Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwa M Ò Kwesịrị Ịga Akwụkwọ?

Nwa M Ò Kwesịrị Ịga Akwụkwọ?

 Nwa M Ò Kwesịrị Ịga Akwụkwọ?

OLEE otú ọ pụrụ ịdị gị ma a sị na ị pụghị ịgụ ihe e dere na peeji a? Gịnị ma ọ bụrụ na ị pụghị ịsụ asụsụ mba unu ji eme ihe? Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ị pụghị ịchọta ala nna gị na map ụwa? Imerime ụmụaka ga-etolite n’ọnọdụ dị otú ahụ kpọmkwem. Gịnị banyere nwa gị?

Nwa gị ò kwesịrị ịga akwụkwọ? N’ọtụtụ mba, ọ bụ iwu na nwata ga-aga akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị, ọ na-abụkarịkwa n’efu. Nkwekọrịta Maka Ihe Ndị Ruuru Nwatakịrị na-ewere ịga akwụkwọ dị ka ihe bụ́ isi ruuru mmadụ. Otú ahụkwa ka Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ si were ya. Otú ọ dị, n’ala ụfọdụ, agụmakwụkwọ nwere ike ọ gaghị abụ n’efu, ọ pụkwara ịbụrụ ndị nne na nna ibu arọ n’ụzọ ego. Ka anyị leba anya n’okwu a, na-eburu n’uche ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị chọrọ ka ụmụ ha mara ịgụ na ide ihe, ma ọ́ bụghị site n’ịhụ na ha gara akwụkwọ ọ bụrụ site n’ụzọ ndị ọzọ.

Ihe Atụ Bible nke Ndị Maara Ịgụ na Ide Ihe

Ihe ka ọtụtụ ná ndị ohu Chineke a kpọtụrụ aha na Bible pụrụ ịgụ na ide ihe. Ndịozi Jizọs bụ́ Pita na Jọn bụ ndị Juu na-akụ azụ̀, ma ha dere akwụkwọ Bible n’asụsụ Grik, ọ bụghị n’olumba Galili ha. * Ihe àmà na-egosi na ndị mụrụ ha hụrụ na ụmụ ha nwetara agụmakwụkwọ bụ́ isi. Ndị ọzọ so dee Bible bụ́ ndị nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ na-agụnye onye ọzụzụ atụrụ bụ́ Devid, onye ọrụ ubi bụ́ Emọs, na onye otu nne ji ya na Jizọs bụ́ Jud, bụ́ onye ghọrọ ọkwa nkà ma eleghị anya.

Nwoke ahụ bụ́ Job pụrụ ịgụ na ide ihe, akwụkwọ Bible bu aha ya na-egosikwa na o nwetụrụ ihe ọmụma banyere sayensị. Ọ pụkwara ịbụ na o nwere ikike nke ide akwụkwọ, n’ihi na okwu ya ndị e hotara n’akwụkwọ Job dị n’ụdị uri. Anyị makwaara na Ndị Kraịst oge gboo maara ịgụ na ide ihe n’ihi na a hụwo ihe pụrụ ịbụwo ihe ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ha deturu ná mpekere ite ụrọ.

Agụmakwụkwọ Dị Mkpa Nye Ndị Kraịst

Ọ dị Ndị Kraịst nile mkpa inwe ọganihu n’ihe ọmụma Bible ma ọ bụrụ na ha gaje ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. (Ndị Filipaị 1:9-11; 1 Ndị Tesalonaịka 4:1) Iji ịdị uchu na-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible eme ihe pụrụ ime ka anyị nwekwuo ọganihu ime mmụọ. Ebe ọ bụ na Chineke enyewo Okwu ya e dere ede, ọ na-atụ anya ka ndị na-efe ya ofufe mara ịgụ na ide ihe ruo ókè o kwere mee. Iji nghọta na-agụ Bible na-eme ka ọ dịkwuo mfe itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ. N’ezie, ọ pụrụ ịbụ na anyị aghaghị ịgụ akụkụ ya ụfọdụ ihe karịrị otu ugboro iji ghọta ha nke ọma ma nwee ike ịtụgharị uche na ha.—Abụ Ọma 119:104; 143:5; Ilu 4:7.

Kwa afọ, ndị Jehova na-enweta ọtụtụ akwụkwọ ndị e dere ede na-enye aka bụ́ ndị a kwadebere site ná nduzi nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Akwụkwọ ndị dị otú ahụ na-ekwu banyere ndụ ezinụlọ, omenala, okpukpe, sayensị, na ọtụtụ isiokwu ndị ọzọ. Nke kasị mkpa bụ na ha na-ebu ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ banyere ihe ime mmụọ. Ọ bụrụ na ụmụ gị apụghị  ịgụ ihe, ha agaghị enweta ihe ọmụma dị ha nnọọ oké mkpa.

Ịmụ banyere akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ dị mkpa n’ihi na ọ na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere e ji nwee mkpa maka Alaeze Chineke. Inwe ihe ọmụma bụ́ isi banyere ọdịdị mbara ala dịkwa mkpa. Bible na-ekwu banyere ọtụtụ ebe ndị dị ka Izrel, Ijipt, na Gris. Nwa gị ọ̀ ga-enwe ike ịchọta ha na map ụwa? Ọ̀ pụrụ ịchọta ala nna ya? Ịghara inwe ike ịchọta ihe na map pụrụ ọbụna ime ka mmadụ ghara inwecha ike ijezu ozi ya n’ebe ụfọdụ e kenyere ya ọrụ.—2 Timoti 4:5.

Ihe Ùgwù Dị Iche Iche n’Ọgbakọ

Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nwere ọtụtụ ibu ọrụ ndị metụtara ịgụ ihe. Dị ka ihe atụ, ha nwere ihe omume ndị ha ga-akwadebe maka nzukọ ọgbakọ. E nwere mkpa maka idekọ akwụkwọ ndị a na-ebute nakwa onyinye ndị e nwetara. Ọ bụrụ na mmadụ enwetaghị agụmakwụkwọ bụ́ isi, ọ ga-esiri ya ike ịrụzu ọrụ ndị a nke ọma.

Ndị ọrụ afọ ofufo na-eje ozi n’ebe obibi Betel ndị e nwere gburugburu ụwa. Ka ndị ọrụ afọ ofufo a wee nwee ike ịdị na-ekwurịta okwu nke ọma ma na-arụzu ọrụ ha, dị ka ịsụgharị akwụkwọ na idozi ígwè ọrụ, ha aghaghị inwe ike ịgụ na ide ihe n’asụsụ mba ha bi na ya ji eme ihe. Ọ bụrụ na ọ dị mgbe ụmụ gị ga-enweta ihe ùgwù ndị dị ka ndị a, ọ na-adịkarị mkpa na ha ga-enweta agụmakwụkwọ bụ́ isi. Olee ihe ndị ọzọ bara uru mere nwa gị ga-eji gaa akwụkwọ?

Ịda Ogbenye na Nkwenkwe Ụgha

Ndị dara ogbenye pụrụ ịbụ ndị ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ha pụrụ ime n’ọnọdụ ụfọdụ. Otú ọ dị, n’ọnọdụ ndị ọzọ, inweta agụmakwụkwọ bụ́ isi pụrụ inyere anyị na ụmụ anyị aka izere ịta ahụhụ n’ụzọ na-enweghị isi. Ọ bụ mmadụ ole na ole na-amaghị ịgụ na ide ihe na-agbali mbọ ibi ndụ nwetụrụ isi. Ụmụaka na ọbụna ndị nne na nna na-anwụ mgbe ụfọdụ n’ihi na obere ego ha na-akpata na-eme ka ọ ghara ikwe ha omume inweta ọgwụgwọ. Erighị ihe na-edozi ahụ́ na ibi n’ụlọ na-adịghị mma na-abụkarị ọnọdụ nke ndị na-agachaghị akwụkwọ ma ọ bụ ndị na-agadịghị aga. Agụmakwụkwọ ma ọ bụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ inwe ike ịgụ na ide ihe pụrụ inye aka n’ụzọ ụfọdụ n’ọnọdụ ndị a.

Ịma otú e si agụ na otú e si ede ihe na-emekwa ka mmadụ ghara ịbụcha onye nwere nkwenkwe ụgha. N’ezie, ma ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ ma ọtụtụ ndị na-agụghị akwụkwọ nwere nkwenkwe ụgha. Ma ọ pụrụ ịdị mfe ịghọgbu ndị na-agụghị akwụkwọ ma rigbuo ha karịa ndị ọzọ, ebe ọ bụ na ha apụghị ịgụ akwụkwọ ndị na-ekpughe aghụghọ ndị dị otú ahụ. N’ihi ya, ha na-aka enwe nkwenkwe ụgha ma na-ekwere na ndị dibịa afa pụrụ ịgwọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube.—Deuterọnọmi 18:10-12; Mkpughe 21:8.

Agụmakwụkwọ Abụghị Nanị Maka Inweta Ọrụ

Ụfọdụ na-eche na nzube bụ́ isi e ji aga akwụkwọ bụ iji kpata ego. Ma, ụfọdụ ndị gụrụ akwụkwọ enweghị ọrụ ma ọ bụkwanụ ha adịghị akpata ego na-ezuru ha iji gboo mkpa ndị bụ́ isi. N’ihi ya, ụfọdụ ndị nne na nna pụrụ iche na ọ baghị uru iziga nwa ha ụlọ akwụkwọ. Ma, agụmakwụkwọ na-eme ihe karịrị ịkwadebe mmadụ ịkpata ego; ọ na-akwadebe ụmụaka maka ndụ n’ozuzu ya. (Eklisiastis 7:12) Ọ bụrụ na  mmadụ pụrụ ịsụ asụsụ mba ya ji eme ihe, nwee ike ịgụ ya, nweekwa ike ide ya ede, iso ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ, ndị ọrụ gọọmenti, ma ọ bụ ndị na-arụ n’ụlọ akụ̀ na-emekọ ihe na-adịkwuru ya mfe, ọbụna bụrụ ihe ọ na-eme mgbe dum, kama ịbụ ihe na-atụ ya ụjọ.

N’ebe ụfọdụ, a pụrụ ịkpọnye mmadụ ụmụaka na-agụghị akwụkwọ ka ọ kụziere ha ọrụ ịkpụ blọk, ịkụ azụ̀, ịkwa ákwà, ma ọ bụ ụfọdụ ọrụ ndị ọzọ. Ịmụ ọrụ dị mma, ma ọ bụrụ na ụmụaka a agatụbeghị akwụkwọ, ikekwe ha agaghị amụta ịgụ na ide ihe nke ọma. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o yikarịrị ka ha ga-ezere ịbụ ndị e rigburu ma nwee ike ibi ndụ na-eju afọ karị ma ọ bụrụ na ha bu ụzọ nweta agụmakwụkwọ bụ́ isi ma gazie mụọ ọrụ.

Jizọs nke Nazaret bụ ọkwa nkà, ihe àmà na-egosikwa na ọ mụrụ ọrụ n’aka nna nkuchi ya, bụ́ Josef. (Matiu 13:55; Mak 6:3) Jizọs makwaara ịgụ na ide ihe, n’ihi na ọbụna mgbe ọ dị afọ 12, o nwere ike iso ndị gụrụ akwụkwọ nọ n’ụlọ nsọ ahụ nwee mkparịta ụka nwere nzube. (Luk 2:46, 47) N’ọnọdụ Jizọs, ịmụ ọrụ emeghị ka ọ ghara inweta ụdị agụmakwụkwọ ndị ọzọ.

È Kwesịkwuru Ịzụ Ụmụaka Ndị Nwanyị n’Ụlọ Akwụkwọ?

Mgbe ụfọdụ, ndị nne na nna na-eziga ụmụ ha ndị nwoke ụlọ akwụkwọ ma hapụ ndị nke nwanyị. Ikekwe ụfọdụ ndị nne na nna na-eche na ọ bụ ịla ego n’iyi iziga ụmụ ha ndị nwanyị ụlọ akwụkwọ ma kwere na ụmụaka nwanyị pụrụ ịbara nne ha uru karị site n’ịdị na-anọ n’ụlọ kwa ụbọchị. Ma amaghị ịgụ na ide ihe  pụrụ ime ka nwatakịrị nwanyị bụrụ onye ụwa ga-atụ n’ọnụ. Otu akwụkwọ Òtù Na-ahụ Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) bipụtara na-ekwu, sị: “Nnyocha ndị e mere ugboro ugboro egosiwo na ịhụ na ụmụaka ndị nwanyị gụrụ akwụkwọ bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi kwụsị ịda ogbenye.” (Poverty and Children: Lessons of the 90s for Least Developed Countries) Ụmụaka nwanyị ndị gụrụ akwụkwọ na-abụ ndị a kwadebere n’ụzọ ka mma maka ndụ ma na-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha karị, si otú ahụ na-abara mmadụ nile nọ n’ezinụlọ ha uru.

Nchọpụta e mere banyere ọnwụ ụmụ ọhụrụ na Benin, n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, gosiri na ụmụaka 167 n’ime 1,000 ọ bụla na-anwụnahụ ndị nne na-amaghị ịgụ na ide ihe n’ozuzu tupu ha eruo afọ ise, ebe ihe na-anwụnahụ ndị inyom gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị bụ ụmụaka 38. Akwụkwọ òtù UNICEF ahụ na-ekwubi, sị: “N’ihi ya, ebe a gụruru akwụkwọ so n’ihe na-ekpebi ọ̀tụ̀tụ̀ nke ọnwụ ụmụ ọhụrụ na Benin, dị ka ọ dị n’ụwa nile.” Ya mere, ịhụ na nwa gị nwanyị gara akwụkwọ pụrụ ịba uru n’ụzọ dịgasị iche iche.

Klas Ịgụ na Ide Ò Zuru?

N’ebe ọ dị mkpa, Ndịàmà Jehova na-eduzi klas ịmụ ịgụ na ide maka ndị òtù ọgbakọ bụ́ ndị na-apụghị ịgụ ihe. * Ndokwa a bara uru na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta ịgụ ihe, karịsịa n’asụsụ ógbè ha. Nke a ọ̀ bụ ihe a ga-eji dochie ịga akwụkwọ? È kwesịrị ịtụ anya ka ọgbakọ  kụziere nwa gị akwụkwọ ọbụna ma a sị na e nwere ụlọ akwụkwọ n’ógbè unu?

Ọ bụ ezie na klas ịgụ na ide bụ ndokwa ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova ji obiọma mee, ndị e bu n’uche guzobe ya bụ ndị meworo okenye ụwa na-atụ n’ọnụ bụ́ ndị na-agaghị akwụkwọ ma ọlị mgbe ha bụ ụmụaka. Ikekwe, ndị mụrụ ha amaghị uru ịgụ na ide ihe bara, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ụlọ akwụkwọ adịghị. Ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ ndị e nyeere aka site n’ịga klas ịmụ ịgụ na ide ndị ọgbakọ na-eduzi. Ma klas ndị a abụghị ihe a ga-eji dochie ụlọ akwụkwọ, e guzobeghịkwa ha iji kụzie ihe ndị bụ́ isi a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ. A dịghị amụ ihe ndị dị ka sayensị, mgbakọ na mwepụ, na akụkọ ihe mere eme na klas ịmụ ịgụ na ide ndị a. Otú ọ dị, a pụrụ ịmụ ha n’ụlọ akwụkwọ.

N’Africa, a na-eduzi klas ịmụ ịgụ na ide karịsịa n’asụsụ ógbè, ọ naghị abụkarị n’asụsụ mba ji eme ihe. Otú ọ dị, a na-ejikarị asụsụ mba ji eme ihe amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ. Nke a na-abakwuru ụmụaka uru n’ihi na a na-ebipụtakwu akwụkwọ na ihe ọgụgụ ndị ọzọ dịgasị iche iche n’asụsụ mba ji eme ihe. Ọ bụ ezie na klas ịmụ ịgụ na ide nke ọgbakọ pụrụ ịbụ ihe ntụkwasị nye akwụkwọ nwata na-agụ n’ụlọ akwụkwọ, ha apụghị iweghara ọnọdụ ịga akwụkwọ. Ya mere, ọ bụrụ na ọ dị otú o si kwe mee, ọ̀ bụ na ụmụaka ekwesịghị ịga akwụkwọ?

Ibu Ọrụ nke Ndị Mụrụ Ụmụ

Ndị ikom na-ebute ụzọ n’igbo mkpa ime mmụọ nke ọgbakọ kwesịrị ịbụ Ndị Kraịst na-esetịpụ ihe nlereanya. Ha kwesịrị ilekọta ezinụlọ ha na ụmụ ha “n’ụzọ dị mma.” (1 Timoti 3:4, 12) Ilekọta ezinụlọ anyị “n’ụzọ dị mma” ga-agụnye ime ihe ọ bụla kwere omume iji nyere ụmụ anyị aka izere ịbụ ndị ụwa ga-atụ n’ọnụ n’ọdịnihu.

Chineke enyewo ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ibu ọrụ dị ukwuu. Ha kwesịrị ịzụlite ụmụ ha n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu ya ma nyere ha aka ịghọ ‘ndị na-ahụ ihe ọmụma n’anya.’ (Ilu 12:1; 22:6; Ndị Efesọs 6:4) Pọl onyeozi dere, sị: “N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịakwa ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Anyị kwesịkwara ime ka ụmụ anyị gụọ akwụkwọ ruo ókè kwesịrị ekwesị.

Mgbe ụfọdụ, a dịghị amụ ihe nke ọma n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ụmụ akwụkwọ nọ na ya karịrị akarị, ụlọ akwụkwọ enweghị ngwá ọrụ zuru ezu, ma ọ bụ ikekwe n’ihi na obi adịghị ndị nkụzi mma, a dịghịkwa akwụpụta ha ụgwọ. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ndị nne na nna na-enwe ezi mmasị n’ihe ụmụ ha na-amụ n’ụlọ akwụkwọ. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịmara ndị nkụzi nke ụmụ gị, karịsịa ná mmalite nke àgbá agụmakwụkwọ ọ bụla, ọbụna na-agwa ha ka ha tụọrọ gị aro otú ụmụ gị pụrụ isi bụrụ ụmụ akwụkwọ na-eme nke ọma karị. Site n’ime otú a, ndị nkụzi pụrụ inwe mmetụta na e ji ha kpọrọ ihe ma bụrụ ndị a kwaliri imekwu mgbalị iji na-akụzikwuru ụmụaka ihe.

Agụmakwụkwọ bụ akụkụ dị oké mkpa nke uto nwata. “Ndị maara ihe na-akpakọba ihe ọmụma,” ka Ilu 10:14 na-ekwu. Nke a bụ eziokwu karịsịa banyere ihe ọmụma Bible. Ndị Jehova—ma ndị na-eto eto ma ndị agadi—aghaghị inwe ihe ọmụma ruo ókè o kwere mee iji na-enyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ na iji ‘na-eche onwe ha n’ihu Chineke dị ka ndị a nwapụtara anwapụta, ndị ọrụ nke na-enweghị ihe ha ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ (2 Timoti 2:15; 1 Timoti 4:15) Ya mere, ụmụ gị hà kwesịziri ịga akwụkwọ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekwubi na ha kwesịrị, ọ bụ ezie na ọ ga-adabere nke ukwuu n’ihe dị irè ná mba unu. Ma ọ dị ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst mkpa ịza ajụjụ a ka mkpa, ‘Ụmụ m hà kwesịrị ịgụ akwụkwọ?’ N’agbanyeghị ebe i bi, ọ̀ bụ na i kwetaghị na azịza ya kwesịrị ịbụ ee dara ụda?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Asụsụ ala nna ha bụ ma ọ́ bụghị olumba Galili bụ́ Aramaic, ọ bụrụ otu ụdị olumba nke asụsụ Hibru. Lee Mpịakọta nke 1, peeji nke 144-146, nke Insight on the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova pụtara.

^ par. 25 Lee Teta! nke January 8, 2001, peeji nke 19-21.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 12, 13]

Ọ Bụrụ Na O Kweghị Omume Ịga Akwụkwọ

Ịga akwụkwọ adịghị ekwe omume n’ọnọdụ ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ Refugees kọrọ na, n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ, ọ bụ nanị 1 nwata n’ime ụmụaka 5 ruru ịga akwụkwọ pụrụ ịga akwụkwọ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ịgba abụbọ ọrụ na-eme ka e mechie ụlọ akwụkwọ ruo ogologo oge. Ụlọ akwụkwọ pụrụ ịdị nnọọ anya ma ọ bụkwanụ ghara ịdị adị n’ógbè ụfọdụ. Mkpagbu a na-akpagbu Ndị Kraịst pụrụ ime ka a chụọ ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ.

Olee otú ị pụrụ isi nyere ụmụ gị aka n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ? Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ị mụrụ ọtụtụ ụmụ ma biri n’ógbè oké mmefu mere ka ọ ghara ikwe omume ka ha nile na-aga akwụkwọ? Ị̀ pụrụ inwe ike iziga otu ma ọ bụ abụọ n’ime ụmụ gị ụlọ akwụkwọ n’etinyeghị ha n’ihe ize ndụ ime mmụọ? Ya bụrụ otú ahụ, ha pụrụ inwe ike inye aka kụziere ụmụ gị ndị ọzọ ihe ha na-amụta n’ụlọ akwụkwọ.

Ná mba ụfọdụ, e nwere ihe a na-akpọ ịnọ n’ụlọ na-agụ akwụkwọ. * Ná ndokwa a, nne ma ọ bụ nna na-ejikarị awa ole na ole akụziri nwa ha ihe kwa ụbọchị. N’oge ndị nna ochie, ndị nne na nna nwere nnọọ ihe ịga nke ọma n’ịkụziri ụmụ ha ihe. Ikekwe n’ihi ọzụzụ dị mma nke nne na nna ya nyere ya, nwa Jekọb bụ́ Josef nwere ikike nke ilekọta ndị ọzọ mgbe ọ ka dị obere.

Usoro ihe ọmụmụ nke ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ usoro ihe omume nke izi ihe, pụrụ isi ike nnweta n’ebe ndị dị ka ogige ndị gbara ọsọ ndụ, ma ndị nne na nna pụrụ iji akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara na-eme ihe dị ka ihe ha ga-eji na-ezi ihe. Dị ka ihe atụ, Akwukwọm nke Akukọ Bible pụrụ ịbụ ihe enyemaka n’ịkụziri ụmụaka ihe. Magazin Teta! na-ebu isiokwu ndị metụtara ọtụtụ ihe. A pụrụ iji akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? kụzie ihe ndị metụtara sayensị. Yearbook of Jehovah’s Witnesses nwere obere map ụwa ma na-akọ banyere ndụ na ọrụ nkwusa n’ala dịgasị iche iche.

A pụrụ ịrụpụta ihe dị nnọọ mma ma ọ bụrụ na a kwadebe ihe ọmụmụ ahụ nke ọma ma mee ka o kwekọọ n’ikike nghọta nke nwatakịrị. Ọ bụrụ na ha anọgide na-agụ ihe ma na-amụ ihe, ọ ga-adịkwuru ha mfe ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ nke ụlọ akwụkwọ ma ọ bụrụ na e mesịa nwee ya. Site n’ibute ụzọ na itinye mgbalị, ị pụrụ inyere ụmụ gị aka ịgụ akwụkwọ. Lee ka nke ahụ pụrụ isi bụrụ ihe na-akwụghachi ụgwọ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 40 Lee isiokwu bụ́ “Ịnọ n’Ụlọ Na-agụ Akwụkwọ—Ọ̀ Dịịrị Gị?” na Teta! nke August 8, 1993, peeji nke 17-20.

[Foto]

Gịnị ka ị pụrụ ime ma ọ bụrụ na i bi n’ebe ụmụ gị na-apụghị ịgụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ?