Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”

“Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”

 “Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”

ỤBỌCHỊ Jizọs nwụrụ—ụbọchị nke 14 nke ọnwa ndị Juu bụ́ Naịsan—malitere mgbe anyanwụ dasịrị na Thursday, March 31, 33 O.A. N’anyasị ahụ, Jizọs na ndịozi ya gbakọtara n’otu ọnụ ụlọ nke otu ụlọ elu dị na Jeruselem ime Ememe Ngabiga. Ka Jizọs jikeere “ka ọ pụọ n’ụwa lakwuru Nna ya,” o gosipụtara na ya hụrụ ndịozi ya n’anya ruo ọgwụgwụ. (Jọn 13:1) N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịkụziri ha ihe ndị magburu onwe ha, si otú ahụ na-akwadebe ha maka ihe na-eche ha n’ọdịnihu.

Ka chi na-ejimi, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:33) Gịnị ka o bu n’uche kwuo okwu ahụ chọrọ obi ike? Ruo n’ókè ụfọdụ, ọ bụ nke a: ‘Ihe ọjọọ dị n’ụwa emeghị ka m wee iwe ma ọ bụ megwara ihe e mere m. Ekwebeghị m ka ụwa kpụzie m otú o si chọọ. Ọ pụkwara ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ.’ Ihe Jizọs kụziiri ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi n’awa ikpeazụ ndị ahụ o biri ndụ n’ụwa ga-enyere ha aka, n’otu aka ahụ, imeri ụwa.

Olee onye na-agaghị ekweta na ihe ọjọọ jupụtara n’ụwa taa? Olee otú anyị si emeghachi omume n’ikpe na-ezighị ezi nakwa ihe ike na-enweghị isi? Hà na-ewe anyị iwe ma ọ bụ na-eme ka anyị bụrụ ndị a nwara imegwara ihe e mere anyị? Olee otú ndakpọ omume ọma nke anyị na-ahụ gburugburu anyị si emetụta anyị? Ọ bụrụ na a gụnyekwuo ezughị okè mmadụ na ọchịchọ mmehie anyị, anyị na-ahụ onwe anyị n’ihu agha abụọ: megide ajọ ụwa gbara anyị gburugburu nakwa megide ọchịchọ ọjọọ ndị dị n’ime anyị. Ànyị pụrụ ịtụ anya n’ezie inwe mmeri n’enwetaghị enyemaka Chineke? Olee otú anyị pụrụ isi nweta enyemaka ya? Olee àgwà ndị anyị kwesịrị ịzụlite bụ́ ndị ga-enyere anyị aka iguzogide ọchịchọ anụ ahụ́? Iji nweta azịza ha, ka anyị tụlee ihe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ọ hụrụ n’anya n’ụbọchị ikpeazụ ahụ ọ dịrị ndụ n’ụwa.

Jiri Ịdị Umeala n’Obi Merie Nganga

Tụlee, dị ka ihe atụ, nsogbu nke nganga, ma ọ bụ mpako. Bible na-ekwu banyere ya, sị: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.” (Ilu 16:18) Akwụkwọ Nsọ na-adụkwa anyị ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ọ dị ihe ya bụ mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụ, ọ na-aghọgbu obi nke ya.” (Ndị Galeshia 6:3) Ee, nganga na-ebibi ihe ma na-eduhie eduhie. Anyị ga-abụ ndị maara ihe ịkpọ “mpako, na nganga” asị.—Ilu 8:13.

Ndịozi Jizọs hà nwere nsogbu n’ihe banyere mpako na nganga? Ọ dịkarịa ala n’otu oge, ha rụrụ ụka n’etiti onwe ha banyere onye ka ukwuu. (Mak 9:33-37) N’oge ọzọ, Jems na Jọn rịọrọ ka e nye ha ọnọdụ dị ùgwù n’Alaeze. (Mak 10:35-45) Jizọs chọrọ inyere ndị na-eso ụzọ ya aka iwepụ ọchịchọ a n’obi ha. N’ihi ya, ka ha nọ na-eri nri Ememe Ngabiga ahụ, o biliri, kee ákwà nhicha ahụ́ n’úkwù ya, ma malite ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya. O mere ka ihe ọ chọrọ ịkụziri ha doo ha anya. “Ọ bụrụ na mụ  onwe m, ọ bụ ezie na m bụ Onyenwenụ na Onye Ozizi, sara unu ụkwụ,” ka Jizọs kwuru, “unu kwesịkwara ịsarịta ụkwụ ibe unu.” (Jọn 13:14) A ghaghị iji ihe megidere nganga—obi umeala—dochie anya ya.

Otú ọ dị, ọ dịghị mfe imeri nganga. Ka e mesịrị n’abalị ahụ, mgbe Jizọs mesịrị ka Judas Iskarịọt, bụ́ onye na-aga ịrara ya nye pụọ, ndịozi 11 ahụ rụrịtara ụka n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Gịnị na-esere ha? Ọ bụ onye o yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu n’ime ha! Kama ịbawara ha mba, ọzọkwa, Jizọs ji ndidi mesie ike mkpa ọ dị ijere ndị ọzọ ozi. O kwuru, sị: “Ndị eze nke ndị mba ọzọ na-eme ka ha bụ ndị nwe ha, a na-akpọkwa ndị nwere ikike n’ebe ha nọ Ndị Ome Mma. Ma, unu onwe unu agaghị adị otú ahụ. Kama ka onye kasị ukwuu n’etiti unu dịrị ka onye kasị bụrụ nwata, ka onye na-emekwa ihe dị ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi.” N’ichetara ha ihe nlereanya o setịpụụrụ ha, ọ gbakwụnyere, sị: “Anọ m n’etiti unu dị ka onye na-eje ozi.”—Luk 22:24-27.

Ndịozi ahụ hà ghọtara isi okwu ya? Ihe àmà na-egosi na ha ghọtara ya. Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, Pita onyeozi dere, sị: “Ka unu nile nwee otu obi, na-egosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna, na-enwe obi ọmịiko, na-adị umeala n’obi.” (1 Pita 3:8) Lee ka o si dị oké mkpa ka anyị onwe anyị kwa jiri obi umeala merie nganga! Anyị ga-abụ ndị maara ihe ịghara imikpu onwe anyị n’ịchụso ịbụ ndị a ma ama, ike, ma ọ bụ ọkwá. “Chineke na-emegide ndị mpako,” ka Bible na-ekwu, “ma ọ na-enye ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.” (Jems 4:6) N’otu aka ahụ, otu ilu oge ochie amamihe dị na ya na-ekwu, sị: “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.”—Ilu 22:4.

Merie Ịkpọasị—N’ụzọ Dị Aṅaa?

Tụlee àgwà ọzọ jupụtara ebe nile n’ụwa—ịkpọasị. Ma ọ̀ bụ egwu, amaghị ihe, ajọ mbunobi, mmegbu, ikpe na-ezighị ezi, ịhụ mba n’anya, ịhụ ebo n’anya, ma ọ bụ ịhụ agbụrụ n’anya kpatara ya, ịkpọasị yiri ka ọ gbara anyị gburugburu. (2 Timoti 3:1-4) Ịkpọasị jupụtakwara ebe nile n’oge Jizọs. Ndị ọnaụtụ bụ ndị ọha ndị Juu na-asọ asọ ma kpọọ asị. Ndị Juu na ndị Sameria adịghị emekọ ihe. (Jọn 4:9) Ndị Juu ledakwara ndị Jentaịl, ma ọ bụ ndị na-abụghị ndị Juu anya. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ụdị ofufe Jizọs guzobere gaje ịnabata mmadụ ndị sitere ná mba nile. (Ọrụ 10:34, 35; Ndị Galeshia 3:28) N’ihi ya, o ji ịhụnanya nye ndị na-eso ụzọ ya ihe ọhụrụ.

Jizọs kwupụtara, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya.” Ha aghaghị ịmụta igosipụta ịhụnanya a, n’ihi na ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) Iwu ahụ dị ọhụrụ n’echiche bụ́ na ọ karịrị ịhụ “mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” (Levitikọs 19:18) N’ụzọ dị aṅaa? Jizọs mere ka o doo anya, na-asị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya. Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya ka nke a ukwuu, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:12, 13) Ha aghaghị ịdị njikere ịchụ ndụ ha n’àjà n’ihi ibe ha nakwa n’ihi ndị ọzọ.

Olee otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ isi wepụ ajọ ịkpọasị ná ndụ ha? Ọ bụ site n’iji ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà dochie ya. Ọtụtụ nde ndị nwere ezi obi bụ́ ndị sitere  n’agbụrụ, ọdịnala, okpukpe, na ọchịchị nile na-eme nnọọ nke ahụ. A na-achịkọta ha ugbu a n’otu òtù dị n’otu nke ịkpọasị na-adịghị na ya—òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. Ha na-eburu okwu ndị a Jọn onyeozi dere n’ike mmụọ nsọ n’uche: “Onye ọ bụla nke kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu makwaara na ọ dịghị ogbu mmadụ nke ndụ ebighị ebi na-adịgide n’ime ya.” (1 Jọn 3:15) Ọ bụghị nanị na ezi Ndị Kraịst na-ajụ ibuli ngwá agha iji lụọ agha kamakwa ha na-agbasi mbọ ike igosirịta ibe ha ịhụnanya.

Otú ọ dị, gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe ndị na-abụghị ndị kwere ekwe ibe anyị nọ bụ́kwa ndị ọ pụrụ ịbụ na ha kpọrọ anyị asị? Ka a kwuwara Jizọs n’elu osisi, o kpere ekpere n’isi ndị gburu ya, na-asị: “Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.” (Luk 23:34) Mgbe ndị ịkpọasị juru obi ji nkume tụgbuo Stivin onye na-eso ụzọ, okwu ndị ikpeazụ o kwuru bụ: “Jehova, agụla mmehie a megide ha.” (Ọrụ 7:60) Jizọs na Stivin chọrọ ka ọbụna ndị kpọrọ ha asị nweta ihe kasị mma. Ha enweghị ịkpọasị n’obi ha. “Ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ,” ka Bible na-adụ anyị n’ọdụ.—Ndị Galeshia 6:10.

‘Ihe Inyeaka Ruo Mgbe Ebighị Ebi’

Ka nzukọ ya na ndịozi 11 kwesịrị ntụkwasị obi nọ na-aga n’ihu, Jizọs mere ka ha mara na, n’oge na-adịghị anya, ya na ha agaghịzi anọ n’anụ ahụ́. (Jọn 14:28; 16:28) Ma o mesiri ha obi ike, sị: “M ga-arịọkwa Nna ahụ, ọ ga-enyekwa unu ihe inyeaka ọzọ ka ọ dịnyere unu ruo mgbe ebighị ebi.” (Jọn 14:16) Ihe inyeaka ahụ e kwere ná nkwa bụ mmụọ nsọ Chineke. Ọ ga-akụziri ha ihe ndị dị omimi nke Akwụkwọ Nsọ ma chetara ha ihe Jizọs kụziwooro ha n’oge o jere ozi n’elu ala.—Jọn 14:26.

Olee otú mmụọ nsọ pụrụ isi nyere anyị aka taa? Bible bụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Ndị ikom e ji buo amụma ma dee Bible bụ ndị ‘mmụọ nsọ duru.’ (2 Pita 1:20, 21; 2 Timoti 3:16) Ịmụ Akwụkwọ Nsọ na itinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ na-enye anyị ihe ọmụma, amamihe, nghọta, mmata, izuzu, na ikike iche echiche. Ọ̀ bụ na anyị anaghị abụ ndị a kwadebere mgbe ahụ n’ụzọ ka mma iche nrụgide dị iche iche nke ajọ ụwa a ihu?

Mmụọ nsọ bụ ihe inyeaka n’ụzọ ọzọkwa. Mmụọ nsọ Chineke bụ ihe na-enwe mmetụta dị ike ma baa uru, na-eme ka ndị ọ na-edu nwee ike igosipụta àgwà ndị na-enye Chineke nsọpụrụ. “Mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, njide onwe onye,” ka Bible na-ekwu. Ọ̀ bụ na ihe ndị a abụghị kpọmkwem àgwà ndị dị anyị mkpa iji merie ọchịchọ anụ ahụ́ ndị anyị na-enwe n’ebe omume rụrụ arụ, esemokwu, ekworo, iwe ọkụ, na ihe ndị yiri ha dị?—Ndị Galeshia 5:19-23.

Site n’ịdabere ná mmụọ Chineke, anyị pụkwara inweta “ike karịrị ike nkịtị” iji nagide nsogbu ma ọ bụ ahụhụ ọ bụla. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọ bụ ezie na mmụọ nsọ nwere ike ọ gaghị ewepụ ule ma ọ bụ ọnwụnwa, ọ pụrụ inyere anyị aka n’ezie ịtachi obi na ha. (1 Ndị Kọrint 10:13) “Maka ihe nile enwere m ume site n’onye ahụ nke na-enye m ike,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Filipaị 4:13) Chineke na-eji mmụọ nsọ ya enye ike dị otú ahụ. Lee aha ekele anyị pụrụ inwe maka mmụọ nsọ! E kwere nkwa inye ya ndị ‘hụrụ Jizọs n’anya ma na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu.’—Jọn 14:15.

“Nọgidenụ n’Ịhụnanya M”

N’abalị ikpeazụ ọ dịrị ndụ dị ka mmadụ, Jizọs gwakwara ndịozi ya, sị: “Onye nwere ihe ndị m nyere n’iwu ma na-edebe ha, onye ahụ bụ onye hụrụ m n’anya. N’aka nke ọzọ, onye hụrụ m n’anya ka Nna m ga-ahụ n’anya.” (Jọn 14:21) “Nọgidenụ n’ịhụnanya m,” ka ọ gbara ha n’ume. (Jọn 15:9) Olee otú ịnọgide n’ịhụnanya nke Nna ahụ na nke Ọkpara ahụ si enyere anyị aka n’agha anyị na-alụso ọchịchọ mmehie dị n’ime anyị nakwa ajọ ụwa gbara anyị gburugburu?

Ànyị pụrụ ịchịkwa ọchịchọ ọjọọ n’ezie ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe na-akwalisi anyị ike ime otú ahụ? Ọ̀ dị ihe pụrụ ịkwali anyị ime ya karịa ọchịchọ nke iso Jehova Chineke na Ọkpara ya na-enwe ezi mmekọrịta? Ernesto, * bụ́ nwa okorobịa  nke lụsiri ọgụ ike megide ndụ nke omume rụrụ arụ bụ́ nke o biworo kemgbe mmalite afọ ndị iri na ụma ya, na-akọwa, sị: “Achọrọ m ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, amụtakwara m site na Bible na ọ dịghị anakwere ụzọ m si ebi ndụ. N’ihi ya, ekpebiri m ịbụ ụdị mmadụ ọzọ, ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ nduzi Chineke. Kwa ụbọchị, aghaghị m ịlụso echiche ọjọọ na nke rụrụ arụ ọgụ bụ́ ndị ka na-abata m n’uche mgbe nile. Ma ekpebisiri m ike imeri n’ọgụ a, ekpekwara m ekpere n’esepụghị aka maka enyemaka Chineke. Mgbe afọ abụọ gasịrị, ọnọdụ ahụ bịara dịtụ mma, ọ bụ ezie na aka m na-ejidesikwa onwe m ike.”

Banyere ọgụ anyị na-alụso ụwa nke gbara anyị gburugburu, tụlee ekpere mmechi Jizọs kpere tupu ha ahapụ ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu na Jeruselem. O kpekuru Nna ya ekpere n’ihi ndị na-eso ụzọ ya ma rịọ, sị: “M na-arịọ gị arịrịọ, ọ bụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ. Ha abụghị akụkụ nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:15, 16) Lee ihe na-emesighachi obi ike nke ahụ bụ! Jehova na-eche ndị ọ hụrụ n’anya nche ma na-ewusikwu ha ike ka ha na-anọgide na-anọpụ iche n’ụwa.

“Gosipụtanụ Okwukwe”

Idebe ihe ndị Jizọs nyere n’iwu pụrụ n’ezie inyere anyị aka inwe mmeri n’ọgụ anyị na-alụso ajọ ụwa a na ọchịchọ mmehie anyị. Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú mmeri ndị ahụ dịruru ná mkpa, ha apụghị iwepụ ụwa ma ọ bụ mmehie e ketara eketa. Ma ọ dịghị anyị mkpa inwe obi nkoropụ.

“Ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya,” ka Bible na-ekwu, “ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Jizọs nyere ndụ ya iji napụta “onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya” n’aka mmehie na ọnwụ. (Jọn 3:16) Ya mere, ka anyị na-amatakwu banyere uche na nzube Chineke, ka anyị buru n’uche ndụmọdụ Jizọs bụ́: “Gosipụtanụ okwukwe na Chineke, gosipụtakwanụ okwukwe na mụ.”—Jọn 14:1.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 E ji aha nnọchianya mee ihe n’ebe a.

[Foto dị na peeji nke 6, 7]

“Nọgidenụ n’ịhụnanya m,” ka Jizọs gbara ndịozi ya ume

[Foto dị na peeji nke 7]

Nnwere onwe pụọ ná mmehie na ihe ndị ọ na-akpata ga-eru anyị aka n’oge na-adịghị anya