Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gbalịa Ịdị Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele ha

Gbalịa Ịdị Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele ha

 Gbalịa Ịdị Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele ha

“Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ.”—1 SAMUEL 16:7.

1, 2. Olee otú ụzọ Jehova si lee Elaịab anya si dị iche n’ụzọ Samuel si lee ya anya, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta na nke a?

NA NARỊ afọ nke 11 T.O.A., Jehova zigara Samuel onye amụma ozi nzuzo. Ọ gwara onye amụma ahụ ka ọ gaa n’ụlọ otu nwoke aha ya bụ Jesi ma tee otu n’ime ụmụ ndị ikom Jesi mmanụ ịbụ eze Izrel n’ọdịnihu. Mgbe Samuel hụrụ ọkpara Jesi, bụ́ Elaịab, obi siri ya ike na ya ahụla onye Chineke họọrọ. Ma Jehova kwuru, sị: “Elegidela ihu ya anya, elegidekwala ogologo nke ịdị elu ya; n’ihi na ajụwo m ya: n’ihi na Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.” (1 Samuel 16:6, 7) Samuel ahụghị Elaịab otú Jehova si hụ ya. *

2 Lee nnọọ ka o si dị mfe ụmụ mmadụ ihie ụzọ n’otú ha si atụ ndị ọzọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀! N’otu akụkụ, anyị pụrụ ịbụ ndị ndị yiri ka ha bụ ezigbo mmadụ ma jọọ njọ n’omume duhiere. N’aka nke ọzọ, anyị pụrụ ịbụ ndị na-agba isi akwara ma ghara ịdị na-agbanwe obi anyị n’otú anyị si ele ndị nwere ezi obi bụ́ ndị àgwà ha na-akpasu anyị iwe anya.

3, 4. (a) Ọ bụrụ na nsogbu ebilite n’etiti Ndị Kraịst abụọ, gịnị ka onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị ikpebisi ike ime? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị mgbe anyị na onye kwere ekwe ibe anyị sere ezigbo okwu?

3 Nsogbu pụrụ ibilite mgbe anyị na-adị ngwa n’ikpe ndị ọzọ ikpe—ọbụna ndị anyị mawooro eri ọtụtụ afọ. Ikekwe gị na Onye Kraịst bụ́bu ezigbo enyi gị esewo ezigbo okwu. Ị̀ ga-achọ idozi esemokwu ahụ? Gịnị ga-enyere gị aka ime nke a?

4 Gịnị ma i leruo nwanna gị nwoke ma ọ bụ nwanyị bụ́ Onye Kraịst anya n’ụzọ ziri ezi ruo ogologo oge? Na-emekwa nke a na-eburu n’uche okwu Jizọs bụ́: “Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.” (Jọn 6:44) Mgbe ahụ jụọ onwe gị, sị: ‘N’ihi gịnị ka Jehova ji dọtara Ọkpara Ya onye a? Àgwà ndị dị aṅaa mara mma ka onye a nwere? Ànọwo m na-eleghara àgwà ndị a anya ma ọ bụ na-ele ha anya dị ka ndị na-abachaghị uru? Gịnị medịrị anyị jibu bụrụ enyi? Gịnị mere m ji nwee mmasị n’ebe onye a nọ?’ Ná mmalite, ọ pụrụ isiri gị ike icheta àgwà ya ndị dị mma, karịsịa ma ọ bụrụ na ị nọwo na-ebu iwe n’obi ruo oge ụfọdụ. Otú ọ dị, nke a bụ nzọụkwụ dị oké mkpa n’idozi ihe na-esere unu abụọ. Iji gosi otú a  pụrụ isi mee nke a, ka anyị lee ma anyị ga-ahụ àgwà ndị dị mma n’ebe ndị ikom abụọ a na-ele anya ọjọọ mgbe ụfọdụ nọ. Ha bụ Jona onye amụma na Pita onyeozi.

Iji Obi Ọcha Lee Jona Anya

5. Ọrụ dị aṅaa ka e nyere Jona, oleekwa otú o si meghachi omume?

5 Jona jere ozi dị ka onye amụma n’alaeze ebe ugwu nke Izrel n’oge Eze Jeroboam nke Abụọ, bụ́ nwa Jehoash. (2 Ndị Eze 14:23-25) Otu ụbọchị, Jehova gwara Jona ka ọ hapụ Izrel gaa Nineve, bụ́ isi obodo nke Alaeze Ukwu Asiria dị ike. Gịnị ka e zigara ya ime? Ọ bụ ịga dọọ ndị bi n’obodo ahụ aka ná ntị na a na-aga ibibi nnukwu obodo ha. (Jona 1:1, 2) Kama ịgbaso ntụziaka Chineke, Jona gbalagara! Ọ banyere n’ụgbọ mmiri na-aga Tashish, bụ́ ebe dị nnọọ anya site na Nineve.—Jona 1:3.

6. N’ihi gịnị ka Jehova ji họrọ Jona ịga Nineve?

6 Gịnị na-abata gị n’uche mgbe i chetara Jona? Ị̀ na-ewere ya dị ka onye amụma nupụrụ isi? Ị pụrụ ikwubi otú ahụ ma i lee ya anya elu elu. Ma, Chineke ọ̀ họpụtara Jona dị ka onye amụma n’ihi na ọ na-enupụ isi? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ ghaghị ịbụ na Jona nwere àgwà ụfọdụ mara mma. Tụlee ihe ndị ọ rụrụ dị ka onye amụma.

7. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Jona nọworo na-ejere Jehova ozi n’Izrel, oleekwa otú ịmara nke a si emetụta otú i si ele ya anya?

7 N’ezie, Jona ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi gbasie mbọ ike n’Izrel, bụ́ ókèala ndị bi na ya na-adịghị aṅa ntị. Emọs onye amụma, bụ́ onye dịrị ndụ n’ihe dị ka n’otu oge ahụ Jona dịrị ndụ, kọwara ndị Izrel nke oge ahụ dị ka ndị hụrụ ihe onwunwe na ihe ụtọ n’anya. * Ihe ọjọọ nọ na-eme n’ala ahụ, ma ndị Izrel achọdịghị ịma. (Emọs 3:13-15; 4:4; 6:4-6) N’agbanyeghị nke ahụ, kwa ụbọchị, Jona ji  ikwesị ntụkwasị obi na-arụ ọrụ ya nke izisara ha ozi. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-ekwusa ozi ọma, ị maara otú o si esi ike ịgwa ndị onwe ha juru afọ na ndị na-enweghị mmasị okwu. Ya mere, ka anyị na-ekweta na Jona nwere adịghị ike, ka anyị cheta àgwà ya nke ikwesị ntụkwasị obi na ntachi obi ka ọ na-ezisara ndị Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi ozi.

8. Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka onye amụma bụ́ onye Izrel ga-eche ihu na Nineve?

8 Ozi e dunyere ya na Nineve gụnyere ihe ịma aka siri ike ọbụna karị. Iji ruo n’obodo ahụ, Jona aghaghị iji ụkwụ gaa ihe dị ka kilomita 800—njem tara akpụ nke ga-ewe ihe dị ka otu ọnwa. Ozugbo onye amụma a ruru ebe ahụ, ọ ghaghị izisara ndị Asiria ozi, bụ́ ndị e ji omume obi ọjọọ mara. E ji iji obi ọjọọ emekpọ ndị mmadụ ọnụ mara ibu agha ha. Ọbụna ha ji ime ihe ike ha etu ọnụ. Ka a sịkwa ihe mere e ji kpọọ Nineve “obodo ọbara”!—Nehum 3:1, 7.

9. Mgbe oké ifufe yiri ndị ọkwọ ụgbọ mmiri ahụ egwu, àgwà ndị dị aṅaa ka Jona gosipụtara?

9 N’ịla azụ irube isi n’iwu Jehova, Jona banyere ụgbọ mmiri nke buuru ya gawa n’ebe dị nnọọ anya site n’ebe e kenyere ya ọrụ. Otú o sina dị, Jehova ajụghị onye amụma ya ma ọ bụ mee ndokwa ka onye ọzọ nọchie anya ya. Kama nke ahụ, Jehova mere ihe iji mee ka anya doo Jona. Chineke mere ka oké ifufe fekwasị oké osimiri ahụ. Ebili mmiri bugharịrị ụgbọ mmiri ahụ bu Jona. Ndị ikom aka ha dị ọcha na-aga ịnwụ n’ihi ihe Jona metara! (Jona 1:4) Gịnị ka Jona ga-eme? N’ịbụ onye na-achọghị ka ndị ọkwọ ụgbọ mmiri nọ n’ụgbọ mmiri ahụ nwụọ n’ihi ya, Jona gwara ha, sị: “Bulienụ m, tụba m n’oké osimiri; oké osimiri ewee dajụọ ghara ịmakwasị unu.” (Jona 1:12) O nweghị ihe mere ọ ga-eji chee na Jehova ga-anapụta ya n’oké osimiri ahụ mgbe ndị ọkwọ ụgbọ mmiri ahụ mesịrị tụba ya n’oké osimiri. (Jona 1:15) Otú ọ dị, Jona dị njikere ịtụfu ndụ ya ka ndị ọkwọ ụgbọ mmiri ahụ ghara ịnwụ. Ọ̀ bụ na anyị ahụghị nke a dị ka omume na-egosi obi ike, ịdị umeala n’obi, na ịhụnanya?

10. Gịnị mere mgbe Jehova nyeghachiri Jona ọrụ ya?

10 N’ikpeazụ, Jehova napụtara Jona. Ihe ndị a Jona mere hà mere ka ọ ghara irukwa eru ọzọ ijere Chineke ozi dị ka onye nnọchianya ya? Ee e, Jehova ji obi ebere na ịhụnanya nyeghachi onye amụma ahụ ọrụ ịga zisaara ndị Nineve ozi. Mgbe Jona rutere Nineve, o ji obi ike gwa ndị bi n’ebe ahụ na Chineke amarawo banyere oké ihe ọjọọ ha nakwa na a gaje ibibi obodo ha n’ime ụbọchị 40. (Jona 1:2; 3:4) Mgbe ndị Nineve nụsịrị ozi Jona ziri n’ezoghị ọnụ, ha chegharịrị, e bibighịkwa obodo ha.

11. Gịnị na-egosi na Jona mụtara ihe bara uru?

11 N’agbanyeghị nke ahụ, Jona eleghị ihe anya n’ụzọ ziri ezi. Otú ọ dị, site n’iji ihe atụ a na-ahụ anya mee ihe, Jehova ji ndidi nyere Jona aka ịmụta na ya na-ahụ ihe karịrị ọdịdị elu ahụ́. Ọ na-enyocha obi. (Jona 4:5-11) Ihe Jona dekọrọ n’onwe ya n’ezoghị ihe ọ bụla bụ ihe àmà na-egosi na ọ mụtara ihe bara uru. Njikere ọ dị idenyecha ihe nile na-eme ihere banyere adịghị ike ya gosikwuru na ọ dị umeala n’obi. Ọ na-achọ obi ike mmadụ ikwere na ya mehiere ihe!

12. (a) Olee otú anyị si mara na Jizọs na-ele ndị mmadụ anya otú Jehova si ele ha? (b) Echiche dị aṅaa ka a na-agba anyị ume inwe banyere ndị anyị na-ekwusara ozi ọma? (Lee igbe dị na peeji nke 18.)

12 Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, Jizọs Kraịst kwuru okwu dị mma banyere otu ihe mere n’oge ndụ Jona. Ọ sịrị: “Dị nnọọ ka Jona nọrọ n’afọ nnukwu azụ ụbọchị atọ ehihie na abalị, otú ahụ ka Nwa nke mmadụ ga-anọ n’ime ala ụbọchị atọ ehihie na abalị.” (Matiu 12:40) Mgbe a ga-akpọlite Jona n’ọnwụ, ọ ga-amata na Jizọs ji oge Ọ nọrọ n’ili tụnyere oge ahụ  onye amụma a nọ n’arụghị ọrụ. Ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe obi ụtọ ijere Chineke nke na-adịghị ajụ ndị ohu ya mgbe ha hiere ụzọ, ozi? Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ́ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ́ ndị na-atụ egwu Ya. N’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:13, 14) N’ezie, “ájá” a—gụnyere ndị mmadụ na-ezughị okè taa—pụrụ ịrụzu ihe dị ukwuu site ná nkwado nke mmụọ nsọ Chineke!

Echiche Kwesịrị Ekwesị Banyere Pita

13. Olee àgwà Pita ndị pụrụ ịgbabata n’uche, ma n’ihi gịnị ka Jizọs ji họrọ ya dị ka onyeozi?

13 Ugbu a ka anyị tụlee ná mkpirikpi ihe atụ nke abụọ, nke Pita onyeozi. Ọ bụrụ na a sị gị kọwaa Pita, ihe ga-abata gị n’uche ozugbo ọ̀ bụ àgwà ndị dị ka ime ihe ọkụ ọkụ, inwe obi ọkụ, na ọbụna mmadụ amaghị ebe ike ya ruru? N’ezie, Pita gosipụtara àgwà ndị dị otú ahụ n’oge ụfọdụ. Otú ọ dị, Jizọs ọ̀ gaara ahọrọ Pita dị ka otu n’ime ndịozi 12 ya ma ọ bụrụ na Pita bụ n’ezie onye na-eme ihe ọkụ ọkụ, onye nwere obi ọkụ, ma ọ bụ onye na-amaghị ebe ike ya ruru? (Luk 6:12-14) Ọ dịghị ma ọlị! O doro anya na Jizọs leghaara adịghị ike ndị a anya ma chọpụta àgwà ọma nke Pita.

14. (a) Gịnị pụrụ imewo ka Pita nwee nkwuwa okwu o yiri ka o nwere? (b) N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị inwe ekele na Pita jụrụ ajụjụ ọtụtụ mgbe?

14 Mgbe ụfọdụ Pita rụrụ ọrụ dị ka ọnụ na-ekwuchitere ndịozi ndị ọzọ. Ụfọdụ pụrụ ile nke a anya dị ka ihe àmà na-egosi na ọ maghị ebe ike ya ruru. Ma ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ezie? Ụfọdụ ndị ekwuwo na ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ Pita tọchara ndịozi ndị ọzọ—ikekwe tọkwuo Jizọs n’onwe ya. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu, nke a pụrụ ịbụ ya mere Pita ji abụkarị onye mbụ na-ekwu okwu. (Matiu 16:22) Otú ọ dị, ọ dị ihe ọzọ e kwesịrị ichebara echiche. Pita bụ nwoke ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe. Ọchịchọ siri ike o nwere inweta ihe ọmụma kpaliri ya ịjụ ajụjụ. Ajụjụ ndị a abaworo anyị uru. Jizọs kwuru ọtụtụ okwu ndị dị oké mkpa ka ọ na-aza ajụjụ dị iche iche Pita jụrụ, e dekọwokwa ha na Bible. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ka Jizọs na-aza ajụjụ Pita ka O kwuru okwu banyere “onye ahụ na-elekọta ụlọ nke na-ekwesị ntụkwasị obi.” (Luk 12:41-44) Cheekwa echiche banyere ajụjụ Pita jụrụ, sị: “Anyị ahapụwo ihe nile ma soro gị; gịnịkwanụ gaje ịbụ nke anyị?” Nke a mere Jizọs ji kwe nkwa a na-emesi obi ike: “Onye ọ bụla nke hapụwokwara ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị nke ahụ ọtụtụ ugboro, ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi.”—Matiu 15:15; 18:21, 22; 19:27-29.

15. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Pita na-eguzosi ike n’ihe n’ezie?

15 Pita nwere àgwà ọzọ mara mma—ọ na-eguzosi ike n’ihe. Mgbe ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-eso ụzọ kwụsịrị iso Jizọs n’ihi na ha aghọtaghị otu n’ime ozizi ya, ọ bụ Pita bụ onye kwuchitere ọnụ ndịozi 12 ahụ ma sị: “Onyenwe  anyị, ònye ka anyị ga-agakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:66-68) Lee ka okwu ndị ahụ na-aghaghị isiwo mee ka obi dị Jizọs ụtọ! Mgbe e mesịrị, mgbe ìgwè na-eme ihe ike bịara ijide Nna ha Ukwu, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndịozi ahụ gbalagara. Otú ọ dị, Pita sooro ìgwè mmadụ ahụ n’azụ azụ banye kpọmkwem na mbara èzí nke nnukwu onye nchụàjà. Ọ bụ obi ike, ọ bụghị ụjọ, mere o ji banye n’ebe ahụ. Ka a nọ na-agba Jizọs ajụjụ ọnụ, Pita sonyeere ìgwè ndị Juu na-anya ọkụ na-enwusi ike. Otu n’ime ndị ohu nke nnukwu onye nchụàjà ahụ matara ya ma boo ya ebubo na ya na Jizọs anọwo. Ee, Pita gọnahụrụ Nna ya Ukwu, ma ka anyị ghara ichezọ na ọ bụ iguzosi ike n’ihe na nchegbu Pita nwere maka Jizọs tinyere ya n’ọnọdụ ahụ dị ize ndụ, bụ́ nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndịozi ahụ na-anwaghị anwa ịbanye.—Jọn 18:15-27.

16. N’ihi nzube dị aṅaa bara uru ka anyị jiworo tụlee àgwà ndị ziri ezi nke Jona na Pita?

16 Àgwà ọma Pita karịrị nnọọ adịghị ike ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa Jona. Dị nnọọ ka anyị leworo Jona na Pita anya n’ụzọ ziri nnọọ ezi karịa ka anyị pụrụ ilebu ha, n’otu aka ahụ, anyị aghaghị ịzụ onwe anyị ilekwu ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ anyị nke oge a anya n’ụzọ ziri ezi. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị na ha dịkwuo ná mma. N’ihi gịnị ka nke a ji dị nnọọ mkpa?

Itinye Ihe Mmụta Dị na Ha n’Ọrụ Taa

17, 18. (a) N’ihi gịnị ka esemokwu pụrụ iji bilite n’etiti Ndị Kraịst? (b) Olee ndụmọdụ Bible nke pụrụ inyere anyị aka idozi nghọtahie nke anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị?

17 Ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka ndị ọnọdụ akụ̀ na ụba na nke agụmakwụkwọ ha dịgasị iche iche, bụ́kwa ndị si n’agbụrụ nile, na-ejere Jehova ozi n’ịdị n’otu taa. (Mkpughe 7:9, 10) Lee ka ndị anyị na-ahụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst si bụrụ ndị nwere àgwà dịgasị iche iche! Ebe ọ bụ na anyị na-efekọ Chineke ọnụ, ọ bụ iwu na a ga-enwe nghọtahie mgbe ụfọdụ.—Ndị Rom 12:10; Ndị Filipaị 2:3.

18 Ọ bụ ezie na anyị na-ahụ ezughị okè nke ụmụnna anyị, anyị adịghị elekwasị ha anya. Anyị na-agbalị iṅomi Jehova bụ́ onye ọbụ abụ ahụ bụrụ banyere ya, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Kama ilekwasị anya n’àgwà ndị pụrụ ikewa anyị, anyị “na-achụso ihe ndị na-akpata udo na ihe ndị na-ewuli ibe anyị elu.” (Ndị Rom 14:19) Anyị na-agbalị ile ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha, na-eleghara adịghị ike ha anya ma na-elekwasị anya n’àgwà ọma ha. Mgbe anyị mere nke a, ọ na-enyere anyị aka ‘ịnọgide na-anagiderịta ibe anyị.’—Ndị Kọlọsi 3:13.

19. Kwuo nzọụkwụ ndị dị irè Onye Kraịst pụrụ iwere n’idozi ezigbo nghọtahie.

19 Gịnị ma ọ bụrụ na e nwee nghọtahie nke anyị na-apụghị nnọọ iwepụ n’obi anyị? (Abụ Ọma 4:4) Nke a ò mewo n’etiti gị na onye kwere ekwe ibe gị? Gịnị ma ị gbalịa idozi esemokwu ahụ? (Jenesis 32:13-15) Buru ụzọ jekwuru Jehova n’ekpere, na-arịọ maka nduzi ya. E mesịa, n’iburu àgwà ọma ndị onye ahụ nwere n’uche, jiri “ịdị nwayọọ nke dịịrị amamihe” jekwuru ya. (Jems 3:13) Gwa ya na ị chọrọ ime ka unu dịghachi n’udo. Cheta ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́: ‘Dị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu, ghara ịdị ngwa n’inwe ọnụma.’ (Jems 1:19) Ndụmọdụ e nyere ka a “ghara ịdị ngwa n’inwe ọnụma” pụtara na onye nke ọzọ pụrụ ime ma ọ bụ kwuo ihe pụrụ ịkpasu gị iwe. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, rịọ Jehova maka enyemaka iji nọgide na-ejide onwe gị. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Chere ka  nwanna gị kwuo ihe na-ewe ya iwe, ma gee ya ntị nke ọma. Amanyela ya aka n’ọnụ, ọbụna ma a sị na i kwenyeghị n’ihe nile ọ na-ekwu. Echiche ya pụrụ ihie ụzọ, ma nke ahụ bụ ihe o chere n’ezie. Gbalịa ile nsogbu ahụ anya dị ka o si ele ya. Nke ahụ pụrụ ọbụna ịgụnye ile onwe gị anya dị ka nwanna gị si ele gị anya.—Ilu 18:17.

20. Mgbe a na-edozi nghọtahie, nzọụkwụ ndị ọzọ dị aṅaa yiri ka ha pụrụ ime ka a dịghachi n’otu?

20 Mgbe o ruru gị n’aka ikwu okwu, jiri amara kwuo okwu. (Ndị Kọlọsi 4:6) Gwa nwanna gị ihe na-amasị gị n’ebe ọ nọ. Rịọ ya mgbaghara maka ihe ọ bụla i meworo iji kpata nghọtahie ahụ. Ọ bụrụ na mgbalị ndị i ji obi umeala mee emee ka unu dịghachi n’udo, kelee Jehova. Ọ bụrụ na ha emeghị otú ahụ, nọgide na-arịọ Jehova maka nduzi ka ị na-achọkwu ohere ndị ọzọ iji mee udo.—Ndị Rom 12:18.

21. Olee otú ihe a a tụleworo si nyere gị aka ile ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha?

21 Jehova hụrụ ndị ohu ya nile n’anya. Obi na-atọ ya ụtọ iji anyị nile na-eme ihe n’ozi ya n’agbanyeghị ezughị okè anyị. Ka anyị na-amụtakwu banyere otú o si ele ndị ọzọ anya, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ ga-amụba. Ọ bụrụ na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Onye Kraịst ibe anyị nọ ajụwo oyi, a pụrụ ime ka ọ maliteghachi ikpo ọkụ. Lee ka anyị ga-esi nweta ngọzi dị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị emee mgbalị siri ike ile ndị ọzọ anya n’ụzọ ziri ezi—ee, ile ha anya otú Jehova si ele ha!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 1 O mesịrị pụta ìhè na Elaịab mara mma enweghị ihe a chọrọ iji bụrụ eze kwesịrị ekwesị nke Izrel. Mgbe dike ndị Filistia bụ́ Golaịat mara ndị Izrel aka n’ọgbọ agha, Elaịab, tinyere ndị ikom Izrel ndị ọzọ, mara jijiji n’ụjọ.—1 Samuel 17:11, 28-30.

^ par. 7 N’ihi nnukwu mmeri ụfọdụ Jeroboam nke Abụọ nwere na nnwetaghachi o nwetaghachiri ebe bụbu ókèala ha na ụtụ ndị ọ malitere ịnata n’ihi nke a, ihe àmà na-egosi na ọ mụbara nnọọ akụ̀ na ụba nke alaeze ebe ugwu ahụ.—2 Samuel 8:6; 2 Ndị Eze 14:23-28; 2 Ihe E Mere 8:3, 4; Emọs 6:2.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú Jehova si ele adịghị ike nke ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi anya?

• Olee àgwà ọma Jona na Pita nwere ndị ị pụrụ ịkpọtụ aha?

• Olee otú i kpebisiri ike isi nọgide na-ele ụmụnna gị Ndị Kraịst anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 18]

Chee Banyere Otú Chineke Si Ele Ndị Ọzọ Anya

Ka ị na-atụgharị uche n’ihe ndekọ Bible banyere Jona, ị̀ na-ahụ mkpa ọ dị ile ndị ị na-ekwusara ozi ọma mgbe nile anya n’ụzọ dị iche? Ha pụrụ iyi ndị onwe ha juru afọ ma ọ bụ ndị na-enweghị mmasị, dị ka ndị Izrel, ma ọ bụkwanụ ha pụrụ ịdị na-emegide ozi Chineke. Otú o sina dị, olee otú Jehova Chineke si ele ha anya? Ọbụna ụfọdụ ndị a ma ama n’usoro ihe a pụrụ ịmalite ịchọ Jehova otu ụbọchị, dị nnọọ ka eze Nineve chegharịrị n’ihi nkwusa Jona mere.—Jona 3:6, 7.

[Foto dị na peeji nke 15]

Ị̀ na-ele ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha?

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Jizọs hụrụ ihe dị mma ikwu banyere ahụmahụ Jona