Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Ọ Bụla Ga-ebi n’Okpuru Osisi Fig Ya

Onye Ọ Bụla Ga-ebi n’Okpuru Osisi Fig Ya

 Onye Ọ Bụla Ga-ebi n’Okpuru Osisi Fig Ya

NDÒ bụ ihe a na-achọsi nnọọ ike n’oge okpomọkụ n’ala ndị dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Osisi ọ bụla a pụrụ ịnọ n’okpuru ya zere anwụ bụ ihe a na-achọsi ike, karịsịa mgbe ọ dị nso n’ebe obibi mmadụ. N’ihi akwụkwọ ya ndị dị obosara na alaka ya ndị gbasapụrụ agbasapụ, osisi fig na-enye ndò dị mma karịa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ osisi ọ bụla ọzọ e nwere n’ógbè ahụ.

Dị ka akwụkwọ bụ́ Plants of the Bible si kwuo, “a na-ekwu na ndò [osisi fig] na-enye ume ọhụrụ ma na-ajụ oyi karịa ndò ụlọikwuu.” N’Izrel oge ochie, osisi fig ndị a kụrụ n’akụkụ ubi vaịn bụ ebe dị nnọọ mma nke ndị na-arụ ọrụ n’ubi na-anọ ezurutụ ike.

N’uhuruchi nke ogologo ụbọchị anwụ chasiri ike na ya, ndị òtù ezinụlọ pụrụ ịnọdụ ala n’okpuru osisi fig ha ma nwee ntụrụndụ. Ọzọkwa, osisi fig na-amịrị onye nwe ya ọtụtụ mkpụrụ na-edozi ahụ́. Ya mere, malite n’oge Eze Solomọn, mmadụ ịnọdụ ala n’okpuru osisi fig ya na-anọchi anya udo, ọganihu na inwe ihe n’ụba.—1 Ndị Eze 4:24, 25.

Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, onye amụma ahụ bụ́ Mozis kọwara Ala Nkwa ahụ dị ka ‘ala nke osisi fig.’ (Deuterọnọmi 8:8) Ndị nledo 12 nyere ihe àmà na-egosi na ala ahụ na-eme ihe nke ọma site n’iwelata mkpụrụ osisi fig na mkpụrụ osisi ndị ọzọ n’ọmụma ụlọikwuu ndị Izrel. (Ọnụ Ọgụgụ 13:21-23) Na narị afọ nke 19, otu onye mere nleta n’ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible kọrọ na osisi fig so n’osisi ndị kasị dị ọtụtụ n’ebe ahụ. Ka a sịkwa ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji akpọtụkarị mkpụrụ fig na osisi fig aha!

Osisi Na-amị Ugboro Abụọ n’Afọ

Osisi fig na-eme nke ọma n’ọtụtụ ala, mkpọrọgwụ ya nke na-agbasapụ agbasapụ na-enyere ya aka ịghara ịkpọnwụ n’oge ọkọchị nke na-anọ ogologo oge n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Osisi ahụ pụrụ nnọọ iche n’ihi na ọ na-amị mkpụrụ mbụ ya n’afọ na June ma na-amịkarịkwa mkpụrụ ya dị ka o kwesịrị site n’August gawa. (Aisaia 28:4) Ndị Izrel na-ara mkpụrụ mbụ ya ara mgbe ha ghọtara ya ọhụrụ.  Ha na-amịkpọ mkpụrụ ya nke abụọ maka iji ya mee ihe n’afọ ahụ nile. A pụrụ iji fig a mịrị amị mee achịcha, a na-etinyekwa ya mkpụrụ almọnd mgbe ụfọdụ. Achịcha ndị a e ji fig mee na-adị mfe, na-edozi ahụ́ ma na-atọ ụtọ.

Nwanyị ahụ nwere uche bụ́ Abigail nyere Devid ogbe achịcha 200 e ji fig a mịrị amị mee, ihe ịrụ ụka adịghị ya na o chere na nke a ga-abụ ezigbo nri maka ndị na-agba ọsọ ndụ. (1 Samuel 25:18, 27) A na-ejikwa fig a mịrị amị eme ọgwụ. E ji fig a gwakọtara agwakọta techie etuto chọrọ igbu Eze Hezekaịa, ọ bụ ezie na mgbake ọ gbakere ka oge na-aga bụ n’ihi enyemaka Chineke. *2 Ndị Eze 20:4-7.

N’oge ochie, e ji fig a mịrị amị kpọrọ oké ihe n’ógbè Mediterenian nile. Otu onye ọnụ na-eru n’okwu bụ́ Cato gosiri Kansụl Kasị Ukwuu nke Rom mkpụrụ osisi fig n’ụzọ mere ka ha kwenye ịlụ Agha Punic nke Atọ megide Carthage. Fig kachasị mma a mịrị amị nke e nwere na Rom si na Caria, nke Asia Minor. N’ihi ya, carica ghọrọ aha fig a mịrị amị n’asụsụ Latin. A ka na-emepụta fig a mịrị amị ndị bụ́ ịgba n’otu ógbè ahụ nke bụ́ Turkey ugbu a.

Ndị Izrel na-arụ ọrụ ugbo na-akụkarị osisi fig n’ubi vaịn, ma ha na-egbutu osisi ndị na-adịghị amị mkpụrụ. Ezigbo ala dị nnọọ ụkọ nke na e kwesịghị ịhapụ osisi ndị na-adịghị amị mkpụrụ na ya. N’ihe atụ Jizọs banyere osisi fig nke na-amịghị mkpụrụ, onye ọrụ ugbo ahụ gwara onye ọrụ ubi vaịn ahụ, sị: “Ọ bụ afọ atọ ugbu a m bịaworo na-achọgharị mkpụrụ n’osisi fig a, ma ọ dịghị nke m hụrụ. Gbutuo ya! Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ọ ga-eji mee ka ala a ghara ịba uru?” (Luk 13:6, 7) Ebe ọ bụ na n’oge Jizọs, a na-akwụ ụtụ isi maka osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ, osisi ọ bụla na-adịghị amị mkpụrụ bụ ụsụ ahịa.

Fig bụ ihe dị oké mkpa n’ihe oriri nke ndị Izrel. N’ihi ya, ọ bụrụ na fig amịghị mkpụrụ nke ọma—ikekwe n’ihi amamikpe nke Jehova—nsogbu dị. (Hosea 2:12; Emọs 4:9) Habakuk onye amụma kwuru, sị: “A sị na osisi fig adịghị ama ifuru, na ọ dịghị ihe omume dị n’osisi [vaịn]; na ihe a rụpụtara n’osisi [oliv] ebelatawo, na ubi nile emeghị ihe oriri . . . ma mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, m ga-etegharị egwú ọṅụ n’ime Chineke nke nzọpụta m.”—Habakuk 3:17, 18.

Ihe Atụ nke Mba Na-enweghị Okwukwe

Mgbe ụfọdụ, Akwụkwọ Nsọ na-eji mkpụrụ fig ma ọ bụ osisi fig eme ihe atụ. Dị ka ihe atụ, Jeremaịa ji ndị Juda ahụ kwesịrị ntụkwasị obi e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ tụnyere nkata fig dị mma, bụ́ fig nke buru ụzọ chaa a na-atakarị ata mgbe a ghọtara ya ọhụrụ. Otú ọ dị, e ji ndị ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi tụnyere fig ọjọọ, nke a na-agaghị ata ata kama a ga-atụfu ha atụfu.—Jeremaịa 24:2, 5,8, 10.

N’ihe atụ ya banyere osisi fig nke na-amịghị mkpụrụ, Jizọs gosiri ndidi Chineke nwere n’ebe mba ndị Juu dị. Dị ka e kwuru na mbụ, o kwuru okwu banyere otu nwoke nke nwere osisi fig n’ubi vaịn ya. Osisi ahụ anọwo n’amịghị mkpụrụ  ruo afọ atọ, onye nwe ya chọkwara igbutu ya. Ma onye ọrụ ubi vaịn ahụ kwuru, sị: “Nna m ukwu, hapụkwuo ya afọ a, ruo mgbe m ga-egwu ala gburugburu ya ma tinye nsị anụ; ọ bụrụkwa na o mechaa mịa mkpụrụ n’ọdịnihu, nke ahụ amaka; ma ọ bụrụ na ọ mịghị, ị ga-egbutu ya.”—Luk 13:8, 9.

Mgbe Jizọs mere ihe atụ a, ọ nọworịị na-eme nkwusa ruo afọ atọ, na-agbalị ime ka ndị Juu gosipụta okwukwe. Jizọs rụsikwuru ọrụ ike, “na-etinye nri ala” n’osisi ihe atụ ahụ—mba ndị Juu—ma na-enye ya ohere ịmị mkpụrụ. Otú ọ dị, n’izu bu izu Jizọs nwụrụ ụzọ, ọ bịara doo nnọọ anya na mba ahụ n’ozuzu ya ajụwo Mezaịa ahụ.—Matiu 23:37, 38.

Ọzọkwa, Jizọs ji osisi fig mee ihe atụ nke ajọ ọnọdụ ime mmụọ nke mba ahụ. Ụbọchị anọ tupu ọnwụ ya, ka o si Betani na-aga Jeruselem, ọ hụrụ otu osisi fig nke akwụkwọ juru na ya ma o nweghị mkpụrụ ọ bụla ọ mịrị. Ebe ọ bụ na mkpụrụ fig mbụ na akwụkwọ ya na-apụta otu mgbe—mgbe ụfọdụ ọbụna na-amị mkpụrụ tupu akwụkwọ ya apụta—osisi ahụ ịbụ nke na-amịghị mkpụrụ gosiri na ọ baghị uru ọ bụla.—Mak 11:13, 14. *

Dị ka osisi fig ahụ na-amịghị mkpụrụ nke ahụ́ dị mma, ndị Juu nwere ọdịdị elu ahụ́ nke na-eduhie eduhie. Ma ọ mịghị mkpụrụ nke na-amasị Chineke, o mesịkwara jụ Ọkpara Jehova. Jizọs bụrụ osisi fig ahụ na-amịghị mkpụrụ ọnụ, n’echi ya kwa, ndị na-eso ụzọ ya hụrụ na osisi ahụ akpọnwụworị. Osisi ahụ kpọnwụrụ akpọnwụ na-egosi ọjụjụ Chineke gaje ịjụ ndị Juu dị ka ndị ya ọ họpụtara.—Mak 11:20, 21.

Mụta Ihe Site n’Osisi Fig’

Jizọs jikwa osisi fig kụzie ihe dị mkpa banyere ọnụnọ ya. O kwuru, sị: “Sitenụ n’osisi fig, dị ka ihe atụ, mụta isi ihe a: Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro, o wee pupụtawa akwụkwọ, unu na-amara na oge okpomọkụ dị nso. N’otu aka ahụkwa, mgbe unu na-ahụ ihe ndị a nile, maranụ na ọ nọ nso n’ọnụ ụzọ.” (Matiu 24:32, 33) Akwụkwọ ya nke na-acha nnọọ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ bụ ihe àmà doro anya nke oge okpomọkụ. N’otu aka ahụ, oké amụma Jizọs nke e dekọrọ na Matiu isi 24, Mak isi 13, na Luk isi 21 na-enye ihe àmà doro nnọọ anya nke ọnụnọ ya ugbu a n’ike Alaeze eluigwe.—Luk 21:29-31.

N’ezie, ebe ọ bụ na anyị na-ebi n’oge pụrụ iche otú ahụ n’akụkọ ihe mere eme, anyị kwesịrị ịmụta ihe site n’osisi fig. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ ma mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, anyị nwere olileanya nke ịhụ mmezu nke nkwa ahụ dị ebube, bụ́: “Ma ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi [vaịn] ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”—Maịka 4:4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 H. B. Tristram, bụ́ ọkà mmụta ihe ndị si n’okike nke letara ala ndị a kpọtụrụ aha na Bible n’etiti narị afọ nke 19, kwuru na ndị ebe ahụ ka na-eji fig a gwakọtara agwakọta agwọ etuto.

^ par. 16 Ihe a mere n’ebe dị nso n’obodo Betfeji. Aha ya pụtara “Ebe Mkpụrụ Fig Na-ebu Ụzọ Amị.” Nke a pụrụ igosi na a ma ógbè ahụ ama dị ka ebe mkpụrụ fig na-ebu ụzọ amị.