Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kraịst Na-agwa Ọgbakọ Dị Iche Iche Okwu

Kraịst Na-agwa Ọgbakọ Dị Iche Iche Okwu

 Kraịst Na-agwa Ọgbakọ Dị Iche Iche Okwu

“Ihe ndị a ka ọ na-ekwu bụ́ onye ahụ chị kpakpando asaa ahụ n’aka nri ya.”—MKPUGHE 2:1.

1, 2. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị inwe mmasị n’ihe Kraịst gwara ọgbakọ asaa dị n’Asia Minor?

ỌKPARA Jehova mụrụ nanị ya, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst. Iji hụ na ọgbakọ nke ụmụazụ ya e tere mmanụ mejupụtara enweghị ntụpọ, Kraịst na-egosipụta ịbụisi ya site n’ịja ha mma na ịgbazi ha. (Ndị Efesọs 5:21-27) E nwere ihe atụ banyere nke a n’isi nke 2 na nke 3 nke Mkpughe, bụ́ ebe anyị na-ahụ ozi dị ike nke Jizọs ji ịhụnanya zigara ọgbakọ asaa dị n’Asia Minor.

2 Tupu Jọn onyeozi anụ ihe Jizọs gwara ọgbakọ asaa ahụ, e mere ka ọ hụ ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ n’ọhụụ. (Mkpughe 1:10) “Ụbọchị” ahụ malitere mgbe e guzobere Alaeze Mezaịa na 1914. N’ihi ya, ihe Kraịst gwara ọgbakọ ndị ahụ dị oké mkpa n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. Agbamume na ndụmọdụ ya na-enyere anyị aka ịnagide oge ndị a pụrụ iche.—2 Timoti 3:1-5.

3. Gịnị ka “kpakpando,” “ndị mmụọ ozi,” na “ihe ndọba oriọna ọlaedo” ndị ahụ Jọn onyeozi hụrụ pụtara n’ụzọ ihe atụ?

3 Jọn hụrụ Jizọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube, bụ́ onye “chị kpakpando asaa ahụ n’aka nri ya” na onye “na-eje ije n’etiti ihe ndọba oriọna ọlaedo asaa ahụ,” ma ọ bụ ọgbakọ asaa ahụ. “Kpakpando” ndị ahụ bụ “ndị mmụọ ozi nke ọgbakọ asaa ahụ.” (Mkpughe 1:20; 2:1) Mgbe ụfọdụ, kpakpando na-ese onyinyo ndị mmụọ ozi e kere eke, ma Kraịst agaghị eji mmadụ dekọọ ozi a ga-ezi ndị mmụọ e kere eke. N’ihi ya, n’ụzọ ezi uche dị na ya, “kpakpando” ndị a na-anọchi anya ndị nlekọta e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ma ọ bụ òtù ndị okenye. Okwu ahụ bụ́ “ndị mmụọ ozi” na-ezo aka n’ọrụ ha dị ka ndị na-eje ozi. Ebe ọ bụ na nzukọ Chineke amụbawo, “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi” ahọpụtawokwa ndị ikom ruru eru so ‘n’atụrụ ọzọ’ nke Jizọs dị ka ndị nlekọta.—Luk 12:42-44; Jọn 10:16.

4. Olee otú ndị okenye si erite uru site n’ige ntị n’ihe Kraịst na-agwa ọgbakọ ndị ahụ?

4 “Kpakpando” ndị ahụ dị n’aka nri Jizọs—o nwere ike n’ebe ha dị, na-achịkwa ha, nwee ihu ọma n’ebe ha dị, ma na-echebe ha. N’ihi ya, ha ga-aza ajụjụ n’ihu ya. Site n’ịṅa ntị n’ihe ọ gwara nke ọ bụla n’ime ọgbakọ asaa ndị ahụ, ndị okenye nke oge a na-ahụ otú ha pụrụ isi mee ihe banyere ọnọdụ ndị yiri nke ọgbakọ ndị ahụ. N’ezie, ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst nile gee Ọkpara Chineke ntị. (Mak 9:7) Ya mere, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ige ntị ka Kraịst na-agwa ọgbakọ ndị ahụ okwu?

 Nye Mmụọ Ozi ahụ Nọ n’Efesọs

5. Olee ụdị obodo Efesọs bụ?

5 Jizọs jara ọgbakọ ahụ dị n’Efesọs mma ma dọọ ya aka ná ntị. (Gụọ Mkpughe 2:1-7.) Nnukwu ụlọ nsọ nke chi nwanyị bụ́ Atemis dị n’obodo a bara ọgaranya nke azụmahịa na okpukpe hiwere isi na ya, bụ́ nke dị n’ụsọ oké osimiri nke ebe ọdịda anyanwụ Asia Minor. Ọ bụ ezie na e mere omume rụrụ arụ, fee ofufe ụgha, ma mee majik nke ukwuu n’Efesọs, Chineke gọziri ozi Pọl onyeozi na ndị ọzọ jere n’obodo ahụ.—Ọrụ, isi 19.

6. Olee otú Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe taa si yie ndị ahụ nọ n’Efesọs oge ochie?

6 Kraịst jara ọgbakọ ahụ dị n’Efesọs mma, na-asị: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ndọgbu n’ọrụ na ntachi obi gị, nakwa na ị pụghị ịnagide ndị ajọ mmadụ, nakwa na ị na-ele ndị ahụ ule, bụ́ ndị na-asị na ha bụ ndịozi, ma ha abụghị, i wee chọpụta na ha bụ ndị ụgha.” Taa, ọgbakọ nke ezi ụmụazụ Jizọs mejupụtara nwere ihe ndekọ nke ezi ọrụ, ịrụsi ọrụ ike, na ntachi obi yiri nke ahụ. Ha adịghị agbachi ụmụnna ụgha nkịtị bụ́ ndị chọrọ ka a na-ele ha anya dị ka ndịozi. (2 Ndị Kọrint 11:13, 26) Dị ka ndị Efesọs, Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe taa ‘apụghị ịnagide ndị ajọ mmadụ.’ N’ihi ya, iji mee ka ofufe Jehova nọgide na-adị ọcha na iji chebe ọgbakọ, ha adịghị eso ndị si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị na-enweghị nchegharị, na-akpakọrịta.—Ndị Galeshia 2:4, 5; 2 Jọn 8-11.

7, 8. Olee nsogbu siri ike nke e nwere n’ọgbakọ ahụ dị n’Efesọs, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ihe banyere ọnọdụ yiri nke ahụ?

7 N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst nọ n’Efesọs nwere otu nsogbu siri ike. “Enwere m ihe a megide gị,” ka Jizọs kwuru, “na ị hapụwo ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.” Ọ dị mkpa ka ndị nọ n’ọgbakọ ahụ hụghachi Jehova n’anya otú ha sibu hụ ya. (Mak 12:28-30; Ndị Efesọs 2:4; 5:1, 2) Anyị onwe anyị aghaghịkwa ịnọ na nche megide ịkwụsị ịhụ Chineke n’anya otú anyị si hụ ya na mbụ. (3 Jọn 3) Ma gịnị ma ọ bụrụ na ihe ndị dị ka ọchịchọ ịba ọgaranya ma ọ bụ ịchụso ihe ụtọ aghọwala ihe mbụ ná ndụ anyị? (1 Timoti 4:8; 6:9, 10) Mgbe ahụ, anyị kwesịrị ikpesi ekpere ike ka Chineke nyere anyị aka iji ịhụnanya miri emi anyị nwere n’ebe Jehova nọ na ekele anyị nwere maka ihe nile ya na Ọkpara ya mewooro anyị dochie ọchịchọ ndị dị otú ahụ.—1 Jọn 4:10, 16.

8 Kraịst gbara ndị Efesọs ume, sị: “Cheta ihe i siworo na ya daa, chegharịakwa ma mee ihe ndị ị na-eme na mbụ.” Gịnị ma ọ bụrụ na ha emeghị otú ahụ? “Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ,” ka Jizọs kwuru, “ana m abịakwute gị, m ga-ewepụkwa ihe ndọba oriọna gị n’ọnọdụ ya.” Ọ bụrụ na atụrụ ahụ nile akwụsị inwe ịhụnanya ha nwere na mbụ, “ihe ndọba oriọna,” ma ọ bụ ọgbakọ ahụ, agaghịzi adị. N’ihi ya, dị ka Ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi, ka anyị na-arụsi ọrụ ike iji hụ na ọgbakọ nọgidere na-enwu enwu n’ụzọ ime mmụọ.—Matiu 5:14-16.

9. Olee otú e kwesịrị isi na-ele ịrọ òtù anya?

9 Ọ bụ ihe kwesịrị ịja mma na ndị Efesọs kpọrọ “ihe ịrọ òtù nke Nikọleọs na-eme asị.” E wezụga ihe e kwuru ná Mkpughe, ọ dịghị ihe ọzọ doro anya a maara banyere mmalite, ozizi, na omume nke ịrọ òtù a. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Jizọs katọrọ ịgbaso mmadụ, ọ dị mkpa ka anyị nọgide na-akpọ ịrọ òtù asị, dị ka Ndị Kraịst nọ n’Efesọs mere.—Matiu 23:10.

10. Gịnị ka ndị na-ege ntị n’ihe mmụọ nsọ na-ekwu ga-enweta?

10 “Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe mmụọ nsọ na-agwa ọgbakọ ndị a,” ka Kraịst kwuru. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, mmụọ nsọ Chineke kpaliri ya ikwu okwu. (Aịsaịa 61:1; Luk 4:16-21) N’ihi ya, anyị kwesịrị ige ntị n’ihe Chineke si n’ọnụ ya na-ekwu ugbu a site n’ike mmụọ nsọ. Site ná nduzi nke mmụọ nsọ, Jizọs kwere nkwa, sị: “M ga-ekwe ka onye ahụ nke na-emeri emeri rie ihe sitere n’osisi nke ndụ, bụ́ nke dị na paradaịs nke Chineke.” Nye ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị na-ege ntị n’ihe mmụọ nsọ na-ekwu, nke a ga-apụta ndụ anwụghị anwụ na ‘paradaịs eluigwe nke Chineke,’ ma ọ bụ kpọmkwem n’ihu Jehova. “Oké ìgwè mmadụ” ahụ, bụ́ ndị na-egekwa ntị n’ihe mmụọ nsọ na-ekwu, ga-ebi na paradaịs elu ala bụ́ ebe ha ga-aṅụ mmiri sitere ‘n’osimiri nke mmiri nke ndụ,’ ha ga-enwetakwa ọgwụgwọ site ‘n’akwụkwọ nke osisi ndị ahụ’ dị n’akụkụ ya.—Mkpughe 7:9; 22:1, 2; Luk 23:43.

11. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ike ịnọgide na-ahụ Jehova n’anya?

11 Ndị Efesọs enweghịzi ịhụnanya ha nwere na  mbụ, ma gịnị ma ọ bụrụ na ọnọdụ yiri nke ahụ na-ebilite n’ọgbakọ taa? Ka anyị onwe anyị n’otu n’otu nọgide na-ahụ Jehova n’anya site n’ikwu okwu banyere ụzọ ịhụnanya ndị o si eme ihe. Anyị pụrụ igosipụta ekele anyị nwere maka ịhụnanya Chineke gosiri n’inye ihe mgbapụta site n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. (Jọn 3:16; Ndị Rom 5:8) Mgbe o kwesịrị ekwesị, anyị pụrụ ikwu okwu banyere ịhụnanya Chineke mgbe anyị na-aza ajụjụ na mgbe anyị na-eme ihe omume n’ọgbakọ. Anyị pụrụ igosipụta ịhụnanya anyị onwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ site n’ito aha ya n’ozi Ndị Kraịst. (Abụ Ọma 145:10-13) Ee, okwu ọnụ na omume anyị pụrụ inye aka n’ụzọ dị ukwuu n’ime ka ọgbakọ nweghachi ịhụnanya o nwere na mbụ ma ọ bụ mee ka ịhụnanya ahụ sikwuo ike.

Nye Mmụọ Ozi ahụ Nọ na Smụana

12. Gịnị ka akụkọ ihe mere eme na-ekpughe banyere Smụana na ihe omume okpukpe ndị e mere n’ebe ahụ?

12 Kraịst, bụ́ “‘Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ,’ onye ghọrọ onye nwụrụ anwụ ma dịrịghachi ndụ” site ná mbilite n’ọnwụ, jara ọgbakọ ahụ dị na Smụana mma. (Gụọ Mkpughe 2:8-11.) E wuru Smụana (nke bụ́zi Izmir, Turkey) n’ụsọ oké osimiri nke ebe ọdịda anyanwụ Asia Minor. Ndị Gris biri n’obodo ahụ, ma ndị Lidia bibiri ya n’ihe dị ka 580 T.O.A. Ndị nọchiri Alexander Onye Ukwu wughachiri Smụana n’ebe ọhụrụ. Ọ ghọrọ akụkụ nke ógbè Rom dị n’Eshia, ọ bụkwa obodo azụmahịa na-ekwo ekwo na ya bụ́ nke e ji ụlọ ọha na eze ndị mara mma mara. Ụlọ nsọ Taịbiriọs Siza nke dị na ya mere ka ọ bụrụ ebe ofufe eze ukwu hiwere isi. Ndị na-efe eze ukwu na-esure ntakịrị ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ma kwuo, sị, “Siza bụ Onyenwe anyị.” Ndị Kraịst apụghị ikwu otú ahụ n’ihi na nye ha, “Jizọs bụ Onyenwe anyị.” N’ihi ya, a kpagburu ha.—Ndị Rom 10:9.

13. Ọ bụ ezie na ha dara ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe, n’echiche dị aṅaa ka Ndị Kraịst nọ na Smụana bara ọgaranya?

13 E wezụga mkpagbu, Ndị Kraịst nọ na Smụana dara ogbenye, ikekwe a machibidoro ha iwu n’ihe ndị metụtara akụ̀ na ụba n’ihi na ha adịghị ekere òkè n’ife eze ukwu ofufe. Ndị ohu Jehova n’oge a na-enwetakwa ule ndị yiri ndị ahụ. (Mkpughe 13:16, 17) Ọ bụ ezie na ha dara ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe, ndị dị ka Ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana bara ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ, nke ahụ bụkwa ihe dị mkpa n’ezie!—Ilu 10:22; 3 Jọn 2.

14, 15. Nkasi obi dị aṅaa ka ndị e tere mmanụ pụrụ inweta site n’ihe e dere ná Mkpughe 2:10?

14 Ọtụtụ n’ime ndị Juu nọ na Smụana bụ “nzukọ Setan” n’ihi na ha nọgidere na-agbaso omenala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, jụ Ọkpara Chineke, ma kwuluo ụmụazụ ya e ji mmụọ nsọ mụta. (Ndị Rom 2:28, 29) Ma lee ka ihe ọzọ Kraịst kwuru pụrụ isi kasie ndị e tere mmanụ obi! Ọ na-ekwu, sị: “Atụla egwu banyere ihe ndị ị na-aga ịta ahụhụ ha. Lee! Ekwensu ga-anọgide na-atụba ụfọdụ n’ime unu n’ụlọ mkpọrọ ka e wee lee unu ule n’ụzọ zuru ezu, ka unu wee nweekwa mkpagbu ruo ụbọchị iri. Gosipụta na ị na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ, m ga-enyekwa gị okpueze bụ́ ndụ.”—Mkpughe 2:8-11.

15 Jizọs atụghị egwu ịnwụ n’ihi ịkwado ọbụbụeze Jehova. (Ndị Filipaị 2:5-8) Ọ bụ ezie na Setan na-ebuso ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ agha  ugbu a, ha adịghị atụ egwu n’ihi ihe ndị ha na-aghaghị ịta ahụhụ ha dị ka otu ìgwè—mkpagbu, ịtụ mkpọrọ, ma ọ bụ ọnwụ ike. (Mkpughe 12:17) Ha ga-emeri ụwa. Kamakwa inweta okooko osisi na-akpọnwụ akpọnwụ nke ndị nwere mmeri n’egwuregwu ndị ọgọ mmụọ na-ekpu dị ka okpu mmeri, Kraịst na-ekwe ndị e tere mmanụ e si n’ọnwụ kpọlite nkwa inye ha “okpueze bụ́ ndụ” dị ka ndị e kere eke na-adịghị anwụ anwụ n’eluigwe. Lee onyinye dị oké ọnụ ahịa nke ahụ bụ!

16. Ọ bụrụ na anyị nọ n’ọgbakọ yiri nke ahụ dị na Smụana oge ochie, n’ihe iseokwu dị aṅaa ka anyị kwesịrị ilekwasị anya?

16 Gịnị ma ọ bụrụ na anyị, ma olileanya anyị ọ̀ bụ nke eluigwe ma ọ bụ nke ụwa, nọ n’ọgbakọ yiri nke ahụ dị na Smụana oge ochie? Ọ bụrụ otú ahụ, ka anyị nyere ndị kwere ekwe ibe anyị aka ilekwasị anya n’isi ihe mere Chineke ji kwere ka mkpagbu dịrị—ihe iseokwu banyere ọbụbụeze eluigwe na ala. Onyeàmà Jehova ọ bụla na-eguzosi ike n’ihe na-egosipụta na Setan bụ onye ụgha ma na-egosikwa na ọbụna mmadụ a na-akpagbu akpagbu pụrụ ịbụ onye ji iguzosi ike n’ihe na-akwado oruru o ruuru Chineke ịchị dị ka Eze Eluigwe na Ala. (Ilu 27:11) Ka anyị na-agba Ndị Kraịst ndị ọzọ ume ịtachi obi ná mkpagbu, sikwa otú ahụ nọgide na-enwe “ihe ùgwù nke ijere [Jehova] ozi dị nsọ n’atụghị egwu, n’iguzosi ike n’ihe na ezi omume n’ihu ya n’ụbọchị nile anyị”—ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.—Luk 1:68, 69, 74, 75.

Nye Mmụọ Ozi ahụ Nọ na Pagamọm

17, 18. Olee ụdị ofufe hiwere isi na Pagamọm, gịnịkwa ka ịjụ ikere òkè n’ikpere arụsị dị otú ahụ pụrụ ịrụpụta?

17 A jara ọgbakọ ahụ dị na Pagamọm mma ma nye ya mgbazi. (Gụọ Mkpughe 2:12-17.) N’ịbụ nke dị ihe dị ka kilomita 80 site n’ebe ugwu nke Smụana, Pagamọm bụ obodo nke okpukpe ndị ọgọ mmụọ jupụtara na ya. O yiri ka ndị magus nke Kaldia (ndị na-agụ kpakpando) hà si Babilọn gbaga n’ebe ahụ. Ndị ọrịa na-enuga n’ụlọ nsọ Asclepius, bụ́ chi ụgha nke na-ahụ maka ịgwọ ọrịa na ọgwụ, a ma ama na Pagamọm. A kpọwo Pagamọm, bụ́ nke nwere ụlọ nsọ a na-anọ efe Siza Ọgọstọs, “ebe ofufe eze ukwu hiwere isi n’oge ọchịchị alaeze ukwu mbụ.”—Encyclopædia Britannica, 1959, Mpịakọta nke 17, peeji nke 507.

18 Na Pagamọm, e nwere ebe ịchụàjà a raara nye Zus. Obodo ahụ bụkwa ebe bụ́ isi a na-efe ụmụ mmadụ ofufe, bụ́ ofufe nke Ekwensu kpalitere. Ka a sịkwa ihe mere e ji sị na ọgbakọ dị n’ebe ahụ dị n’ebe “ocheeze Setan” dị! Ịjụ ife eze ukwu ofufe pụrụ ịkpatara onye na-akwado ọbụbụeze Jehova ọnwụ. Ụwa ka dị n’ike aka Ekwensu, a na-efekwa ihe nnọchianya mba ofufe ugbu a. (1 Jọn 5:19) Malite na narị afọ mbụ ruo n’oge a, e gbuwo ọtụtụ Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi n’ihi okwukwe ha, dị ka onye ahụ Kraịst kpọrọ “Antipas, bụ́ onye àmà m, onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ onye e gburu n’akụkụ unu.” N’ezie, Jehova Chineke na Jizọs Kraịst na-echeta ndị dị otú ahụ ji iguzosi ike n’ihe jeere ha ozi.—1 Jọn 5:21.

19. Gịnị ka Belam mere, gịnịkwa ka Ndị Kraịst nile na-aghaghị ịnọ na nche megide?

19 Kraịst kwukwara banyere “ozizi Belam.” N’ihi akpịrị ihe onwunwe, onye amụma ụgha ahụ bụ́ Belam gbalịrị ịkọcha Izrel. Mgbe Chineke gbanwere nkọcha ya ịbụ ngọzi, Belam sooro Eze  Belak nke Moab rụkọọ ọrụ ma raba ọtụtụ ndị Izrel n’ikpere arụsị na n’inwe mmekọahụ rụrụ arụ. Ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-akwụsi ike maka ezi omume dị ka Fineas, bụ́ onye mere ihe megide aka ọrụ Belam. (Ọnụ Ọgụgụ 22:1–25:15; 2 Pita 2:15, 16; Jud 11) N’ezie, Ndị Kraịst nile aghaghị ịnọ na nche megide ikpere arụsị, megidekwa ikwe ka mmekọahụ rụrụ arụ gbebata n’ọgbakọ.—Jud 3, 4.

20. Ọ bụrụ na Onye Kraịst ọ bụla amalitewala ịnabata echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ, gịnị ka o kwesịrị ime?

20 Ọgbakọ ahụ dị na Pagamọm nọ ná nnukwu ihe ize ndụ n’ihi na o kwere ka “ndị na-ejidesi aka ike n’ozizi nke ịrọ òtù nke Nikọleọs” nọrọ n’ime ya. Kraịst gwara ọgbakọ ahụ, sị: “Chegharịa. Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, ana m abịakwute gị ọsọ ọsọ, m ga-ejikwa ogologo mma agha dị n’ọnụ m lụsoo ha agha.” Ndị na-arọ òtù na-achọ imerụ Ndị Kraịst ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ, ndị siri ọnwụ na-akpata nkewa na ịrọ òtù agaghịkwa eketa Alaeze Chineke. (Ndị Rom 16:17, 18; 1 Ndị Kọrint 1:10; Ndị Galeshia 5:19-21) Ọ bụrụ na Onye Kraịst ọ bụla amalitewala ịnabata echiche ndị si n’ezi ofufe dapụ ma na-achọ ịgbasa ha, o kwesịrị ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Kraịst! Iji gbanahụ ọdachi, o kwesịrị ichegharị ma chọọ enyemaka ime mmụọ site n’aka ndị okenye nọ n’ọgbakọ. (Jems 5:13-18) Ọ dị oké mkpa ka o mee ya ngwa ngwa, n’ihi na Jizọs na-abịa ngwa ngwa imezu ihe e kpere n’ikpe.

21, 22. Olee ndị na-eri “mana ahụ zoro ezo,” gịnịkwa ka ọ na-ese onyinyo ya?

21 Ọ dịghị mkpa ka Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi na ndị ibe ha na-eguzosi ike n’ihe, na-atụ ụjọ n’ihi ikpe na-abịanụ. Ngọzi na-echere ndị nile na-ege ntị na ndụmọdụ Jizọs nke e nyere site ná nduzi nke mmụọ nsọ Chineke. Dị ka ihe atụ, a ga-akpọ ndị e tere mmanụ na-emeri ụwa ka ha bịa rie ụfọdụ n’ime “mana ahụ zoro ezo,” a ga-enyekwa ha “obere okwute na-acha ọcha” nke e dere “aha ọhụrụ” n’elu ya.

22 Chineke nyere ụmụ Izrel mana iji zụọ ha n’oge ha ji ụkwụ mee njem were afọ 40 n’ọzara. E debere ụfọdụ n’ime “achịcha” ahụ n’ime otu ite ọlaedo dị n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, e sikwa otú ahụ zoo ya n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọikwuu ahụ, bụ́ ebe ìhè nke na-egbukepụ n’ụzọ ọrụ ebube sere onyinyo ọnụnọ Jehova. (Ọpụpụ 16:14, 15, 23, 26, 33; 26:34; Ndị Hibru 9:3, 4) Ọ dịghị onye e kwere ka o rie mana ahụ e zoro ezo. Otú ọ dị, mgbe a kpọlitere ụmụazụ Jizọs e tere mmanụ n’ọnwụ, ha ga-eyikwasị anwụghị anwụ, bụ́ nke iri “mana ahụ zoro ezo” na-ese onyinyo ya.—1 Ndị Kọrint 15:53-57.

23. Gịnị ka ‘obere okwute ahụ na-acha ọcha’ na “aha ọhụrụ” ahụ pụtara?

23 Obere okwute na-eji oji na-egosi na a maala mmadụ ikpe n’ụlọikpe ndị Rom, ebe nke na-acha ọcha na-apụta na a tọhapụla onye ahụ. Jizọs inye Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere mmeri “obere okwute na-acha ọcha” na-egosi na o lere ha anya dị ka ndị aka ha dị ọcha, ndị na-enweghị ntụpọ, na ndị dị ọcha. Ebe ọ bụ na ndị Rom na-ejikwa obere okwute anata ikike ịbanye n’ebe a na-eme ihe omume dị mkpa, ‘obere okwute ahụ na-acha ọcha’ pụrụ igosi nnabata a nabatara ndị ahụ e tere mmanụ n’eluigwe ịnọ ya n’alụmdi na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ. (Mkpughe 19:7-9) Ihe àmà na-egosi na “aha ọhụrụ” ahụ pụtara ihe ùgwù ha nke ịbụ ndị ga-eso Jizọs ketakọọ ihe n’Alaeze eluigwe. Lee ka ihe a nile si bụrụ ihe na-agba ume nye ndị e tere mmanụ nakwa ndị ha na ha so na-eje ozi Jehova, bụ́ ndị nwere olileanya ibi na paradaịs elu ala!

24. Gịnị ka anyị kwesịrị ime n’ihe banyere ndapụ n’ezi ofufe?

 24 Ọ bụ ihe amamihe dị na ya icheta na ndị si n’ezi ofufe dapụ mere ka ọgbakọ ahụ dị na Pagamọm nọrọ n’ihe ize ndụ. Ọ bụrụ na ọnọdụ yiri nke ahụ achọọ imebi ọdịmma ime mmụọ nke ọgbakọ anyị nọ na ya, ka anyị jụ ndapụ n’ezi ofufe kpam kpam ma nọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ. (Jọn 8:32, 44; 3 Jọn 4) Ebe ọ bụ na ndị na-ezi ozizi ụgha na ndị na-achọ ịdapụ n’ezi ofufe pụrụ imerụ ọgbakọ dum, anyị aghaghị iguzosi ike megide ndapụ n’ezi ofufe, ghara ikwe ma ọlị ka ajọ nrụgide gbochie anyị irube isi n’eziokwu ahụ.—Ndị Galeshia 5:7-12; 2 Jọn 8-11.

25. Ozi Kraịst zigaara ọgbakọ ndị dị aṅaa ka a ga-atụle n’isokwu na-esonụ?

25 Lee okwu ịja mma na ndụmọdụ na-akpali iche echiche ndị Jizọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube gwara atọ n’ime ọgbakọ asaa ahụ dị n’Asia Minor bụ́ ndị anyị tụleworo ihe banyere ha! Otú ọ dị, dị ka mmụọ nsọ duziri, o nwekwara ọtụtụ ihe ọ ga-agwa ọgbakọ anọ ndị fọrọ afọ. A ga-atụle ozi ndị a, bụ́ ndị e zigaara Taịataịra, Sadis, Filadelfia, na Leodisia, n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ige ntị n’ihe Kraịst gwara ọgbakọ ndị ahụ?

• Olee otú anyị pụrụ isi nye aka ime ka ọgbakọ nweghachi ịhụnanya o nwere na mbụ?

• N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Ndị Kraịst nọ na Smụana bụ́ ndị dara ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe bara ọgaranya n’ezie?

• N’ịtụgharị uche n’ọnọdụ dị n’ọgbakọ ahụ dị na Pagamọm, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele echiche ndị si na-ezi ofufe dapụ anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Map dị na peeji 10]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

GRIS

ASIA MINOR

Efesọs

Smụana

Pagamọm

Taịataịra

Sadis

Filadelfia

Leodisia

[Foto dị na peeji nke 12]

“Oké ìgwè mmadụ” ahụ ga-ebi na paradaịs elu ala

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Ndị Kraịst a na-akpagbu akpagbu bụ ndị na-emeri ụwa