke si ele ụmụ mmadụ anya ma na-egosi anyị ụkpụrụ ndị kwesịrị ịchịkwa otú anyị si emesorịta ibe anyị ihe. Ọ bụrụ na anyị enwee ihe ọmụma dị otú ahụ, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-enwe ịhụnanya n’ebe ndị agbata obi anyị nọ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Nke a bụkwa ihe m nọgidere na-ekpe n’ekpere, ka ịhụnanya unu wee na-amụbawanye n’ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu.”—Ndị Filipaị 1:9.

Iji gosi otú ‘ezi ihe ọmụma’ pụrụ isi mee ka a na-egosipụta ịhụnanya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, tụlee eziokwu ahụ bụ́ isi nke dị n’Ọrụ 10:34, 35: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” Ọ bụrụ na Chineke ji ezi omume ndị mmadụ na egwu nsọpụrụ ha na-atụ ya, ọ bụghị mba ma ọ bụ agbụrụ ha si na ya, atụ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji àgwà eleghị mmadụ anya n’ihu yiri nke ahụ na-atụ mmadụ ibe anyị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀?—Ọrụ 17:26, 27; 1 Jọn 4:7-11, 20, 21.

ỊhụnanyaMkpụrụ nke Mmụọ Chineke

Dị nnọọ ka mmiri zoro n’oge ya nke na-ezokwasị ubi mkpụrụ osisi si eme ka ọ mịa mkpụrụ nke ọma, mmụọ Chineke pụrụ ịmịpụta n’ime ndị nwere obi na-anabata ihe, àgwà ndị Bible na-akọwa dị ka “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Ndị Galeshia 5:22, 23) Nke mbụ n’ime mkpụrụ a bụ ịhụnanya. (1 Ndị Kọrint 13:13) Ma olee otú anyị si enweta mmụọ Chineke? Otu ụzọ dị oké mkpa e si enweta ya bụ site n’ekpere. Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka mmụọ Chineke, ọ ga-enye anyị ya. (Luk 11:9-13) Ị̀ ‘na-anọgide’ na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ? Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, mgbe ahụ mkpụrụ ya ndị dị oké ọnụ ahịa, gụnyere ịhụnanya, kwesịrị ịpụtakwu ìhè ná ndụ gị.

Otú ọ dị, e nwere ụdị mmụọ ọzọ nke na-emegide mmụọ Chineke. Bible na-akpọ ya “mmụọ nke ụwa.” (1 Ndị Kọrint 2:12; Ndị Efesọs 2:2) Ọ bụ mmetụta ọjọọ, ọ dịghịkwa onye ọzọ o si n’aka ma ọ bụghị Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ “onye na-achị ụwa a” nke ihe a kpọrọ mmadụ e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. (Jọn 12:31) Dị ka ifufe nke na-ebuli uzuzu na ihe ndị a tụsasịrị n’ala, “mmụọ nke ụwa” na-akpalite ọchịchọ ndị na-emebi ihe bụ́ ndị na-ebibi ịhụnanya ma na-emejụ adịghị ike nke anụ ahụ́.—Ndị Galeshia 5:19-21.

Ndị mmadụ na-anakwere mmụọ ahụ dị njọ mgbe ha na-anabata echiche nke ịhụ ihe onwunwe n’anya na nke iche nanị banyere onwe ha, na-anabata ime ihe ike, na echiche ndị hiere ụzọ na ndị na-arụkarị arụ bụ́ ndị a na-enwe banyere ịhụnanya n’ebe nile n’ụwa. Ọ bụrụ na ị chọrọ inwekwu ezi ihe ọmụma, ị ghaghị iguzogidesi mmụọ nke ụwa ike. (Jems 4:7) Otú ọ dị, atụkwasịla obi n’ike nke onwe gị; kpọkuo Jehova maka enyemaka. Mmụọ ya—ike kasịnụ n’eluigwe na ala—pụrụ iwusi gị ike ma mee ka i nwee ihe ịga nke ọma.—Abụ Ọma 121:2.

Mụta Banyere Ịhụnanya Site n’Aka Òtù Ụmụnna Ndị Kraịst

Dị nnọọ ka ụmụaka na-amụta igosipụta ịhụnanya site n’ịhụ ka a na-egosipụta ya n’ebe obibi  ha, anyị nile—ma ndị na-eto eto ma ndị agadi—pụrụ inwekwu ịhụnanya site n’iso Ndị Kraịst ndị ọzọ na-akpakọrịta. (Jọn 13:34, 35) N’ezie, otu n’ime ọrụ ndị bụ́ isi ọgbakọ Ndị Kraịst na-arụ bụ ime ka e nwee gburugburu ebe ndị mmadụ pụrụ ‘ịkpali ibe ha inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’—Ndị Hibru 10:24.

Ndị ọ pụrụ ịbụ na “a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha” n’ụwa a nke ịhụnanya na-adịghị na ya, na-akasị eji ịhụnanya dị otú ahụ akpọrọ ihe. (Matiu 9:36) Ahụmahụ egosiwo na mmadụ inwe mmekọrịta ịhụnanya mgbe o toruworo ogo mmadụ pụrụ inyere ya aka imeri ọtụtụ n’ime mmetụta ọjọọ ndị o nwere n’ihi ịhụnanya a na-egosighị ya mgbe ọ dị na nwata. N’ihi ya, lee ka o si dị mkpa ka Ndị Kraịst nile raara onwe ha nye nabata nnọọ ndị ọhụrụ bụ́ ndị bịara n’etiti ha, nke ọma!

“Ịhụnanya Adịghị Ada Ada”

Bible na-ekwu na “ịhụnanya adịghị ada ada.” (1 Ndị Kọrint 13:8) Olee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu? Pọl onyeozi na-agwa anyị, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ.” (1 Ndị Kọrint 13:4, 5) N’ụzọ doro anya, ịhụnanya dị otú a abụghị nke a na-eche n’echiche ma ọ bụ mmetụta na-erughị n’obi. N’ụzọ megidere nke ahụ—ndị na-egosipụta ya maara ma kwere na a na-enwe ndakpọ olileanya na ihe mgbu ná ndụ, ma ha adịghị ekwe ka ihe ndị a bibie ịhụnanya ha nwere n’ebe mmadụ ibe ha nọ. Ịhụnanya dị otú ahụ bụ n’ezie “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Ndị Kọlọsi 3:12-14.

Tụlee ihe atụ nke otu nwa agbọghọ dị afọ 17 bụ́ Onye Kraịst nke bi na Korea. Mgbe ọ malitere ijere Jehova Chineke ozi, ndị ezinụlọ ya ekweghị, ọ ghaghịkwa ịkwapụ n’ụlọ ha. Otú ọ dị, kama iwewe iwe, o kpere ekpere banyere nsogbu ahụ, na-ekwe ka Okwu na mmụọ Chineke kpụzie echiche ya. Mgbe e mesịrị, o degaara ezinụlọ ya akwụkwọ ọtụtụ ugboro, na-egosipụta nnọọ ezi mmetụta na-ekpo ọkụ o nwere n’ebe ha nọ n’akwụkwọ ozi ya. N’ihi ya, ụmụnne ya ndị nwoke abụọ tọrọ ya malitere ịmụ Bible, ha bụkwa Ndị Kraịst rarawooro onwe ha nye ugbu a. Mama ya na nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ nakwekwaara eziokwu nke Bible. N’ikpeazụ, papa ya, bụ́ onye megidere ya n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, gbanwere obi. Nwa agbọghọ ahụ bụ́ Onyeàmà na-ede, sị: “Anyị nile lụrụ Ndị Kraịst ibe anyị, anyị dịzikwa mmadụ 23 ná ngụkọta n’ezinụlọ anyị nke dị n’otu n’ofufe.” Lee mmeri nke ahụ bụụrụ ịhụnanya!

Ị̀ chọrọ ịzụlite ezi ịhụnanya ma nyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ? Mgbe ahụ gakwuru Jehova, bụ́ Isi Iyi nke àgwà ahụ dị oké ọnụ ahịa. Ee, ṅaa ntị n’Okwu ya, kpee ekpere maka mmụọ nsọ, ma soro òtù ụmụnna bụ́ Ndị Kraịst na-akpachi anya. (Aịsaịa 11:9; Matiu 5:5) Lee ka o si bụrụ ihe na-enye obi ụtọ ịmara na n’isi nso, ndị ajọ omume nile agaghịzi adị, ndị ga-afọdụzi ga-abụ nanị ndị na-egosipụta ezi ịhụnanya Ndị Kraịst! N’ezie, ịhụnanya bụ isi ihe na-eme ka e nwee obi ụtọ ná ndụ.—Abụ Ọma 37:10, 11; 1 Jọn 3:14.

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ekpere na ịmụ Okwu Chineke ga-enyere anyị aka ịzụlite ezi ịhụnanya