Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Oge Mbụ Na Iwu Mozis

Ndị Kraịst Oge Mbụ Na Iwu Mozis

 Ndị Kraịst Oge Mbụ Na Iwu Mozis

“Iwu ahụ aghọwo onye nduzi anyị nke na-eduga na Kraịst.”—NDỊ GALESHIA 3:24.

1, 2. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime uru ndị Izrel bụ́ ndị ji nlezianya debe Iwu Mozis ritere?

NA 1513 T.O.A., Jehova nyere ụmụ Izrel usoro iwu. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha egee ntị n’olu ya, na ya ga-agọzi ha, ha ga-ebikwa ndụ obi ụtọ na nke na-eju afọ.—Ọpụpụ 19:5, 6.

2 Usoro Iwu ahụ, bụ́ nke a kpọrọ Iwu Mozis, ma ọ bụ nanị, “Iwu ahụ,” dị “nsọ, ziekwa ezi ma dị mma.” (Ndị Rom 7:12) O mere ka e nwee àgwà ọma ndị dị ka obiọma, ime ihe n’eziokwu, omume dị ọcha, na ịhụ onye agbata obi n’anya. (Ọpụpụ 23:4, 5; Levitikọs 19:14; Deuterọnọmi 15:13-15; 22:10, 22) Iwu ahụ kpalikwara ndị Juu ịhụ ibe ha n’anya. (Levitikọs 19:18) Tụkwasị na nke ahụ, ha na ndị Jentaịl, bụ́ ndị na-anọghị n’okpuru Iwu ahụ, agaghị na-akpakọrịta ma ọ bụ na-alụrịta di na nwunye. (Deuterọnọmi 7:3, 4) Dị ka “mgbidi” nke kewara ndị Juu na ndị Jentaịl, Iwu Mozis mere ka ndị Chineke ghara ịbụ ndị echiche na omume nke ndị na-ekpere arụsị metọrọ.—Ndị Efesọs 2:14, 15; Jọn 18:28.

3. Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye pụrụ idebe Iwu ahụ n’ụzọ zuru ezu, mmetụta dị aṅaa ka o nwere?

3 Otú ọ dị, ọbụna ndị Juu kasị elezi anya apụghị idebe Iwu Chineke n’ụzọ zuru ezu. Jehova ọ̀ na-atụ anya ihe ha na-agaghị emeli n’aka ha? Ee e. Otu n’ime ihe ndị mere e ji nye Izrel Iwu ahụ bụ “iji mee ka mmebi iwu pụta ìhè.” (Ndị Galeshia 3:19) Iwu ahụ mere ka ndị Juu nwere ezi obi mata na Onye Mgbapụta dị ha oké mkpa. Mgbe Onye ahụ bịara,  ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi ṅụrịrị ọṅụ. Mgbapụta ha pụọ n’ọbụbụ ọnụ nke mmehie na ọnwụ dị nso!—Jọn 1:29.

4. N’echiche dị aṅaa ka Iwu ahụ bụ ‘onye nduzi nke na-eduga na Kraịst’?

4 E bu n’uche ka Iwu Mozis bụrụ ndokwa ga-adịru nwa oge. Ka Pọl onyeozi na-edegara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, ọ kọwara ya dị ka ‘onye nduzi nke na-eduga na Kraịst.’ (Ndị Galeshia 3:24) Onye nduzi n’oge ochie na-eduga ụmụaka ụlọ akwụkwọ. Ọ bụghị ya bụ onye nkụzi; nanị ihe ọ na-eme bụ iduru ụmụaka dugara onye nkụzi. N’ụzọ yiri nke ahụ, e mere Iwu Mozis ka o duru ndị Juu na-atụ egwu Chineke dugara Kraịst. Jizọs kwere nkwa na ya ga-anọnyere ụmụazụ ya “ụbọchị nile ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe.” (Matiu 28:20) N’ihi ya, ozugbo e guzobere ọgbakọ Ndị Kraịst, “onye nduzi” ahụ—Iwu ahụ—abaghịzi uru. (Ndị Rom 10:4; Ndị Galeshia 3:25) Ma, ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst aghọtaghị eziokwu a dị oké mkpa ozugbo. N’ihi ya, ha nọgidere na-edebe akụkụ ụfọdụ nke Iwu ahụ ọbụna mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ. Otú ọ dị, ndị ọzọ gbanwere echiche ha. Site n’ime otú ahụ, ha setịpụụrụ anyị ezi ihe nlereanya taa. Ka anyị hụ otú ha si mee ya.

Nghọta Ọhụrụ Ndị E Nwere n’Ihe Banyere Nkwenkwe Ndị Kraịst

5. Ntụziaka dị aṅaa ka e nyere Pita n’ọhụụ, n’ihi gịnịkwa ka o ji wụọ ya akpata oyi n’ahụ́?

5 Na 36 O.A., Onye Kraịst bụ́ Pita onyeozi hụrụ ọhụụ dị ịrịba ama. N’oge ahụ, otu olu nke sitere n’eluigwe nyere ya iwu ka o gbuo ma rie ụmụ nnụnụ na ụmụ anụmanụ ndị e weere dị ka ndị na-adịghị ọcha n’okpuru Iwu ahụ. Nke ahụ wụrụ Pita akpata oyi n’ahụ́! Ọ dịbeghị mgbe o “riworo ihe ọ bụla rụrụ arụ na nke na-adịghị ọcha.” Ma olu ahụ gwara ya, sị: “Kwụsị ịkpọ ihe ndị Chineke meworo ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.” (Ọrụ 10:9-15) Kama isi ọnwụ ịnọgide na-agbaso Iwu ahụ, Pita gbanwere echiche ya. Nke a mere ka ọ chọpụta ihe dị ịtụnanya banyere nzube Chineke.

6, 7. Gịnị nyeere Pita aka ikwubi na ya nweziri ike ikwusara ndị Jentaịl ozi ọma, gịnị ọzọkwa ka o kwubiri ma eleghị anya?

6 Nke a bụ ihe merenụ. Ndị ikom atọ gara n’ụlọ Pita nọ na ya ịrịọ ya ka o soro ha gaa n’ụlọ otu onye Jentaịl na-atụ egwu Chineke nke a na-ebighị úgwù aha ya bụ Kọniliọs. Pita kpọbara ndị ikom ahụ n’ime ụlọ ma lee ha ọbịa. Ebe ọ ghọtaworo ihe ọhụụ ahụ pụtara, Pita sooro ha gawa n’ụlọ Kọniliọs n’echi ya. N’ebe ahụ, Pita gbara àmà nke ọma banyere Jizọs Kraịst. N’oge ahụ, Pita kwuru, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” Ọ bụghị nanị Kọniliọs gosipụtara okwukwe na Jizọs kamakwa ndị ikwu na ibe ya mere otú ahụ, ‘mmụọ nsọ dakwasịkwara ndị nile na-anụ okwu ahụ.’ N’ịchọpụta na aka Jehova dị na ya, Pita “nyere iwu ka e mee ha baptizim n’aha Jizọs Kraịst.”—Ọrụ 10:17-48.

7 Gịnị nyeere Pita aka ikwubi na ndị Jentaịl bụ́ ndị na-edobeghị onwe ha n’okpuru Iwu Mozis pụziri ịghọ ụmụazụ Jizọs Kraịst? Ọ bụ nghọta ime mmụọ. Ebe ọ bụ na Chineke egosiwo na ya nabatara ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù, wụsa ha mmụọ nsọ ya, Pita ghọtara na a pụrụ ikwere ka e mee ha baptizim. N’otu oge ahụ, o doro anya na Pita ghọtara na Chineke adịghị atụ anya ka ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst debe Iwu Mozis dị ka ihe a chọrọ n’aka ha tupu e mee ha baptizim. Ọ bụrụ na ị dị ndụ n’oge ahụ, ị̀ gaara adịwo njikere dị ka Pita ịgbanwe echiche gị?

Ụfọdụ Nọgidere Na-eso “Onye Nduzi” Ahụ

8. Echiche dị aṅaa banyere ibi úgwù nke dị iche na nke Pita ka ụfọdụ Ndị Kraịst bi na Jeruselem kwadoro, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

8 Mgbe Pita hapụsịrị ụlọ Kọniliọs, ọ gawara Jeruselem. Ọgbakọ nọ n’ebe ahụ anụwo na ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù ‘anatawo okwu Chineke,’ nke ahụ wekwara ọtụtụ ndị Juu na-eso ụzọ iwe. (Ọrụ 11:1-3) Ọ bụ ezie na “ndị na-akwado ibi úgwù” kweere na ndị Jentaịl  pụrụ ịghọ ụmụazụ Jizọs, ha siri ọnwụ na ndị a sitere ná mba ndị na-abụghị nke ndị Juu aghaghị idebe Iwu ahụ iji bụrụ ndị a ga-azọpụta. N’aka nke ọzọ, n’ógbè ebe ndị ka n’ọnụ ọgụgụ bụ ndị Jentaịl, bụ́ ebe ndị e nwere Ndị Kraịst ole na ole bụ́ ndị Juu, ibi úgwù abụchaghị nsogbu. A nọgidere na-enwe echiche abụọ ahụ ruo ihe dị ka afọ 13. (1 Ndị Kọrint 1:10) Lee ule nke ahụ na-aghaghị ịbụworo Ndị Kraịst oge mbụ ahụ—karịsịa ndị Jentaịl bi n’ógbè ndị Juu!

9. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka e dozie nsogbu ahụ metụtara ibi úgwù?

9 Nsogbu ahụ ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’ikpeazụ na 49 O.A. mgbe Ndị Kraịst si Jeruselem gara Antiọk nke Siria, bụ́ ebe Pọl nọ na-eme nkwusa. Ha malitere ịkụzi na a ghaghị ibi ndị Jentaịl a tọghatara úgwù dị ka Iwu ahụ si dị. Ha na Pọl na Banabas bịara nwee nnukwu nghọtahie na arụmụka! Ọ bụrụ na e dozighị nsogbu ahụ, ọ ga-eme ka ụfọdụ Ndị Kraịst, ma ha bụ ndị Juu ma ha bụ ndị Jentaịl, sụọ ngọngọ. N’ihi ya, e mere ndokwa ka Pọl na mmadụ ole na ole ndị ọzọ gaa Jeruselem ma gwa òtù na-achị isi nke Ndị Kraịst ka ha dozie nsogbu ahụ kpam kpam.—Ọrụ 15:1, 2, 24.

Echiche Dịrịtara Iche E Ji Ezi Obi Kwupụta—E Mesịa, E Nwee Ịdị n’Otu!

10. Gịnị bụ ụfọdụ isi ihe ndị òtù na-achị isi tụlere tupu ha emee mkpebi banyere ọnọdụ ndị Jentaịl?

10 N’otu nzukọ e nwere, ihe àmà na-egosi na ụfọdụ kwadoro ibi úgwù, ebe ndị ọzọ kwupụtara echiche megidere nke ahụ. Ma ha anọgideghị na-arụ ụka ụbọchị ahụ dum. Mgbe ha rụsịrị ụka ruo ogologo oge, ndịozi bụ́ Pita na Pọl kọwara ihe ịrịba àmà ndị Jehova mere n’etiti ndị a na-ebighị úgwù. Ha kọwara na Chineke awụsawo mmụọ nsọ ya n’ahụ́ ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha jụrụ, sị, ‘Ọgbakọ Ndị Kraịst ọ̀ pụrụ izi ezi ịjụ ndị Chineke n’onwe ya nabatara?’ Mgbe e mesịrị, Jems onye na-eso ụzọ gụrụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ nke nyeere mmadụ nile nọ n’ebe ahụ aka ịghọta ihe bụ́ uche Jehova n’okwu ahụ.—Ọrụ 15:4-17.

11. Olee ihe na-emetụtaghị mkpebi ahụ e mere n’ihe banyere obibi úgwù, gịnịkwa na-egosi na Jehova gọziri mkpebi ahụ?

11 Ọ bụzi òtù na-achị isi ka e lekwasịrị anya. Ọbụbụ ha bụ ndị Juu ọ̀ ga-eme ka ha kpebie n’ụzọ na-ezighị ezi ịkwado obibi úgwù? Ee e. Ndị ikom a kwesịrị ntụkwasị obi kpebisiri ike ịgbaso ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru na nduzi nke mmụọ nsọ Chineke. Mgbe òtù na-achị isi nụsịrị ihe akaebe nile ndị dị mkpa, ha kwekọrịtara na ọ dịghị mkpa ka e bie ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst úgwù nakwa na ọ dịghị mkpa ka ha bata n’okpuru Iwu Mozis. Mgbe ụmụnna nụrụ ihe ha kpebiri, ha ṅụrịrị ọṅụ, ọgbakọ dị iche iche malitekwara ‘ịba ụba n’ọnụ ọgụgụ site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.’ Ndị Kraịst ahụ  bụ́ ndị nakweere ntụziaka doro anya nke ọchịchị Chineke, nwetara azịza gbara ọkpụrụkpụ nke sitere n’Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 15:19-23, 28, 29; 16:1-5) N’agbanyeghị nke ahụ, a ka nwere ajụjụ dị mkpa a na-azabeghị.

Gịnị Banyere Ndị Juu Bụ́ Ndị Kraịst?

12. Olee ajụjụ a na-azabeghị?

12 Òtù ahụ na-achị isi egosiwo n’ụzọ doro anya na ọ dịghị mkpa ka e bie ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst úgwù. Ma gịnị banyere ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst? Mkpebi ahụ òtù na-achị isi mere edozighị kpọmkwem akụkụ a nke nsogbu ahụ.

13. Gịnị mere na o zighị ezi ikwu na idebe Iwu Mozis dị mkpa maka nzọpụta?

13 Ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst, bụ́ ndị ‘na-anụrụ Iwu ahụ ọkụ n’obi,’ nọgidere na-ebi ụmụ ha úgwù ma na-edebe akụkụ ụfọdụ nke Iwu ahụ. (Ọrụ 21:20) Ndị ọzọ mere ihe karịrị nke ahụ, ọbụna na-esi ọnwụ na ọ dị mkpa ka ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst debe Iwu ahụ iji bụrụ ndị a ga-azọpụta. Ha hiere nnọọ ụzọ na nke a. Dị ka ihe atụ, olee otú onye ọ bụla bụ́ Onye Kraịst pụrụ isi na-achụ àjà ụmụ anụmanụ maka mgbaghara mmehie? Àjà Kraịst emewo ka àjà ndị dị otú ahụ bụrụ ihe mgbe ochie. Gịnị banyere ihe Iwu ahụ chọrọ bụ́ ka ndị Juu zere iso ndị Jentaịl na-akpakọrịta? Ọ gaara esiworo Ndị Kraịst na-ezisa ozi ọma bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi ike irube isi n’ihe mgbochi ndị dị otú ahụ ma na-arụzukwa ọrụ e nyere ha bụ́ ịkụziri ndị Jentaịl ihe nile Jizọs kụziri.  (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8; 10:28) * E nweghị ihe àmà ọ bụla gosiri na e doziri okwu a ná nzukọ nke òtù na-achị isi. N’agbanyeghị nke ahụ, a hapụghị ọgbakọ ahụ n’enyereghị ha aka.

14. Nduzi dị aṅaa ka akwụkwọ ozi Pọl ji ike mmụọ nsọ dee nyere n’ihe banyere Iwu ahụ?

14 E nyere nduzi, ọ bụghị n’ụdị akwụkwọ ozi sitere n’aka òtù na-achị isi, kama n’ụdị nke akwụkwọ ozi sitere n’ike mmụọ nsọ nke ndịozi dere. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi zigaara ndị Juu na ndị Jentaịl bi na Rom otu ozi kpụ ọkụ n’ọnụ. N’akwụkwọ ozi o degaara ha, ọ kọwara na ‘onye Juu n’ime bụ ya bụ ezigbo onye Juu, ibi úgwù ya bụkwa nke obi site na mmụọ.’ (Ndị Rom 2:28, 29) N’otu akwụkwọ ozi ahụ, Pọl ji otu ihe atụ gosi na Ndị Kraịst anọghịzi n’okpuru Iwu ahụ. O kwuru na nwanyị apụghị ịlụ di abụọ n’otu oge. Ma, ọ bụrụ na di ya anwụọ, o nweere onwe ya ịlụgharị di. Pọl kọwaziri ihe atụ ahụ, na-egosi na Ndị Kraịst e tere mmanụ apụghị ido onwe ha n’okpuru Iwu Mozis ma bụrụ nke Kraịst n’otu oge ahụ. Ha aghaghị ‘ịnwụ n’ebe Iwu ahụ dị’ ka ha wee nwee ike ịbụ ndị ha na Kraịst dị n’otu.—Ndị Rom 7:1-5.

O Were Ha Oge Iji Ghọta Ihe A Na-ekwu

15, 16. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst na-ejighị ghọta ihe e kwuru banyere Iwu ahụ, gịnịkwa ka nke a na-egosi banyere mkpa ọ dị ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

15 Ihe Pọl kwuru banyere Iwu ahụ enweghị  mgbagha. Gịnịzi mere ụfọdụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst aghọtaghị ihe ọ na-ekwu? Otu ihe kpatara ya bụ na ha enweghị nghọta ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, ha hapụrụ iri nri ime mmụọ siri ike. (Ndị Hibru 5:11-14) Ha adịghịkwa agachi nzukọ Ndị Kraịst anya. (Ndị Hibru 10:23-25) Ihe ọzọ mere ụfọdụ aghọtaghị ihe a na-ekwu pụrụ ịbụ n’ihi otú Iwu ahụ n’onwe ya dị. Ọ dabeere n’ihe ndị a pụrụ ịhụ anya ma na-emetụ aka, dị ka ụlọ nsọ ahụ na òtù ndị nchụàjà. Ọ dị nnọọ mfe onye na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe ịnakwere Iwu ahụ karịa ịnakwere ụkpụrụ ndị ka mie emie nke Iso Ụzọ Kraịst, bụ́ nke dabeere n’ihe ndị dị adị a na-adịghị ahụ anya.—2 Ndị Kọrint 4:18.

16 Ihe ọzọkwa mere ụfọdụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst ji na-achọsi ike idebe Iwu ahụ bụ ihe Pọl depụtara n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Galeshia. Ọ kọwara na ndị a chọrọ ka a na-ele ha anya dị ka ndị e kwesịrị ịkwanyere ùgwù, dị ka ndị so n’okpukpe a ma ama. Kama ịgbapụ iche n’obodo ha, ha dị njikere ịnakwere ihe ọ bụla iji bụrụ ndị a na-anabata n’obodo. Ha nwere mmasị n’inweta ihu ọma mmadụ karịa n’inweta ihu ọma Chineke.—Ndị Galeshia 6:12.

17. Olee mgbe a bịara ghọta ihe bụ́ echiche kwesịrị ekwesị banyere idebe Iwu ahụ?

17 Ndị Kraịst nwere nghọta bụ́ ndị ji nlezianya mụọ ihe ndị Pọl na ndị ọzọ ji ike mmụọ nsọ dee ruru ná nkwubi okwu ziri ezi banyere Iwu ahụ. Otú ọ dị, ọ bụ nanị na 70 O.A. ka ndị Juu nile bụ́ Ndị Kraịst bịara ghọta ihe bụ́ echiche kwesịrị nnọọ ekwesị banyere Iwu Mozis. Nke ahụ mere mgbe Chineke kwere ka e bibie Jeruselem, ụlọ nsọ ya, na ihe ndekọ dị iche iche banyere òtù ndị nchụàjà ya. Nke a mere ka ọ ghara ikwe mmadụ ọ bụla omume idebe akụkụ nile nke Iwu ahụ.

Itinye Ihe Mmụta Dị na Ya n’Ọrụ Taa

18, 19. (a) Àgwà ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị inwe, àgwà ndị dịkwa aṅaa ka anyị na-aghaghị izere, iji nọgide na-agbasi ike n’ụzọ ime mmụọ? (b) Gịnị ka ihe nlereanya Pọl na-akụziri anyị banyere ịgbaso ntụziaka anyị na-enweta site n’aka ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ? (Lee igbe dị na peeji nke 24.)

18 Ka anyị tụlesịrị ihe a mere ogologo oge gara aga, eleghị anya ị na-eche, sị: ‘Ọ bụrụ na adị m ndụ n’oge ahụ, olee otú m gaara esi emeghachi omume ka e ji nwayọọ nwayọọ na-ekpughe uche Chineke? Àgaara m esi ọnwụ ịnọgide na-enwe echiche ndị m nweburu? Ka àgaara m enwewo ndidi ruo mgbe nghọta kwesịrị ekwesị doro anya? Mgbe nke ahụ mere, àgaara m eji obi m nile kwado ya?’

19 N’ezie, anyị apụghị ijide n’aka otú anyị gaara esiwo emeghachi omume ma a sị na anyị dị ndụ laa azụ n’oge ahụ. Ma anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee otú m na-esi emeghachi omume banyere ihe ndị e mere ka ha doo anya ná nghọta Bible mgbe e mere ka anyị mara ha taa? (Matiu 24:45) Mgbe e nyere nduzi dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, àna m agbalị itinye ya n’ọrụ, na-agbaso, ọ bụghị nanị akụkụ nile nke ihe ndị e nyere n’iwu kama, mmụọ e ji nye ya? (1 Ndị Kọrint 14:20) Àna m eji ndidi echere Jehova mgbe o yiri ka azịza nye ajụjụ ndị na-enye nsogbu n’obi adịghị abịa ngwa ngwa?’ Ọ dị oké mkpa ka anyị na-eri nri ime mmụọ e nwere taa, ka “anyị wee ghara ịkpafu mgbe ọ bụla.” (Ndị Hibru 2:1) Ka anyị na-ege ntị nke ọma mgbe Jehova na-enye nduzi site n’Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na nzukọ elu ala ya. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, Jehova ga-eji ndụ ebighị ebi nke na-enye ma obi ụtọ ma afọ ojuju gọzie anyị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Mgbe Pita gara Antiọk nke Siria, o soro ndị kwere ekwe bụ́ ndị Jentaịl nwee mkpakọrịta na-ekpo ọkụ. Otú ọ dị, mgbe ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst si Jeruselem bịa, Pita “wezụgara ma kewapụ onwe ya, n’ihi egwu nke ndị ahụ e biri úgwù.” Anyị pụrụ iji anya nke uche hụ otú nke ahụ na-aghaghị isiwo wute ndị ahụ kwere ekwe bụ́ ndị Jentaịl mgbe onyeozi a a na-akwanyere ùgwù jụrụ iso ha rie ihe.—Ndị Galeshia 2:11-13.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• N’echiche dị aṅaa ka Iwu Mozis dị ka ‘onye nduzi nke na-eduga na Kraịst’?

• Olee ihe ị pụrụ ikwu na ọ bụ ya kpatara ọdịiche ndị e nwere n’ụzọ Pita na “ndị na-akwado ibi ùgwù” si meghachi omume ná mgbanwe ndị e nwere ná nghọta nke eziokwu ahụ?

• Gịnị ka ị mụtaworo banyere ụzọ Jehova si ekpughe eziokwu ahụ taa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

Pọl Ejiri Obi Umeala Merie Ule

Mgbe Pọl mesịrị njem ozi ala ọzọ gara nke ọma, ọ gara Jeruselem na 56 O.A. Ule nọ na-echere ya n’ebe ahụ. Akụkọ na ọ nọwo na-akụzi na e wezụgawo Iwu ahụ n’akụkụ eruwo n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ. Ụjọ ji ndị okenye na nkwuwa okwu Pọl n’ihe banyere Iwu ahụ ga-eme ka ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ sụọ ngọngọ nakwa na ha pụrụ ikwubi na Ndị Kraịst adịghị akwanyere ndokwa Jehova ùgwù. N’ọgbakọ ahụ, e nwere ndị Juu anọ bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị kwere Chineke nkwa, ikekwe ha kwere nkwa ijere ya ozi dị ka ndị Nazịraịt. Ha aghaghị ịga n’ụlọ nsọ iji mezuo nkwa ha.

Ndị okenye ahụ gwara Pọl ka o duga mmadụ anọ ahụ n’ụlọ nsọ ma hụ maka mmefu ha. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, Pọl edewo akwụkwọ ozi abụọ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ ebe o kwuru na idebe Iwu ahụ adịghị mkpa maka nzọpụta. Otú ọ dị, o chebaara akọ na uche ndị ọzọ echiche. O dewo na mbụ, sị: “N’ebe ndị nọ n’okpuru iwu nọ, adịrị m ka onye nọ n’okpuru iwu . . . ka m wee rite ndị nọ n’okpuru iwu n’uru.” (1 Ndị Kọrint 9:20-23) Ọ bụ ezie na Pọl adịtụghị ekwenye n’ihe megidere ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị oké mkpa, o chere na ya pụrụ ime ihe ndị okenye tụrụ n’aro. (Ọrụ 21:15-26) Ọ dịghị njọ ya ime otú ahụ. Ọ dịghị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru megide ndokwa e mere maka ikwe Chineke nkwa, e jibuwokwa ụlọ nsọ ahụ mee ihe maka ezi ofufe, ọ bụghị maka ikpere arụsị. Ya mere, iji ghara ime ihe ga-akpata ịsụ ngọngọ, Pọl mere ihe a gwara ya. (1 Ndị Kọrint 8:13) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a chọrọ oké obi umeala n’aka Pọl, nke bụ́ ihe mere anyị ji kwesị ịkwanyekwuru ya ùgwù.

[Foto dị na peeji nke 22, 23]

Ruo afọ ụfọdụ, Ndị Kraịst nọgidere na-enwe echiche ndị dịrịtara iche banyere Iwu Mozis