Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụlọ Akwụkwọ Gilead—Afọ 60 nke Ọzụzụ Maka Ozi Ala Ọzọ

Ụlọ Akwụkwọ Gilead—Afọ 60 nke Ọzụzụ Maka Ozi Ala Ọzọ

 Ụlọ Akwụkwọ Gilead—Afọ 60 nke Ọzụzụ Maka Ozi Ala Ọzọ

“N’IHI ọmụmụ Bible kpụ ọkụ n’ọnụ nke anyị nweworo, anyị bịarukwuru Jehova nso ma mụtakwuo banyere nzukọ ya. Nke a kwadebere anyị ibi ndụ n’ebe e kenyere anyị ọrụ n’ala ọzọ.” Otú a ka otu onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke mbụ si kọwaa ihe ọ mụrụ na Watchtower Bible School of Gilead. Kemgbe a malitere ya afọ 60 gara aga, Ụlọ Akwụkwọ Gilead anọwo na-ezipụ ndị ozi ala ọzọ. Na March 8, 2003, e mere ememe ngụsị akwụkwọ nke klas nke 114 n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower nke dị na Patterson, New York. Mmadụ 6,404 bụ́ ndị gbakọtara n’ụlọ mgbakọ ahụ na n’ebe dị iche iche e gosiri ihe omume ahụ na telivishọn gere ntị nke ọma n’ihe omume ahụ, bụ́ nke gụnyere okwu, ajụjụ ọnụ, na nkwurịta okwu nke otu ìgwè.

Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ onyeisi oche. N’okwu mmeghe ya o mere ka a mara na ndị ahụ na-ege ntị si mba dị iche iche bịa, ụfọdụ si Eshia, ógbè Caribbean, Ebe Etiti na Ebe Ndịda America, na Europe. N’ịgbakwasị ụkwụ na 2 Timoti 4:5 n’okwu ya, Nwanna Jaracz mesiri ọrụ bụ́ isi nke ndị ozi ala ọzọ a zụrụ na Gilead ike—ịrụ “ọrụ onye na-ezisa ozi ọma.” Ndị ozi ala ọzọ na-agbara eziokwu ahụ àmà site n’ịkụziri ndị mmadụ Bible.

Ụmụ Akwụkwọ Anata Ntụziaka Ikpeazụ

N’ịbụ onye mbụ kwuru okwu n’usoro isiokwu ndị dịcha mkpirikpi, John Larson, onye so na Kọmitii Alaka nke United States, kwuru okwu n’isiokwu na-ewusi okwukwe ike bụ́ “Ọ Bụrụ na Chineke Nọnyeere Anyị, Ònye Ga-emegide Anyị?” (Ndị Rom 8:31) Ọkà okwu ahụ kọwara ihe e dere na Bible nke ụmụ akwụkwọ ahụ ga-adabere na ya nwee obi ike zuru ezu n’ike Jehova nwere inyere ha aka imeri ihe mgbochi ọ bụla ha pụrụ izute n’ebe e kenyere ha ọrụ. N’iji ihe e dere ná Ndị Rom 8:38, 39 mee ihe, Nwanna Larson dụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ọdụ, sị: “Kwụsịnụ ma tụgharịa uche n’ike Chineke na-akpa n’ihi unu, ma chetanụ na ọ dịghị ihe pụrụ ime ka Jehova n’onwe ya kwụsị inwe mmasị n’ebe unu nọ.”

Onye ọzọ kwuru okwu n’usoro ihe omume ahụ bụ́ Guy Pierce, onye so n’Òtù Na-achị Isi. Ọ họọrọ isiokwu bụ́ “Mee Ka Anya Gị Na-enwe Obi Ụtọ!” (Luk 10:23) Ọ kọwara na ezi obi ụtọ na-agụnye ịmara Jehova na ịghọta nzube ebighị ebi ya nakwa ịhụ mmezu amụma Bible. Ebe ọ bụla ha gara, ụmụ akwụkwọ ahụ pụrụ ịnọgide na-enwe ezi obi ụtọ site n’ime ka anya ha nọgide na-enwe obi ụtọ. Nwanna Pierce gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha na-atụgharị uche n’ụzọ miri emi n’ịdị mma Jehova nakwa ka ha na-eme ka uche na obi ha dịrị n’ime uche Ya. (Abụ Ọma 77:12) Site n’ịnọgide na-enwe àgwà ziri ezi, ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ pụrụ imeri nsogbu ọ bụla ha pụrụ izute.

Mgbe nke ahụ gasịrị, mmadụ abụọ n’ime ndị nkụzi ha bụ́ ndị kụziiri ha ihe kwa ụbọchị gwara ha okwu ha ji sị ha gaa nke ọma. “Ị̀ Na-achọ Otuto?” bụ ajụjụ Lawrence Bowen jụrụ n’isiokwu nke okwu ya. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eche na otuto bụ inye ha nsọpụrụ, ịkwanyere ha ùgwù, na inye ha ọkwá pụrụ iche. Otú ọ dị, ọbụ abụ bụ́ Esaf bịara  ghọta ihe ezi otuto bụ—akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke iso Jehova na-enwe mmekọrịta dị ùgwù. (Abụ Ọma 73:24, 25) A gbara ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ka ha nọgide soro Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya site n’ịnọgide na-amụ Bible nke ọma. Ndị mmụọ ozi “na-achọ inyonye anya” n’ihe ndị metụtara mmezu nke nzube Jehova site n’aka Kraịst. (1 Pita 1:12) Ha chọrọ ịmụta ihe dị ukwuu banyere Nna ha ruo ókè o kwere ha mee iji nwee ike ịdị na-egosipụta otuto ya. Ọkà okwu ahụ gbaziri ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha na-enye Jehova otuto n’ebe e kenyere ha ozi ala ọzọ site n’inyere ndị ọzọ aka ịchọta akụ̀ ahụ dị oké ọnụ ahịa.

Onye na-edebanye aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ́ Wallace Liverance, wetara usoro isiokwu mbụ ahụ ná mmechi site n’ikwu okwu n’isiokwu bụ́ “Na-ekwupụta Amamihe Chineke Dị n’Ihe Nzuzo Dị Nsọ.” (1 Ndị Kọrint 2:7) Gịnị bụ amamihe Chineke a nke Pọl onyeozi kwuru banyere ya n’oge ọ na-eje ozi ala ọzọ? Ọ bụ ụzọ amamihe na nke bụ́ ịgba Jehova ga-esi eme ka e nwee udo na ịdị n’otu n’eluigwe na ala. Amamihe a hiwere isi n’ebe Jizọs nọ. Kama ikwusa oziọma banyere ịgwọta nsogbu ọha na eze, Pọl nyeere ndị mmadụ aka ịhụ otú Chineke ga-esi edozi ihe mmehie Adam mebiri. (Ndị Efesọs 3:8, 9) Ọkà okwu ahụ gbara ndị na-ege ya ntị  ume, sị: “Jirinụ ihe ùgwù ije ozi unu mee ihe dị ka Pọl mere, bụ́ onye lere ozi ala ọzọ ya anya dị ka ohere iji nyere ndị mmadụ aka ịhụ otú Jehova ga-esi emezu nzube ya.”

Mgbe o kwusịrị okwu ya, Mark Noumair, bụ́ onye nkụzi ọzọ nke Gilead, duziri nkwurịta okwu na-ekpo ọkụ nke ya na ọtụtụ n’ime ụmụ klas ahụ nwere. Isiokwu ya bụ́ “Ịmụ Okwu Chineke Na-eme Ka E Nwee Ndị Ozi Na-anụ Ọkụ n’Obi” mesiri ike okwu Pọl nke dị ná Ndị Rom 10:10. Ndị klas ahụ kọrọ ọtụtụ ahụmahụ ha nwetara n’ozi ubi n’oge ha nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ahụmahụ ha gosiri na mgbe anyị na-amụ ma na-atụgharị uche n’Okwu Chineke, ihe ndị magburu onwe ha banyere Jehova Chineke na Alaeze ya ga-ejupụta n’obi anyị, anyị ga-agwakwa ndị ọzọ banyere ha. N’ime ọnwa ise ha nọrọ n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower, ụmụ akwụkwọ ahụ nwetara ihe karịrị mmadụ 30 nwere mmasị ha duziiri ọmụmụ Bible ebe obibi n’ókèala ndị a na-arụkarị ọrụ na ha nke ọgbakọ ndị dị nso.

Ndị Tozuru Okè Ekwuo Okwu

Mgbe ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụ akwụkwọ, ha ritere uru site ná mkpakọrịta nke ha na ndị ezinụlọ Betel nke United States. Ndị na-arụ ọrụ n’alaka ahụ bụ́ Robert Ciranko na Robert P. Johnson gbara ọtụtụ ndị ohu Jehova kwesịworo ntụkwasị obi ruo ogologo oge ajụjụ ọnụ, gụnyere ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị bụ́ ndị nọ mgbe ahụ na-anata ọzụzụ pụrụ iche n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower. Ndị nile a gbara ajụjụ ọnụ bụcha ndị gụsịworo akwụkwọ na Gilead bụ́ ndị jetụrụla ozi ala ọzọ. Ọ bụụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ na ndị ezinụlọ na ndị enyi ha ihe na-emesi obi ike ịnụrụ okwu ndị amamihe dị na ha site n’ọnụ ndị ikom a nwere ahụmahụ bụ́ ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.

Ndụmọdụ ha gụnyere: “Na-arụsi ọrụ ike ruo ókè o kwere mee n’ozi nakwa n’ọgbakọ.” “Ejila onwe gị akpọrọ ihe gabiga ókè. Tụkwasị uche ná nzube gị dị ka onye ozi ala ọzọ, werekwa ebe e kenyere gị ọrụ dị ka obodo gị.” Okwu ndị ọzọ na-enye aka ha kwuru gosiri otú ọzụzụ a na-enweta na Gilead si akwadebe onye ozi maka ezi ọrụ, n’agbanyeghị ebe e kenyere ya ọrụ. Nke a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ha kwuru: “Anyị mụtara ikwenye ekwenye na ịrụkọ ọrụ ọnụ.” “Ụlọ akwụkwọ ahụ nyeere anyị aka ịnakwere ọdịbendị ọhụrụ.” “A kụziiri anyị ụzọ ọhụrụ isi jiri Akwụkwọ Nsọ na-eme ihe.”

John E. Barr, bụ́ onye nọworo ogologo oge n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu bụ́ isi nke usoro ihe omume ahụ. Isiokwu ya dabeere n’Akwụkwọ Nsọ bụ “N’ime Ụwa Dum Ka Ụda Ha Garuru.” (Ndị Rom 10:18) Ọ jụrụ, sị, Ndị Chineke hà enwewo ike ịrụzu ọrụ a siri ike taa? Eenụ! Laa azụ na 1881, a jụrụ ndị na-agụ magazin Ụlọ Nche, sị: “Ị̀ na-eme nkwusa?” Ọkà okwu ahụ chetaziiri ndị nile na-ege ntị òkù ahụ mere ihe akụkọ nke a kpọrọ ná mgbakọ e nwere na 1922 na Cedar Point, Ohio, U.S.A., sị: “Kpọsaanụ Eze ahụ na Alaeze ya!” Ka oge na-agafe, ịnụ ọkụ n’obi nke ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi kpaliri ha ikwusara mba nile eziokwu Alaeze ahụ magburu onwe ya. Site n’iji akwụkwọ ndị e biri ebi eme ihe nakwa site n’okwu ọnụ, okwu nke ozi ọma ahụ eruwo na nsọtụ nile nke elu ụwa dum mmadụ bi—ihe a nile na-ewetara Jehova nsọpụrụ na otuto. N’imechi okwu ya n’ụzọ na-akpali akpali, Nwanna Barr gbara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ịgụkọ ngọzi ndị ha nweworo, na-asị: “Kwa ụbọchị, mgbe ị na-ekpegara Jehova ekpere n’ebe e kenyere gị ọrụ, jiri obi gị dum kelee ya maka òkè ị na-ekere n’imezu okwu bụ́, ‘N’ime ụwa dum ka ụda ha garuru.’”

Mgbe o kwusịrị okwu a, a gụrụ ozi ekele, onyeisi oche nyekwara onye nke ọ bụla gụsịrị akwụkwọ diplọma ya. Mgbe e mesịrị, ka ndị klas ahụ na-enwe ọṅụ na mwute n’ihi ịhapụ ụlọ akwụkwọ ha hụrụ n’anya, onye nnọchiteanya ha gụrụ mkpebi ha degaara Òtù Na-achị Isi na ezinụlọ Betel, na-egosi mkpebi siri ike nke ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ mere ịgọzi Jehova “site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 115:18.

Anyị na-ekpe ekpere ka ndị a na-agụsị akwụkwọ nwee ike ime mgbanwe iji kwekọọ n’ebe obibi ọhụrụ ha ma kere òkè dị mma n’ọganihu nke ọrụ nkwusa a zuru ụwa ọnụ, dị nnọọ ka ndị bu ha ụzọ pụọ meworo kemgbe afọ 60.

[Igbe dị na peeji nke 23]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 12

Ọnụ ọgụgụ mba ndị e zigara ha: 16

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48

Nkezi afọ ndụ ha: 34.4

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 17.6

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 13.5

[Foto dị na peeji nke 24]

Klas nke 114 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Rosa, D.; Garrigolas, J.; Lindström, R.; Pavanello, P.; Tait, N. (2) Van Hout, M.; Donabauer, C.; Martínez, L.; Millar, D.; Festré, Y.; Nutter, S. (3) Martínez, P.; Clarke, L.; Maughan, B.; Fischer, L.; Romo, G. (4) Romo, R.; Eadie, S.; Tuynman, C.; Campbell, P.; Millar, D.; Rosa, W. (5) Lindström, C.; Garrigolas, J.; Markevich, N.; Lindala, K.; van den Heuvel, J.; Tait, S.; Nutter, P. (6) Maughan, P.; Pavanello, V.; Eadie, N.; West, A.; Clarke, D.; Markevich, J. (7) Fischer, D.; Donabauer, R.; Curry, P.; Curry, Y.; Carfagno, W.; West, M.; Tuynman, A. (8) Van Hout, M.; Campbell, C.; Festré, Y.; Carfagno, C.; van den Heuvel, K.; Lindala, D.