Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndekọ Njem Noa—Ò Nwere Ihe Ọ Pụtara Nye Anyị?

Ihe Ndekọ Njem Noa—Ò Nwere Ihe Ọ Pụtara Nye Anyị?

 Ihe Ndekọ Njem Noa—Ò Nwere Ihe Ọ Pụtara Nye Anyị?

KA Jizọs na-ebu amụma banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ usoro ihe a, ọ sịrị: “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Matiu 24:3, 37) N’ụzọ doro anya, Jizọs buru amụma na ihe na-eme n’ụbọchị anyị yiri ihe mere n’oge Noa. Ihe ndekọ bụ́ eziokwu na nke a pụrụ ịdabere na ya banyere ihe ndị mere n’ụbọchị Noa pụrụ ịbara anyị uru nke ukwuu.

Ihe ndekọ njem Noa ọ̀ bara uru otú ahụ? Ò nwere ihe ndị na-egosi na e dekọrọ ihe ndị mere eme na ya? Ànyị pụrụ n’ezie ịmata mgbe Iju Mmiri ahụ weere ọnọdụ?

Olee Mgbe Iju Mmiri ahụ Weere Ọnọdụ?

Bible na-enye ihe ọmụma ndị e dekọrọ n’usoro ha ji mee bụ́ ndị na-eme ka e nwee ike iji nlezianya gụrụ oge laa azụ ruo ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Na Jenesis 5:1-29, anyị na-ahụ ihe ndekọ usoro ọmụmụ site n’oge e kere nwoke mbụ, bụ́ Adam, ruo n’oge a mụrụ Noa. Iju Mmiri ahụ malitere “[na narị afọ nke isii] nke ndụ Noa.”—Jenesis 7:11.

Iji chọpụta oge Iju Mmiri ahụ weere ọnọdụ, ọ dị anyị mkpa ịmalite n’afọ dị ịrịba ama. Ya bụ, anyị aghaghị ịmalite n’afọ nke a nakweere n’akụkọ ihe mere eme n’abụghị nke okpukpe, bụrụkwa nke kwekọrọ n’otu ihe omume e dere banyere ya n’ime Bible. Site n’oge ahụ a kapịrị ọnụ, anyị pụrụ ịgụkọ oge ma kwuo kpọmkwem afọ Iju Mmiri ahụ weere ọnọdụ, bụ́ afọ nke ga-adabere na kalenda Gregory, nke e ji eme ihe n’ebe nile ugbu a.

Otu afọ dị ịrịba ama bụ 539 T.O.A., bụ́ afọ Eze Saịrọs nke Peasia kwaturu Babilọn. Ihe odide ndị na-abụghị nke okpukpe bụ́ ndị kwuru banyere oge ọ chịrị na-agụnye ihe ndị e dere ná mbadamba nkume ndị Babilọn na ihe odide Diodorus, Africanus, Eusebius, na Ptolemy. N’ihi iwu Saịrọs nyere, ndị Juu fọdụrụnụ hapụrụ Babilọn ma rute n’ala nna ha na 537 T.O.A. Nke ahụ kara akara ọgwụgwụ nke afọ 70 nke ntọgbọrọ n’efu Juda bụ́ nke, dị ka ihe ndekọ Bible si kwuo, malitere na 607 T.O.A. Site n’iburu n’uche oge ndị ikpe na oge ndị eze Izrel chịrị, anyị pụrụ ịchọpụta na Ọpụpụ ụmụ Izrel site n’Ijipt weere ọnọdụ na 1513 T.O.A. Ọgụgụ oge nke dabeere na Bible na-eduru anyị laa azụ gaa n’afọ 430 bụ́ oge e so Ebreham gbaa ndụ na 1943 T.O.A. Ọzọkwa, anyị aghaghị iburu n’uche oge a mụrụ Tira, Nehọ, Sirọg, Riu, Pileg, Iba, na Shila, nakwa Apakshad, bụ́ onye a mụrụ “afọ abụọ ka iju mmiri ahụ gasịrị,” na ogologo oge ha dịrị ndụ. (Jenesis 11:10-32) N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ ikwu na Iju Mmiri ahụ malitere n’afọ 2370 T.O.A. *

Iju Mmiri ahụ Amalite

Tupu anyị amalite ịtụle ihe ndị mere n’ụbọchị Noa, biko gụọ Jenesis isi 7 amaokwu 11 ruo isi 8 amaokwu 4. Banyere oké mmiri ozuzo ahụ, a gwara anyị, sị: “[Na narị afọ nke isii] nke ndụ Noa [2370 T.O.A.], n’ọnwa nke abụọ, n’ụbọchị nke iri na asaa nke ọnwa, n’ụbọchị ahụ ka a gbawara isi iyi nile nke oké ogbu mmiri, e meghekwara windo nile nke eluigwe.”—Jenesis 7:11.

Noa kewara afọ ahụ gaa n’ọnwa 12, ndị nke ọ bụla n’ime ha dị ụbọchị 30. N’oge  ochie, ọnwa mbụ na-amalite n’ihe dị ka n’etiti ọnwa September nke kalenda anyị. Mmiri ozuzo ahụ malitere “n’ọnwa nke abụọ, n’ụbọchị nke iri na asaa nke ọnwa” ma zogide ruo ụbọchị 40 ehihie na abalị n’ime ọnwa November na December, 2370 T.O.A.

A gwakwara anyị banyere Iju Mmiri ahụ, sị: “Mmiri wee dị ike n’elu ụwa [otu narị ụbọchị na iri ise]. . . . Mmiri wee si n’elu ụwa na-alaghachi mgbe nile: mmiri ahụ wee bilata mgbe [otu narị ụbọchị na iri ise] gwụsịrị. Ụgbọ ahụ wee tọgbọrọ n’elu ugwu nke Ararat n’ọnwa nke asaa, n’ụbọchị nke iri na asaa nke ọnwa ahụ.” (Jenesis 7:24–8:4) Ya mere, oge gaferenụ site n’oge mmiri ahụ dị ike n’elu ụwa ruo n’oge o bilatara bụ ụbọchị 150, ma ọ bụ ọnwa ise. N’ihi ya, ụgbọ ahụ bịara tọgbọrọ n’ugwu Ararat n’April nke 2369 T.O.A.

Biko gụzie Jenesis 8:5-17. Mgbe a malitere ịhụ ọnụ ọnụ ugwu bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwa abụọ na ọkara (ụbọchị 73) ka e mesịrị, “n’ọnwa nke iri ahụ [June], n’ụbọchị mbụ nke ọnwa.” (Jenesis 8:5) * Ọnwa atọ (ụbọchị 90) ka e mesịrị—n’afọ nke [narị isii na otu nke Noa], n’ọnwa mbụ, n’ụbọchị mbụ nke ọnwa ahụ,” ma ọ bụ n’etiti September, 2369 T.O.A.—Noa wepụrụ ihe mkpuchi nke ụgbọ ahụ. Mgbe ahụ, ọ bịara nwee ike ịhụ na “ihu ala kpọrọ nkụ.” (Jenesis 8:13) Ọ bụ otu ọnwa na ụbọchị 27 (ụbọchị 57) ka e mesịrị, “n’ọnwa nke abụọ, n’ụbọchị nke [iri abụọ] na asaa [n’etiti November, 2369 T.O.A.], ka ala kọsịrị.” Noa na ezinụlọ ya sizi n’ụgbọ ahụ pụta n’ala akọrọ. N’ihi ya, Noa na ndị ọzọ nọrọ otu afọ na ụbọchị iri e ji ọnwa gụọ (ụbọchị 370) n’ime ụgbọ ahụ.—Jenesis 8:14.

Gịnị ka ihe ndekọ ndị a a kapịrị okwu ọnụ na ha banyere ihe ndị merenụ, otú ha si mee, na oge ha mere na-egosi? Ọ bụ nnọọ nke a: Onye amụma Hibru bụ́ Mozis, bụ́ onye o doro anya na ọ gbakwasịrị ụkwụ n’ihe ndekọ o nwetara wee dee Jenesis, kọrọ ihe ndị mere eme, ọ  bụghị akụkọ ifo. N’ihi ya, Iju Mmiri ahụ nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara nye anyị taa.

Olee Otú Ndị Ọzọ So Dee Bible Si Lee Iju Mmiri ahụ Anya?

Tụkwasị n’ihe ahụ e dekọrọ na Jenesis, e nwere ọtụtụ ebe a kpọtụrụ Noa aha ma ọ bụ kwuo banyere Iju Mmiri ahụ n’ime Bible. Iji maa atụ:

(1) Onye nchọpụta bụ́ Ezra gụnyere Noa na ụmụ ya (Shem, Ham, na Jefet) n’usoro ọmụmụ nke mba Izrel.—1 Ihe E Mere 1:4-17.

(2) Luk bụ́ dibịa na onye so dee Oziọma ndị ahụ gụnyere Noa mgbe ọ na-edetu ndị nna nna Jizọs Kraịst.—Luk 3:36.

(3) Pita onyeozi kwuru banyere Iju Mmiri ahụ ihe karịrị otu ugboro mgbe ọ na-edegara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ.—2 Pita 2:5; 3:5, 6.

(4) Pọl onyeozi kwuru banyere nnukwu okwukwe Noa gosipụtara n’iwu ụgbọ ahụ iji chebe ezinụlọ ya.—Ndị Hibru 11:7.

À pụrụ inwe obi abụọ ọ bụla ma ndị a dere Bible site n’ike mmụọ nsọ hà kwetara na ihe ahụ e dekọrọ na Jenesis banyere Iju Mmiri ahụ bụ eziokwu? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha weere ya dị ka ihe mere eme n’ezie.

Jizọs na Iju Mmiri Ahụ

Jizọs Kraịst dịrị ndụ tupu ya aghọọ mmadụ. (Ilu 8:30, 31) Ọ bụ mmụọ e kere eke n’eluigwe n’oge Iju Mmiri ahụ weere ọnọdụ. Ya mere, dị ka onye ji anya ya hụ ihe merenụ, Jizọs na-enye anyị ihe akaebe kasịnụ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ banyere Noa na Iju Mmiri ahụ. Jizọs kwuru, sị: “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.  N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị bu iju mmiri ahụ ụzọ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-enyekwa ndị inyom n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37-39.

Jizọs ọ̀ ga-eji akụkọ ifo na-adọ anyị aka ná ntị banyere ọbịbịa nke ọgwụgwụ usoro ihe a? Mbanụ! Obi siri anyị ike na o ji ihe atụ mere eme banyere mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe megide ndị ajọ omume mee ihe. Ee, ọtụtụ mmadụ nwụrụ, ma anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’ịmara na a zọpụtara Noa na ezinụlọ ya n’Iju Mmiri ahụ.

‘Ụbọchị Noa’ nwere ihe dị ukwuu ọ pụtara nye ndị na-ebi n’oge a, ‘n’ọnụnọ Nwa nke mmadụ,’ bụ́ Jizọs Kraịst. Ka anyị na-agụ ihe ndekọ zuru ezu banyere Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ bụ́ nke e chekwara n’ebe Noa dekọrọ ya, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ bụ ihe ndekọ na-akọ ihe mere eme n’ezie. Ihe ndị e ji ike mmụọ nsọ Chineke dekọọ na Jenesis banyere Iju Mmiri ahụ nwekwara ihe dị ukwuu ha pụtara nye anyị. Dị nnọọ ka Noa, ụmụ ya, na ndị nwunye ha nwere okwukwe n’ụzọ Chineke si zọpụta ha, anyị onwe anyị taa pụrụ iso ná ndị Jehova ga-echebe na-adabere n’okwukwe anyị nwere n’àjà mgbapụta Jizọs. (Matiu 20:28) Ọzọkwa, anyị pụrụ inwe olileanya nke iso ná ndị ga-alanahụ ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a, dị nnọọ ka ihe ndekọ njem Noa na-egosi na ya na ezinụlọ ya lanahụrụ Iju Mmiri ahụ nke wetara ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’oge ahụ ná njedebe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Iji nweta nkọwa zuru ezu banyere afọ Iju Mmiri ahụ weere ọnọdụ, lee Mpịakọta nke 1, peeji nke 458-460, nke Insight on the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 12 Akwụkwọ bụ́ Keil-Delitzsch Commentary on the Old Testament, Mpịakọta nke 1, peeji nke 148, na-ekwu, sị: “Ikekwe, ụbọchị 73 site n’oge ụgbọ ahụ tọgbọsịrị, a hụrụ elu ugwu, ya bụ, elu ugwu ndị dị n’Armenia, bụ́ ndị dị gburugburu ebe ụgbọ ahụ tọgbọrọ.”

[Igbe dị na peeji nke 5]

Hà Dịruru Ndụ Otú Ahụ?

“ỤBỌCHỊ nile nke Noa wee bụrụ [narị afọ itoolu na iri ise]: o wee nwụọ,” ka Bible na-ekwu. (Jenesis 9:29) Nna nna Noa bụ́ Metusela dịgidere ndụ ruo afọ 969—afọ kasị ogologo e dekọtụrụla na mmadụ dịruru ndụ. Nkezi afọ ndụ nke ọgbọ iri e nwere site n’Adam ruo Noa karịrị afọ 850. (Jenesis 5:5-31) Ndị dịrị ndụ laa azụ n’oge ahụ hà dịruru ndụ otú ahụ?

Nzube mbụ nke Chineke bụ ka mmadụ dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. E kere nwoke mbụ, bụ́ Adam, inwe ohere nke ịdị ndụ na-agaghị agwụ agwụ ma ọlị ma ọ bụrụ na o rubere Chineke isi. (Jenesis 2:15-17) Ma Adam nupụrụ isi, ohere ahụ funahụkwara ya. Mgbe Adam dịsịrị ndụ ruo afọ 930, bụ́ nke ọ dịrị ka o ji nke nta nke nta na-eru n’ọnụ ọnwụ, ọ laghachiri n’ala e si wepụta ya. (Jenesis 3:19; 5:5) Nwoke mbụ ahụ hapụụrụ ụmụ ya nile ihe nketa nke mmehie na ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.

Otú ọ dị, ndị dịrị ndụ n’oge ahụ biri n’oge na-adịghị anya site n’oge Adam zuru okè, ikekwe ọ bụ ya mere ha ji dị ogologo ndụ karịa ndị biri ndụ n’oge dị anya site na mgbe ahụ. N’ihi ya, afọ ndụ ụmụ mmadụ fọrọ nke nta ka o ruo otu puku afọ n’oge bu Iju Mmiri ahụ ụzọ, ọ gbadara n’ike mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị. Dị ka ihe atụ, Ebreham dịrị ndụ nanị afọ 175. (Jenesis 25:7) Ihe dịkwa ka afọ 400 mgbe nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nwụsịrị, Mozis onye amụma dere, sị: “Ụbọchị afọ nile anyị dị iri afọ asaa; ma ọ bụrụ na ha esite n’ịdị ike anyị ruo iri afọ asatọ, otú ọ dị, nganga ha bụ nanị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ na ajọ ihe.” (Abụ Ọma 90:10) Ọnọdụ e nwere taa bụ nnọọ otu ihe ahụ.

[Chaatị/Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]

Isi n’Oge Saịrọs Nyere Iwu nke Nyere Ndị Juu Ohere Isi ná Ndọrọ n’Agha Lọta Gụrụ Oge Laa Azụ Ruo Iju Mmiri nke Oge Noa

537 Iwu Saịrọs *

539 Nkwatu Saịrọs onye Peasia kwaturu

Babilọn

Afọ 68

607 Afọ 70 nke ntọgbọrọ n’efu Juda

amalite

Afọ 906 nke ndị ndú,

ndị ikpe, na ndị eze

Izrel lekọtara mba ahụ

1513 Ọpụpụ ha site n’Ijipt

Afọ 430 Afọ 430 nke ụmụ Izrel biri n’ala

Ijipt nakwa na Kenan

(Ọpụpụ 12:40, 41)

1943 E mee ka ọgbụgba ndụ Ebreham dị irè

Afọ 205

2148 Ọmụmụ Tira

Afọ 222

2370 Mmalite Iju Mmiri Ahụ

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 35 Saịrọs kpọsara ka a tọhapụ ndị Juu ná ndọrọ n’agha “n’afọ mbụ nke Saịrọs, bụ́ eze Peasia,” ikekwe n’afọ 538 T.O.A. ma ọ bụ ná mmalite 537 T.O.A.