Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Na-eche Banyere Ndị Nkịtị

Jehova Na-eche Banyere Ndị Nkịtị

 Jehova Na-eche Banyere Ndị Nkịtị

Ọ̀ DỊ anyị mkpa ịbụ ndị gbapụrụ iche ma ọ bụ ndị a ma ama n’ụzọ ụfọdụ iji bụrụ ndị Chineke ga-ahụta? Abraham Lincoln, bụ́ president nke 16, nke United States, ka e hotara na o kwuru, sị: “Onyenwe anyị nwere mmasị karịsịa n’ebe ndị nkịtị nọ. Ọ bụ ya mere o ji kee ha ọtụtụ.” Ọtụtụ ndị na-eche na ha bụ ndị nkịtị na-abaghị uru ọ bụla. Ịbụ onye nkịtị pụrụ inye echiche nke ịbụ “ogbenye, ịbụ onye dị ala.” N’ụzọ yiri nke ahụ, okwu ahụ bụ́ “onye nkịtị” pụrụ ịpụta “onye na-enweghị ihe ùgwù ma ọ bụ ọkwá pụrụ iche,” “onye na-enweghị ka ọ ha ya,” ma ọ bụ ọbụna “onye ọnọdụ ya dị nnọọ ala karịa nke ibe ya.” Ụdị ndị dị aṅaa ka ị na-enwe mmasị ịnọnyere? Ọ̀ bụ ndị dị mpako, nwee olu ike, ma dị nganga? Ị́ gaghị enwe mmasị ịnọnyere ndị nwere omume enyi, dị obi umeala, ma mara ebe ike ha ruru, ndị ji ezi obi egosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ?

Ebe ọ bụ na a na-amaja ndị mmadụ ma na-akwa ha emo n’ebe nile n’ụwa taa, ọ na-esiri ụfọdụ ike ikwere na Chineke nwere mmasị n’ebe ha nọ. “Esi m n’ezinụlọ na-adịchaghị egosi ịhụnanya. E ledara m anya, jiri m mee akaje, na ihe ọchị. N’ihi ya, n’oge m bụ nwata, ọ bịara dị m ka abaghị m uru,” ka otu onye na-agụ magazin a dere. “M ka na-enwe mmetụta ndị na-adịghị apụ m n’obi n’ihi ihe ndị mere n’oge gara aga bụ́ ndị na-eme ka m nwee nkụda mmụọ mgbe ihe ọdachi mere m.” N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ihe ndị mere a ga-eji kwere na Chineke n’onwe ya nwere mmasị n’ebe ndị nkịtị nọ.

Mmasị Chineke Nwere n’Ahụ́ Ndị Nkịtị

“Onye ukwu ka Jehova bụ, Ọ bụkwa Onye a na-eto nke ukwuu; ọ dịghịkwa ngwupụta ala dịịrị ịdị ukwuu Ya,” ka Eze Devid dere. (Abụ Ọma 145:3) Otú ọ dị, nke a adịghị egbochi Jehova ilekọta anyị anya n’ụzọ ịhụnanya na ọmịiko. (1 Pita 5:7) Dị ka ihe atụ, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

Ihe ndị na-adọrọ mmasị ndị mmadụ n’ụwa, dị ka mma elu ahụ́, ùgwù, ma ọ bụ akụ̀ na ụba, abụghị ihe Chineke na-agụ dị ka ihe ndị dị mkpa. Iwu Chineke nyere Izrel gosiri mmasị ọmịiko o nwere n’ebe ndị ogbenye, ụmụ mgbei, ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị ala ọzọ nọ. Chineke gwara ndị Izrel, bụ́ ndị e mesowororị omume obi ọjọọ n’Ijipt, sị: “Gị emela ọbịa ihe ike, emegbukwala ya . . . Nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ, ma ọ bụ nwa mgbei, unu ewedala ya n’ala. Ọ bụrụ na i wedaa ya n’ala ma ọlị, o wee tikuo m n’ụzọ ọ bụla n’ezie, aghaghị m ịnụ ntiku ya.” (Ọpụpụ 22:21-24) Ọzọkwa, Aịzaịa onye amụma kwupụtara obi ike o nwere ná nlekọta Chineke na-elekọta ndị na-enweghị ike, sị: “Ị bụworo onye na-enweghị ike ebe siri ike, Ị bụworo ogbenye ebe siri ike n’ime mkpa na-akpa ya, ebe mgbaba ịpụ n’oké mmiri ozuzo, ndò ịpụ n’okpomọkụ, mgbe oké ifufe nke ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji dị ka oké mmiri ozuzo na-amakwasị mgbidi.”—Aịsaịa 25:4.

N’oge nile o jere ozi, Jizọs Kraịst, onye bụ́ ‘ihe nnọchiteanya nke Chineke kpọmkwem,’ ghọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe nlereanya n’igosi ezi mmasị n’ebe ndị nkịtị nọ. (Ndị Hibru 1:3) Mgbe Jizọs hụrụ ìgwè mmadụ ndị ‘a gbara akpụkpọ ma chụsasịa dị ka atụrụ na-enweghị  onye na-azụ ha,’ o “nwere ọmịiko n’ahụ́ ha.”—Matiu 9:36.

Rịbakwa ama ụdị ndị Jizọs họọrọ dị ka ndịozi ya—mmadụ ndị a kọwara dị ka “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị.” (Ọrụ 4:13) Mgbe ọnwụ Jizọs gasịrị, ụmụazụ ya malitere ịkpọ ụdị mmadụ nile òkù ịṅa ntị n’Okwu Chineke. Pọl onyeozi dere na “onye ọ bụla na-ekweghị ekwe ma ọ bụ onye nkịtị” pụrụ ịbata n’ọgbakọ Ndị Kraịst ma ghọọ onye kwere ekwe. (1 Ndị Kọrint 14:24, 25) Kama ịhọrọ nanị ndị a na-asọpụrụ n’ụzọ ụwa si ele ihe anya, Chineke họọrọ ọtụtụ ndị nkịtị maka ijere ya ozi. “Unu na-ahụ ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu, ụmụnna m,” ka Pọl onyeozi kwuru, “na ọ bụghị ọtụtụ ndị maara ihe n’ụzọ anụ ahụ́ ka a kpọrọ, ọ bụghị ọtụtụ ndị dị ike, ọ bụghị ọtụtụ ndị si n’usoro ọmụmụ ndị eze; kama Chineke họọrọ ihe nzuzu nke ụwa, ka o wee menye ndị amamihe ihere; Chineke họrọkwaara ihe ndị na-adịghị ike nke ụwa, ka o wee menye ihe ndị dị ike ihere; Chineke họrọkwaara ihe ndị dị ala nke ụwa na ihe ndị a na-elelị, bụ́ ihe ndị na-adịghị adị, ka o wee mee ka ihe ndị dị adị ghara ịdị irè, ka anụ ahụ́ ọ bụla wee ghara ịnya isi n’ihu Chineke.”—1 Ndị Kọrint 1:26-29.

N’otu aka ahụ, taa, Chineke nwere ezi mmasị n’ahụ́ anyị. Uche Chineke bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ọ bụrụ na Chineke hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’anya nke ukwuu nke na o zitere Ọkpara ya n’ụwa ka ọ nwụọ n’ihi anyị, ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji na-eche na a hụghị anyị n’anya ma ọ bụ na anyị abaghị uru. (Jọn 3:16) Jizọs Kraịst gosiri ụmụazụ ya mkpa ọ dị imeso ọbụna onye kasị dị nta n’ime ụmụnna ime mmụọ ya ihe dị ka a ga-asị na ọ bụ Jizọs n’onwe ya ka ha na-emeso ihe. O kwuru, sị: “Ruo n’ókè unu meere ya otu n’ime ndị kasị nta n’ime ụmụnna m ndị a, unu meere m ya.” (Matiu 25:40) N’agbanyeghị otú ụwa pụrụ isi na-ele anyị anya, ọ bụrụ na anyị hụrụ eziokwu ahụ n’anya, anyị bụ ndị pụrụ iche n’anya Chineke.

Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị Francisco, * bụ́ nwatakịrị nwoke onye Brazil nke na-enweghị nna, mgbe ọ zụlitesịrị mmekọrịta onwe onye n’ebe Chineke nọ. Ọ na-akọwa, sị: “Ịmata Jehova na ọgbakọ ya nyeere m aka ịnagide mmetụta nke anọghị ná ntụkwasị obi na nke ihere m nwere. Amụtara m na Jehova n’onwe ya nwere mmasị n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” Jehova ghọrọ Nna dị adị n’ezie nye Francisco.

Otú O Si Eche Maka Ndị Na-eto Eto

Jehova nwere ezi mmasị, ọ bụghị nanị n’ebe ndị na-eto eto n’ozuzu nọ, kamakwa n’ebe onye nke ọ bụla n’ime ha nọ. N’ezie, ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ànyị bụ ndị okenye, anyị ekwesịghị ibuli onwe anyị elu. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ inwe nkà ma ọ bụ àgwà ndị Chineke pụrụ iji mee ihe n’ọdịnihu. Jehova maara nnụcha na ọzụzụ ndị dị anyị mkpa iji nwee ike igosipụta nkà na àgwà ndị anyị nwere. Dị ka ihe atụ, rịba ihe ndekọ dị na 1 Samuel isi 16 ama. Ebe ọ bụ na ndị ọzọ a na-ele anya ịbụ eze Izrel yiri ndị ka ruo eruo n’anya Samuel onye amụma, Jehova kọwara ihe ndị mere O ji họrọ  Devid, bụ́ nwa nwoke ikpeazụ nke Jesi, ịbụ eze ga-achị Izrel n’ọdịnihu, sị: “Elegidela ihu ya anya, elegidekwala ogologo nke ịdị elu ya; n’ihi na ajụwo m ya [nwanne Devid nke tọrọ ya]: n’ihi na Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ sị ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.”—1 Samuel 16:7.

Ndị na-eto eto taa hà pụrụ inwe obi ike na Jehova na-enwe ezi mmasị n’ahụ́ ha n’ezie? Tụlee ihe banyere Ana, bụ́ nwa agbọghọ bụ́ onye Brazil. Dị ka ọ dị n’ebe ọtụtụ ndị ntorobịa ndị ọzọ nọ, nrụrụ aka na ikpe na-ezighị ezi ọ na-ahụ nyere ya nsogbu n’obi. E mesịa, nna ya malitere ịkpọrọ ya na ụmụnne ya ndị nwanyị na-aga nzukọ Ndị Kraịst. Ka oge na-aga, ọ malitere inwe mmasị n’ihe ndị ọ na-amụta banyere Okwu Chineke. Ana malitere ịgụ Bible nakwa akwụkwọ Ndị Kraịst na-ebipụta ma na-ekpegara Jehova Chineke ekpere. Nke nta nke nta, ọ bịara malite iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya. Ọ na-akọwa, sị: “Ọ na-amasị m ịgbara ịnyịnya ígwè m gaa n’otu ugwu dị nso n’ebe obibi m bụ́ ebe m pụrụ ịnọ kirie ịma mma nke ọdịda anyanwụ. Ana m ekpegara Jehova ekpere ma na-ekele ya maka obiọma na mmesapụ aka ya, na-agbalị ịgwa ya otú m hụruru ya n’anya. Ịmata Jehova Chineke na nzube ya mere ka m nwee ahụ́ iru ala na mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi.” Ị̀ na-agbalị iwepụta oge iji tụgharịa uche ná nlekọta ịhụnanya Jehova?

N’eziokwu, otú e si zụlite anyị pụrụ ime ka o siere anyị ike iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya. Were Lidia dị ka ihe atụ. Mgbe ọ kọọrọ nna ya banyere otu ihe nke nọ nnọọ na-enye ya nsogbu n’obi, nna ya baara ya nnọọ mba, na-asị: “Onye iberibe.” Ọ bụ ezie na ọ ghọtara na nna ya chọrọ ka o chefuo nsogbu ahụ, Lidia na-ekwu sị: “Ịmụ Bible nyere m ihe nile m chọrọ ọbụna karịakwa. Àgwà Jehova nke na-adọrọ adọrọ mere ka ọ bụrụ ezigbo enyi m. Ugbu a, enwere m Nna na-ahụ n’anya ma nwee nghọta bụ́ onye m pụrụ ịkọsara nchegbu na nsogbu m ndị kasị bụrụ ihe nzuzo. Apụrụ m iji ọtụtụ awa gwa Onye kasị mkpa n’eluigwe na ala okwu, na-ejide n’aka na ọ ga-ege m ntị.” Akụkụ Bible ndị dị ka Ndị Filipaị 4:6, 7 nyeere ya aka inwe mmetụta nke ịbụ onye Jehova ji ịhụnanya na-elekọta. Akụkụ ihe odide ahụ na-asị: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.”

Enyemaka Iji Gboo Mkpa Gị

Jehova na-enwe mmetụta n’ebe ndị ohu ya n’otu n’otu nọ nakwa n’ebe ọgbakọ ya zuru ụwa ọnụ nọ. Anyị pụrụ igosi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ site n’iwepụta oge iji gwa ya okwu. Anyị ekwesịghị iji mmekọrịta anyị na ya gwurie egwu mgbe ọ bụla. Devid bu mmekọrịta ya na Jehova n’obi mgbe nile. O kwuru, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile. Mee m ka m zọọ ije n’eziokwu Gị, Gị zikwa m ihe; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke nke nzọpụta m; Gị ka m na-ele anya Gị ogologo ụbọchị nile.”—Abụ Ọma 25:4, 5.

Echiche nke iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya pụrụ ịbụ ihe ọhụrụ nye gị. N’agbanyeghị ụdị nsogbu ị pụrụ inwe, obi pụrụ isi gị ike mgbe nile na Onye Kasị Ihe Nile Elu ga-enyeliri gị aka, n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya. (1 Jọn 5:14, 15) N’ihi ya, mụta ịkapị ekpere gị ọnụ, na-eburu ọnọdụ gị na mkpa gị n’uche.

E mere ka mkpa ọ dị ịmata ihe bụ́ mkpa anyị pụta ìhè n’ekpere Eze Solomọn kpere mgbe a  na-arara ụlọ nsọ ahụ nye: “Mgbe oké ụnwụ ga-adị n’ala, mgbe ajọ ọrịa nke na-efe efe ga-adị, mgbe nchakpọ ga-adị, ma ọ bụ ọmụma ebu, ma ọ bụ igurube, ma ọ bụ ọbụbụ; mgbe ndị iro ha ga-anọchigide ha n’agha n’ala nke ọnụ ụzọ ama nile ha; ihe otiti ọ bụla, ma ọ bụ ọrịa ọ bụla; ekpere ọ bụla, arịrịọ amara ọ bụla, nke ga-adịrị mmadụ ọ bụla, ma ọ bụ nke ga-adịrị ndị Gị nile, bụ́ [Izrel], ndị ga-amara, nwoke ọ bụla ihe otiti ya na ihe mgbu ya, . . . Gị onwe gị sikwa n’eluigwe . . . nụrụ, gbaghara, nye nwoke ọ bụla dị ka ụzọ ya nile si dị.” (2 Ihe E Mere 6:28-30) N’ezie, ọ bụ nanị gị ‘maara ihe otiti gị nakwa ihe mgbu gị.’ Ya mere, lee ka o si dị oké mkpa ikwupụta ihe ndị bụ́ mkpa gị na ọchịchọ gị n’ezie. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, “[Jehova] ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.”—Abụ Ọma 37:4.

Mee Ka Mmekọrịta Gị na Jehova Sikwuo Ike

Jehova na-enwe obi ụtọ ikwe ka ndị nkịtị soro ya na-enwe mmekọrịta chiri anya. Okwu ya na-emesi anyị obi ike, sị: “‘M ga-abụkwara unu nna, unu ga-abụkwara m ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom,’ ka Jehova Onye Pụrụ Ime Ihe Nile na-ekwu.” (2 Ndị Kọrint 6:18) N’ezie, Jehova na Ọkpara ya chọrọ ka anyị nwee ihe ịga nke ọma ma nweta ndụ ebighị ebi. Lee ihe agbamume ọ bụ ịmata na Jehova ga-enyere anyị aka ibu ibu ndị dịịrị anyị n’ime ezinụlọ, n’ebe ọrụ, nakwa n’ọgbakọ Ndị Kraịst!

Otú o sina dị, anyị nile na-eche oge pụrụ iche ihu. Ahụ́ esighị ike, nsogbu ezinụlọ, ịkpata ego dị nta, ma ọ bụ ihe ọzọ pụrụ ịkpatara anyị ihe mgbu. Anyị nwere ike ghara ịma ụzọ anyị pụrụ isi nagide ule ma ọ bụ ọnwụnwa ụfọdụ. Ọ bụ onye na-ebo ajọ ebubo, bụ́ Setan Ekwensu, onye na-ebuso ndị Chineke agha ime mmụọ, na-eji aka ya ma ọ bụ si n’ụzọ ọzọ eme ka nrụgide a na-akawanye njọ. Otú ọ dị, e nwere otu onye nke na-aghọta ọnọdụ anyị nọ na ya ma na-enyere anyị aka isoro Jehova na-enwe ezi mmekọrịta. Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ karịa Jizọs Kraịst n’ọnọdụ ya e buliri elu n’eluigwe. Anyị na-agụ, sị: “Anyị nwere dị ka nnukwu onye nchụàjà, ọ bụghị onye na-apụghị imetara anyị ebere n’adịghị ike anyị, kama onye a nwaleworo n’ụzọ nile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie. Ya mere, ka anyị jiri nkwuwa okwu na-abịaru nso n’ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ, ka e wee meere anyị ebere, anyị enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ maka enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị.”—Ndị Hibru 4:15, 16.

Lee ihe na-emesi obi ike ọ bụ ịmata na ọ dịghị anyị mkpa ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ ndị bara ọgaranya iji nweta ihu ọma Chineke! Ọbụna mgbe ihe na-esiri gị ike, ṅomie ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye kpere ekpere, sị: “Mụ onwe m bụ onye e wedara n’ala na ogbenye; ma Onyenwe anyị na-echere m echiche: Onye inyeaka m na Onye na-eme ka m gbapụ ka Ị bụ.” (Abụ Ọma 31:9-14; 40:17) Jide n’aka na Jehova hụrụ ndị nkịtị dị umeala n’obi n’anya. N’ezie, ‘anyị pụrụ ịtụkwasị nchegbu nile anyị n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere anyị.’—1 Pita 5:7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Ọtụtụ n’ime ụmụazụ Jizọs bụ ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị

[Foto dị na peeji nke 30]

Ndị Kraịst na-agbalịsi ike inwe okwukwe siri ike

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Ọ dịghị anyị mkpa ịbụ ndị a ma ama iji nweta ihu ọma Chineke