Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ijere Ìgwè Na-asụ Asụsụ Pụrụ Iche Ozi na Korea

Ijere Ìgwè Na-asụ Asụsụ Pụrụ Iche Ozi na Korea

 Ijere Ìgwè Na-asụ Asụsụ Pụrụ Iche Ozi na Korea

OTU ìgwè mmadụ nwere oké mkpali, bụ́kwa ndị na-adịghị eme ụzụ, zukọrọ maka mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova n’oge okpomọkụ nke 1997. Nke a bụ nke mbụ e nwetụrụla ụdị mgbakọ a maka ndị ntị chiri. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị bịara ya bụ 1,174. E ji Ụdị Asụsụ Ogbi nke Korea mee akụkụ nile nke ihe omume ahụ—gụnyere okwu, ajụjụ ọnụ, na ihe nkiri—e jikwa ígwè electronic mee ka a na-ekiri ya n’otu nnukwu telivishọn e debere n’ebe onye ọ bụla nọ n’Ụlọ Mgbakọ ahụ ga na-ahụ ya. Nke a bụ ihe ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo nọworo na-agbasi mbọ ike ruo ọtụtụ afọ ịhụ na e mere.

Oge na-abịa n’ụwa paradaịs mgbe ‘a ga-emeghe ntị nke ndị ntị chiri.’ (Aịsaịa 35:5) Iji bie ndụ na Paradaịs ahụ, onye ọ bụla, gụnyere ndị ntị chiri, aghaghị ibu ụzọ banye na paradaịs ime mmụọ, bụ́ ọnọdụ ime mmụọ na-aga nke ọma nke ndị Chineke a gọziri agọzi nọ na ya. Ha aghaghị ịghọ Ndịàmà Jehova raara onwe ha nye e mere baptizim, bụrụ ndị ọ na-ezi ihe.—Maịka 4:1-4.

Mmalite Dị Nta

Ọ bụ ezie na e kwusaara ndị ntị chiri ozi ọma n’afọ ndị 1960, ma ọ bụ n’afọ ndị 1970 ka mmadụ ole na ole n’ime ha malitere ịga nzukọ Ndịàmà Jehova na Seoul, bụ́ isi obodo Korea. Otu nwanna nwoke bụ́ Onye Kraịst nke pụrụ ide ihe ọsọ ọsọ na-edepụta na bọọdụ isi ihe ndị e kwuru ná nzukọ, gụnyere akụkụ Bible ndị e ji mee ihe.

Na 1971, n’obodo Taejon, otu Onyeàmà nke nwere nwa nwoke ntị chiri malitere ịkụziri ya na ndị enyi ya ntị chiri ozi Alaeze ahụ. E siwo n’ìgwè a nweta ọtụtụ ndị na-anụ ọkụ n’obi, ndị bụ́zi idè ji ókèala ndị e ji asụsụ ogbi eme ihe na ha.—Zekaraịa 4:10.

 Ndị Na-eto Eto Ewepụta Onwe Ha n’Afọ Ofufo

Ọ bụrụ na ndị ntị chiri gaje inweta ihe ọmụma banyere Jehova na Jizọs ma si otú ahụ banye n’ụzọ nke ndụ, ndị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ aghaghị itinye mgbalị dị ukwuu. (Jọn 17:3) Iji mezuo nke a, ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova amụtawo asụsụ ogbi, e jiriwokwa ahụmahụ ndị dị mma gọzie ha.

Otu nwa okoro dị afọ 15, bụ́ Park In-sun, setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ nke ịmụta asụsụ ogbi. Iji mee ya, ọ gara mụọ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ bụ́ ebe mmadụ 20 ntị chiri na-arụ ọrụ. Ruo ọnwa asatọ, o sooro ha rụkọọ nnọọ ọrụ iji mụta asụsụ ogbi na otú ndị ntị chiri si eche echiche. N’afọ na-esonụ, ọ ghọrọ onye ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ onye nkwusa Alaeze oge nile, ma soro ìgwè ndị ntị chiri bụ́ ndị nwere mmasị n’eziokwu Bible na-arụkọ ọrụ. Ìgwè ahụ mụbara nnọọ ngwa ngwa, n’oge na-adịghịkwa anya, ihe karịrị mmadụ 35 malitere ịga nzukọ ndị a na-enwe na Sunday.—Abụ Ọma 110:3.

Mgbe nke ahụ gasịrị, na nke mbụ ya na Seoul, e mere ndokwa ịdị na-enwe nzukọ Ndị Kraịst nile n’asụsụ ogbi. Nwanna Park In-sun jere ozi dị ka ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ìgwè a na-abawanye ụba. Ọ ghọwo aka ochie ugbu a n’ịsụ asụsụ ogbi. N’ime ọnwa ụfọdụ, o duziiri mmadụ 28 ntị chiri ọmụmụ Bible ebe obibi. Ọtụtụ n’ime ha nwere ọganihu ma ghọọ Ndịàmà Jehova.

N’ihi ọrụ afọ ofufo a a rụsịrị nnọọ ike, e guzobere ọgbakọ asụsụ ogbi mbụ na Seoul n’October 1976, bụ́ nke nwere ndị nkwusa 40 na mmadụ 2 bụ́ ndị ọsụ ụzọ oge nile. Nke a kpaliri obodo ndị ọzọ dị na Korea ịrụ ọrụ ahụ. Agụụ eziokwu ahụ nọ na-agụ ọtụtụ ndị ntị chiri, ha nọkwa na-eche ka a bịa na nke ha.

Iso Ndị Ntị Chiri Na-arụ Ọrụ

Ị pụrụ iche otú e si na-achọta ndị ntị chiri. A kpọtụụrụ ọtụtụ n’ime ha mgbe ndị mmadụ nyere nkọwa banyere ha. Ọzọkwa, a gakwuuru ndị nwere ụlọ ahịa osikapa n’ógbè ndị ahụ, ha nyekwara aha na adres nke ndị ntị chiri. Ụfọdụ ụlọ ọrụ gọọmenti nyere aka n’inye ihe ọmụma dị otú ahụ. E nwere ihe ịga nke ọma n’iji ịdị uchu rụzuo ókèala ebe ndị ntị chiri bi nke na, ka oge na-aga, e guzobere ọgbakọ anọ ji asụsụ ogbi eme ihe. A gbara ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst ume ịmụ asụsụ ogbi.

Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova kenyere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche bụ́ ndị mụtarala asụsụ ogbi ọrụ n’ọgbakọ ndị ahụ. N’oge na-adịbeghị anya, e kenyewo ndị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ọrụ n’ọgbakọ ndị a, ha ewusiwokwa ha ike n’ụzọ ime mmụọ.

E nwere ihe isi ike ndị a ga-emeri. Ije ozi n’ókèala a na-achọ itinye mgbalị iji mụta ọdịbendị nke ndị ogbi. Ha na-eche echiche ma na-eme ihe ọkụ ọkụ. Nke a na-eju ndị mmadụ anya mgbe ụfọdụ, ọ pụkwara ibute nghọtahie. Ọzọkwa, mgbe Ndịàmà na-eduziri ndị ntị chiri ọmụmụ Bible ebe obibi, ọ dị mkpa inyere ha aka ịmụta asụsụ ha nke ọma na ịgba ha ume ịmụba usoro ihe omume ha nke ịgụ na ịmụ ihe.

N’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị, ndị ntị chiri na-enweta ihe isi ike ndị  ndị ọzọ na-adịtụghị ama banyere ha. Ikwurịta okwu n’ụlọ ọrụ gọọmenti na n’ụlọ ọgwụ, nakwa azụmahịa nkịtị, na-abụkarịrị ha oké nsogbu. Ebe ọ bụ na Ndịàmà si n’ọgbakọ ndị dị nso ejiriwo ịhụnanya nye aka, ndị ntị chiri nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst enwetawo ezi òtù ụmụnna.—Jọn 13:34, 35.

Àmà Mberede Arụpụta Ihe

Na Pusan, bụ́ obodo ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ isi n’ebe ndịda Korea dị na ya, otu Onyeàmà zutere mmadụ abụọ ntị chiri bụ́ ndị dere ná mpempe akwụkwọ, sị: “Anyị nwere mmasị na Paradaịs. Anyị chọrọ ịmata akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwuru banyere ndụ ebighị ebi.” Nwanna ahụ deturu adres ha ma mee ndokwa ileta ha. Mgbe ọ gara, ndị ntị chiri jupụtara n’ọnụ ụlọ ahụ na-echere ịnụrụ ozi Alaeze ahụ. Ahụmahụ a kpaliri ya ịmalite ịmụ asụsụ ogbi. N’oge na-adịghị anya, e guzobere ọgbakọ ji asụsụ ogbi eme ihe na Pusan.

Otu nwanna si n’ọgbakọ ahụ hụrụ mmadụ abụọ ntị chiri ka ha ji asụsụ ogbi na-akọrị ma gakwuru ha. Ka ọ chọpụtara na ha si ụka na-alọta, ọ kpọrọ ha òkù ka ha bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’elekere anya abụọ nke ehihie ụbọchị ahụ. Ha gara, a malitekwara iduziri ha ọmụmụ Bible. N’oge na-adịghị anya nke ahụ gasịrị, mmadụ 2 ahụ, tinyere ndị enyi ha 20 ntị chiri, gara mgbakọ distrikti. Ọtụtụ ndị si n’ìgwè ahụ ararawo ndụ ha nye Jehova. Mmadụ abụọ n’ime ha aghọọla ndị okenye ọgbakọ, otu aghọwokwa ohu  na-eje ozi n’ọgbakọ ndị e ji asụsụ ogbi eme ihe na ha.

E Nweta Nkwụghachi Ụgwọ Maka Mkpebi Siri Ike

Ebe ọ bụ na ụfọdụ ndị ntị chiri bi n’ebe dị anya site n’ebe ọgbakọ e ji asụsụ ogbi eme ihe na ya dị, ọ na-achọkarị mgbalị dị ukwuu iji na-enyechi ha nri ime mmụọ ndị sitere na Bible anya. Dị ka ihe atụ, otu nwoke dị afọ 31 na-akpata ihe o ji ebi ndụ site n’ịkụ azụ̀ n’ụsọ oké osimiri nke otu àgwàetiti. Ọ nụrụ banyere ozi Bible n’ọnụ nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ, bụ́ onye Ndịàmà Jehova letarala. Ná mgbalị iji rie nri ime mmụọ, onye ọkụ azụ̀ ahụ ntị chiri ji ụgbọ epeepe gaa kilomita 16 ruo Tongyoung City, bụ́ nke dị n’ụsọ oké osimiri nke ebe ndịda Korea. Ihe ọ gara bụ izute otu ọsụ ụzọ pụrụ iche nke si n’ọgbakọ asụsụ ogbi nke dị na Masan City. Kwa ụbọchị Monday, ọsụ ụzọ a pụrụ iche na-aga kilomita 65 nanị iji duziere onye ọkụ azụ̀ ahụ ntị chiri ọmụmụ Bible.

Iji gaa nzukọ nke ụbọchị Sunday na Masan City, onye a ntị chiri a na-amụrụ Bible aghaghị iji ụgbọ epeepe gaa kilomita 16 ma banyezie bọs iji gaa kilomita 65 ọzọ. Mkpebi siri ike o mere rụpụtara ihe dị mma. N’ime ọnwa ole na ole, ọ mụtakwuru asụsụ ogbi, matakwuo mkpụrụ akwụkwọ Korean—nke kasịkwa mkpa—mụta ụzọ nke ọ bụ nanị ya ka e si eso Jehova enwe mmekọrịta. N’ịghọta mkpa ọ dị ịdị na-aga nzukọ na ịdị na-agba àmà mgbe nile, ọ kwagara n’ókèala nke ọgbakọ ahụ e ji asụsụ ogbi eme ihe na ya. Nke ahụ ọ̀ dịịrị ya mfe? Ee e. Ọ ghaghị ịhapụ ọrụ ịkụ azụ̀ ya bụ́ nke ọ na-akpata $3,800 n’ọnwa na ya, ma o nwetara ụgwọ ọrụ n’ihi mkpebi a siri ike o mere. Mgbe o nwesịrị ọganihu n’eziokwu ahụ, e mere ya baptizim, ugbu a kwa, ya na ezinụlọ ya ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi.

Nsụgharị Maka Ndị Ntị Chiri

A na-ejikarị okwu ọnụ ezi ozi ọma Alaeze ahụ. Otú ọ dị, iji zie ozi sitere n’Okwu Chineke n’ụzọ ka zie ezie, ọ dị oké mkpa ka ozizi Bible dịrị n’ụdị na-adịgide adịgide karị. N’ihi ya, na narị afọ mbụ, ndị okenye nwere ahụmahụ dere akwụkwọ na akwụkwọ ozi dị iche iche. (Ọrụ 15:22-31; Ndị Efesọs 3:4; Ndị Kọlọsi 1:2; 4:16) N’oge anyị, e jiriwo akwụkwọ na mbipụta ndị ọzọ nke Ndị Kraịst na-enye nri ime mmụọ n’ụba. A sụgharịwo ha n’ọtụtụ narị asụsụ, gụnyere ụdị dị iche iche nke asụsụ ogbi. Iji mee nke a n’Ụdị Asụsụ Ogbi nke Korea, alaka ụlọ ọrụ dị n’ebe ahụ nwere ngalaba nsụgharị nke asụsụ ogbi. Ngalaba vidio na-emepụta vidio n’asụsụ ogbi. Nke a na-eme ka ndị ntị chiri bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma na ndị nwere mmasị nọ n’ọgbakọ ndị dị n’ebe nile na Korea nwee ihe ndị ha ji akwado onwe ha n’ụzọ ime mmụọ.

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị amụtawo asụsụ ogbi nke ọma ma nye aka n’imepụta vidio, dị ka ọ na-adịkarị, ndị kasị mara asụgharị ya bụ ụmụ nke ndị ntị chiri. Ha amụtawo asụsụ ogbi site n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ. Ọ bụghị nanị na ha na-asụ ya nke ọma kamakwa ha na-eji mmegharị ahụ́ na ọdịdị ihu ha emesi ihe ha na-ekwu ike ma na-eme ka a ghọta ya, si otú ahụ na-eme ka ọ na-eru n’obi na n’uche.

Dị ka e kwuru, a na-enwechizi mgbakọ ukwu na ndị nta anya n’asụsụ ogbi na Korea. A chọrọ ọrụ siri ike, oké mmefu, na mgbalị siri ike iji na-emezu nke a. Otú ọ dị, ndị na-aga ya na-enwe ekele maka ndokwa a. Mgbe e mechisịrị mgbakọ ndị a, ọtụtụ ndị na-anọtụkwu, na-achọ inwekwu mkpakọrịta ahụ dị mma na ịtụleghachi ọmarịcha nri ime mmụọ ndị e nyere ha. N’ụzọ doro anya, ije ozi n’ìgwè a pụrụ iche nwere ihe ịma aka ndị so ya, ma ngọzi ime mmụọ ndị a na-enweta na ya na-eme ka o kwesị mgbalị a na-eme maka ya.

[Foto dị na peeji nke 10]

Vidio asụsụ ogbi ndị e mepụtara na Korea: “What Does God Require of Us?,” “Appreciating Our Spiritual Heritage,” “Warning Examples for Our Day,” na “Respect Jehovah’s Authority”

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Malite n’okpuru aka ekpe gaa n’aka nri: Ka a na-emepụta vidio asụsụ ogbi n’alaka ụlọ ọrụ Korea; ka a na-echepụta otú a ga-esi na-ekwu okwu ọchịchị Chineke n’asụsụ ogbi; ìgwè ndị nsụgharị nke asụsụ ogbi; ichetara onye na-asụ asụsụ ogbi otú ọ ga-esi sụọ ya n’oge a na-emepụta vidio