Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Òkè M Keere n’Ime Ka Ọrụ Nkụzi Bible Zuru Ụwa Ọnụ Gaa n’Ihu

Òkè M Keere n’Ime Ka Ọrụ Nkụzi Bible Zuru Ụwa Ọnụ Gaa n’Ihu

 Akụkọ Ndụ

Òkè M Keere n’Ime Ka Ọrụ Nkụzi Bible Zuru Ụwa Ọnụ Gaa n’Ihu

DỊ KA ROBERT NISBET SI KỌỌ

Eze Sobhuza nke Abụọ nke Swaziland nabatara mụ na nwanne m nwoke bụ́ George n’obí ya. Ọ bụ n’afọ 1936, ma aka m na-echeta mkparịta ụka anyị na ya nwere nke ọma. Otú m si bịa soro eze nwee mkparịta ụka a were ogologo oge socha n’òkè m keere ná nnukwu ọrụ nkụzi Bible nke m rụworo ruo ogologo oge. Ugbu a m dị afọ 95, eji m obi ụtọ echeta òkè m keere n’ọrụ ahụ, bụ́ nke kpọgara m kọntinent ise.

IHE a nile malitere na 1925 mgbe otu nwoke na-ere tii aha ya bụ Dobson malitere ileta ezinụlọ anyị n’Edinburgh, Scotland. Anọ m ná ngwụsị afọ ndị iri na ụma m, anọkwa m na-amụ ọrụ imepụta ọgwụ. Ọ bụ ezie na m ka dịtụ obere, n’agbanyeghị nke ahụ, anọ m na-enwe nchegbu banyere mgbanwe ndị dị ịrịba ama agha ụwa nke 1914-1918 wetaworo ná ndụ ezinụlọ na nke okpukpe. N’otu n’ime oge ndị Maazị Dobson letara anyị, o nyere anyị akwụkwọ bụ́ The Divine Plan of the Ages. Otú o si kọwaa Onye Okike nwere ọgụgụ isi nke nwere “atụmatụ” a kapịrị ọnụ yiri nnọọ ihe ezi uche dị na ya ma kwesị ụdị Chi m chọrọ ife ofufe.

N’oge na-adịghị anya, mụ na mama m malitere ịga nzukọ nke Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Na September 1926, ma mụ ma mama m gosipụtara nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova site n’ịbụ ndị e mikpuru n’ime mmiri n’otu mgbakọ e nwere na Glasgow. E nyere onye nke ọ bụla n’ime ndị a na-aga ime baptizim otu uwe mwụda nke ọnụ ọnụ ala ya na-eru na nkwonkwo ụkwụ ka anyị yikwasị n’elu uwe baptizim anyị. N’oge ahụ, e  weere nke a dị ka ejiji kwesịrị ekwesị maka ihe omume dị oké mkpa otú ahụ.

N’oge mbụ ahụ, ọ dị mkpa ime ka anyị ghọtakwuo ọtụtụ ihe nke ọma. Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ọgbakọ, ma ọ bụrụdị na ọ bụghị ha nile, na-eme ememe Krismas. Ọ bụ mmadụ ole na ole keere òkè n’ozi ubi. Ọbụna ụfọdụ ndị okenye ekweghị ka a na-ekesa akwụkwọ n’ụbọchị Sunday, n’ihi na ha chere na o megidere iwu Ụbọchị Izu Ike. Otú ọ dị, isiokwu dị iche iche nke Ụlọ Nche 1925 malitere ikwusi okwu ike banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Mak 13:10: “A ghaghị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ ná mba nile.”

Olee otú a ga-esi rụzuo ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ? Ná mgbalị mbụ m mere ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, nanị ihe m gwara onye nwe ụlọ bụ na ana m ere akwụkwọ okpukpe ndị dị mma ma nyefee ya The Harp of God, bụ́ akwụkwọ kọwara ozizi iri ndị dị mkpa nke Bible, jiri ha na-atụnyere akwara iri ndị dị n’ụbọ akwara. E mesịa, e nyere anyị kaadị ịgba àmà, bụ́ nke e dere ozi dị mkpirikpi a na-enye onye nwe ụlọ ka ọ gụọ. Anyị jikwa okwu e kwunyere na teepu mee ihe bụ́ nke na-ewe minit anọ na ọkara, nke a pụkwara ịkpọ n’ígwè phonograph a na-ebugharị ebugharị. Ụdị ochie ya dị arọ obubu ma ndị ọgbara ọhụrụ ya adịtụghị arọ ka ha, a pụkwara ọbụna ịkwụwa ụfọdụ n’ime ha ọtọ wee na-akpọ.

Site na 1925 ruo n’ime afọ ndị 1930, anyị rụrụ ọrụ ịgba àmà anyị n’ụzọ ọ bụla kasị mma anyị pụrụ isi rụọ ya. E mesịa, ná mmalite afọ ndị 1940, e guzobere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’ọgbakọ nile. A kụziiri anyị izisa ozi Alaeze ahụ n’onwe anyị site n’iji ọnụ anyị na-agwa ndị nwe ụlọ bụ́ ndị ga-ege ntị okwu. Anyị mụtakwara mkpa ọ dị iduziri ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible ebe obibi. N’otu echiche, anyị pụrụ ikwu na nke a bụ mgbe ọrụ nkụzi Bible a na-arụ n’ụwa nile ugbu a ka na-amalite amalite.

Agbamume Nwanna Rutherford Nyere M

Ọchịchọ m nwere ikere òkè ka ukwuu n’ọrụ izi ihe ahụ mere ka m malite ọrụ ọsụ ụzọ oge nile na 1931. Ekwesịrị m ịmalite ozugbo e nwesịrị otu mgbakọ na London. Otú ọ dị, otu ụbọchị ka a nọ ná nkwụsịtụ nke ehihie, Nwanna Joseph Rutherford, bụ́ onye na-elekọta ọrụ ahụ n’oge ahụ, gwara m ka mụ na ya kọrịa. Ọ na-eme atụmatụ ka otu ọsụ ụzọ gaa Africa. “Ị̀ ga-enwe ọchịchọ ịga?” ka ọ jụrụ m. Ọ bụ ezie na ọ datụrụ m mberede, ejisiri m ike kwusie nnọọ ike, sị: “Ee, aga m aga.”

N’oge ahụ, ihe mgbaru ọsọ anyị bụ́ isi bụ ikesa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ruo ókè o kwere mee, nke ahụ pụtakwara na anyị ga na-agagharị agagharị mgbe nile. A gbara m ume ịnọgide n’alụghị nwanyị, dịkwa ka a gbara ihe ka ọtụtụ n’ime ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ nke inye nlekọta n’oge ahụ. Ebe e kenyere m ọrụ malitere na Cape Town, nke dị na ndịda ndịda Africa ruo n’ebe ọwụwa anyanwụ nke kọntinent ahụ, gụnyere àgwàetiti ndị dị n’ụsọ Oké Osimiri India. Iji garuo ebe ọ sọtụrụ n’ebe ọdịda anyanwụ, aghaghị m ịgafe ala uzuzu dị ọkụ nke Ọzara Kalahari ma gbagoruo isi Osimiri Naịl nke dị n’Ọdọ Mmiri Victoria. Mụ na onye òtù m aghaghị ịnọ ọnwa isii kwa afọ n’otu ma ọ bụ karị n’ime mba Africa ndị dị n’ógbè a sara mbara.

Katọn 200 nke Akụ̀ Ime Mmụọ

Mgbe m rutere Cape Town, e gosiri m katọn akwụkwọ 200 ndị e butere ka e kesaa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa. E biri akwụkwọ ndị ahụ n’asụsụ anọ nke Europe nakwa n’asụsụ anọ nke Eshia, ma ọ dịghị nke e biri n’asụsụ ọ bụla nke Africa. Mgbe m jụrụ ihe mere akwụkwọ ndị a ji dịrị ebe ahụ tupu mụ abịarutedị, a gwara m na ndị e bu n’obi bute ha bụ Frank na Gray Smith, bụ́ ndị ọsụ ụzọ abụọ gara Kenya ime nkwusa n’oge na-adịbeghị anya mgbe ahụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ha rutere Kenya, ha abụọ butere ọrịa ịba, ọ dịkwa mwute ikwu na Frank nwụrụ.

Ọ bụ ezie na akụkọ a kpaliri m iche echiche, ọ kụdaghị m mmụọ. Mụ na onye òtù m, bụ́ David Norman, ji ụgbọ mmiri si Cape Town kwọpụ gawa ebe mbụ e kenyere anyị ọrụ na Tanzania, nke dị ihe dị ka kilomita 5,000 site n’ebe  ahụ. Otu onye na-ahụ maka njem na Mombasa, Kenya, lekọtara akwụkwọ anyị ma na-ezitere anyị katọn akwụkwọ n’ebe ọ bụla anyị gwara ya ka o zite ha. Ná mmalite, anyị gbara àmà n’ógbè azụmahịa—n’ụlọ ahịa na ọfịs—ndị dị n’obodo nke ọ bụla. Akwụkwọ ndị anyị bu gụnyere ùkwù akwụkwọ 9 na akwụkwọ nta 11, bụ́ ndị a bịara mara dị ka eke na ogwurugwu, n’ihi àgwà ha dịgasị iche iche.

Mgbe anyị mesịrị, anyị kpebiri ịga àgwàetiti Zanzibar, nke dị ihe dị ka kilomita 30 site n’ụsọ oké osimiri nke ebe ọwụwa anyanwụ. Ruo ọtụtụ narị afọ, Zanzibar bụ ebe ahịa ohu hiwere isi, ma, a makwa ya ama n’ihi okooko osisi clove, bụ́ nke a na-anụ ísì ya n’ebe nile n’obodo ahụ. Ọ na-esitụrụ anyị ike ịmata ụzọ n’ihi na e jighị ụkpụrụ wuo obodo ahụ. Okporo ámá ndị dị na ya gbagọrọ agbagọ n’ụzọ dị mgbagwoju anya, ọ dịkwaara anyị mfe ifu ụzọ. Ụlọ oriri anyị nọ na ya dị mma, ma ibo ụzọ ya bụ ígwè, mgbidi ya dịkwa obosara ma yie ụlọ mkpọrọ karịa ụlọ oriri. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị rụpụtara ihe ndị dị mma n’ebe ahụ, obi dịkwa anyị ụtọ ịhụ na ndị Arab, ndị India, na ndị ọzọ ji obi ha nara akwụkwọ anyị.

Ụgbọ Okporo Ígwè, Ụgbọ Mmiri, na Ụgbọala

Ime njem n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa n’oge ahụ adịghị mfe. Dị ka ihe atụ, ka anyị si Mombasa na-aga n’ebe bụ́ ugwu ugwu nke Kenya, ìgwè igurube kwụsịrị ụgbọ okporo ígwè anyị. Ọtụtụ nde igurube jupụtara n’ala nakwa n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè ahụ, na-eme ka ha na-amị nnọọ amị nke na ụkwụ ụgbọ okporo ígwè apụghị ịkwụsi ike n’ala ma ọ na-agba. Nanị ihe e mere mete ya bụ iji mmiri ọkụ si n’ụgbọ okporo ígwè ahụ saa ebe ụgbọ ahụ na-erubeghị tupu ya enwee ike isi na ya gafee. N’ihi ya, ụgbọ ahụ nọ na-aga nwayọọ nwayọọ ruo mgbe anyị mesịrị ruo ebe igurube na-adịghị. Leekwa ahụ́ efe anyị nwetara mgbe ụgbọ okporo ígwè ahụ malitere ịrịgo ugwu ndị ahụ, ahụ́ ajụọkwa anyị oyi n’ihi ọnọdụ ihu igwe jụrụ oyi e nwere n’ebe ndị ahụ bụ́ ugwu ugwu!

Ọ bụ ezie na ọ dị mfe iji ụgbọ okporo ígwè na ụgbọ mmiri gaa n’obodo ndị dị n’ụsọ oké osimiri ahụ, ihe kasị mma iji gaa n’ime obodo ndị dị n’ebe ndị ahụ bụ ụgbọala. Obi dị m ụtọ mgbe nwanne m nwoke bụ́ George sonyeere m, n’ihi ya anyị bịaziri nwee ike ịzụta ụgbọala panel van butụrụ ibu, o buru ibu ruo n’ókè nke ịrụnye ya ihe ndina, kichin, ebe a na-akwasa ngwongwo, na windo ndị e tinyere ihe na-egbochi anwụnta ịbanye na ya. Anyị kenyekwara ígwè okwu n’elu ya. N’inwe ihe ndị a, anyị bịara nwee ike ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ mgbe chi dị ma na-akpọ ndị mmadụ ịbịa gee okwu anyị n’uhuruchi n’ọmà ahịa. Okwu anyị na-akpọnyekarịrị ha bụ nke isiokwu ya bụ “Hel Ọ̀ Dị Ọkụ?” N’otu oge, anyị ji “ụlọ anyị na-agbagharị agbagharị” si South Africa gaa Kenya, nke bụ́ njem ruru kilomita 3,000, obi dịkwa anyị ụtọ n’oge a inwe akwụkwọ dịgasị iche iche n’ọtụtụ asụsụ nke Africa, bụ́ ndị ndị bi n’ógbè ndị ahụ ji obi ụtọ nara anyị.

Ahụmahụ na-akpali mmasị anyị nwere bụ  na, na njem ndị dị otú a, anyị na-enwe ike ịhụ ihe ka ọtụtụ n’anụmanụ ndị dị n’Africa. N’ezie, iji chebe onwe anyị, anyị na-anọ n’ime ụgbọala anyị ma chi jie, ma, ọ bụ nnọọ ihe na-ewusi okwukwe ike ịhụ ụdị anụmanụ dịgasị iche iche otú ahụ ka ha nọ n’ebe Jehova kere ha ibi.

Mmegide Amalite

Ọ bụ ezie na anyị kpachapụrụ anya n’ebe anụ ọhịa dị, ọ dịghị ihe nke a bụ ma e jiri ya tụnyere ihe ọ dị mkpa ka anyị mee mgbe anyị nọ na-eche ndị ọrụ gọọmenti dịgasị iche iche na ụfọdụ ndị ndú okpukpe iwe ji ihu bụ́ ndị malitere imegide nnọọ ọrụ nkwusa Alaeze anyị n’ihu ọha. Otu nsogbu bụ́ isi anyị na-aghaghị ịnagide bụ nke metụtara otu onye na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè bụ́ onye kpọrọ onwe ya Mwana Lesa nke pụtara “Ọkpara Chineke,” a bịakwa mara ìgwè ya dị ka Kitawala, bụ́ nke dị mwute na ọ pụtara “Ụlọ Nche.” Ụfọdụ oge tupu anyị abịarute, onye a agbagbuwo ọtụtụ ndị Africa ná mmiri, na-asị na ya na-eme ha baptizim. E mesịrị jide ya ma kwụgbuo ya. Ka e mesịrị, enwetara m ohere nke ịgwa nwoke ahụ kwụgburu ya okwu, na-akọwara ya na ọ dịghị ihe jikọrọ nwoke a na Watch Tower Society (Òtù Ụlọ Nche) anyị.

Anyị nwetakwara ihe isi ike n’aka ọtụtụ ndị Europe bụ́ ndị ọrụ izi ihe anyị na-ewe iwe, karịsịa n’ihi ihe ndị metụtara ego. Otu manịja nke otu ụlọ nkwakọba ihe mere mkpesa, sị: “Ọ bụrụ na ndị ọcha gaje ịnọgide ná mba a, ndị Africa anwakwala anwa chọpụta otú e si na-erigbu ha n’obere ego a na-akwụ ha n’ọrụ.” N’ihi otu ihe ahụ, onyeisi nke otu ụlọ ọrụ na-egwupụta ọlaedo nyere m iwu isi n’ọfịs ya pụọ ozugbo. Ya ejirizie iwe duru m ruo n’okporo ámá.

Gọọmenti Rhodesia (Zimbabwe ugbu a) mesịrị nye anyị iwu isi ná mba ahụ pụọ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ n’ihi ịbụ ndị ndị mmegide bụ́ ndị okpukpe na ndị azụmahịa kpaliri. Anyị tinyere akwụkwọ maka ilebagharị anya ná mkpebi a, anyị nwekwaara ihe ịga nke ọma n’ịhụ na e kwere ka anyị nọrọ, ma ọ bụrụhaala na anyị agaghị na-ekwusara ndị Africa ozi ọma. Ihe otu onye ọrụ gọọmenti kwuru kpatara ya bụ na akwụkwọ anyị “ekwesịghị ndị Africa.” Otú ọ dị, ná mba ndị ọzọ, e gbochighị ọrụ izi ihe anyị n’etiti ndị Africa, ọbụna a nabatara ya. Otu n’ime mba ndị a bụ Swaziland.

Nnabata Eze Nabatara Anyị na Swaziland

Swaziland bụ obere mba na-achị onwe ya nke dị square kilomita 17,364, nke dị n’ime South Africa. Ọ bụ ebe a ka anyị zutere Eze Sobhuza nke Abụọ onye bụ́ ọkà n’ikwu okwu nke m kwuru banyere ya ná mmalite akụkọ a. Ọ ma asụ Bekee nke ọma, bụ́ nke ọ mụtara mgbe ọ gara akwụkwọ n’otu mahadum dị na Britain. N’ịbụ onye jiri ejiji nkịtị, ọ nabatara anyị nke ọma.

Mkparịta ụka anyị na ya hiwere isi na Paradaịs elu ala nke Chineke zubere maka ndị nwere ezi ọchịchọ obi. Ọ bụ ezie na o nwechaghị mmasị n’isiokwu ahụ, o mere ka o doo anya na okwu metụtara nke ahụ dị ya n’obi nke ukwuu. Eze ahụ tinyere onwe ya n’ịkwalite ọnọdụ ibi ndụ nke ndị ogbenye na ndị na-agụghị akwụkwọ. O nweghị mmasị n’ọrụ nke ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ nke Krisendọm, bụ́ ndị yiri ka ha nwere mmasị n’inweta ndị òtù chọọchị karịa n’ịkụziri ha ihe. Otú ọ dị, eze ahụ maara banyere ọrụ  nke ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ anyị, ọ jakwara anyị mma maka ọrụ nkụzi Bible anyị, nke ka nke ebe anyị dị njikere ime ya n’achọghị ka a kwụọ anyị ụgwọ ma ọ bụ ka e meere anyị ihe ndị ọzọ.

A Gbapụ Nkụzi Bible Ọsọ

Na 1943, e guzobere Watchtower Bible School of Gilead maka inye ndị ozi ala ọzọ ọzụzụ. E lekwasịrị anya n’isochi mmasị nile e gosipụtara kama ịbụ nanị n’inyefe akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Na 1950, a kpọrọ mụ na George òkù ịga klas nke 16 nke Gilead. Ebe a bụ ebe mbụ m zutere Jean Hyde, bụ́ ọmarịcha nwanna nwanyị bụ́ onye Australia nke e kenyere ozi ala ọzọ na Japan mgbe anyị abụọ gụsịrị akwụkwọ. Ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ka bụ nnọọ ihe na-ewu n’oge ahụ, n’ihi ya, anyị emereghị enyi anyị gaa n’ihu.

Mgbe anyị nwetasịrị ọzụzụ na Gilead, e kenyere mụ na George ozi ala ọzọ na Mauritius, bụ́ àgwàetiti nke dị n’Oké Osimiri India. Anyị bịara meta ndị ebe ahụ enyi, mụta asụsụ ha, ma duziere ha ọmụmụ Bible ebe obibi. E mesịa, nwanne m nwoke nke m tọrọ bụ́ William na nwunye ya, bụ́ Muriel, gụsịkwara akwụkwọ na Gilead. E zigara ha n’ókèala m meburu nkwusa na ya—Kenya.

Afọ asatọ gafere ngwa ngwa, e mesịa, ná mgbakọ mba nile e nwere na New York na 1958, ezutere m Jean Hyde ọzọ. Anyị maliteghachiri enyi anyị ma kwezie nkwa ọlụlụ. A gbanwere ebe e kenyere m ije ozi ala ọzọ site na Mauritius gaa Japan, n’ebe ahụkwa ka mụ na Jean nọ lụọ na 1959. Anyị maliteziri ibi ndụ na-enye nnọọ obi ụtọ n’ozi ala ọzọ na Hiroshima, bụ́ ebe e nwere nanị otu obere ọgbakọ n’oge ahụ. Taa, e nwere ọgbakọ 36 n’obodo ahụ.

Ịhapụ Japan

Ka ọtụtụ afọ gafere, nsogbu ahụ́ ike anyị abụọ na-enwe malitere ime ka ozi ala ọzọ na-esiwanyere anyị ike, n’ikpeazụkwa, ọ bịara dị mkpa ka anyị hapụ Japan ma jee biri n’ala nna Jean, bụ́ Australia. Ụbọchị anyị hapurụ Hiroshima bụ ụbọchị dị mwute. N’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, anyị sịrị ndị enyi anyị nile anyị hụrụ n’anya nọrọ nke ọma.

Anyị bizi Australia, anyị so Ọgbakọ Armidale nke dị na steeti New South Wales nọgide na-ejere Jehova ozi ruo ókè ike anyị a kpaara ókè kwere anyị. Lee ihe ọṅụ ọ bụworo isoro ọtụtụ mmadụ na-ekerịta akụ̀ nke eziokwu Ndị Kraịst ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ asatọ! Ahụla m mmụba dị ịtụnanya nke usoro nkụzi Bible, mụ onwe m ahụwokwa ihe omume ime mmụọ ndị dị ịrịba ama. Ọ dịghị mmadụ ma ọ bụ ìgwè pụrụ ịnara otuto maka nke a. N’ezie, n’ikwu ihe ọbụ abụ ahụ kwuru, “ọ bụ n’aka Jehova ka nke a sitere; nke ahụ bụ oké ọrụ n’anya anyị.”—Abụ Ọma 118:23.

[Foto dị na peeji nke 28]

Nwanne m nwoke bụ́ George ka ọ nọ n’ụgbọala anyị ji mere ụlọ

[Foto dị na peeji nke 28]

Ka m nọ n’Ọdọ Mmiri Victoria

[Foto dị na peeji nke 29]

Ụmụ akwụkwọ sekọndrị bụ́ ndị bịara gee okwu ihu ọha na Swaziland na 1938

[Foto ndị dị na peeji nke 30]

Mụ na Jean n’ụbọchị agbamakwụkwọ anyị na 1959 nakwa taa